Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Levitikọs 1:1-27:34
  • Levitikọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Levitikọs
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Levitikọs

LEVITIKỌS

1 Jehova wee kpọọ Mosis ma si n’ụlọikwuu nzute+ gwa ya okwu, sị: 2 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu chọrọ iji anụ ụlọ chụọrọ Jehova àjà, unu ga-esi n’ìgwè ehi ma ọ bụ n’ìgwè ewu na atụrụ unu weta anụ unu ga-eji chụọ ya.+

3 “‘Ọ bụrụ na ọ ga-esi n’ìgwè ehi weta anụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ, ọ ga-eweta oké ehi ahụ́ dị mma.+ Ọ ga-eji obi ya+ weta ya n’ihu Jehova, n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 4 Ọ ga-ebikwasị aka ya n’isi anụ ahụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ. A ga-anabatakwa ya ka e jiri ya kpuchiere ya mmehie.

5 “‘A ga-egbu oké ehi ahụ n’ihu Jehova. Ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà,+ ga-eche ọbara ya n’ihu Chineke ma fesa ọbara ahụ n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà ahụ+ dị n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 6 A ga-agba anụ ahụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ akpụkpọ ma gburie ya.+ 7 Ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà, ga-etinye ọkụ n’ebe ịchụàjà+ ma sonye nkụ n’ọkụ ahụ. 8 Ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà, ga-edo anụ ahụ e gburisịrị egburisị+ n’usoro, dosakwa isi ya na abụba ya* n’elu nkụ e sonyere n’ọkụ ahụ dị n’ebe ịchụàjà. 9 A ga-eji mmiri saa eriri afọ ya na ụkwụ ya. Onye nchụàjà ga-esukwa ha niile ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.+

10 “‘Ọ bụrụ na ọ ga-esi n’ìgwè ewu na atụrụ+ weta ebule ma ọ bụ ewu a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ, o kwesịrị iweta oké nke ahụ́ dị mma.+ 11 A ga-egbu ya n’akụkụ ebe ugwu nke ebe ịchụàjà n’ihu Jehova. Ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà, ga-efesa ọbara ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà.+ 12 Ọ ga-egburisị ya. Onye nchụàjà ga-edokwa ha n’usoro, ma isi ya ma abụba ya,* n’elu nkụ e sonyere n’ọkụ ahụ dị n’ebe ịchụàjà. 13 Ọ ga-eji mmiri saa eriri afọ ya na ụkwụ ya. Onye nchụàjà ga-esukwa ha niile ọkụ ma mee ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.

14 “‘Ma, ọ bụrụ nnụnụ ka ọ ga-eweta ka e jiri chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, ọ ga-esi ná nduru ma ọ bụ n’ụmụ kpalakwukwu weta ya.+ 15 Onye nchụàjà ga-eweta ya n’ebe ịchụàjà, tụbie ya olu ma suo ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà. Ma ọ ga-ahapụ ya ka ọbara ya gụsịa n’akụkụ ebe ịchụàjà. 16 Ọ ga-ewepụ akpa nri ya, tụpụsịa ábụ́bà* ya ma wụsa ha n’akụkụ ebe ịchụàjà, n’ebe ọwụwa anyanwụ, n’ebe a na-ekposa ntụ.*+ 17 Ọ ga-esi n’agbata nku ya abụọ nyawaa ya, ma ọ gaghị anyakapụ ya anyakapụ. Onye nchụàjà ga-esu ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, n’elu nkụ dị n’ọkụ. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.

2 “‘Ọ bụrụ na mmadụ* chọrọ ịchụrụ Jehova àjà ọka,+ àjà ya kwesịrị ịbụ ntụ ọka e gwere nke ọma. Ọ ga-awụ mmanụ n’elu ya ma tụkwasị frankinsens n’elu ya.+ 2 Ọ ga-ebuteziri ya ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà. Onye nchụàjà ga-ekporo ntụ ọka e gwere nke ọma ga-eju ọbụ aka ya nakwa mmanụ na frankinsens ya niile, ọ ga-esukwa ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, ka ọ bụrụ ihe nọchiri anya àjà+ e wetara. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. 3 Ihe ọ bụla fọrọ n’àjà ọka ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya.+ Ọ bụ ihe kacha nsọ+ si n’àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova.

4 “‘Ọ bụrụ na ị ga-eji achịcha e mere n’ekwú chụọ àjà ọka, ọ ga-abụ achịcha e ji ntụ ọka e gwere nke ọma mee, ya bụ, ogbe achịcha ndị na-ekoghị eko dị okirikiri a gwara mmanụ ma ọ bụ achịcha ndị na-ekoghị eko dị fere fere a wụrụ mmanụ.+

5 “‘Ọ bụrụ na achịcha ị ga-eji chụọ àjà ọka bụ nke e mere n’ite dị mbadamba,+ ọ ga-abụ achịcha na-ekoghị eko e ji ntụ ọka e gwere nke ọma mee, nke a gwara mmanụ. 6 A ga-anyawasị ya iberibe iberibe, ị ga-awụsakwa ya mmanụ.+ Ọ bụ àjà ọka.

7 “‘Ọ bụrụ na achịcha ị ga-eji chụọ àjà ọka bụ nke e mere n’ite e ji eme achịcha, ọ ga-abụ achịcha e ji ntụ ọka e gwere nke ọma na mmanụ mee. 8 Ị ga-ewetara Jehova àjà ọka e ji ihe ndị a mee. A ga-enyekwa ya onye nchụàjà, onye ga-eweta ya nso n’ebe ịchụàjà. 9 Onye nchụàjà ga-ewere ụfọdụ n’ime àjà ọka ahụ ka ọ bụrụ ihe nọchiri anya àjà+ e wetara. Ọ ga-esukwa ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.+ 10 Ihe fọrọ n’àjà ọka ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ ihe kacha nsọ si n’àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova.+

11 “‘E nweghị àjà ọka unu ga-achụrụ Jehova a ga-etinye ihe na-eko achịcha,+ n’ihi na unu agaghị eji ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha ma ọ bụ mmanụ aṅụ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ.

12 “‘Unu nwere ike iwetara ha Jehova ka mkpụrụ mbụ,+ ma a gaghị eweta ha n’ebe ịchụàjà ka e jiri ha chụọ àjà na-esi ísì ọma.*

13 “‘Ị ga-etinye nnu n’àjà ọka gị ọ bụla. Ekwela ka nnu ọgbụgba ndụ Chineke gị kọọ ụkọ n’àjà ọka gị. Ị ga-eweta nnu+ mgbe ọ bụla ị na-eweta ihe ị ga-eji chụọ àjà.

14 “‘Ọ bụrụ na ị ga-esi ná mkpụrụ mbụ kara aka wetara Jehova àjà ọka, ị ga-eweta ọka ọhụrụ* e ghere eghe,* mkpụrụ ọka ọhụrụ a na-egwerighị nke ọma, ka ọ bụrụ àjà ọka si ná mkpụrụ mbụ gị kara aka.+ 15 Ị ga-awụ mmanụ n’elu ya ma tụkwasị frankinsens n’elu ya. Ọ bụ àjà ọka. 16 Onye nchụàjà ga-esu ya ọkụ ka ọ bụrụ ihe na-anọchi anya àjà+ e wetara, ya bụ, ụfọdụ n’ime ọka ahụ a na-egwerighị nke ọma na mmanụ na frankinsens ya niile. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova.

3 “‘Ọ bụrụ na àjà ọ chọrọ ịchụ bụ àjà udo,+ ọ bụrụkwa na ọ ga-esi n’ìgwè ehi weta anụ ọ ga-eji chụọ ya, ma ọ̀ bụ oké ma ọ̀ bụ nne, ọ bụ nke ahụ́ dị mma ka ọ ga-ewetara Jehova. 2 Ọ ga-ebikwasị aka ya n’isi anụ ahụ. A ga-egbukwa anụ ahụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. Ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà, ga-efesa ọbara ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà. 3 Ọ ga-eweta ụfọdụ n’ime àjà udo ahụ ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ a ga-achụrụ Jehova:+ abụba+ kpuchiri eriri afọ ya, abụba niile dị gburugburu eriri afọ ya, 4 nakwa akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha bụ́ ndị dị n’akụkụ úkwù ya. Ọ ga-ewepụta abụba kpuchiri imeju ya, wepụtakwa akụrụ ya abụọ.+ 5 Ụmụ Erọn ga-esu ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, n’elu anụ e ji chụọ àjà a na-esu ọkụ nke dị n’elu nkụ e sonyere n’ọkụ.+ Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.+

6 “‘Ọ bụrụ na ọ ga-esi n’ìgwè ewu na atụrụ weta anụ ọ ga-eji chụọrọ Jehova àjà udo, ọ ga-eweta oké ma ọ bụ nne ahụ́ dị mma.+ 7 Ọ bụrụ na ọ bụ ebule ka ọ ga-eji chụọ àjà, ọ ga-eweta ya n’ihu Jehova. 8 Ọ ga-ebikwasị aka ya n’isi anụ ahụ ọ ga-eji chụọ àjà. A ga-egbukwa anụ ahụ n’ihu ụlọikwuu nzute. Ụmụ Erọn ga-efesa ọbara ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà. 9 Ọ ga-eweta abụba si n’anụ àjà udo ahụ ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ a ga-achụrụ Jehova.+ Ọ ga-ewepụta ọdụ ya bụ́ abụba abụba nke dị n’akụkụ ọkpụkpụ azụ ya, abụba nke kpuchiri eriri afọ ya, abụba niile dị gburugburu eriri afọ ya, 10 nakwa akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha bụ́ ndị dị n’akụkụ úkwù ya. Ọ ga-ewepụta abụba kpuchiri imeju ya, wepụtakwa akụrụ ya abụọ.+ 11 Onye nchụàjà ga-esu ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà ka ọ bụrụ ihe oriri,* ya bụ, àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova.+

12 “‘Ọ bụrụ na ọ bụ ewu ka ọ ga-eji chụọ àjà, ọ ga-eweta ya n’ihu Jehova. 13 Ọ ga-ebikwasị ya aka n’isi, a ga-egbukwa ewu ahụ n’ihu ụlọikwuu nzute. Ụmụ Erọn ga-efesa ọbara ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà. 14 Ihe ọ ga-eweta ka e jiri chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ bụ abụba kpuchiri eriri afọ anụ ahụ, abụba niile dị gburugburu eriri afọ ya,+ 15 nakwa akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha bụ́ ndị dị n’akụkụ úkwù ya. Ọ ga-ewepụta abụba kpuchiri imeju ya, wepụtakwa akụrụ ya abụọ. 16 Onye nchụàjà ga-esu ha ọkụ n’ebe ịchụàjà ka ọ bụrụ ihe oriri.* Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma* a na-esu ọkụ. Ọ bụ Jehova nwe abụba niile.+

17 “‘Unu erila abụba ọ bụla ma ọ bụ ọbara ọ bụla.+ Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe n’ebe niile unu ga-ebi.’”

4 Jehova wee gwa Mosis, sị: 2 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụ ihe a ka mmadụ* ga-eme ma ọ bụrụ na o mehie n’amaghị ụma+ wee mee nke ọ bụla n’ime ihe ndị Jehova nyere iwu ka a ghara ime:

3 “‘Ọ bụrụ na onye nchụàjà e tere mmanụ*+ emehie+ wee mee ka ikpe ma ndị Izrel, ọ ga-ewetara Jehova oké ehi ahụ́ dị mma ka ọ bụrụ àjà mmehie maka mmehie o mere.+ 4 Ọ ga-akpụta oké ehi ahụ n’ihu Jehova n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute+ ma bikwasị aka ya n’isi oké ehi ahụ. Ọ ga-egbukwa oké ehi ahụ n’ihu Jehova.+ 5 Onye nchụàjà ahụ e tere mmanụ*+ ga-eweretụ ọbara oké ehi ahụ ma weta ya n’ime ụlọikwuu nzute. 6 Onye nchụàjà ahụ ga-arụnye mkpịsị aka ya n’ọbara ahụ+ ma fesa ya n’ala n’ihu Jehova, n’ihu ákwà mgbochi e ji gechie ebe nsọ ahụ. Ọ ga-eme ya ugboro asaa.+ 7 Onye nchụàjà ahụ ga-eweretụ ọbara tee na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà insens na-esi ísì ọma,+ nke dị n’ihu Jehova n’ụlọikwuu nzute. Ọ ga-awụsakwa ọbara niile fọrọ n’ọbara oké ehi ahụ n’ala ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ,+ nke dị n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.

8 “‘Ọ ga-ewepụta abụba niile dị n’oké ehi ahụ e ji achụ àjà mmehie, ma abụba kpuchiri eriri afọ ya ma abụba niile dị gburugburu eriri afọ ya, 9 nakwa akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha bụ́ ndị dị n’akụkụ úkwù ya. Ọ ga-ewepụta abụba kpuchiri imeju ya, wepụtakwa akụrụ ya abụọ.+ 10 Ọ bụ ihe ndị ahụ a na-ewepụta n’oké ehi e ji achụ àjà udo+ ka ọ ga-ewepụta. Onye nchụàjà ahụ ga-esu ha ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ.

11 “‘Ma akpụkpọ oké ehi ahụ, ya na anụ ya niile, isi ya, ụkwụ ya, eriri afọ ya, na nsị ya,+ 12 ya bụ, ihe niile fọrọ n’oké ehi ahụ, ka ọ ga-ahụ na e bupụrụ ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu ma buga ha n’ebe dị ọcha, n’ebe a na-ekpofu ntụ.* Ọ ga-edokwasị ha n’elu nkụ kpọọ ha ọkụ.+ Ọ bụ n’ebe a na-ekpofu ntụ ka a ga-akpọ ha ọkụ.

13 “‘Ọ bụrụ na ikpe ama nzukọ Izrel niile maka na ha mere mmehie n’amaghị ụma,+ ma ọgbakọ ahụ amaghị na ha emeela ihe Jehova nyere ha iwu ka ha ghara ime,+ 14 e wee mata na ha emehiela, ọgbakọ ahụ ga-eweta oké ehi ka ọ bụrụ àjà mmehie. Ha ga-eweta ya n’ihu ụlọikwuu nzute. 15 Ndị okenye nzukọ ahụ ga-ebikwasị aka ha n’isi oké ehi ahụ n’ihu Jehova, a ga-egbukwa oké ehi ahụ n’ihu Jehova.

16 “‘Onye nchụàjà e tere mmanụ* ga-eweretụ ọbara oké ehi ahụ ma weta ya n’ụlọikwuu nzute. 17 Onye nchụàjà ahụ ga-arụnye mkpịsị aka ya n’ọbara ahụ ma fesa ya n’ala n’ihu Jehova, n’ihu ákwà mgbochi.+ Ọ ga-eme ya ugboro asaa. 18 Ọ ga-eweretụ ọbara tee na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà+ nke dị n’ihu Jehova, n’ụlọikwuu nzute. Ọ ga-awụsakwa ọbara niile fọrọ afọ n’ala ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ, nke dị n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.+ 19 Ọ ga-ewepụta abụba niile dị n’oké ehi ahụ ma suo ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà.+ 20 Ọ ga-eme oké ehi a ihe o mere oké ehi nke ọzọ e ji chụọ àjà mmehie. Ọ bụ otú ọ ga-eme ya. Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ha mmehie ha,+ a ga-agbagharakwa ha. 21 Ọ ga-ahụ na e bupụrụ oké ehi ahụ ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu ma kpọọ ya ọkụ, otú ọ kpọrọ oké ehi nke mbụ ahụ ọkụ.+ Ọ bụ àjà mmehie a ga-achụ maka ọgbakọ ahụ.+

22 “‘Ọ bụrụ na onyeisi+ emee mmehie n’amaghị ụma wee mee otu n’ime ihe niile Jehova bụ́ Chineke ya nyere iwu ka a ghara ime, ikpe wee ma ya, 23 ma ọ bụkwanụ ya amata na ya adaala iwu, ọ ga-eweta nwa mkpi ahụ́ dị mma ka ọ bụrụ àjà ya. 24 Ọ ga-ebikwasị aka ya n’isi nwa mkpi ahụ ma gbuo ya n’ebe a na-egbu anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ n’ihu Jehova.+ Ọ bụ àjà mmehie. 25 Onye nchụàjà ga-eji mkpịsị aka ya rụrụ ọbara anụ ahụ e ji achụ àjà mmehie ma tee ya na mpi+ ndị dị n’ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ. Ọ ga-awụsakwa ọbara ya fọrọ afọ n’ala ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ.+ 26 Ọ ga-esu abụba ya niile ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà otú a na-eme abụba àjà udo.+ Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya, a ga-agbagharakwa ya.

27 “‘Ọ bụrụ na onye* ọ bụla ọzọ ná ndị m emehie n’amaghị ụma, ikpe ewee ma ya maka na o mere otu n’ime ihe ndị Jehova nyere iwu ka a ghara ime,+ 28 ma ọ bụkwanụ ya amata na ya emehiela, ọ ga-eweta nne ewu ahụ́ dị mma ka ọ bụrụ àjà ya maka mmehie o mere. 29 Ọ ga-ebikwasị aka ya n’isi anụ e ji achụ àjà mmehie ahụ ma gbuo ya n’otu ebe ahụ a na-egbu anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ.+ 30 Onye nchụàjà ga-eji mkpịsị aka ya rụrụ ọbara anụ ahụ ma tee ya na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ. Ọ ga-awụsakwa ọbara ya niile fọrọ afọ n’ala ebe ịchụàjà.+ 31 Ọ ga-ewepụta abụba ya niile,+ otú a na-ewepụta abụba ndị dị n’anụ e ji achụ àjà udo.+ Onye nchụàjà ga-esu ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, ka o wee bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya, a ga-agbagharakwa ya.

32 “‘Ma ọ bụrụ na ọ chọrọ iweta nwa atụrụ ka ọ bụrụ àjà maka mmehie ya, ọ ga-eweta obere nne atụrụ ahụ́ dị mma. 33 Ọ ga-ebikwasị aka ya n’isi anụ e ji achụ àjà mmehie ahụ ma gbuo ya n’ebe a na-egbu anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ ka ọ bụrụ àjà mmehie.+ 34 Onye nchụàjà ga-eji mkpịsị aka ya rụrụ ọbara anụ ahụ e ji chụọ àjà mmehie ma tee ya na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ.+ Ọ ga-awụsakwa ọbara ya niile fọrọ afọ n’ala ebe ịchụàjà. 35 Ọ ga-ewepụta abụba ya niile otú e si ewepụta abụba ndị dị n’ebule e ji achụ àjà udo. Onye nchụàjà ga-esu ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’elu àjà Jehova e suru ọkụ.+ Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie o mere, a ga-agbagharakwa ya.+

5 “‘Ọ bụrụ na mmadụ* hụrụ mgbe onye ọzọ mere mmehie ma ọ bụ nụ gbasara mmehie ahụ ma ọ bụ mara gbasara ya, ya anụkwa mgbe e kwuru n’ihu ọha na onye ma gbasara mmehie ahụ kwesịrị ikwu ya,*+ ma ọ pụtaghị kwuo ya, o mehiela. Ọ ga-aza ajụjụ maka mmehie ya.

2 “‘Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na mmadụ* metụrụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha aka, ma ọ̀ bụ ozu anụ ọhịa na-adịghị ọcha ma ọ̀ bụ ozu anụ ụlọ na-adịghị ọcha ma ọ̀ bụ ozu obere ụmụ anụmanụ ndị ọzọ* na-adịghị ọcha,+ onye ahụ bụzi onye na-adịghị ọcha, ikpe makwara ya, ọ bụrụgodị na ọ maghị na ya adịghị ọcha. 3 Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na mmadụ amaghị ụma metụ ihe ọ bụla nwere ike ime ka mmadụ ghara ịdị ọcha aka,+ ya bụ, onye ọ bụla na-adịghị ọcha ma ọ bụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha nke nwere ike ime ka ọ ghara ịdị ọcha, o wee mechaa mata gbasara ya, ikpe amala ya.

4 “‘Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na mmadụ* echeghị echiche nke ọma ṅụọ iyi na e nwere ihe ọ ga-eme, ma ọ̀ bụ ime ihe ọma ma ọ̀ bụ ime ihe ọjọọ, ma ya emechaa chọpụta na ya echeghị echiche nke ọma ṅụọ iyi ahụ, ikpe mara ya.*+

5 “‘Ọ bụrụ na ikpe mara ya na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a, ọ ga-ekwupụta+ otú o si mehie. 6 Ọ ga-ewetakwara Jehova àjà ikpe ọmụma ya maka mmehie o mere,+ ya bụ, obere nne atụrụ ma ọ bụ obere nne ewu, ka ọ bụrụ àjà mmehie. Onye nchụàjà ga-ekpuchiziri ya mmehie ya.

7 “‘Ma ọ bụrụ na ọ gaghị ewetali atụrụ, ọ ga-ewetara Jehova nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ+ ka ha bụrụ àjà ikpe ọmụma maka mmehie ya. Otu ga-abụ maka àjà mmehie, otu abụrụ maka àjà a na-esu ọkụ.+ 8 Ọ ga-ewetara ha onye nchụàjà. Onye nchụàjà ga-ebu ụzọ were nke a ga-eji chụọ àjà mmehie. Ọ ga-esi n’ihu olu ya tụbie ya olu, ma isi ya agaghị adapụ adapụ. 9 Ọ ga-efesatụ ọbara nnụnụ àjà mmehie a n’akụkụ ebe ịchụàjà, ma ọ ga-ahapụ nnụnụ a ka ọbara ya fọrọ afọ gụsịa n’ala ebe ịchụàjà.+ Ọ bụ àjà mmehie. 10 Ọ ga-eji nnụnụ nke ọzọ chụọ àjà a na-esu ọkụ otú e nyere iwu ka e si na-achụ ya.+ Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie o mere, a ga-agbagharakwa ya.+

11 “‘Ma ọ bụrụ na ọ gaghị ewetali nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, ọ ga-eweta otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa*+ ntụ ọka e gwere nke ọma ka ọ bụrụ àjà mmehie maka mmehie ya. Ọ gaghị awụ mmanụ n’elu ya ma ọ bụ tụkwasị frankinsens n’elu ya n’ihi na ọ bụ àjà mmehie. 12 Ọ ga-ewetara ya onye nchụàjà. Onye nchụàjà ga-ekporo ntụ ọka ga-eju ọbụ aka ya ka ọ bụrụ ihe nọchiri anya àjà o wetara, ọ ga-esukwa ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, n’elu àjà Jehova e suru ọkụ. Ọ bụ àjà mmehie. 13 Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie o mere, ya bụ, nke ọ bụla n’ime mmehie ndị a. A ga-agbagharakwa ya.+ Ihe fọrọ n’àjà a ga-abụ nke onye nchụàjà,+ otú a na-eme ihe fọrọ n’àjà ọka.’”+

14 Jehova gwakwara Mosis, sị: 15 “Ọ bụrụ na mmadụ* emehie n’amaghị ụma wee mebie iwu e nyere gbasara ihe ndị dị nsọ bụ́ nke Jehova,+ ọ ga-esi n’ìgwè atụrụ wetara Jehova ebule ahụ́ dị mma ka ọ bụrụ àjà ikpe ọmụma.+ Onye nchụàjà ga-ekwu shekel* ọlaọcha ole ebule ahụ ruru, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ọlaọcha ahụ.+ 16 Ọ ga-akwụ ụgwọ maka imebi iwu e nyere gbasara ebe nsọ. Ọ ga-ewetakwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ụgwọ ọ kwụrụ.+ Ọ ga-enye ya onye nchụàjà ka onye nchụàjà jiri ebule ahụ e ji achụ àjà ikpe ọmụma kpuchiere ya mmehie ya.+ A ga-agbagharakwa ya.+

17 “Ọ bụrụ na mmadụ* emehie wee mee nke ọ bụla n’ime ihe ndị Jehova nyere iwu ka a ghara ime, ọ bụrụgodị na ọ maghị na ya mehiere, ikpe mara ya. Ọ ga-azakwa ajụjụ maka mmehie ya.+ 18 Ọ ga-esi n’ìgwè atụrụ wetara onye nchụàjà ebule ahụ́ dị mma nke ruru ego ole a chọrọ ka anụ àjà ikpe ọmụma ruo.+ Onye nchụàjà ga-ekpuchiziri ya mmehie o mere n’amaghị ụma. A ga-agbagharakwa ya. 19 Ọ bụ àjà ikpe ọmụma. Ikpe mara ya maka na o mehiere Jehova.”

6 Jehova wee gwa Mosis, sị: 2 “Ọ bụrụ na mmadụ* emehie wee mejọọ Jehova,+ ghọgbuo mmadụ ibe ya n’ihe e nyere ya ka o lekọta+ ma ọ bụ n’ihe e nyere ya ka o jide, ma ọ bụkwanụ ya ezuo mmadụ ibe ya ohi ma ọ bụ jiri aghụghọ nara ya ihe, 3 ma ọ bụkwanụ ya ahụ ihe furu efu ma ghaa ụgha na ya ahụghị ya, ọ bụrụkwa na ọ ṅụrụ iyi na ya emeghị nke ọ bụla n’ime mmehie ndị a,+ ihe a ka ọ ga-eme: 4 Ọ bụrụ na o mehiere, ikpe amakwa ya, ọ ga-eweghachi ihe o zuru, ihe o ji aghụghọ nara, ihe e nyere ya ka o lekọta, ma ọ bụ ihe furu efu ọ hụrụ, 5 ma ọ bụkwanụ ihe ọ bụla ọ ṅụrụ iyi na ya ewereghị. Ọ ga-akwụcha ụgwọ ihe ahụ.+ Ọ ga-ewetakwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ego ole ihe ahụ bụ. Ọ ga-enye ya onye nwe ihe ahụ n’ụbọchị e gosiri na ikpe mara ya. 6 Ọ ga-esi n’ìgwè atụrụ wetara onye nchụàjà ebule ahụ́ dị mma ka ọ bụrụ àjà ọ ga-achụrụ Jehova maka na ikpe mara ya. Ebule ọ ga-eweta ga-eru ego ole e kwuru na anụ e ji achụ àjà ikpe ọmụma kwesịrị iru.+ 7 Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya n’ihu Jehova. A ga-agbagharakwa ya ihe ọ bụla o mere nke mere ka ikpe ma ya.”+

8 Jehova gwakwara Mosis, sị: 9 “Nye Erọn na ụmụ ya ndị nwoke iwu, sị, ‘Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà a na-esu ọkụ:+ Anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ ga-adị n’ekwú ebe ịchụàjà abalị niile ruo ụtụtụ. A ga-emekwa ka ọkụ na-enwu n’ebe ịchụàjà. 10 Onye nchụàjà ga-eyiri uwe linin+ o ji arụ ọrụ nchụàjà, yirikwa uwe úkwù*+ yichie ọtọ ya. Ọ ga-ekpopụzi ntụ*+ si n’àjà a na-esu ọkụ nke ọkụ repịara n’ebe ịchụàjà ma kposa ya n’akụkụ ebe ịchụàjà. 11 Ọ ga-eyipụ uwe ya+ yiri uwe ọzọ ma buru ntụ ahụ gaa n’ebe dị ọcha, ná mpụga ebe unu mara ụlọikwuu.+ 12 A ga-eme ka ọkụ na-enwu n’ebe ịchụàjà ahụ. Ọ gaghị anyụ anyụ. Onye nchụàjà ga na-esonye nkụ+ na ya kwa ụtụtụ ma na-edo anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ n’usoro n’elu ya. Ọ ga na-esukwa abụba anụ e ji achụ àjà udo ọkụ n’elu ya ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ.+ 13 A ga-eme ka ọkụ na-enwu n’ebe ịchụàjà mgbe niile. Ọ gaghị anyụ anyụ.

14 “‘Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà ọka:+ Ọ bụ ụmụ Erọn ndị nwoke ga na-eweta ya n’ihu Jehova, n’ihu ebe ịchụàjà. 15 Otu n’ime ha ga-esi n’ọka ahụ e gwere nke ọma e ji achụ àjà ọka kporo ntụ ọka ga-eju ọbụ aka ya, ya na mmanụ ya na frankinsens niile a tụkwasịrị n’elu ya. Ọ ga-esukwa ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. Ọ bụ ya nọchiri anya àjà ọka e wetara.+ 16 Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-eri ihe fọrọ na ya.+ A ga-eji ya mee achịcha na-ekoghị eko. A ga-anọkwa n’ebe dị nsọ rie ya. Ha ga-anọ n’ogige ụlọikwuu nzute rie ya.+ 17 A gaghị etinye ya ihe na-eko achịcha.+ Enyela m ha ya ka ọ bụrụ òkè ha nke si n’àjà e suru ọkụ+ a chụụrụ m. Ọ bụ ihe kacha nsọ,+ dị ka àjà mmehie na àjà ikpe ọmụma. 18 Nwoke ọ bụla n’ime ụmụ Erọn ga-eri ya.+ Ọ bụ òkè ha nke ga-adịgide n’ọgbọ unu niile, nke si n’àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova.+ Ihe ọ bụla metụrụ ha* ga-adị nsọ.’”

19 Jehova gwara Mosis okwu ọzọ, sị: 20 “Ihe a bụ àjà Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-achụrụ Jehova n’ụbọchị a ga-ete ya mmanụ:+ otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa*+ ntụ ọka e gwere nke ọma ka ọ bụrụ àjà ọka a na-achụ mgbe niile.+ A chụọ ọkara ya n’ụtụtụ, a chụọ ọkara ya ná mgbede. 21 A ga-agwa ya mmanụ ma mee ya n’ite dị mbadamba.+ Ị ga-eji mmanụ gwọọ ya nke ọma, nyawasịa ya iberibe iberibe ma weta ya ka ọ bụrụ àjà ọka, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. 22 Ọ bụ onye nchụàjà e tere mmanụ, onye ga-anọchi ya n’ime ụmụ ya,+ ga-achụ ya. A ga-esuru ya Jehova ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ, ka ọ bụrụ àjà a na-esucha ọkụ. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide. 23 Àjà ọka ọ bụla bụ́ maka onye nchụàjà, a ga-esucha ya ọkụ. A gaghị eri ya eri.”

24 Jehova gwakwara Mosis okwu ọzọ, sị: 25 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke, sị, ‘Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà mmehie:+ Ọ bụ n’ebe a na-egbu anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ+ ka a ga-egbukwa anụ e ji achụ àjà mmehie n’ihu Jehova. Ọ bụ ihe kacha nsọ. 26 Onye nchụàjà nke chụrụ ya n’àjà maka mmehie ga-eri ya.+ A ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya, n’ogige ụlọikwuu nzute.+

27 “‘Ihe ọ bụla metụrụ anụ àjà ahụ ga-adị nsọ. Ọ bụrụkwa na mmadụ efesa ọbara anụ ahụ n’uwe ya, a ga-anọ n’ebe dị nsọ sụọ ya. 28 A ga-akụri ite ụrọ e ji sie ya. Ma ọ bụrụ ite ọla kọpa ka e ji sie ya, a ga-ekwocha ya ma jiri mmiri saa ya.

29 “‘Nwoke ọ bụla so ná ndị nchụàjà ga-eri ya.+ Ọ bụ ihe kacha nsọ.+ 30 Ma, a gaghị eri anụ e ji achụ àjà mmehie ma ọ bụrụ na e webatara ọbara ya n’ụlọikwuu nzute ka e jiri ya kpuchie mmehie n’ebe nsọ.+ A ga-akpọ ya ọkụ.

7 “‘Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà ikpe ọmụma:+ Ọ bụ ihe kacha nsọ. 2 Ha ga na-egbu anụ e ji achụ àjà ikpe ọmụma n’ebe a na-egbu anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ. A ga-efesakwa ọbara ya+ n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà.+ 3 Ọ ga-eweta abụba ya niile,+ ya bụ, ọdụ ya nke bụ́ abụba abụba, abụba ndị kpuchiri eriri afọ ya, 4 nakwa akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha bụ́ ndị dị n’akụkụ úkwù ya. Ọ ga-ewepụta abụba kpuchiri imeju ya, wepụtakwa akụrụ ya abụọ.+ 5 Onye nchụàjà ga-esu ha ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova.+ Ọ bụ àjà ikpe ọmụma. 6 Nwoke ọ bụla so ná ndị nchụàjà ga-eri ya.+ A ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya. Ọ bụ ihe kacha nsọ.+ 7 Iwu na-achị àjà mmehie ga na-achịkwa àjà ikpe ọmụma. Ọ bụ onye nchụàjà nke ga-eji ya kpuchie mmehie nwe anụ ya.+

8 “‘Ọ bụrụ na onye nchụàjà ejiri anụ mmadụ wetara chụọ àjà a na-esu ọkụ maka onye ahụ, akpụkpọ anụ+ ahụ e ji chụọ àjà a na-esu ọkụ ga-abụ nke onye nchụàjà chụrụ àjà ahụ.

9 “‘Achịcha ọ bụla e wetara ka e jiri chụọ àjà ọka, bụ́ nke e mere n’ekwú ma ọ bụ n’ite e ji eme achịcha ma ọ bụ n’ite dị mbadamba,+ ga-abụ nke onye nchụàjà chụrụ ya n’àjà. Ọ ga-abụ nke ya.+ 10 Ma àjà ọka ọ bụla ọzọ, ma ọ̀ bụ nke a gwara mmanụ+ ma ọ̀ bụ nke ọkpọọ,+ ga-abụ nke ụmụ Erọn ndị nwoke niile. Ihe ha niile ga-eketa ga-aha.

11 “‘Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà udo+ mmadụ nwere ike iwetara Jehova: 12 Ọ bụrụ na o wetara ya iji kelee Chineke,+ ihe ndị ọ ga-eweta ya na àjà ekele ahụ bụ ogbe achịcha ndị na-ekoghị eko dị okirikiri a gwara mmanụ, achịcha ndị dị fere fere na-ekoghị eko a wụrụ mmanụ, nakwa ogbe achịcha ndị dị okirikiri e ji ntụ ọka e gwere nke ọma mee, bụ́ ndị a gwara mmanụ nke ọma. 13 Mgbe ọ na-eweta àjà udo ya, bụ́ àjà o ji ekele Chineke, ọ ga-eweta ya na ogbe achịcha ndị koro eko dị okirikiri. 14 Ọ ga-esi na ha niile were otu otu ka ọ bụrụ òkè dị nsọ ọ ga-enye Jehova. Ọ ga-abụ nke onye nchụàjà fesara ọbara anụ ahụ e ji chụọ àjà udo n’elu ebe ịchụàjà.+ 15 A ga-eri anụ o ji chụọ àjà udo, bụ́ àjà o ji ekele Chineke, n’ụbọchị ọ chụrụ ya n’àjà. Ọ gaghị edofọ nke ọ bụla ruo ụtụtụ.+

16 “‘Ọ bụrụ na ọ bụ ihe o kwere ná nkwa+ ma ọ bụ ihe si ya n’obi ka o wetara ka a chụọ n’àjà,+ a ga-eri ihe ahụ o wetara n’ụbọchị ọ chụrụ ya n’àjà. E nwekwara ike iri ihe fọrọ na ya n’echi ya. 17 Ma ihe ọ bụla fọrọ n’anụ ahụ a chụrụ n’àjà ruo n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọ ya ọkụ.+ 18 Ma ọ bụrụ na e rie ihe ọ bụla fọrọ n’anụ e ji chụọ àjà udo n’ụbọchị nke atọ, Chineke agaghị anabata onye wetara àjà ahụ. Àjà ahụ agaghị abara ya uru. Ọ bụ ihe rụrụ arụ. Onye* riri nke ọ bụla n’ime ya ga-aza ajụjụ maka mmehie ya.+ 19 A gaghị eri anụ ọ bụla metụrụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha. A ga-akpọ ya ọkụ. Onye ọ bụla dị ọcha nwere ike iri anụ dị ọcha.

20 “‘Ma onye* ọ bụla na-adịghị ọcha nke riri anụ e ji chụọ àjà udo, bụ́ nke Jehova, a ga-egbu ya.*+ 21 Ọ bụrụ na mmadụ* emetụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha aka, ma ọ̀ bụ ihe na-adịghị ọcha si n’ahụ́ mmadụ+ ma ọ̀ bụ anụmanụ na-adịghị ọcha+ ma ọ̀ bụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha na-asọ oyi,+ ma rie ụfọdụ n’ime anụ e ji chụọ àjà udo, bụ́ nke Jehova, a ga-egbu ya.’”*

22 Jehova gwakwara Mosis, sị: 23 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Unu erila abụba ọ bụla,+ ma ọ̀ bụ nke oké ehi ma ọ̀ bụ nke ebule ma ọ̀ bụ nke ewu. 24 E nwere ike iji abụba anụ nwụrụ anwụ na abụba anụ a dọgburu adọgbu mee ihe ọ bụla ọzọ, ma unu erila ya eri.+ 25 N’ihi na onye ọ bụla riri abụba si n’anụ o ji chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, a ga-egbu ya.*

26 “‘Unu erila ọbara ọ bụla+ n’ebe ọ bụla unu bi, ma ọ̀ bụ nke nnụnụ ma ọ̀ bụ nke anụmanụ ọzọ. 27 Onye* ọ bụla riri ọbara ọ bụla, a ga-egbu ya.’”*+

28 Jehova wee gwa Mosis, sị: 29 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Onye ọ bụla chọrọ ịchụrụ Jehova àjà udo ga-ewetara Jehova ụfọdụ n’ime anụ ọ ga-eji chụọ àjà udo ahụ.+ 30 Ọ ga-eji aka ya weta abụba+ anụ ahụ na okpuru afọ* ya ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ a ga-achụrụ Jehova. Ọ ga-efegharị ya ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị+ n’ihu Jehova. 31 Onye nchụàjà ga-esu abụba ahụ ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà,+ ma okpuru afọ* anụ ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị nwoke.+

32 “‘Unu ga-enye onye nchụàjà ụkwụ aka nri anụ ahụ ka ọ bụrụ òkè dị nsọ si n’àjà udo unu.+ 33 Ọ bụ nwa Erọn nke wetara ọbara anụ e ji chụọ àjà udo n’ihu Chineke ma chụọ abụba ya n’àjà ga-eketa ụkwụ aka nri ya.+ 34 N’ihi na m na-anara ndị Izrel okpuru afọ* anụ e ji chụọ àjà a na-efegharị efegharị nakwa ụkwụ anụ bụ́ òkè dị nsọ nke si n’àjà udo ha. M na-ewerekwa ha nye Erọn onye nchụàjà na ụmụ ya ndị nwoke ka ọ bụrụ iwu ga-adịgide adịgide ndị Izrel ga na-edebe.+

35 “‘Ihe a bụ òkè si n’àjà a na-esu ọkụ a chụụrụ Jehova, nke e wepụtaara ndị nchụàjà, ya bụ, Erọn na ụmụ ya ndị nwoke, n’ụbọchị ọ họpụtara ha ka ha bụrụ ndị nchụàjà Jehova.+ 36 Jehova nyere ndị Izrel iwu ka a na-ekenye ha òkè a malite n’ụbọchị o tere ha mmanụ.+ Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ ha niile ga na-edebe.’”

37 Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà a na-esu ọkụ,+ àjà ọka,+ àjà mmehie,+ àjà ikpe ọmụma,+ àjà e ji ahọpụta ndị nchụàjà,+ na àjà udo,+ 38 otú Jehova nyere Mosis n’iwu n’Ugwu Saịnaị+ n’ụbọchị o nyere ndị Izrel iwu n’ala ịkpa Saịnaị ka ha na-achụrụ Jehova àjà.+

8 Jehova wee gwa Mosis, sị: 2 “Kpọrọ Erọn na ụmụ ya ndị nwoke,+ chịrị uwe ha,+ were mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ,+ kpụrụ oké ehi e ji achụ àjà mmehie na ebule abụọ, burukwa nkata nke achịcha na-ekoghị eko dị na ya+ 3 ma kpọkọta nzukọ Izrel niile ka ha gbakọta n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.”

4 Mosis mere nnọọ otú Jehova nyere ya n’iwu. Nzukọ ahụ wee gbakọta n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 5 Mosis gwara nzukọ ahụ, sị: “Ọ bụ ihe a ka Jehova nyere anyị iwu ka anyị mee.” 6 Mosis wee kpọta Erọn na ụmụ ya ndị nwoke nso ma gwa ha ka ha jiri mmiri saa ahụ́.*+ 7 O yiweziri Erọn uwe mwụda,+ kee ya ákwà a na-eke n’úkwù,+ yiwe ya uwe na-enweghị aka,+ yiwekwa ya efọd+ ma jiri eriri*+ efọd ahụ kegide efọd ahụ n’ahụ́ ya. 8 O kegidere ya akpa a na-anya n’obi+ ma tinye Yurim na Tọmịm*+ n’ime akpa ahụ. 9 O keziri ya ákwà isi+ n’isi ma tinye ihe dị mbadamba na-egbuke egbuke e ji ọlaedo mee n’ihu ákwà isi ahụ, ya bụ, ihe àmà dị nsọ.*+ Mosis mere nnọọ otú Jehova nyere ya n’iwu.

10 Mosis wee were mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ tee ụlọikwuu ahụ na ihe niile dị n’ime ya+ ma mee ka ha dị nsọ. 11 O fesaziri mmanụ ahụ ugboro asaa n’ebe ịchụàjà ma tee ebe ịchụàjà na arịa ya niile na nnukwu ite ahụ na ihe e ji adọkwasị ya mmanụ ka ha wee dị nsọ. 12 N’ikpeazụ, ọ wụsatụrụ mmanụ ahụ e ji ete mmadụ mmanụ n’isi Erọn ma tee ya mmanụ ka ọ dị nsọ.+

13 Mosis kpọtaziri ụmụ Erọn ndị nwoke yiwe ha uwe mwụda ma kee ha ákwà n’úkwù, keekwa ha ákwà n’isi,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

14 O wee kpụta oké ehi e ji achụ àjà mmehie, Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ebikwasị aka ha n’isi oké ehi ahụ e ji achụ àjà mmehie.+ 15 Mosis gburu ya, jiri mkpịsị aka ya rụrụ ọbara+ ya tee na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà ahụ n’akụkụ ya niile ma kpuchiere ebe ịchụàjà ahụ mmehie. Ma, ọ wụsara ọbara fọrọ afọ n’ala ebe ịchụàjà ahụ ka o mee ka ọ dị nsọ, ka e wee na-ekpuchi mmehie n’elu ya. 16 Mosis wee were abụba niile dị n’elu eriri afọ oké ehi ahụ, abụba kpuchiri imeju ya, nakwa akụrụ ya abụọ na abụba ha, suo ha ọkụ n’ebe ịchụàjà ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.+ 17 E wee kpọọ ihe niile fọrọ n’oké ehi ahụ ọkụ, ya bụ, akpụkpọ ya, anụ ya, na nsị ya. A kpọrọ ha ọkụ n’ebe dị anya n’ebe ha mara ụlọikwuu,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

18 Ọ kpụtaziri ebule ahụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ, Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ebikwasị aka ha n’isi ebule ahụ.+ 19 Mosis wee gbuo ya ma fesa ọbara ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà. 20 E gburisịrị ebule ahụ. Mosis wee suo isi ya, akụkụ ya dị iche iche, na abụba* ya ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ. 21 E ji mmiri saa eriri afọ ya na ụkwụ ya. Mosis wee suo ebule ahụ niile ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà. Ọ bụ àjà e suru ọkụ ka o sie ísì ọma.* Ọ bụ àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

22 Ọ kpụtara ebule nke abụọ, bụ́ ebule e ji ahọpụta ndị nchụàjà.+ Erọn na ụmụ ya ndị nwoke wee bikwasị aka ha n’isi ebule ahụ.+ 23 Mosis gburu ya, weretụ ọbara ya tee n’ọnụ ọnụ ntị aka nri Erọn nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ya nakwa na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ya. 24 Mosis kpọtaziri ụmụ Erọn ndị nwoke, tesatụ ha ọbara ahụ n’ọnụ ọnụ ntị aka nri ha nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ha nakwa na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ha. Ma, Mosis fesara ọbara nke fọrọ afọ n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà.+

25 O wee were abụba ya, ọdụ ya nke bụ́ abụba abụba, abụba niile dị n’elu eriri afọ ya, na abụba kpuchiri imeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba ha, na ụkwụ aka nri ya.+ 26 O si na nkata achịcha na-ekoghị eko dị na ya, nke dị n’ihu Jehova, were otu ogbe achịcha na-ekoghị eko dị okirikiri+ na otu ogbe achịcha dị okirikiri a gwara mmanụ+ na otu achịcha dị fere fere. Ọ tụkwasịrị ha n’elu abụba ndị ahụ na ụkwụ aka nri anụ ahụ. 27 O wee chịkwasị ha niile n’ọbụ aka Erọn nakwa n’ọbụ aka ụmụ ya ndị nwoke ma malite ifegharị ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova. 28 Mosis wee chịrị ha n’aka ha ma suo ha ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, n’elu àjà ahụ e suru ọkụ. Ha bụ àjà e ji ahọpụta ndị nchụàjà nke na-esi ísì ọma.* Ọ bụ àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova.

29 Mosis wee were okpuru afọ* anụ ahụ, fegharịa ya ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova.+ Ọ bụ òkè Mosis nke si n’ebule e ji ahọpụta ndị nchụàjà, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.+

30 Mosis wee weretụ mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ+ na ọbara dị n’ebe ịchụàjà fesa n’ahụ́ Erọn nakwa n’uwe ya, fesakwa n’ahụ́ ụmụ ya ndị nwoke nakwa n’uwe ụmụ ya ndị nwoke. O si otú a mee ka Erọn na uwe ya dị nsọ, meekwa ka ụmụ ya ndị nwoke+ na uwe ha dị nsọ.+

31 Mosis gwaziri Erọn na ụmụ ya ndị nwoke, sị: “Sienụ+ anụ ahụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. Unu ga-anọkwa ebe ahụ rie ya na achịcha ndị dị na nkata e ji ahọpụta ndị nchụàjà, otú e nyere m n’iwu, sị, ‘Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-eri ya.’+ 32 Unu ga-akpọ ihe fọrọ n’anụ ahụ nakwa n’achịcha ahụ ọkụ.+ 33 Unu agaghị esi n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute pụọ ruo ụbọchị asaa, ruo mgbe ụbọchị ole e ji ahọpụta unu zuru, n’ihi na ọ bụ ụbọchị asaa ka a ga-eji mee unu ndị nchụàjà.+ 34 Jehova nyere iwu ka anyị mee ihe a anyị mere taa ka e wee kpuchiere unu mmehie.+ 35 Unu ga-anọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ehihie na abalị ruo ụbọchị asaa.+ Unu ga na-emekwa ihe Jehova nyere unu n’iwu+ ka unu wee ghara ịnwụ; n’ihi na ọ bụ ihe e nyere m n’iwu.”

36 Erọn na ụmụ ya ndị nwoke wee mee ihe niile Jehova si n’ọnụ Mosis nye n’iwu.

9 N’ụbọchị nke asatọ,+ Mosis kpọrọ Erọn na ụmụ ya ndị nwoke nakwa ndị okenye Izrel. 2 Ọ gwara Erọn, sị: “Kpụrụ otu nwa ehi ị ga-eji chụọ àjà mmehie maka onwe gị+ nakwa otu ebule ị ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ. Ha ga-abụ ndị ahụ́ dị mma. Ị ga-ewetakwa ha n’ihu Jehova. 3 Ma ị ga-agwa ndị Izrel, sị, ‘Kpụtanụ otu mkpi a ga-eji chụọ àjà mmehie nakwa otu nwa ehi na otu nwa ebule, ndị gbara otu afọ otu afọ, ndị ahụ́ dị mma, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ. 4 Kpụtakwanụ otu oké ehi na otu ebule a ga-eji chụọ àjà udo,+ ka a chụọ ha n’àjà n’ihu Jehova. Wetakwanụ àjà ọka+ a gwara mmanụ, n’ihi na Jehova ga-apụta n’ihu unu taa.’”+

5 Ha ji ihe niile Mosis nyere ha n’iwu ka ha weta bịa n’ihu ụlọikwuu nzute. Nzukọ ahụ niile wee bịa guzoro n’ihu Jehova. 6 Mosis wee sị: “Ọ bụ ihe a ka Jehova nyere unu n’iwu ka unu mee, ka Jehova wee gosi unu ebube ya.”+ 7 Mosis sịziri Erọn: “Gaa n’ebe ịchụàjà chụọ àjà mmehie maka mmehie gị+ nakwa àjà ị ga-esu ọkụ ma kpuchie mmehie gị+ na mmehie ezinụlọ* gị. Chụọkwara ndị Izrel àjà ha+ ma kpuchiere ha mmehie ha,+ otú Jehova nyere n’iwu.”

8 Erọn gara n’ebe ịchụàjà ozugbo gbuo nwa ehi o ji achụ àjà mmehie maka mmehie ya.+ 9 Ụmụ Erọn ndị nwoke wee butere ya ọbara+ nwa ehi ahụ, ya arụnye mkpịsị aka ya n’ọbara ahụ ma tee ya na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà. Ọ wụsakwara ọbara fọrọ afọ n’ala ebe ịchụàjà.+ 10 O suru abụba si n’anụ ahụ o ji achụ àjà mmehie nakwa akụrụ ya abụọ na abụba kpuchiri imeju ya ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.+ 11 Ọ kpọkwara anụ ya na akpụkpọ ya ọkụ n’ebe dị anya n’ebe ha mara ụlọikwuu.+

12 O gbuziri anụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ. Ụmụ Erọn ndị nwoke wee bunye ya ọbara ya, ya efesa ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà.+ 13 Ha bunyere ya anụ ahụ e gburiri egburi a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ, bunyekwa ya isi ya, ya esuo ha ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà. 14 Ọ sakwara eriri afọ ya na ụkwụ ya ma suo ha ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’elu anụ e ji chụọ àjà a na-esu ọkụ nke dị n’ebe ịchụàjà.

15 O wee chụọ àjà ndị Izrel wetara. Ọ kpụụrụ ewu a ga-eji chụọ àjà mmehie maka ndị Izrel gbuo, were ya chụọ àjà mmehie otú o mere nke mbụ ahụ. 16 Ọ kpụtakwara anụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ ma chụọ ya otú e nyere iwu ka e si na-achụ ya.+

17 E wepụ àjà a na-esu ọkụ+ ọ chụrụ n’ụtụtụ,+ ọ chụkwara àjà ọka. O kpooro ọka juru ọbụ aka ya ma suo ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà.

18 Erọn gbuziri oké ehi na ebule e ji achụrụ ndị Izrel àjà udo. Ụmụ ya wee bunye ya ọbara anụ ndị ahụ, ya efesa ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà.+ 19 Ha weere abụba oké ehi ahụ,+ ọdụ ebule ahụ nke bụ́ abụba abụba, abụba kpuchiri eriri afọ ha, akụrụ ha, na abụba kpuchiri imeju ha,+ 20 ma tụkwasị abụba niile ahụ n’elu okpuru afọ* anụ ndị ahụ. O suziri abụba ndị ahụ ọkụ, ha akwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà.+ 21 Ma Erọn fegharịrị okpuru afọ* anụ ndị ahụ na ụkwụ aka nri ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova, otú Mosis nyere n’iwu.+

22 Erọn wee chee ndị Izrel ihu, chịlie aka ya gọzie ha.+ O sikwa n’ebe ahụ ọ nọ chụọ àjà mmehie na àjà a na-esu ọkụ na àjà udo gbadata. 23 N’ikpeazụ, Mosis na Erọn banyere n’ụlọikwuu nzute. Ha pụtakwara gọzie ndị Izrel.+

Jehova wee gosi ndị Izrel niile ebube ya.+ 24 Jehova zitere ọkụ,+ ya amalite irepịa àjà ahụ a na-esu ọkụ na abụba ndị ahụ dị n’ebe ịchụàjà. Mgbe ha niile hụrụ ya, ha malitere iti mkpu ma gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala.+

10 Mgbe e mechara, ụmụ Erọn bụ́ Nedab na Abaịhu+ weere ihe ha ji amụ insens, gụnye ọkụ na ha ma tinye insens*+ na ha. Ha wee malite ịchụ àjà* iwu na-akwadoghị+ n’ihu Jehova, nke ọ na-enyeghị ha iwu ka ha chụọ. 2 Jehova wee zite ọkụ, ya eregbuo ha,+ ha anwụọ n’ihu Jehova.+ 3 Mosis wee sị Erọn: “Jehova kwuru, sị, ‘Ndị na-abịa m nso+ kwesịrị icheta na m dị nsọ. A ga-enyekwa m otuto n’ihu mmadụ niile.’” Ma Erọn gbara nkịtị.

4 Mosis kpọziri Mishel na Elzefan, bụ́ ụmụ Ọziel,+ nwanne nna Erọn, sị ha: “Bịanụ ebe a. Sinụ n’ihu ebe nsọ buru ozu ụmụnne unu pụọ n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu.” 5 Ha wee bịa buru ozu ha mgbe ha ka yi uwe mwụda ha ma bupụ ha n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, otú Mosis gwara ha.

6 Mosis wee gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ndị nke ọzọ, bụ́ Elieza na Ịtama, sị: “Unu ahapụla isi unu n’edozighị ya edozi, unu adọwakwala uwe unu,+ ka unu ghara ịnwụ, ka Chineke gharakwa iwesa nzukọ a niile iwe. Ụmụnne unu, bụ́ ezinụlọ Izrel niile, ga-ebere ndị a Jehova ji ọkụ gbuo ákwá. 7 Unu esila n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute pụọ, ma ọ́ bụghị ya unu ga-anwụ, n’ihi na Jehova tere unu mmanụ.”+ Ha wee mee ihe Mosis kwuru.

8 Jehova gwaziri Erọn, sị: 9 “Aṅụla mmanya ma ọ bụ ihe ọzọ na-aba n’anya, gị na ụmụ gị ndị nwoke, mgbe unu na-abata n’ụlọikwuu nzute,+ ka unu ghara ịnwụ. Ọ bụ iwu na-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe. 10 Ọ ga-eme ka a mata ihe dị iche n’ihe dị nsọ na ihe rụrụ arụ nakwa ihe dị iche n’ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha,+ 11 meekwa ka a kụziere ndị Izrel iwu niile Jehova si n’ọnụ Mosis nye ha.”+

12 Mosis wee gwa Erọn na Elieza na Ịtama, bụ́ ụmụ Erọn ndị nwoke fọrọnụ, sị: “Werenụ ihe fọrọ n’àjà ọka e suru ọkụ a chụụrụ Jehova mee achịcha na-ekoghị eko, nọrọkwanụ n’ebe dị nso n’ebe ịchụàjà rie ya,+ n’ihi na ọ bụ ihe kacha nsọ.+ 13 Unu ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya+ maka na ọ bụ òkè unu nakwa òkè ụmụ unu ndị nwoke n’àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova, n’ihi na ọ bụ ihe e nyere m n’iwu. 14 Unu ga-anọkwa n’ebe dị ọcha rie okpuru afọ* anụ e ji chụọ àjà a na-efegharị efegharị nakwa ụkwụ anụ nke bụ́ òkè dị nsọ,+ unu na ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị,+ n’ihi na e nyela unu ihe ndị a ka ha bụrụ òkè unu nakwa òkè ụmụ unu ndị nwoke n’àjà udo ndị Izrel na-eweta. 15 Ha ga na-eweta ụkwụ anụ nke bụ́ òkè dị nsọ na okpuru afọ* anụ e ji achụ àjà a na-efegharị efegharị nakwa abụba nke àjà e suru ọkụ, ka e wee fegharịa àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova. Ọ ga-abụ òkè unu na ụmụ unu ga na-eketa mgbe niile,+ otú Jehova nyere n’iwu.”

16 Mosis chọsiri anụ fọrọ n’ewu ahụ e ji chụọ àjà mmehie+ ike. O wee chọpụta na e suola ya ọkụ. O wee wesa Elieza na Ịtama, bụ́ ụmụ Erọn ndị fọrọnụ, ezigbo iwe. Ọ sịrị: 17 “Gịnị mere na unu erighị anụ ahụ e ji chụọ àjà mmehie n’ebe dị nsọ+ ebe ọ bụ ihe kacha nsọ, Chineke enyekwala ya unu ka unu wee na-aza ajụjụ maka mmehie nzukọ a ma na-ekpuchiri ha mmehie n’ihu Jehova? 18 Lee, e webataghị ọbara ya n’ime ebe nsọ. Unu kwesịrị iri ya n’ebe dị nsọ,+ otú e nyere m n’iwu.” 19 Erọn zara Mosis, sị: “Lee, taa ha chụụrụ Jehova àjà mmehie ha na àjà ha a na-esu ọkụ.+ N’agbanyeghị ya, ihe ndị a mere m. A sị na m riri anụ àjà mmehie ahụ taa, ọ̀ gaara adị Jehova mma?” 20 Mgbe Mosis nụrụ ihe o kwuru, ọ dị ya mma.

11 Jehova wee gwa Mosis na Erọn, sị: 2 “Gwanụ ndị Izrel, sị, ‘Ihe a bụ anụmanụ ndị unu nwere ike iri+ n’ime anụmanụ ndị na-agagharị n’ala: 3 Unu nwere ike iri anụmanụ ọ bụla na-atagharị ọnụ, nke ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ, gbawaakwa n’etiti.

4 “‘Ma unu agaghị eri anụmanụ ndị a n’ime anụmanụ ndị na-atagharị ọnụ ma ọ bụ ndị ọbụ ụkwụ ha kebiri abụọ: kamel bụ́ anụ na-atagharị ọnụ ma ọbụ ụkwụ ya ekebighị abụọ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha.+ 5 Unu erikwala ewi nkume+ n’ihi na ọ na-atagharị ọnụ ma ọbụ ụkwụ ya ekebighị abụọ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. 6 Unu erikwala ùrúrù* n’ihi na ọ na-atagharị ọnụ ma ọbụ ụkwụ ya ekebighị abụọ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. 7 Unu erikwala ézì+ n’ihi na ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ, gbawaakwa n’etiti, ma ọ naghị atagharị ọnụ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. 8 Unu erila anụ ha ọ bụla. Unu emetụkwala ozu ha aka. Ha bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.+

9 “‘Ihe a bụ ihe ndị unu nwere ike iri n’ime ihe ndị bi na mmiri: Unu nwere ike iri+ ihe ọ bụla nwere nku* na akpịrịkpa, ma ò bi n’oké osimiri ma ò bi n’iyi. 10 Ma ihe ọ bụla na-enweghị nku* na akpịrịkpa nke bi n’oké osimiri nakwa n’iyi n’ime obere ụmụ anụmanụ* niile nakwa n’ime ihe* ọ bụla ọzọ bi na mmiri, unu ga na-asọ ya oyi. 11 Unu ga na-asọ ha oyi. Unu erikwala anụ ha ọ bụla.+ Unu ga na-asọkwa ozu ha oyi. 12 Unu ga na-asọ ihe ọ bụla bi na mmiri nke na-enweghị nku* na akpịrịkpa oyi.

13 “Unu ga na-asọ anụ ndị a na-efe efe oyi, e kwesịghịkwa iri ha eri: ugo,+ ugo na-eri azụ̀, udele ojii,+ 14 égbé uhie na ụdị égbé ojii ọ bụla, 15 ụdị ugoloọma ọ bụla, 16 enyí nnụnụ, ikwiikwii, nnụnụ mmiri, ụdị agụ nkwọ ọ bụla, 17 ikwiikwii nta, nnụnụ mmiri a na-akpọ kọmọrant, ikwiikwii ntị ogologo, 18 ọbọgwụ mmiri, okwolo, udele, 19 ụgbala ọcha,* ụdị ụgbala mmiri ọ bụla, nnụnụ a na-akpọ huupu, na ụsụ. 20 Obere ụmụ anụmanụ* ọ bụla nwere nku bụ́ ndị na-eji ụkwụ anọ ha agagharị, unu ga na-asọ ha oyi.

21 “‘N’ime obere ụmụ anụmanụ* nwere nku bụ́ ndị na-eji ụkwụ anọ ha agagharị, unu nwere ike iri naanị ndị nke nwekwara ụkwụ ogologo abụọ ọzọ ha ji esi n’ala amali. 22 Unu nwere ike iri ndị a: ụdị igurube dị iche iche na-esi otu ebe efere n’ìgwè gaa ebe ọzọ, igurube ndị ọzọ a na-eri eri,+ mbụzụ,* na ụkpara. 23 Obere ụmụ anụmanụ niile ọzọ nwere nku, nweekwa ụkwụ anọ, unu ga na-asọ ha oyi. 24 Ihe ndị a ga-eme ka unu ghara ịdị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 25 Onye ọ bụla tụtụụrụ nke ọ bụla nwụrụ anwụ n’ime ha kwesịrị ịsụ uwe ya.+ Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.

26 “‘Anụmanụ ọ bụla ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ ma ọ gbawaghị agbawa n’etiti, ọ naghịkwa atagharị ọnụ, ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ nke ọ bụla n’ime ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha.+ 27 Anụmanụ ọ bụla ji ọbụ ụkwụ na ọbụ aka ya eje ije n’ime anụmanụ ndị na-eji ụkwụ anọ agagharị bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 28 Onye ọ bụla buuru ozu ha kwesịrị ịsụ uwe ya.+ Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ Ha bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha.

29 “‘N’ime obere ụmụ anụmanụ* ndị na-agagharị n’ala, ndị a ga-abụrụ unu anụ na-adịghị ọcha: nkapị, òké,+ ụdị ngwere ọ bụla, 30 agụ ụlọ,* nnukwu ngwere ndị yiri agụ iyi, ngwere mmiri, ngwere ájá, na ogwumagala. 31 Obere ụmụ anụmanụ ndị a ga-abụrụ unu anụ na-adịghị ọcha.+ Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+

32 “‘Ihe ọ bụla ozu ha dasara ga-abụ ihe na-adịghị ọcha, ma ọ̀ bụ arịa osisi, uwe, akpụkpọ anụ, ma ọ̀ bụ ákwà iru uju. Ụdị arịa ọ bụla e ji eme ihe nke ozu ha dasara, a ga-etinye ya n’ime mmiri. Ọ ga-abụkwa ihe na-adịghị ọcha ruo mgbede. E mechaa, ọ ga-adị ọcha. 33 Ọ bụrụ na ha dabara n’ite ụrọ, unu ga-akụri ya. Ihe ọ bụla dị n’ite ahụ ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.+ 34 Nri ọ bụla nke mmiri dị n’ite ahụ wụsara ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. Ihe ọ bụla a na-aṅụ aṅụ dị n’ite ahụ ga-abụkwa ihe na-adịghị ọcha. 35 Ihe ọ bụla ozu ha dasara ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. Ma ọ̀ bụ nnukwu ekwú ma ọ̀ bụ obere ekwú, a ga-akụri ya. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha. Ha ga na-abụkwara unu ihe na-adịghị ọcha. 36 Ma ọ bụrụ na ha adanye n’iyi ma ọ bụ n’olulu mmiri, iyi ahụ na olulu mmiri ahụ ka ga-adị ọcha, ma onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha. 37 Ọ bụrụ na ozu ha adaa n’elu mkpụrụ ọ bụla a ka ga-akụ akụ, mkpụrụ ahụ dị ọcha. 38 Ma ọ bụrụ na a wụsara mmiri ná mkpụrụ, ya enwee otú ozu ha si dasa na ya, mkpụrụ ahụ ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.

39 “‘Ọ bụrụ na anụmanụ unu na-eri eri anwụọ, onye ọ bụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 40 Onye ọ bụla riri ihe ọ bụla n’anụ ahụ nwụrụ anwụ kwesịrị ịsụ uwe ya. Ọ ga-abụkwa onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ Onye bupụrụ ozu ya kwesịrị ịsụ uwe ya. Ọ ga-abụkwa onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 41 Unu ga na-asọ obere anụmanụ* ọ bụla na-adịghị ọcha na-agagharị n’ala oyi.+ A gaghị eri ya eri. 42 Unu erila anụ ọ bụla na-akpụ afọ n’ala ma ọ bụ obere anụmanụ* ọ bụla na-eji ụkwụ anọ agagharị ma ọ bụ obere anụmanụ ọ bụla nwere ọtụtụ ụkwụ, n’ihi na ha bụ ihe a na-asọ oyi.+ 43 Unu ekwela ka nke ọ bụla n’ime obere ụmụ anụmanụ* mee ka unu* bụrụ ndị a na-asọ oyi. Unu ejikwala ha merụọ onwe unu, ha ewee mee ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha.+ 44 N’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu,+ unu ga-edokwa onwe unu nsọ ma dị nsọ+ n’ihi na adị m nsọ.+ Unu ejila obere anụmanụ* ọ bụla na-agagharị n’ala mee onwe unu ka unu ghara ịdị ọcha. 45 N’ihi na abụ m Jehova, onye dupụtara unu n’Ijipt, iji gosi na m bụ Chineke unu.+ Unu ga-adị nsọ,+ n’ihi na adị m nsọ.+

46 “‘Ihe a bụ iwu banyere anụmanụ, anụ ndị na-efe efe, ihe ọ bụla na-agagharị na mmiri, nakwa banyere obere anụmanụ* ọ bụla na-agagharị n’ala, 47 ka e wee mee ka e nwee ihe dị iche n’ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha nakwa n’anụ ndị e nwere ike iri eri na ndị a na-agaghị eri eri.’”+

12 Jehova wee gwa Mosis, sị: 2 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na nwaanyị adị ime ma mụọ nwa nwoke, nwaanyị ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa, otú ọ na-abụ onye na-adịghị ọcha mgbe ọ na-ahụ nsọ ya.+ 3 N’ụbọchị nke asatọ, a ga-ebi nwa nwoke ahụ úgwù.+ 4 Nwaanyị ahụ ka ga na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha ruo ụbọchị iri atọ na atọ na-esonụ n’ihi ọbara gbara ya. Ọ gaghị emetụ ihe ọ bụla dị nsọ aka. Ọ gaghịkwa abata n’ebe dị nsọ ruo mgbe ụbọchị ole o ji eme onwe ya ka ọ dị ọcha zuru.

5 “‘Ọ bụrụ na ọ mụrụ nwa nwaanyị, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị iri na anọ, otú ọ na-abụ onye na-adịghị ọcha mgbe ọ na-ahụ nsọ ya. Ọ ka ga na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha ruo ụbọchị iri isii na isii na-esonụ n’ihi ọbara gbara ya. 6 Mgbe ụbọchị ole o ji eme onwe ya ka ọ dị ọcha maka nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwaanyị ọ mụrụ zuru, ọ ga-akpụta ebule na-agafebeghị otu afọ ka e jiri chụọ àjà a na-esu ọkụ.+ Ọ ga-anwụtakwa nwa kpalakwukwu ma ọ bụ otu nduru ka e jiri chụọ àjà mmehie. Ọ ga-ewetara ha onye nchụàjà n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 7 Onye nchụàjà ga-eweta ha n’ihu Jehova ma kpuchiere nwaanyị ahụ mmehie ya. Ọ ga-adịkwa ọcha n’ọbara gbara ya. Ihe a bụ iwu nwaanyị mụrụ nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwaanyị ga-edebe. 8 Ma ọ bụrụ na ọ gaghị ewetali atụrụ, ọ ga-anwụta nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ.+ A ga-eji otu chụọ àjà a na-esu ọkụ, jiri otu chụọ àjà mmehie. Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya, ọ ga-adịkwa ọcha.

13 Jehova gwakwara Mosis na Erọn, sị: 2 “Ọ bụrụ na e nwee ebe ahụ́ mmadụ zara aza ma ọ bụ na onye ahụ nwere ihe yiri ọnyá kpọchiri akpọchi n’ahụ́ ya ma ọ bụ na ntụpọ pụtara ya n’ahụ́, ya abụrụkwa na ihe ahụ nwere ike ịghọ ọrịa ekpenta*+ n’ahụ́ ya, a ga-akpọgara ya Erọn onye nchụàjà ma ọ bụ otu n’ime ụmụ ya, bụ́ ndị nchụàjà.+ 3 Onye nchụàjà ga-eleru ihe ahụ mere ya n’ahụ́ anya. Ọ bụrụ na ajị dị n’ebe ahụ achawala ọcha, ọ bụrụkwa na ihe ahụ mere ya bara ime, ọ bụ ọrịa ekpenta. Onye nchụàjà ga-eleru ya anya ma kwuo na onye ahụ adịghị ọcha. 4 Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ pụtara ya n’ahụ́ na-acha ọcha ma ọ dịghị ka ọ̀ bara ime, ọ bụrụkwa na ajị dị n’ebe ahụ achawabeghị ọcha, onye nchụàjà ga-akpọpụ onye ahụ iche ruo ụbọchị asaa.+ 5 Onye nchụàjà ga-eleruzi ya anya n’ụbọchị nke asaa. Ọ bụrụ na o yiri ka ihe ahụ mere ya ọ̀ laala, ọ bụrụkwa na ọ gbasaghị n’ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-akpọpụ ya iche ruo ụbọchị asaa ọzọ.

6 “Onye nchụàjà ga-eleru ya anya ọzọ n’ụbọchị nke asaa. Ọ bụrụ na ihe ahụ mere ya alawala, ọ bụrụkwa na ọ gbasaghị n’ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-ekwu na ọ dị ọcha.+ Ọ bụ naanị ọnyá kpọchiri akpọchi. Onye ahụ ga-asụ uwe ya ma dị ọcha. 7 Ma ọ bụrụ na ọnyá ahụ kpọchiri akpọchi* gbasara n’ahụ́ ya mgbe o gosicharala onye nchụàjà onwe ya ka e kwuo ma ọ̀ dịla ọcha, ọ ga-egosi onye nchụàjà onwe ya ọzọ.* 8 Onye nchụàjà ga-eleru ya anya. Ọ bụrụ na ọnyá ahụ kpọchiri akpọchi agbasaala n’ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-ekwuzi na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ekpenta.+

9 “Ọ bụrụ na ekpenta apụta mmadụ n’ahụ́, a ga-akpọgara ya onye nchụàjà. 10 Onye nchụàjà ga-eleru ya anya.+ Ọ bụrụ na e nwere ebe zara aza n’ahụ́ ya ma na-acha ọcha, ọ bụrụkwa na ajị dị n’ebe ahụ na-achazi ọcha, e nweekwa ọnyá+ na ya, 11 ihe ahụ dị ya n’ahụ́ bụ ekpenta na-anaghị ala ngwa ngwa. Onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ gaghị akpọpụ ya iche+ n’ihi na o doro anya na ọ dịghị ọcha. 12 Ọ bụrụ na ekpenta ahụ agbasaa n’ahụ́ onye ahụ niile, onye nchụàjà ahụkwa na n’ebe ọ bụla o lere ya anya, ekpenta kpuchiri ya ahụ́ si n’isi ruo n’ụkwụ, 13 ọ bụrụkwa na onye nchụàjà eleruola ya anya ma hụ na ekpenta ahụ kpuchiri ahụ́ ya niile, ọ ga-ekwuzi na onye ahụ adịla ọcha.* Ahụ́ ya niile achawala ọcha, onye ahụ bụzi onye dị ọcha. 14 Ma mgbe ọ bụla ọnyá pụtara ya n’ahụ́, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha. 15 Mgbe onye nchụàjà ga-ahụ ọnyá ahụ, ọ ga-ekwu na onye ahụ adịghị ọcha.+ Ọnyá ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ekpenta.+ 16 Ma ọ bụrụ na ọnyá ahụ achawa ọcha ọzọ, ọ ga-agakwuru onye nchụàjà. 17 Onye nchụàjà ga-eleru ya anya n’ahụ́.+ Ọ bụrụ na ọnyá ahụ achawala ọcha, onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ ihe ahụ mere adịla ọcha. Onye ahụ dị ọcha.

18 “Ọ bụrụ na etuto etoo mmadụ n’ahụ́ ma laa, 19 ebe ahụ etuto toburu onye ahụ emechaa zaa, chawazie ọcha ma ọ bụkwanụ ntụpọ na-achatụ ọbara ọbara apụta n’ebe ahụ, ọ ga-egosi onye nchụàjà onwe ya. 20 Onye nchụàjà ga-eleru ya anya.+ Ọ bụrụ na ọ dị ka ihe ahụ ọ̀ bara ime, ọ bụrụkwa na ajị dị n’ebe ahụ achawala ọcha, onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ekpenta pụtara n’etuto ahụ. 21 Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà eleruo ya anya ma hụ na e nweghị ajị na-acha ọcha dị n’ebe ahụ, hụkwa na ọ baghị ime nakwa na ọ lawala, onye nchụàjà ga-akpọpụ ya iche ruo ụbọchị asaa.+ 22 Ọ bụrụ na ọ gbasaala n’ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ekpenta. 23 Ma, ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaghị n’ahụ́ ya, ọ bụ etuto ahụ toro ya mere ka ebe ahụ dị otú ahụ. Onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ dị ọcha.+

24 “Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọkụ eree mmadụ, onye ahụ enwee apa n’ebe ọkụ rere ya, ọ bụrụkwa na ntụpọ na-achatụ ọbara ọbara ma ọ bụ nke na-acha ọcha apụta n’ọnyá dị n’apa ahụ, 25 onye nchụàjà ga-eleru ya anya. Ọ bụrụ na ajị dị ná ntụpọ ahụ na-achazi ọcha, ọ bụrụkwa na ọ dị ka ọ̀ bara ime, ọ bụ ekpenta pụtara n’apa ahụ. Onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ekpenta. 26 Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà eleruo ya anya ma hụ na e nweghị ajị ọcha dị ná ntụpọ ahụ, ntụpọ ahụ abaghịkwa ime, ọ lawakwala, onye nchụàjà ga-akpọpụ ya iche ruo ụbọchị asaa.+ 27 Onye nchụàjà ga-eleru ya anya n’ụbọchị nke asaa. Ọ bụrụ na ọ gbasaala n’ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ekpenta. 28 Ma, ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaghị ya n’ahụ́, ọ bụrụkwa na ọ lawala, ọ bụ apa ahụ mere ka ebe ahụ zaa azaa, onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ dị ọcha, n’ihi na ọ bụ apa ahụ mere ka ebe ahụ zaa.

29 “Ọ bụrụ na e nwee ihe mere nwoke ma ọ bụ nwaanyị n’isi ma ọ bụ n’agba, 30 onye nchụàjà ga-eleru ihe ahụ mere ya anya.+ Ọ bụrụ na ọ dị ka ihe ahụ ọ̀ bara ime, ya abụrụkwa na ntutu dị n’ebe ahụ na-achazi odo odo, o jughịkwa eju otú o juburu, onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa bịara ya n’ala isi ma ọ bụ n’afụ ọnụ.* Ọ bụ ekpenta isi ma ọ bụ ekpenta agba. 31 Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà ahụ na ihe ahụ mere ya adịghị ka ọ̀ bara ime nakwa na e nweghị ntutu ojii dị na ya, onye nchụàjà ga-akpọpụ onye ahụ ihe ahụ mere iche ruo ụbọchị asaa.+ 32 N’ụbọchị nke asaa, onye nchụàjà ga-eleru ihe ahụ mere ya anya. Ọ bụrụ na ihe ahụ mere ya agbasaghị, ntutu na-acha odo odo apụtaghịkwa na ya, ọ bụrụkwa na ọ dịghị ka ihe ahụ mere ya ọ̀ bara ime, 33 a ga-akpụ onye ahụ isi ma ọ bụ kpụọ ya afụ ọnụ,* ma a gaghị akpụ ebe ahụ ihe mere ya. Onye nchụàjà ga-akpọpụzi onye ahụ ihe ahụ mere iche ruo ụbọchị asaa ọzọ.

34 “Onye nchụàjà ga-eleru ebe ahụ ihe ahụ mere ya anya n’ụbọchị nke asaa. Ọ bụrụ na ihe ahụ mere ya n’ala isi ma ọ bụ n’afụ ọnụ* agbasaghị n’ahụ́ ya, ọ dịghịkwa ka ọ̀ bara ime, onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ dị ọcha. Ọ ga-asụkwa uwe ya wee dị ọcha. 35 Ma ọ bụrụ na ihe ahụ mere ya agbasaa n’ahụ́ ya mgbe e kwuchara na ọ dị ọcha, 36 onye nchụàjà ga-eleru onye ahụ anya. Ọ bụrụ na ihe ahụ mere ya agbasaala n’ahụ́ ya, onye nchụàjà agaghị achọwa ka ọ hụ ntutu na-acha odo odo. Onye ahụ adịghị ọcha. 37 Ma ọ bụrụ na o leruru ihe ahụ mere ya anya ma hụ na ọ gbasaghị n’ahụ́ ya nakwa na ntutu ojii etopụtala na ya, ihe ahụ mere ya alaala. Onye ahụ dị ọcha. Onye nchụàjà ga-ekwukwa na ọ dị ọcha.+

38 “Ọ bụrụ na ntụpọ apụtasịa nwoke ma ọ bụ nwaanyị n’ahụ́, ya abụrụ na ntụpọ ndị ahụ na-acha ọcha, 39 onye nchụàjà ga-eleru ntụpọ ndị ahụ anya.+ Ọ bụrụ na ntụpọ ndị ahụ anaghị acha ezigbo ọcha, ọ bụ ọkọ nkịtị ghara ya n’ahụ́. Onye ahụ dị ọcha.

40 “Ọ bụrụ na ntutu adapụsịa nwoke n’isi, isi ya akwọchaa, onye ahụ dị ọcha. 41 Ọ bụrụ na ntutu adapụsịa n’ihu isi ya, ihu isi ya akwọchaa, onye ahụ dị ọcha. 42 Ma ọ bụrụ na ọnyá na-achatụ ọbara ọbara apụta n’ebe ahụ isi ya kwọchara akwọcha ma ọ bụ n’ihu isi ya, ọ bụ ekpenta na-abịa ya n’isi ma ọ bụ n’ihu isi ya. 43 Onye nchụàjà ga-eleru ya anya. Ọ bụrụ na ihe ahụ nke mere ya n’ebe isi ya kwọchara akwọcha ma ọ bụ n’ihu isi ya zara aza ma na-achatụ ọbara ọbara, ọ bụrụkwa na ọ dị ka ekpenta, 44 ọ bụ onye ekpenta. Ọ dịghị ọcha. Onye nchụàjà ga-ekwu na ọ dịghị ọcha n’ihi ihe ahụ mere ya n’isi. 45 Ma onye ahụ na-arịa ọrịa ekpenta ga na-eyi uwe dọkara adọka. Ọ gaghịkwa edozi isi ya edozi. Ọ ga-ekpuchikwa afụ ọnụ ya, na-eti mkpu, sị, ‘Adịghị m ọcha! Adịghị m ọcha!’ 46 Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha n’oge niile ọ na-arịa ọrịa ahụ. Ebe ọ bụ na ọ dịghị ọcha, ọ ga-ebi iche. Ọ gaghị ebi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu.+

47 “Ọ bụrụ na ntụpọ yiri ọrịa ekpenta apụta n’uwe, ma ọ̀ bụ uwe e ji ajị anụ kpaa ma ọ̀ bụ uwe e ji ákwà linin kpaa, 48 ma ọ̀ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo ma ọ̀ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe e ji ákwà linin kpaa ma ọ bụ nke e ji ajị anụ kpaa ma ọ̀ bụ n’akpụkpọ anụ ma ọ̀ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, 49 ọ bụrụkwa na ọrịa ahụ mere ka e nwee ntụpọ na-achatụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma ọ bụ na-acha ọbara ọbara n’uwe ahụ, n’akpụkpọ anụ, n’owu ndị gara ogologo ogologo n’uwe, n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, ọ bụ ekpenta. A ga-egosi ya onye nchụàjà. 50 Onye nchụàjà ga-eleru ntụpọ ahụ anya, ọ ga-edosakwa ihe ntụpọ ahụ pụtara na ya iche ruo ụbọchị asaa.+ 51 Mgbe o leruru ntụpọ ahụ anya n’ụbọchị nke asaa ma hụ na ọ gbasaala n’uwe ahụ, n’owu ndị gara ogologo ogologo n’uwe ahụ, n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ahụ ma ọ bụ n’akpụkpọ anụ (ihe ọ sọkwara ya bụrụ ihe e ji akpụkpọ anụ ahụ eme), ntụpọ ahụ bụ ajọ ọrịa ekpenta. Ihe ahụ ọ dị na ya adịghị ọcha.+ 52 Ọ ga-akpọ ihe ahụ ntụpọ ahụ pụtara na ya ọkụ, ma ọ̀ bụ uwe ahụ ma ọ̀ bụ owu ndị gara ogologo ogologo ma ọ̀ bụ owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ahụ e ji ajị anụ kpaa ma ọ̀ bụ n’uwe ahụ e ji ákwà linin kpaa ma ọ̀ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, n’ihi na ọ bụ ajọ ọrịa ekpenta. A ga-akpọ ihe ahụ ọkụ.

53 “Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà eleruo ya anya ma hụ na ntụpọ ahụ agbasaghị n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ahụ ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, 54 onye nchụàjà ga-enye iwu ka ha saa ihe ahụ ntụpọ pụtara na ya mmiri. Ọ ga-edosakwa ya iche ruo ụbọchị asaa ọzọ. 55 Onye nchụàjà ga-eleru ihe ahụ ntụpọ ahụ pụtara na ya anya mgbe a sachara ya nke ọma. Ọ bụrụ na otú ntụpọ ahụ dị agbanwebeghị, ọ bụrụgodị na ọ gbasabeghị, ihe ahụ adịghị ọcha. Ị ga-akpọ ya ọkụ n’ihi na o sila n’ime ma ọ bụ n’elu rie ihe ahụ.

56 Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà eleruo ya anya ma hụ na ntụpọ ahụ apụwala mgbe a sachara ihe ahụ nke ọma, ọ ga-adọkapụ ebe ahụ ntụpọ ahụ dị n’uwe ahụ ma ọ bụ n’akpụkpọ anụ ahụ ma ọ bụ n’owu ndị ahụ gara ogologo ogologo n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ahụ. 57 Ma ọ bụrụ na ọ pụtakwara ebe ọzọ n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ahụ ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, ọ na-agbasa agbasa. Ị ga-akpọ ihe ọ bụla ntụpọ ahụ pụtara na ya ọkụ.+ 58 Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ adịghịzi n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ahụ ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee mgbe ị sachara ya mmiri, ị ga-asa ya nke ugboro abụọ, ọ ga-adịkwa ọcha.

59 “Ihe a bụ iwu banyere ntụpọ yiri ọrịa ekpenta nke pụtara n’uwe e ji ajị anụ kpaa ma ọ bụ n’uwe e ji ákwà linin kpaa ma ọ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo n’uwe ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee. A ga-eji iwu a na-ekpebi ma ihe ndị a hà dị ọcha ka ọ̀ bụ na ha adịghị ọcha.”

14 Jehova gwakwara Mosis, sị: 2 “Ihe a bụ iwu a ga-edebe n’ụbọchị a ga-egosi na onye ekpenta adịla ọcha, mgbe a ga-akpọrọ ya gakwuru onye nchụàjà.+ 3 Onye nchụàjà ga-esi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu pụọ gaa leruo ya anya. Ọ bụrụ na ekpenta ya alaala, 4 onye nchụàjà ga-enye ya iwu ka ọ nwụta nnụnụ abụọ dị ndụ bụ́ ndị na-esoghị ná nnụnụ ndị na-adịghị ọcha, wetakwa osisi sida, ákwà na-acha uhie uhie, na ahịhịa hisop ka e jiri ha mee ka ọ dị ọcha.+ 5 Onye nchụàjà ga-enye iwu ka e gbuo otu nnụnụ n’ite ụrọ nke mmiri e kutere n’iyi dị n’ime ya. 6 Ma ọ ga-anwụrụ nnụnụ nke ọzọ dị ndụ, werekwa osisi sida ahụ, ákwà ahụ na-acha uhie uhie, na ahịhịa hisop ahụ ma sụnyekọta ha n’ọbara nnụnụ ahụ e gburu n’ite ụrọ nke mmiri e kutere n’iyi dị n’ime ya. 7 Ọ ga-efesa ọbara ahụ ugboro asaa n’ahụ́ onye ekpenta ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha, kwuokwa na ọ dịla ọcha. Ọ ga-ahapụzi nnụnụ ahụ dị ndụ ka o feba n’ọhịa.+

8 “Onye ahụ nke na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha ga-asụ uwe ya, kpụọ ntutu niile na ajị niile dị ya n’ahụ́ ma jiri mmiri saa ahụ́. Ọ ga-adịzi ọcha. E mechaa, ọ ga-abata n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu. Ma, ọ gaghị abanye n’ụlọikwuu ya ruo ụbọchị asaa. 9 N’ụbọchị nke asaa, ọ ga-akpụ ntutu niile dị ya n’isi na ajị agba ya na iku anya ya. Mgbe ọ kpụchara ntutu ya niile na ajị niile dị ya n’ahụ́, ọ ga-asụ uwe ya ma jiri mmiri saa ahụ́. Ọ ga-adịzi ọcha.

10 “N’ụbọchị nke asatọ, ọ ga-akpụta ebule abụọ ahụ́ dị mma, otu nne atụrụ ahụ́ dị mma+ nke na-agafebeghị otu afọ, butekwa ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka,+ nakwa otu lọg* mmanụ.+ 11 Onye nchụàjà nke kwuru na onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha adịla ọcha ga-akpọta ya n’ihu Jehova n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, wetakwa ihe ndị o wetara. 12 Onye nchụàjà ga-akpụrụ otu ebule chụọ n’àjà ka ọ bụrụ àjà ikpe ọmụma,+ ya na otu lọg mmanụ ahụ. Ọ ga-efegharị ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova.+ 13 Ọ ga-egbu ebule ahụ n’ebe a na-egbu anụ e ji achụ àjà mmehie na anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ,+ n’ebe dị nsọ, n’ihi na ọ bụ onye nchụàjà nwe anụ e ji achụ àjà ikpe ọmụma otú ọ bụkwa ya nwe anụ e ji achụ àjà mmehie.+ Ọ bụ ihe kacha nsọ.+

14 “Onye nchụàjà ga-eweretụ ọbara anụ ahụ e ji chụọ àjà ikpe ọmụma. Onye nchụàjà ga-etesa ya n’ọnụ ọnụ ntị aka nri nke onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ya nakwa na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ya. 15 Onye nchụàjà ga-esi n’otu lọg mmanụ+ ahụ gbara mmanụ wụnye n’ọbụ aka aka ekpe ya. 16 Onye nchụàjà ga-arụnyezi mkpịsị aka aka nri ya ná mmanụ ahụ dị n’ọbụ aka aka ekpe ya ma fesa mmanụ ahụ n’ala n’ihu Jehova. Ọ ga-eme ya ugboro asaa. 17 Onye nchụàjà ga-etesa mmanụ fọrọ n’ọbụ aka ya n’ọnụ ọnụ ntị aka nri nke onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ya nakwa na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ya, n’elu ebe ndị o tesaburu ọbara anụ e ji chụọ àjà ikpe ọmụma. 18 Onye nchụàjà ga-ete mmanụ fọrọ ya n’ọbụ aka n’isi onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha. Onye nchụàjà ga-ekpuchiri onye ahụ mmehie ya n’ihu Jehova.+

19 “Onye nchụàjà ga-achụ anụ e ji achụ àjà mmehie+ ahụ n’àjà wee kpuchiere onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha mmehie ya. E mechaa, ọ ga-egbu anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ. 20 Onye nchụàjà ga-achụ anụ ahụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ n’ebe ịchụàjà, chụọkwa àjà ọka+ ahụ n’ebe ahụ. Onye nchụàjà ga-ekpuchiri onye ahụ mmehie ya.+ Ọ ga-adịzi ọcha.+

21 “Ma ọ bụrụ na ọ bụ ogbenye, ya abụrụkwa na aka erughị ya iweta ihe ndị ahụ, ọ ga-akpụta otu ebule a ga-eji chụọ àjà ikpe ọmụma ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị, ka e wee kpuchiere ya mmehie ya. Ọ ga-ebutekwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka, nakwa otu lọg mmanụ, 22 nwụtakwa nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, nke aka ruru ya. A ga-eji otu chụọ àjà mmehie, jiri nke ọzọ chụọ àjà a na-esu ọkụ.+ 23 N’ụbọchị nke asatọ,+ ọ ga-ewetara ha onye nchụàjà n’ihu Jehova n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ka e jiri ha gosi na ọ dịla ọcha.+

24 “Onye nchụàjà ga-akpụrụ ebule ahụ a ga-eji chụọ àjà ikpe ọmụma,+ werekwa otu lọg mmanụ ahụ. Onye nchụàjà ga-efegharị ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova.+ 25 Ọ ga-egbu ebule ahụ e ji achụ àjà ikpe ọmụma. Onye nchụàjà ga-eweretụ ọbara anụ ahụ e ji achụ àjà ikpe ọmụma tee n’ọnụ ọnụ ntị aka nri nke onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ya nakwa na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ya.+ 26 Onye nchụàjà ga-awụnyetụ mmanụ ahụ n’ọbụ aka aka ekpe nke ya.+ 27 Onye nchụàjà ga-eji mkpịsị aka aka nri ya fesa mmanụ ahụ dị n’ọbụ aka aka ekpe ya n’ala n’ihu Jehova. Ọ ga-eme ya ugboro asaa. 28 Onye nchụàjà ga-etesa mmanụ ahụ dị n’ọbụ aka ya n’ọnụ ọnụ ntị aka nri onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ya nakwa na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ya, n’elu ebe ndị o tesaburu ọbara anụ e ji chụọ àjà ikpe ọmụma. 29 Onye nchụàjà ga-etezi mmanụ fọrọ ya n’ọbụ aka n’isi onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha, ka o wee kpuchiere ya mmehie ya n’ihu Jehova.

30 “Ọ ga-achụ otu n’ime nduru ndị ahụ n’àjà ma ọ bụ otu n’ime kpalakwukwu ndị ahụ, nke aka ruru onye ahụ iweta,+ 31 nke ọ ga-ewetali, ka ọ bụrụ àjà mmehie, chụọkwa nke ọzọ ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ.+ Ọ ga-achụkọta ha na àjà ọka ahụ. Onye nchụàjà ga-ekpuchiri onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha mmehie ya n’ihu Jehova.+

32 “Ihe a bụ iwu banyere onye na-arịa ọrịa ekpenta nke na-enweghị otú ọ hà ya mgbe a na-egosi na ọ dịla ọcha.”

33 Jehova wee gwa Mosis na Erọn, sị: 34 “Mgbe unu batara na Kenan,+ bụ́ ala m ga-enye unu ka unu biri na ya,+ m wee kwe ka ọrịa ekpenta dịrị n’ụlọ dị n’ala unu,+ 35 onye nwe ụlọ ahụ ga-abịa gwa onye nchụàjà, sị, ‘E nwere ihe yiri ọrịa pụtara n’ụlọ m.’ 36 Onye nchụàjà ga-enye iwu ka e wepụchaa ihe ndị dị n’ụlọ ahụ tupu ya abịa ileru ihe ahụ pụtara n’ụlọ ahụ anya, ka ọ ghara ikwu na ihe niile dị n’ụlọ ahụ adịghị ọcha. E mechaa, onye nchụàjà ga-abata ka o leruo ụlọ ahụ anya. 37 Ọ ga-eleru ebe ihe ahụ pụtara anya. Ọ bụrụ na ebe ihe ahụ pụtara n’ahụ́ ụlọ ahụ na-achatụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma ọ bụ ọbara ọbara, ọ bụrụkwa na o yiri ka hà bara ime n’ahụ́ ụlọ ahụ, 38 onye nchụàjà ga-esi n’ụlọ ahụ pụta gaa n’ebe e si abanye n’ụlọ ahụ. Ọ ga-emechi ụlọ ahụ ka a ghara ịbanye na ya ruo ụbọchị asaa.+

39 “Onye nchụàjà ga-abịaghachi n’ụbọchị nke asaa leruo ya anya. Ọ bụrụ na ihe ahụ pụtara n’ụlọ ahụ agbasaala n’ahụ́ ụlọ ahụ, 40 onye nchụàjà ga-enyezi iwu. A ga-akụpụta nkume ndị ihe ahụ yiri ọrịa dị na ha ma tụfuo ha n’azụ obodo, n’ebe a na-ekpofu ihe na-adịghị ọcha. 41 Ọ ga-ahụ na a kpụchasịrị ime ụlọ ahụ nke ọma. A ga-ekporo ájá ụrọ a kpụchapụtara na ya kpofuo n’azụ obodo, n’ebe a na-ekpofu ihe na-adịghị ọcha. 42 Ha ga-ewerezi nkume ndị ọzọ dochie nkume ndị ahụ ha kụpụsịrị. A ga-ejikwa ájá ụrọ ọzọ techie ahụ́ ụlọ ahụ.

43 “Ma ọ bụrụ na ihe ahụ yiri ọrịa apụtaghachi, a hụ ya n’ụlọ ahụ mgbe a kụpụchara nkume ndị ọ pụtaburu na ha ma kpụchasịa ahụ́ ụlọ ahụ, jirikwa ájá ụrọ ọzọ techie ya, 44 onye nchụàjà ga-abanye leruo ya anya. Ọ bụrụ na ihe ahụ yiri ọrịa agbasaala n’ụlọ ahụ, ọ bụ ajọ ekpenta+ pụtara n’ụlọ ahụ. Ụlọ ahụ adịghị ọcha. 45 Ọ ga-ahụ na a kwaturu ụlọ ahụ, ma nkume ya niile ma osisi ya niile ma ájá ụrọ niile e ji techie ya. Ọ ga-ahụkwa na e bugara ha n’azụ obodo, n’ebe a na-ekpofu ihe na-adịghị ọcha.+ 46 Ma onye ọ bụla banyere n’ụlọ ahụ n’ụbọchị ndị e mechiri ya ka a ghara ịbanye na ya+ agaghị adị ọcha ruo mgbede.+ 47 Onye ọ bụla dinara ala n’ụlọ ahụ ga-asụ uwe ya. Onye ọ bụla riri nri n’ụlọ ahụ ga-asụ uwe ya.

48 “Ma, ọ bụrụ na onye nchụàjà abịa hụ na ihe ahụ yiri ọrịa agbasaghị n’ụlọ ahụ mgbe e jirila ájá ụrọ ọhụrụ techie ahụ́ ụlọ ahụ, onye nchụàjà ga-ekwu na ụlọ ahụ adịla ọcha, n’ihi na ihe ahụ yiri ọrịa alaala. 49 Ọ ga-ewere nnụnụ abụọ, osisi sida, ákwà na-acha uhie uhie, na ahịhịa hisop+ ma jiri ha mee ka ụlọ ahụ dị ọcha.* 50 Ọ ga-egbu otu nnụnụ n’ite ụrọ nke mmiri e kutere n’iyi dị n’ime ya. 51 Ọ ga-ewere osisi sida ahụ, ahịhịa hisop, ákwà na-acha uhie uhie, na nnụnụ nke ọzọ dị ndụ ma sụnyekọta ha n’ọbara nnụnụ ahụ e gburu n’ite ụrọ nke mmiri e kutere n’iyi dị n’ime ya. Ọ ga-efesakwa ọbara ahụ ugboro asaa+ n’ụlọ ahụ. 52 Ọ ga-eji ọbara nnụnụ ahụ, mmiri ahụ e kutere n’iyi, nnụnụ ahụ dị ndụ, osisi sida ahụ, ahịhịa hisop ahụ, na ákwà ahụ na-acha uhie uhie mee ka ụlọ ahụ dị ọcha.* 53 Ọ ga-esizi n’obodo pụta ma hapụ nnụnụ ahụ dị ndụ ka o feba n’ọhịa. Ọ ga-esi otú ahụ kpuchiere ụlọ ahụ mmehie. Ụlọ ahụ ga-adịzi ọcha.

54 “Ihe a bụ iwu banyere ekpenta, ọrịa bịara mmadụ n’ala isi ma ọ bụ n’afụ ọnụ,*+ 55 ihe yiri ọrịa ekpenta nke pụtara n’uwe+ ma ọ bụ n’ụlọ,+ 56 nakwa banyere ebe ahụ́ mmadụ zara aza, ebe mmadụ nwere ihe yiri ọnyá kpọchiri akpọchi n’ahụ́ ya, nakwa ebe ntụpọ pụtara n’ahụ́ mmadụ.+ 57 A ga-eji iwu a mata mgbe ihe na-adịghị ọcha na mgbe ihe dị ọcha.+ Ọ bụ ya bụ iwu banyere ekpenta.”+

15 Jehova gwakwara Mosis na Erọn, sị: 2 “Gwanụ ndị Izrel okwu, sịnụ ha, ‘Ọ bụrụ na ihe na-agbapụta nwoke n’ihe o ji bụrụ nwoke,* ihe ahụ na-agbapụta ya emeela ka ọ bụrụ onye na-adịghị ọcha.+ 3 Ọ bụ onye na-adịghị ọcha n’ihi ihe ahụ na-agbapụta ya n’ahụ́, ma ihe ahụ ọ̀ ka nọ na-agbapụta ya n’ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ̀ sụchiri ihe o ji bụrụ nwoke, ọ ka bụ onye na-adịghị ọcha.

4 “‘Àkwà* ọ bụla onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́ dinara na ya ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. Ihe ọ bụla ọ nọrọ ọdụ na ya ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. 5 Onye ọ bụla nke metụrụ àkwà* ya aka ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 6 Onye ọ bụla nọrọ ọdụ n’ihe onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́ nọrọ ọdụ ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 7 Onye ọ bụla metụrụ onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́ aka ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 8 Ọ bụrụ na onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́ agbụọ onye dị ọcha asọ mmiri, onye ahụ ọ gbụrụ asọ mmiri ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 9 Ihe ọ bụla onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́ ji nọrọ ọdụ n’elu anụmanụ ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. 10 Onye ọ bụla metụrụ ihe ọ bụla ọ nọrọ ọdụ na ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. Onye ọ bụla buuru ihe ndị ahụ ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 11 Ọ bụrụ na onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́+ emetụ mmadụ aka mgbe ọ na-akwọbeghị aka ya na mmiri, onye o metụrụ aka ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 12 A ga-akụri ite ụrọ onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́ metụrụ aka, jirikwa mmiri saa arịa ọ bụla e ji osisi rụọ.+

13 “‘Mgbe ihe ahụ kwụsịrị ịgbapụta onye ahụ n’ahụ́, ya abụrụ na ahụ́ adịla onye ahụ mma, ọ ga-anọ ụbọchị asaa. Ụbọchị asaa ahụ gachaa, ọ ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri iyi saa ahụ́. Ọ ga-abụzi onye dị ọcha.+ 14 N’ụbọchị nke asatọ, ọ ga-anwụrụ nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ+ bịa n’ihu Jehova n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. Ọ ga-enye ha onye nchụàjà. 15 Onye nchụàjà ga-achụ ha n’àjà. Ọ ga-eji otu chụọ àjà mmehie, jiri nke ọzọ chụọ àjà a na-esu ọkụ. Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya n’ihu Jehova n’ihi ihe ahụ nọ na-agbapụta ya n’ahụ́.

16 “‘Ọ bụrụ na ọbara ọcha agbapụta nwoke n’ahụ́, ọ ga-eji mmiri saa ahụ́ ya niile. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 17 Ọ ga-eji mmiri saa uwe ọ bụla na akpụkpọ anụ ọ bụla ọbara ọcha ahụ mesara. Ihe ahụ o mesara ga-abụ ihe na-adịghị ọcha ruo mgbede.

18 “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị enwee mmekọahụ,* ọbara ọcha agbapụta nwoke ahụ n’ahụ́, ha ga-eji mmiri saa ahụ́. Ha ga-abụ ndị na-adịghị ọcha ruo mgbede.+

19 “‘Ọ bụrụ na ọbara agbapụta nwaanyị n’ahụ́, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa maka nsọ ya ọ na-ahụ.+ Onye ọ bụla metụrụ ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 20 Ihe ọ bụla o dinara ala na ya mgbe ọ na-ahụ nsọ ya ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. Ihe ọ bụla ọ nọkwara ọdụ na ya ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.+ 21 Onye ọ bụla metụrụ àkwà* ya aka ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 22 Onye ọ bụla metụrụ aka n’ihe ọ bụla ọ nọrọ ọdụ na ya ga-asụ uwe ya ma jiri mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 23 Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ nọdụrụ n’àkwà* ma ọ bụ n’ihe ọzọ, onye metụrụ ihe ahụ ọ nọdụrụ na ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 24 Ọ bụrụ na ya na nwoke enwee mmekọahụ,* ọbara nsọ ya emesa ya,+ nwoke ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa. Àkwà* ọ bụla nwoke ahụ dinara ala na ya ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.

25 “‘Ọ bụrụ na ọbara agbaa nwaanyị ọtụtụ ụbọchị+ mgbe na-abụghị oge o ji ahụ nsọ ya,+ ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọbara agbaa ya gafee ụbọchị ole ọbara na-agba ya n’oge ọ na-ahụ nsọ ya, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha n’ụbọchị niile ọbara na-agbapụta ya n’ahụ́, otú ọ na-adị n’oge ọ na-ahụ nsọ ya. 26 Àkwà* ọ bụla o dinara na ya n’ụbọchị ndị ahụ ọbara na-agbapụta ya n’ahụ́ ga-abụ ihe na-adịghị ọcha, otú ọ na-adị n’oge ọ na-ahụ nsọ ya.+ Ihe ọ bụla ọ nọkwara ọdụ na ya ga-abụ ihe na-adịghị ọcha, otú ọ na-adị n’oge ọ na-ahụ nsọ ya. 27 Onye ọ bụla metụrụ ihe ndị ahụ aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha. Ọ ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+

28 “‘Ma, mgbe ọbara ahụ kwụsịrị ịgbapụta ya n’ahụ́, ya abụrụ na ahụ́ adịla ya mma, ọ ga-anọ ụbọchị asaa. Ụbọchị asaa ahụ gachaa, ọ ga-abụzi onye dị ọcha.+ 29 N’ụbọchị nke asatọ, ọ ga-anwụrụ nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ+ nwụtara onye nchụàjà n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.+ 30 Onye nchụàjà ga-eji otu chụọ àjà mmehie, jiri nke ọzọ chụọ àjà a na-esu ọkụ. Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya n’ihu Jehova n’ihi ọbara ahụ na-adịghị ọcha nọ na-agbapụta ya n’ahụ́.+

31 “‘Unu ga-esi otú a nyere ndị Izrel aka ka ha na-adị ọcha, ka ha ghara imerụ ụlọikwuu m, nke dị n’etiti ha,+ wee nwụọ.

32 “‘Ihe a bụ iwu banyere nwoke ihe na-agbapụta n’ahụ́, nwoke na-adịghị ọcha n’ihi ọbara ọcha na-agbapụta ya n’ahụ́,+ 33 nwaanyị nọ ná nsọ ya,+ nwoke ọ bụla ma ọ bụ nwaanyị ọ bụla ihe na-agbapụta n’ahụ́,+ nakwa banyere nwoke ya na nwaanyị na-adịghị ọcha nwere mmekọahụ.’”*

16 Jehova gwara Mosis okwu mgbe ụmụ Erọn abụọ nwụchara maka na ha bịara n’ihu Jehova otú na-ekwesịghị ekwesị.+ 2 Jehova gwara Mosis, sị: “Gwa Erọn nwanne gị nwoke na ọ bụghị mgbe ọ bụla ka ọ ga na-abata n’ebe nsọ,+ n’ime ebe ahụ e gechiri ákwà mgbochi,+ n’ihu okwuchi Igbe ahụ, ka ọ ghara ịnwụ,+ n’ihi na m ga na-apụta n’ígwé ojii+ n’elu okwuchi+ Igbe ahụ.

3 “Erọn ga-eji ihe ndị a mgbe ọ na-abata n’ebe nsọ: oké ehi ọ ga-eji chụọ àjà mmehie+ na ebule ọ ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ.+ 4 Ọ ga-eyiri uwe mwụda dị nsọ e ji eri linin kpaa,+ yirikwa uwe úkwù*+ e ji eri linin kpaa nke ga-ekpuchi ahụ́* ya. Ọ ga-ekekwa onwe ya ákwà a na-eke n’úkwù e ji eri linin kpaa,+ keekwa ákwà isi e ji eri linin kpaa.+ Ha bụ uwe dị nsọ.+ Ọ ga-eji mmiri saa ahụ́,+ yirizie ha.

5 “Ọ ga-anata nzukọ ndị Izrel+ mkpi abụọ ọ ga-eji chụọ àjà mmehie nakwa otu ebule ọ ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ.

6 “Erọn ga-achụzi oké ehi ahụ bụ́ maka àjà mmehie n’àjà, ya bụ, nke ahụ bụ́ maka onwe ya. Ọ ga-ekpuchiri onwe ya mmehie ya,+ kpuchiekwara ezinụlọ* ya.

7 “Ọ ga-akpụrụ mkpi abụọ ahụ mee ka ha guzo n’ihu Jehova n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 8 Erọn ga-efe nza n’isi mkpi abụọ ahụ ka ọ mara nke ga-abụ nke Jehova na nke ga-abụ maka Azazel.* 9 Erọn ga-achụ mkpi nza mara+ ka ọ bụrụ nke Jehova n’àjà. Ọ ga-eji ya chụọ àjà mmehie. 10 Ma, a ga-akpụta mkpi nza mara maka Azazel ná ndụ ka o guzo n’ihu Jehova ka e jiri ya kpuchie mmehie, ka e wee kpụga ya n’ala ịkpa maka Azazel.+

11 “Erọn ga-eweta oké ehi ahụ bụ́ maka àjà mmehie, ya bụ, nke ahụ bụ́ maka onwe ya, jiri ya kpuchiere onwe ya na ezinụlọ* ya mmehie ha. E mechaa, ọ ga-egbu oké ehi ahụ bụ́ maka àjà mmehie, nke bụ́ maka onwe ya.+

12 “Ọ ga-ewere ihe e ji amụ insens+ a gụjuru icheku ọkụ nke si n’ebe ịchụàjà+ dị n’ihu Jehova nakwa insens na-esi ísì ọma+ juru ọbụ aka abụọ. Ọ ga-ewere ha bata n’ime ebe ahụ e gechiri ákwà mgbochi.+ 13 Ọ ga-awụsakwa insens* ahụ n’elu ọkụ ahụ n’ihu Jehova.+ Anwụrụ ọkụ si n’insens ahụ ga-ekpuchi okwuchi igbe ọgbụgba ndụ*+ ahụ ka ọ ghara ịnwụ.

14 “Ọ ga-eweretụ ọbara+ oké ehi ahụ ma jiri mkpịsị aka ya fesa ya n’ihu okwuchi Igbe ahụ n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ ga-ejikwa mkpịsị aka ya fesa ọbara ahụ ugboro asaa n’ihu okwuchi Igbe ahụ.+

15 “Ọ ga-egbu mkpi ahụ bụ́ maka àjà mmehie, nke bụ́ maka ndị Izrel.+ Ọ ga-ewebata ọbara ya n’ime ebe ahụ e gechiri ákwà mgbochi+ ma were ọbara ya+ mee ihe o ji ọbara oké ehi ahụ mee. Ọ ga-efesa ya n’ihu okwuchi Igbe ahụ.

16 “Ọ ga-ekpuchiri ebe nsọ ahụ mmehie n’ihi ihe ndị Izrel, bụ́ ndị na-adịghị ọcha, mere nakwa n’ihi nnupụisi ha na mmehie ha.+ Ọ ga-emekwa otu ihe ahụ maka ụlọikwuu nzute, nke dị n’etiti ndị Izrel, bụ́ ndị na-adịghị ọcha.

17 “E nweghị onye ọzọ ga-anọ n’ụlọikwuu nzute malite mgbe ọ banyere n’ebe nsọ ka o kpuchie mmehie ruo mgbe ọ pụtara. Ọ ga-ekpuchiri onwe ya na ezinụlọ* ya mmehie ha,+ kpuchiekwara ọgbakọ Izrel niile mmehie ha.+

18 “Ọ ga-apụta gaa n’ebe ịchụàjà+ nke dị n’ihu Jehova ma kpuchiere ebe ịchụàjà ahụ mmehie. Ọ ga-eweretụ ọbara oké ehi ahụ, weretụkwa ọbara mkpi ahụ ma tee ha na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà ahụ, n’akụkụ ya niile. 19 Ọ ga-ejikwa mkpịsị aka ya fesa ọbara ahụ n’elu ya ugboro asaa wee mee ka ọ dị ọcha, dookwa ya nsọ n’ihi ihe ndị Izrel, bụ́ ndị na-adịghị ọcha, mere.

20 “Mgbe o kpuchichaara+ ebe nsọ na ụlọikwuu nzute nakwa ebe ịchụàjà+ mmehie, ọ ga-akpụtakwa mkpi ahụ dị ndụ.+ 21 Erọn ga-ebikwasị aka ya abụọ n’isi mkpi ahụ dị ndụ ma kwupụta ihe ọjọọ niile ndị Izrel mere na nnupụisi ha niile na mmehie ha niile n’isi mkpi ahụ. Ọ ga-eme ka ha dịrị n’isi mkpi ahụ.+ Ọ ga-edunyezi otu nwoke a họpụtara* ka ọ kpụrụ mkpi ahụ kpụga ya n’ala ịkpa. 22 Mkpi ahụ ga-eburu mmehie ha niile+ banye n’ọzara.+ Ọ ga-akpụga mkpi ahụ n’ala ịkpa.+

23 “Erọn ga-abanye n’ụlọikwuu nzute yipụ uwe ndị ahụ e ji eri linin kpaa o yiiri mgbe ọ banyere n’ebe nsọ ahụ. Ọ ga-awụsa ha n’ebe ahụ. 24 Ọ ga-eji mmiri saa ahụ́+ n’ebe dị nsọ ma yiri uwe ya.+ Ọ ga-apụtazi chụọ àjà a na-esu ọkụ nke ya+ nakwa àjà a na-esu ọkụ nke ndị Izrel.+ Ọ ga-ekpuchiri onwe ya mmehie ya, kpuchiekwara ndị Izrel mmehie ha.+ 25 Ọ ga-esu abụba anụ e ji chụọ àjà mmehie ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà.

26 “Nwoke ahụ nke kpụpụrụ mkpi ahụ bụ́ maka Azazel+ ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. O mechaa, o nweziri ike ịbata n’ebe unu mara ụlọikwuu.

27 “A ga-eburu ozu oké ehi ahụ e ji chụọ àjà mmehie na ozu mkpi ahụ e ji chụọ àjà mmehie, bụ́ ndị e bubatara ọbara ha n’ebe nsọ ka e jiri kpuchie mmehie, pụọ n’ebe unu mara ụlọikwuu. A ga-akpọ akpụkpọ ha na anụ ha na nsị ha ọkụ.+ 28 Onye kpọrọ ha ọkụ ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. O mechaa, o nweziri ike ịbata n’ebe unu mara ụlọikwuu.

29 “Ihe a ga-abụrụ unu iwu na-adịgide adịgide: N’abalị iri n’ọnwa nke asaa, unu ga-emekpa onwe* unu ahụ́.* Unu agaghịkwa arụ ọrụ ọ bụla,+ ma nwa afọ ma onye mbịarambịa binyeere unu. 30 N’ụbọchị a, a ga-ekpuchiri unu mmehie,+ ka e wee kwuo na unu adịla ọcha. N’anya Jehova, unu ga-abụzi ndị a sachapụrụ mmehie ha niile.+ 31 Ọ bụ ụbọchị izu ike nke unu ga-ezu naanị ike na ya. Unu ga-emekpakwa onwe* unu ahụ́.+ Ọ bụ iwu na-adịgide adịgide.

32 “Ọ bụ onye nchụàjà e tere mmanụ,+ onye a họpụtara ka ọ bụrụ onye nchụàjà+ nke ga-anọchi nna ya,+ ga na-ekpuchi mmehie. Ọ bụkwa ya ga-eyiri uwe ndị ahụ e ji linin kpaa,+ ya bụ, uwe ndị ahụ dị nsọ.+ 33 Ọ bụ ya ga na-ekpuchi mmehie maka ebe kacha nsọ,+ ụlọikwuu nzute,+ nakwa ebe ịchụàjà.+ Ọ bụkwa ya ga-ekpuchiri ndị nchụàjà mmehie ha, kpuchiekwara mmadụ niile n’ọgbakọ Izrel.+ 34 Ihe a ga-abụrụ unu iwu na-adịgide adịgide,+ ka e wee na-ekpuchiri ndị Izrel mmehie ha niile otu ugboro n’afọ.”+

O* mere nnọọ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

17 Jehova wee gwa Mosis, sị: 2 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke nakwa ndị Izrel niile okwu, sị ha, ‘Ihe a bụ ihe Jehova nyere n’iwu:

3 “‘“Ọ bụrụ na onye Izrel ọ bụla anọrọ n’ebe unu mara ụlọikwuu gbuo oké ehi ma ọ bụ ebule ma ọ bụ ewu ma ọ bụkwanụ nọrọ n’ebe ọzọ na-abụghị n’ebe unu mara ụlọikwuu gbuo ya, 4 kama iweta ya n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ma jiri ya chụọrọ Jehova àjà n’ihu ụlọikwuu Jehova, ikpe ọbara mara onye ahụ. O gburu anụmanụ otú iwu na-akwadoghị.* A ga-egbukwa onye ahụ.* 5 Iwu a ga-eme ka ndị Izrel na-ewetaziri Jehova anụ ndị ha na-anọ n’èzí achụ n’àjà. Ha ga na-ewetara ha onye nchụàjà n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. Ha ga-eji ha na-achụrụ Jehova àjà udo.+ 6 Onye nchụàjà ga-efesa ọbara ha n’ebe ịchụàjà Jehova n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ma suo abụba dị na ha ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ, ka o wee bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.+ 7 Ha ekwesịghịzi ịna-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ yiri ewu* àjà,+ bụ́ ndị ha hapụrụ Chineke gaa fewe.*+ Ihe a bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe.”’

8 “Ị ga-agwa ha, sị, ‘E nweghị onye Izrel ọ bụla ma ọ bụ onye mbịarambịa ọ bụla binyeere unu nke kwesịrị ịnọ n’ebe ọ bụla sọrọ ya chụọ àjà a na-esu ọkụ ma ọ bụ àjà ọzọ. 9 Kama o kwesịrị iweta ya n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute ka o jiri ya chụọrọ Jehova àjà. Onye ọ bula na-emeghị otú a, a ga-egbu ya.*+

10 “‘Ọ bụrụ na onye Izrel ọ bụla ma ọ bụ onye mbịarambịa ọ bụla nke binyeere unu erie ụdị ọbara ọ bụla,+ m ga-ajụ onye* ahụ na-eri ọbara, m ga-egbukwa ya.* 11 N’ihi na ndụ* anụ ahụ́ dị n’ọbara ya.+ Enyekwala m ya unu ka unu jiri ya na-ekpuchiri onwe* unu mmehie,+ maka na ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie+ n’ihi na ndụ* dị na ya. 12 Ọ bụ ya mere m ji gwa ndị Izrel, sị: “Ya enwela onye* n’ime unu ga-eri ọbara. Ya enwekwala onye mbịarambịa binyeere unu+ ga-eri ọbara.”+

13 “‘Ọ bụrụ na onye Izrel ma ọ bụ onye mbịarambịa nke binyeere unu na-achụ nta wee nwụde anụ ọhịa ma ọ bụ nnụnụ a na-eri eri, ọ ga-egbu ya ma hapụ ya ka ọbara ya gbapụchaa.+ Ọ ga-ekpochikwa ọbara ya ájá. 14 N’ihi na ndụ* ụdị anụ ahụ́ ọ bụla bụ ọbara ya, n’ihi na ndụ* ya dị n’ọbara ya. Ọ bụ ya mere m ji gwa ndị Izrel, sị: “Unu erila ọbara nke ụdị anụ ahụ́ ọ bụla n’ihi na ndụ* ụdị anụ ahụ́ ọ bụla bụ ọbara ya. A ga-egbu onye ọ bụla na-eri ya.”+ 15 Ọ bụrụ na onye* ọ bụla erie anụ nwụrụ anwụ ma ọ bụ nke anụ ọhịa dọgburu,+ ma onye ahụ ọ̀ bụ nwa afọ ma ọ̀ bụ mbịarambịa, ọ ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ E mechaa, ọ ga-adị ọcha. 16 Ma ọ bụrụ na ọ sụghị ha, saakwa ahụ́, ọ ga-aza ajụjụ maka mmehie ya.’”+

18 Jehova gwakwara Mosis, sị: 2 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.+ 3 Unu akpala àgwà otú ndị Ijipt unu biri n’ala ha na-akpa. Unu emekwala ihe ndị bi na Kenan, bụ́ ebe m na-akpọga unu, na-eme.+ Unu esokwala omenala ha. 4 Unu ga na-eme ihe niile m kpebiri, na-edebekwa iwu m niile ma na-eso ha.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. 5 Unu ga na-edebe iwu m, na-emekwa ihe m kpebiri. Onye ọ bụla na-eme otú a ga-adị ndụ maka na ọ na-eme ha.+ Abụ m Jehova.

6 “‘Ya enwela onye ọ bụla n’ime unu ga-agakwuru onye ọ bụla bụ́ onye ikwu ya ka ya na ya nwee mmekọahụ.*+ Abụ m Jehova. 7 Gị na nna gị enwela mmekọahụ. Gị na nne gị enwekwala mmekọahụ. Ọ bụ nne gị, gị na ya enwela mmekọahụ.

8 “‘Gị na nwunye nna gị enwela mmekọahụ.+ Ime otú ahụ bụ imenye nna gị ihere.*

9 “‘Gị na nwanne gị nwaanyị enwela mmekọahụ, ma ọ̀ bụ nwa nwaanyị nna gị mụrụ ma ọ̀ bụ nwa nwaanyị nne gị mụrụ, ma à mụrụ gị na ya n’otu ụlọ ma à mụrụ ya n’ebe ọzọ.+

10 “‘Gị na nwa nwaanyị nwa gị nwoke mụrụ ma ọ bụ nwa nwaanyị nwa gị nwaanyị mụrụ enwela mmekọahụ n’ihi na ime otú ahụ bụụrụ gị ihe ihere.*

11 “‘Gị na nwa nwaanyị nwunye nna gị mụrụ, bụ́ nwa nna gị, enwela mmekọahụ, n’ihi na ọ bụ nwanne gị nwaanyị.

12 “‘Gị na nwanne nna gị nke nwaanyị enwela mmekọahụ. Ya na nna gị bụ otu ọbara.+

13 “‘Gị na nwanne nne gị nke nwaanyị enwela mmekọahụ n’ihi na ya na nne gị bụ otu ọbara.

14 “‘Gị na nwunye nwanne nna gị nke nwoke enwela mmekọahụ, ka ị ghara isi otú ahụ menye nwanne nna gị ihere.* Ọ bụ nwunye nwanne nna gị.+

15 “‘Gị na nwunye nwa gị enwela mmekọahụ.+ Ọ bụ nwunye nwa gị nwoke. Gị na ya enwela mmekọahụ.

16 “‘Gị na nwunye nwanne gị nwoke enwela mmekọahụ+ n’ihi na ime otú ahụ bụ imenye nwanne gị nwoke ihere.*

17 “‘Gị na nwaanyị ọ bụla na nwa ya nwaanyị enwela mmekọahụ.+ Alụrụla nwa nwaanyị nwa ya nwoke mụrụ ma ọ bụ nwa nwaanyị nwa ya nwaanyị mụrụ ka gị na ya na-enwe mmekọahụ. Ha na ya bụ otu ọbara. Ọ bụ omume rụrụ arụ.*

18 “‘Alụla nwaanyị lụọkwa nwanne ya nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye di ya,+ gị na ya ana-enwe mmekọahụ mgbe nwanne ya nwaanyị ka nọ ndụ.

19 “‘Agakwurula nwunye gị* ka gị na ya nwee mmekọahụ n’oge ọ na-adịghị ọcha, mgbe ọ na-ahụ nsọ ya.+

20 “‘Gị na nwunye mmadụ ibe gị* enwela mmekọahụ. Ị ga-abụ onye na-adịghị ọcha ma i mee otú ahụ.+

21 “‘Ekwela ka e were nwa gị ọ bụla nye Molek.*+ Emela otú a ka ị ghara imebi aha Chineke gị.+ Abụ m Jehova.

22 “‘Gị na nwoke ibe gị enwela mmekọahụ.*+ Ọ bụ arụ.

23 “‘Nwoke na anụmanụ ekwesịghị inwe mmekọahụ. Nwoke mere otú ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha. Nwaanyị ekwesịghịkwa ịgakwuru anụmanụ ka ya na ya nwee mmekọahụ.+ Ọ bụ arụ.

24 “‘Unu emela nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ka unu ghara ịbụ ndị na-adịghị ọcha, n’ihi na ọ bụ ihe ndị a niile ka mba ndị m na-achụpụrụ unu nọ na-eme wee bụrụ ndị na-adịghị ọcha.+ 25 N’ihi ya, ala ha adịghị ọcha. M ga-atakwa ndị bi na ya ahụhụ maka mmehie ha. A ga-achụpụ ha n’ala ha.*+ 26 Ma ununwa ga na-edebe iwu m, na-emekwa ihe m kpebiri.+ Unu emekwala nke ọ bụla n’ime arụ ndị a, ma nwa afọ ma onye mbịarambịa nke binyeere unu.+ 27 N’ihi na ọ bụ arụ ndị a niile ka ndị biri n’ala a nọ na-eme,+ nke mere na ala a adịghịzi ọcha. 28 A gaghịkwa achụpụ unu n’ala a otú a ga-achụpụ* mba ndị bi na ya tupu unu erute maka na unu agaghị emerụ ala a. 29 Ọ bụrụ na e nwee ndị na-eme nke ọ bụla n’ime arụ ndị a, a ga-egbu ha niile.* 30 Unu ga na-eme ihe niile m chọrọ ka unu na-eme ma ghara ime nke ọ bụla n’omenala rụrụ arụ ndị bi tupu unu erute nọ na-eme,+ ka omume ndị ahụ ghara ime ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”

19 Jehova gwara Mosis okwu ọzọ, sị: 2 “Gwa nzukọ Izrel niile okwu, sị ha, ‘Unu ga-adị nsọ, n’ihi na mụnwa, bụ́ Jehova Chineke unu, dị nsọ.+

3 “‘Onye ọ bụla n’ime unu ga na-akwanyere nne ya na nna ya ùgwù.*+ Unu ga na-edebekwa ụbọchị izu ike m.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. 4 Unu efela chi na-abaghị uru.+ Unu emekwarala onwe unu chi a kpụrụ akpụ.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.

5 “‘Ọ bụrụ na unu na-achụrụ Jehova àjà udo,+ chụọnụ ya otú ga-eme ka ọ nabata ya.+ 6 A ga-eri anụ ya n’ụbọchị unu chụrụ àjà ahụ nakwa n’echi ya. Ma ihe fọrọ na ya ruo n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọ ya ọkụ.+ 7 Ma, ọ bụrụ na e rie ihe ọ bụla fọrọ na ya n’ụbọchị nke atọ, ọ bụ ihe rụrụ arụ. Chineke agaghị anabata ya. 8 Onye riri ya ga-aza ajụjụ maka mmehie ya n’ihi na o merụrụ àjà dị nsọ a chụụrụ Jehova. A ga-egbukwa onye ahụ.*

9 “‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi n’ala unu, unu ewerechala ihe niile dị n’ọnụ ọnụ ubi unu. Unu atụtụkwala ihe unu hapụrụ* n’ihe ubi unu.+ 10 Unu aghọrọla mkpụrụ unu ghọfọrọ n’ubi vaịn unu. Unu atụtụkwala mkpụrụ vaịn dasasịrị n’ubi vaịn unu. Unu ga-ahapụ ha maka ndị ogbenye+ na ndị mbịarambịa. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.

11 “‘Unu ezula ohi.+ Unu eduhiela mmadụ.+ Unu aghọkwala ibe unu aghụghọ. 12 Unu ejila aha m aṅụ iyi ụgha,+ si otú ahụ mebie aha Chineke unu. Abụ m Jehova. 13 Unu erigbula mmadụ ibe unu.+ Unu apụnarala mmadụ ihe.+ Unu goo mmadụ ọrụ, unu ahapụla ịkwụ ya ụgwọ ọrụ ya chi abọọ.+

14 “‘Akpọla onye ntị chiri iyi.* Edochikwarala onye ìsì ihe n’ụzọ.+ Tụọ egwu Chineke gị.+ Abụ m Jehova.

15 “‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi. Unu emerela ogbenye ebere maka na ọ bụ ogbenye. Unu emenyekwarala ọgaranya maka na ọ bụ ọgaranya.+ Na-ekpenụ mmadụ ibe unu ikpe ziri ezi.

16 “‘Agala na-ekwutọsị onye ọzọ n’ihu ụmụnna gị.+ Agbala mbọ ka i gbuo mmadụ ibe gị.*+ Abụ m Jehova.

17 “‘Akpọla nwanna gị asị n’obi gị.+ I kwesịrị ịdọ mmadụ ibe gị aka ná ntị,+ ka ị ghara iso ya buru mmehie ya.

18 “‘Abọla ọbọ.+ Ebukwarala mmadụ ibe gị iwe n’obi. Hụ mmadụ ibe gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.+ Abụ m Jehova.

19 “‘Unu ga-edebe iwu ndị a m na-enye unu: Unu akpọtala anụ ụlọ abụọ na-abụghị otu ụdị anụ ka otu gbaa ibe ya. Unu aghakọtala ụdị mkpụrụ abụọ dị iche iche n’ubi unu.+ Unu eyikwala uwe e ji ụdị eri abụọ dị iche iche kpaa.+

20 “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị enwee mmekọahụ, ya abụrụ na nwaanyị ahụ na-ejere nwoke ọzọ ozi, ya abụrụkwa na e kenyela nwaanyị ahụ nwoke ọzọ, ma nwoke ahụ agbarabeghị ya ma ọ bụkwanụ na nwaanyị ahụ enwerebeghị onwe ya, a ga-ata ha ahụhụ. Ma, a gaghị egbu ha n’ihi na nwaanyị ahụ enwerebeghị onwe ya. 21 Nwoke ahụ ga-ewetara Jehova àjà ikpe ọmụma ya n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ya bụ, ebule a ga-eji chụọ àjà ikpe ọmụma.+ 22 Onye nchụàjà ga-eji ebule ahụ a ga-eji chụọ àjà ikpe ọmụma kpuchiere ya mmehie ya n’ihu Jehova. A ga-agbaghara ya mmehie o mere.

23 “‘Ọ bụrụ na unu abata n’ala ahụ wee kụọ osisi ọ bụla nke unu ga-eri mkpụrụ ya eri, unu ga-ewere mkpụrụ ya ka ihe na-adịghị ọcha na ihe a na-anaghị eri eri.* Ọ ga-abụrụ unu ihe a na-anaghị eri eri ruo afọ atọ. Unu erikwala ya. 24 Ma n’afọ nke anọ, mkpụrụ ya niile ga-abụ mkpụrụ dị nsọ. Ọ ga-abụkwa oge ịṅụrị ọṅụ n’ihu Jehova.+ 25 N’afọ nke ise, unu nweziri ike iri mkpụrụ ya. Ọ ga-esozi ná mkpụrụ unu na-ewe n’ubi. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.

26 “‘Unu erila ihe ọ bụla ọbara dị na ya.+

“‘Unu agbala afa ka unu mata ihe ga-eme n’ọdịnihu. Unu emekwala anwansi.*+

27 “‘Unu akpụla* ajị ndị dị n’akụkụ ntì unu. Unu akpụchapụkwala ọnụ afụ ọnụ* unu.*+

28 “‘Unu ebekasịla ahụ́ unu maka onye nwụrụ anwụ.*+ Unu esenyekwala ihe n’ahụ́ unu. Abụ m Jehova.

29 “‘Emela ka nwa gị nwaanyị gbawa akwụna,+ si otú ahụ metọọ nwa gị nwaanyị. I mee otú ahụ, ịgba akwụna ga-eme ka ala unu rụọ arụọ, omume rụrụ arụ ejukwa n’ala unu.+

30 “‘Unu ga na-edebe ụbọchị izu ike m.+ Unu ga na-akwanyere ebe a na-anọ efe m ùgwù.* Abụ m Jehova.

31 “‘Unu agakwurula ndị na-agba afa.+ Unu ajụkwala ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ase,+ ka ha ghara ime ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.

32 “‘Ị ga-ebiliri onye isi awọ́.+ Ị ga-asọpụrụ agadi.+ Ị ga-atụkwa egwu Chineke gị.+ Abụ m Jehova.

33 “‘Ọ bụrụ na onye mbịarambịa binyeere unu n’ala unu, unu emegbula ya.+ 34 Unu ga-ewere onye mbịarambịa binyeere unu ka nwa afọ.+ Unu ga-ahụkwa ya n’anya otú unu hụrụ onwe unu n’anya, n’ihi na e nwere mgbe unu bụ ndị mbịarambịa n’Ijipt.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.

35 “‘Unu ejila ihe ọ bụla e ji atụ̀ ihe nke na-ezughị ezu tụọ ihe, ma ùnu na-atụ otú ihe hà n’ogologo ma ùnu na-atụ otú ihe dịruru n’arọ ma ùnu na-atụ otú ihe bururu n’ibu.+ 36 Unu ga na-eji ihe zuru ezu atụ̀ ihe. Jirikwanụ ihe zuru ezu e ji atụ̀ otú ihe dịruru n’arọ na ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe dị mmiri mmiri* nakwa ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe na-adịghị mmiri mmiri* na-atụ ihe.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt. 37 N’ihi ya, unu ga na-edebe iwu m niile, na-emekwa ihe niile m kpebiri ma na-eso ha.+ Abụ m Jehova.’”

20 Jehova gwakwara Mosis, sị: 2 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na onye Izrel ọ bụla ma ọ bụ onye mbịarambịa ọ bụla nke bi n’Izrel enye Molek nwa ya ọ bụla,* a ga-egburịrị ya.+ Ndị obodo unu ga-eji nkume tụgbuo ya. 3 M ga-ajụ onye ahụ. M ga-egbukwa ya* maka na o nyere Molek nwa ya ma merụọ ebe nsọ m,+ mebiekwa aha nsọ m. 4 Ọ bụrụ na ndị obodo unu amara ụma leghara onye ahụ anya ma hapụ igbu ya mgbe o nyere Molek nwa ya,+ 5 m ga-ajụ onye ahụ na ezinụlọ ya.+ M ga-egbu onye ahụ,* gbuokwa ndị niile sooro ya kpawa àgwà ka ndị akwụna wee hapụ m fewe Molek.

6 “‘M ga-ajụ onye* hapụrụ m* gakwuru ndị na-agba afa+ na ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ M ga-egbukwa ya.*+

7 “‘Unu ga-edo onwe unu nsọ ma dị nsọ,+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. 8 Unu ga-edebe iwu m niile ma na-eme ha.+ Abụ m Jehova, onye na-edo unu nsọ.+

9 “‘Ọ bụrụ na e nwee onye kpọrọ nne ya ma ọ bụ nna ya iyi,* a ga-egburịrị ya.+ Ebe ọ bụ na ọ kpọrọ nne ya ma ọ bụ nna ya iyi, ọbara ya ga-adị ya n’isi.

10 “‘Ihe a bụ ihe a ga-eme ma nwoke na nwunye onye ọzọ kwaa iko: A ga-egburịrị onye ya na nwunye nwoke ibe ya kwara iko. A ga-egbu ma nwoke ahụ ma nwaanyị ahụ kwara iko.+ 11 Nwoke ya na nwunye nna ya nwere mmekọahụ* emenyela nna ya ihere.*+ A ga-egburịrị ha abụọ. Ọbara ha ga-adị ha n’isi. 12 Ọ bụrụ na nwoke na nwunye nwa ya enwee mmekọahụ,* a ga-egburịrị ha abụọ. Ha mere arụ. Ọbara ha ga-adị ha n’isi.+

13 “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwoke ibe ya enwee mmekọahụ,* ha abụọ emeela arụ.+ A ga-egburịrị ha. Ọbara ha ga-adị ha n’isi.

14 “‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị, ya na nne nwunye ya enweekwa mmekọahụ, ọ bụ omume rụrụ arụ.*+ A ga-egbu ya na ha ma kpọọ ha ọkụ,*+ ka omume rụrụ arụ ghara ịdịrị gawa n’ebe unu bi.

15 “‘Ọ bụrụ na nwoke na anụmanụ enwee mmekọahụ, a ga-egburịrị nwoke ahụ. Unu ga-egbukwa anụmanụ ahụ.+ 16 Ọ bụrụ na nwaanyị agakwuru anụmanụ ọ bụla ka ya na ya nwee mmekọahụ,+ unu ga-egbu nwaanyị ahụ na anụmanụ ahụ. A ga-egburịrị ha. Ọbara ha ga-adị ha n’isi.

17 “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwanne ya nwaanyị, ya bụ, nwa nwaanyị nna ya mụrụ ma ọ bụ nwa nwaanyị nne ya mụrụ, enwee mmekọahụ wee hụ ọtọ ibe ha, ọ bụ ihe ihere.+ A ga-egbu ha n’ihu ndị Izrel. Nwoke ahụ emenyela nwanne ya nwaanyị ihere.* Ọ ga-aza ajụjụ maka mmehie ya.

18 “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị nọ ná nsọ ya enwee mmekọahụ, ma nwoke ahụ ma nwaanyị ahụ ekpugheela ọbara na-agba nwaanyị ahụ.+ A ga-egbu ha abụọ.*

19 “‘Gị na nwanne nne gị nke nwaanyị na nwanne nna gị nke nwaanyị enwela mmekọahụ, n’ihi na ime otú ahụ bụ imenye onye gị na ya bụ otu ọbara ihere.+ Ndị mere ya ga-aza ajụjụ maka mmehie ha. 20 Nwoke ya na nwunye nwanne nna ya dinara emenyela nwanne nna ya ihere.*+ Ha ga-aza ajụjụ maka mmehie ha. Ha ga-anwụ n’amụtaghị nwa. 21 Ọ bụrụ na nwoke na nwunye nwanne ya enwee mmekọahụ, ọ bụ arụ.+ Nwoke ahụ emenyela nwanne ya nwoke ihere.* Ha agaghị amụta nwa.

22 “‘Debenụ iwu m niile, na-emekwanụ ihe niile m kpebiri,+ na-erubekwanụ isi na ha,+ ka a ghara ịchụpụ unu n’ala m na-akpọbata unu ka unu biri na ya.+ 23 Unu esokwala omenala nke mba ndị m na-achụpụrụ unu maka na ha mere ihe a niile,+ akpọkwara m ha asị.+ 24 Ọ bụ ya mere m ji sị unu: “Unu ga-eweghara ala ha. M ga-enyekwa ya unu ka ọ bụrụ nke unu, bụ́ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye mere ka unu dị iche ná ndị niile ọzọ.”+ 25 Unu ga-ama ihe dị iche n’anụ dị ọcha na anụ na-adịghị ọcha, marakwa ihe dị iche ná nnụnụ na-adịghị ọcha na nnụnụ dị ọcha.+ Unu ejikwala anụmanụ ma ọ bụ nnụnụ ma ọ bụ ihe ọ bụla na-arịgharị n’ala* merụọ onwe unu, ya bụ, anụ niile m gwara unu ka unu were ka anụ ndị na-adịghị ọcha.+ 26 Unu ga-abụrụ m ndị dị nsọ, n’ihi na mụnwa bụ́ Jehova dị nsọ.+ M na-emekwa ka unu dị iche ná ndị niile ọzọ, ka unu bụrụ ndị m.+

27 “‘Nwoke ma ọ bụ nwaanyị ọ bụla na-agba afa ma ọ bụ na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu, a ga-egburịrị ya.+ Ndị obodo unu ga-eji nkume tụgbuo ya. Ọbara ya ga-adị ya n’isi.’”

21 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Gwa ndị nchụàjà, bụ́ ụmụ Erọn okwu, sị ha, ‘Ka onye nchụàjà ọ bụla ghara imerụ onwe ya n’ihi onye nwụrụ anwụ* n’ime ndị Izrel.*+ 2 Ma, o nwere ike imerụ onwe ya n’ihi onye ikwu ya nke ya na ya bụ otu ọbara, ya bụ, nne ya, nna ya, nwa ya nwoke, nwa ya nwaanyị ma ọ bụ nwanne ya nwoke. 3 O nwekwara ike imerụ onwe ya n’ihi nwanne ya nwaanyị ya na ya bi ma ọ bụrụ na nwanne ya nwaanyị ahụ amabeghị nwoke ma ọ bụkwanụ lụọ di. 4 Ọ gaghị emerụ onwe ya wee bụrụ onye na-adịghị nsọ n’ihi nwaanyị otu n’ime ndị Izrel lụrụ. 5 Ha agaghị akpụchapụ isi ha+ ma ọ bụ kpụchapụ ọnụ afụ ọnụ* ha ma ọ bụkwanụ bekasịa ahụ́ ha.+ 6 Ha ga-abụrụ Chineke ha ndị dị nsọ.+ Ha agaghị emebi aha Chineke ha+ n’ihi na ọ bụ ha na-achụrụ Jehova àjà ndị a na-esu ọkụ, bụ́ achịcha* Chineke ha. Ha ga-adị nsọ.+ 7 Ha agaghị alụ akwụna+ ma ọ bụ nwaanyị e merụrụ emerụ ma ọ bụkwanụ nwaanyị di ya gbara alụkwaghịm,+ n’ihi na onye nchụàjà dị nsọ n’anya Chineke ya. 8 Unu ga-ewere ya ka onye dị nsọ+ n’ihi na ọ bụ ya na-ewetara Chineke unu achịcha. Unu ga-ewere ya ka onye dị nsọ n’ihi na mụnwa bụ́ Jehova, onye kpọpụtara unu iche ka unu dị nsọ, dị nsọ.+

9 “‘Ọ bụrụ na nwa nwaanyị onye nchụàjà mụrụ agbaa akwụna wee merụọ onwe ya, ọ bụ nna ya ka o mechuru ihu. A ga-egbu nwa ahụ ma kpọọ ya ọkụ.+

10 “‘Onye bụ́ onyeisi nchụàjà n’ime ụmụnne ya, onye e tere mmanụ,+ onye a họpụtakwara ka o yiri uwe onyeisi nchụàjà,+ agaghị ahapụ isi ya n’edozighị ya edozi. Ọ gaghịkwa adọwa uwe ya.+ 11 Ọ gaghị abịa onye ọ bụla nwụrụ anwụ* nso.+ Ọ gaghịdị emerụ onwe ya n’ihi nne ya ma ọ bụ nna ya. 12 Ọ gaghị apụ n’ụlọikwuu. Ọ gaghịkwa emerụ ụlọikwuu Chineke ya+ n’ihi na ihe àmà nke na-egosi na e nyefeela ya n’aka Chineke, bụ́ mmanụ Chineke ya tere ya,+ dị n’isi ya. Abụ m Jehova.

13 “‘Ọ bụ nwaanyị na-amaghị nwoke ka ọ ga-alụ.+ 14 Ọ gaghị alụ nwaanyị di ya nwụrụ, nwaanyị a gbara alụkwaghịm, nwaanyị e merụrụ emerụ ma ọ bụkwanụ akwụna. Kama ọ ga-esi ná ndị Izrel lụrụ nwaanyị na-amaghị nwoke. 15 Ọ gaghị eme ihe ga-emerụ nwa* ya n’ime ndị Izrel,+ n’ihi na abụ m Jehova, onye mere ka ọ dị nsọ.’”

16 Jehova gwakwara Mosis, sị: 17 “Gwa Erọn, sị, ‘E nweghị nwa* gị nwoke ọ bụla n’ọgbọ ha niile ga-abịa ka ọ chụọrọ Chineke ya achịcha n’àjà ma ọ bụrụ na o nwere nkwarụ. 18 Ọ bụrụ na e nwere nwoke nwere nkwarụ, ọ gaghị abịa ịchụrụ Chineke achịcha n’àjà, ya bụ, nwoke kpuru ìsì ma ọ bụ nwoke dara ngwọrọ ma ọ bụ nwoke ihu ya hịgọrọ ahịgọ* ma ọ bụ nwoke otu aka ya ma ọ bụ otu ụkwụ ya dị ogologo karịa ibe ya, 19 ma ọ bụ nwoke ụkwụ ya ma ọ bụ aka ya gbajiri agbaji, 20 ma ọ bụ nwoke nwere mkpumkpu azụ ma ọ bụ nwoke bụ́ akpụda* ma ọ bụ nke ihe mere n’anya ma ọ bụ nke ụ́gwọ̀ mere n’ahụ́ ma ọ bụ nke nwere ọkpụisi eri ngo ma ọ bụ nke mkpụrụ amụ ya mebiri emebi.+ 21 E nweghị nwoke ọ bụla nwere nkwarụ bụ́ nwa* Erọn onye nchụàjà ga-abịa ịchụ àjà Jehova ndị a na-esu ọkụ. Ebe ọ bụ na o nwere nkwarụ, ọ gaghị abịa ịchụrụ Chineke achịcha n’àjà. 22 O nwere ike iri achịcha Chineke ya, ya bụ, achịcha si n’ihe ndị kacha nsọ+ nakwa n’ihe ndị dị nsọ.+ 23 Ma, ọ gaghị abịa ákwà mgbochi ahụ nso.+ Ọ gaghịkwa abịa nso n’ebe ịchụàjà+ maka na o nwere nkwarụ. Ọ gaghịkwa emerụ ụlọikwuu m+ n’ihi na abụ m Jehova, onye na-eme ka ha dị nsọ.’”+

24 Mosis wee gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke nakwa ndị Izrel niile ihe ndị a.

22 Jehova gwakwara Mosis, sị: 2 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ka ha kpachara anya n’otú ha si emetụ ihe ndị dị nsọ ndị Izrel na-eweta aka nakwa ihe ndị ha na-enye m,+ ka ha ghara imebi aha nsọ m.+ Abụ m Jehova. 3 Sị ha, ‘N’ọgbọ unu niile, nwa unu ọ bụla bịara nso n’ihe ndị dị nsọ ndị Izrel na-ewetara Jehova mgbe ọ na-adịghị ọcha, a ga-egbu ya.*+ Abụ m Jehova. 4 Nwoke ọ bụla bụ́ nwa Erọn nke na-arịa ekpenta+ ma ọ bụ nke ihe na-agbapụta n’ahụ́+ agaghị eri ihe dị nsọ ruo mgbe ọ dịrị ọcha.+ E nweghị nwoke ga-eri ya ma ọ bụrụ na o metụrụ onye na-adịghị ọcha aka, ya bụ, onye na-adịghị ọcha maka na o metụrụ onye nwụrụ anwụ*+ aka. Nwoke ọbara ọcha na-agbapụta n’ahụ́ agaghịkwa eri ya.+ 5 Nwoke metụrụ obere anụmanụ* na-adịghị ọcha aka+ ma ọ bụ nwoke metụrụ onye na-adịghị ọcha aka bụ́ onye nwere ike ime ka ọ ghara ịdị ọcha agaghịkwa eri ya.+ 6 Onye* ọ bụla metụrụ ihe ọ bụla n’ime ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. Onye ahụ agaghịkwa eri ihe ọ bụla dị nsọ, kama ọ ga-eji mmiri saa ahụ́.+ 7 Ọ ga-adị ọcha mgbe anyanwụ dara. E mechaa, o nwere ike iri ihe si n’ihe ndị dị nsọ maka na ọ bụ nri ya.+ 8 Ọ gaghịkwa eri anụ ọ bụla nwụrụ anwụ ma ọ bụ ihe ọ bụla anụ ọhịa dọgburu, ka ọ ghara ime ka ọ bụrụ onye na-adịghị ọcha.+ Abụ m Jehova.

9 “‘Ha ga na-eme ihe niile m chọrọ ka ha na-eme ka ha ghara imehie maka na ha emeghị ya, ha ewee nwụọ maka na ha na-emebi iwu m. Abụ m Jehova, onye na-eme ka ha dị nsọ.

10 “‘Onye ọ bụla na-esighị n’ezinụlọ ndị nchụàjà* agaghị eri ihe ọ bụla dị nsọ.+ E nweghị onye mbịarambịa binyeere onye nchụàjà ma ọ bụ onye ọrụ o goro ego ga-eri ihe ọ bụla dị nsọ. 11 Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà ejiri ego ya zụta mmadụ,* onye ahụ nwere ike iso ya na-eri ihe dị nsọ. Ndị ohu a mụrụ n’ụlọ ya nwekwara ike iso ya na-eri nri ya.+ 12 Ọ bụrụ na nwa onye nchụàjà alụọ nwoke na-abụghị onye nchụàjà,* ọ gaghịzi na-eri ihe si n’onyinye ndị dị nsọ. 13 Ma ọ bụrụ na a gbaa nwa onye nchụàjà alụkwaghịm ma ọ bụkwanụ di ya anwụọ, ma ọ mụtaghị nwa, o wee laghachi n’ụlọ nna ya biri otú o bi mgbe ọ ka bụ agbọghọ, o nwere ike ịna-eri nri nna ya.+ Ma onye ọ bụla na-esighị n’ezinụlọ ndị nchụàjà* agaghị eri ya.

14 “‘Ọ bụrụ na mmadụ erie ihe dị nsọ n’amaghị ụma, ọ ga-akwụ ụgwọ ihe ahụ o riri, wetakwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ihe ahụ ma were ha nye onye nchụàjà.+ 15 N’ihi ya, ha agaghị emerụ ihe ndị dị nsọ ndị Izrel na-ewetara Jehova+ 16 wee mee ka ndị Izrel taa ahụhụ mmehie ha maka na ha riri ihe ndị dị nsọ; n’ihi na abụ m Jehova, onye na-eme ka ha dị nsọ.’”

17 Jehova gwakwara Mosis, sị: 18 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke nakwa ndị Izrel niile okwu, sị ha, ‘Mgbe onye Izrel ọ bụla ma ọ bụ onye mbịarambịa bi n’Izrel na-ewetara Jehova àjà a na-esu ọkụ+ ka o jiri ya mezuo nkwa o kwere ma ọ bụ ka ọ bụrụ onyinye si ya n’obi ọ na-enye Chineke,+ 19 ọ ga-esi n’ìgwè ehi ma ọ bụ n’ụmụ ebule ma ọ bụ n’ìgwè ewu weta oké nke ahụ́ dị mma,+ ka e wee nabata onyinye ya. 20 Unu ewetala ihe ọ bụla nwere nkwarụ+ n’ihi na ọ ga-eme ka Chineke ghara ịnabata unu.

21 “‘Ọ bụrụ na mmadụ na-ewetara Jehova àjà udo+ ka o jiri ya mezuo nkwa o kwere ma ọ bụ ka ọ bụrụ onyinye si ya n’obi ọ na-enye Chineke, ọ ga-esi n’ìgwè ehi ma ọ bụ n’ìgwè ewu na atụrụ weta anụmanụ ahụ́ dị mma ka e wee nabata onyinye ya. Anụmanụ ahụ agaghị enwe nkwarụ ọ bụla. 22 A gaghị eweta anụmanụ kpuru ìsì, nke ọkpụkpụ ya gbajiri agbaji, nke ihe chawara ahụ́, nke nwere ákpụ̀, akpụkpa ma ọ bụ ọkpụisi eri ngo. Unu ewetakwarala Jehova anụmanụ ọ bụla nwere nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ma ọ bụ jiri ya chụọrọ Jehova àjà n’ebe ịchụàjà. 23 Unu nwere ike iji ehi ma ọ bụ atụrụ otu ụkwụ ya ma ọ bụ otu aka ya dị ogologo ma ọ bụ dị mkpụmkpụ karịa ibe ya nye onyinye si unu n’obi. Ma a gaghị anabata ya ma unu weta ya ka unu jiri ya mezuo nkwa unu kwere. 24 Unu ewetarala Jehova anụmanụ mkpụrụ amụ ya mebiri emebi ma ọ bụ nke a kụpịara mkpụrụ amụ ma ọ bụ nke a pịrị amụ. Unu ejikwala anụmanụ dị otú ahụ achụ àjà n’ala unu. 25 Unu anatala onye mbịarambịa nke ọ bụla n’ime anụmanụ ndị ahụ ka e jiri ya chụọ àjà ka ọ bụrụ achịcha* Chineke unu n’ihi na ha rụrụ arụ, nweekwa nkwarụ. Chineke agaghị anabata ha.’”

26 Jehova gwakwara Mosis, sị: 27 “Ọ bụrụ na a mụọ oké ehi ma ọ bụ ebule ma ọ bụ ewu, ya na nne ya ga-anọ ruo ụbọchị asaa.+ Ma malite n’ụbọchị nke asatọ gawa, Jehova ga-anabata ya ma e jiri ya chụọrọ ya àjà, ya bụ, àjà a na-esu ọkụ. 28 Unu egbula ehi ma ọ bụ atụrụ na nwa ya n’otu ụbọchị.+

29 “Ọ bụrụ na unu achụọrọ Jehova àjà iji kelee ya,+ unu ga-achụ ya otú ga-eme ka ọ nabata ya. 30 A ga-eri anụ àjà ahụ n’ụbọchị ahụ. Unu edofọla ihe ọ bụla n’ime ya ruo ụtụtụ.+ Abụ m Jehova.

31 “Na-edebenụ ihe m nyere n’iwu, na-emekwanụ ha.+ Abụ m Jehova. 32 Unu emebila aha nsọ m.+ A ga-edokwa m nsọ n’etiti ndị Izrel.+ Abụ m Jehova, onye na-eme ka unu dị nsọ,+ 33 onye kpọpụtara unu n’Ijipt iji gosi na m bụ Chineke unu.+ Abụ m Jehova.”

23 Jehova gwakwara Mosis, sị: 2 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Ememme ndị a ga na-emere Jehova n’oge dị iche iche,+ bụ́ ndị unu ga-ama ọkwa ka e mee,+ bụcha mgbakọ dị nsọ. Ha bụ ememme ndị a ga na-emere m n’oge dị iche iche:

3 “‘Unu nwere ike ịrụ ọrụ ụbọchị isii, ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike nke a ga-ezu naanị ike na ya.+ Ọ bụ ụbọchị mgbakọ dị nsọ. Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla. Ọ bụ ụbọchị izu ike unu ga-edebere Jehova n’ebe ọ bụla unu bi.+

4 “‘Ihe ndị a bụ ememme ndị a ga na-emere Jehova n’oge dị iche iche, ya bụ, mgbakọ dị nsọ ndị unu ga-ama ọkwa ka e mee n’oge e ji eme ha: 5 N’abalị iri na anọ n’ọnwa mbụ,+ unu ga-emere Jehova Ememme Ngabiga ná mgbede.*+

6 “‘Ọ bụ n’abalị iri na ise n’ọnwa a ka Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko unu ga-emere Jehova ga-amalite.+ Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa.+ 7 N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike. 8 Ma unu ga-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ ruo ụbọchị asaa. Unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ n’ụbọchị nke asaa. Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike.’”

9 Jehova gwakwara Mosis, sị: 10 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu ga-emecha bata n’ala m ga-enye unu ma wee ihe ubi ya, unu ga-ebutere onye nchụàjà otu ùkwù ọka bali si ná mkpụrụ mbụ unu+ wetara n’ubi unu.+ 11 Onye nchụàjà ga-efegharị ùkwù ọka bali ahụ n’ihu Jehova ka o wee nabata unu. Ọ bụ n’ụbọchị na-esote Ụbọchị Izu Ike ka ọ ga-efegharị ya. 12 N’ụbọchị e fegharịrị ùkwù ọka bali ahụ, unu ga-achụ ebule ahụ́ dị mma, nke na-agafebeghị otu afọ, n’àjà. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova. 13 A ga-eji ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, chụọ àjà ọka ya. Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma* a na-esuru Jehova ọkụ. A ga-eji otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin* mmanya chụọ àjà mmanya ya. 14 Unu erila achịcha ọ bụla ma ọ bụ ọka bali e ghere eghe* ma ọ bụ ọka bali ọhụrụ ruo n’ụbọchị a, ruo mgbe unu wetaara Chineke unu onyinye. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe n’ebe ọ bụla unu bi.

15 “‘Malite n’ụbọchị na-esote Ụbọchị Izu Ike ahụ, ya bụ, malite n’ụbọchị unu wetara ùkwù ọka bali a ga-eji chụọ àjà a na-efegharị efegharị, unu ga-agụ ụbọchị izu ike asaa.+ Ụbọchị izu ike ndị ahụ ga-ezu ezu. 16 Unu ga-agụ ụbọchị iri ise+ gụruo n’ụbọchị na-esote Ụbọchị Izu Ike nke asaa, unu ewetaziere Jehova àjà ọka ọhụrụ.+ 17 Unu ga-esi n’ebe unu bi weta ogbe achịcha abụọ ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị. A ga-eji ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma mee ha. A ga-etinye ha ihe na-eko achịcha,+ ka ha bụrụ mkpụrụ mbụ kara aka a na-enye Jehova.+ 18 Ihe ndị unu ga-eweta ha na ogbe achịcha ndị ahụ bụ ebule asaa ahụ́ dị mma, ndị gbara otu afọ otu afọ, nakwa otu ehi na ebule abụọ.+ Ha ga-abụ àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova, ha na àjà ọka ha na àjà mmanya ha. Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma* a na-esuru Jehova ọkụ. 19 Unu ga-ejikwa nwa ewu chụọ àjà mmehie,+ jirikwa ụmụ ebule abụọ gbara otu afọ otu afọ chụọ àjà udo.+ 20 Onye nchụàjà ga-efegharị ebule abụọ ahụ, ha na ogbe achịcha ndị ahụ e ji ọka wit mbụ kara aka mee, ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova. Ha ga-abụrụ Jehova ihe dị nsọ nke ga-abụ nke onye nchụàjà.+ 21 N’ụbọchị ahụ, unu ga-ama ọkwa+ ka unu nwee mgbakọ dị nsọ. Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe n’ebe ọ bụla unu bi.

22 “‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi n’ala unu, unu ewerechala ihe niile dị n’ọnụ ọnụ ubi unu. Unu atụtụkwala ihe fọrọ n’ihe ubi unu.+ Unu ga-ahapụ ha maka ndị ogbenye+ na ndị mbịarambịa.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”

23 Jehova gwakwara Mosis, sị: 24 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘N’abalị mbụ n’ọnwa nke asaa, unu ga-ezu naanị ike. A ga-afụ opi+ n’ụbọchị ahụ ka e chetara unu na a ga-enwe mgbakọ dị nsọ. 25 Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike. Unu ga-achụkwara Jehova àjà a na-esu ọkụ.’”

26 Jehova gwakwuru Mosis, sị: 27 “Ma, ụbọchị nke iri n’ọnwa nke asaa ahụ ga-abụ Ụbọchị Ikpuchi Mmehie.+ Unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu ga-emekpa onwe* unu ahụ́,*+ chụọkwara Jehova àjà a na-esu ọkụ. 28 Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla n’ụbọchị a n’ihi na ọ bụ ụbọchị ikpuchi mmehie nke a ga-eji na-ekpuchiri unu mmehie+ unu n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu. 29 Onye* ọ bụla na-emekpaghị onwe ya ahụ́* n’ụbọchị ahụ, a ga-egbu ya.*+ 30 M ga-ebibi onye* ọ bụla rụrụ ụdị ọrụ ọ bụla n’ụbọchị ahụ. 31 Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe n’ebe ọ bụla unu bi. 32 Ọ bụ ụbọchị izu ike nke unu ga-ezu naanị ike na ya. Unu ga-emekpakwa onwe* unu ahụ́+ ná mgbede ụbọchị nke itoolu n’ọnwa ahụ. Unu ga-edebe ụbọchị izu ike unu malite ná mgbede ruo ná mgbede.”

33 Jehova gwakwara Mosis, sị: 34 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘N’abalị iri na ise n’ọnwa asaa ahụ, unu ga-amalite Ememme Ụlọ Ndò a na-emere Jehova. Unu ga-eme ya ruo ụbọchị asaa.+ 35 Unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ n’ụbọchị nke mbụ. Unu agaghịkwa arụ ọrụ ọ bụla siri ike. 36 Unu ga-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ ruo ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asatọ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu ga-achụkwara Jehova àjà a na-esu ọkụ. Ọ bụ nzukọ pụrụ iche. Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike.

37 “‘Ihe ndị a bụ ememme+ ndị a ga na-emere Jehova, ndị unu ga-ama ọkwa ka e mee ka ha bụrụ mgbakọ dị nsọ.+ Ha ga-abụ oge a ga na-achụrụ Jehova àjà a na-esuru ya ọkụ, ya bụ, àjà a na-esu ọkụ+ na àjà ọka+ na àjà mmanya.+ A ga na-achụ àjà ndị a otú e kwuru ka a na-achụ ha n’ụbọchị nke ọ bụla. 38 Unu ga na-achụ àjà ndị a, na-achụkwa ndị nke a na-achụ n’ụbọchị izu ike niile nke Jehova,+ ha na onyinye ndị unu wetara,+ onyinye ndị unu kwere ná nkwa,+ nakwa onyinye ndị si unu n’obi,+ bụ́ ndị unu ga-enye Jehova. 39 Ma n’abalị iri na ise n’ọnwa nke asaa, mgbe unu chịkọtachara ihe ala unu mepụtara, unu ga-eme ememme Jehova ruo ụbọchị asaa.+ Unu ga-ezu naanị ike n’ụbọchị nke mbụ. Unu ga-ezukwa naanị ike n’ụbọchị nke asatọ.+ 40 N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-ewere mkpụrụ nke osisi ndị mara mma, igu nkwụ,+ alaka osisi ndị nwere akwụkwọ na alaka osisi pọpla ndị dị na ndagwurugwu. Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ+ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu ruo ụbọchị asaa.+ 41 Unu ga-eme ya ụbọchị asaa n’afọ ka ọ bụrụ ememme a na-emere Jehova.+ Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe. Unu ga na-eme ya n’ọnwa nke asaa. 42 Unu ga-ebi n’ụlọ ndò ụbọchị asaa.+ Ndị niile bụ́ ụmụ afọ Izrel ga-ebi n’ụlọ ndò, 43 ka ọgbọ unu ndị ga-esote unu wee mara+ na ọ bụ n’ụlọ ndò ka m mere ka ndị Izrel biri mgbe m na-akpọpụta ha n’Ijipt.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”

44 Mosis wee gwa ndị Izrel banyere ememme ndị a ga na-emere Jehova n’oge dị iche iche.

24 Jehova wee gwa Mosis, sị: 2 “Nye ndị Izrel iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv a na-agwaghị agwa a ga-eji na-amụ ọkụ, ka ọkụ* ndị ahụ* wee na-enwu mgbe niile.+ 3 Erọn ga-ahụ na ọkụ ndị ahụ na-enwu, ya bụ, ọkụ ndị dị n’ihu ebe ahụ e ji ákwà mgbochi gechie igbe ọgbụgba ndụ* ahụ dị n’ụlọikwuu nzute. Ọkụ* ndị ahụ ga na-enwu malite ná mgbede ruo n’ụtụtụ n’ihu Jehova. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe. 4 Ọ ga-edozi ọkụ* ndị ahụ n’ihe ahụ e ji adọsa ọkụ*+ e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ, ka ha dịrị n’ihu Jehova mgbe niile.

5 “Ị ga-eji ntụ ọka e gwere nke ọma mee achịcha iri na abụọ dị okirikiri. A ga-eji ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka mee nke ọ bụla n’ime ha. 6 Ị ga-edosa ha n’ihu Jehova n’elu tebụl ahụ e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ.+ Ha ga-adị ahịrị abụọ. Achịcha isii ga-adị n’otu ahịrị, isii adịrị n’ahịrị nke ọzọ.+ 7 Ị ga-atụkwasị frankinsens a na-agwaghị agwa n’elu ahịrị nke ọ bụla. Ị ga-esu ya ọkụ ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ a chụụrụ Jehova nke nọchiri anya achịcha ahụ.+ 8 Kwa Ụbọchị Izu Ike, ọ ga-edo achịcha ahụ n’usoro mgbe niile n’ihu Jehova.+ Ọ bụ ọgbụgba ndụ ga-adịte aka mụ na ndị Izrel na-agba. 9 Achịcha ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị nwoke.+ Ha ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya+ n’ihi na ọ bụụrụ onye nchụàjà ihe kacha nsọ nke si n’àjà a na-esu ọkụ a chụụrụ Jehova. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide.”

10 E nwere otu nwoke nne ya bụ onye Izrel ma nna ya bụ onye Ijipt.+ Nwoke ahụ na nwoke Izrel ọzọ malitere ịlụ ọgụ n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu. 11 Nwoke ahụ nne ya bụ onye Izrel malitere ikwutọ aha Chineke* ma kpọọ Chineke iyi.+ E wee kpọgara ya Mosis.+ Aha nne ya bụ Shelomit, nwa Dibraị, onye si n’ebo Dan. 12 Ha jichiri nwoke ahụ ruo mgbe a ga-eme ka ha mata ihe Jehova chọrọ ka ha mee.+

13 Jehova wee gwa Mosis, sị: 14 “Si n’ebe unu mara ụlọikwuu kpọpụ onye ahụ kwutọrọ aha m. Ndị niile nụrụ mgbe o kwutọrọ aha m ga-ebikwasị ya aka n’isi. Nzukọ ahụ niile ga-atụkwa ya nkume.+ 15 Ị ga-agwakwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla akpọọ Chineke ya iyi, ọ ga-aza ajụjụ maka mmehie ya. 16 N’ihi ya, a ga-egburịrị onye kwutọrọ aha Jehova.+ Nzukọ ahụ niile ga-atụrịrị ya nkume. A ga-egbu onye ọ bụla kwutọrọ aha Chineke, ma ọ̀ bụ onye mbịarambịa ma ọ̀ bụ nwa afọ.

17 “‘Ọ bụrụ na mmadụ egbuo mmadụ,* a ga-egburịrị ya.+ 18 Onye ọ bụla kụgburu anụ ụlọ* ga-akwụ ụgwọ ya. Ndụ ga-alara ndụ.* 19 Ọ bụrụ na mmadụ emerụọ mmadụ ibe ya ahụ́, a ga-eme ya ihe o mere onye ahụ.+ 20 Onye gbajiri mmadụ ọkpụkpụ, a ga-agbaji ya ọkpụkpụ. Onye kụkpọrọ mmadụ anya, a ga-akụkpọ ya anya. Onye kụpụrụ mmadụ ezé, a ga-akụpụ ya ezé. Ụdị ihe ọ bụla o mere onye ahụ ka a ga-eme ya.+ 21 Onye kụgburu anụmanụ ga-akwụ ụgwọ ya.+ Ma a ga-egbu onye kụgburu mmadụ.+

22 “‘Otu iwu ga na-achị unu, ma onye mbịarambịa ma nwa afọ,+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”

23 Mosis gwaziri ndị Izrel okwu, ha wee si n’ebe ha mara ụlọikwuu kpọpụ onye ahụ kwutọrọ aha Chineke ma tụọ ya nkume.+ Ndị Izrel wee mee nnọọ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

25 Jehova wee gwa Mosis okwu ọzọ n’Ugwu Saịnaị, sị: 2 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu ga-emecha bata n’ala m ga-enye unu,+ unu ga-edebere Jehova ụbọchị izu ike ma hapụ ala ahụ ka o zuo ike.+ 3 Afọ isii ka unu ga-agha mkpụrụ n’ubi unu. Afọ isii ka unu ga-akwachakwa ubi vaịn unu. Unu ga-aghọrọkwa mkpụrụ ala unu mepụtara.+ 4 Ma n’afọ nke asaa, unu ga-ahapụ ya ka o zuo ezigbo ike. Ọ bụ afọ izu ike a ga-edebere Jehova. Unu agaghị agha mkpụrụ n’ubi unu ma ọ bụ kwachaa ubi vaịn unu. 5 Unu werechaa ihe ubi unu mepụtara, unu aghọrọla ọka* nke mkpụrụ a hapụrụ n’ubi mịrị. Unu aghọrọkwala mkpụrụ si n’osisi vaịn ndị unu na-akwachaghị akwacha. Unu ga-ahapụ ala ahụ ka o zuo ezigbo ike otu afọ. 6 Ma unu nwere ike iri nri ala ahụ mepụtara n’oge ahụ unu hapụrụ ya ka o zuo ike. Gị na ohu gị nwoke na ohu gị nwaanyị na onye ọrụ i goro ego na ndị ọbịa gị na ha bi nwere ike iri ya. 7 Anụ ụlọ gị na anụ ọhịa ndị bi n’ala gị nwekwara ike iri ya. E nwere ike iri ihe niile ala ahụ mepụtara eri.

8 “‘Unu ga-agụ afọ izu ike asaa, ya bụ, afọ asaa ụzọ asaa. Afọ izu ike asaa ga-abụ afọ iri anọ na itoolu. 9 N’abalị iri n’ọnwa nke asaa, unu ga-afụ opi ka ọ dasie ụda ike. Unu ga-afụ opi ahụ ka a nụ ya n’ala unu niile n’Ụbọchị Ikpuchi Mmehie.+ 10 Unu ga-edo afọ nke iri ise nsọ ma maa ọkwa ka ndị niile bi n’ala unu nwere onwe ha.+ Ọ ga-abụrụ unu afọ Nnwere Onwe.* Onye ọ bụla n’ime unu ga-alaghachi n’ala o ketara. Onye ọ bụla n’ime unu ga-alaghachikwuru ezinụlọ ya.+ 11 Afọ nke iri ise ga-abụrụ unu afọ Nnwere Onwe. Unu agaghị agha mkpụrụ ma ọ bụ ghọrọ ọka wit mkpụrụ a hapụrụ n’ubi mịrị. Unu agaghịkwa aghọrọ mkpụrụ si n’osisi vaịn ndị unu na-akwachaghị akwacha.+ 12 N’ihi na ọ bụ afọ Nnwere Onwe. Ọ ga-abụrụ unu afọ dị nsọ. Ọ bụ naanị ihe ala ahụ mepụtara n’onwe ya ka unu nwere ike iri.+

13 “‘N’afọ Nnwere Onwe, onye ọ bụla n’ime unu ga-alaghachi n’ala o ketara.+ 14 Unu resịwa mmadụ ibe unu ihe ọ bụla ma ọ bụ zụwa ya ihe, unu erigbula ibe unu.+ 15 Unu zụwa ala n’aka mmadụ ibe unu, unu ga-agbakọ afọ ole gaferela kemgbe afọ Nnwere Onwe gachara. Onye ahụ ga-agbakọkwa afọ ole fọrọ ị ga-eji wee ihe n’ubi ahụ ka ọ mata ego ole ọ ga-ana gị.+ 16 Ọ bụrụ na ọtụtụ afọ ka fọrọ, o nwere ike iweli ọnụ ahịa ya. Ma, ọ bụrụ afọ ole na ole fọrọ, ọ ga-ewetu ọnụ ahịa ya n’ihi na ihe ọ na-eresị gị bụ ihe ndị ubi ahụ ga-emepụtara gị. 17 Onye ọ bụla n’ime unu erigbula ibe ya.+ Tụọnụ egwu Chineke unu+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.+ 18 Ọ bụrụ na unu na-edebe iwu m ma na-eme ihe m kpebiri, unu ga-ebi n’ala ahụ, obi eruo unu ala.+ 19 Ala ahụ ga na-amị mkpụrụ.+ Unu ga-eriju afọ ma biri na ya, obi eruokwa unu ala.+

20 “‘Ma ọ bụrụ na unu asị: “Gịnị ka anyị ga-eri n’afọ nke asaa ma ọ bụrụ na anyị agaghị agha mkpụrụ ma ọ bụ wee ihe ubi?”+ 21 M ga-awụsa unu ngọzi m n’afọ nke isii. Ala unu ga-amịkwa mkpụrụ ga-ezuru unu afọ atọ.+ 22 Unu ga-aghazi mkpụrụ n’afọ nke asatọ, ma unu ga na-eri ihe ochie unu wetara n’ubi ruo n’afọ nke itoolu. Unu ga na-eri nke ochie ruo mgbe mkpụrụ unu kụrụ mịrị.

23 “‘A gaghị ere ala ka ọ bụrụzie nke onye unu resịrị ya ebighị ebi,+ n’ihi na ọ bụ m nwe ala.+ N’ihi na n’anya m, unu bụ ndị mbịarambịa na ndị ọbịa.+ 24 N’ala niile unu ketara, onye rere ala nwere ikike ịzụrụghachi ala ya.

25 “‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye wee ree ụfọdụ n’ime ala ya, ezigbo onye ikwu ya ga-abịa zụrụghachi ala ahụ nwanne ya rere.+ 26 Ọ bụrụ na mmadụ enweghị onye ga-agbara ihe o rere, ma ya abaa ọgaranya wee nweta ego ọ ga-eji gbara ya, 27 ọ ga-agbakọ ego afọ ole garala kemgbe o rere ala ahụ, wepụ ya n’ego ole o rere ala ahụ, nyeghachizie onye o resịrị ala ahụ ego ole fọrọnụ. Ọ ga-ewereghachi ala ya.+

28 “‘Ma ọ bụrụ na o nwetaghị ego ọ ga-eji zụrụghachi ya n’aka onye o resịrị ya, ihe ahụ o rere ga-adị n’aka onye zụrụ ya ruo n’afọ Nnwere Onwe.+ Ala ahụ ga-abụghachi nke ya n’afọ Nnwere Onwe, ya ewerezie ya.+

29 “‘Ọ bụrụ na mmadụ eree ụlọ dị n’obodo nwere mgbidi, ọ ga-enwe ikike ịgbara ya malite mgbe o rere ya ruo mgbe otu afọ gwụrụ. Ọ ga-enwe ikike a+ ruo otu afọ zuru ezu. 30 Ma ọ bụrụ na a zụrụghachighị ụlọ ahụ dị n’obodo nwere mgbidi mgbe otu afọ zuru, ọ ga-abụzi nke onye zụrụ ya n’ọgbọ ya niile. N’afọ Nnwere Onwe, a gaghị enyeghachi ya onye nwebu ya. 31 Ma, a ga-ewere ụlọ ọ bụla dị n’obodo nta na-enweghị mgbidi otú e si were ala ubi dị n’ime ime obodo. A ka ga-enwe ikike ịgbara ya. N’afọ Nnwere Onwe, a ga-enyeghachi ya onye nwebu ya.

32 “‘Ma ndị Livaị nwere ikike ịgbara ụlọ ndị dị n’obodo ha+ mgbe ọ bụla. 33 Ọ bụrụ na a zụrụghachighị ụlọ ndị Livaị e rere ere, bụ́ nke dị n’obodo ndị Livaị, a ga-enyeghachi onye nwebu ụlọ ahụ ụlọ ya n’afọ Nnwere Onwe,+ n’ihi na ọ bụ ndị Livaị ketara ụlọ ndị dị n’obodo ha n’Izrel.+ 34 A gaghịkwa ere ala ndị gbara obodo ha gburugburu, bụ́ ala ebe anụmanụ na-ata ahịhịa,+ n’ihi na ọ bụ nke ha mgbe niile.

35 “‘Ọ bụrụ na nwanne gị nke bi gị nso adaa ogbenye, ya abụrụ na o nweghị ike igboro onwe ya mkpa,+ ị ga na-enye ya ihe na-akpa ya otú ị ga-emere onye mbịarambịa na onye ọbịa,+ ka nwanne gị soro gị dịrị ndụ. 36 Anala ya ọmụrụ nwa ma ọ bụ jiri ya kpaa ego.+ Tụọ egwu Chineke gị.+ Nwanne gị ga-esokwa gị dịrị ndụ. 37 Anala ya ọmụrụ nwa ma i binye ya ego.+ Enyekwala ya nri ka i nweta uru. 38 Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt+ ka m nye unu ala Kenan, ka m wee gosi na m bụ Chineke unu.+

39 “‘Ọ bụrụ na nwanne gị nke bi gị nso adaa ogbenye wee resị gị onwe ya,+ amanyela ya ka ọ rụwara gị ọrụ ka ohu nkịtị.+ 40 Ị ga-ewere ya ka onye ọrụ e goro ego+ ma ọ bụ ọbịa. Ọ ga na-ejere gị ozi ruo n’afọ Nnwere Onwe. 41 Ọ ga-ahapụzi gị laghachikwuru ezinụlọ ya, ya na ụmụ ya. Ọ ga-alaghachi n’ala nna nna ya hà ketara.+ 42 N’ihi na ha bụ ndị ohu m, ndị m kpọpụtara n’Ijipt.+ Ha agaghị ere onwe ha ka ha bụrụ ndị ohu nkịtị. 43 Emegbula ya.+ Tụọ egwu Chineke gị.+ 44 I nwere ike isi ná mba ndị gbara unu gburugburu nweta ohu nwoke na ohu nwaanyị. Ọ bụ ná mba ndị ahụ ka i nwere ike isi zụrụ ohu nwoke ma ọ bụ ohu nwaanyị. 45 Unu nwekwara ike isi n’ụmụ ndị mbịarambịa binyeere unu+ nakwa ná ndị ezinụlọ ha, bụ́ ndị a mụụrụ ha n’ala unu, zụrụ ndị ohu. Ha ga-abụkwa nke unu. 46 Unu nwere ike inyefe ha ụmụ unu ndị ga-anọchi unu ka ha bụrụ ndị ohu ụmụ unu. Unu nwere ike iji ha mere ndị ọrụ, ma unu emegbula ndị Izrel bụ́ ụmụnne unu.+

47 “‘Ma ọ bụrụ na onye mbịarambịa ma ọ bụ onye ọbịa binyeere unu abaa ọgaranya, ma nwanne gị bi ya nso adaa ogbenye, o wee resị onye mbịarambịa ma ọ bụ onye ọbịa binyeere unu onwe ya ma ọ bụ resị otu onye n’ezinụlọ onye mbịarambịa onwe ya, 48 ọ ka nwere ikike ịgbara onwe ya mgbe o rechara onwe ya. Otu n’ime ụmụnne ya ndị nwoke nwere ike ịgbara ya.+ 49 Nwanne nna ya ma ọ bụ nwa nwanne nna ya nwere ike ịgbara ya. Onye ikwu ya ọ bụla* si n’ezinụlọ ya nwere ike ịgbara ya.

“‘Ma ọ bụ, ọ bụrụ na onye ahụ rere onwe ya abaa ọgaranya, o nwekwara ike ịgbara onwe ya.+ 50 Ya na onye zụrụ ya ga-agbakọ oge ọ nọrọla malite n’afọ o resịrị ya onwe ya ruo n’afọ Nnwere Onwe.+ Ego ole o rere onwe ya na ego afọ ole ọ rụrụ ọrụ ga-aha.+ A ga-agbakọ ego ụbọchị ndị ọ rụrụ ọrụ otú e si agbakọ nke onye ọrụ e goro ego.+ 51 Ọ bụrụ na afọ ole fọrọ tupu afọ Nnwere Onwe ka dị ọtụtụ, ọ ga-akwụ ya ụgwọ afọ ole fọrọnụ ka o wee gbara onwe ya. 52 Ma ọ bụrụ naanị afọ ole na ole fọrọ tupu afọ Nnwere Onwe, ọ ga-agbakọ ya ma kwụọ ụgwọ afọ ole fọrọnụ ka o wee gbara onwe ya. 53 N’oge niile ọ na-ejere nna ya ukwu ozi, ọ ga na-arụ ọrụ ka onye ọrụ e goro ego. Unu ga-ahụ na e megbughị ya.+ 54 Ma, ọ bụrụ na ọ gaghị agbarali onwe ya otú e kwuru, ọ ga-enwere onwe ya n’afọ Nnwere Onwe,+ ya na ụmụ ya.

55 “‘N’ihi na ndị Izrel bụ ndị ohu m. Ha bụ ndị ohu m, ndị m kpọpụtara n’Ijipt.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.

26 “‘Unu emerela onwe unu chi na-abaghị uru.+ Unu edosarala onwe unu arụsị a pịrị apị+ ma ọ bụ ogidi arụsị, unu edosakwala nkume a tụrụ ihe na ya+ n’ala unu ka unu na-akpọ isiala n’ihu ya;+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu. 2 Unu ga na-edebe ụbọchị izu ike m, na-akwanyekwara ebe a na-anọ efe m ùgwù.* Abụ m Jehova.

3 “‘Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe m kwuru, na-edebe ihe m nyere n’iwu ma na-eso ha,+ 4 m ga-eme ka mmiri na-ezoro unu n’oge kwesịrị ekwesị.+ Ala ga na-amị mkpụrụ ya.+ Osisi ndị dị n’ubi ga na-amịkwa mkpụrụ ha. 5 Unu ga-azọchagide mkpụrụ ruo n’oge unu ga-aghọwa mkpụrụ vaịn. Unu ga-aghọgidekwa mkpụrụ vaịn ruo n’oge unu ga-aghawa mkpụrụ. Unu ga na-eri nri unu rijuo afọ. Unu ga-ebikwa n’ala unu, obi eruo unu ala.+ 6 M ga-eme ka udo dịrị n’ala unu.+ E nweghị onye ga-eme ka unu tụọ egwu mgbe unu na-ehi ụra.+ M ga-eme ka a ghara inwe ajọ anụ ọhịa ọ bụla n’ala unu. E nweghịkwa onye ga-alụso unu agha* n’ala unu. 7 Unu ga-achụ ndị iro unu ọsọ, unu ga-ejikwa mma agha merie ha. 8 Mmadụ ise n’ime unu ga-achụ otu narị (100) mmadụ ọsọ, otu narị (100) mmadụ n’ime unu ga-achụ puku mmadụ iri (10,000) ọsọ. Unu ga-ejikwa mma agha merie ndị iro unu.+

9 “‘M ga-agọzi unu ma mee ka unu mụọ ọmụmụ, meekwa ka unu mụbaa.+ Agaghị m emebi ọgbụgba ndụ mụ na unu.+ 10 Mgbe unu ka na-eri ihe unu wetara n’ubi n’afọ gara aga, unu ga-achọwa otú unu ga-esi wepụsịa ihe ochie unu wetara n’ubi ka unu wee hụ ebe unu ga-edowe ndị nke ọhụrụ. 11 M ga-eme ka ụlọikwuu m dịrị n’etiti unu,+ agaghịkwa m* ajụ unu. 12 M ga-anọnyere unu ma bụrụ Chineke unu,+ unu ga-abụkwa ndị m.+ 13 Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt, ka unu kwụsị ịgbara ndị Ijipt ohu. M gbajikwara osisi yok unu bu ma mee ka unu ghara ihuru ehuru na-aga ije.

14 “‘Ma ọ bụrụ na unu agaghị ege m ntị ma ọ bụ ghara idebe iwu ndị a niile,+ 15 ọ bụrụkwa na unu ajụ ime ihe m kwuru,+ unu* ewee kpọọ ihe m kpebiri ka unu na-eme asị ma ghara ime ihe niile m nyere n’iwu, unu emebiekwa ọgbụgba ndụ m,+ 16 m ga-eme unu ihe ndị a: m ga-ata unu ahụhụ, mee ka unu rịa ụkwara nta na oké ahụ́ ọkụ, bụ́ ndị ga-eme ka unu ghara ịna-ahụ ụzọ nakwa ka ike gwụ unu.* Unu ga-agha mkpụrụ n’efu n’ihi na ọ bụ ndị iro unu ga-eri ya.+ 17 M ga-ajụ unu, ndị iro unu ga-emerikwa unu.+ Ndị kpọrọ unu asị ga-emegbu unu.+ Unu ga-agbakwa ọsọ mgbe a na-enweghị onye na-achụ unu.+

18 “‘Ọ bụrụ na ihe a emeghị ka unu gee m ntị, m ga-ata unu ahụhụ maka mmehie unu okpukpu asaa karịa otú m taburu unu. 19 M ga-ata unu ahụhụ ka unu kwụsị ime isi ike, kwụsịkwa ịdị mpako. M ga-emekwa ka eluigwe unu dị ka ígwè,*+ meekwa ka ala unu dị ka ọla kọpa.* 20 Unu ga-emefusị ike unu na nkịtị n’ihi na ala unu agaghị emepụta ihe,+ osisi ndị dị n’ala agaghịkwa amị mkpụrụ.

21 “‘Ma ọ bụrụ na unu ka na-enupụrụ m isi ma jụ ige m ntị, m ga-atakwu unu ahụhụ okpukpu asaa maka mmehie unu karịa otú m taburu unu. 22 M ga-eme ka anụ ọhịa bata n’ala unu.+ Ha ga-agbawa unu aka ụmụ+ ma gbuchapụ anụ ụlọ unu. Ha ga-emekwa ka unu fọ ole na ole, ụzọ unu ga-atọgbọkwa chakoo.+

23 “‘Ma ọ bụrụ na n’agbanyeghị ihe ndị a, unu anabataghị aka ná ntị m dọrọ unu,+ unu akpọchie ntị na-enupụrụ m isi, 24 m ga-emesi unu ike. M ga-ata unu ahụhụ okpukpu asaa maka mmehie unu. 25 M ga-eme ka ndị iro unu jiri mma agha lụso unu agha ka ha taa unu ahụhụ maka na unu mebiri ọgbụgba ndụ mụ na unu.+ Ọ bụrụ na unu agbaga n’obodo unu dị iche iche, m ga-eme ka unu rịa ọrịa,+ m ga-emekwa ka ndị iro unu merie unu.+ 26 Mgbe m ga-emebi ebe unu na-edosa* achịcha,*+ ihe ga-afọ ga-adị obere nke na ụmụ nwaanyị iri ga-eji naanị otu ekwú na-emere unu achịcha. Ha ga na-atụ achịcha ha na-enye unu atụ̀.+ Unu ga-eri ihe, ma afọ agaghị eju unu.+

27 “‘Ọ bụrụ na n’agbanyeghị ihe a, unu egeghị m ntị, unu akpọchie ntị na-enupụrụ m isi, 28 m ga-ewesakwu unu iwe.+ M ga-atakwa unu ahụhụ okpukpu asaa maka mmehie unu. 29 N’ihi ya, unu ga-eri anụ ụmụ unu ndị nwoke, unu ga-erikwa anụ ụmụ unu ndị nwaanyị.+ 30 M ga-ebibi ebe ndị dị elu unu na-anọ efe chi ụgha unu,+ gbutusịakwa ihe unu ji adọsa insens* ma tụsachaa ozu unu n’elu arụsị unu na-adịghị ndụ bụ́ ndị na-asọ oyi.*+ M ga-agbakụta unu azụ maka na unu na-asọ oyi.+ 31 M ga-eme ka e jiri mma agha bibie obodo unu dị iche iche+ nakwa ebe ndị unu na-anọ efe ofufe. Agaghịkwa m anụrụ ísì si n’àjà na-esi ísì ọma* unu na-achụ. 32 M ga-eme ka ala unu tọgbọrọ chakoo.+ Ndị iro unu bụ́ ndị ga-ebi na ya ga-ekporopụ anya na-ele ya.+ 33 M ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche.+ M ga-emekwa ka ndị iro unu jiri mma agha bịa lụso unu agha.+ A ga-eme ka ala unu tọgbọrọ chakoo,+ bibichaakwa obodo unu dị iche iche.

34 “‘N’oge niile ala unu ga-atọgbọrọ chakoo mgbe unu ga-anọ n’ala ndị iro unu, ala unu ga-akwụ ụgwọ ụbọchị izu ike o ji. N’oge ahụ, ala unu ga-ezu ike,* n’ihi na ọ ga-akwụ ụgwọ ụbọchị izu ike o ji.+ 35 N’ụbọchị niile ọ ga-atọgbọrọ chakoo, ọ ga-ezu ike n’ihi na o zughị ike n’oge o kwesịrị izu ike mgbe unu bi na ya.

36 “‘Ma m ga-eme ka ezigbo ụjọ na-atụ ndị fọrọ n’ime unu,+ bụ́ ndị nọ n’ala ndị iro unu. Mkpọtụ akwụkwọ ifufe na-ebugharị ga-eme ka ha gbaa ọsọ. Ha ga-agba ọsọ ka à ga-asị na e nwere onye ji mma agha achụ ha ọsọ. Ha ga-adakwa n’enweghị onye na-achụ ha.+ 37 Ha ga na-adagide ibe ha ka à ga-asị na e nwere onye ji mma agha achụ ha ọsọ, n’agbanyeghị na e nweghị onye na-achụ ha. Unu agaghị eguzoli n’ihu ndị iro unu.+ 38 Unu ga-anwụ ná mba dị iche iche.+ Ala ndị iro unu ga-atakwa isi unu. 39 A ga-ahapụ ndị fọrọ n’ime unu ka ha rekasịa n’ala ndị iro unu+ n’ihi mmehie unu. N’eziokwu, ha ga-erekasị n’ihi mmehie ndị nna nna ha.+ 40 Ha ga-ekwupụtazi mmehie ha+ na mmehie ndị nna nna ha, kwupụtakwa na ndị nna nna ha bụ ndị a na-ekwesịghị ịtụkwasị obi. Ha ga-ekwetakwa na ha bụ ndị a na-ekwesịghị ịtụkwasị obi nakwa na ha nupụụrụ m isi.+ 41 M ga-ata ha ahụhụ,+ kpọbata ha n’ala ndị iro ha.+

“‘Ikekwe, ha agaghịzi akpọchi obi ha, ha ga-adịkwa umeala n’obi,*+ ha ewee kwụọ ụgwọ mmehie ha. 42 M ga-echeta ọgbụgba ndụ mụ na Jekọb+ na ọgbụgba ndụ mụ na Aịzik+ nakwa ọgbụgba ndụ mụ na Ebreham.+ M ga-echetakwa ala unu 43 maka na mgbe ha na-ebighị n’ala ahụ, ala ahụ nọ na-akwụ ụgwọ ụbọchị izu ike o ji.+ Ọ tọgbọkwa chakoo n’enweghị onye n’ime ha bi na ya. Ha nọkwa na-akwụ ụgwọ mmehie ha n’ihi na ha jụrụ ime ihe m kpebiri. Ha* kpọkwara iwu m asị.+ 44 Ma n’agbanyeghị ihe a niile, mgbe ha nọ n’ala ndị iro ha, agaghị m ajụ ha kpamkpam.+ Agaghịkwa m akpọ ha asị nke na m ga-ekpochapụ ha wee mebie ọgbụgba ndụ mụ na ha,+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke ha. 45 M ga-eji maka ha cheta ọgbụgba ndụ mụ na ndị nna nna ha,+ bụ́ ndị m si n’Ijipt kpọpụta n’ihu mba dị iche iche+ ka m wee gosi na m bụ Chineke ha. Abụ m Jehova.’”

46 Ihe ndị a bụ ntụziaka Jehova na ihe ndị o kpebiri ka ndị Izrel na-eme nakwa iwu ya ndị o si n’aka Mosis nye ndị Izrel n’Ugwu Saịnaị.+

27 Jehova gwakwara Mosis, sị: 2 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Ọ bụrụ na mmadụ ekwe nkwa pụrụ iche+ na ọ ga-enye Jehova ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa mmadụ,* 3 ọnụ ahịa nwoke nọ n’agbata afọ iri abụọ na afọ iri isii ga-abụ shekel* ọlaọcha iri ise ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ya. 4 Ma ọnụ ahịa nwaanyị ga-abụ shekel iri atọ. 5 Ọ bụrụ ndị nọ n’agbata afọ ise na afọ iri abụọ, ọnụ ahịa nwoke ga-abụ shekel iri abụọ, ọnụ ahịa nwaanyị abụrụ shekel iri. 6 Ọ bụrụ ndị nọ n’agbata otu ọnwa na afọ ise, ọnụ ahịa nwoke ga-abụ shekel ọlaọcha ise, ọnụ ahịa nwaanyị abụrụ shekel ọlaọcha atọ.

7 “‘Ọ bụrụ ndị dị afọ iri isii ma ọ bụ karịa, ọnụ ahịa nwoke ga-abụ shekel iri na ise, ọnụ ahịa nwaanyị abụrụ shekel iri. 8 Ma ọ bụrụ na onye kwere nkwa ahụ dara ogbenye nke na ọ gaghị akwụli ọnụ ahịa e kwuru,+ onye ahụ e kwere ná nkwa ga-aga guzoro n’ihu onye nchụàjà. Onye nchụàjà ga-ekwu ego ole a ga-akwụ n’isi ya. Ọ bụ ego ole onye ahụ kwere nkwa ga-akwụli ka onye nchụàjà ga-eji ekpebi ego ole ọ ga-agwa ya kwụọ.+

9 “‘Ọ bụrụ anụmanụ ka e kwere ná nkwa, ya bụ, anụmanụ a ga-ejili chụọrọ Jehova àjà, ihe ọ bụla a ga-enye Jehova ga-abụzi ihe dị nsọ. 10 Ọ gaghị eji ọzọ dochie ya. Ọ gaghịkwa eji nke ahụ́ dị mma gbanwere nke ahụ́ na-adịghị mma ma ọ bụ jiri nke ahụ́ na-adịghị mma gbanwere nke ahụ́ dị mma. Ma ọ bụrụ na o jiri anụmanụ ọzọ gbanwere ya, ma nke ahụ a gbanwere agbanwe ma nke ahụ e ji gbanwere ya ga-abụzi ihe dị nsọ. 11 Ọ bụrụ na ọ bụ anụmanụ na-adịghị ọcha,+ nke a na-agaghị ejili chụọrọ Jehova àjà, ọ ga-akpụta anụ ahụ ma kwụwa ya n’ihu onye nchụàjà. 12 Onye nchụàjà ga-ekwu ego ole a ga-akwụ n’isi ya. Ọ bụ otú anụmanụ ahụ dị ka ọ ga-eji kpebie ya. Ego ole ọ bụla onye nchụàjà kwuru ka ọ ga-abụ. 13 Ma ọ bụrụ na e nwee ka o si chọọ ịzụrụghachi ya, ọ ga-akwụ ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa anụmanụ ahụ, kwụọkwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ego ahụ.+

14 “‘Ọ bụrụ na mmadụ enye Jehova ụlọ ya ka ọ bụrụ ihe dị nsọ, onye nchụàjà ga-ekwu ọnụ ahịa ya. Ọ bụ otú ụlọ ahụ dị ka ọ ga-eji kpebie ya. Ọ bụ ihe onye nchụàjà kwuru ga-abụ ọnụ ahịa ya.+ 15 Ma ọ bụrụ na onye ahụ nyere Chineke ụlọ ya achọọ ịzụrụghachi ya, ọ ga-akwụ ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya, kwụọkwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ahịa ahụ. Ụlọ ahụ ga-abụzi nke ya.

16 “‘Ọ bụrụ na e nwere ebe mmadụ nyere Jehova n’ubi o ketara, ọ bụ mkpụrụ ole a ga-agha na ya ka a ga-eji kpebie ego ole a ga-akwụ maka ya: ọ bụrụ na mkpụrụ a ga-agha na ya bụ ọka bali dị otu homa,* ọ ga-abụ shekel ọlaọcha iri ise. 17 Ọ bụrụ na o nyere ubi ya malite n’afọ Nnwere Onwe,*+ a gaghị agbanwe ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya. 18 Ọ bụrụ na afọ Nnwere Onwe agafeela tupu ya enye Chineke ubi ahụ, onye nchụàjà ga-eji afọ ole fọrọ tupu afọ Nnwere Onwe ọzọ eruo gbakọọrọ ya ego ya, wepụzie ya n’ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya.+ 19 Ma ọ bụrụ na e nwee ka onye nyere ubi ahụ si chọọ ịzụrụghachi ya, ọ ga-akwụ ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya, kwụọkwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ahịa ahụ, ubi ahụ abụrụzie nke ya. 20 Ọ bụrụ na ọ zụrụghachighị ubi ahụ, e wee resị ya onye ọzọ, ọ gaghị azụrụghachi ya ọzọ. 21 Mgbe onye ahụ ga-esepụ aka n’ubi ahụ n’afọ Nnwere Onwe, ọ ga-abụ ihe dị nsọ n’anya Jehova. Ọ ga-abụ ubi e wepụtara iche ka ọ bụrụ nke Chineke. Ọ ga-abụzi nke ndị nchụàjà.+

22 “Ọ bụrụ na mmadụ enye Jehova ubi ọ zụrụ azụ nke na-esoghị n’ala o ketara,+ 23 onye nchụàjà ga-agbakọrọ ya ego ole ga-abụ ọnụ ahịa ya ruo n’afọ Nnwere Onwe. Ọ ga-akwụkwa ego ahụ n’ụbọchị ahụ.+ Ọ bụ ihe dị nsọ n’anya Jehova. 24 N’afọ Nnwere Onwe, onye ọ zụrụ ubi ahụ, ya bụ, onye nwebu ala ahụ, ga-ewereghachi ya.+

25 “‘Ọ bụ shekel dị n’ebe nsọ ka a ga-eji na-ekpebi ọnụ ahịa ọ bụla. Otu shekel kwesịrị ịdị gira* iri abụọ.

26 “‘Ma, e nweghị onye kwesịrị inye Chineke anụmanụ e bu ụzọ mụọ ka ọ bụrụ ihe dị nsọ, n’ihi na anụmanụ ọ bụla e bu ụzọ mụọ bụ nke Jehova.+ Ma ọ̀ bụ ehi ma ọ̀ bụ atụrụ, ọ bụ Jehova nwe ya.+ 27 Ọ bụrụ na anụmanụ e bu ụzọ mụọ bụ anụ na-adịghị ọcha, ya abụrụkwa na onye wetara ya chọrọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya, kwụọkwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ahịa ahụ.+ Ma ọ bụrụ na a zụrụghachighị ya, a ga-ere ya ọnụ ahịa ahụ e kwuru.

28 “‘Ma, ọ bụrụ na mmadụ esi n’ihe ndị o nwere wepụta ihe ọ bụla iche ka ọ bụrụzie nke Jehova, e nweghị ike ire ihe ahụ ere ma ọ bụ zụrụghachi ya, ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ̀ bụ anụmanụ ma ọ̀ bụ ubi. Ihe ọ bụla e wepụtara iche ka ọ bụrụ nke Jehova bụ ihe kacha nsọ n’anya ya.+ 29 E nweghịkwa onye a mara ikpe ọnwụ* a ga-agbara agbara.+ A ga-egburịrị ya.+

30 “‘Otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ọ bụla+ ala mepụtara bụ nke Jehova, ma ọ̀ bụ ihe mkpụrụ a ghara n’ubi mepụtara ma ọ̀ bụ mkpụrụ osisi. Ọ bụ ihe dị nsọ n’anya Jehova. 31 Ọ bụrụ na e nwee ka mmadụ si chọọ ịzụrụghachi nke ọ bụla n’otu ụzọ n’ụzọ iri o wetara, ọ ga-eweta ọnụ ahịa ya, wetakwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ahịa ahụ. 32 Unu ga-enye Jehova otu ụzọ n’ụzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na ìgwè atụrụ unu. Mgbe onye na-azụ atụrụ na-agụ anụmanụ ya ọnụ,* ọ ga-ewepụtara Chineke anụ nke iri. Anụmanụ nke iri ọ bụla dị nsọ. 33 Ọ gaghị eleruwe anụmanụ ahụ anya ka ọ mara ma ahụ́ ọ̀ dị ya mma ma ọ̀ bụ na ahụ́ adịghị ya mma. Ọ gaghịkwa eji ọzọ gbanwere ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwaa anwa chọọ ịgbanwere ya, ma anụ ahụ ma nke o ji agbanwere ya ga-abụzi ihe dị nsọ.+ A gaghị azụrụghachi ha.’”

34 Ihe ndị a bụ iwu Jehova nyere Mosis n’Ugwu Saịnaị+ ka o nye ndị Izrel.

Ma ọ bụ “abụba ndị dị n’akụrụ ya.”

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “abụba ndị dị n’akụrụ ya.”

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “ugbene.”

Ma ọ bụ “ntụ ya na abụba gwakọtara,” ya bụ, abụba si n’àjà ndị a chụrụ.

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “oko ọka wit ma ọ bụ bali na-akpọbeghị akpọ.”

Ma ọ bụ “a ṅara n’ọkụ.”

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Na Hibru, “achịcha,” ya bụ, ihe e kenyere Chineke n’àjà udo ahụ.

Na Hibru, “achịcha,” ya bụ, ihe e kenyere Chineke n’àjà udo ahụ.

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ọ bụ nnukwu onye nchụàjà ka a na-ekwu maka ya.

Ọ bụ nnukwu onye nchụàjà ka a na-ekwu maka ya.

Ma ọ bụ “ntụ ya na abụba gwakọtara,” ya bụ, abụba si n’àjà ndị a chụrụ.

Ọ bụ nnukwu onye nchụàjà ka a na-ekwu maka ya.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Na Hibru, “ya anụkwa ọnụ a bụrụ.” O nwere ike ịbụ ọkwa a mara gbasara ihe ọjọọ mmadụ mere nakwa ọnụ a bụrụ onye mere ihe ọjọọ ahụ ma ọ bụ onye ma gbasara ya ma jụ ịgba akaebe.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ọ ga-abụ na ihe a na-ekwu bụ na o mezughị nkwa o kwere.

Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 2.2. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “e jiri shekel dị nsọ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “uwe ime.”

Ma ọ bụ “ntụ ya na abụba gwakọtara,” ya bụ, abụba si n’àjà ndị a chụrụ.

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “àjà ahụ.”

Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 2.2. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ya gbupụ mkpụrụ obi ahụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ya gbupụ mkpụrụ obi ahụ.”

Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”

Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”

Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”

Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”

Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”

Na Hibru, “jiri mmiri saa ha ahụ́.”

Ma ọ bụ “ájị̀.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “ihe àmà na-egosi na e nyefeela Erọn n’aka Chineke; okpu dị nsọ.”

Ma ọ bụ “abụba ndị dị n’akụrụ ya.”

Ma ọ bụ “ka ísì ya mee ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”

Ma ọ bụ “ebo.”

Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”

Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”

Na Hibru, “iche ọkụ.”

Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”

Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”

Anụmanụ a yiri òké bekee, ma ntị ya na ụkwụ ya na-adị ogologo karịa nke òké bekee.

Ma ọ bụ “ntù.”

Ma ọ bụ “ntù.”

O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “ntù.”

Ma ọ bụ “shekeleke.”

Ma ọ bụ “Ahụhụ.”

O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.

Ma ọ bụ “abụzụ.”

O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.

Ma ọ bụ “ncheke.”

O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.

O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.

O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”

O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.

O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.

Okwu Hibru a sụgharịrị “ekpenta” pụtara ọtụtụ ihe. Ọtụtụ ọrịa na-efe efe nke na-eme mmadụ n’akpụkpọ ahụ́ nwere ike iso na ya. Ọrịa ụfọdụ na-atapara n’ákwà nakwa n’ụlọ nwekwara ike iso na ya.

Ma ọ bụ “ihe ahụ mere ya.”

Ma ọ bụ “nke ugboro abụọ.”

Ma ọ bụ “na ọrịa onye ahụ anaghịzi efe efe.”

Ya bụ, n’ajị na-adị n’agba.

Ya bụ, ajị na-adị n’agba.

Ya bụ, n’ajị na-adị n’agba.

Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 6.6. Gụọ B14.

Lọg bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu lọg bụ lita 0.31. Gụọ B14.

Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 2.2. Gụọ B14.

Na Hibru, “sachapụ ụlọ ahụ mmehie.”

Na Hibru, “sachapụ ụlọ ahụ mmehie.”

Ya bụ, ajị na-adị n’agba.

Na Hibru, “n’ahụ́.”

Ma ọ bụ “Ihe ndina.”

Ma ọ bụ “ihe ndina.”

Na Hibru, “edinaa.”

Ma ọ bụ “ihe ndina.”

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”

Na Hibru, “edinaa.”

Ma ọ bụ “Ihe ndina.”

Ma ọ bụ “Ihe ndina.”

Na Hibru, “dinara.”

Ma ọ bụ “uwe ime.”

Ma ọ bụ “ọtọ.”

Ma ọ bụ “ebo.”

O nwere ike ịbụ na Azazel pụtara “Ewu Na-agbafu Agbafu.”

Ma ọ bụ “ebo.”

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”

Na Hibru, “okwuchi Igbe, nke dị n’elu Ihe Àmà.”

Ma ọ bụ “ebo.”

Ma ọ bụ “nwoke kwụ na-eche eche.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

“Mmadụ imekpa onwe ya ahụ́” pụtara na onye ahụ agaghị emere onwe ya ihe ndị o kwesịrị imere onwe ya. Ibu ọnụ so na ya.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ya bụ, Erọn.

Na Hibru, “Ọ wụfuru ọbara.”

Na Hibru, “A ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Na Hibru, “ịna-achụrụ ewu dị iche iche.”

Na Hibru, “ndị ha na ha kwara iko.”

Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Na Hibru, “m ga-egbupụ ya ná ndị ya.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

N’amaokwu a nakwa n’amaokwu ndị na-esonụ, otú e si dee “inwe mmekọahụ” na Hibru bụ “ikpughe ọtọ.”

Na Hibru, “Ọ bụ ọtọ nna gị.”

Na Hibru, “ha bụ ọtọ gị.”

Na Hibru, “kpughee ọtọ nwanne nna gị.”

Na Hibru, “ọ bụ ọtọ nwanne gị nwoke.”

Ma ọ bụ “omume na-eme ihere.”

O nwekwara ike ịbụ iko mmadụ ka a na-ekwu.

Ma ọ bụ “onye agbata obi gị; enyi gị.”

Ma ọ bụ “chụọrọ Molek àjà.”

Na Hibru, “Gị na nwoke edinala otú nwoke na nwaanyị si edina.”

Na Hibru, “Ala ha ga-agbọpụ ha.”

Na Hibru, “Ala a agaghịkwa agbọpụ unu otú ọ ga-agbọpụ.”

Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ha gbupụ ha.”

Na Hibru, “na-atụ egwu nne ya na nna ya.”

Na Hibru, “A ga-esi ná ndị ya gbupụ mkpụrụ obi ahụ.”

Ma ọ bụ “ihe fọrọ.”

Ma ọ bụ “Abụla onye ntị chiri ọnụ.”

O nwere ike ịbụ, “Akwụrụla na-ele n’anya n’anya mgbe e nwere ihe ga-ata isi mmadụ ibe gị.”

Na Hibru, “ihe a na-ebighị úgwù.”

Ma ọ bụ “majik.”

Ma ọ bụ “akpụlatala.”

Ya bụ, ajị na-adị n’agba.

Ọ ga-abụ na ihe a na-ekwu bụ ịkpụ ya otú ndị na-ekpere arụsị si akpụ nke ha.

Ma ọ bụ “maka mkpụrụ obi.” N’amaokwu a, okwu Hibru bụ́ ne′phesh pụtara onye nwụrụ anwụ.

Na Hibru, “na-atụ egwu ebe a na-anọ efe m.”

Na Hibru, “hin zuru ezu.” Gụọ B14.

Na Hibru, “efa zuru ezu.” Gụọ B14.

Ma ọ bụ “ewere nwa ya ọ bụla chụọrọ Molek àjà.”

Na Hibru, “M ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”

Na Hibru, “M ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “onye kpara àgwà ka ndị akwụna hapụ m.”

Na Hibru, “M ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”

Ma ọ bụ “bụrụ nne ya ma ọ bụ nna ya ọnụ.”

Na Hibru, “dinara.”

Na Hibru, “ekpugheela ọtọ nna ya.”

Na Hibru, “edinaa.”

Na Hibru, “edinaa otú nwoke na nwaanyị si edina.”

Ma ọ bụ “omume na-eme ihere.”

Ihe a gosiri na ọ ga-abụ na ụmụ nwaanyị abụọ ahụ kwadoro omume a rụrụ arụ.

Na Hibru, “O kpughere ọtọ nwanne ya nwaanyị.”

Na Hibru, “A ga-esi ná ndị ha gbupụ ha.”

Na Hibru, “ekpugheela ọtọ nwanne nna ya.”

Na Hibru, “ekpugheela ọtọ nwanne ya nwoke.”

Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.

Ọ bụ anụmanụ ndị dị ka òké, ngwere, na ụmụ ahụhụ ka a na-ekwu.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

O nwere ike ịbụ onye nwụrụ n’ebo ma ọ bụ n’ọnụmara onye nchụàjà. Ọ bụkwa otu ihe ahụ n’amaokwu nke 4, 14, 15.

Ya bụ, ajị na-adị n’agba.

Ma ọ bụ “ihe oriri,” ya bụ, àjà dị iche iche a na-achụ.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi nwụrụ anwụ.” N’amaokwu a, e dekọtara okwu Hibru bụ́ ne′phesh na okwu Hibru ọzọ. Ha abụọ pụtara “onye nwụrụ anwụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “nwoke imi mpịa.”

O nwere ike ịbụ, “onye tara ezigbo ahụ́.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ahụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”

Na Hibru, “Onye mbịarambịa,” ya bụ, nwoke na-esighị n’ezinụlọ Erọn.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “alụọ onye mbịarambịa.”

Na Hibru, “onye mbịarambịa,” ya bụ, nwoke na-esighị n’ezinụlọ Erọn.

Ma ọ bụ “ihe oriri,” ya bụ, àjà dị iche iche a na-achụ.

O nwere ike ịbụ n’agbata oge anyanwụ dara na mgbe chi bidoro iji.

Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 4.4. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Hin bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu hin bụ lita 3.67. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “a ṅara n’ọkụ.”

Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 4.4. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

“Mmadụ imekpa onwe ya ahụ́” pụtara na onye ahụ agaghị emere onwe ya ihe ndị o kwesịrị imere onwe ya. Ibu ọnụ so na ya.

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”

O nwere ike ịbụ, “na-ebughị ọnụ.”

Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ya bụ, ọkụ ndị ahụ dị n’ihe e ji ọlaedo rụọ a na-adọsa ọkụ.

Na Hibru, “Ihe Àmà.”

Ma ọ bụ “Oriọna.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”

Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 4.4. Gụọ B14.

Ya bụ, aha bụ́ Jehova, otú amaokwu nke 15 na 16 gosiri.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi bụ́ mmadụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi bụ́ anụ ụlọ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ga-alara mkpụrụ obi.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Ma ọ bụ “afọ Jubili.”

Ma ọ bụ “onye ikwu ya ọ bụla ya na ya bụ otu ọbara.”

Na Hibru, “na-atụ egwu ebe a na-anọ efe m.”

Na Hibru, “mma agha agaghị agafe.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m agaghịkwa.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”

Ya bụ, mmiri agaghị ezo.

Ya bụ, ala ga-akpọ nkụ.

Na Hibru, “osisi.” O nwere ike ịbụ osisi e ji ekonye achịcha.

Ma ọ bụ “nri.”

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”

Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.

Ma ọ bụ “n’àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”

Ma ọ bụ “ga-edebe ụbọchị izu ike.”

Na Hibru, “obi ha a na-ebighị úgwù ga-adịzi umeala n’obi.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ha.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “e jiri shekel dị nsọ.”

Homa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu homa bụ lita 220. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “n’afọ Jubili.”

Otu gira bụ gram 0.57. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “onye a ga-egbu egbu.”

Otú onye na-azụ atụrụ si agụ anụ ya ọnụ bụ ime ka ha si n’okpuru mkpara ya na-agafe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya