Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Job 1:1-42:17
  • Job

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Job
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Job

JOB

1 E nwere otu nwoke bi n’ala Ọz. Aha ya bụ Job.*+ Ọ bụ onye ezi omume nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.*+ Ọ na-atụ egwu Chineke, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ.+ 2 A mụụrụ ya ụmụ nwoke asaa na ụmụ nwaanyị atọ. 3 Anụ ụlọ ya dị puku atụrụ asaa (7,000), puku kamel atọ (3,000), otu puku ehi (1,000),* na narị jakị* ise (500). O nwekwara ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ ya mere o ji bụrụ ya kacha baa ọgaranya ná ndị niile bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ.

4 Nwa ya nwoke nke ọ bụla na-eme oriri n’ụlọ ya n’ụbọchị nke ya.* Ha na-akpọ ụmụnne ha ndị nwaanyị atọ ka ha bịa soro ha rie ma ṅụọ. 5 Mgbe ha niile n’otu n’otu mechara oriri n’ụlọ ha, Job na-ezi ozi ka ha bịa ka o mee ka ha dị nsọ. Ọ na-ebili n’isi ụtụtụ chụọrọ onye nke ọ bụla n’ime ha àjà a na-esu ọkụ.+ N’ihi na, Job na-asị: “O nwere ike ịbụ na ụmụ m emehiela ma kwujọọ Chineke n’obi ha.” Ọ bụ ihe Job na-eme mgbe niile.+

6 Otu ụbọchị, ụmụ ezi Chineke*+ bịara ka ha guzo n’ihu Jehova,+ Setan+ bịakwara soro ha.+

7 Jehova wee sị Setan: “Olee ebe i si bịa?” Setan zara Jehova, sị: “M nọ na-akpagharị n’ụwa, na-agagharịkwa n’ime ya.”+ 8 Jehova wee sị Setan: “Ì leruola ohu m Job anya?* Ị̀ hụla na e nweghị onye dị ka ya n’ụwa? Ọ bụ onye ezi omume nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.*+ Ọ na-atụ egwu Chineke, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ.” 9 Setan wee sị Jehova: “Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke?+ 10 Ọ̀ bụ na ị naghị echebe ya+ na ụlọ ya na ihe niile o nwere?* Ị gọziela ọrụ niile ọ na-arụ,+ meekwa ka anụ ụlọ ya ju ebe niile. 11 Ma, ọ bụrụ na ị ga-amatị aka gị ugbu a napụ ya ihe niile o nwere, ọ ga-ekwujọ gị n’ihu gị.” 12 Jehova sịziri Setan: “Lee, ihe niile o nwere dị gị n’aka. Ma, emetụla yanwa aka.” Setan wee si n’ihu Jehova pụọ.+

13 Otu ụbọchị, mgbe ụmụ ya ndị nwoke na ụmụ ya ndị nwaanyị nọ na-eri ihe ma na-aṅụ mmanya n’ụlọ nwanne ha nke diọkpara,+ 14 otu onye ozi bịakwutere Job, sị: “Ìgwè ehi gị nọ na-akọ ihe, ìgwè jakị gị nọkwa na-ata ahịhịa n’akụkụ ha 15 mgbe ndị Siba bịara lụso anyị ọgụ ma chịkọrọ ha, ha jikwa mma agha gbuo ndị na-ejere gị ozi. Ọ bụ naanị m gbapụtara ka m kọọrọ gị ihe merenụ.”

16 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, onye ọzọ bịara, sị: “Ọkụ nke si n’aka Chineke* si n’eluigwe daa ree ìgwè atụrụ gị na ndị na-ejere gị ozi ma regbuo ha. Ọ bụ naanị m gbapụtara ka m kọọrọ gị ihe merenụ.”

17 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, onye ọzọ bịara, sị: “Ndị Kaldia+ kere onwe ha ụzọ atọ bịa chịkọrọ kamel gị, ha jikwa mma agha gbuo ndị na-ejere gị ozi. Ọ bụ naanị m gbapụtara ka m kọọrọ gị ihe merenụ.”

18 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, onye ọzọ bịakwara, sị: “Ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwaanyị nọ na-eri ihe ma na-aṅụ mmanya n’ụlọ nwanne ha nke diọkpara. 19 Ma, oké ifufe si n’ala ịkpa fee na mberede. O fesiri ike n’ụlọ ahụ, ụlọ ahụ wee daa dagbuo ụmụ gị. Ọ bụ naanị m gbapụtara ka m kọọrọ gị ihe merenụ.”

20 Job wee bilie dọwaa uwe ya, kpụọkwa isi ya. O gburu ikpere n’ala kpọọ isiala, 21 sị:

“Agba m aka* si n’afọ nne m pụta,

M ga-agbakwa aka* laghachi.+

Ọ bụ Jehova nyere,+ ọ bụkwa Jehova weere.

Ka a na-eto aha Jehova.”

22 N’ihe niile a, Job emehieghị, o kwughịkwa na Chineke mere ihe na-adịghị mma.*

2 Mgbe e mechara, ụmụ ezi Chineke*+ bịara ka ha guzo n’ihu Jehova+ n’ụbọchị ọzọ. Setan bịakwara ka o soro ha guzo n’ihu Jehova.+

2 Jehova wee sị Setan: “Olee ebe i si bịa?” Setan zara Jehova, sị: “M nọ na-akpagharị n’ụwa, na-agagharịkwa n’ime ya.”+ 3 Jehova wee sị Setan: “Ì leruola ohu m Job anya?* Ị̀ hụla na e nweghị onye dị ka ya n’ụwa? Ọ bụ onye ezi omume nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.*+ Ọ na-atụ egwu Chineke, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ. Ọ ka kwụsiri ike n’ebe m nọ+ n’agbanyeghị na ị na-agbalị ime ka m laa ya+ n’iyi* ọ bụ eziokwu na e nweghị ihe o mere.” 4 Ma Setan gwara Jehova, sị: “Mmadụ nọrọ n’ọnụ ọnwụ, ọ ga-enye* ihe niile o nwere ka ọ zọọ ndụ* ya. 5 Ma, ọ bụrụ na ị ga-amatị aka gị ugbu a mee ka ọ rịawa ọrịa,* ọ ga-ekwujọ gị n’ihu gị.”+

6 Jehova sịziri Setan: “Lee, ọ nọ gị n’aka. Ma, egbula ya egbu.” 7 Setan wee si n’ihu Jehova pụọ ma mee ka etuto na-afụ ụfụ too Job,*+ malite n’ọbụ ụkwụ ya ruo n’opu isi ya. 8 Job wee were mpekere ite ụrọ kụwara akụwa na-akọ onwe ya ọkọ, ọ nọdụkwara ala ná ntụ.+

9 N’ikpeazụ, nwunye ya sịrị ya: “Ị̀ ka jisiri Chineke aka ike? Kpọọ Chineke iyi nwụọ.” 10 Ma ọ sịrị nwunye ya: “Ị na-ekwu okwu ka nwaanyị nzuzu. Ọ̀ bụ naanị ihe ọma ka anyị ga na-anata ezi Chineke, ghara ịnata ihe ọjọọ?”+ N’ihe a niile, Job ekwughị ihe ọjọọ ọ bụla.+

11 Ndị enyi Job atọ nụrụ ihe ọjọọ niile mere ya. Onye ọ bụla n’ime ha wee si n’obodo ya bịa. Aha ha bụ Elifaz+ onye Timan, Bildad+ onye Shua,+ na Zofa+ onye Neama.* Ha kwuru ka ha zukọta soro gaa sị Job ndo ma kasie ya obi. 12 Mgbe ha nọ n’ebe dị anya hụ ya, ha amataghị na ọ bụ ya. Ha bewere ákwá mgbe ha matara na ọ bụ ya, na-ebesi ya ike. Ha dọwara uwe ha, kpolie uzuzu elu, wụsakwa ya n’isi ha.+ 13 Ha sooro ya nọrọ ọdụ n’ala ruo ụbọchị asaa, ehihie na abalị. E nweghị onye gwara ya ihe ọ bụla n’ihi na ha hụrụ na ahụ́ na-egbusi ya mgbu ike.+

3 Ọ bụ mgbe ihe a mechara ka Job kwuziri okwu ma bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ.*+ 2 Job sịrị:

 3 “M na-abụ ụbọchị a mụrụ m ọnụ,+

Nakwa abalị ahụ mmadụ sịrị, ‘A dịla ime nwa nwoke.’

 4 Ka ụbọchị ahụ gbaa ọchịchịrị.

Ka Chineke chefuo ya.

Ka ìhè gharakwa inwu na ya.

 5 Ka oké ọchịchịrị gbachie ya.

Ka urukpuru kpuchie ya.

Ka oké ọchịchịrị kpuchie ìhè ya.

 6 Ka oké itiri gbaa n’abalị ahụ.+

Ka a ghara ịṅụrị ọṅụ n’ụbọchị ahụ n’ime ụbọchị ndị e nwere n’afọ,

Ka ọ ghara iso n’ụbọchị ndị e nwere n’ọnwa.

 7 N’eziokwu, ọ gaara aka mma ma a sị na e nweghị onye a mụrụ n’abalị ahụ.

Ka a ghara iti mkpu ọṅụ na ya.

 8 Ka ndị na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ya ọnụ,

Bụ́ ndị nwere ike ịkpọte Agụ Iyi.*+

 9 Ka kpakpando nke pụtara mgbe chi malitere iji n’abalị ahụ gbaa ọchịchịrị.

Ka o chere ìhè, ma ka ìhè ghara ịdị,

Ka ọ gharakwa ịhụ ìhè na-apụta ma chi bọwa.

10 N’ihi na o mechighị akpa nwa nne m,+

O meghịkwa ka m ghara ịhụ nsogbu.

11 Gịnị mere na anwụghị m mgbe a na-amụ m?

Gịnị mere na anwụghị m mgbe m si n’akpa nwa pụta?+

12 Gịnị mere mama m ji kuru m n’ụkwụ ya,

Nyekwa m ara ka m ṅụọ?

13 N’ihi na ugbu a, m gaarala edinara ala n’enweghị onye na-enye m nsogbu.+

M gaarala na-ehi ụra, na-ezukwa ike,+

14 Mụ na ndị eze ụwa na ndị na-adụ ha ọdụ,

Ndị ebe ndị ha rụụrụ onwe ha dakpọsịziri adakpọsị,*

15 Ma ọ bụ, mụ na ụmụ ndị eze* bụ́ ndị nwere ọlaedo,

Ndị ọlaọcha juru n’ụlọ ha.

16 Ma ọ bụ, gịnị mere na ime apụghị mama m mgbe ọ dị ime m,

Mụ anwụọ ka ụmụaka ndị na-ahụtụghị ìhè?

17 N’ebe ahụ, ndị ajọ omume anaghịzi echegbu onwe ha.

Ndị ike gwụrụ na-ezu ike n’ebe ahụ.+

18 Ndị mkpọrọ niile na-atụsara ahụ́ n’ebe ahụ.

Ha anaghị anụ olu onye na-amanye ha ịrụ ọrụ.

19 Onye ukwu na onye nta bụ otu n’ebe ahụ,+

Ohu na-enwerekwa onwe ya n’aka nna ya ukwu.

20 Gịnị mere Chineke ji ekwe ka onye na-ata ahụhụ dịrị ndụ,*

Na-enyekwa ndị na-ahụsi anya ndụ?+

21 Gịnị mere na ọnwụ anaghị egbu ndị chọrọ ịnwụ?+

Ndị na-achọ ya karịa otú e si achọ akụ̀ zoro ezo,

22 Ndị na-aṅụrị nnukwu ọṅụ,

Ndị obi na-atọ ụtọ ịnwụ.*

23 Gịnị mere Chineke ji enye onye furu ụzọ ìhè,

Bụ́ onye ọ gbachibidoro ogige?+

24 N’ihi na m na-ama ọsụ kama iri ihe.+

Ude m na-asụ+ dị ka ebe mmiri na-agba n’akwụsịghị akwụsị.

25 N’ihi na ihe m tụrụ ụjọ ya abịarala m,

Ihe m tụrụ egwu ya emeekwala m.

26 E nweghị mgbe obi ruru m ala. E nweghị mgbe m nọ jụụ. E nweghị mgbe m zuru ike,

Kama nsogbu nọ na-abịa.”

4 Elifaz+ onye Timan wee sị:

 2 “Ọ bụrụ na mmadụ agbalịa ka ọ gwa gị okwu, ike ọ̀ ga-agwụ gị ige ya ntị?

Ma ònye ga-agbachili nkịtị ghara ikwu okwu?

 3 N’eziokwu, ị kụzierela ọtụtụ ndị ihe.

Ị na-agbabu ndị ike gwụrụ ume.

 4 Okwu gị na-agba onye ọ bụla na-ada mbà ume,

Ị na-emekwa ka ndị chọrọ ịda ada kwụsie ike.

 5 Ma ugbu a, nsogbu abịarala gị, ike ụwa agwụ gị.

O ruola gị ahụ́, gị adaa mbà.

 6 Ọ̀ bụ na nsọpụrụ ị na-asọpụrụ Chineke anaghị eme ka obi sie gị ike?

Ọ̀ bụ na otú i si kwụsie ike n’ebe Chineke nọ+ anaghị eme ka i nwee olileanya?

 7 Biko, è nwetụla onye aka ya dị ọcha i chetara nwụchuru ọnwụ?

Olee mgbe e bibitụrụla onye ezi omume?

 8 Ihe m hụrụla bụ na ndị na-akụ ihe ọjọọ ka mkpụrụ

Na ndị na-agha nsogbu ka mkpụrụ ga-aghọrọ otu ihe.

 9 Ume Chineke kupụrụ na-ebibi ha,

Ha na-anwụkwa ma o wee ezigbo iwe.

10 Ọdụm na-agbọ ụja, nwa ọdụm na-abakwa mba,

Ma a na-agbaji ezé ọdụm siri ike.

11 Ọdụm na-anwụ n’ihi na e nweghị anụ ọ ga-eri,

Ụmụ ọdụm na-agbasasịkwa.

12 E nwere okwu a gwara m na nzuzo.

A takwunyeere m ya ná ntị.

13 N’abalị, mgbe ndị mmadụ nọ n’oké ụra,

M hụrụ ọhụụ mere ka obi ghara izu m ike.

14 Ezigbo ụjọ jidere m,

Ọkpụkpụ m niile ana-ama jijiji.

15 Otu mmụọ gafere n’ihu m,

Akpata oyi awụọ m n’ahụ́.

16 Ọ kwụụrụ otu ebe,

Ma amataghị m ihe ọ bụ.

E nwere ihe guzo n’ihu m.

Ebe niile dara jụụ, m wee nụ otu olu nke sịrị:

17 ‘Mmadụ efu ò nwere ike ịka Chineke bụrụ onye ezi omume?

Mmadụ ò nwere ike ịka Onye kere ya bụrụ onye aka ya dị ọcha?’

18 Lee, ọ tụkwasịghị ndị ohu ya obi,

Ọ na-atakwa ndị mmụọ ozi ya* ụta,

19 Ma ya fọdụzie ndị mmadụ e ji ájá kpụọ,

Ndị bụ́kwa naanị ájá,*+

Ndị a na-azọpịa ọsọ ọsọ ka egu.*

20 Ha nọ ndụ n’ụtụtụ, ma tupu mgbede eruo, a zọpịachaala ha.

A na-ebibi ha ruo mgbe ebighị ebi, e nweghịkwa onye na-ama.

21 Ọ̀ bụ na ha adịghị ka ụlọikwuu e fopụsịrị ụdọ e ji jide ya efopụ?

Ha na-anwụ n’amaghị ihe ọ bụla.

5 “Biko, kpọọ òkù. È nwere onye na-aza gị?

Ònye n’ime ndị nsọ* ka ị ga-akpọ ka o nyere gị aka?

 2 N’ihi na iwe ga-egbu onye nzuzu,

Anyaụfụ ga-egbukwa onye na-amaghị ihe.

 3 Ahụla m ka ihe na-agaziri onye nzuzu.

Ma na mberede, a na-abụ ụlọ ya ọnụ.

 4 Ụmụ ya ejighị ndụ ha n’aka.

A na-emegbu ha n’ọnụ ụzọ ámá obodo,+ e nweghịkwa onye na-anapụta ha.

 5 Onye agụụ na-agụ na-eri ihe onye ahụ wetara n’ubi.

Ọ na-eweredị ihe ndị dị n’ebe e nwere ogwu,

A na-eburukwa ihe ha n’ike.

 6 Ma, ihe ọjọọ anaghị esi n’ájá epupụta,

Nsogbu anaghịkwa esi n’ala epulite.

 7 O doro anya na ikerike ọkụ ga-esirịrị n’ọkụ gbalie elu.

Otú ahụkwa ka o doro anya na mmadụ ga-enwerịrị nsogbu ná ndụ ya.

 8 Ma, m ga-arịọ Chineke arịrịọ,

Ọ bụkwa Chineke ka m ga-ewegara okwu m,

 9 Onye na-eme oké ihe na ihe ndị a na-enweghị ike ịchọpụta achọpụta,

Ihe ndị dị ebube a na-enweghị ike ịgụta ọnụ.

10 Ọ na-eme ka mmiri zoo n’ụwa,

Na-emekwa ka mmiri zoo n’ubi.

11 Ọ na-ebuli onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya elu,

Na-azọpụtakwa onye ike ụwa gwụrụ.

12 Ọ na-akụghasị atụmatụ ndị aghụghọ,

Ka ihe ha na-eme ghara inwe isi.

13 Ọ na-eme ka ọnyà ndị ma ihe siri ma ha,+

Ka atụmatụ ha wee kụsasịa.

14 Ọchịchịrị na-agbachi ha n’ehihie,

Ha na-asọgharịkwa ìsì n’etiti ehihie ka à ga-asị na ọ bụ abalị.

15 Ọ na-anapụta mmadụ n’okwu si ha n’ọnụ apụta nke dị ka mma agha,

Na-anapụta ogbenye n’aka onye siri ike,

16 Ka onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya nwee olileanya,

Ma a na-emechi ọnụ onye ajọ omume.

17 Lee, onye Chineke dọrọ aka ná ntị na-enwe obi ụtọ;

N’ihi ya, ajụla aka ná ntị Onye Pụrụ Ime Ihe Niile na-adọ gị.

18 Ọ na-eme mmadụ ihe ga-egbu ya mgbu, ma ọ na-ekechi ọnyá onye ahụ.

Ọ na-emerụ mmadụ ahụ́, ma ọ na-eji aka ya agwọ onye ahụ.

19 Ọ ga-anapụta gị ná nsogbu ọ bụla bịaara gị,

Ọ bụrụgodị nsogbu isii ma ọ bụ asaa.

20 N’oge ụnwụ, ọ ga-anapụta gị ka ọnwụ ghara igbu gị,

Napụtakwa gị n’oge agha, ka mma agha ghara igbu gị.

21 A ga-echebe gị ka a ghara ịgwa gị okwu ọjọọ,+

Ị gaghịkwa atụ egwu mgbe a na-ebibi ndị mmadụ.

22 Ị gaghị atụ egwu na a ga-ebibi gị ma ọ bụ na agụụ ga-agụgbu gị,

Ị gaghịkwa atụ anụ ọhịa egwu.

23 N’ihi na nkume ndị dị n’ọhịa agaghị emerụ gị ahụ́,*

Gị na anụ ọhịa ga-adịkwa n’udo.

24 Obi ga-eru gị ala n’ụlọikwuu gị,

E nweghịkwa anụ ị ga-achọ achọ mgbe ị ga-eleru ebe ụmụ anụmanụ gị na-ata ahịhịa anya.

25 Ị ga-enwe ọtụtụ ụmụ,

Ụmụ ụmụ gị ga-adịkwa ọtụtụ ka ahịhịa dị n’ala.

26 Ike ka ga-adị gị n’ahụ́ mgbe ị ga-anwụ,

Ka ùkwù ọka e gbutere n’oge ya.

27 Lee, anyị elebala ihe a anya. Ọ bụ otú ọ dị.

Gee ntị ma nabata ya.”

6 Job wee sị:

 2 “Ọ dị m ka ya bụrụ na e nwere ike ịtụ nsogbu m+ niile atụ̀,

Jirikwa ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ha na ahụhụ m na-ata.

 3 N’ihi na ọ dị arọ karịa ájá dị n’oké osimiri.

Ọ bụ ya mere m ji ekwu okwu n’echeghị echiche.+

 4 N’ihi na akụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile agbatala m,

Nsí si n’akụ́ ndị ahụ na-abanyekwa m n’ime ahụ́.+

Ọgụ Chineke na-alụso m emeela ka ụjọ zuo m ahụ́.

 5 Jakị ọhịa+ ọ̀ ga na-eti mkpu mgbe o nwere ahịhịa ọ ga-ata,

Ka ehi ọ̀ ga na-eti mkpu mgbe o nwere ihe ọ ga-eri?

 6 À na-eri nri na-anaghị atọ ụtọ n’etinyeghị ya nnu,

Ka mmiri si n’ahịhịa malo ọ̀ na-atọ ụtọ?

 7 Ekweghị m* emetụ ụdị ihe ndị ahụ aka.

Ha dị ka nri mebiri emebi.

 8 Ọ dị m ka ya bụrụ na a ga-emere m ihe m na-arịọ,

Na Chineke ga-emere m ihe m chọrọ,

 9 Na Chineke ga-ekwe zọpịa m,

Nakwa na ọ ga-esetị aka ya bibie m.+

10 N’ihi na nke ahụ ga-akasidị m obi.

M ga-amali elu ṅụrịa ọṅụ n’agbanyeghị na ahụ́ na-egbusi m mgbu ike,

N’ihi na eledatụbeghị m ihe Onye Nsọ kwuru anya.+

11 Ike ịnọ na-echere ọ̀ dị m?+

Gịnị ka m ga-enweta n’ikpeazụ mere m ka ga-eji dịrị ndụ?

12 M̀ siri ike ka nkume?

Ka ọ̀ bụ ọla kọpa ka e ji mee ahụ́ m?

13 È nwere otú m nwere ike isi nyere onwe m aka

Mgbe a napụrụla m ihe niile na-enyere m aka?

14 Onye ọ bụla na-anaghị ahụ mmadụ ibe ya n’anya*+

Anaghịzi atụ egwu Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+

15 Ụmụnne m na-aghọ m aghụghọ+ ka ngele,*

Ka ngele ndị na-ata ata.

16 Mmiri kpụkọrọ akpụkọ na-eme ka ha na-eji oji,

Snoo na-agbaze agbaze na-ezo n’ime ha.

17 Ma mgbe oge ruru, mmiri anaghịzi adị na ha.

Mgbe okpomọkụ bịara, ha na-ata.

18 Ha na-asọrọ gaa ebe ọzọ.

Ha na-asọba n’ọzara wee taa.

19 Ndị si Tima aga njem+ na-achọ mmiri ndị ahụ.

Ndị si Siba aga njem+ na-ele anya ha.

20 Ihere na-eme ha n’ihi na ha cheburu na ha ga-ahụ mmiri.

Ha bịarutere ebe ahụ ma ha ahụghị ihe ha tụrụ anya ya.

21 Ọ bụ otú a ka unu dị n’ebe m nọ.+

Unu ahụla ahụhụ dị egwu m na-ata, ụjọ abịa unu.+

22 M̀ sịrị unu nye m ihe,

Ka m̀ rịọrọ unu ka unu si n’akụnụba unu nye m onyinye?

23 M̀ rịọrọ unu ka unu napụta m n’aka onye iro

Ma ọ bụ ka unu zọpụta m n’aka ndị na-emesi mmadụ ike?

24 Kụzierenụ m ihe m ga-eme. M ga-agba nkịtị gee ntị.+

Meenụ ka m ghọta ihe m mejọrọ.

25 Eziokwu anaghị afụ ụfụ.+

Ma olee uru mba unu na-abara m bara?+

26 Ùnu na-achọ otú unu ga-esi tụchasịa ihe m kwuru,

Bụ́ okwu onye ike ụwa gwụrụ,+ nke ifufe na-efesasị?

27 Unu ga-efekwa nza n’isi nwa na-enweghị nne na nna,+

Reekwa enyi unu.*+

28 Ngwa, tụgharịanụ lee m anya,

N’ihi na agaghị m aghara unu ụgha.

29 Biko, cheenụ echiche, unu aghọtahiela m.

Cheenụ echiche ọzọ, n’ihi na m ka bụ onye ezi omume.

30 Ire m ọ̀ na-ekwu ihe na-adịghị mma?

Ọ̀ bụ na enweghị m ike ịmata na ihe adịghị mma?

7 “Ọ̀ bụ na ndụ mmadụ efu bi n’ụwa adịghị ka ebe a manyere mmadụ ịrụ ọrụ ike?

Ọ̀ bụ na ọ naghị ebi ndụ kwa ụbọchị ka onye ọrụ e goro ego?+

 2 Ọ na-agụ ya agụụ ka ọ nọrọ na ndò otú ọ na-agụ ohu,

Ọ na-atụkwa anya ka a kwụọ ya ụgwọ ọrụ ya otú onye ọrụ e goro ego na-atụ anya ụgwọ ọrụ ya.+

 3 Otú ahụ ka ndụ m si bụrụ ihe na-abaghị uru kemgbe ọtụtụ ọnwa,

M nọkwa na-ahụsi anya kemgbe ọtụtụ abalị.+

 4 M dinara ala, m na-ajụ, sị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’+

Ma ebe chi na-ekweghị abọ ngwa ngwa, m na-atụgharịgide ruo n’isi ụtụtụ.

 5 Ikpuru na ọkpụrụkpụ ájá kpuchiri m ahụ́.+

Ọnyá na abụ juru m n’ahụ́.+

 6 Ndụ m na-agbada n’ike n’ike.*+

Ọ na-agwụ ngwa ngwa, enweghịkwa m olileanya.+

 7 Cheta na ndụ m dị ka ifufe,+

Na agaghị m enwe obi ụtọ* ọzọ.

 8 Onye na-ahụ m ugbu a agaghị ahụ m ọzọ.

Ị ga-eji anya na-achọ m, ma agakwaghị m anọ ya.+

 9 Otú ahụ ígwé ojii si ekusa pụọ n’anya

Ka onye na-agbada n’ili* na-anaghị esi na ya apụta.+

10 Ọ gaghị alaghachi ọzọ n’ụlọ ya,

A gakwaghị ahụ ya ọzọ n’ebe o bibu.+

11 N’ihi ya, agaghị m emechi ọnụ m.

M ga-ekwu okwu n’ihi otú obi si afụ m ụfụ.

M ga-ekwu okwu n’ihi otú ahụhụ m na-ata si ewute m.+

12 Àbụ m oké osimiri, ka m̀ bụ nnukwu anụ mmiri,

Nke mere ị ga-eji mee ka a na-eche m nche?

13 Mgbe m sịrị, ‘Àkwà m* ga-akasi m obi.

Ọ ga-eme ka ahụhụ m na-ata belata,’

14 I meziri ka m rọwa nrọ na-atụ ụjọ,

Meekwa ka m hụwa ọhụụ na-atụ egwu.

15 N’ihi ya, ọ kaara m* mma ka m kubie ume.

N’eziokwu, ọ kaara m mma na m nwụrụ anwụ karịa ahụ́ m* ịdị otú a ọ dị.+

16 Ndụ m agwụla m ike.+ Achọghịzi m ịdị ndụ.

Hapụ m, n’ihi na ndụ m dị ka ume e kupụrụ ekupụ.+

17 Gịnị ka mmadụ efu bụ nke mere ị ga-eji na-eche banyere ya,

Anya gị adịrịkwa* n’ebe ọ nọ?+

18 Gịnị mere i ji enyocha ya kwa ụtụtụ,

Na-anwalekwa ya mgbe niile?+

19 Ọ̀ bụ na ị gaghị ewepụ anya gị n’ebe m nọ

Ma hapụtụ m ka m loo asọ mmiri?+

20 Ọ bụrụ na m mehiere, gịnị ka m ga-emeli gị, gị Onye na-ahụ ihe niile mmadụ na-eme?+

Gịnị mere o ji bụrụ m ka i lekwasịrị anya?

M̀ bụziiri gị ibu arọ?

21 Gịnị mere na ị naghị agbaghara m mmehie m

Ma leghara ihe ọjọọ m mere anya?

N’ihi na m ga-edinara n’ájá n’oge na-adịghị anya,+

Ị ga-achọkwa m, ma agaghị m anọ ya.”

8 Bildad+ onye Shua+ wee sị:

 2 “Olee mgbe ị ga-akwụsị ikwu okwu otú a?+

Okwu si gị n’ọnụ apụta bụ naanị oké ifufe.

 3 Chineke ọ̀ ga-ekpe ikpe na-ezighị ezi,

Ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ọ̀ ga-eme ihe na-adịghị mma?

 4 Ọ bụrụ na ụmụ gị mehiere ya,

Ọ hapụrụ ha ka a taa ha ahụhụ maka nnupụisi ha.

 5 Ma ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi,+

Rịọkwa Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ka o meere gị amara,

 6 Ọ bụrụkwa eziokwu na ị na-eme ezi omume ma na-akwụwa aka ọtọ,+

Ọ ga-elebara gị anya

Ma mee ka ihe dịrị gị ná mma otú ọ dịbuuru gị.

 7 N’agbanyeghị na e nweghị ezigbo ihe i nwere ná mmalite,

Ị ga-emecha baa ọgaranya.+

 8 Biko, jụọ ọgbọ gara aga ajụjụ,

Chebakwara ihe ndị nna nna ha chọpụtara echiche.+

 9 N’ihi na ọ ka bụ ụnyaahụ ka a mụrụ anyị, e nweghịkwa ihe anyị ma,

N’ihi na anyị anaghị adịte ndụ aka.*

10 Ọ̀ bụ na ha agaghị akụziri gị ihe,

Kọọkwara gị ihe ha ma?

11 Ahịhịa papaịrọs ọ̀ ga-eto ogologo n’ebe mmiri na-anaghị adọ?

Ahịhịa amị ọ̀ ga-eto ogologo ma ọ bụrụ na mmiri adịghị?

12 Ọ ga-ebu ahịhịa ọ bụla ụzọ kpọọ nkụ

Mgbe ọ na-amabeghị ifuru, mgbe a na-akajipụbeghị ya.

13 Ọ bụ ihe a ga-eme ndị niile na-echefu Chineke,

N’ihi na ihe onye na-anaghị asọpụrụ Chineke* na-ele anya ya agaghị enwe isi,

14 Bụ́ onye chekwubere ihe na-enweghị isi,

Onye tụkwasịkwara obi n’ihe na-esighị ike ka ọnyà* ududo.

15 Ọ ga-adabere n’ụlọ ya, ma ụlọ ya ga-adakasị.

Ọ ga-agbalị ka o jide ụlọ ya aka, ma ọ gaghịzi adị.

16 O yiri obere osisi a na-agba mmiri nke anwụ na-achasa,

Alaka ya gbasasịkwara n’ubi.+

17 Ọ gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’ikpo nkume.

Ọ na-eji ebe nkume juru emere ụlọ ya.

18 Ma mgbe a ga-efopụ ya n’ebe ọ dị,

Ebe ahụ ga-agọnahụ ya, sị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’+

19 N’eziokwu, ọ bụ otú a ka ọ ga-esi funyụọ anya.+

Osisi ndị ọzọ ga-esizi n’ájá pulite nọchie ya.

20 O doro anya na Chineke agaghị ajụ ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta,*

Ọ gaghịkwa akwado ndị ọjọọ,*

21 N’ihi na ọ ka ga-eme ka ọchị ju gị n’ọnụ,

Meekwa ka ọnụ gị na-eti naanị mkpu ọṅụ.

22 A ga-eyiwe ndị kpọrọ gị asị ihere ka uwe.

Ụlọikwuu ndị ajọ omume agaghịzi adị.”

9 Job kwuru, sị:

 2 “N’eziokwu, ama m na ọ bụ otú a ka ọ dị.

Ma, olee otú ọ ga-esi bụrụ mmadụ efu ka aka ya dị ọcha n’okwu ya na Chineke?+

 3 Ọ bụrụ na mmadụ achọọ ka ya na Chineke rụọ ụka,*+

Onye ahụ agaghị azali otu ajụjụ n’ime otu puku ajụjụ Chineke ga-ajụ.

 4 Ọ ma ihe, ike ya dịkwa ukwuu.+

Ònye ga-ama ya aka, a ghara imerụ onye ahụ ahụ́?+

 5 Ọ na-ebupụ* ugwu, ma mmadụ anaghị ama.

Ọ na-eji iwe ya akwatu ha.

 6 Ọ na-eme ka ụwa maa jijiji n’ebe ọ dị,

Nke na-eme ka ogidi ndị ji ya maa jijiji.+

 7 Ọ na-enye anyanwụ iwu ka ọ ghara ịcha,

Na-ekpuchikwa ìhè kpakpando dị iche iche.+

 8 Ọ bụ yanwa na-agbasa eluigwe ka ákwà,+

Na-agakwa ije n’elu ebili mmiri nke oké osimiri.+

 9 O kere ìgwè kpakpando Ash,* ìgwè kpakpando Kisịl,* na ìgwè kpakpando Kaịma,*+

Keekwa ìgwè kpakpando ndị dị na mbara igwe ebe ndịda.*

10 Ọ na-eme nnukwu ihe ndị a na-enweghị ike ịchọpụta achọpụta,+

Ihe ndị dị ebube a na-enweghị ike ịgụ ọnụ.+

11 Ọ na-agafe n’akụkụ m, ma anaghị m ahụ ya.

Ọ na-agafe m, ma anaghị m ama.

12 Ọ bụrụ na ọ napụwa mmadụ ihe, è nwere onye ga-egbochi ya?

Ònye ga-asịli ya, ‘Gịnị ka ị na-eme?’+

13 Chineke agaghị eme ka iwe ya dajụọ.+

Ndị na-enyedịrị Rehab*+ aka ga-adara ya n’ala.

14 N’ihi ya, mgbe m na-asa ya okwu,

M ga-elezi anya họrọ okwu m ga-agwa ya.

15 Ọ bụrụgodị na aka m dị ọcha, agaghị m asa ya okwu.+

Naanị arịrịọ ka m ga na-arịọ onye na-ekpe m ikpe* ka o meere m ebere.

16 Ọ bụrụ na mụ akpọọ ya, ọ̀ ga-aza m?

Ekwetaghị m na ọ ga-ege m ntị,

17 N’ihi na o ji oké ifufe na-emerụsị m ahụ́,

Na-emekwa ka ọnyá na-apụtakwu m n’ahụ́ n’agbanyeghị na e nweghị ihe m mere.+

18 Ọ naghị ekwe ka m kuru ume.

Ọ na-eme ka nsogbu zuo m ahụ́.

19 A bịa n’ịdị ike, ọ bụ yanwa dị ike.+

A bịa n’ikpe ikpe ziri ezi, ọ ga-asị: ‘Ònye ka m ga-aza ajụjụ?’*

20 Ọ bụrụ na ọ bụ mụnwa bụ onye aka ya dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe.

Ọ bụrụgodị na e nweghị ihe a ga-eji taa m ụta,* ọ ga-asị na ikpe mara m.*

21 Ọ bụrụgodị na e nweghị ihe a ga-eji taa m ụta,* obi akaghị m.

Ndụ m agwụla m ike.*

22 E nweghị ihe dị iche. Ọ bụ ya mere m ji asị,

‘Ọ na-ebibi ma onye aka ya dị ọcha ma onye ajọ omume.’

23 Ọ bụrụ na idei mmiri egbuo ndị mmadụ na mberede,

Ọ ga-achị ndị aka ha dị ọcha ọchị na ha enweghị ike ịzọ onwe ha ndụ.

24 E nyefeela ụwa n’aka ndị ọjọọ.+

Ọ na-ekpuchi anya* ndị ikpe e nwere n’ụwa.

Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, ọ̀ bụzi onye?

25 Ndụ m na-efezi ọsọ karịa onye na-agba ọsọ.+

O ji ọsọ na-agafe, ma e nweghị ihe ọma m na-ahụ.

26 Ọ na-agbafere ka ụgbọ epeepe e ji ahịhịa amị rụọ,

Ka ugo nke na-efedata ka o buru ihe ọ ga-eri.

27 Ọ bụrụ na mụ asị, ‘M ga-akwụsị ikwu ihe na-enye m nsogbu n’obi,

M ga-akwụsị ịgbarụ ihu m, nwewezie obi ụtọ,’

28 Ụjọ ka ga na-atụ m n’ihi mgbu ahụ́ niile na-egbu m,+

Amakwa m na ị gaghị ewere m ka onye aka ya dị ọcha.

29 A ga-ewere m ka onye ikpe mara.*

Gịnịzi mere m ga-eji na-adọlị n’efu?+

30 Ọ bụrụ na mụ ejiri mmiri si na snoo na-agbaze agbaze saa ahụ́,

Jirikwa ncha* kwọọ aka m,+

31 Ị ga-asụnyezi m n’olulu apịtị,

Nke ga-emedị ka uwe m kpọọ m asị.

32 N’ihi na ọ bụghị mmadụ otú m bụ nke na m ga-asa ya okwu,

Nke na mụ na ya ga-aga ikpe.+

33 E nweghị onye ga-ebiri mụ na ya ikpe,

Onye nwere ike ịbụrụ anyị onyeikpe.*

34 Ọ bụrụ na ọ ga-akwụsị ịpịa m ihe,*

Kwụsịkwa imenye m ụjọ,+

35 M ga-agwa ya okwu n’atụghị egwu,

N’ihi na anaghị m eji ụjọ ekwu okwu.

10 “Ndụ m agwụla m ike.+

M ga-ekwupụta ihe na-enye m nsogbu n’obi.

M ga-ekwu okwu n’ihi otú ahụhụ m na-ata si ewute m.

 2 M ga-asị Chineke, ‘Ekwula na ikpe mara m.

Gwa m ihe mere i ji na-esesa m okwu.

 3 Ọ̀ baara gị uru na ị na-emesi m ike,

Na ị kpọrọ ọrụ aka gị asị,+

Ma na-anabata ndụmọdụ ndị ajọ omume?

 4 Ọ̀ bụ anya mmadụ ka i nwere,

Ka ị̀ na-ahụ ihe otú mmadụ efu si ahụ?

 5 Ụbọchị ole ị na-adị ndụ ọ̀ bụ ụbọchị ole mmadụ efu na-adị ndụ,

Ka afọ ole ị na-adị ndụ ọ̀ bụ afọ ole mmadụ na-adị ndụ,+

 6 Nke mere ị ga-eji na-enyopụta ihe ọjọọ m mere

Ma na-achọgharị ka ị hụ mmehie m?+

 7 Ị ma na aka m dị ọcha.+

E nweghịkwa onye nwere ike ịnapụta m n’aka gị.+

 8 Ọ bụ aka gị ka i ji kpụọ m ma kee m.+

Ma ugbu a, ị na-achọ ibibi m kpamkpam.

 9 Biko, cheta na ọ bụ ájá ka i ji kpụọ m.+

Ma ugbu a, ị na-eme ka m laghachi n’ájá.+

10 Ọ̀ bụ na i tinyeghị m n’afọ nne m,

Ma kpụọ m n’ebe ahụ?*

11 I yiwere m anụ ahụ́ na akpụkpọ ahụ́ ka uwe,

Jirikwa ọkpụkpụ na akwara jikọta m.+

12 I nyela m ndụ, gosikwa m na ị hụrụ m n’anya.

Nlekọta ị na-elekọta m echebela ndụ* m.+

13 Ma i bu n’obi ime m ihe ndị a na nzuzo.

Ama m na ọ bụ gị na-eme ihe ndị a.

14 Ọ bụrụ na mụ emee mmehie, ị ga na-ele m anya,+

Ị gaghịkwa ahapụ ịta m ahụhụ mmehie m.

15 Ọ bụrụ na ikpe mara m, nke m agwụla.

Ọ bụrụgodị na aka m dị ọcha, m ga-ekpudo ihu n’ala,+

N’ihi na ihere emegbuola m, ahụhụ zukwara m ahụ́.+

16 Ọ bụrụ na m welite isi m elu, ị na-achụgharị m otú ọdụm si achụ nta anụ,+

Ị na-ejikwa ike gị emekpa m ahụ́.

17 Ị na-akpọta ndị ọhụrụ ga-agbagide m akaebe.

Ị na-ewesakwu m iwe,

Ihe ana-esikwuru m ike.

18 Gịnịzi mere i ji si n’akpa nwa nne m kupụta m?+

Ọ gaara akara m mma na m nwụrụ tupu onye ọ bụla ahụ m anya.

19 Ọ gaara adị ka e nweghị mgbe m dịtụrụla ndụ.

A gaara esi n’akpa nwa kuru m kuba n’ili.’

20 Ọ̀ bụ na ụbọchị ndụ m adịghị ole na ole?+ Ya hapụ m aka.

Ya wepụ anya ya n’ebe m nọ, ka m kurutụ ume*+

21 Tupu mụ agawa n’ebe ọ ga-abụ m gaa, agaghịzi m alọta,+

N’ala kacha gbaa ọchịchịrị,+

22 N’ala gbara itiri,

N’ala oké ọchịchịrị na ọgba aghara,

N’ebe ìhè ya dị ka itiri.”

11 Zofa+ onye Neama kwuru, sị:

 2 “À ga-ahapụ ịza gị ihe a niile ị na-ekwu,

Ka ọtụtụ okwu ọ̀ ga-eme ka ị bụrụ onye ezi omume?

 3 Okwu na-abaghị uru ị na-ekwu ọ̀ ga-eme ka ndị mmadụ mechie ọnụ?

Ọ̀ bụ na e nweghị onye ga-abara gị mba maka okwu mkparị ị na-ekwu?+

 4 N’ihi na ị sịrị, ‘Ihe m na-akụzi dị mma,+

Adịkwa m ọcha n’anya gị.’+

 5 Ma, ọ dị m ka ya bụrụ na Chineke ga-ekwu okwu,

Megheekwa ọnụ ya gwa gị okwu.+

 6 Ọ gaara eme ka ị mata ihe nzuzo ndị ga-eme ka ị mara ihe,

N’ihi na onye ma ihe n’eziokwu na-aghọta ọtụtụ ihe.

Ị gaara amata na Chineke chefuru ụfọdụ mmehie gị.

 7 Ị̀ ga-achọpụtali amamihe Chineke nke dị omimi?

Ka ị̀ ga-achọpụtali ihe niile banyere Onye Pụrụ Ime Ihe Niile?

 8 Ọ dị elu karịa eluigwe. Gịnị ka ị ga-emeli?

O miri emi karịa ili.* Gịnị ka ị ga-amatali?

 9 O buru ibu karịa ụwa,

Saakwa mbara karịa oké osimiri.

10 Ọ bụrụ na ọ gafee jichie mmadụ, kpọọkwa onye ahụ ikpe,

Ònye ga-akwụsịli ya?

11 N’ihi na ọ ma mgbe ndị mmadụ na-aghọ aghụghọ.

Ọ hụ ihe ọjọọ, ọ̀ bụ na ọ gaghị ama?

12 Ma, ọ bụ naanị mgbe jakị ọhịa ga-amụtali mmadụ

Ka onye na-anaghị eche echiche ga-aghọta ihe.

13 Ọ dị m ka ya bụrụ na ị ga-edozi obi gị

Ma gbasapụ aka gị rịọ Chineke arịrịọ.

14 Ọ bụrụ na ị na-etinye aka n’ihe ọjọọ, sepụ aka na ya,

Ekwekwala ka a na-eme ihe ọjọọ n’ụlọikwuu gị.

15 Ị ga-enwezi ike iwelite ihu gị elu n’emeghị ihere,

Ị ga-akwụsili ike n’atụghị egwu.

16 Ị ga-echefuzi nsogbu gị.

Ị ga-echefu ya ka mmiri sọfere asọfe.

17 Ndụ gị ga-enwu gbaa karịa etiti ehihie.

Ọchịchịrị ya ga-adị ka ụtụtụ.

18 Ị ga-enwe obi ike maka na i nwere olileanya,

Ị ga-elegharịkwa anya ma dinara ala, obi eruo gị ala.

19 E nweghị onye ga-emenye gị ụjọ ma i dinara ala,

Ọtụtụ ndị ga-achọkwa ka gị na ha dị ná mma.

20 Ma anya ndị ajọ omume agaghị ahụ ụzọ.

Ha agaghị ahụ ebe ha ga-agbaga ka e chebe ha.

Naanị olileanya ha ga-enwe bụ ọnwụ.”+

12 Job wee sị:

 2 “N’eziokwu, ọ bụ ununwa ma ihe,

Amamihe ga-esokwa unu nwụọ.

 3 Ma m na-aghọtakwa ihe.

Unu akaghị m.

Olee onye na-amaghị ihe ndị a?

 4 Abụrụla m onye ndị enyi ya ji eme ihe ọchị,+

Onye na-akpọ Chineke ka ọ za ya.+

Onye ezi omume nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta bụzi onye e ji eme ihe ọchị.

 5 Onye ihe na-agaziri na-achị ndị nsogbu bịaara ọchị,

Na-eche na ọ bụ naanị ndị nọ ná nsogbu* ka ọdachi na-adakwasị.

 6 Obi ruru ndị ohi ala n’ụlọikwuu ha,+

E nweghịkwa onye na-enye ndị na-akpasu Chineke iwe nsogbu,+

Bụ́ ndị na-ebu chi ha n’aka.

 7 Ma, biko jụgodị ụmụ anụmanụ. Ha ga-akụziri gị ihe.

Jụọkwa ụmụ nnụnụ, ha ga-akọrọ gị.

 8 Ma ọ bụ, leruo ihe ndị dị n’ụwa anya.* Ha ga-akụziri gị ihe.

Azụ̀ ndị dị n’oké osimiri ga-akọkwara gị ya.

 9 N’ime ihe ndị a niile, olee nke na-amaghị

Na ọ bụ aka Jehova mere ihe a?

10 Ndụ ihe ọ bụla dị ndụ

Nakwa ndụ* mmadụ ọ bụla dị ya n’aka.+

11 Ọ̀ bụ na ntị anaghị atụle okwu

Otú ire* si amata otú nri na-atọ?+

12 Ọ̀ bụ na ndị agadi amaghị ihe?+

Ọ̀ bụ na ịdịte ndụ aka anaghị eme ka mmadụ na-aghọta ihe?

13 O nwere amamihe ma dị ike.+

Ọ na-aghọta ihe, na-emekwa ka uche ya mezuo.+

14 Ọ kwatuo ihe, e nweghị ike ịrụghachi ya.+

O mechie ihe, e nweghị mmadụ nwere ike imeghe ya.

15 O jichie mmiri, ihe niile akpọọ nkụ.+

O mee ka mmiri zowe, mmiri eju n’ụwa.+

16 O nwere ike, nweekwa ezigbo amamihe.+

Ọ bụ ya nwe onye na-eme mmehie nakwa onye na-eme ka mmadụ mehie.

17 Ọ na-eme ka ndị na-adụ ndị mmadụ ọdụ gbara ụkwụ ọtọ,*

Ọ na-emekwa ka ndị ikpe zuzuwe nzuzu.+

18 Ọ na-atọpụ agbụ ndị eze kere ndị ọzọ,+

Ọ na-ekekwa hanwa ájị̀ ndị ohu n’úkwù.

19 Ọ na-eme ka ndị nchụàjà gbara ụkwụ ọtọ,+

Ọ na-akwatukwa ndị ọnụ na-eru n’okwu.+

20 Ọ na-eme ka ndị a tụkwasịrị obi na ha ga-adụ ndị mmadụ ọdụ ghara ịma ihe ha ga-ekwu.

Ọ na-eme ka ndị agadi gharazie inwe ezi uche.

21 Ọ na-eme ka a na-eleda ndị a ma ama anya,+

Ọ na-emekwa ka ike gwụ ndị dị ike.*

22 Ọ na-eme ka a mata ihe ndị e zoro n’ọchịchịrị,+

Ọ na-emekwa ka ìhè nwuo n’ebe gbara oké ọchịchịrị.

23 Ọ na-eme ka mba dị iche iche dị ike, ka o wee bibie ha.

Ọ na-eme ka ala mba dị iche iche saa mbara, ka o wee mee ka a dọrọ ha n’agha.

24 Ọ na-eme ka ndị na-achị ndị mmadụ ghara ịghọta ihe,

Na-emekwa ka ha na-agagharị n’ọzara ụzọ na-adịghị.+

25 Ha na-asọ ìsì n’ọchịchịrị,+ n’ebe ìhè na-adịghị.

Ọ na-eme ka ha na-adagharị ka ndị mmanya na-egbu.+

13 “N’eziokwu, anya m ahụla ihe a niile.

Ntị m anụla ya ma ghọta ya.

 2 Ama m ihe unu ma.

Unu akaghị m.

 3 Ma, ọ ga-akara m mma ka m gwa Onye Pụrụ Ime Ihe Niile okwu.

M chọrọ ịzara ọnụ m n’ihu Chineke.+

 4 Ma unu na-aghagide m ụgha.

Unu bụcha ndị dibịa na-abaghị uru.+

 5 A sị nnọọ na unu ga-agbachi nkịtị,

Ọ ga-egosi na unu ma ihe.+

 6 Biko, geenụ ntị n’ihe m na-ekwu,

Ṅaakwanụ ntị n’arịrịọ m na-arịọ.

 7 Ùnu ga-ekwu ihe na-ezighị ezi ka unu wee gbachitere Chineke?

Ùnu ga-ekwukwa okwu aghụghọ ka unu wee kwuchitere ya?

 8 Ùnu ga-adụnyere ya úkwù?*

Ùnu ga-ekpechitere ezi Chineke ọnụ ya?

 9 Ọ bụrụ na o leruo unu anya, ihe ọ ga-ahụ ọ̀ ga-adị ya mma?+

Ùnu ga-aghọ ya aghụghọ otú unu ga-aghọ mmadụ efu aghụghọ?

10 E nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara ịbara unu mba

Ma ọ bụrụ na unu na-eme ka à ga-asị na unu na-adụnyere ya úkwù.+

11 Ọ̀ bụ na ebube ya agaghị emenye unu ụjọ,

Ụjọ ya ejidekwa unu?

12 Okwu amamihe unu na-ekwu enweghị isi na ọdụ.*

Ihe ndị unu na-ekwu abaghị uru otú ọta e ji ájá kpụọ na-abaghị uru.

13 Gbachienụ nkịtị ka m kwuo okwu.

Ka ihe ọ bụla ga-eme m mee m.

14 Gịnị mere m ji etinye onwe m ná nsogbu,*

Na-emekwa ihe nwere ike ịta isi m?

15 M ga-echere n’agbanyeghị na o nwere ike igbu m.+

M ga-azara ọnụ m n’ihu ya.

16 Ọ ga-azọpụtazi m,+

N’ihi na onye ọ bụla na-anaghị asọpụrụ ya* agaghị abata n’ihu ya.+

17 Geenụ ntị nke ọma n’okwu m.

Tinyekwanụ uche n’ihe m na-ekwu.

18 Lee, akwadebela m ihe m ga-ekwu iji zara ọnụ m.

Ama m na aka m dị ọcha.

19 Ònye ga-agbagha ihe m na-ekwu?

M ga-anwụ ma m gbachi nkịtị.*

20 Chineke, biko, meere m ihe abụọ a*

Ka m ghara izoro gị onwe m:

21 Wepụ aka gị nke na-anyị arọ n’ahụ́ m ma mee ka ọ dị anya n’ebe m nọ,

Ekwekwala ka ụjọ gị jide m.+

22 Kpọọ m ka m za

Ma ọ bụkwanụ ka m kwuo okwu ka ị za m.

23 Olee ihe ọjọọ m mere, oleekwa mmehie m mere?

Mee ka m mara iwu m dara na mmehie m mere.

24 Gịnị mere i ji na-ezoro m ihu gị+

Ma na-ewere m ka onye iro gị?+

25 Ị̀ ga-agbalị ka i menye ahịhịa ifufe na-ebugharị ụjọ,

Ka ị̀ ga na-achụ ahịhịa ọka kpọrọ nkụ ọsọ?

26 N’ihi na ị nọ na-ede ihe ndị i ji ebo m ebubo dị iche iche,

Ị na-emekwa ka m taa ahụhụ maka mmehie ndị m mere mgbe m bụ okorobịa.

27 I tinyela ụkwụ m n’ọtọsị.

Ị na-enyocha ụzọ m niile,

Ị na-enyochakwa ebe ọ bụla m zọnyere ụkwụ.

28 N’ihi ya, mmadụ* na-ere ure ka ihe mebiri emebi,

Ka uwe nke egu* na-atakasị.

14 “Mmadụ nwaanyị mụrụ

Anaghị ebite ndụ aka,+ nsogbu na-ezukwa ya ahụ́.+

 2 Ọ na-apụta ka okooko osisi, mechaa kpọnwụọ.*+

Ọ na-agafe ọsọ ọsọ ka onyinyo ma pụọ n’anya.+

 3 N’eziokwu, ị nọ na-ele ya anya,

Ị na-akpọkwa ya* ka gị na ya kpee ikpe.+

 4 È nwere onye na-adịghị ọcha ga-amụtali onye dị ọcha?+

E nweghị.

 5 Ọ bụrụ na e kpebiela ụbọchị ole ọ ga-adị ndụ,

Ọnwa ole ọ ga-adị ndụ dị gị n’aka.

I kpebiela oge ọ ga-anọru ka ọ ghara ịgafe ya.+

 6 Wepụ anya gị n’ebe ọ nọ ka o zuru ike,

Ruo mgbe ụbọchị ya ga-ezu, otú onye ọrụ e goro ego si arụcha ọrụ ya n’ụbọchị.+

 7 N’ihi na osisi nwedịrị olileanya.

Ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epulite ọzọ,

Ome ya ka ga na-etokwa.

 8 Ọ bụrụ na mgbọrọgwụ ya emee ochie n’ime ala,

Ọ bụrụkwa na úkwù ya anwụọ n’ime ájá,

 9 Ọ ga-epulite ma mmiri metụ ya.

Ọ ga-awakwa alaka ka osisi puru ọhụrụ.

10 Ma mmadụ na-anwụ, tọgbọrọ n’enweghị ike.

Mmadụ kubie ume, olee ebe ọ nọ?+

11 Mmiri na-ata n’oké osimiri,

Mmiri na-asọpụcha n’osimiri, osimiri ataa.

12 Mmadụ na-edinakwa ala ma ghara ibili.+

Ọ gaghị ebili ruo mgbe eluigwe na-adịghịzi,

A gaghịkwa akpọte ya n’ụra.+

13 A sị nnọọ na ị ga-ezo m n’ili,*+

Na ị ga-ezo m ruo mgbe iwe gị dajụrụ,

Na ị ga-ekpebi oge m ga-anọru, gị echeta m.+

14 Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?+

M ga-echere n’oge niile a manyere m ichere,

Ruo mgbe a ga-eme ka m nwere onwe m.+

15 Ị ga-akpọ òkù, m ga-azakwa gị.+

Agụụ ọrụ aka gị ga na-agụsi gị ike.

16 Ma ka ọ dị ugbu a, ị na-agụ ije ụkwụ m niile ọnụ.

Ị na-ele anya ka ị hụ naanị mmehie m.

17 I kechiela ihe ọjọọ m mere n’akpa,

I jikwa mgbá nyachie ya ka mmehie m dịrị na ya.

18 Otú ahụ ugwu na-ada, kụrisịa,

E bupụkwa oké nkume n’ebe ọ dị,

19 Otú ahụ mmiri na-erichasị nkume,

Idei mmiri ebupụkwa ájá dị n’ala,

Otú ahụ ka ị na-eme ka olileanya mmadụ efu laa n’iyi.

20 Ị na-emerigide ya ruo mgbe ọ lara n’iyi.+

Ị na-agbanwe otú ọ dị, ị na-ezipụkwa ya.

21 A na-akwanyere ụmụ ya ùgwù, ma ọ naghị ama.

Ọ naghị ama mgbe a na-ejighịzi ha kpọrọ ihe.+

22 Ọ bụ naanị mgbe ọ nọ ndụ ka ihe na-afụ ya ụfụ.

Ọ bụ naanị mgbe ọ nọ ndụ ka ọ na-eru uju.”

15 Elifaz+ onye Timan kwuru, sị:

 2 “Onye ma ihe ọ̀ ga-ekwu ihe na-enweghị isi ma ọ sawa okwu,

Ka ọ̀ ga-eme ka echiche ọjọọ* ju n’obi ya?

 3 Ọ baghị uru iji okwu na-enweghị isi adọ mmadụ aka ná ntị,

Ikwu naanị okwu abaghịkwa uru ọ bụla.

 4 N’ihi na ị na-eme ka a ghara ịna-atụ egwu Chineke,

Ị na-emekwa ka ndị ọzọ ghara ịna-atụgharị uche n’ihe gbasara Chineke.

 5 N’ihi na ọ bụ mmehie gị mere i ji ekwu ihe ndị a,

Ọ bụkwa okwu e ji aghọgbu mmadụ ka ị họọrọ ikwu.

 6 Ọnụ gị na-ama gị ikpe, ọ bụghị m.

Okwu ọnụ* gị na-agbagide gị akaebe.+

 7 Ọ̀ bụ gị bụ mmadụ mbụ a mụrụ,

Ka è bu ụzọ mụọ gị tupu e kee ugwu?

 8 Ị̀ na-anụ okwu Chineke na-ekwu na nzuzo,

Ka ì chere na ọ bụ naanị gị ma ihe?

 9 Gịnị ka ị ma anyị na-amaghị?+

Gịnị ka ị ghọtara anyị na-aghọtaghị?

10 E nwere ma ndị isi awọ́ ma ndị agadi n’ime anyị,+

Bụ́ ndị tọkasịrị nna gị ahụ́.

11 Obi Chineke na-akasi gị

Ma ọ bụ okwu e ji nwayọọ gwa gị ó zughịrị gị?

12 Gịnị mere obi gị ji arafu gị?

Gịnịkwa mere i ji na-achakasị anya n’iwe?

13 N’ihi na ọ bụ Chineke ka ị na-ewesa iwe,

I kwekwara ka okwu ndị a si n’ọnụ gị na-apụta.

14 Gịnị ka mmadụ efu bụ nke mere aka ya ga-eji dị ọcha?

Oleekwa otú onye ọ bụla nwaanyị mụrụ ga-esi bụrụ onye ezi omume?+

15 Lee, ọ tụkwasịghị ndị nsọ ya obi,

Eluigwe adịghịdị ọcha n’anya ya,+

16 Ma ya fọdụzie mmadụ nke na-eme ihe rụrụ arụ, onye ọ kpọkwara asị,+

Onye na-aṅụ ajọ omume ka mmiri.

17 M ga-agwa gị ya. Gee m ntị.

M ga-akọ ihe m hụrụ,

18 Ihe ndị ma ihe kọrọ,+

Ihe ndị nna ha kọọrọ ha, nke ha na-ezochighị ezochi.

19 Ọ bụ naanị ha ka e nyere ala,

E nweghịkwa onye mbịarambịa batara n’ala ha.

20 Onye ajọ omume nke dị aka ike na-ata ahụhụ n’ụbọchị ndụ ya niile.

Ọ na-ata ahụhụ n’afọ niile ọ nọ ndụ.

21 Ntị ya na-anụ ụda na-emenye ụjọ.+

N’oge udo, ndị na-ebukọrọ ihe mmadụ na-abịa na nke ya.

22 O kwetaghị na ya ga-esi n’ọchịchịrị pụta.+

Mma agha na-echere ya.

23 Ọ na-agagharị na-achọ nri,* na-asị: “Olee ebe ọ dị?”

Ọ ma nke ọma na ụbọchị ọchịchịrị ga-agbachibido ya dị nso.

24 Ụjọ ga na-atụ ya n’ihi ahụhụ ọ na-ata na nsogbu ọ nọ na ya.

Ahụhụ na nsogbu na-emesi ya ike otú eze nke jikeere ịlụ agha si emesi ndị iro ya ike.

25 N’ihi na ọ na-eweli aka ya ka ọ maa Chineke aka,

Ọ na-achọkwa igosi na ọ ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ike.

26 O buuru nnukwu ọta ya siri ike,

Mere isi ike gawa ka ọ maa ya aka.

27 Abụba juru ya ihu,

Úkwù ya makwara abụba.

28 O bi n’obodo dị iche iche a ga-ebibi ebibi,

N’ụlọ ndị a na-enweghị onye ga-ebi na ha,

Bụ́ ndị ga-aghọ ikpo nkume.

29 Ọ gaghị aba ọgaranya. Akụ̀ ya agaghị ebukwu ibu,

Ihe ndị o nwere agaghịkwa adịrị gawa.

30 Ọ gaghị esi n’ọchịchịrị pụta.

Ire ọkụ ga-eme ka ome ya* kpọnwụọ,

Ikuku nke si n’ọnụ Chineke* ga-eburu ya bufuo.+

31 Ka ọ ghara iduhie onwe ya ma tụkwasị ihe na-abaghị uru obi,

N’ihi na ihe ọ ga-enweta na ya agaghị aba uru.

32 Ihe a ga-eme ya n’oge na-adịghị anya.

Alaka ya agaghịkwa ama pokopoko.+

33 Ọ ga-adị ka osisi vaịn nke na-enwopụsị mkpụrụ ya na-achaghị acha,

Dịkwa ka osisi oliv nke ifuru ya na-adapụsị.

34 N’ihi na ebe ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke* na-ezukọ tọgbọ chakoo,+

Ọkụ ga-erepịakwa ụlọikwuu ndị na-anara aka azụ.*

35 Ha na-akpa nkata ọjọọ n’obi ha nke na-eme ka ha na-eme ihe ọjọọ.

Ihe ha na-eche mgbe niile bụ otú ha ga-esi aghọ aghụghọ.”

16 Job kwuru, sị:

 2 “Anụbuola m ọtụtụ ihe yiri ihe ndị a.

Kama unu ga-akasi m obi, unu na-akpatakwuru m nsogbu.+

 3 Okwu na-enweghị isi ọ̀ na-agwụkwa agwụ?

Gịnị mere i ji ekwu okwu otú a?

 4 A sị na ọ bụ unu ka ihe a mere m mere,

M nwere ike ikwu okwu otú unu si ekwu,

M nwekwara ike ịkatọ unu,

Fufeekwara unu isi.+

 5 Ma kama ime otú ahụ, m ga-eji okwu ọnụ m gbaa unu ume.

M ga-agwa unu okwu ga-akasi unu obi ka unu nwetatụ ume.+

 6 Ọ bụrụ na m kwuo okwu, ọ naghị eme ka ahụ́ kwụsịtụ igbu m mgbu,+

Ọ bụrụkwa na mụ akwụsị ikwu okwu, ọ̀ na-eme ka ahụ́ kwụsịtụ igbu m mgbu?

 7 Ma ugbu a, Chineke emeela ka ike gwụ m.+

O bibiela ezinụlọ m niile.*

 8 I jichikwara m, o wee bụrụ ihe akaebe,

Nke mere na ahụ́ m tara na-agbagide m akaebe.

 9 O ji iwe ya dọrisie m, ọ na-ebukwara m iwe n’obi.+

Ọ na-ata ikikere ezé n’ihi iwe ọ na-ewesa m.

Onye iro m na-ele m anya ọjọọ.+

10 Ha emegheela ọnụ ha ka ha loo m.+

Ha amaala m ụra na ntì ma jiri m mee ihe ọchị.

Ha agbakọtala n’ìgwè ka ha mesie m ike.+

11 Chineke enyefeela m n’aka ụmụ okorobịa,

Ọ tụbakwala m n’aka ndị ajọ omume.+

12 M tụsaara ahụ́, ma ọ kụriri m.+

O jidere m n’azụ olu m gwerie m.

O lekwasịrị m anya ka ọ taa m ahụhụ.

13 Ndị na-agbara ya ụta gbara m gburugburu.+

Ọ gbapuola akụrụ m,+ o meteghịkwara m ebere.

Ọ wụpụla elo* m n’ala.

14 Ọ na-etipusị m ahụ́ otú e si etipu mgbidi.

Ọ na-eji ọsọ abịa alụso m ọgụ ka onye agha.

15 Adụkọtala m ákwà iru uju ka m jiri ya kpuchie ahụ́ m.+

Ùgwù* m alaala nke na m na-anọzi n’ájá.*+

16 Ihu m na-achazi ọbara ọbara n’ihi ákwá m na-ebe,+

Oké ọchịchịrị agbachiekwala mbubere anya m,

17 N’agbanyeghị na e nweghị ihe ọjọọ m mere,

M jikwa obi ọcha ekpe ekpere.

18 Ala, biko, ekpuchila ọbara m.+

Ka a gharakwa inwe ihe ga-eme ka ákwá m na-ebe kwụsị.

19 Ma ugbu a, onye na-agbara m akaebe nọ n’eluigwe.

Onye nwere ike ịgbara m akaebe nọ n’ebe dị n’elu.

20 Ndị enyi m na-achị m ọchị+

Mgbe m na-ebesara Chineke ákwá.*+

21 Ka mmadụ kpeere mụ na Chineke ikpe,

Otú mmadụ si ekpere mmadụ na ibe ya ikpe.+

22 N’ihi na ọ bụ afọ ole na ole fọrọ,

M ga-agakwa ebe ọ ga-abụ m gaa, agaghịzi m alọghachi.+

17 “Obi agbawaala m. Anwụọla m anwụọ.

Ili na-echere m.+

 2 Ndị na-akwa mmadụ emo gbara m gburugburu,+

Anya m na-elekwa otú ha si enupụ isi.

 3 Biko, kwe m nkwa na ị ga-akwado m.

È nwere onye ọzọ ga-enyere m aka?+

 4 N’ihi na i meela ka ha ghara ịna-aghọta ihe.+

Ọ bụ ya mere na ị naghị ebuli ha elu.

 5 Ha nwere ike ịgwa ndị enyi ha ka ha na ha kee ihe ndị ha nwere,

Ma agụụ ana-eme ka ụmụ ha ghara ịhụcha ụzọ.

 6 O meela ka m bụrụ onye ndị mmadụ ji eme ihe ọchị,*+

Mụ abụrụzie onye ha na-agbụ asọ mmiri n’ihu.+

 7 Uju m na-eru emeela ka anya m na-ahụzi inyoghi inyoghi.+

Aka m abụọ na ụkwụ m abụọ adịghịzi otú ha dịbu.

 8 Ndị ezi omume kporopụrụ anya na-ele ihe a na-emenụ,

Obi na-ajọkwa onye aka ya dị ọcha njọ n’ihi ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke.*

 9 Onye ezi omume anaghị akwụsị ime ezi omume.+

Onye aka ya dị ọcha na-esikwu ike.+

10 Ma, unu niile nwere ike ịbịa malitekwa ịrụ ụka,

N’ihi na ahụbeghị m onye ma ihe n’ime unu.+

11 Ndụ m agwụla agwụ.+

A kụghasịala ihe ndị dị m n’obi m chọrọ ime.+

12 Ha na-agbanwe abalị ka ọ bụrụ ehihie,

Na-asị, ‘Ebe ọ bụ na ọchịchịrị agbaala, chi abọwala.’

13 Ọ bụrụ na mụ echere, m ga-agazi biri n’ili.*+

M ga-agbasa ihe ndina m* n’ọchịchịrị.+

14 M ga-eji oké olu gwa olulu,*+ sị, ‘Ị bụ nna m!’

Gwakwa ikpuru, sị, ‘Ị bụ nne m na nwanne m nwaanyị!’

15 Oleezi ebe olileanya m dị?+

Ònye chere na m nwere olileanya?

16 Ọ* ga-agbada banye n’ọnụ ụzọ ili,* bụ́ nke e mechiri emechi,

Mgbe anyị niile ga-agbadakọta n’ájá.”+

18 Bildad+ onye Shua kwuru, sị:

 2 “Olee mgbe unu* ga-akwụsị ụdị okwu a unu na-ekwu?

Gositụnụ na unu na-aghọta ihe ka anyị nwee ike ikwu okwu.

 3 Gịnị mere unu ga-eji were anyị ka anụmanụ,+

Na-elekwa anyị anya ka ndị iberiibe?*

 4 Ọ bụrụgodị na iwe ị na-ewe emee ka ị dọrie onwe gị,*

À ga-agbapụrụ gị n’ụwa,

Ka oké nkume ọ̀ ga-esi n’ebe ọ dị pụọ?

 5 N’eziokwu, a ga-emenyụ ọkụ onye ajọ omume,

Ire ọkụ ya agaghịkwa enwu.+

 6 Ọkụ nke na-enwu n’ụlọikwuu ya ga-agba ọchịchịrị,

A ga-afụnyụkwa ọkụ* o konyere n’ụlọikwuu ya.

 7 A ga-eme ka otú o si azọsi ụkwụ ike n’ala belata,

Atụmatụ ya ga-emekwa ka ọ daa.+

 8 N’ihi na ụkwụ ya ga-eduba ya n’ụgbụ.

Ọ ga-agara banye na ya.

 9 Ọnyà ga-ama ya n’ikiri ụkwụ.

Ọnyà ga-ejide ya.+

10 E zoro ụdọ n’ala ka e jiri ya jide ya,

E sikwara ọnyà n’ebe o si agafe.

11 Ihe niile gbara ya gburugburu na-emenye ya ụjọ,+

Ụjọ na-emekwa ka ọ nọrọ n’ọsọ mgbe niile.

12 Ike na-agwụ ya,

Ọdachi+ ga-emekwa ka ọ na-adagharị.*

13 Ọrịa na-eri akpụkpọ ahụ́ ya.

Ọrịa kacha njọ na-erichapụ aka ya na ụkwụ ya.

14 A ga-esi n’ụlọikwuu ya, bụ́ ebe obi ruru ya ala, kpụpụta ya+

Kpọgara ya eze kacha emenye mmadụ ụjọ.*

15 Ndị ọbịa* ga-ebi n’ụlọikwuu ya.

A ga-eji ọkụ* bibie ụlọ ya.+

16 Mgbọrọgwụ ya ga-akpọ nkụ n’ime ala,

Alaka ya ga-akpọnwụkwa.

17 A gaghị na-echeta ya n’ụwa,

A gaghịkwa ama aha ya* n’okporo ámá.

18 A ga-esi n’ìhè chụba ya n’ọchịchịrị,

A ga-achụpụkwa ya n’ụwa.

19 Ọ gaghị enwe ụmụ na ụmụ ụmụ n’ebe ndị obodo ya bi,

E nweghịkwa onye ga-afọrọ ya ndụ n’ebe o bi.*

20 N’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ya, akpata oyi ga-awụ ndị nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ,

Egwu ga-ejidekwa ndị nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ.

21 Ọ bụ ihe na-eme ụlọikwuu onye na-eme ihe ọjọọ,

Ọ bụkwa ihe na-eme ụlọ onye na-amaghị Chineke.”

19 Job wee sị:

 2 “Olee mgbe unu ga-akwụsị ịkpasu m* iwe,+

Kwụsịkwa ikwu ihe na-agbawa m obi?+

 3 Unu abaarala m mba* ugboro iri ugbu a.

Ihere anaghị eme unu na unu na-emesi m ike.+

 4 Ọ bụrụgodị na m mere mmehie,

Ọ bụ n’isi m ka mmehie m dị.

 5 Ọ bụrụ na unu ana-ebuli onwe unu elu,

Na-ekwu na ihere nsogbu m nọ na ya na-ebutere m kwesịrị m,

 6 Marazienụ na ọ bụ Chineke duhiere m,

O jirikwala ụgbụ o ji achụ nta jide m.

 7 M na-eti mkpu n’ihi ahụhụ m na-ata, ma e nweghị onye na-aza m.+

M na-arịọ ka e nyere m aka, ma e nweghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi.+

 8 O ji nkume rụchie mgbidi n’ebe m si agafe, enweghịkwa m ike ịgafe.

O meekwala ka ọchịchịrị gbachie okporo ụzọ m.+

 9 O meela ka m gharazie inwe ùgwù,

Kpupụkwa m okpueze n’isi.

10 O si n’akụkụ niile na-akụrisị m ruo mgbe ọ lara m n’iyi.

Ọ na-eme ka m ghara inwe olileanya otú osisi e fopụrụ efopụ na-enweghị olileanya.

11 Ọ na-ewesa m iwe dị ọkụ,

Ọ na-ewerekwa m ka onye iro ya.+

12 Ndị agha ya abịakọtala ka ha lụso m agha,

Ha gbakwara ụlọikwuu m gburugburu.

13 Ọ chụpụla ụmụnne m ka ha nọrọ m n’ebe dị anya,

Ndị ma m esila n’ebe m nọ pụọ.+

14 Ezigbo ndị enyi* m ahapụla m,

Ndị m ma nke ọma echefuokwala m,+

15 Ndị bịara n’ụlọ m+ na ndị ohu m nwaanyị weere m ka onye mbịarambịa.

Abụ m onye mba ọzọ n’anya ha.

16 M na-akpọ onye na-ejere m ozi òkù, ma ọ naghị aza m.

Eji m ọnụ m na-arịọ ya ka o metere m ebere.*

17 Ume m na-ekupụta na-asọzi nwunye m oyi,+

M na-esikwa ụmụnne m* ísì ọjọọ.

18 Ụmụaka kpọdịrị m asị.

M bilie ọtọ, ha na-amalite iji m eme ihe ọchị.

19 Ezigbo ndị enyi m niile kpọrọ m asị,+

Ndị m hụrụ n’anya bụzi ndị iro m.+

20 Abụzi m ọkpụkpụ ọkpụkpụ.+

Ejisiri m ike gbanahụ ọnwụ.*

21 Ndị enyi m, meerenụ m ebere, meerenụ m ebere,

N’ihi na Chineke ebiela m aka.+

22 Gịnị mere unu ji na-akpagbu m otú Chineke si akpagbu m,+

Na-emesi m ike n’akwụsịghị akwụsị?+

23 Ọ gaara amasị m ma a sị na e dere okwu m ede,

Ma a sị na e dere ya n’akwụkwọ.

24 Ọ gaara amasị m ma a sị na e ji mkpịsị ígwè na nkume led*

Denye ya n’oké nkume ruo mgbe ebighị ebi.

25 N’ihi na o doro m anya na onye mgbapụta m+ dị ndụ.

Ọ ga-emecha bịa guzoro n’elu ụwa.*

26 Mgbe e si otú a mebichaa akpụkpọ ahụ́ m

N’oge m ka nọ ndụ, m ga-ahụ Chineke,

27 Bụ́ onye m ga-ahụ,

Onye anya m ga-ahụ, ọ bụghị anya onye ọzọ.+

Ma, adaala m mbà n’obi.*

28 N’ihi na unu na-asị, ‘Olee otú anyị si na-akpagbu ya?’+

Ebe ọ bụ na nsogbu m si m n’aka.

29 Tụọnụ egwu mma agha,+

N’ihi na mma agha na-ata onye mere mmehie ahụhụ.

Unu kwesịrị ịma na e nwere onyeikpe.”+

20 Zofa+ onye Neama kwuru, sị:

 2 “Obi ezughị m ike, obi erughịkwa m ala.

Ọ bụ ya mere m ji chọọ ikwu okwu.

 3 Anụla m mba a baara m, nke e ji kparịa m.

Ihe m ghọtara na-emekwa ka m saa gị okwu.

 4 O doro anya na ị ma ihe a kemgbe,

N’ihi na ọ dị otú a kemgbe e kere mmadụ,*+

 5 Na mkpu ọṅụ ndị ajọ omume na-eti anaghị adịte aka,

Nakwa na ọ bụ naanị obere oge ka onye na-anaghị asọpụrụ Chineke* na-aṅụrị ọṅụ.+

 6 Ọ bụrụgodị na mpako ya ruru n’eluigwe,

Isi ya ana-emetụkwa n’ígwé ojii,

 7 Ọ ga-ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi otú nsị ya si ala n’iyi.

Ndị na-ahụbu ya ga-asị, ‘Olee ebe ọ nọ?’

 8 A ga-echefu ya otú e si echefu nrọ.

A ga-echefu ya otú e si echefu ọhụụ a hụrụ n’abalị.

 9 Anya hụburu ya agaghị ahụ ya ọzọ,

A gaghịkwa ahụ ya ọzọ n’ụlọ ya.+

10 Ụmụ ya ga-arịọ ndị ogbenye ka ha meere ha amara,

Ọ ga-ejikwa aka ya nyeghachi ndị ọzọ akụ̀ ọ naara ha.+

11 Ike okorobịa juru ya ahụ́,

Ma ike ka ga-eju ya n’ahụ́ ya anwụọ.

12 Ọ bụrụ na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ n’ọnụ,

Ọ bụrụ na o zoo ya n’okpuru ire ya,

13 Ọ bụrụ na ọ kpụrụ ya n’ọnụ ya,

Ya ana-atọ ya ụtọ, ọ chọghịkwa ilo ya ngwa ngwa,

14 Nri ahụ ga-agba ụka n’ime afọ ya.

Ọ ga-adị ka elò agwọ ubí n’ime ahụ́ ya.

15 O loola akụnụba, ma ọ ga-agbọpụta ya.

Chineke ga-eme ka o si n’afọ ya pụta.

16 Ọ ga-amịrị elò agwọ ubí.

Ajụala ga-eji ezé ya tagbuo ya.*

17 Ọ gaghị ahụ mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi,

Bụ́ ndị na-asọ ka iyi.

18 Ọ ga-eweghachi akụ̀ ọ kpatara, n’erighị ya eri.

Ọ gaghị eri akụ̀ ọ na-akpata n’ahịa ọ na-azụ.+

19 N’ihi na o chiela ndị ogbenye ọnụ n’ala, gbahapụkwa ha.

O werela ụlọ ọ na-abụghị ya rụrụ.

20 Ma obi agaghị ezu ya ike.

Akụnụba ya agaghị azọpụta ya.

21 E nweghị ihe ọ ga-anapụ mmadụ.

Ọ bụ ya mere na ihe agaghị anọ na-agara ya nke ọma.

22 Mgbe akụnụba ya ga-eju ebe niile, ọ ga-echegbuwe onwe ya.

Ihe ọjọọ niile ga-abịara ya.

23 Mgbe ọ na-eri ihe ka o rijuo afọ,

Chineke* ga-ewesa ya ezigbo iwe,

Mee ka iwe ya zuo ya ahụ́ ka ebe mmiri mazuru mmadụ ahụ́.

24 Mgbe ọ na-agbapụ ka ngwá agha ndị e ji ígwè rụọ ghara imerụ ya ahụ́,

Ụta e ji ọla kọpa rụọ ga-agbapu ya ahụ́.

25 Ọ na-efopụ ụta a gbara ya n’azụ,

Ụta na-egbu maramara a gbara ya n’elo* ya.

Ụjọ na-ejide ya.+

26 A ga-awụfu akụnụba ya niile n’ebe gbara oké ọchịchịrị.

Ọkụ a na-enweghị onye fụnwuru ya ga-eregbu ya.

Ọdachi ga-abịara onye ọ bụla fọrọ ndụ n’ụlọikwuu ya.

27 Eluigwe ga-ekpughe mmehie ya.

Ụwa ga-emegide ya.

28 Idei mmiri ga-ebupụ ụlọ ya.

Mmiri ga-ezosi ike n’ụbọchị iwe Chineke.*

29 Ọ bụ ihe a ka onye ajọ omume ga-eketa n’aka Chineke.

Ọ bụ ihe Chineke kwuru na a ga-ekenye ya.”

21 Job wee sị:

 2 “Geenụ ntị nke ọma n’ihe m na-ekwu,

Ka ọ bụrụ otú unu ga-esi kasie m obi.

 3 Nweerenụ m ndidi ka m kwuo okwu.

M kwuchaa, unu nweziri ike ịkwa m emo.+

 4 Ọ̀ bụ mmadụ ka m na-ekpesara?

Ọ bụrụ na ọ bụ mmadụ, ọ̀ bụ na ike inwe ndidi agaghị agwụ m?

 5 Lewenụ m anya, ka akpata oyi wụọkwa unu n’ahụ́.

Kpuchienụ aka n’ọnụ.

 6 M chewe banyere ya, obi anaghị ezu m ike,

Ahụ́ m niile na-amakwa jijiji.

 7 Gịnị mere ndị ajọ omume ji adị ndụ,+

Kaa nká, baakwa ọgaranya?*+

 8 Ha na-ahụ ka ụmụ ha na-eto ghọọ mmadụ,

Ha na-ahụkwa ụmụ ụmụ ha.

 9 Udo na-adị n’ụlọ ha. Ụjọ anaghị atụ ha,+

Chineke anaghịkwa ata ha ahụhụ.

10 Oké ehi ha na-agba nne ehi n’enweghị nsogbu ọ bụla.

Nne ehi ha na-amụ ụmụ, ime anaghịkwa apụ ha.

11 Ụmụaka ha ndị nwoke na-agbagharị n’èzí otú ewu na atụrụ si agbagharị,

Ụmụ ha na-awụgharịkwa.

12 Ha na-eji obere ịgbà na ụbọ akwara agụ egwú,

Na-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe ha na-anụ ụda ọjà.+

13 Ha na-enwe obi ụtọ n’oge niile ha dị ndụ,

Ha na-anwụkwa n’udo,* e lie ha n’ili.*

14 Ma ha na-asị ezi Chineke, ‘Hapụ anyị aka!

Anyị achọghị ịma ihe i nyere n’iwu.*+

15 Ònye bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nke mere anyị ga-eji fee ya?*+

Olee uru anyị ga-erite ma anyị na ya dịrị ná mma?’+

16 Ma ama m na ọ bụghị ha na-eme ka ihe na-agaziri ha.+

Anaghị m eche echiche otú ndị ajọ omume si eche.+

17 Ugboro ole ka e menyụrụla ọkụ* ndị ajọ omume?+

Ugboro ole ka ọdachi na-abịara ha?

Ugboro ole ka Chineke jitụrụla iwe bibie ha?

18 È nwere mgbe ha na-adị ka ahịhịa ọka* ifufe na-ebugharị,

Ma ọ̀ bụ ka mkpo ọka oké ifufe na-ebupụ?

19 Ọ bụrụ na mmadụ emee ihe ọjọọ, Chineke ga-ata ụmụ ya ahụhụ ihe o mere.

Ma ka Chineke kwụọ ya ụgwọ ihe o mere ka ọ hụ ya.+

20 Ka o jiri anya ya hụ otú a ga-esi laa ya n’iyi,

Ka ọ bụrụkwa ya ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-ewesa iwe ya.*+

21 N’ihi na ọ bụrụ na ọ nwụchuo ọnwụ,

È nwere ihe na-eme n’ụlọ ya ka gbasara ya?+

22 È nwere onye ga-akụziri Chineke ihe,+

Ebe ọ bụ Chineke na-ekpe ndị kacha elu ikpe?+

23 Otu onye na-anwụ mgbe ike ndụ ka juru ya ahụ́,+

Mgbe ọ na-enweghị ihe ọ bụla na-echegbu ya nakwa mgbe obi ruru ya ala,+

24 Mgbe apata ụkwụ ya bụ abụba abụba,

Mgbe ọkpụkpụ ya ka gbasikwara ike.*

25 Ma onye ọzọ na-atagide ahụhụ nwụọ,

N’enweghị mgbe o kporiri ndụ.

26 Ha abụọ ga-alaghachi n’ájá,+

Ikpuru ga-ekpuchikwa ha abụọ.+

27 Lee, ama m ihe unu na-eche,

Marakwa atụmatụ unu chọrọ iji mesie m ike.+

28 N’ihi na unu na-asị, ‘Oleezi ụlọ onye ahụ a ma ama?

Oleekwa ụlọikwuu onye ajọ omume bibu?’+

29 Ọ̀ bụ na unu ajụbeghị ndị na-aga ebe dị iche iche ase?

Ọ̀ bụ na unu anaghị echebara ihe ndị ha chọpụtara echiche nke ọma,

30 Na a na-ahapụ onye ọjọọ ndụ n’ụbọchị ọdachi,

Napụtakwa ya n’ụbọchị oké iwe?

31 Ònye ga-ajụ ya ajụjụ maka ihe ọ na-eme?

Ònyekwa ga-akwụ ya ụgwọ ihe o mere?

32 Mgbe a na-ebuga ya n’ebe a ga-eli ya,

A ga-eche ili ya nche.

33 Ájá ndị e ji kpochie ya ga-atọ ya ụtọ,+

Mmadụ niile na-esorokwa ya n’azụ*+

Ka imirikitiimi ndị bu ya ụzọ.

34 Gịnịzi mere unu ji jiri okwu na-enweghị isi na-akasi m obi?+

Ihe niile unu na-aza m bụ ụgha.”

22 Elifaz+ onye Timan kwuru, sị:

 2 “È nwere uru mmadụ ga-abara Chineke?

È nwere uru onye nwere nghọta ga-abara ya?+

 3 Ọ̀ gbasara Onye Pụrụ Ime Ihe Niile* na ị bụ onye ezi omume?

Ka è nwere uru ọ na-erite na ị bụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta?*+

 4 Ọ̀ ga-ata gị ahụhụ

Ma kpọọ gị ikpe maka na ị na-asọpụrụ ya?

 5 Ọ̀ bụ na ọ bụghị maka na ihe ọjọọ ị na-eme karịrị akarị,

Mmehie gị anaghịkwa akwụsị akwụsị?+

 6 N’ihi na ị na-anara ụmụnne gị ihe ibé n’ihe ị na-ekwesịghị ịnara ihe ibé,

Ị na-eyipụkwa ndị mmadụ ákwà ha ka ha gbara ọtọ.*+

 7 Ị naghị enye onye ike gwụrụ mmiri ka ọ ṅụọ,

Ị naghịkwa enye onye agụụ na-agụ nri.+

 8 Ọ bụ onye ukwu nwe ala,+

Ọ bụkwa onye a hụrụ n’anya na-ebi na ya.

 9 Ma ị gbawara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ aka sị ha lawa,

I mesikwara ụmụ na-enweghị nna* ike.

10 Ọ bụ ya mere e ji siere gị ọnyà* gburugburu,+

Ụjọ na-atụkwa gị na mberede.

11 Ọ bụ ya mere ọchịchịrị ji gbachie nke na ị naghị ahụ ụzọ,

Idei mmiri ekpuchiekwa gị.

12 Ọ̀ bụ na Chineke anọghị n’ebe kacha elu n’eluigwe?

Lee, kpakpando niile dịkwa ezigbo elu.

13 Ma ị sịrị: ‘Gịnịdị ka Chineke ma?

Urukpuru ọ̀ ga-ekwe ya hụ ụzọ kpee ikpe?

14 Ígwé ojii na-anọchi ya nke mere na ọ naghị ahụ ụzọ

Ka ọ na-agagharị gburugburu eluigwe.’

15 Ị̀ ga-esoro ụzọ ochie

Nke ndị ajọ omume jere ije na ya,

16 Ndị ọnwụ gburu tupu oge ha eruo

Otú idei mmiri* si ebupụ ntọala ụlọ?+

17 Ha nọ na-asị ezi Chineke: ‘Hapụ anyị aka!’

Na-asịkwa, ‘Gịnị ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-eme anyị?’

18 Ma, ọ bụ ya mere ka ihe ndị dị mma ju n’ụlọ ha.

(Anaghị m eche ụdị ihe ọjọọ a n’obi m.)

19 Onye ezi omume ga-ahụ ihe a ṅụrịa ọṅụ.

Onye aka ya dị ọcha ga-akwa ha emo, sị:

20 ‘E bibiela ndị iro anyị,

Ọkụ ga-erechapụkwa ihe fọrọ na ha.’

21 Mata onye Chineke bụ, gị na ya ga-adị ná mma.

Ihe ọma ga-eruzi gị aka.

22 Nabata iwu si n’ọnụ ya,

Ka ihe o kwuru dịrịkwa n’obi gị.+

23 Ọ bụrụ na ị lọghachikwuru Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ihe ga-adịghachiri gị ná mma.+

Ọ bụrụ na i wepụ ajọ omume n’ụlọikwuu gị,

24 Ọ bụrụ na ị ga-atụnye ọlaedo gị n’ájá,

Tụbakwa ọlaedo kacha mma*+ ná nnukwu nkume ndị dị na ndagwurugwu,

25 Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-abụziri gị ọlaedo,

Ọ ga-abụkwara gị ọlaọcha kacha mma.

26 Ị ga na-enwezi obi ụtọ maka na gị na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile dị ná mma,

Ị ga-ewelikwa ihu gị lee Chineke.

27 Ị ga-arịọsi ya arịrịọ ike. Ọ ga-anụ olu gị.

Ị ga-emezukwa nkwa i kwere.

28 Ihe ọ bụla i kpebiri ime ga-aga nke ọma,

Ìhè ga na-enwukwa n’ụzọ gị.

29 N’ihi na a ga-eweda gị ala ma i kwuo okwu na-egosi na ị dị mpako.

Ma ọ ga-azọpụta onye dị umeala n’obi.

30 Ọ ga-anapụta ndị na-enweghị ihe ha mere.

N’ihi ya, ọ bụrụ na aka gị dị ọcha, ọ ga-anapụta gị.”

23 Job wee sị:

 2 “Taa, m ka ga-esi ọnwụ gwa unu otú obi dị m.+

Ike agwụla m n’ihi ude m na-asụ.

 3 A sị nnọọ na m ma ebe m ga-ahụ Chineke,+

M ga-aga n’ebe o bi.+

 4 M ga-anọ n’ihu ya kwuo otú o si bụrụ na aka m dị ọcha,

M ga-ekwukwa ọtụtụ ihe iji zara ọnụ m.

 5 M ga-anụ ihe ọ ga-asa m,

Marakwa ihe ọ ga-agwa m.

 6 Ọ̀ ga-ekwuchi m ọnụ maka na ike ya dị ukwuu?

Mbanụ! N’eziokwu, ọ ga-ege m ntị.+

 7 N’ebe ahụ ka ya na onye ezi omume ga-edozi okwu,

Onyeikpe m ga-ekwukwa na ikpe amaghị m.

 8 Ma ọ bụrụ na m gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ, ọ gaghị anọ n’ebe ahụ.

M lọghachikwa, agaghị m ahụ ya.

 9 Ọ nọrọ n’aka ekpe na-arụ ọrụ, enweghị m ike ịhụ ya.

Ọ tụgharịa gaa n’aka nri, anaghịkwa m ahụ ya.

10 Ma ọ ma na m na-aga n’ụzọ dị mma.+

Ọ nwalechaa m, m ga-adịzi ka ezigbo ọlaedo.+

11 Ụkwụ m na-esochi nzọụkwụ ya anya.

Ahapụghịkwa m ụzọ ya gawa ebe ọzọ.+

12 Akwụsịghị m idebe iwu si ya n’ọnụ.

Eji m ihe ndị o kwuru kpọrọ ihe+ karịadị otú a chọrọ ka m mee.

13 O kpebie ime ihe, ònye ga-egbochili ya?+

Ọ* chọọ ime ihe, ọ na-eme ya.+

14 N’ihi na ọ ga-emecha m ihe niile o kpebiri ime m,

E nwekwara ọtụtụ ihe yiri ihe ndị a bụ́ ndị ọ chọrọ ime m.

15 Ọ bụ ya mere m ji echegbu onwe m ma m cheta Chineke.

M chewe banyere ya, egwu na-atụkwu m.

16 Chineke emeela ka obi na-amapụ m,

Onye Pụrụ Ime Ihe Niile emeekwala ka ụjọ na-atụ m.

17 Ma ọchịchịrị emebeghị ka m gba nkịtị,

Itiri gbachiri m ihu emebeghịkwa ka m gba nkịtị.

24 “Gịnị mere na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ekpebibeghị oge ọ ga-ekpe ikpe?+

Gịnị mere na ndị ma ya anaghị ahụ ụbọchị ahụ?

 2 Ndị mmadụ na-ewela ihe e ji kpaa ókè azụ.+

Ha na-ezuru ìgwè ewu na atụrụ ma duru ha gaa n’ebe anụmanụ ha na-ata ahịhịa.

 3 Ha na-akpụrụ jakị ụmụ na-enweghị nna,

Na-anarakwa nwaanyị di ya nwụrụ oké ehi ya ka ọ bụrụ ihe ibé maka ego ha binyere ya.+

 4 Ha na-enupụ ndị ogbenye n’ụzọ.

Ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka na-ezo ezo ma ha hụ ha.+

 5 Ndị ogbenye na-achọgharị nri ka jakị ọhịa+ ndị nọ n’ala ịkpa.

Ha na-aga n’ọzara achọ nri ụmụ ha ga-eri.

 6 Ọ bụ n’ubi onye ọzọ ka ha na-aga enweta nri.*

Ha na-aga n’ubi vaịn onye ajọ omume atụtụkọ ihe e wefọrọ ewefọ.

 7 Ha na-agba ọtọ ehi ụra abalị, n’eyighị uwe.+

Ha enweghị ákwà ha ji achụ oyi.

 8 Mmiri nke na-ezo n’ugwu na-ede ha ahụ́.

Ha na-anọrọ n’akụkụ oké nkume maka na ha enweghị ebe ha ga-agbaba.

 9 A na-esepụ nwa na-enweghị nna ọnụ n’ara.+

A na-achịrị uwe ndị ogbenye ka ọ bụrụ ihe ibé maka ego e binyere ha,+

10 Nke na-eme ka ha gbara ọtọ na-ejegharị, n’eyighị uwe,

Agụụ ana-agụkwa ha ka ha na-ebu ùkwù ọka.

11 Ha na-anọ n’anwụ arụgbu onwe ha n’ọrụ n’agbata obere mgbidi ndị a rụrụ n’ubi ndị dị ná mkpọda ugwu.*

Ha na-azọchapụta mmanya, ma akpịrị na-akpọ ha nkụ.+

12 Ndị na-anwụ anwụ na-asụ ude n’obodo.

Ndị* merụrụ ezigbo ahụ́ na-ebe ákwá ka e nyere ha aka.+

Ma Chineke anaghị ewere ihe a ka ihe na-ekwesịghị ekwesị.*

13 E nwere ndị kpọrọ ìhè asị.+

Ha amaghị ụzọ ya,

Ha anaghịkwa aga n’ụzọ ya.

14 Onye na-egbu mmadụ na-ebili n’isi ụtụtụ.

Ọ na-egbu ogbenye nakwa onye na-enweghị onye na-enyere ya aka.+

Ma n’abalị, ọ na-aga ohi.

15 Onye na-akwa iko na-eche ka mgbede ruo,+

Na-asị, ‘E nweghị onye ga-ahụ m.’+

Ọ na-ekpuchikwa ihu ya.

16 Ha na-akụka* ụlọ mgbe ọchịchịrị gbara ma banye na ha.

N’ehihie, ha na-akpọchibido onwe ha ụzọ.

Ha anaghị apụta mgbe ìhè dị.+

17 N’ihi na ụtụtụ na oké ọchịchịrị bụụrụ ha otu ihe.

Ụjọ oké ọchịchịrị anaghị atụ ha.

18 Ma mmiri na-ebufu ha ngwa ngwa.

A ga-abụ ala ha ketara ọnụ.+

Ha agaghị alọghachi n’ubi vaịn ha.

19 Otú oké ọkọchị na okpomọkụ si amịkọrọ mmiri snoo nke gbazere agbaze

Ka ili* si eri ndị mere mmehie.+

20 Nne ya* ga-echefu ya. Ikpuru ga-eri ya.

A gakwaghị echeta ya.+

A ga-egbutukwa ndị ajọ omume otú e si egbutu osisi.

21 Ha na-erigbu nwaanyị aga,

Na-emesikwa nwaanyị di ya nwụrụ ike.

22 Chineke* ga-eji ike ya bibie ndị ukwu.

Ọ bụ eziokwu na ha nwere ike ịgbago n’ọkwá, ha ejighị ndụ ha n’aka.

23 Chineke* na-ahapụ ha ka obi sie ha ike, obi eruokwa ha ala,+

Ma anya ya dị n’ihe niile ha na-eme.*+

24 A na-ebuli ha elu obere oge. E mechaa, ha anaghịzi anọ.+

A na-eweda ha ala,+ ha anwụọ otú onye ọ bụla ọzọ si anwụ.

A na-egbupụ ha otú e si egbupụ ụyọkọ ọka.*

25 Ugbu a, ònye ga-egosili na m bụ onye ụgha

Ma ọ bụ gbaghaa ihe m kwuru?”

25 Bildad+ onye Shua kwuru, sị:

 2 “Ọ bụ ya nwe ọchịchị, ọ dịkwa egwu.

Ọ na-eme ka udo dịrị n’eluigwe.*

 3 À na-agụtali ndị agha ya ọnụ?

È nwere onye ìhè ya na-anaghị enwuru?

 4 Oleezi otú mmadụ efu ga-esi bụrụ onye ezi omume n’anya Chineke,+

Ma ọ bụ, olee otú onye nwaanyị mụrụ ga-esi bụrụ onye aka ya dị ọcha?+

 5 Ọnwa anaghịdị etisi ike n’anya ya,

Kpakpando adịghịkwa ọcha n’anya ya,

 6 Ma ya fọdụzie mmadụ efu bụ́ ikpuru

Nakwa nwa nke mmadụ bụ́ idide.”

26 Job wee sị:

 2 “Legodị ụdị aka i nyeere onye ike na-adịghị.

Legodị otú i si zọpụta onye na-enweghị ume.+

 3 Legodị ọmarịcha ndụmọdụ i nyere onye na-amaghị ihe.+

Legodị otú i si gosi na ị ma nnọọ ihe.

 4 Ònye ka ị na-agbalị ịgwa okwu?

Ọ̀ bụkwa onye mere ka i kwuo ihe ndị a?

 5 Ndị nwụrụ anwụ enweghị ike ọ bụla, ha na-amakwa jijiji.

Ha nọdị n’ebe dị ala karịa osimiri na ihe ndị bi n’ime ya.

 6 Ili* ghe oghe n’anya Chineke,*+

Ọ na-ahụkwa ihe niile dị n’ebe mmadụ na-anọ erekasị.*

 7 Ọ na-agbasa mbara igwe nke dị n’ebe ugwu n’elu ebe tọgbọ chakoo,+

E nweghịkwa ihe o kokwasịrị ụwa na ya.

 8 Ọ na-eji ígwé ojii ya afụchi mmiri+

Otú ígwé ojii na-agaghị agbawa n’agbanyeghị otú mmiri si dị arọ.

 9 Ọ na-ekpuchi ocheeze ya ka a ghara ịhụ ya,

Jiri ígwé ojii ya sachie ya.+

10 Ọ na-akpara mbara igwe na osimiri ókè.+

Ọ na-akpara ìhè na ọchịchịrị ókè.

11 Ogidi ndị ji eluigwe na-ama jijiji.

Mba ọ na-aba na-eme ka egwu jide ha.

12 Ọ na-eji ike ya eme ka oké osimiri mee mkpọtụ.+

Ọ na-akụri nnukwu anụ mmiri* n’ihi nghọta o nwere.+

13 Ọ na-eji ume ọ na-ekupụ* eme ka mbara igwe gbachapụ agbachapụ.

Aka ya na-egwepịa agwọ siri ike njide.*

14 Lee, ihe ndị a bụ nnọọ obere ihe n’ihe ndị ọ na-eme.+

Naanị obere ihe nke yiri ihe a takwunyere atakwunye ka a nụrụla banyere ya.

Ònyezi ga-aghọtali otú o si eme ka égbè eluigwe ya dị egwu gbaa?”+

27 Job kwukwara, sị:

 2 “Eji m Chineke dị ndụ, bụ́ onye kpere m ikpe mkpegbu, na-aṅụ iyi,+

Eji m Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, bụ́ onye mewara m obi, na-aṅụ iyi+

 3 Na ebe ọ bụ na m ka na-eku ume,

Ebe ọ bụkwa na imi m ka na-ekuru ume si n’ebe Chineke nọ,+

 4 Ọnụ* m agaghị ekwu okwu ọjọọ ọ bụla.

Ire m agaghịkwa ekwu ihe ọ bụla ga-aghọgbu mmadụ.

 5 Agaghị m anwa anwa kpọọ unu ndị ezi omume.

Ruo mgbe m nwụrụ, m ga-ejisi Chineke aka ike.+

 6 M ka ga na-eme ezi omume, agaghịkwa m akwụsị.+

Obi m agaghị ama m ikpe* ná ndụ m niile.

 7 Ka onye iro m dịrị ka onye na-eme ihe ọjọọ.

Ka ndị na-alụso m ọgụ dịrị ka ndị ajọ omume.

 8 N’ihi na olee olileanya onye na-anaghị asọpụrụ Chineke* nwere ma e bibie ya,+

Ma Chineke napụ ya ndụ* ya?

 9 Chineke ọ̀ ga-anụ ákwá ya

Mgbe nsogbu ga-abịara ya?+

10 Ka ihe gbasara Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ọ̀ ga-amasị ya?

Ọ̀ ga na-arịọ Chineke arịrịọ mgbe niile?

11 M ga-akụziri unu gbasara ike Chineke.

Agaghị m ezoro unu ihe ọ bụla gbasara Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.

12 Ọ bụrụ na unu niile hụrụ ọhụụ,

Gịnị mere na okwu unu enweghị isi na ọdụ?

13 Ọ bụ ihe a ka onye ajọ omume ga-eketa n’aka Chineke.+

Ọ bụ ihe ndị aka ike ga-eketa n’aka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.

14 Ọ bụrụ na ụmụ ya adị ọtụtụ, a ga-eji mma agha gbuo ha,+

Ụmụ ụmụ ya agaghịkwa enwe nri ga-ezuru ha.

15 Ọrịa ọjọọ ga-egbu ndị ọ hapụrụ nwụọ, e lie ha,

Ndị nwunye ha agaghịkwa ebere ha ákwá.

16 Ọ bụrụgodị na ọ kpakọjuo ọlaọcha ka ájá,

Nwejuokwa ọmarịcha uwe ka ájá ụrọ,

17 Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ya gbara mbọ nweta ha,

Ọ bụ onye ezi omume ga-eyi ha.+

Ọ bụkwa ndị aka ha dị ọcha ga-eke ọlaọcha ya.

18 Ụlọ ọ rụrụ esighị ike otú ụlọ egu* na-anaghị esi ike,

Ọ dịkwa ka ụlọ ndò+ onye nche rụrụ.

19 Ọ ga-abụ ọgaranya laba ụra, ma akụnụba ya agaghịzi afọ.*

Mgbe ọ ga-emeghe anya ya, e nweghịzi ihe ga-afọ.

20 Ụjọ ga-ezu ya ahụ́ otú idei mmiri si erikpu mmadụ.

Oké ifufe ga-ebufu ya n’abalị.+

21 Ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-eburu ya. Ọ gaghịzi anọ.

Ọ ga-esi n’ebe o bi bupụ ya.+

22 Ọ ga-efekwasị ya n’emetereghị ya ebere+

Ka ọ na-agbalịsi ike ka ọ gbanahụ ya.+

23 Ọ ga-esi n’ebe o bi na-akụrụ ya aka iji kwaa ya emo,

Na-afụkwara ya mkpọrọhịhị.*+

28 “E nwere ebe a na-egwute ọlaọcha

Nakwa ebe a na-egwute ọlaedo a ga-anụcha anụcha.+

 2 A na-egwute ígwè n’ala,

A na-esikwa na nkume agbazeta ọla kọpa.+

 3 Mmadụ na-abanye n’ebe gbara ọchịchịrị.

Ọ na-abanye n’ime ime itiri na ọchịchịrị,

Na-achọ nkume ndị a dị oké ọnụ.

 4 Ọ na-egwunye ígwè n’ebe dị anya n’ebe ndị mmadụ bi,

N’ebe e chefuru echefu, n’ebe dị anya n’ebe ndị mmadụ na-agaru.

Ụfọdụ ndị na-eke onwe ha ụdọ rịba n’ime ala, ụdọ ejide ha ha ana-arụ ọrụ.

 5 Elu ala na-emepụta nri;

Ma n’okpuru ala, a na-emebisị ihe niile ka ebe e ji ọkụ na-emebisị ihe.*

 6 N’ebe ahụ ka nkume safaya dị,

Ọlaedo dịkwa n’ájá dị n’ebe ahụ.

 7 E nweghị nnụnụ na-eri anụ ma ụzọ e si aga na ya.

Anya égbé ojii ahụbeghị ebe ahụ.

 8 E nweghị anụ ọhịa na-akpa ike zọtụrụla ụkwụ na ya.

Ọdụm agatụbeghị na ya.

 9 Mmadụ na-akụrisị nkume siri ike.

Ọ na-esi na ntọala ugwu akwatu ugwu.

10 Ọ na-awara mmiri ụzọ+ n’oké nkume.

Anya ya na-ahụ ihe ọ bụla dị oké ọnụ.

11 Ọ na-eji ihe arụbichi ebe mmiri si asọpụta,

Ọ na-agbakwa ihe e zoro ezo n’anwụ.

12 Ma olee ebe a ga-achọta amamihe?+

Oleekwa ebe e si enweta nghọta?+

13 E nweghị mmadụ ma uru ọ bara,+

A naghịkwa ahụ ya n’ụwa.*

14 Mmiri miri emi na-asị, ‘Ọ dịghị n’ime m.’

Oké osimiri na-asịkwa, ‘Ọ bụghị m ji ya.’+

15 E nweghị ike iji ezigbo ọlaedo zụta ya,

E nweghịkwa otú a ga-atụru ọlaọcha jiri gbanweta ya.+

16 E nweghị ike iji ọlaedo kacha mma* zụta ya,+

Ma ọ bụkwanụ jiri nkume ọnịks na nkume safaya dị oké ọnụ zụta ya.

17 A gaghị ejili ọlaedo na enyo tụnyere ya.

E nweghịkwa ike iji arịa e ji ezigbo ọlaedo* mee gbanweta ya.+

18 A gaghịdị eji nkume kọral na nkume kristal tụnyere ya,+

N’ihi na akpa nke amamihe juru bara uru karịa nke nkume pel juru.

19 E nweghị ike iji nkume topaz+ si Kush tụnyere ya.

E nweghịdị ike iji ezigbo ọlaedo zụta ya.

20 Ma olee ebe amamihe si abịa?

Oleekwa ebe e si enweta nghọta?+

21 E zoro ya ezo ka anya ihe ọ bụla dị ndụ ghara ịhụ ya,+

Zookwa ya ka nnụnụ ghara ịhụ ya.

22 Mbibi na ọnwụ na-asị,

‘Naanị n’akụkọ ka ntị anyị nụrụ gbasara ya.’

23 Ọ bụ Chineke ghọtara otú a ga-esi chọta ya.

Naanị ya ma ebe o bi,+

24 N’ihi na anya ya na-eru na nsọtụ ụwa,

Ọ na-ahụkwa ihe niile dị n’ụwa.*+

25 Mgbe o nyere ifufe ikike ọ ga-eji na-efe*+

Ma tụọ otú mmiri dị iche iche ga-aha,+

26 Mgbe o mere iwu ga na-achị mmiri ozuzo,+

Waakwara oké mmiri ozuzo na égbè eluigwe ụzọ,+

27 Mgbe ahụ, ọ hụrụ amamihe ma kọwaa ya.

O mere ka amamihe dịrị, nwaleekwa ya.

28 O wee sị mmadụ:

‘Lee, ọ bụ ịtụ egwu Jehova bụ amamihe.+

Mmadụ iwepụ aka n’ihe ọjọọ bụkwa nghọta.’”+

29 Job kwukwara, sị:

 2 “Ọ dị m ka ya bụrụ na ihe a bụ ọnwa ndị garala aga,

N’oge Chineke na-eche m nche,

 3 Mgbe o mere ka ọkụ* ya na-acha m n’isi,

Mgbe m na-eji ìhè ya agafe n’ọchịchịrị,+

 4 Mgbe m ka bụ okorobịa,

Mgbe mụ na Chineke dị n’ezigbo mma,+

 5 Mgbe Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ka nọnyeere m,

Mgbe ụmụ m* gbara m gburugburu,

 6 Mgbe mmiri ara ehi juru n’ebe m na-azọ ụkwụ,

Oké nkume ana-agbapụtara m mmanụ ka mmiri.+

 7 Mgbe m na-agabu n’ọnụ ụzọ ámá obodo+

Ma nọrọ ọdụ n’ámá,+

 8 Ụmụ okorobịa na-ahụ m nye ohere.*

Ndị agadi na-ebilidị guzoro ọtọ.+

 9 Ndị isi anaghị ekwu okwu.

Ha na-ekpuchi aka n’ọnụ ha.

10 Ndị a ma ama gbachiri nkịtị.

Ire ha tapaara n’okpo ọnụ ha.

11 Onye ọ bụla nụrụ ihe m kwuru ga-ekwu okwu ọma banyere m,

Ndị hụkwara m ga-agbara m akaebe.

12 N’ihi na m na-anapụta ogbenye nke na-ebe ákwá ka e nyere ya aka,+

Na-anapụtakwa nwa na-enweghị nna na onye ọ bụla nke na-enweghị onye na-enyere ya aka.+

13 Onye m napụtara n’ọnụ ọnwụ ga-agọzi m,+

M mekwara ka obi dị nwaanyị di ya nwụrụ ụtọ.+

14 M yi ezi omume ka uwe.

Ikpe ziri ezi bụụrụ m uwe elu* na ákwà m na-eke n’isi.

15 Abụ m anya ndị ìsì ji ahụ ụzọ,

Bụrụkwa ụkwụ ndị ngwọrọ ji aga ije.

16 Abụụrụ m ndị ogbenye nna.+

M na-eleba anya n’ikpe gbasara ndị m na-amaghị.+

17 M na-akụwa onye na-eme ihe ọjọọ agba, onye dị ka anụ ọhịa nke jidere anụ ọ ga-eri.+

M na-anapụtakwa ndị o ji eji.

18 M na-asịbu, ‘M ga-anọ n’ụlọ m* nwụọ,+

Ụbọchị m ga-adịkwa ọtụtụ ka ájá dị n’ala.

19 M ga-adị ka osisi mgbọrọgwụ ya ga-agbasa banye na mmiri,

Nke igirigi ga-adịkwa n’alaka ya chi abọọ.

20 E nweghị mgbe a ga-akwụsị ịkwanyere m ùgwù,

M ga na-agbakwa ụta m ji n’aka n’akwụsịghị akwụsị.’

21 Ndị mmadụ ga-ege ntị ka ha nụ ihe m ga-ekwu.

Ha ga-anọ jụụ na-eche ka m dụọ ha ọdụ.+

22 M kwuchaa okwu, e nweghị ihe ọzọ ha na-ekwu.

Okwu m na-eru ha n’ahụ́.

23 Ha na-atụ anya m otú e si atụ anya mmiri ozuzo.

Ha na-atụsi anya ike ịnụ ihe m ga-ekwu otú mmadụ si atụsi anya ụla mmiri ike.+

24 M mụmụọrọ ha ọnụ ọchị, ọ na-eju ha anya.

Otú m si agbasapụ ihu m na-eme ka obi sie ha ike.

25 M na-enye ha ntụziaka ka onyeisi ha.

M bi ka eze ndị agha ya gbara gburugburu,+

Ka onye na-akasi ndị na-eru uju obi.+

30 “Ugbu a, ndị m tọrọ atọ

Na-achị m ọchị,+

Ndị m na-agaraghị ekwe ka nna ha

Na nkịta ndị na-eche ìgwè ewu na atụrụ m nche nọrọ.

 2 Olee uru ike ha nwere baara m?

Ike ha alaala n’iyi.

 3 Agụụ na ụkọ nri emeela ka ha gharazie inwe ume.

Ha na-ata ájá dị n’ala kpọrọ nkụ,

Nke a lara n’iyi, mebisiekwa.

 4 Ha na-aga n’ọhịa akụrụ ahịhịa na-atọ nnu nnu.

Nri ha bụ mgbọrọgwụ osisi brum.*

 5 A na-achụpụ ha n’obodo.+

Ndị mmadụ na-eti mkpu na-eso ha n’azụ otú e si eme onye ohi.

 6 Ha na-ebi ná mkpọda ndagwurugwu,

N’oghere ndị dị n’ala nakwa na nkume.

 7 Ha na-anọ n’ọhịa na-eti mkpu,

Ha ga-agbakọtakwa n’ebe e nwere ahịhịa akụwa.*

 8 Ebe ha bụ ụmụ ndị nzuzu na ụmụ ndị na-enweghị aha,

A chụpụla ha n’obodo.*

 9 Ma ugbu a, ha na-akwadị m emo ma ha gụwa egwú.+

Abụzi m onye ha ji eme ihe ọchị.*+

10 Ha kpọrọ m asị, ha anaghịkwa abịa m nso.+

Ha anaghị atụ ụjọ ịgbụ m asọ mmiri n’ihu.+

11 E nweghị ihe ha na-anaghị eme n’ihu m,

N’ihi na Chineke emeela ka ike gwụ m, wedakwa m ala.

12 Ha na-ebili ka ìgwè mmadụ n’aka nri m.

Ha chụrụ m ọsọ,

Rụchiekwa ihe n’ụzọ m si aga ka ha laa m n’iyi.

13 Ha emebisịala ụzọ m si aga

Ma mee ka nsogbu m na-akakwu njọ.+

E nweghị onye na-akwụsị ha.*

14 Ha na-abịa ka à ga-asị na ha si ná nnukwu oghere dị ná mgbidi abata.

Ha nukọọrọ na-abata n’ebe e bibiri ebibi.

15 Ụjọ zuru m ahụ́.

Ùgwù m alaala ka uzuzu ifufe bufuru ebufu.

Enweghịzi m olileanya na a ga-azọpụta m.

16 Ugbu a, m na-anwụzi anwụ.+

M na-ata ahụhụ kwa ụbọchị.+

17 N’abalị, ọkpụkpụ m na-afụgbu m afụgbu.+

Ahụ́ na-egbusi m mgbu ike. Ọ naghị akwụsị akwụsị.+

18 A na-eji nnukwu ike ahịkọ uwe m yi.*

Ọ na-atọchi m olu otú olu uwe si atọchi mmadụ olu.

19 Chineke atụbala m n’apịtị.

Abụzi m naanị ájá na ntụ.

20 M na-ebesara gị ákwá ka i nyere m aka, ma ị naghị aza m.+

M na-ebili ọtọ, ma naanị ihe ị na-eme bụ ile m anya.

21 I ji obi ọjọọ emesi m ike.+

I ji ike gị niile alụso m ọgụ.

22 I ji ifufe bulite m bufuo,

Jirizie oké ifufe na-ebugharị m.

23 N’ihi na ama m na ị ga-eme ka m nwụọ,

Ka m gaa n’ụlọ ebe onye ọ bụla dị ndụ ga-emecha gaa.

24 Ma e nweghị onye ga-akụ nwoke ike ụwa gwụrụ ihe+

Mgbe ọ na-ebe ákwá ka e nyere ya aka n’oge ọ nọ ná nsogbu.

25 Ọ̀ bụ na ebereghị m ndị ihe siiri ike ákwá?

Ọ̀ bụ na erughịrị m* ndị ogbenye uju?+

26 M tụrụ anya ihe ọma, ma ọ bụ ihe ọjọọ bịara.

M tụrụ anya ìhè, ma ọ bụ ọchịchịrị bịara.

27 Obi ezughị m ike.

Nsogbu na-abịara m ụbọchị niile.

28 M na-agagharị, ma obi adịghị m mma.+ Anaghị m ahụ ìhè anyanwụ.

N’ebe ndị mmadụ zukọrọ, m na-ebili bee ákwá ka e nyere m aka.

29 Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa,

Bụrụkwa enyi ụmụ enyí nnụnụ.+

30 Akpụkpọ ahụ́ m na-ejizi oji, na-erekapụsịkwa.+

Okpomọkụ* emeela ka ọkpụkpụ m na-ere ọkụ.

31 Ọ bụ naanị abụ iru uju ka e ji ụbọ akwara m abụ,

Ọ bụkwa naanị ndị na-ebe ákwá ka a na-afụrụ ọjà m.

31 “Mụ na anya m agbaala ndụ.+

Gịnịzi mere m ga-eji lewe nwaanyị ọzọ* anya otú na-ekwesịghị ekwesị?+

 2 Oleezi ihe m ga-enweta n’aka Chineke bi n’eluigwe?

Gịnị ka m ga-eketa n’aka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile bụ́ onye nọ n’elu?

 3 Ọ̀ bụ na ọ bụghị mbibi ka a ga-ebibi onye na-eme ihe ọjọọ?

Ọ̀ bụkwa na ọdachi agaghị adakwasị ndị arụrụala?+

 4 Ọ̀ bụ na Chineke anaghị ahụ ụzọ m,+

Na-agụkwa nzọụkwụ m niile ọnụ?

 5 È nwetụla mgbe m sooro ndị na-anaghị ekwu eziokwu?

È nwetụla mgbe m gara ije ngwa ngwa ka m ghọọ aghụghọ?+

 6 Ka Chineke jiri ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe tụọ m.+

Ọ ga-achọpụta na m kwụsiri ike n’ebe ọ nọ.+

 7 Ọ bụrụ na m hapụrụ iso ezigbo ụzọ,+

Ma ọ bụ na ihe anya m hụrụ gụwara obi m agụụ,+

Ma ọ bụ na aka m adịghịzi ọcha,

 8 Ka onye ọzọ rie mkpụrụ m kụrụ,+

Ka e fopụkwa ihe m kụrụ.*

 9 Ọ bụrụ na obi m dị n’ebe nwaanyị ọzọ nọ,+

Ọ bụrụkwa na m gara zoo n’ọnụ ụzọ onye agbata obi m maka na m na-achọ nwunye ya,+

10 Ka nwunye m gweere nwoke ọzọ nri,

Ka ụmụ nwoke ndị ọzọ dinaa ya.*+

11 N’ihi na m mee otú ahụ, ọ ga-abụ ihe ihere,

Bụrụkwa ihe ọjọọ nke ndị ikpe ga-eji maka ya taa m ahụhụ.+

12 Ọ ga-adị ka ọkụ nke ga-erepịa ihe niile m rụpụtara ma bibie ha,+

Repịakwa mgbọrọgwụ* ha niile.

13 Ọ bụrụ na emereghị m ndị ohu m ndị nwoke ma ọ bụ ndị nwaanyị ihe m kwesịrị imere ha

Mgbe ha kwuru na e nwere ihe m mere na-adịghị ha mma,*

14 Gịnị ka m ga-eme ma Chineke kpọọ m ikpe?*

Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ ga-achọ ka m zaa ya ajụjụ?+

15 Ọ̀ bụ na ọ bụghị Onye kere m n’ime akpa nwa nne m kere ha?+

Ọ̀ bụ na ọ bụghị otu Onye ahụ kere anyị tupu a mụọ anyị?*+

16 Ọ bụrụ na ekweghị m enye ogbenye ihe ọ chọrọ+

Ma ọ bụkwanụ mee ka nwaanyị di ya nwụrụ gharazie inwe olileanya,*+

17 Ọ bụrụ na ọ bụ naanị m na-eri nri m,

Ọ bụrụ na anaghị m enyetụ ụmụ na-enweghị nne na nna,+

18 (N’ihi na malite mgbe m bụ okorobịa, m na-elekọta nwa na-enweghị nne na nna ka à ga-asị na m bụ nna ya.

M na-enyekwara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ aka malite mgbe m bụ nwata.*)

19 Ọ bụrụ na m hụrụ onye ọ bụla oyi na-atụgbu maka na o nweghị uwe

Ma ọ bụ ogbenye na-enweghị ákwà ọ ga-eji kpuchie onwe ya,+

20 Ọ bụrụ na mụ enyeghị ya ajị anụ a kpachapụtara n’atụrụ m ka o jiri kpuchie onwe ya,

Ya agọzie m,+

21 Ọ bụrụ na m ji iwe tụọ nwa na-enweghị nne na nna aka+

Mgbe ọ nọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo na-achọ ka m nyere ya aka,*+

22 Ka aka m si n’ubu m kwokapụ,

Ka aka m gbajiekwa n’ikpere aka m.

23 Ma emeghị m nke ọ bụla n’ihe ndị a maka na ụjọ tụrụ m na Chineke ga-eme ka ọdachi dakwasị m,

Agaghịkwa m eguzoli n’ihu ya n’ihi otú o si dị ebube.

24 Ọ bụrụ na m tụkwasịrị ọlaedo obi

Ma ọ bụ na m sịrị ezigbo ọlaedo, ‘Ọ bụ gị bụ obi ike m,’+

25 Ọ bụrụ na ihe na-eme m obi ụtọ bụ nnukwu akụnụba m,+

Maka na akụ̀ m kpatara karịrị akarị,+

26 Ọ bụrụ na m hụrụ ka anwụ na-acha*

Ma ọ bụ hụ ka ọmarịcha ọnwa na-aga na mbara igwe,+

27 Obi m wee duhie m,

Mụ esusuo aka m ọnụ iji fee ha ofufe,+

28 Ọ ga-abụ ihe ọjọọ nke ndị ikpe ga-eji maka ya taa m ahụhụ,

N’ihi na ọ pụtara na mụ agọnahụla ezi Chineke bi n’elu.

29 È nwetụla mgbe m ṅụrịrị ọṅụ maka na e bibiri onye iro m+

Ma ọ bụkwanụ nwee obi ụtọ maka na ihe ọjọọ mere ya?

30 E nwetụbeghị mgbe m ji ọnụ m mehie

Wee kpọọ onye iro m iyi, sị ya nwụọ.+

31 Ọ̀ bụ na ndị bi n’ụlọikwuu m ajụbeghị, sị,

‘Ònye ga-achọtali onye na-eribeghị nri Job, rijuo afọ?’+

32 E nweghị onye mbịarambịa m hapụrụ ka ọ rahụ n’èzí.+

M ghewere ọnụ ụzọ m oghe maka ndị njem.

33 Èkpuchitụla m mmehie m otú ndị ọzọ si eme+

Wee zooro ndị ọzọ ihe ọjọọ m mere?*

34 È nwetụla mgbe m tụrụ ụjọ ihe ìgwè mmadụ ga-eme?

Ma ọ bụ, è nwetụla mgbe m tụrụ ụjọ maka otú ezinụlọ ndị ọzọ ga-esi leda m anya,

Ya emee ka m gba nkịtị, ụjọ ịpụ n’èzí ana-atụkwa m?

35 A sị nnọọ na e nwere onye ga-ege m ntị,+

M ga-ede aha m iji bịanye aka n’ihe m kwuru.

Ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile za m.+

A sị nnọọ na onye na-ebo m ebubo dere ebubo ndị o boro m n’akwụkwọ,

36 M gaara eburu akwụkwọ ahụ n’ubu m,

M gakwaara ekpuru ya n’isi m ka okpueze.

37 M gaara akọrọ Chineke ije m niile.

M gaara eji obi ike gakwuru ya otú onyeisi si eme.

38 Ọ bụrụ na ala m ga-ebe ákwá maka na m zuru ya ezu,

Ebe niile a kọrọ akọ na ya ebeekwa ákwá,

39 Ọ bụrụ na m riri mkpụrụ si na ya n’akwụghị ụgwọ,+

Ma ọ bụ, ọ bụrụ na m mere ka ndị nwe ya* sụọ ude,+

40 Ka ogwu puoro m kama ọka wit ga-epuru m,

Ka ahịhịa na-esi ísì ọjọọ puokwara m kama ọka bali ga-epuru m.”

N’ebe a ka okwu Job gwụrụ.

32 Ụmụ nwoke atọ a kwụsịrị ịgbalị ka ha saa Job okwu maka na o kwetasiri ike na ya bụ onye ezi omume.*+ 2 Ma ezigbo iwe were Elaịhu nwa Barakel, onye si n’agbụrụ Bọz,+ n’ezinụlọ Ram. O wesara Job oké iwe maka na Job na-agbalị ka o gosi na ya bụ onye ezi omume kama igosi na ọ bụ Chineke bụ onye ezi omume.+ 3 O wesakwara ndị enyi Job atọ oké iwe maka na e nweghị ezigbo ihe ha sara Job, kama ha kwuru na Chineke bụ onye ọjọọ.+ 4 Elaịhu nọ na-eche ka ndị ọzọ kwuchaa tupu ya agwa Job ihe ọ chọrọ ịgwa ya, n’ihi na ha niile tọrọ ya.+ 5 Mgbe Elaịhu hụrụ na ụmụ nwoke atọ a enweghịzi ihe ha ga-ekwu, ezigbo iwe were ya. 6 Elaịhu nwa Barakel onye si n’agbụrụ Bọz wee malite ikwu okwu. Ọ sịrị:

“Abụ m nwata,

Ma unu bụ ndị okenye.+

Ọ bụ ya mere m ji kwanyere unu ùgwù ghara ikwu okwu,+

Anwaghịkwa m ịgwa unu ihe m ma.

 7 M kwuru n’obi m, sị, ‘Ka ndị okenye kwuo okwu.

Ka ndị dịrịla ndụ ọtụtụ afọ kwuo okwu ka ndị ma ihe.’

 8 Ma, ọ bụ mmụọ nsọ nke Chineke na-enye ndị mmadụ,

Bụ́ ume nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, na-eme ka ha ghọta ihe.+

 9 Ọ bụghị naanị afọ ole mmadụ dị na-eme ka ọ mara ihe,

Ọ bụghịkwa naanị ndị mere agadi na-aghọta ihe dị mma.+

10 Ọ bụ ya mere m ji asị, ‘Geenụ m ntị.

M ga-agwakwa unu ihe m ma.’

11 M nọ na-eche ka unu kwuchaa.

M nọ na-ege ntị n’ihe unu na-akọwa+

Mgbe unu nọ na-achọ ihe unu ga-ekwu.+

12 M gere unu ntị nke ọma,

Ma e nweghị onye n’ime unu mere ka Job mata na ihe ọ na-ekwu abụghị eziokwu*

Ma ọ bụ saa ya ihe ndị o kwuru.

13 N’ihi ya, unu ekwula, sị, ‘Anyị ma ihe.

Ọ bụ Chineke ga-agwa ya na ihe ọ na-ekwu abụghị eziokwu, ọ bụghị mmadụ.’

14 Ọ bụghị m ka ọ gwara ihe ndị o kwuru.

N’ihi ya, agaghị m asa ya ihe ndị unu sara ya.

15 Ụjọ ji ha. Ha enweghịzi ihe ha ga-asa ya.

Okwu agwụla ha n’ọnụ.

16 M nọ na-echere, ma e nweghịzi ihe ha na-ekwu.

Ha kwụ ebe ahụ. E nweghịzi ihe ha na-asa ya.

17 Ọ bụ ya mere mụnwa ga-eji saa ya okwu.

M ga-ekwukwa ihe m ma,

18 N’ihi na okwu juru m ọnụ.

Mmụọ Chineke nke dị n’ime m na-enu m enu ka m kwuo okwu.

19 Ime ahụ́ m dị ka mmanya na-enweghị ebe o si ekupụ,

Ka karama akpụkpọ ọhụrụ chọrọ ịgbawa agbawa.+

20 Ka m kwuo okwu ka ahụ́ dajụọ m.

M ga-emeghe ọnụ m kwuo okwu.

21 Agaghị m ele onye ọ bụla anya n’ihu.+

Agaghịkwa m eto onye ọ bụla otuto elu ọnụ,*

22 N’ihi na amaghị m otú e si eto mmadụ otuto elu ọnụ.

Ọ bụrụ na m na-eme otú ahụ, Onye kere m ga-ebibi m ngwa ngwa.

33 “Ma ugbu a, Job, biko nụrụ okwu m.

Gee ntị n’ihe niile m na-ekwu.

 2 Biko, m ga-emegherịrị ọnụ m.

Ire m* ga-ekwurịrị okwu.

 3 Ihe m na-ekwu na-egosi na obi m dị ọcha,+

Eji m obi ọcha na-ekwu ihe m ma.

 4 Ọ bụ mmụọ Chineke kere m,+

Ọ bụkwa ume Onye Pụrụ Ime Ihe Niile kupụtara mere ka m dị ndụ.+

 5 Saa m okwu ma ọ bụrụ na i nwere ike.

Kwuo ihe ndị ị chọrọ ikwu n’ihu m. Jikere ịzara ọnụ gị.

 6 Mụ na gị bụ otu ihe n’anya ezi Chineke.

Ọ bụkwa ájá ka e ji kpụọ m.+

 7 N’ihi ya, i kwesịghị ịtụ m ụjọ,

Ihe m na-ekwu ekwesịghịkwa ime ka ike gwụ gị.

 8 Ma e nwere ihe i kwuru ná ntị m.

N’eziokwu, m nọ na-anụ ka ị na-asị,

 9 ‘Abụ m onye ezi omume. Anaghị m eme mmehie.+

Aka m dị ọcha. Anaghị m eme ihe ọjọọ.+

10 Ma Chineke na-achọ ihe ọ ga-akụdo aka mesie m ike.

O weere m ka onye iro ya.+

11 Ọ na-etinye ụkwụ m n’ọtọsị.

Ọ na-enyocha ụzọ m niile.’+

12 Ma i kwuteghị ihe a i kwuru. Ọ bụ ya mere m ga-eji saa gị okwu:

Chineke karịrị nnọọ mmadụ efu.+

13 Gịnị mere i ji ekwu na ihe o mere adịghị mma?+

Ọ̀ bụ maka na ọ saghị gị ihe niile i kwuru?+

14 N’ihi na Chineke na-ekwu okwu ugboro ugboro.*

Ma e nweghị onye na-ege ya ntị.

15 Ná nrọ, n’ọhụụ a na-ahụ n’abalị,+

Mgbe oké ụra ji ndị mmadụ,

Mgbe ha na-ehi ụra n’àkwà* ha.

16 Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ na-emeghe ntị ha,+

Mee ka ndụmọdụ ya ruo ha n’obi,

17 Iji mee ka mmadụ hapụ omume ọjọọ,+

Meekwa ka ọ kwụsị ịdị mpako.+

18 Chineke na-azọ ya ndụ* ka ọ ghara ịbanye n’olulu,*+

Ka a ghara iji mma agha* laa ndụ ya n’iyi.

19 Mmadụ na-amụtakwa ihe mgbe o dina n’àkwà* ya, ahụ́ ana-egbu ya mgbu,

Nakwa mgbe ọkpụkpụ na-afụ ya ụfụ n’akwụsịghị akwụsị,

20 Nke mere na ọ* na-asọ nri oyi.

Ọ naghịdị* ekwe eri nri dị mma.+

21 Ọ taala ahụ́.

A na-ahụzi ọkpụkpụ ya niile anya.

22 Ọ* na-abịa olulu* nso.

Ọ ga-adaba n’aka ndị na-egbu mmadụ.

23 Ọ bụrụ na e nwere otu onye ozi* n’ime otu puku ndị ozi

Nke ga-ekwuchite ọnụ ya,

Bụ́ onye ga-agwa mmadụ ihe dị mma ọ ga-eme,

24 Mgbe ahụ, Chineke ga-emere ya amara, sị,

‘Napụta ya ka ọ ghara ịbanye n’olulu.*+

Ahụla m ihe mgbapụta.+

25 Ka ahụ́ ya dị ọhụrụ* karịa otú ọ dị mgbe ọ bụ nwata.+

Ka o nweghachi ike o nwere mgbe ọ bụ okorobịa.’+

26 Ọ ga-arịọsi Chineke arịrịọ ike.+ Chineke ga-emere ya amara.

Ọ ga-eti mkpu ọṅụ mgbe ọ ga-ahụ ihu Chineke.

Chineke ga-emekwa ka mmadụ efu bụrụghachi onye ezi omume n’anya ya.

27 Onye ahụ ga-agwa ndị mmadụ,* sị,

‘M mehiela.+ M meela ihe na-adịghị mma.

Ma, a taghị m ahụhụ e kwesịrị ịta m.*

28 Ọ napụtala mkpụrụ obi* m ka m ghara ịbanye n’olulu.*+

M ka ga-anọ ndụ na-ahụ ìhè.’

29 N’eziokwu, Chineke na-emere mmadụ ihe niile a

Ugboro ugboro,*

30 Ka o si n’olulu* kpọghachi ya,*

Ka ìhè nke ndụ wee nwuoro ya.+

31 Ṅaa ntị, Job. Gee m ntị.

Gba nkịtị ka m gwakwuo gị okwu.

32 Ọ bụrụ na e nwere ihe ị ga-asa m, saa m ya.

Kwuo okwu, n’ihi na achọrọ m igosi na aka gị dị ọcha.

33 Ọ bụrụ na e nweghị ihe ị ga-ekwu, i kwesịrị ige m ntị.

Gba nkịtị. M ga-akụziri gị amamihe.”

34 Elaịhu kwukwara, sị:

 2 “Unu ndị ma ihe, geenụ ntị n’ihe m na-ekwu.

Ṅaanụ m ntị, unu ndị ọkachamara.

 3 N’ihi na ntị na-atụle okwu

Otú ire* si amata otú nri na-atọ.

 4 Ka anyị jiri aka anyị chọpụta ihe bụ́ ihe ziri ezi.

Ka anyị kpebie ihe bụ́ ihe dị mma.

 5 N’ihi na Job sịrị, ‘Aka m dị ọcha.+

Ma Chineke ekpeela m ikpe mkpegbu.+

 6 M̀ ga-agha ụgha, sị na e kwesịrị ịma m ikpe?

Ọnyá m anaghị ala ala n’agbanyeghị na e nweghị iwu m dara.’+

 7 È nwere nwoke ọzọ dị ka Job,

Onye a na-akwa emo, ya ana-aṅụ ya ka mmiri?

 8 Ya na ndị na-eme ihe ọjọọ bụzi otu.

Ya na ndị ajọ omume dịkwa ná mma.+

 9 N’ihi na ọ sịrị, ‘E nweghị uru mmadụ na-erite

Na ọ na-agbalị ime ihe dị Chineke mma.’+

10 N’ihi ya, geenụ m ntị, unu ndị na-aghọta ihe:

Chineke emekataghị mee ihe ọjọọ.+

Onye Pụrụ Ime Ihe Niile emekataghị mee ihe na-adịghị mma.+

11 N’ihi na ọ ga-akwụ mmadụ ụgwọ ihe ọ na-eme,+

Ọ ga-emekwa ka onye ahụ taa ahụhụ ihe o metara.

12 N’eziokwu, Chineke anaghị eme ihe ọjọọ.+

Onye Pụrụ Ime Ihe Niile anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.+

13 Ònye nyefere ụwa n’aka ya?

Ọ̀ bụkwa onye họpụtara ya ka o lekọtawa ụwa niile?

14 Ọ bụrụ na o lekwasị ndị mmadụ anya,

Ọ bụrụ na o kpebie ịnapụ ha mmụọ ya na ume ha na-eku,+

15 Mmadụ* niile ga-anwụ,

Mmadụ ga-alaghachikwa n’ájá.+

16 N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-aghọta ihe, ṅaa ntị.

Gee ntị nke ọma n’ihe m na-ekwu.

17 Ò kwesịrị ịbụ onye kpọrọ ikpe ziri ezi asị na-achị?

Ka ị̀ ga-akpọ onye dị ike nke na-eme ezi omume onye ọjọọ?

18 Ị̀ ga-asị eze, ‘Ị baghị uru,’

Ma ọ bụ sị ndị a ma ama, ‘Unu bụ ndị ajọ omume’?+

19 E nwere Onye na-anaghị ele ndị isi anya n’ihu,

Onye na-anaghịkwa ahapụ ogbenye menyere ọgaranya,+

N’ihi na ọ bụ ya kere ha niile.+

20 Ha nwere ike ịnwụ na mberede,+ n’etiti abalị.+

Ha na-amasi jijiji ike wee nwụọ.

Ndị dị ike na-alakwa n’iyi, ma ọ bụghị mmadụ na-ala ha n’iyi.+

21 N’ihi na anya Chineke na-ahụ ụzọ mmadụ,+

Ọ na-ahụkwa nzọụkwụ ya niile.

22 E nweghị itiri ma ọ bụ oké ọchịchịrị,

Bụ́ ebe ndị na-eme ihe ọjọọ nwere ike izo.+

23 N’ihi na e nweghị onye Chineke yiiri oge

Ọ ga-abịa n’ihu Chineke ka o kpee ya ikpe.

24 Ọ na-ebibi ndị dị ike n’ebughị ụzọ mee nchọpụta,

Ọ na-akpọrọkwa ndị ọzọ dochie ha.+

25 N’ihi na ọ ma ihe ha na-eme.+

Ọ na-emeri ha n’abalị, e bibie ha.+

26 Ọ na-ebibi ha n’ihi ajọ omume ha,

N’ebe mmadụ niile ga-ahụ ha,+

27 N’ihi na ha akwụsịla iso ya,+

E nweghịkwa ihe ha ji ihe ọ bụla ọ na-eme kpọrọ.+

28 Ha na-eme ka ndị ogbenye besara ya ákwá,

Nke na-eme ka ọ nụ ákwá ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka.+

29 Ọ bụrụ na Chineke agbachi nkịtị, ònye ga-ama ya ikpe?

Ọ bụrụ na o zoo ihu ya, ònye ga-ahụ ya?

Ma ọ̀ bụ mba ma ọ̀ bụ otu onye ka o zooro ihu ya, ọ bụ otu ihe ahụ ga-eme,

30 Ya bụ, ọ gaghị ekwe ka onye na-anaghị asọpụrụ ya* chịa+

Ma ọ bụ kwe ka onye ahụ mee ka ọnyà ma ndị mmadụ.

31 N’ihi na è nwere onye ga-asị Chineke,

‘A taala m ahụhụ n’agbanyeghị na e nweghị ihe ọjọọ m mere.+

32 Kụziere m ihe m na-ahụbeghị.

Ọ bụrụ na e nwere ihe ọjọọ m mere, agaghị m eme ya ọzọ’?

33 Ọ̀ ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ otú i si chọọ ebe ọ bụ na ị jụrụ ikpe ya?

Ọ bụ gị ga-ekpebi, ọ bụghị m.

Gwazie m ihe ahụ ị ma.

34 Ndị na-aghọta ihe,

Ya bụ, onye ọ bụla ma ihe nke na-anụ ihe m na-ekwu, ga-asị m,

35 ‘Job amaghị ihe ọ na-ekwu.+

Ihe ọ na-ekwu gosiri na ọ naghị aghọta ihe.’

36 Ka a nwalee Job* ruo n’isi

N’ihi na ọ na-asa okwu otú ndị na-eme ihe ọjọọ si asa.

37 A ka na-ekwu na o mehiere, ya ana-enupụkwa isi.+

Ọ na-akụ aka iji kwaa anyị emo,

Ọ na-ebokwa ezi Chineke ọtụtụ ebubo.”+

35 Elaịhu kwukwara, sị:

 2 “Obi ò siri gị nnọọ ike na ị bụ onye ezi omume nke na ị na-asị,

‘Abụ m onye ezi omume karịa Chineke’?+

 3 N’ihi na ị na-asị, ‘Ọ bụrụ na m na-eme ihe dị mma, olee otú o si gbasa gị?*

Ihe ọ̀ gaara akara m mma ma a sị na m mere mmehie?’+

 4 M ga-asa gị okwu,

Saakwa ndị enyi gị+ gị na ha nọ.

 5 Lelie anya n’eluigwe ka ị hụ,

Leruo ígwé ojii nke dị ezigbo elu karịa gị anya.+

 6 I mee mmehie, è nwere ihe i metere Chineke?+

Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ ọtụtụ ugboro, olee ihe i metere ya?+

 7 Ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, gịnị ka ị na-enye ya?

Gịnị ka ọ na-enweta n’aka gị?+

 8 Ọ bụ naanị mmadụ ibe gị ka ihe ọjọọ ị na-eme gbasara,

Ọ bụkwa mmadụ ka ezi omume ị na-eme na-abara uru.

 9 Ndị mmadụ na-ebe ákwá ka e nyere ha aka mgbe a na-emegbu ha.

Ha na-ebe ákwá ka a napụta ha n’aka ndị dike na-achị ha.+

10 Ma e nweghị onye na-ajụ, sị, ‘Olee ebe Chineke, bụ́ Onye Ukwu kere m, nọ,+

Onye na-eme ka ndị mmadụ na-abụ abụ otuto n’abalị?’+

11 Ọ na-akụziri anyị ihe+ ka anyị wee mara ihe karịa anụ ọhịa,+

Ọ na-emekwa ka anyị mara ihe karịa ụmụ nnụnụ.

12 Ndị mmadụ na-ebe ákwá ka e nyere ha aka, ma ọ naghị aza,+

N’ihi na ndị na-eme ihe ọjọọ dị mpako.+

13 N’eziokwu, Chineke anaghị anụ ákwá aghụghọ.+

Onye Pụrụ Ime Ihe Niile enweghị ihe o ji ya kpọrọ,

14 Ma ya fọdụzie mgbe ị na-asị na ị naghị ahụ ihe ọ na-eme.+

Ikpe gị dị n’aka ya. N’ihi ya, i kwesịrị ichere ya.+

15 N’ihi na o jibeghị iwe kpọọ gị ka ị zaa ya ajụjụ.

O tinyebeghị uche n’ọnụ ị na-agbakasịrị ya.+

16 Job na-emeghe ọnụ ya na nkịtị.

Ọ na-ekwu ọtụtụ okwu n’agbanyeghị na e nweghị ihe ọ ma.”+

36 Elaịhu kwukwara, sị:

 2 “Nwetụkwuoro m ndidi ka m kọwaara gị ihe m na-ekwu,

N’ihi na m ka nwere ihe m ga-ekwu n’aha Chineke.

 3 M ga-ekwu ihe m ma otú ga-edo anya,

M ga-akpọkwa Onye kere m onye ezi omume.+

 4 N’eziokwu, ihe m na-ekwu abụghị ụgha.

Onye ma ihe niile+ nọ gị n’ihu n’ebe a.

 5 N’eziokwu, Chineke dị ike,+ ọ naghịkwa ajụ onye ọ bụla.

Ọ na-aghọta ihe nke ọma.

 6 Ọ gaghị ahapụ ndị ajọ omume ndụ.+

Ma ọ ga-ekpere ndị na-ata ahụhụ ikpe ziri ezi.+

 7 Ọ naghị ewepụ anya ya n’ebe ndị ezi omume nọ.+

Ọ na-eme ka ha nọrọ n’ocheeze,*+ a na-ebulikwa ha elu ruo mgbe ebighị ebi.

 8 Ma ọ bụrụ na e kee ha agbụ ígwè,

Jirikwa ụdọ e ji ata mmadụ ahụhụ jide ha,

 9 Ọ ga-eme ka ha mata ihe ha mere,

Bụ́ mmehie ndị ha mere maka na ha dị mpako.

10 Ọ na-adọ ha aka ná ntị,

Na-agwakwa ha ka ha kwụsị ime ihe ọjọọ.+

11 Ọ bụrụ na ha erube isi ma fee ya,

Ihe ga-agaziri ha ná ndụ ha niile,

Ndụ ha ga-atọkwa ha ụtọ.+

12 Ma ọ bụrụ na ha erubeghị isi, a ga-eji mma agha* gbuo ha,+

Ha ga-anwụkwa n’amaghị ihe.

13 Ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke* na-ebu iwe n’obi.

Ọ bụrụgodị na o kee ha agbụ, ha anaghị arịọ ka e nyere ha aka.

14 Ha na ụmụ nwoke bụ́ ndị akwụna* na-anọ,*+

Ha* na-anwụkwa mgbe ha ka bụ okorobịa.+

15 Ma Chineke* na-anapụta ndị na-ata ahụhụ n’ahụhụ ha.

Ọ na-emeghe ntị ha n’oge a na-emegbu ha.

16 Ọ na-anapụta gị n’ahụhụ+

Ka ị nọrọ n’ebe sara mbara, n’ebe a na-enweghị ihe na-akpagide gị,+

N’ebe ezigbo nri nke dị na tebụl gị ga-eme ka obi gị jụrụ.+

17 Mgbe ahụ, ikpe a mara ndị ajọ omume ga-eju gị afọ,+

Mgbe e kpere ha ikpe ziri ezi, meekwa ha ihe e kpebiri.

18 Ma kpachara anya ka iwe ghara ime ka i mewe ihe ọjọọ,*+

Anakwala aka azụ, ka ọ ghara idufu gị.

19 Ákwá ị na-ebe ka e nyere gị aka

Ma ọ bụ mbọ ị na-agbasi ike ọ̀ ga-eme ka ị kwụsị ịta ahụhụ?+

20 Atụla anya ka abalị ruo,

Bụ́ mgbe ndị mmadụ na-apụ n’ebe ha nọ.

21 Lezie anya ka ị ghara imewe ihe ọjọọ,

N’ihi na ọ bụ ya ka ị na-ahọrọ kama ịta ahụhụ.+

22 Lee, a na-eto Chineke n’ihi ike ya.

È nwere onye na-akụzi ihe otú o si akụzi?

23 Ònye gwatụrụla ya ihe ọ ga-eme*+

Ma ọ bụ sị ya, ‘Ihe i mere adịghị mma’?+

24 Cheta ka ị jaa ọrụ ya mma,+

Bụ́ nke ndị mmadụ jirila bụọ abụ.+

25 Mmadụ niile ahụla ya.

Mmadụ efu nọ n’ebe dị anya na-ele ya.

26 N’eziokwu, Chineke dị ukwuu karịa otú anyị nwere ike ịmata.+

E nweghị ike ịghọta* afọ ndụ ya.+

27 Ọ na-amịkọrọ mmiri niile tasara n’ala.+

Ha na-aghọ mmiri ozuzo na alụlụụ.

28 Ha na-esizi n’ígwé ojii zoo.+

Ha na-ezo, onye ọ bụla enweta mmiri.

29 È nwere onye ga-aghọtali otú e si gbasaa urukpuru

Ma ọ bụ ghọta ụda égbè eluigwe nke si n’ebe o bi?*+

30 Lee otú o si agbasa àmụ̀mà* ya+ n’elu ya,

Na-ekpuchikwa ogbu* oké osimiri.

31 Ọ na-eji ihe ndị a eme ka ndị mmadụ dịrị ndụ.*

Ọ na-enye ha ihe oriri n’ụba.+

32 Ọ na-eji aka ya ekpuchi àmụ̀mà,

Ọ na-eduzikwa ya ka ọ gaa n’ebe ọ na-aga.+

33 Égbè eluigwe ya na-akọ banyere ya,

Anụ ụlọ na-ekwukwa onye* na-abịa.

37 “Obi kụwara m kpum kpum,

Obi mapụkwara m.

 2 Geenụ ntị nke ọma ka unu nụ mkpọtụ olu ya na-eme

Na ụda si n’ọnụ ya apụta nke na-ada ka égbè eluigwe.

 3 Ọ na-eme ka a nụ ya n’okpuru eluigwe niile,

Na-emekwa ka àmụ̀mà ya+ gbuo n’ebe niile n’ụwa.

 4 O gbuchaa, a na-anụ oké ụda.

Olu ya na-ada ụda ka égbè eluigwe,+

Ọ naghịkwa ejichi àmụ̀mà mgbe olu ya na-ada ụda.

 5 Otú olu Chineke si ada ụda+ dị ebube.

Ọ na-eme nnukwu ihe ndị anyị na-enweghị ike ịghọta.+

 6 N’ihi na ọ na-asị snoo, ‘Daa n’ụwa,’+

Ọ na-asịkwa nnukwu mmiri ozuzo, ‘Zosie ike.’+

 7 Chineke na-akwụsị ọrụ niile mmadụ na-arụ,

Ka mmadụ efu ọ bụla wee mata ọrụ ya.

 8 Anụ ọhịa na-abanye n’ebe ha bi,

Ha anaghịkwa apụta n’ebe ha na-ezo.

 9 Ifufe mmiri na-esi n’ụlọ ya fere pụta,+

Oyi na-esikwa n’ifufe si n’ebe ugwu abịa.+

10 Ume Chineke kupụrụ na-eme ka mmiri kpụkọọ,+

Meekwa ka mmiri niile kpụkọta ọnụ.+

11 N’eziokwu, ọ na-eme ka mmiri na-anyịgbu urukpuru.

Ọ na-eme ka àmụ̀mà ya+ gbuo n’ebe niile n’ígwé ojii.

12 Ha na-aga okirikiri n’ebe ọ na-agwa ha ka ha gaa.

Ha na-eme ihe ọ bụla o nyere iwu+ ka ha mee n’ụwa.

13 Ọ na-eji urukpuru eweta ahụhụ,+ jiri ya na-eme ka mmiri zoo n’ala,

Ma ọ bụ jiri ya gosi ịhụnanya ya.+

14 Job, gee ntị n’ihe a.

Cheregodị ka i chee echiche nke ọma banyere ọrụ ndị dị ebube Chineke na-arụ.+

15 Ị̀ ma otú Chineke si achị ígwé ojii,*

Nakwa otú o si eme ka àmụ̀mà gbuo n’ígwé ojii ya?

16 Ị̀ ma otú ígwé ojii si erugharị?+

Ihe ndị a bụ ọrụ ndị dị ebube Onye ma ihe niile na-arụ.+

17 Gịnị mere uwe gị ji ekporo ọkụ

Mgbe ụwa dara jụụ n’ihi ifufe si n’ebe ndịda na-abịa?+

18 Ì nwere ike iso ya gbasaa mbara igwe,+

Ya esie ike ka enyo e ji ọla kọpa* mee?

19 Gwa anyị ihe anyị ga-agwa ya.

Anyị enweghị ike ịsa ya ihe ọ bụla n’ihi na anyị nọ n’ọchịchịrị.

20 M̀ kwesịrị ịgwa Chineke na m chọrọ ịgwa ya okwu?

Ka è nweela onye kwuru ihe e kwesịrị ịgwa ya?+

21 Ha enweghịdị ike ịhụ ìhè,*

N’agbanyeghị na ọ na-achasi ike na mbara igwe,

Ruo mgbe ifufe fere wee mee ka mbara igwe gbachapụ.

22 Ìhè nke na-enwu ka ọlaedo na-esi n’ebe ugwu abịa.

Ebube Chineke+ dị egwu.

23 Anyị enweghị ike ịghọta ihe niile banyere Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+

Ike ya dị ukwuu,+

E nweghịkwa mgbe ọ na-anaghị ekpe ikpe ziri ezi+ ma ọ bụ mgbe ọ na-anaghị eme ihe dị mma.+

24 Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji kwesị ịtụ egwu ya.+

N’ihi na ọ naghị enwe mmasị n’ebe ndị chere na ha ma ihe nọ.”+

38 Jehova wee si n’oké ifufe gwa Job,+ sị:

 2 “Ònye bụ onye a nke na-agba otú m si eme ihe ụkwụ

Ma na-ekwu okwu n’agbanyeghị na e nweghị ihe ọ ma?+

 3 Biko, jikere ka dimkpa.

M ga-ajụ gị ajụjụ, ị ga-azakwa m.

 4 Olee ebe ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa?+

Gwa m, ma ọ bụrụ na i chere na ị na-aghọta ihe.

 5 Ònye kpebiri otú ọ ga-aha, ma ọ bụrụ na ị ma?

Ma ọ bụ, ònye ji eriri e ji atụ̀ ihe tụọ ya?

 6 Na gịnị ka e gwunyere ntọala ya,

Ma ọ bụ, ònye dọnyere nkume ji ya,+

 7 Mgbe kpakpando ụtụtụ+ tikọrọ mkpu ọṅụ ọnụ,

Ụmụ Chineke* niile+ amalitekwa iti mkpu otuto?

 8 Ònye mechibidoro oké osimiri ụzọ+

Mgbe o si n’ebe o si asọpụta* sọpụtasiwe ike,

 9 Mgbe m yiwere ya ígwé ojii ka uwe,

Jirikwa oké ọchịchịrị kee ya ka ákwà,

10 Mgbe m kpaara ya ókè,

Tinyekwa ihe e ji atụchi ya nakwa ibo ụzọ ya,+

11 M wee sị, ‘Ebe a ka ị ga-erute. Ị gaghị agafe ya.

Ebe a ka ebili mmiri gị nke na-amali elu ga-ejedebe’?+

12 È nweela mgbe i nyere anyanwụ ụtụtụ iwu ka ọ waa

Ma ọ bụ mee ka chi mara ebe ọ ga-abọ,+

13 Ka ọ bọọ n’ebe niile ụwa sọtụrụ

Nakwa ka ọ yọgharịa ụwa, yọpụ ndị ajọ omume?+

14 Ọ na-agbanwe otú ụwa dị otú ahụ ihu ụrọ si agbanwe ma e bie ihe e ji aka ihe akara na ya,

Ihe ndị dị n’ụwa apụtazie ìhè otú ihe e sere n’ákwà si apụta ìhè.

15 Ma a na-eme ka ìhè kwụsị inwuru ndị ajọ omume,

Meekwa ka ndị ajọ omume kwụsị imegbu ndị mmadụ.*

16 Ị̀ gatụla n’ebe oké osimiri si asọpụta

Ma ọ bụ gagharịa n’ime mmiri miri emi ka ị chọpụta ihe ndị dị na ya?+

17 È gosila gị ọnụ ụzọ ọnwụ?+

Ka ị̀ hụtụla ọnụ ụzọ oké ọchịchịrị?+

18 Ị̀ ghọtala otú ụwa si buo ibu?+

Gwa m, ma ọ bụrụ na ị ma ihe a niile.

19 Olee ebe ìhè bi?+

Oleekwa ebe bụ́ ụlọ ọchịchịrị,

20 Ka i wee kpọrọ ya gaa n’ebe ahụ,

Ma ghọta ụzọ e si aga n’ụlọ ya?

21 Ị̀ ma ihe a maka na a mụọla gị mgbe ahụ

Nakwa maka na ị dịteela ndụ aka?

22 Ị̀ banyetụla n’ebe snoo si apụta?+

Ka ị̀ hụtụla ebe akụ́ mmiri ígwé si apụta,+

23 Bụ́ ihe ndị m dowere maka oge ahụhụ,

Maka ụbọchị ọgụ na agha?+

24 Olee ebe e si ekesa ìhè?*

Oleekwa ebe ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ si eku n’ụwa?+

25 Ònye waara idei mmiri ụzọ,

Waakwara égbè eluigwe na ígwé ojii nke mmiri rujuru ụzọ,+

26 Ka mmiri zoo n’ebe mmadụ na-ebighị,

N’ala ịkpa mmadụ ọ bụla na-ebighị,+

27 Ka mmiri ju n’ala kpọrọ nkụ nke ihe na-adịghị,

Meekwa ka ahịhịa pulite na ya?+

28 Mmiri ozuzo ò nwere nna,+

Ma ọ bụ, ònye bụ nna igirigi?+

29 Ònye na-eme ka mmiri kpụkọọ akpụkọọ?

Ònyekwa na-amụpụta mkpụrụ mmiri ígwé?+

30 Ònye na-ekpuchi mmiri ka à ga-asị na e ji nkume kpuchie ya,

Meekwa ka mmiri miri emi kpụkọọ?+

31 Ì nwere ike ikechi ụdọ ndị ji ìgwè kpakpando Kaịma*

Ma ọ bụ tọọ ụdọ ndị ji ìgwè kpakpando Kisịl?*+

32 Ì nwere ike iduru otu ìgwè kpakpando* pụta n’oge ya

Ma ọ bụ duzie ìgwè kpakpando Ash* na ụmụ ya?

33 Ị̀ ma iwu ndị na-achị ihe ndị dị n’eluigwe,+

Ka ì nwere ike ime ka iwu ndị ahụ chịwa ụwa?

34 Ì nwere ike iti mkpu gwa ígwé ojii okwu

Ka nnukwu mmiri wee zoo dee gị ahụ́?+

35 Ì nwere ike ime ka àmụ̀mà gbuo?

Hà ga-abịa sị gị, ‘Lee anyị’?

36 Ònye mere ka ígwé ojii* mara ihe+

Ma ọ bụ mee ka ihe ndị dị na mbara igwe* na-aghọta ihe?+

37 Ònye ma ihe nke na ọ ga-agụli ígwé ojii ọnụ?

Ma ọ bụ, ònye nwere ike ikpu ite mmiri ndị dị n’eluigwe ihu?+

38 Ònye na-eme ka uzuzu kpụkọọ ọnụ,

Ájá ụrọ anyakọtakwa ọnụ?

39 Ì nwere ike igbutere ọdụm anụ ọ ga-eri

Ma ọ bụ nyejuo ụmụ ọdụm agụụ ji afọ+

40 Mgbe ha makpu n’ebe ha na-ezo

Ma ọ bụ mgbe ha makpu n’ebe ha bi na-eche anụ?

41 Ònye na-akwadebere ugoloọma nri+

Mgbe ụmụ ya na-ebe ákwá ka Chineke nyere ha aka,

Ha ana-adagharịkwa maka na ihe ha ga-eri adịghị?

39 “Ị̀ ma oge ewu ọhịa* ji amụ nwa?+

Ị̀ hụtụla mgbe mgbada na-amụ nwa?+

 2 Ị̀ na-agụkọ ọnwa ole ha na-ebu afọ ime?

Ị̀ ma mgbe ha ji amụ nwa?

 3 Ha na-ehulata mụọ nwa mgbe ime na-eme ha,

Ahụ́ mgbu ha akwụsị.

 4 Ụmụ ha na-agbasi ike ma too n’ime ọhịa.

Ha na-apụ, ha anaghịkwa alọghachikwute nne ha.

 5 Ònye hapụrụ jakị ọhịa ka ọ gawara onwe ya?+

Ọ̀ bụkwa onye tọpụrụ eriri e kere jakị ọhịa?*

 6 M meela ka ọzara bụrụ ụlọ ya,

Meekwa ka ala nnu bụrụ ebe ọ na-ebi.

 7 Ọ na-achị ọgba aghara e nwere n’obodo ọchị.

Ọ naghị anụ mkpu onye na-achị anụmanụ na-eti.

 8 Ọ na-akpagharị n’ugwu na-achọ ahịhịa ọ ga-ata,

Na-achọ ụdị ahịhịa ndụ ọ bụla.

 9 Atụ́ ọ̀ ga-achọ ijere gị ozi?+

Ọ̀ ga-anọbọ chi n’ụlọ anụmanụ gị?*

10 Ì nwere ike iji ụdọ kegide atụ́ ka ọ kọọrọ gị ihe n’ubi,

Ka ọ̀ ga-eso gị gaa kọọrọ gị ihe na ndagwurugwu?

11 Ị̀ ga-atụkwasị ya obi maka na ọ dị ezigbo ike,

Ma hapụ ya ka ọ rụọrọ gị nnukwu ọrụ i nwere ịrụ?

12 Ị̀ ga-atụkwasị ya obi ka o bulatara gị ihe ubi gị mepụtara?*

Ọ̀ ga-ekpokọta ha n’ebe ị na-azọcha ọka?*

13 Obi na-atọ enyí nnụnụ ụtọ mgbe ọ na-efe nku ya.

Ma à ga-eji nku ya na ábụ́bà* ya tụnyere nke ụgbala ọcha?*+

14 N’ihi na ọ na-ahapụ àkwá ya n’ala.

Ọ na-ahapụ ha n’ájá ka ájá na-ekpo ha ọkụ.

15 Ọ na-echefu na mmadụ nwere ike ịzọpịa ha

Ma ọ bụ na anụmanụ nwere ike ịzọ ha ụkwụ.

16 Ọ na-emesi ụmụ ya ike ka à ga-asị na ọ bụghị ya mụrụ ha.+

Ọ chọghịdị ịma na mbọ niile ọ gbara nwere ike ịla n’iyi.

17 N’ihi na Chineke emeela ka ọ ghara ịma ihe,*

Meekwa ka ọ ghara ịna-aghọta ihe.

18 Ma mgbe o biliri fee nku ya,

Ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ya ọchị.

19 Ọ̀ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya?+

Ọ̀ bụ gị na-eme ka o nwee ọzà n’olu ya?

20 Ì nwere ike ime ka ọ malie ka igurube?

Otú o si eze ume n’ike n’ike na-emenye ụjọ.+

21 Ọ na-akụ ụkwụ n’ala n’ike n’ike na ndagwurugwu, na-amalikwa elu.+

Ọ na-azọrọ kwem kwem pụta n’ọgbọ agha.+

22 Ọ na-achị ihe na-emenye ụjọ ọchị, e nweghịkwa ihe ọ na-atụ egwu.+

Mma agha anaghị eme ka ọ gbaghachi azụ.

23 Akpa akụ́ na-eme mkpọtụ n’akụkụ ya,

Ube na árọ̀ ana-egbukwa maramara.

24 Ebe ọ bụ na ọ na-enu ya enu, ọ na-awụrụ ọsọ gawa.

O nweghị ike ịkwụrụ otu ebe ma ọ nụ ụda opi.*

25 A fụọ opi, ọ na-asị, ‘Ehee!’

Ọ na-anọ n’ebe dị anya anụ ísì agha,

Na-anụkwa mkpu ndị ọchịagha na-eti nakwa mkpu agha.+

26 Ọ̀ bụ gị kụziiri agụ nkwọ otú ọ ga-esi na-efe?

Ị̀ kụziiri ya otú ọ ga-esi na-efega n’ebe ndịda?

27 Ka ọ̀ bụ gị na-enye ugo iwu ka o felie elu+

Ma kpaa akwụ́ ya n’ebe dị elu?+

28 Ọ na-anọ n’ọnụ ọnụ nkume dị elu chi abọọ.

Ọ na-ebi n’ebe ọ rụsiri ike ná nnukwu nkume pịrị ọnụ.

29 Ọ na-esi n’ebe ahụ achọ nri.+

Anya ya na-eru n’ebe dị ezigbo anya.

30 Ụmụ ya na-aṅụ ọbara.

Ọ na-anọkwa n’ebe ọ bụla ozu dị.”+

40 Jehova gwakwara Job, sị:

 2 “Mmadụ ò kwesịrị ikwu na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile na-eme ihe ọjọọ ma sesawa ya okwu?+

Ka onye chọrọ ịbara Chineke mba zaa ajụjụ a.”+

3 Job zara Jehova, sị:

 4 “Lee, erughị m eru.+

Gịnị ka m ga-aza gị?

Ekpuchiela m aka n’ọnụ m.+

 5 M kwuola okwu ọtụtụ ugboro,* ma agaghị m ekwu ọzọ.

E nweghị ihe ọzọ m ga-ekwu.”

 6 Jehova sizi n’oké ifufe gwa Job,+ sị:

 7 “Biko, jikere ka dimkpa.

M ga-ajụ gị ajụjụ, ị ga-azakwa m.+

 8 Ị̀ ga-asị na anaghị m ekpe ikpe ziri ezi?

Ị̀ ga-ekwu na m bụ onye ọjọọ ka i wee bụrụ onye ezi omume?+

 9 Aka gị ò siri ike ka nke ezi Chineke?+

Ka olu gị ò nwere ike ịdasi ụda ike ka nke ya?+

10 Biko, jiri ebube na ike chọọ onwe gị mma.

Yiri ùgwù na ịma mma ka uwe.

11 Gosi na oké iwe na-ewe gị.

Lebara onye ọ bụla dị mpako anya ma weda ya ala.

12 Lebara onye ọ bụla dị mpako anya ma wetuo ya ala,

Zọpịakwa ndị ajọ omume n’ebe ha guzo.

13 Zoo ha niile n’ájá.

Kpọchie ha* n’ebe zoro ezo.

14 M ga-ekwetazi*

Na ị ga-ejili ike* gị zọpụta onwe gị.

15 Chebaragodị Enyí Mmiri* echiche, bụ́ nke m kere otú m kere gị.

Ọ na-ata ahịhịa otú ehi na-ata.

16 Legodị otú úkwù ya si sie ike

Nakwa otú afọ ya si sie ike.

17 Ọ na-eme ka ọdụ ya dị ka osisi sida.

Akwara apata ụkwụ ya dị ka ihe a kpara akpa.

18 Ọkpụkpụ ya dị ka ihe e ji ọla kọpa mee.

Aka ya na ụkwụ ya dị ka ígwè a kpara akpa.

19 Ọ bụ ya bụ nke mbụ nakwa nke kachanụ n’anụ ndị dị ka ya Chineke kere.

Ọ bụ naanị Onye kere ya nwere ike iji mma agha gaa ya nso.

20 N’ihi na ugwu dị iche iche, bụ́ ebe anụ ọhịa niile na-egwuri egwu,

Na-emepụtara ya nri.

21 Ọ na-edina ala n’okpuru osisi lotọs,

N’ebe e nwere ahịhịa amị n’ebe mmiri na-adọ.

22 Ndò osisi lotọs na-ekpuchi ya.

Osisi pọpla nke na-adị na ndagwurugwu na-agba ya gburugburu.

23 Ọ bụrụ na e nwee ebili mmiri n’osimiri, ọ naghị atụ ụjọ.

Ọ bụrụgodị na Osimiri Jọdan+ asọrọ n’ike n’ike na-abịa n’ihu ya, obi na-esi ya ike.

24 È nwere onye nwere ike ịnwụde ya mgbe ọ na-ele onye ahụ anya

Ma ọ bụ jiri nko* dụpuo ya imi?

41 “Ị̀ ga-ejili nko azụ̀ jide Agụ Iyi*+

Ma ọ bụ jiri eriri kegide ire ya?

 2 Ị̀ ga-aganyeli eriri n’oghere imi ya

Ma ọ bụ jiri nko* dụpuo agba ya?

 3 Ọ̀ ga-arịọ gị arịrịọ ọtụtụ ugboro,

Ka ọ̀ ga-eji nwayọọ gwa gị okwu?

 4 Ọ̀ ga-ekwe ka gị na ya gbaa ndụ

Ka i jiri ya mere ohu ná ndụ gị niile?

 5 Ị̀ ga-egwusa ya egwu otú e si egwusa nnụnụ

Ma ọ bụ kenye ya eriri ka ụmụaka gị ndị nwaanyị jiri ya gwurie egwu?

 6 Ndị ahịa hà ga na-ekwe ya ọnụ?

Hà ga-ekere ya ndị na-azụ ahịa?

 7 Ì nwere ike ịmanyeju ya ube n’ahụ́+

Ma ọ bụ manyejuo ya ube e ji egbu azụ̀ n’isi?

 8 Tụkwasị ya aka gị.

Ị ga-echetazi ọgụ gị na ya lụrụ, ị gaghịkwa anwa anwa tụkwasị ya aka ọzọ.

 9 Olileanya ọ bụla mmadụ nwere na ọ ga-emeri ya bụ n’efu.

Anya nkịtị ị hụrụ ya ga-eme ka egwu jide gị.*

10 E nweghị onye ga-anwa anwa kpasuo ya.

Ònyezi nwere ike iguzo n’ihu m?+

11 È nwere onye bu ụzọ nye m ihe ọ bụla nke mere m ga-eji kwụghachi ya ihe o nyere m?+

Ihe niile dị n’ụwa* bụ nke m.+

12 M ga-ekwukwa banyere ụkwụ ya na aka ya,

Banyere otú o si sie ike nakwa otú ahụ́ ya si dị egwu.

13 Ònye gbatụrụla ya akpụkpọ?

Ònye ga-abanyeli ya n’ọnụ ma o meghee agba ya?

14 Ònye ga-amanyeli ya ka o meghee ọnụ* ya?

Ezé ya niile na-emenye ụjọ.

15 Azụ ya niile bụ akpịrịkpa akpịrịkpa*

Ndị rapagidesiri ike n’ibe ha.

16 Nke ọ bụla rapagidesiri ike n’ibe ya

Nke na ikuku enweghị ike isi n’etiti ha gafere.

17 Ha tapaara n’ahụ́ ibe ha.

Ha nyakọtara ọnụ, e nweghịkwa ike ikewa ha.

18 Ìhè na-enwupụta ma o zee ume,

Anya ya na-enwukwa ka ìhè na-enwu ma chi bọwa.

19 Ihe yiri àmụ̀mà na-esi ya n’ọnụ apụta.

Ikerike ọkụ na-esi ya n’ọnụ apụta.

20 Anwụrụ ọkụ na-esi n’oghere imi ya apụta

Otú anwụrụ ọkụ si esi n’ekwú a wụnyere ahịhịa amị apụta.

21 Ume ọ na-ekupụta na-eme ka icheku ọkụ nwuru ọkụ,

Ire ọkụ na-esikwa ya n’ọnụ apụta.

22 Olu ya siri ezigbo ike.

Ezigbo ụjọ na-ejide onye ọ bụla zutere ya.

23 Akpụkpọ ahụ́ ya fụkọtara afụkọta.

Ha siri ezigbo ike ka à ga-asị na e ji ígwè kpụọ ha nke na ha enweghị ike ikpekapụ ekpekapụ.

24 Obi ya siri ike ka nkume.

N’eziokwu, o siri ike ka nnukwu nkume e ji egwe nri.

25 O bilie ọtọ, ụjọ na-ejidedị ndị dike.

Mkpọtụ ọ na-eme n’ime mmiri na-eyi egwu.

26 E nweghị mma agha nwere ike imerụ ya ahụ́,

Ma ube ma akụ́ ma ngwá agha ọzọ.+

27 Ọ na-ewere ígwè ka okporo ahịhịa ọka,

Were ọla kọpa ka osisi rere ure.

28 Akụ́ anaghị eme ka ọ gbaa ọsọ.

E jiri èbè* gbaa ya nkume, ọ na-adị ya ka à tụrụ ya ahịhịa ọka.

29 Ọ na-ewere okpiri ka ahịhịa ọka,

Mkpọtụ árọ̀ na-eme na-atọkwa ya ọchị.

30 Okpuru afọ ya dị ka mpekere ite ụrọ ndị ọnụ ha pịrị apị.

Ọ na-agbasa onwe ya n’apịtị ka ihe e ji azọcha ọka.+

31 Ọ na-eme ka ala ala osimiri na-agbọ agbọ ka mmiri e sinyere n’ite.

Ọ na-eme ka oké osimiri na-agbọ ụfụfụ ka ite mmanụ otite e sinyere n’ọkụ.

32 Ọ na-eme ka mmiri na-agbọ ụfụfụ mgbe ọ na-egwugharị na mmiri.

Mmadụ ga-eche na oké osimiri gbara isi awọ́.

33 E nweghị ihe yiri ya n’ụwa.

E kere ya ka ọ ghara ịna-atụ ihe ọ bụla ụjọ.

34 Ọ na-ele anụ ọ bụla dị mpako anya n’atụghị egwu.

Ọ bụ eze anụ ọhịa niile siri ike.”

42 Job gwaziri Jehova, sị:

 2 “Ugbu a, amatala m na i nwere ike ime ihe niile.

E nweghị ihe ọ bụla i bu n’obi ime nke ị na-agaghị emeli.+

 3 Ị sịrị, ‘Ònye bụ onye a nke na-agba otú m si eme ihe ụkwụ n’agbanyeghị na e nweghị ihe ọ ma?’+

N’eziokwu, m kwuru okwu n’aghọtaghị

Ihe ndị juru m anya, bụ́ ihe ndị m na-amaghị.+

 4 Ị sịrị, ‘Biko, gee ntị, m ga-ekwu okwu.

M ga-ajụ gị ajụjụ, ị ga-azakwa m.’+

 5 Ntị m anụla banyere gị.

Ma ugbu a, eji m anya m na-ahụ gị.

 6 Ọ bụ ya mere m ji asị na ekwukwaghị m ihe m kwuru.+

Anọzi m ọdụ n’ájá nakwa ná ntụ iji gosi na echegharịala m.”+

7 Mgbe Jehova gwachara Job okwu ndị a, Jehova gwara Elifaz onye Timan, sị:

“M na-ewesa gị na ndị enyi gị abụọ ezigbo iwe+ maka na unu ekwughị eziokwu banyere m+ otú ohu m Job kwuru. 8 Ugbu a, kpụrụnụ oké ehi asaa na ebule asaa gakwuru ohu m Job, chụọkwanụ àjà a na-esu ọkụ maka mmehie unu. Ohu m Job ga-ekpere unu ekpere.+ M ga-anụ arịrịọ ọ ga-arịọ m ka m ghara ime unu ihe m kwesịrị ime unu maka nzuzu unu zuzuru, n’ihi na unu ekwughị eziokwu banyere m otú ohu m Job kwuru.”

9 Elifaz onye Timan, Bildad onye Shua, na Zofa onye Neama* gara mee ihe Jehova gwara ha ka ha mee. Jehova nụrụ ekpere Job.

10 Mgbe Job kpechaara ndị enyi ya ekpere,+ Jehova mere ka Job kwụsị ịta ahụhụ,+ meekwa ka ọ bụrụghachi ọgaranya. Jehova nyere ya ihe niile o nweburu okpukpu abụọ.+ 11 Ụmụnne ya ndị nwoke niile na ụmụnne ya ndị nwaanyị niile na ndị niile bụ́bu ndị enyi ya+ bịakwutere ya soro ya rie nri n’ụlọ ya. Ha sịrị ya ndo ma kasie ya obi maka nsogbu niile Jehova kwere ka ha bịara ya. Onye ọ bụla n’ime ha nyere ya otu mkpụrụ ego na otu mgbaaka ọlaedo.

12 Jehova gọziri ngwụcha ndụ Job karịa mmalite ya.+ Job wee nwee puku atụrụ iri na anọ (14,000), puku kamel isii (6,000), puku ehi abụọ (2,000),* na otu puku (1,000) nne jakị.+ 13 Ọ mụkwara ụmụ nwoke asaa ọzọ na ụmụ nwaanyị atọ ọzọ.+ 14 Ọ gụrụ nwa ya nwaanyị nke mbụ Jimaịma, gụọ nke abụọ Kezaya, gụọ nke atọ Kerin-hapọk. 15 N’ala ahụ niile, e nweghị ụmụ nwaanyị mara mma ka ụmụ Job ndị nwaanyị. Nna ha kenyekwara ha ihe otú o kenyere ụmụnne ha ndị nwoke.

16 Mgbe ihe ndị a mechara, Job dịrị ndụ otu narị afọ na iri anọ (140). Ọ hụkwara ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya, ruo ọgbọ nke anọ. 17 Job nwụziri mgbe o merela ezigbo agadi, ndụ ya jukwara ya afọ.

O nwere ike ịbụ na Job pụtara “Onye A Kpọrọ Asị.”

Ma ọ bụ “nke kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ.”

Na Hibru, “ehi abụọ abụọ dị ụzọ narị ise.”

Na Hibru, “nne jakị.”

Ma ọ bụ “n’ụlọ onye nke ọ bụla o ruuru.”

Ihe a bụ akpaala okwu Hibru nke pụtara ụmụ Chineke bụ́ ndị mmụọ ozi.

Na Hibru, “Ì tinyela obi gị n’ebe ohu m Job nọ?”

Ma ọ bụ “nke kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ.”

Na Hibru, “Ọ̀ bụ na ị gbaghị ya na ụlọ ya na ihe niile o nwere ogige?”

O nwere ike ịbụ, “Àmụ̀mà.”

Na Hibru, “ọtọ.”

Na Hibru, “ọtọ.”

Ma ọ bụ “o kwujọghịkwa Chineke.”

Ihe a bụ akpaala okwu Hibru nke pụtara ụmụ Chineke bụ́ ndị mmụọ ozi.

Na Hibru, “Ì tinyela obi gị n’ebe ohu m Job nọ?”

Ma ọ bụ “nke kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ.”

Na Hibru, “ka m loo ya.”

Na Hibru, “Akpụkpọ ahụ́ laara akpụkpọ ahụ́. Mmadụ ga-enye.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Na Hibru, “tie ọkpụkpụ ya na anụ ahụ́ ya ihe.”

Ma ọ bụ “mee ka Job nwee ọnyá ọjọọ n’ahụ́.”

O nwere ike ịbụ na Timan, Shua, na Neama bụ ma aha obodo ma aha ezinụlọ.

Na Hibru, “bụọ ụbọchị ya ọnụ.”

Na Hibru, “Levayatan.” Gụọ Nkọwa Okwu.

O nwere ike ịbụ, “ndị rụụrụ onwe ha ebe dakpọsịrị adakpọsị.”

Ma ọ bụ “ndị ọkwá ha gbagotere n’ụlọ eze.”

Na Hibru, “enye onye na-ata ahụhụ ìhè.”

Na Hibru, “Ndị obi na-atọ ụtọ mgbe ha chọtara ili.”

Ma ọ bụ “ndị na-ejere ya ozi.”

Na Hibru, “fọdụzie ndị bi n’ụlọ ájá, ndị a tọrọ ntọala ha n’ájá.”

N’Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.

O nwere ike ịbụ ndị mmụọ ozi ka a na-ekwu.

Ma ọ bụ “gị na nkume ndị dị n’ọhịa ga-agba ndụ.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m ekweghị.”

Ma ọ bụ “egosi mmadụ ibe ya ịhụnanya pụrụ iche.”

Ma ọ bụ “obere iyi.”

Ma ọ bụ “Jirikwa enyi unu gbanweta ihe.”

Na Hibru, “Ụbọchị m na-agafe ọsọ ọsọ karịa osisi a gbanyere eri nke onye na-ekwe ákwà ji ekwe ákwà.”

Na Hibru, “Na anya m agaghị ahụ ihe ọma.”

Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “Ihe ndina m.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”

Na Hibru, “ọkpụkpụ m.”

Na Hibru, “Gị etinyekwa obi gị.”

Na Hibru, “ụbọchị anyị n’ụwa bụ onyinyo.”

Ma ọ bụ “onye kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ.”

Na Hibru, “ụlọ.”

Ma ọ bụ “ndị kwụsiri ike n’ebe ọ nọ.”

Na Hibru, “ejide ndị ọjọọ aka.”

Ma ọ bụ “achọọ ịkpọpụ Chineke ụlọikpe.”

Ma ọ bụ “na-ewepụ.”

O nwere ike ịbụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Nnukwu Anụ Bea (Ọsa Mejọ).

O nwere ike ịbụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Ọrayọn.

O nwere ike ịbụ kpakpando Pledis ndị dị n’ìgwè kpakpando a na-akpọ Tọrọs.

Na Hibru, “ime ime ụlọ ndị dị n’ebe ndịda.”

O nwere ike ịbụ na Rehab a bụ nnukwu anụ mmiri.

O nwere ike ịbụ, “onye mụ na ya nwere ikpe.”

Na Hibru, “Ònye ga-akpọ m ikpe?”

Ma ọ bụ “Ọ bụrụgodị na m kwụsiri ike n’ebe ọ nọ.”

Na Hibru, “na m gbagọrọ agbagọ.”

Ma ọ bụ “Ọ bụrụgodị na m kwụsiri ike n’ebe ọ nọ.”

Ma ọ bụ “M kpọọla ndụ m asị.”

Na Hibru, “ihu.”

Na Hibru, “ka onye ajọ omume.”

Ma ọ bụ “akanwụ.”

Na Hibru, “ibikwasị anyị abụọ aka.”

Na Hibru, “ga-ewepụ ụtarị ya n’ahụ́ m.”

Na Hibru, “Ọ̀ bụ na ị wụpụghị m ka mmiri ara ehi, meekwa ka m kpụkọta ọnụ ka chiiz?”

Na Hibru, “mmụọ.”

Ma ọ bụ “m gbasapụtụ ihu.”

Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “ndị ụkwụ ha na-ama jijiji.”

O nwere ike ịbụ, “gwa ụwa okwu.”

Na Hibru, “mmụọ.”

Na Hibru, “okpo ọnụ.”

Ma ọ bụ “gbara aka ihe niile.”

Na Hibru, “na-atọpụ ájị̀ ndị dị ike kere.”

Ma ọ bụ “Ùnu ga-asọ ya anya?”

Na Hibru, “bụ ilu ntụ.”

Na Hibru, “Gịnị mere m ji atagide anụ ahụ́ m ezé?”

Ma ọ bụ “onye kwụsịrị ife ya fewe chi ọzọ.”

O nwere ike ịbụ, “Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mmadụ omume, m ga-agbachi nkịtị nwụọ.”

Na Hibru, “Naanị ihe abụọ ka ị na-agaghị eme m.”

Na Hibru, “ọ.” O nwere ike ịbụ Job ka a na-ekwu.

N’Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.

O nwere ike ịbụ, “e mechaa, e gbupụ ya.”

Na Hibru, “m.”

Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ.” Ifufe a na-ekpo ọkụ. Ọ na-esi n’ala ịkpa.

Na Hibru, “Egbugbere ọnụ.”

Na Hibru, “achịcha.”

Ya bụ, olileanya ọ bụla o nwere na ihe ga-adịghachiri ya mma.

Na Hibru, “n’ọnụ ya.”

Ma ọ bụ “ndị kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ.”

Ma ọ bụ “na-eri ngarị.”

Ma ọ bụ “ndị mụ na ha na-ezukọta.”

Ma ọ bụ “ihe dị n’akpa ilu.”

Ma ọ bụ “Ike.”

Na Hibru, “Eliela m mpi m n’ájá.”

O nwere ike ịbụ, “Mgbe m na-ele Chineke anya n’ehighị ụra.”

Na Hibru, “ji atụ ilu.”

Ma ọ bụ “ndị kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ.”

Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “àkwà m.”

Ma ọ bụ “ili.”

Ya bụ, olileanya m.

Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ọ ga-abụ Job, ndị dị ka ya, ma ọ bụ ndị na-emetara ya ebere.

O nwere ike ịbụ, “ndị na-adịghị ọcha.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “na-ete ụkwụ.”

Ya bụ, a ga-eme ka ọ nwụọ ọnwụ ike.

Na Hibru, “Ihe na-abụghị nke ya.”

Ma ọ bụ “sọlfọ na-ere ọkụ.”

Na Hibru, “Ọ gaghị enwe aha.”

Ma ọ bụ “n’ebe o bi ka mbịarambịa.”

Na Hibru, “mkpụrụ obi m.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “akparịala m.”

Ma ọ bụ “Ndị ikwu.”

Ma ọ bụ “ka o nweere m ọmịiko.”

Na Hibru, “ụmụ afọ m,” ya bụ, ụmụ si n’afọ nne m.

Na Hibru, “Eji m akpụkpọ ezé m gbalaga.”

Ma ọ bụ “opu.”

Na Hibru, “guzoro n’elu ájá.”

Ma ọ bụ “Akụrụ m akwụsịla ịrụ ọrụ n’ime ahụ́ m.”

Ma ọ bụ “ụmụ mmadụ; Adam.”

Ma ọ bụ “onye kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ.”

Na Hibru, “ire ya gbuo ya.”

Na Hibru, “Ọ.”

Ma ọ bụ “n’akpa ilu.”

Na Hibru, “ya.”

Ma ọ bụ “bụrụkwa ndị ukwu.”

Ma ọ bụ “n’otu ntabi anya,” ya bụ, ha na-anwụ n’ataghị ahụhụ.

Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “ịmata ụzọ gị.”

Na Hibru, “jeere ya ozi.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Na Hibru, “ga-aṅụ ọnụma Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”

Na Hibru, “Mgbe ụmị ọkpụkpụ ya ka dị mmiri mmiri.”

Na Hibru, “Ọ ga-adọkpụrụkwa mmadụ niile ka ha soro ya.”

Ma ọ bụ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ọ̀ na-enwe obi ụtọ.”

Ma ọ bụ “ị kwụsiri ike n’ebe ọ nọ.”

Na Hibru, “Ị na-eyipụ ndị gba ọtọ ákwà ha.”

Ma ọ bụ “ụmụ na-enweghị nne na nna.”

Okwu Hibru a sụgharịrị ebe a pụtara ọnyà ma ọ bụ ụgbụ e ji ejide nnụnụ.

Na Hibru, “osimiri.”

Ma ọ bụ “ọlaedo Ofa.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ya.”

O nwere ike ịbụ, “Ọ bụ n’ubi ka ha na-aga eweta nri anụ.”

O nwere ike ịbụ, “Ha na-azọchapụta mmanụ n’agbata obere mgbidi ndị a rụrụ n’ubi ndị dị ná mkpọda ugwu.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi dị iche iche.”

O nwere ike ịbụ, “Ma Chineke anaghị ekwu na e nwere onye mehiere.”

Na Hibru, “na-egwupu.”

Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “Akpa nwa.”

Na Hibru, “Ọ.”

Na Hibru, “Ọ.”

Na Hibru, “n’ụzọ ha.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Na Hibru, “n’ebe ya dị elu.”

Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu

Na Hibru, “ya.”

Ma ọ bụ “dị n’Abadọn.”

Na Hibru, “Rehab.”

Ma ọ bụ “na-eji ifufe ya.”

Ma ọ bụ “agwọ na-amịgharị amịgharị.”

Na Hibru, “Egbugbere ọnụ.”

Ma ọ bụ “ata m ụta.”

Ma ọ bụ “onye kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

N’Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.

Na Hibru, “ma e nweghị ihe ọ ga-eweta n’ubi.”

O nwere ike ịbụ, “Ha ga-esi n’ebe ha bi na-akụrụ ya aka iji kwaa ya emo, na-afụkwara ya mkpọrọhịhị.”

O nwere ike ịbụ na ihe a na-ekwu bụ otú e si egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala.

Na Hibru, “n’ala ndị dị ndụ.”

Ma ọ bụ “ọlaedo Ofa.”

Ma ọ bụ “ọlaedo a nụchara anụcha.”

Ma ọ bụ “n’okpuru eluigwe.”

Na Hibru, “Mgbe ọ tụrụ otú ifufe ga-adịru n’arọ.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “ndị na-ejere m ozi.”

Na Hibru, “gaa zoo.”

Ma ọ bụ “uwe na-enweghị aka.”

Na Hibru, “n’akwụ́ m.”

Osisi a na-adị n’ọzara.

Ma ọ bụ “ahịhịa ogwu.”

Na Hibru, “A pịara ha ihe pịapụ ha n’obodo.”

Na Hibru, “ji atụ ilu.”

O nwere ike ịbụ, “E nweghị onye na-enyere ha aka.”

O nwere ike ịbụ, “Nnukwu ahụhụ m na-ata agbanweela otú ahụ́ m dị.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m erughịrị.”

O nwere ike ịbụ, “Ahụ́ ọkụ.”

Na Hibru, “nwaanyị na-amaghị nwoke.”

Ma ọ bụ “Ka e bibiekwa ụmụ m mụtara.”

Na Hibru, “gbaa agada n’elu ya.”

Ma ọ bụ “Fopụkwa.”

Ma ọ bụ “Mgbe mụ na ha nwere ikpe.”

Na Hibru, “bilie ọtọ?”

Na Hibru, “n’akpa nwa.”

Na Hibru, “mee ka anya nwaanyị di ya nwụrụ ghara ịhụcha ụzọ.”

Na Hibru, “malite n’afọ nne m.”

O nwere ike ịbụ, “Mgbe m hụrụ na e nwere ndị na-akwado m n’ọnụ ụzọ ámá obodo.”

Ma ọ bụ “ìhè na-enwu.”

Na Hibru, “zoo ihe ọjọọ m mere n’akpa uwe m?”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi nke ndị nwe ya.”

Ma ọ bụ “maka na ọ bụ onye ezi omume n’anya onwe ya.”

Ma ọ bụ “baara Job mba.”

Ma ọ bụ “etu onye ọ bụla aha.”

Na Hibru, “Ire m na okpo ọnụ m.”

Na Hibru, “otu ugboro nakwa ugboro abụọ.”

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”

Na Hibru, “mkpụrụ obi ya.”

Ma ọ bụ “n’ili.”

Ma ọ bụ “ngwá ọgụ.”

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”

Na Hibru, “ndụ ya.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ya anaghịdị.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ya; Ndụ ya.”

Ma ọ bụ “ili.”

Ma ọ bụ “mmụọ ozi.”

Ma ọ bụ “n’ili.”

Ma ọ bụ “Ka ahụ́ gbasie ya ike.”

Na Hibru, “ga-abụrụ ndị mmadụ abụ.”

O nwere ike ịbụ, “Ma ọ baraghị m uru.”

Ma ọ bụ “ndụ.”

Ma ọ bụ “n’ili.”

Na Hibru, “Ugboro abụọ, ugboro atọ.”

Ma ọ bụ “n’ili.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”

Na Hibru, “okpo ọnụ.”

Na Hibru, “Anụ ahụ́.”

Ma ọ bụ “onye kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ.”

O nwere ike ịbụ, “Nna m, ka a nwalee Job.”

O nwere ike ịbụ Chineke ka ọ na-agwa.

O nwere ike ịbụ, “Ọ na-echi ndị mmadụ eze.”

Ma ọ bụ “ngwá ọgụ.”

Ma ọ bụ “Ndị kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ.”

Ma ọ bụ “ndị na-agba akwụna n’ụlọ arụsị.” O nwere ike ịbụ na ịgba akwụna a bụ ụdị nke e ji efe chi dị iche iche.

O nwere ike ịbụ, “na-anwụkọ.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ha.”

Na Hibru, “ọ.”

Na Hibru, “ka ị kụọ aka,” ya bụ, ụdị ịkụ aka na-egosi mkparị.

O nwere ike ịbụ, “katọtụrụla ya; kpọtụrụla ya ka ọ zaa ajụjụ.”

Ma ọ bụ “ịchọpụta.”

Ma ọ bụ “n’ụlọikwuu ya.”

Na Hibru, “ìhè.”

Ma ọ bụ “ala ala.”

O nwere ike ịbụ, “na-eji ihe ndị a ekpechitere ndị mmadụ ọnụ.”

O nwere ike ịbụ, “ihe.”

Ma ọ bụ “si enye ígwé ojii iwu.”

Ma ọ bụ “enyo e ji ígwè kpụọ.” Ọ bụ ígwè, ọla nchara ma ọ bụ ọla kọpa ka e ji eme enyo n’oge ochie. E mechakwara na-eji gbamgbam, ọlaọcha, nakwa ọlaedo eme ya.

Ya bụ, anyanwụ.

Ihe a bụ akpaala okwu Hibru nke pụtara ndị mmụọ ozi.

Na Hibru, “n’akpa nwa.”

Na Hibru, “Gbajiekwa aka ha weliri elu.”

O nwere ike ịbụ, “ebe àmụ̀mà si egbu.”

O nwere ike ịbụ kpakpando Pledis ndị dị n’ìgwè kpakpando a na-akpọ Tọrọs.

O nwere ike ịbụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Ọrayọn.

Na Hibru, “Mazarọt.”

O nwere ike ịbụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Nnukwu Anụ Bea (Ọsa Mejọ).

O nwere ike ịbụ, “mmadụ.”

O nwere ike ịbụ, “mee ka uche.”

Na Hibru, “ewu na-ebi n’ugwu.”

N’asụsụ Hibru, aha a kpọrọ jakị ọhịa nke mbụ dị iche n’aha a kpọrọ nke abụọ. O gosiri na ha bụ ụdị jakị ọhịa abụọ.

Ma ọ bụ “n’ebe ị na-etinyere anụ ụlọ nri.”

Na Hibru, “bulatara gị mkpụrụ.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Ma ọ bụ “ugbene.”

Ma ọ bụ “shekeleke.”

Na Hibru, “ka o chefuo amamihe.”

O nwere ike ịbụ, “Ọ naghị ekwe na ọ bụ ụda opi ka ọ na-anụ.”

Na Hibru, “otu ugboro, ugboro abụọ.”

Na Hibru, “Kechie ihu ha.”

Ma ọ bụ “ga-aja gị mma.”

Na Hibru, “aka nri.”

Na Hibru, “Behimọt.”

Na Hibru, “ọnyà.”

Na Hibru, “Levayatan.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “ogwu.”

Ma ọ bụ “ga-akwada gị n’ala.”

Ma ọ bụ “n’okpuru eluigwe.”

Na Hibru, “ihu.”

O nwere ike ịbụ, “Ihe na-ebu ya isi bụ na ahụ́ ya bụ akpịrịkpa akpịrịkpa.”

Èbè bụ ihe yiri katapọt.

O nwere ike ịbụ na Timan, Shua, na Neama bụ ma aha obodo ma aha ezinụlọ.

Na Hibru, “ehi abụọ abụọ dị ụzọ otu puku.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya