Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Ilu 1:1-31:31
  • Ilu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ilu
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ilu

ILU

1 Ilu dị iche iche Solomọn+ nwa Devid,+ bụ́ eze Izrel,+ tụrụ:

 2 E dere ilu ndị a ka mmadụ si na ha mara ihe,+ ka a dọọkwa ya aka ná ntị;

Ka mmadụ si na ha ghọta okwu e ji amamihe kwuo;

 3 Ka mmadụ wee nabata aka ná ntị a dọrọ ya+ nke ga-eme ka ọ na-aghọta ihe,

Ka o wee bụrụ onye ezi omume,+ onye na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị,*+ na onye na-akwụwa aka ọtọ;

 4 Ka ndị na-amaghị ihe si na ha mara ihe;+

Ka nwa okorobịa si na ha mụta ihe ma na-eche echiche nke ọma.+

 5 Onye ma ihe na-ege ntị ka ọ mụtakwuo ihe.+

Onye na-aghọta ihe na-anabata ezigbo ntụziaka,+

 6 Ka o wee ghọta ilu na okwu na-agbagwoju anya,

Okwu ndị ma ihe kwuru nakwa ilu ha tụrụ.+

 7 Otú mmadụ si egosi na ya amatawala ihe bụ ịtụ egwu Jehova.+

Ndị nzuzu anaghị eji amamihe na ịdọ aka ná ntị akpọrọ ihe.+

 8 Nwa m, nabata aka ná ntị* nna gị na-adọ gị,+

Ahapụkwala ntụziaka* nne gị nyere gị.+

 9 Ha dị ka okpu mara mma e ji okooko kpaa nke ị ga-ekpu n’isi,+

Dịrịkwa ka ọmarịcha ihe olu ị ga-anya n’olu.+

10 Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie agbawa mbọ ka ha rata gị, ekwela.+

11 Ọ bụrụ na ha asị: “Soro anyị.

Ka anyị gaa chechie ndị mmadụ gbuo ha.*

Anyị ga-amakpuru n’ebe zoro ezo, chebiri ndị aka ha dị ọcha.

12 Anyị ga-elo ha otú ili* si elo mmadụ,

Anyị ga-elocha ha otú olulu si elocha ndị na-abanye na ya.

13 Ka anyị kwakọrọ ihe niile bara ezigbo uru ha nwere.

Anyị ga-eji ihe ndị anyị kwatara kwajuo ụlọ anyị.

14 I kwesịrị ịbịa soro anyị.

Anyị niile ga-eke ihe anyị zutere, ihe otu onye ketara ka ibe ya ga-eketa.”

15 Nwa m, esola ha.

Etinyela isi n’ụzọ ha,+

16 N’ihi na ha* na-eji ọsọ aga eme ihe ọjọọ.

Ha na-eme ngwa ngwa aga egbu mmadụ.*+

17 N’eziokwu, ọ bụ n’efu ka mmadụ na-agbasa ụgbụ ọ ga-eji jide nnụnụ ma ọ bụrụ na nnụnụ ahụ na-ahụ ya.

18 Ọ bụ ya mere ha ji aga ezo ka ha gbuo mmadụ.*

Ha na-amakpuru n’ebe zoro ezo ka ha gbuo ndị ọzọ.

19 Ọ bụ ihe ndị a ka ndị na-aghọ aghụghọ ka ha baa ọgaranya na-eme.

Akụ̀ ha na-enweta ga-ata isi ha.+

20 Ezigbo amamihe+ na-eti mkpu n’okporo ámá.+

Ọ na-etisi mkpu ike n’ámá obodo.+

21 Ọ na-anọ n’isi okporo ụzọ ndị na-ekwo ekwo akpọ òkù.

Ọ na-anọ n’ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá obodo, na-asị:+

22 “Unu ndị na-amaghị ihe, olee mgbe unu ga-akwụsị ime iberiibe?

Unu ndị na-akwa ndị mmadụ emo, olee mgbe ịkwa ndị mmadụ emo ga-akwụsị ịtọ unu ụtọ?

Unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe?+

23 Nabatanụ aka ná ntị m na-adọ unu.+

M ga-enyezi unu amamihe.*

M ga-akụziri unu okwu m.+

24 Ebe ọ bụ na m kpọrọ òkù, ma unu ekweghị aza,

M matịrị aka m, ma e nweghị onye mere ihe ọ bụla,+

25 E nweghị ihe unu ji ndụmọdụ niile m na-enye unu kpọrọ,

Unu anabataghịkwa aka ná ntị m na-adọ unu,

26 M ga-achịkwa unu ọchị mgbe ọdachi ga-adakwasị unu.

M ga-akwa unu emo mgbe ihe unu na-atụ ụjọ ya ga-eme,+

27 Mgbe ihe unu na-atụ ụjọ ya ga-abịa ka oké ifufe,

Mgbe ọdachi ga-adakwasị unu ka oké ifufe mmiri,

Mgbe ahụhụ na nsogbu ga-abịara unu.

28 N’oge ahụ, unu* ga na-akpọ m, ma agaghị m aza.

Unu ga na-achọsi m ike, ma unu agaghị achọta m,+

29 N’ihi na e nweghị ihe unu ji ịmụta ihe kpọrọ,+

Unu achọghịkwa ịtụ egwu Jehova.+

30 Unu anabataghị ndụmọdụ m.

E nweghị ihe unu ji aka ná ntị niile m na-adọ unu kpọrọ.

31 N’ihi ya, unu ga-eji isi unu buru ihe unu metara,*+

Atụmatụ* unu ga-etinye unu ná nsogbu.*

32 N’ihi na ihe ga-egbu ndị na-amaghị ihe bụ isi ha na-enupụ,

Ndị nzuzu ga-alakwa n’iyi maka na ha anaghị eji ihe akpọrọ ihe.

33 Ma obi ga-eru onye na-ege m ntị ala,+

Ụjọ ọdachi agaghịkwa atụ ya.”+

2 Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata ihe m na-ekwu

Ma jiri iwu m na-enye gị kpọrọ ihe,+

 2 I wee gee ntị ka ị mara ihe+

Ma meghee obi gị ka ị na-aghọta ihe;+

 3 Ọ bụrụkwa na ị rịọ arịrịọ ka ị ghọta ihe+

Ma rịọsie arịrịọ ike ka ihe wee doo gị anya;+

 4 Ọ bụrụ na ị na-achọ ya otú e si achọ ọlaọcha,+

Na-achọkwa ya otú e si achọ akụ̀ zoro ezo;+

 5 Mgbe ahụ, ị ga-aghọta ihe ịtụ egwu Jehova pụtara,+

Ị ga-amụtakwa banyere Chineke.+

 6 N’ihi na ọ bụ Jehova na-eme ka mmadụ mara ihe.+

Ọ bụ okwu si n’ọnụ ya na-eme ka mmadụ mụta ihe ma ghọta ihe.

 7 Ọ na-eme ka ndị ezi omume nwee ezigbo amamihe.

Ọ bụụrụ ndị kwụsiri ike n’ebe ọ nọ ọta.+

 8 Ọ na-eche ụzọ ndị na-ekpe ikpe ziri ezi nche,

Ọ ga-echekwa ụzọ ndị na-erubere ya isi nche.+

 9 Mgbe ahụ, ị ga-aghọta ihe bụ́ ezi omume na ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ,

Ya bụ, ihe niile dị mma mmadụ kwesịrị ịna-eme.+

10 Mgbe amamihe banyere gị n’obi,+

Ịmụta ihe ana-atọkwa gị* ụtọ,+

11 Ichebara ihe echiche nke ọma ga-eche gị nche,+

Ịghọta ihe ga-echebekwa gị.

12 Ọ ga-echebe gị ka ị ghara ịbanye n’ụzọ ọjọọ,

Ka ị ghara ịdaba n’aka onye na-ekwu ihe rụrụ arụ,+

13 Ka ị ghara ịdaba n’aka ndị na-ahapụ ezigbo ụzọ

Gawa n’ụzọ gbara ọchịchịrị,+

14 Ka ị ghara ịdaba n’aka ndị ime ihe ọjọọ na-atọ ụtọ,

Ndị ịrụ arụrụala na-eme obi ụtọ,

15 Ndị ụzọ ha gbagọrọ agbagọ,

Ndị na-aghọkwa aghụghọ n’ihe niile ha na-eme.

16 Ọ ga-echebe gị ka ị ghara ịdaba n’aka nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ,*

N’aka nwaanyị na-akwa iko* nke na-eji ire ụtọ arata mmadụ,+

17 Bụ́ nwaanyị na-ahapụ enyi ọma* o nwere kemgbe ọ bụ agbọghọ,+

Na-echefukwa ndụ ya na Chineke gbara.

18 N’ihi na ịga n’ụlọ ya dị ka mmadụ ịgakwuru ọnwụ,

Ụzọ ụlọ ya na-edugakwa mmadụ n’ili.+

19 E nweghị onye ọ bụla n’ime ndị ya na ha na-enwe mmekọahụ ga-alọta,

Ha agaghịkwa abịaghachi n’ụzọ na-eduga ná ndụ.+

20 N’ihi ya, soro ụzọ ndị ezigbo mmadụ,

Nọrọkwa n’ụzọ ndị ezi omume.+

21 N’ihi na ọ bụ naanị ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa,

Ọ bụkwa ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta* ga-anọ na ya.+

22 Ma a ga-ekpochapụ ndị ajọ omume n’ụwa,+

A ga-ebibikwa ndị aghụghọ nọ na ya.+

3 Nwa m, echefula ihe m na-akụziri gị,*

Jiri obi gị niile na-edebe iwu dị iche iche m na-enye gị,

 2 N’ihi na ha ga-eme ka ị dịtee ndụ aka,

Meekwa ka obi ruo gị ala.+

 3 Akwụsịla ịhụ ndị ọzọ n’anya,* akwụsịkwala igosi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.*+

Yiri àgwà ndị a n’olu gị ka ihe olu.

Dee ha n’obi gị.+

 4 I mee ya, ihe gị ga na-amasị ma Chineke ma mmadụ,

Ha ga-ewerekwa gị ka onye na-aghọta ihe.+

 5 Jiri obi gị niile tụkwasị Jehova obi,+

Atụkwasịla amamihe gị obi.*+

 6 N’ihe niile ị na-eme, chọpụta ihe bụ́ uche ya,+

Ọ ga-emekwa ka ihe gaziere gị.*+

 7 Amala ihe n’anya onwe gị.+

Tụọ egwu Jehova, hapụkwa ihe ọjọọ.

 8 I mee otú a, ahụ́ ga-adị gị ka à gwọrọ gị ọrịa,

Ime ahụ́* ga-agbasikwa gị ike.

 9 Sọpụrụ Jehova ma nye ya ihe ndị kacha mma i nwere,+

Ha na mkpụrụ mbụ* nke ihe ọ bụla ị kụrụ n’ubi.*+

10 Ihe ga-ejuzi n’ebe ndị ị na-akwasa ihe,+

Olulu ebe mmanya ọhụrụ ị zọchapụtara na-asọba ga-ejukwa n’ọnụ.

11 Nwa m, ajụla aka ná ntị Jehova na-adọ gị,+

Eledakwala mba ọ na-abara gị anya,+

12 N’ihi na ọ bụ ndị Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-abara mba,+

Otú nna si abara nwa ya ọ hụrụ n’anya mba.+

13 Onye nwetara amamihe+

Na onye na-aghọta ihe na-enwe obi ụtọ.

14 Inweta amamihe dị mma karịa inweta ọlaọcha.

Inweta ya* dịkwa mma karịa inweta ọlaedo.+

15 Ọ bara uru karịa nkume kọral.*

E nweghị ihe ọ bụla ọzọ ị chọrọ inweta a ga-eji tụnyere ya.

16 Ogologo ndụ dị n’aka nri ya.

Akụnụba na ùgwù dị n’aka ekpe ya.

17 Ịga n’ụzọ ya na-eme mmadụ obi ụtọ,

Ụzọ ya niile bụkwa ụzọ udo.+

18 Ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka osisi nke ndụ,

A ga-akpọkwa ndị na-ejidesi ya aka ike ndị na-enwe obi ụtọ.+

19 Jehova ji amamihe tọọ ntọala ụwa.+

O ji nghọta mee ka eluigwe kwụsie ike.+

20 O ji amamihe ya kewaa mmiri miri emi,

Na-emekwa ka mmiri si n’ígwé ojii na-ezo obere obere.+

21 Nwa m, elegharala ha* anya.

Jidesie ezigbo amamihe aka ike, na-echebakwara ihe echiche nke ọma.

22 Ha ga-eme ka ị* dị ndụ,

Ha ga-abụkwa ihe ị ga-eji chọọ olu gị mma.

23 Mgbe ahụ, e nweghị ihe ga-eme gị mgbe ị na-aga n’ụzọ,

Ụkwụ gị agaghịkwa akpọ n’ihe ọ bụla.+

24 Ụjọ agaghị atụ gị mgbe i dina ala.+

Ị ga-edina ala hie ụra, ụra ga-atọkwa gị ụtọ.+

25 Ị gaghị atụ ọdachi ọ bụla na-abịa na mberede ụjọ,+

Ị gaghịkwa atụ ụjọ mbibi a ga-ebibi* ndị ajọ omume.+

26 N’ihi na Jehova ga-eme ka obi sie gị ike.+

Ọ ga-eme ka ọnyà ghara ịma gị.*+

27 Ajụla imere ndị i kwesịrị imere ihe ọma ihe ọma+

Ma ọ bụrụ na i nwere ike inyere ha aka.+

28 Asịla onye agbata obi gị: “Lawa; e mechaa, gị abịa. M ga-emere gị ya echi,”

Ma ọ bụrụ na i nwere ike imere ya ihe ahụ ozugbo.

29 Akparala onye agbata obi gị nkata ọjọọ+

Mgbe o chere na gị na ya bi n’udo.

30 Esesala mmadụ okwu+

Ma ọ bụrụ na e nweghị ihe ọjọọ o mere gị.+

31 Enwerela onye tigbuo zọgbuo anyaụfụ,+

Akpakwala àgwà ka ya.

32 N’ihi na Jehova kpọrọ onye aghụghọ asị,+

Ma ya na onye ezi omume na-abụ ezigbo enyi.+

33 Jehova na-abụ ezinụlọ onye ajọ omume ọnụ,+

Ma ọ na-agọzi ezinụlọ onye ezi omume.+

34 Ọ na-akwa ndị na-akwa emo emo,+

Ma ọ na-emere ndị dị umeala n’obi amara.+

35 A ga-akwanyere ndị ma ihe ùgwù,

Ma a ga-akpụ ùgwù ndị nzuzu n’ala.+

4 Ụmụ m, nabatanụ aka ná ntị onye bụ́ nna na-adọ unu.+

Geenụ ntị ka unu ghọta ihe,

 2 N’ihi na m ga-enye unu ezigbo ntụziaka.

Unu ahapụla ihe m na-akụziri* unu.+

 3 Abụụrụ m nna m ezigbo nwa,+

Bụrụkwa onye nne m kacha hụ n’anya.+

 4 Nna m kụziiri m ihe ma sị m: “Ka ihe m na-agwa gị ghara ịpụ gị apụ n’obi.+

Na-edebe iwu m ka i wee dịrị ndụ.+

 5 Nweta amamihe. Gbalịa ka ị na-aghọta ihe.+

Echefula ihe m kwuru, ahapụkwala ya.

 6 Ahapụla amamihe. Ọ ga-azọ gị ndụ.

Jiri ya kpọrọ ihe. Ọ ga-echebe gị.

 7 Nweta amamihe n’ihi na amamihe bụ ihe kacha mkpa.*+

N’ihe niile ị na-enweta, gbalịa ka nghọta soro na ha.+

 8 Jiri amamihe kpọrọ ihe nke ukwuu. Ọ ga-eme ka ị bụrụ onye ukwu.+

A ga na-akwanyere gị ùgwù maka na i ji obi gị niile nabata ya.+

 9 Ọ ga-ekpuwe gị okpu mara mma e ji okooko kpaa.

Ọ ga-ekpuwe gị okpueze mara mma.”

10 Nwa m, gee ntị ma nabata ihe m na-ekwu,

Ị ga-adịtekwa ndụ aka.+

11 M ga-akụziri gị otú ị ga-esi mara ihe.+

M ga na-edu gị ka ị na-aga n’ezigbo ụzọ.+

12 E nweghị ihe ga-anọchiri gị ụzọ mgbe ị na-eje ije.

Ị gaghịkwa ada ada mgbe ị na-agba ọsọ.

13 Nabata aka ná ntị a dọrọ gị. Ajụla ya.+

Jiri ya kpọrọ ihe n’ihi na ọ ga-azọ gị ndụ.+

14 Etinyela isi n’ụzọ ndị ajọ omume,

Agakwala n’ụzọ ndị ọjọọ.+

15 Zere ya. Agala na ya.+

Abanyela na ya. Si ebe ọzọ gafere.+

16 N’ihi na ha enweghị ike ihi ụra ọ gwụla ma hà mere ihe ọjọọ.

Ụra anaghị atụ ha ọ gwụla ma hà kwaturu mmadụ.

17 Ihe ọjọọ na-atọ ha ụtọ ka nri,

Tigbuo zọgbuo na-atọkwa ha ụtọ ka mmanya.

18 Ma ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè na-enwu mgbe chi bọrọ,

Nke na-enwusikwu ike ruo mgbe chi bọchara.+

19 Ụzọ ndị ajọ omume yiri ọchịchịrị.

Ha amaghị ihe na-akwatu ha.

20 Nwa m, ṅaa ntị n’okwu m na-agwa gị.

Gee ntị nke ọma n’ihe m na-ekwu.

21 Echefula ha.

Dowe ha n’ime ime obi gị,+

22 N’ihi na ha na-azọ ndị na-anabata ha ndụ,+

Ha na-emekwa ka ahụ́ dị ha mma.

23 N’ime ihe niile ị na-eche nche, chebe obi gị,+

N’ihi na ọ bụ ya bụ isi ndụ gị.

24 Ekwula okwu na-adịghị mma,+

Ekwukwala ihe ga-eduhie mmadụ.

25 Ka anya gị dịrị n’ebe ị na-aga,

Na-elekwa anya n’ebe ị na-aga.+

26 Mee ka ụzọ ị na-aga dị larịị,*+

Ụkwụ ga-esikwa gị ike n’ala.

27 Abanyela n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.+

Wepụ ụkwụ gị n’ihe ọjọọ.

5 Nwa m, ṅaa ntị n’okwu m ji amamihe na-agwa gị.

Gee ntị nke ọma n’ihe m na-akụziri gị banyere ịghọta ihe,+

 2 Ka i wee kpachapụrụ otú i si eche echiche anya

Ma na-ekwu ihe bụ́ eziokwu mgbe niile.+

 3 N’ihi na okwu* nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ* na-atọ ka mmanụ aṅụ.+

Ọ na-eji okwu ọnụ ya arafu mmadụ.*+

 4 Ma n’ikpeazụ, nwaanyị a na-elu ilu ka ahịhịa ilu,+

Ọ dịkwa nkọ ka mma agha nwere ihu abụọ.+

 5 Ụkwụ ya na-eduga n’ọnwụ.

Nzọụkwụ ya na-eduga mmadụ n’ili.*

 6 Ọ naghị eche echiche banyere ụzọ na-eduga ná ndụ.

Ọ na-agagharị, ma ọ maghị ebe ọ na-aga.

 7 Ụmụ m, geenụ m ntị,

Unu ahapụkwala ihe m na-ekwu.

 8 Agala nwaanyị a nso.

Agala nso n’ọnụ ụzọ ụlọ ya,+

 9 Ka i wee ghara ire ùgwù gị,+

Ka ị gharakwa ịta ahụhụ n’afọ niile fọrọ ná ndụ gị.+

10 Ka ndị bịara abịa ghara irichapụ akụ̀ gị,+

Ka ihe ị rụgburu onwe gị n’ọrụ nweta gharakwa ịlara ezinụlọ onye mba ọzọ.

11 Ọ bụrụ na i geghị m ntị, ị ga na-asụ ude n’ikpeazụ

Mgbe ike na-adịghịzi gị, mgbe ahụ́ niile ga-agwụkwa gị.+

12 I wee sị: “Ejighị m aka ná ntị a dọrọ m kpọrọ ihe.

Obi m anabataghị mba a baara m.

13 Egeghị m ntị n’ihe ndị na-akụziri m ihe kwuru,

Aṅaghịkwa m ndị nkụzi m ntị.

14 Ọ fọla obere ka nke m gwụ

N’ime ọgbakọ niile.”+

15 Ṅụọ mmiri si n’olulu mmiri* gị,

Ṅụọkwa mmiri dị mma nke si n’isi mmiri gị.+

16 Isi iyi gị ò kwesịrị ịna-asọga n’èzí?

Iyi gị ò kwesịrị ịna-asọga n’ámá obodo?+

17 Ka ọ bụrụ naanị nke gị

Ma ghara ịbụ nke gị na ndị bịara abịa.+

18 Ka a gọzie isi mmiri gị.

Ka gị na nwunye ị lụrụ n’okorobịa na-aṅụrị ọṅụ.+

19 Ọ dị ka ọmarịcha nne ele, dịrịkwa ka ewu ọhịa mara mma.+

Ka ara ya na-eme gị obi ụtọ* mgbe niile.

Ka obi na-atọ gị ụtọ mgbe niile maka na ọ hụrụ gị n’anya.+

20 Nwa m, gịnịzi mere ị ga-eji nwee mmasị n’ebe nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ* nọ?

Gịnị mere ị ga-eji na-amakụ nwaanyị na-akwa iko?*+

21 Jehova na-ahụ ihe niile mmadụ na-eme.

Ọ na-eleru ihe niile mmadụ na-eme anya.+

22 Ihe ọjọọ onye ajọ omume na-eme ga-eme ka ọ ma n’ọnyà.

Mmehie ọ na-eme ga-eke ya agbụ.+

23 Ọ ga-anwụ maka na ọ nabataghị aka ná ntị a dọrọ ya,

Ọ ga-akpafukwa maka na ọ dị ezigbote iberiibe.

6 Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbata obi gị n’ibé,+

Ọ bụrụ na e nwere ihe gị na onye ị na-amaghị kwekọrịtara,*+

 2 Ọ bụrụ na nkwa i kwere arapụtala gị,

Ọ bụrụ na ihe i ji ọnụ gị kwuo etinyela gị ná nsogbu,+

 3 Nwa m, ebe ọ bụ na ị banyela n’aka mmadụ ibe gị,

Mee ihe a ka ị gbara isi gị:

Gakwuru onye ahụ ozugbo. Weda onwe gị ala rịọ ya arịrịọ.+

 4 Ekwela ka ụra gaa gị n’anya,

Ekwekwala ka ụra buru gị.

 5 Napụta onwe gị otú ele si agbapụ n’aka dinta,

Otú nnụnụ si agbapụ n’aka onye na-achụ nta nnụnụ.

 6 Gị onye umengwụ, gakwuru ndanda.+

Leruo otú ha si eme ihe anya ka ị mara ihe.

 7 Ọ bụ eziokwu na ha enweghị ọchịagha, onyeisi, ma ọ bụ onye na-achị ha,

 8 Ha na-akwadebe nri ha n’ọkọchị,+

Ha na-akpakọtakwa ihe oriri ha n’oge a na-ewe ihe ubi.

 9 Gị onye umengwụ, olee mgbe ị ga-esi n’ebe i dina bilie?

Olee mgbe ị ga-esi n’ụra bilie?

10 Ihitụ ụra, irotụ ụra,

Na ịkụkụwatụ aka ka i zuo ike+

11 Ga-eme ka ị daa ogbenye na mberede ka à ga-asị na onye ohi zuru gị ohi na mberede,

Ị ga-adakwa ụkpa ka à ga-asị na mmadụ ji ngwá ọgụ bịa nakọrọ gị ihe niile i nwere.+

12 Onye nzuzu nke bụ́kwa onye ajọ omume na-ejegharị na-ekwu ihe na-enweghị isi.+

13 Ọ na-atabiri mmadụ anya,+ na-akụ ụkwụ ya n’ala, na-emegharịkwa mkpịsị aka ya mgbe ọ na-aghọ ndị ọzọ aghụghọ.

14 Ebe o bu ihe ọjọọ n’obi,

Ọ na-akpa nkata ọjọọ mgbe niile+ ma na-ekwu ihe ga-akpata esemokwu.+

15 N’ihi ya, ọdachi ga-adakwasị ya na mberede.

A ga-ala ya n’iyi kpamkpam n’otu ntabi anya.+

16 E nwere ihe isii Jehova kpọrọ asị.

N’eziokwu, e nwere ihe asaa dị oké njọ n’anya ya:

17 Mpako,+ ịgha ụgha,*+ igbu* onye aka ya dị ọcha,+

18 Ịkpa* nkata ọjọọ,+ ime ngwa ngwa gaa mee ihe ọjọọ,*

19 Ịbụ onye akaebe nke ụgha juru ọnụ+

Nakwa ime ka ụmụnne na-ese okwu.+

20 Nwa m, debe iwu nna gị nyere gị,

Ahapụkwala ntụziaka* nne gị nyere gị.+

21 Kee ha gburugburu obi gị mgbe niile.

Nyara ha n’olu gị.

22 Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga-edu gị.

Mgbe i dina ala, ọ ga-eche gị nche.

Mgbe i tetakwara, ọ ga-agwa gị okwu.*

23 N’ihi na ntụziaka bụ ọkụ e ji ahụ ụzọ.*+

Iwu* bụ ìhè,+

Mba a bara iji dọọ mmadụ aka ná ntị ga-emekwa ka mmadụ dị ndụ.+

24 Ha ga-echebe gị ka ị ghara ịdaba n’aka nwaanyị ọjọọ,+

Ka nwaanyị na-akwa iko* ghara iji ire ụtọ rata gị.+

25 Ekwela ka obi gị dịrị n’ebe ọ nọ maka na ọ mara mma,+

Ekwekwala ka o jiri anya ọ na-akpịnyere gị rata gị,

26 N’ihi na nwaanyị akwụna na-eme ka nwoke bụrụ ogbenye ọnụ ntụ,*+

Ma nwunye nwoke ọzọ na-ala ndụ nwoke ya na ya na-akwa iko n’iyi.

27 Mmadụ ọ̀ ga-agụkwasị ọkụ n’obi ya, uwe ya aghara ire ọkụ?+

28 Ka mmadụ ọ̀ ga-eje ije n’elu icheku ọkụ, ọkụ aghara ire ya n’ụkwụ?

29 Otú ahụ ka ọ dị onye ọ bụla ya na nwunye onye agbata obi ya na-enwe mmekọahụ.

E nweghị onye metụrụ nwaanyị ahụ aka a na-agaghị ata ahụhụ.+

30 Ndị mmadụ anaghị ele onye ohi anya ọjọọ

Ma ọ bụrụ na o zuru ohi maka na agụụ na-agụ ya.

31 Ma e jide ya, ọ ga-akwụ ụgwọ ihe o zuru okpukpu asaa.

Ọ ga-eji ihe niile bara uru o nwere n’ụlọ ya kwụọ ụgwọ ya.+

32 Onye ọ bụla ya na nwaanyị na-akwa iko enweghị uche.

Onye na-eme otú ahụ na-ala ndụ ya* n’iyi.+

33 A ga-emepụ ya ọnyá, mechuo ya ihu,+

Ihere agaghịkwa akwụsị ime ya.+

34 N’ihi na ekworo na-eme ka iwe ju nwoke lụrụ nwaanyị obi.

Ọ gaghịkwa eme ebere ma ọ bọwa ọbọ.+

35 Ọ gaghị anara ihe ọ bụla a chọrọ iji tie ya aka n’obi.

Obi agaghị ajụrụ ya, n’agbanyeghị otú onyinye a chọrọ inye ya bururu n’ibu.

7 Nwa m, na-eme ihe m na-agwa gị,

Jirikwa iwu ndị m na-enye gị kpọrọ ihe.+

 2 Debe iwu m na-enye gị ka i wee dị ndụ.+

Were ntụziaka* m ka ihe bara ezigbo uru ka mkpụrụ anya gị.

 3 Kee ha ná mkpịsị aka gị.

Dee ha n’obi gị.+

 4 Gwa amamihe, sị: “Ị bụ nwanne m nwaanyị,”

Gwakwa nghọta, sị: “Ị bụ onye ikwu m,”

 5 Ka o wee chebe gị ka ị ghara ịdaba n’aka nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ,*+

N’aka nwaanyị na-akwa iko,* ka ọ ghara iji ire ụtọ ya rata gị.+

 6 M si na windo ụlọ m,

Na mpio ụlọ m, ledata anya.

 7 Ka m nọ na-ele ndị na-amaghị ihe,

M hụrụ otu nwa okorobịa n’ime ha nke na-enweghị uche.+

 8 Ọ nọ na-aga n’okporo ụzọ dị nso n’ebe nwaanyị ahụ bi,

Ọ gawakwara n’ụzọ gara n’ụlọ nwaanyị ahụ

 9 Mgbe anyanwụ dara, ná mgbede,+

Mgbe chi na-achọ iji, ọchịchịrị achọwakwa ịgba.

10 M wee hụ ka otu nwaanyị gara zute ya.

O jiri ejiji ka akwụna,+ ọ dịkwa aghụghọ.

11 Ọ dị aghara, ọ naghịkwa ekwe ekwe.+

E nweghị mgbe ọ na-anọ n’ụlọ.*

12 Obere oge, ọ nọ n’èzí. Obere oge, ọ nọ n’ámá.

Ọ na-aga chebiri ndị mmadụ n’isi ụzọ ọ bụla.+

13 O jidere nwa okorobịa ahụ susuo ya ọnụ.

Ebe ọ bụ na ihere anaghị eme ya, ọ gwara nwa okorobịa ahụ, sị:

14 “M chụọla àjà udo.+

Ọ bụ taa ka m mezuru nkwa m kwere.

15 Ọ bụ ya mere m ji pụta ka m zute gị,

Ka m chọọ gị. M wee chọta gị.

16 M gbasaala ọmarịcha ákwà n’elu àkwà m,*

Bụ́ ákwà linin tụrụ àgwà nke si Ijipt.+

17 M feela mea, alo, na sinamọn n’elu àkwà m.*+

18 Bịa ka anyị ṅụjuo ịhụnanya afọ ka mmiri ruo ụtụtụ.

Ka anyị mee ibe anyị obi ụtọ ma gosi na anyị hụrụ ibe anyị n’anya,

19 N’ihi na di m anọghị n’ụlọ.

Ọ gaala ebe dị anya.

20 O bu akpa ego gaa.

Ọ bụ n’ụbọchị ọnwa ga-agbazu ka ọ ga-alọta.”

21 Ọ gwara ya okwu ruru ya n’obi wee duhie ya.+

O ji ire ụtọ rata ya.

22 Na mberede, o sooro nwaanyị ahụ ka oké ehi nke na-aga n’ebe a ga-egbu ya,

Ka onye nzuzu a ga-atụ ịga ma taa ahụhụ.+

23 Ọ nọ na-aga ruo mgbe akụ́ gbapuru imeju ya.

Ọ dị ka nnụnụ nke ji ọsọ feba n’ọnyà. Ọ maghị na ihe a o mere ga-ata isi ya.+

24 Ugbu a, ụmụ m, geenụ m ntị.

Ṅaakwanụ ntị n’ihe m na-ekwu.

25 Ekwela ka obi gị duba gị n’ụzọ nwaanyị ahụ.

Akpafula banye n’ụzọ ya.+

26 N’ihi na ọ laala ọtụtụ ndị n’iyi,+

Ndị o gburu dịkwa ọtụtụ.+

27 Ụlọ ya na-eduga ndị mmadụ n’ili.*

Ọ na-eduga n’ebe ndị nwụrụ anwụ tọgbọ.

8 Ọ̀ bụ na amamihe anọghị na-akpọ òkù?

Ọ̀ bụ na nghọta anọghịkwa na-eti mkpu?+

 2 Ọ na-eguzo n’ebe ndị dị elu+ n’okporo ụzọ,

N’ebe ụzọ gbara mkpị.

 3 Ọ na-anọ n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá e si abanye n’obodo,

N’ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ dị iche iche,

Na-eti mkpu n’oké olu, sị:+

 4 “Ndị mmadụ, ọ bụ unu ka m na-akpọ òkù.

Ọ bụ mmadụ niile ka m weliri olu na-agwa okwu.

 5 Unu ndị na-amaghị ihe, maranụ ihe.+

Unu ndị nzuzu, nweenụ uche.

 6 Geenụ ntị, n’ihi na ihe m na-ekwu dị mkpa.

Ihe m na-ekwu dị mma.

 7 N’ihi na m weturu olu na-ekwu eziokwu,

Ejighịkwa m ọnụ m ekwu ihe ọjọọ.

 8 Ihe niile ọnụ m na-ekwu dị mma.

E nweghị nke bụ́ ụgha, e nweghịkwa nke na-eduhie mmadụ.

 9 Ha niile doro onye na-aghọta ihe anya,

Ndị ma ihe makwa na ha ziri ezi.

10 Naranụ aka ná ntị m na-adọ unu kama ịnara ọlaọcha,

Narakwanụ amamihe kama ịnara ọlaedo kacha

mma.+

11 N’ihi na amamihe ka nkume kọral* mma.

E nweghị ihe ọ bụla ọzọ bara ezigbo uru a ga-eji tụnyere ya.

12 Abụ m amamihe. Mụ na nghọta bi.

M mụtala ihe, m na-echekwa echiche nke ọma.+

13 Ịtụ egwu Jehova pụtara ịkpọ ihe ọjọọ asị.+

M kpọrọ nganga na mmadụ ibuli onwe ya elu asị,+ kpọọkwa ihe ọjọọ na okwu rụrụ arụ asị.+

14 Enwere m ezigbo ndụmọdụ na ezigbo amamihe.+

M na-aghọta ihe,+ m dịkwa ike.+

15 Ọ bụ m ka ndị eze ji achị,

Ọ bụkwa m ka ndị isi ji eme iwu ndị dị mma.+

16 Ọ bụ m ka ndị isi ji achị,

Ọ bụkwa m ka ndị a ma ama ji ekpe ikpe ziri ezi.

17 M hụrụ ndị hụrụ m n’anya n’anya,

Ndị na-achọ m ga-achọtakwa m.+

18 Akụnụba na ebube dị m n’aka,

Akụ̀ na-anaghị agwụ agwụ na ezi omume dịkwa m n’aka.

19 Mkpụrụ m na-amịpụta ka ọlaedo mma. Ọ kadị ọlaedo a nụchara anụcha mma.

Ihe m na-emepụta dịkwa mma karịa ọlaọcha kacha mma.+

20 M na-eje ije n’ụzọ ezi omume,

N’etiti okporo ụzọ ikpe ziri ezi.

21 M na-ekenye ndị hụrụ m n’anya nnukwu ihe,

M na-emekwa ka ebe ha na-akwasa ihe ju n’ọnụ.

22 Jehova kere m, mụ abụrụ mmalite ụzọ ya.+

Abụ m nke mbụ n’ime ihe niile o kere n’oge dị anya gara aga.+

23 O mere ka m dịrị malite n’oge ochie,+

Ná mbido mbido, malite mgbe ụwa na-adịbeghị.+

24 A mụrụ m mgbe oké osimiri na-adịbeghị,+

Mgbe a na-enwebeghị ebe mmiri na-agbapụta n’ala.

25 A mụrụ m tupu e mee ka ugwu ukwu dịrị,

Tupu e nwee ugwu nta,

26 Mgbe ọ na-ekebeghị ụwa na mbara ala ya

Ma ọ bụ ájá mbụ dị n’ụwa.

27 Mgbe ọ kwadebere eluigwe,+ anọ m ya.

Mgbe ọ kpaara mbara igwe na osimiri ókè,+

28 Mgbe o mere ka ígwé ojii dịrị n’elu,*

Mgbe o mere ka oké osimiri ju n’ọnụ,

29 Mgbe o nyere oké osimiri iwu

Ka mmiri ya ghara ịgafe ókè ọ kpaara ya,+

Mgbe ọ tọrọ ntọala ụwa,

30 Mgbe ahụ, m nọ n’akụkụ ya na-arụ ọrụ. Abụkwa m ọkà n’ọrụ.+

Ihe gbasara m na-eme ya ezigbo obi ụtọ+ kwa ụbọchị.

M na-aṅụrị ọṅụ n’ihu ya mgbe niile.+

31 M ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ụwa ọ kwadebere ka e biri na ya,

Ihe gbasara ụmụ mmadụ na-emekwa m ezigbo obi ụtọ.

32 Ugbu a, ụmụ m, geenụ m ntị.

Ndị na-eso ụzọ m na-enwe obi ụtọ.

33 Nabatanụ aka ná ntị* a na-adọ unu+ ka unu wee mara ihe.

Unu elegharala ya anya.

34 Onye na-ege m ntị na-enwe obi ụtọ.

Ọ na-abịa n’ọnụ ụzọ ụlọ m* kwa ụbọchị n’isi ụtụtụ.

Ọ na-echere n’akụkụ ọnụ ụzọ m.

35 N’ihi na onye na-achọ m ga-achọta ndụ,+

Ihe ya ga-adịkwa Jehova mma.

36 Ma onye na-ejighị m kpọrọ ihe na-emerụ onwe ya ahụ́.

Ndị kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ n’anya.”+

9 Ezigbo amamihe arụọla ụlọ ya.

O gwunyela* ogidi asaa ya.

 2 O gbuchaala anụ ya.

Ọ gwaala mmanya ya.

Ọ dọwala ihe dị iche iche na tebụl ya.

 3 O zipụla ụmụ nwaanyị na-ejere ya ozi

Ka ha nọrọ n’ebe ndị dị elu n’obodo na-akpọ ndị mmadụ òkù, sị:+

 4 “Onye ọ bụla na-amaghị ihe, ya bata ebe a.”

Ọ na-agwa onye na-enweghị uche, sị:

 5 “Bịa rie nri m,

Sorokwa ṅụọ mmanya m gwara agwa.

 6 Kwụsị izuzu nzuzu* ka i wee dịrị ndụ.+

Na-ebi ndụ otú na-egosi na ị na-aghọta ihe.”*+

 7 Onye na-adọ onye na-akwa mmadụ emo aka ná ntị na-akparị onwe ya,+

Ihere ga-emekwa onye na-abara onye ajọ omume mba.

 8 Abarala onye na-akwa mmadụ emo mba ka ọ ghara ịkpọ gị asị.+

Baara onye ma ihe mba, ọ ga-ahụ gị n’anya.+

 9 Kụziere onye ma ihe ihe, ọ ga-amakwu ihe.+

Kụziere onye ezi omume ihe, ọ ga-amụtakwu ihe.

10 Ihe na-egosi na mmadụ amatawala ihe bụ onye ahụ ịtụ egwu Jehova,+

Ihe na-egosikwa na mmadụ na-aghọta ihe bụ onye ahụ ịmata Onye Kacha Nsọ.+

11 N’ihi na m ga-eme ka ị dịtee ndụ aka,+

M ga-emekwa ka ị dị ogologo ndụ.

12 Ọ bụrụ na ị mara ihe, ọ bụ gị ka ọ ga-abara uru.

Ma, ọ bụrụ na ị na-akwa ndị mmadụ emo, ọ bụ naanị gị ga-ata ahụhụ ya.

13 Nwaanyị nzuzu na-eme mkpọtụ.+

O nweghị uche, ọ maghịkwa ihe ọ bụla.

14 Ọ na-anọrọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ụlọ ya,

N’oche dị n’ebe ndị dị elu n’obodo,+

15 Na-akpọ ndị na-agafe agafe òkù,

Bụ́ ndị na-agara onwe ha n’ụzọ, sị:

16 “Onye ọ bụla na-amaghị ihe, ya bata ebe a.”

Ọ na-agwa ndị na-enweghị uche, sị:+

17 “Mmiri e zutere ezute na-atọ ụtọ,

Nri e riri na nzuzo na-adịkwa ụtọ.”+

18 Ma ha amaghị na ụlọ ya bụ ụlọ ndị nwụrụ anwụ,

Na ndị na-abanye na nke ya nọ n’ime ime ili.*+

10 Ilu Solomọn.+

Nwa ma ihe na-eme nna ya obi ụtọ,+

Ma nwa nzuzu na-eme ka nne ya na-eru uju.

 2 Akụ̀ e ji aghụghọ kpata agaghị aba uru,

Ma ezi omume ga-anapụta mmadụ n’ọnwụ.+

 3 Jehova agaghị ekwe ka agụụ gụgbuo onye ezi omume,+

Ma ọ ga-eme ka ndị ajọ omume ghara inweta ihe na-agụsi ha ike.

 4 Onye umengwụ ga-ada ogbenye,+

Ma, onye na-arụsi ọrụ ike ga-aba ọgaranya.+

 5 Nwa na-aghọta ihe na-achịkọta ihe ubi n’oge okpomọkụ,

Ma nwa iberiibe na-anọ n’ezigbo ụra n’oge a na-ewe ihe ubi.+

 6 A ga-agọzi onye ezi omume,+

Ma okwu* onye ajọ omume na-eme ka a ghara ịmata ihe ọjọọ dị ya n’obi.

 7 A ga-echeta onye ezi omume ma gọzie ya,+

Ma aha ndị ajọ omume ga-efu.*+

 8 Onye ma ihe ga-anabata ntụziaka* e nyere ya,+

Ma onye na-ekwu okwu nzuzu ga-ala n’iyi.+

 9 Obi ga-eru onye kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ ala,+

Ma a ga-agba ihe onye aghụghọ na-eme n’anwụ.+

10 Onye na-atabi anya iji ghọgbuo mmadụ na-eme ka ndị ọ na-aghọgbu ruwe uju,+

Onye na-ekwu okwu nzuzu ga-alakwa n’iyi.+

11 Okwu* onye ezi omume na-eme ka mmadụ dị ndụ;+

Ma okwu onye ajọ omume na-eme ka a ghara ịmata ihe ọjọọ dị ya n’obi.+

12 Ịkpọasị na-akpata esemokwu,

Ma ịhụnanya na-ekpuchi mmejọ niile.+

13 Ihe onye na-aghọta ihe na-ekwu na-egosi na ọ ma ihe,+

Ma e mere ụtarị maka azụ onye na-enweghị uche.+

14 Ndị ma ihe na-agbalịsi ike ka ha mụta ihe,+

Ma ọnụ onye nzuzu na-etinye ya ná nsogbu.+

15 Akụ̀ onye bara ọgaranya nwere bụụrụ ya obodo a rụsiri ike.

Ịda ogbenye na-ala ndị ogbenye n’iyi.+

16 Ihe onye ezi omume na-eme ga-eme ka ọ dị ndụ,

Ma ihe onye ajọ omume na-eme ga-eme ka ọ na-eme mmehie.+

17 Onye na-anabata aka ná ntị a dọrọ ya na-eme ka ndị ọzọ dị ndụ,*

Ma onye na-anaghị eji mba a baara ya kpọrọ ihe na-edufu ndị ọzọ.

18 Onye na-eme ka a ghara ịmata na ọ kpọrọ mmadụ asị na-agha ụgha.+

Onye na-akọsa akụkọ ọjọọ* banyere ndị ọzọ dị nzuzu.

19 Mgbe mmadụ na-ekwu ọtụtụ okwu, ọ ga-emerịrị mmehie,+

Ma onye na-ejide ọnụ ya aka na-egosi na o nwere uche.+

20 Ire onye ezi omume dị ka ọlaọcha kacha mma,+

Ma obi onye ajọ omume abachaghị uru.

21 Ihe onye ezi omume na-ekwu na-abara ọtụtụ ndị uru,*+

Ma onye nzuzu na-anwụ maka na o nweghị uche.+

22 Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya,+

E nweghịkwa nsogbu* ya na ya na-eso.

23 Onye nzuzu na-ewere ime omume rụrụ arụ ka egwuregwu,

Ma onye na-aghọta ihe nwere amamihe.+

24 Ihe onye ajọ omume na-atụ ụjọ ya ga-abịara ya,

Ma a ga-emere ndị ezi omume ihe na-agụ ha.+

25 Mgbe oké ifufe ga-efe, onye ajọ omume ga-ala n’iyi,+

Ma onye ezi omume dị ka ntọala ga-adịru mgbe ebighị ebi.+

26 Otú ahụ mmanya gbara ụka si egbu ezé, anwụrụ ọkụ ana-afụkwa ụfụ n’anya,

Ka ihe onye umengwụ na-eme si agbakasị onye dunyere ya ozi* ahụ́.

27 Ịtụ egwu Jehova na-eme ka mmadụ dị ogologo ndụ,+

Ma a ga-eme ka ndị ajọ omume ghara ịdịte ndụ aka.+

28 Ihe ndị ezi omume na-atụ anya ya* ga-eme ka ha ṅụrịa ọṅụ,+

Ma ihe ndị ajọ omume na-atụ anya ya agaghị enwe isi.+

29 Ihe Jehova na-eme* na-echebe onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta,+

Ma ọ* na-eme ka ndị na-eme ihe ọjọọ laa n’iyi.+

30 A gaghị eme ka onye ezi omume daa,+

Ma ndị ajọ omume agaghịzi ebi n’ụwa.+

31 Ihe juru onye ezi omume ọnụ bụ okwu amamihe,

Ma a ga-ebepụ ire onye na-ekwu okwu ọjọọ.

32 Onye ezi omume na-ekwu ihe dị mma,

Ma ihe juru ndị ajọ omume ọnụ bụ okwu ọjọọ.

11 Jehova kpọrọ ihe na-ezughị ezu e ji atụ̀ ihe asị,

Ma ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe* na-adị ya mma.+

 2 Ọ bụrụ na mmadụ adị mpako, a ga-emechu ya ihu.+

Ma ndị dị umeala n’obi ma ihe.+

 3 Ọ bụ ịkwụwa aka ọtọ na-edu ndị ezi omume,+

Ma aghụghọ ndị ajọ omume na-aghọ ga-ala ha n’iyi.+

 4 E nweghị uru akụnụba ga-aba n’ụbọchị oké iwe.*+

Ma, ọ bụ ezi omume ga-anapụta mmadụ n’ọnwụ.+

 5 Ezi omume onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta na-eme ga-eme ka ihe gaziere ya,*

Ma ihe agaghị agaziri onye ajọ omume* n’ihi ihe ọjọọ ọ na-eme.+

 6 Ihe ga-anapụta ndị ezi omume bụ ezi omume ha na-eme,+

Ma ihe na-agụ ndị aghụghọ agụụ ga-eme ka ha ma n’ọnyà.+

 7 Ihe onye ajọ omume na-ele anya ya na-ala n’iyi ma ọ nwụọ.

Ihe ọ na-atụ anya na ọ ga-eji ike ya mee anaghịzi enwe isi.+

 8 A na-anapụta onye ezi omume ná nsogbu,

Nsogbu ahụ abịaziere onye ajọ omume.+

 9 Onye kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ* na-eji ọnụ ya ala onye agbata obi ya n’iyi,

Ma ihe ndị ezi omume ma na-anapụta ha.+

10 Àgwà ọma ndị ezi omume na-akpa na-eme ka ndị bi n’obodo na-enwe obi ụtọ,

A na-etikwa mkpu ọṅụ ma e bibie ndị ajọ omume.+

11 Ngọzi a na-agọzi ndị ezi omume na-eme ka ihe na-aga nke ọma n’obodo,+

Ma ihe ndị ajọ omume na-ekwu na-emebi obodo.+

12 Onye na-enweghị uche na-akpọ onye agbata obi ya asị,

Ma onye na-aghọta ihe nke ọma na-agbachi nkịtị.+

13 Onye na-ekwutọ mmadụ na-agagharị na-akọsa ihe a na-achọghị ka ndị ọzọ mara,+

Ma onye a tụkwasịrị obi anaghị ekwu ihe a na-achọghị ka ndị ọzọ mara.

14 Ndị mmadụ na-ata ahụhụ ma ọ bụrụ na e nyeghị ha ezigbo ntụziaka,

Ma ihe na-aga nke ọma* ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.+

15 Onye ọ bụla nke kwere nkwa na ya ga-akwụ ego onye ọ na-amaghị bitere ma onye ahụ akwụghị ya,* ihe agaghị agaziri ya.+

Ma onye ọ bụla ọ na-anaghị adị ngwa ngwa ka ya na mmadụ kwekọrịta ihe ha ga-eme* anaghị aba ná nsogbu.

16 A na-akwanyere nwaanyị obiọma* ùgwù,+

Ma ụmụ nwoke obi fere azụ na-ebukọrọ akụnụba.

17 Nwoke obiọma na-abara onwe ya uru,+

Ma onye obi tara mmiri na-etinye onwe ya ná nsogbu.*+

18 Ụgwọ ọrụ onye ajọ omume na-enweta anaghị aba uru ọ bụla,+

Ma a na-akwụ onye ezi omume* ezigbo ụgwọ ọrụ.+

19 Onye jisiri ike na-eme ezi omume ga-adị ndụ,+

Ma onye obi ya dị n’ime ihe ọjọọ ga-anwụ.

20 Jehova kpọrọ ndị obi ha jọrọ njọ* asị,+

Ma ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta na-eme ya obi ụtọ.+

21 Ka obi sie gị ike na a ga-atarịrị onye ọjọọ ahụhụ,+

Ma e nweghị ihe ga-eme ụmụ ndị ezi omume.

22 Nwaanyị mara mma nke na-achọghị inwe ezi uche

Dị ka ọlaedo a gbanyere ézì n’imi.

23 Ihe na-agụ ndị ezi omume na-eme ka ha nweta ihe ọma,+

Ma ihe ndị ajọ omume na-atụ anya ya na-eme ka e wesa ha nnukwu iwe.

24 E nwere onye na-eji obi ya niile enye ndị ọzọ ihe, ma ya ana-enwetakwu ihe.+

E nwekwara onye na-anaghị enye ndị ọzọ ihe o kwesịrị inye ha, ma ya adaa ogbenye.+

25 Ihe ga-agaziri onye na-emesapụ aka,+

Onye na-enyejukwa ndị ọzọ mmiri afọ ka a ga-enyeju mmiri afọ.+

26 Onye na-ekweghị ewepụta ọka,* ndị mmadụ ga-abụ ya ọnụ,

Ma ha ga-agọzi onye na-eresị ya ndị ọzọ.

27 A ga-emere onye na-agbasi mbọ ike ka o mee ihe dị mma amara,+

Ma ihe ọjọọ ga-abịara onye na-agba mbọ ka o mee ihe ọjọọ.+

28 Ọdachi ga-adakwasị onye tụkwasịrị obi n’akụnụba ya,+

Ma ndị ezi omume ga-ama pokopoko ka akwụkwọ ndụ.+

29 Onye ọ bụla nke na-ekotere ezinụlọ ya nsogbu* ga-agba aka,+

Onye nzuzu ga-abụkwa ohu onye ma ihe.

30 Ihe onye ezi omume na-eme dị ka* osisi nke ndụ,+

Onye na-eme ka ndị mmadụ mee ihe dị mma ma ihe.+

31 Ọ bụrụ na onye ezi omume nke nọ n’ụwa na-enweta ụgwọ ọrụ,

O doro anya na onye ajọ omume na onye mmehie ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ.+

12 Onye ji aka ná ntị a na-adọ ya kpọrọ ihe ji ihe ọ na-amụta kpọrọ ihe,+

Ma onye na-ejighị mba a na-abara ya kpọrọ ihe enweghị uche.+

 2 Ihe ezigbo mmadụ na-eme na-eme Jehova obi ụtọ,

Ma ọ na-ama onye na-akpa nkata ọjọọ ikpe.+

 3 Mmadụ ime ihe ọjọọ enweghị ike ime ka ihe gaziere ya+

Ma onye ezi omume ga-adị ka osisi a na-enweghị ike ifopụ efopụ.

 4 Ezigbo nwaanyị bụ okpueze di ya,+

Ma nwaanyị nke na-emechu di ya ihu dị ka ọrịa nke na-eme ka ọkpụkpụ di ya rewe ure.+

 5 Ndị ezi omume na-eche ihe dị mma n’echiche,

Ma ndị ajọ omume na-aghọgbu ndị ha na-edu.

 6 Ihe ndị ajọ omume na-ekwu dị ka isiri mmadụ ọnyà ọjọọ,*+

Ma ihe ndị ezi omume na-ekwu na-anapụta mmadụ.+

 7 E bibie ndị ajọ omume, ha anaghịzi anọ,

Ma ụlọ ndị ezi omume ga na-adị mgbe niile.+

 8 A na-aja mmadụ mma maka na ihe ọ na-ekwu na-egosi na ọ ma ihe,+

Ma a ga-emechu onye aghụghọ* ihu.+

 9 Ọ ka mma na e jighị mmadụ kpọrọ ihe ma ya enwee onye na-ejere ya ozi,

Kama mmadụ ịna-etu ọnụ ma ya abụrụ na o nweghị nri* ọ bụla.+

10 Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya,+

Ma onye ajọ omume na-eche na ya na-eme ebere, ma n’eziokwu, obi tara ya mmiri.

11 Onye na-akọ ubi ya ga-eriju nri afọ,+

Ma onye na-achụ ihe na-abaghị uru enweghị uche.

12 Onye ajọ omume na-enwere ndị ọjọọ ibe ya anyaụfụ maka ihe ha nwetara,

Ma ndị ezi omume dị ka osisi na-amị mkpụrụ nke gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’ala.

13 Ihe ọjọọ onye ajọ omume na-ekwu na-eme ka ọ ma n’ọnyà,+

Ma onye ezi omume na-esi ná nsogbu apụta.

14 Ihe mmadụ na-ekwu na-eme ka ihe gaara ya nke ọma,+

Ihe o jikwa aka ya eme ga-abara ya uru.

15 Ihe onye nzuzu na-eme dị mma n’anya ya,+

Ma onye ma ihe na-anabata ndụmọdụ.+

16 Onye nzuzu na-egosi ozugbo* na iwe ji ya,+

Ma onye ma ihe na-eleghara mkparị anya.*

17 Onye akaebe a tụkwasịrị obi ga-ekwu eziokwu,

Ma ihe juru onye akaebe ụgha ọnụ bụ ụgha.*

18 Okwu mmadụ kwuru n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ,

Ma okwu ndị ma ihe* na-agwọ mmadụ.+

19 Onye na-ekwu eziokwu ga-anọru mgbe ebighị ebi,+

Ma onye na-agha ụgha ga-anọ naanị obere oge.+

20 Ihe dị n’obi ndị na-akpa nkata ọjọọ bụ aghụghọ,

Ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ.+

21 E nweghị ihe ọjọọ ga-eme onye ezi omume,+

Ma ọdachi ga-ezu ndị ajọ omume ahụ́.+

22 Jehova kpọrọ ndị na-agha ụgha asị,+

Ma ndị na-eme ihe dị mma na-eme ya obi ụtọ.

23 Onye ma ihe anaghị ekwu ihe niile ọ ma.

Ma ihe onye nzuzu na-ekwu na-egosi na ọ dị nzuzu.+

24 Ndị na-arụsi ọrụ ike ga na-achị,+

Ma a ga-amanye ndị umengwụ ka ha gbawa ohu.+

25 Nchegbu na-eme ka ike gwụ mmadụ,+

Ma okwu ọma na-eme ka obi dị ya ụtọ.+

26 Onye ezi omume na-achọta ebe anụ ya ga-ata ahịhịa,

Ma ụzọ ndị ajọ omume na-eso na-edufu ha.

27 Ndị umengwụ anaghị achụ nta anụ ha ga-eri,+

Ma ịrụsi ọrụ ike dị ka akụ̀ bara ezigbo uru mmadụ nwere.

28 Ụzọ ezi omume na-eduga mmadụ ná ndụ.+

Ụzọ ya enweghị ike iduga mmadụ n’ọnwụ.

13 Nwa ma ihe na-anabata aka ná ntị nna ya na-adọ ya,+

Ma onye na-akwa mmadụ emo anaghị anabata mba a na-abara ya.+

 2 Ihe dị mma mmadụ na-ekwu ga-eme ka ihe ọma bịara ya,+

Ma ihe na-agụ ndị na-aghọ aghụghọ agụụ bụ tigbuo zọgbuo.

 3 Onye na-eche ọnụ ya* nche na-echebe ndụ* ya,+

Ma onye na-anaghị ejide ọnụ ya aka ga-ala n’iyi.+

 4 Ọtụtụ ihe na-agụ onye umengwụ agụụ, ma e nweghị ihe ọ bụla o nwere.+

Ma afọ ga-eju onye na-arụsi ọrụ ike.+

 5 Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị,+

Ma ihe ndị ajọ omume na-eme na-emechu ha ihu, na-emenyekwa ha ihere.

 6 Ezi omume na-echebe onye aka ya dị ọcha,+

Ma ajọ omume na-ala onye mmehie n’iyi.

 7 E nwere onye na-eme ka à ga-asị na ọ bara ọgaranya, ma o nweghị ihe ọ bụla.+

E nwekwara onye na-eme ka à ga-asị na ọ dara ogbenye, ma o nwejuru akụ̀ enweju.

 8 Mmadụ na-eji akụnụba ya agbapụta onwe ya,+

Ma e nweghịdị ihe na-eyi ogbenye egwu.+

 9 Ìhè ndị ezi omume na-enwusi ike,*+

Ma a ga-emenyụ ọkụ* ndị ajọ omume.+

10 Naanị ihe mpako na-akpata bụ ọgụ,+

Ma ndị na-achọ ka a dụọ ha ọdụ* ma ihe.+

11 Akụ̀ a kpatara ngwa ngwa ga na-agbada agbada,+

Ma akụ̀ mmadụ na-akpata obere obere ga na-amụba amụba.

12 Ike na-agwụ mmadụ ma ọ bụrụ na ihe ọ na-atụ anya ya emezughị mgbe ọ tụrụ anya ya.+

Ma ọ na-aṅụrị ọṅụ, nwetakwa ume ma ihe ọ na-atụ anya ya mezuo.*+

13 Onye na-anaghị eji ntụziaka akpọrọ ihe ga-ata ahụhụ ya,+

Ma onye na-eji iwu e nyere ya akpọrọ ihe ga-enweta ụgwọ ọrụ.+

14 Ihe onye ma ihe na-akụzi* na-eme ka mmadụ dị ndụ.+

Ọ na-eme ka mmadụ ghara ịba ná nsogbu ga-ata isi ya.

15 A na-ele onye na-aghọta ihe nke ọma anya ọma,

Ma ndụ ndị aghụghọ na-abụ nsogbu nsogbu.

16 Onye ma ihe na-akpa àgwà otú na-egosi na ọ ma ihe,+

Ma onye nzuzu na-egosi na ya dị iberiibe.+

17 Onye ozi nke bụ́ onye ajọ omume ga-aba ná nsogbu,+

Ma onye ozi a tụkwasịrị obi na-eme ka ihe dị mma.+

18 Onye ọ bụla nke na-eleghara aka ná ntị a na-adọ ya anya ga-ada ogbenye, a ga-emechukwa ya ihu.

Ma a ga-akwanyere onye na-anabata mba a na-abara ya ùgwù.+

19 Obi na-adị mmadụ ụtọ mgbe o nwetara ihe na-agụ ya,+

Ma ndị nzuzu anaghị achọ ịhapụ ihe ọjọọ.+

20 Onye ya na ndị ma ihe na-akpa* ga-ama ihe,+

Ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.+

21 Ọdachi na-achụgharị ndị mmehie,+

Ma ihe na-agaziri ndị ezi omume.+

22 Ezigbo mmadụ na-ahapụrụ ụmụ ụmụ ya ihe ha ga-eketa.

Ma, ọ bụ akụ̀ onye mmehie kpatara ka a ga-edowere onye ezi omume.+

23 Ala ebe ndị ogbenye na-akọ ihe na-eme nri nke ọma,

Ma ikpe na-ezighị ezi nwere ike ime ka ọ* laa n’iyi.

24 Onye na-anaghị apịa nwa ya ụtarị* kpọrọ ya asị,+

Ma onye hụrụ nwa ya n’anya na-adọsi ya aka ná ntị ike.*+

25 Onye ezi omume na-eri nri rijuo afọ,+

Ma afọ ndị ajọ omume na-atọgbọ chakoo.+

14 Nwaanyị ma ihe na-eme ka ihe na-aga nke ọma n’ezinụlọ ya,+

Ma nwaanyị nzuzu na-eji aka ya aghasa ezinụlọ ya.

 2 Onye na-akwụwa aka ọtọ na-atụ egwu Jehova,

Ma onye aghụghọ* na-eleda Chineke anya.

 3 Okwu ọjọọ onye nzuzu na-ekwu dị ka ụtarị,

Ma ihe ndị ma ihe na-ekwu ga-echebe ha.

 4 N’ebe a na-enweghị ehi, ihe e ji etinyere ehi nri na-adị ọcha,

Ma otú oké ehi si arụsi ọrụ ike na-eme ka ihe a na-eweta n’ubi buo ibu.

 5 Onye akaebe a tụkwasịrị obi agaghị agha ụgha,

Ma ụgha juru onye akaebe ụgha ọnụ.+

 6 Onye na-akwa emo na-achọ ka ọ mara ihe, ma ọ naghị ama ihe.

Ma ọ na-adịrị onye na-aghọta ihe mfe ịmụta ihe.+

 7 Gị na onye nzuzu emekọla ihe,

N’ihi na ị gaghị amụta ihe n’ọnụ ya.+

 8 Amamihe na-eme ka onye ma ihe na-aghọta ihe ọ na-eme,

Ma ihe na-eduhie ndị nzuzu* bụ iberiibe ha.+

 9 Ihe ọjọọ ndị iberiibe na-eme na-atọ ha ọchị,+

Ma ndị ezi omume na-adị njikere idozi okwu.

10 Ọ bụ onye ihe na-ewute ma ihe na-ewute ya n’obi,

Onye ọzọ enweghịkwa ike ịghọta obi ụtọ mmadụ na-enwe.

11 A ga-ebibi ụlọ ndị ajọ omume,+

Ma ihe ga na-aga nke ọma n’ụlọikwuu ndị ezi omume.

12 E nwere ihe na-adị mma n’anya mmadụ,+

Ma ọ na-emecha butere mmadụ ọnwụ.+

13 Mmadụ nwere ike na-achị ọchị mgbe obi na-adịghị ya mma,

Onye na-aṅụrị ọṅụ nwekwara ike ruwezie uju.

14 Onye obi ya na-adịghị n’ime ihe dị mma ga-ata ahụhụ ihe ndị ọ na-eme,+

Ma ezigbo mmadụ ga-eri uru ihe ndị ọ na-eme.+

15 Onye na-amaghị ihe na-ekweta ihe niile e kwuru,

Ma onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.+

16 Onye ma ihe na-akpachapụ anya, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ.

Ma onye nzuzu anaghị akpachapụ anya,* ọ tụkwasịkwara onwe ya obi.

17 Onye na-ewe iwe ọsọ ọsọ na-ezuzu nzuzu,+

Ma a kpọrọ onye na-echebara ihe echiche asị.

18 Ndị na-amaghị ihe ga-aghọ ndị nzuzu,

Ma ndị ma ihe ga-amụta ihe.+

19 Ndị ọjọọ ga-akpọrọ ndị ezigbo mmadụ isiala,

Ndị ajọ omume ga-akpọkwa isiala n’ọnụ ụzọ ámá ndị ezi omume.

20 Ndị mmadụ na-akpọ ogbenye asị, ndị agbata obi ya na-akpọdị ya asị.+

Ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi.+

21 Onye na-eleda onye agbata obi ya anya na-eme mmehie,

Ma onye na-emetere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ebere na-enwe obi ụtọ.+

22 Ọ̀ bụ na ndị na-akpa nkata ọjọọ agaghị akpafu?

Ma a ga-ahụ ndị na-agbalị ka ha mee ihe dị mma n’anya, tụkwasịkwa ha obi.+

23 Mmadụ na-erite uru ma ọ bụrụ na ọ na-arụsi ọrụ ike,

Ma mmadụ ịna-ekwu naanị okwu ga-eme ka ọ daa ogbenye.+

24 Mma onye ma ihe bụ akụnụba ya,

Ma ndị iberiibe ga na-ezuzu naanị nzuzu.+

25 Onye akaebe nke na-ekwu eziokwu na-azọ mmadụ ndụ,

Ma ihe juru onye na-aghọ aghụghọ ọnụ bụ ụgha.

26 Obi na-esi onye na-atụ egwu Jehova ezigbo ike,+

Ịtụ egwu Chineke ga-echebekwa ụmụ ya.+

27 Ịtụ egwu Jehova na-eme ka mmadụ dị ndụ,

Ọ na-emekwa ka mmadụ ghara ịba ná nsogbu ga-ata isi ya.

28 Gidigidi bụ ùgwù eze,+

Ma onye ọchịchị na-ala n’iyi ma ọ bụrụ na e nweghị ndị ọ na-achị.

29 Onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ na-aghọta ihe nke ọma,+

Ma onye na-anaghị enwe ndidi na-egosi na ọ dị nzuzu.+

30 Ahụ́ na-adị mmadụ mma ma obi ruo ya ala,

Ma anyaụfụ dị ka ọrịa nke na-eme ka ọkpụkpụ mmadụ na-ere ure.+

31 Onye na-erigbu onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-akparị Onye kere ya,+

Ma onye na-emetere ogbenye ebere na-eto Onye kere ya.+

32 Ihe ọjọọ onye ajọ omume na-eme ga-eme ka ọ laa n’iyi,

Ma a ga-echebe onye ezi omume maka na ọ kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ.+

33 Onye na-aghọta ihe anaghị ekwu na ya ma ihe,+

Ma onye iberiibe na-akọsa na ya ma ihe.

34 Ezi omume na-eme ka a na-akwanyere obodo ùgwù,+

Ma mmehie na-eme ka ihere na-eme ndị bi na ya.

35 Eze na-enwe mmasị n’ohu ya nke na-aghọta ihe,+

Ma ọ na-ewesa onye na-emechu mmadụ ihu ezigbo iwe.+

15 Mmadụ na-akwụsị iwe iwe ma e wetuo obi* zaa ya okwu,+

Ma okwu ọjọọ* na-akpasu iwe.+

 2 Ndị ma ihe na-ekwu ihe dị mma ha ma,+

Ma ndị iberiibe na-ekwu okwu nzuzu.

 3 Anya Jehova na-ahụ ihe niile.

Ọ na-ahụ ma ndị ọma ma ndị ọjọọ.+

 4 Okwu ọma na-eme ka mmadụ dị ndụ,*+

Ma okwu ọjọọ na-agbawa obi.

 5 Onye nzuzu na-elelị aka ná ntị nna ya na-adọ ya,+

Ma onye ma ihe na-anabata ndụmọdụ.*+

 6 Akụ̀ na-eju n’ụlọ onye ezi omume,

Ma ihe onye ajọ omume na-eme* na-akpatara ya nsogbu.+

 7 Ihe ndị ezi omume na-ekwu na-eme ka ndị mmadụ mụta ihe,+

Ma obi ndị nzuzu adịghị otú ahụ.+

 8 Jehova kpọrọ àjà ndị ajọ omume na-achụ asị,+

Ma ekpere ndị ezi omume na-ekpe na-eme ya obi ụtọ.+

 9 Jehova kpọrọ ihe onye ajọ omume na-eme asị,+

Ma ọ hụrụ onye na-agba mbọ na-eme ezi omume n’anya.+

10 Onye na-achọghị ịnọ n’ezigbo ụzọ na-ewere aka ná ntị a na-adọ ya ka ihe ọjọọ,*+

Ma onye kpọrọ mba a na-abara ya asị ga-anwụ.+

11 Ebe ọ bụ na Jehova na-ahụ ndị nọ n’ili* nakwa ebe ndị mmadụ na-anọ erekasị,*+

O doro anya na ọ na-ahụ ihe dị ndị mmadụ n’obi.+

12 Onye na-akwa mmadụ emo anaghị ahụ onye na-abara ya mba* n’anya.+

Ọ gaghị agakwuru ndị ma ihe ka ha dụọ ya ọdụ.+

13 Ọ bụrụ na obi dị mmadụ mma, ihu na-abụ ya ọchị ọchị,

Ma ike na-agwụ mmadụ ma ọ bụrụ na obi adịghị ya mma.+

14 Onye na-aghọta ihe na-agba mbọ ka ọ mụta ihe,+

Ma ihe juru ndị nzuzu ọnụ bụ okwu iberiibe.+

15 Ụbọchị niile na-abụrụ onye na-ata ahụhụ* nsogbu nsogbu,+

Ma onye obi na-adị mma na-enwe obi ụtọ mgbe niile.+

16 Ọ ka mma mmadụ inwe obere ihe ma ya ana-atụ egwu Jehova+

Kama mmadụ inweju akụnụba ma obi anaghị eru ya ala.*+

17 Ọ ka mma na ndị mmadụ na-eri naanị akwụkwọ nri ma hụ ibe ha n’anya+

Kama ịna-ata anụ ehi gbara agba ma kpọọ ibe ha asị.+

18 Onye na-ewe iwe ọkụ na-akpata esemokwu,+

Ma onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ na-eme ka esemokwu bie.+

19 Ogwu juru n’ụzọ onye umengwụ,*+

Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka okporo ụzọ dị larịị.+

20 Nwa ma ihe na-eme nna ya obi ụtọ,+

Ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.+

21 Nzuzu na-atọ onye na-enweghị uche ụtọ,+

Ma onye na-aghọta ihe na-eso ezigbo ụzọ.+

22 Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu,

Ma a na-arụpụta ezigbo ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.+

23 Mmadụ na-aṅụrị ọṅụ ma ọ zata ajụjụ,+

Okwu e kwuru mgbe kwesịrị ekwesị na-adịkwa ezigbo mma.+

24 Onye na-aghọta ihe na-aga n’ụzọ na-agbago agbago nke na-eduga ná ndụ.+

Ọ naghị abanye n’ụzọ na-agbada agbada nke na-eduga n’ili.*+

25 Jehova ga-akwatu ụlọ ndị dị mpako,+

Ma ọ ga-eme ka a ghara ịkpa ala nwaanyị di ya nwụrụ aka.+

26 Jehova kpọrọ nkata onye ọjọọ na-akpa asị,+

Ma okwu ọma na-adị ya mma.+

27 Onye ji aghụghọ akpa akụ̀ na-akpatara ezinụlọ ya nsogbu,*+

Ma onye kpọrọ ịnara aka azụ asị ga na-adị ndụ.+

28 Onye ezi omume na-atụgharị uche tupu ya azaghachi,*+

Ma ndị ajọ omume na-ekwupụsị okwu ọjọọ.

29 Jehova anaghị abịa ndị ajọ omume nso,

Ma ọ na-anụ ekpere ndị ezi omume.+

30 Ihu ọchị na-eme ka obi dị mmadụ ụtọ.

Akụkọ dị mma na-eme ka mmadụ nwee ume.*+

31 Onye na-anabata mba a na-abara ya

Na-egosi na ọ ma ihe.+

32 Onye ọ bụla nke na-anaghị anabata aka ná ntị a na-adọ ya kpọrọ ndụ ya asị,+

Ma onye ọ bụla nke na-anabata mba a na-abara ya na-aghọta ihe.+

33 Ọ bụrụ na mmadụ na-atụ egwu Jehova, ọ ga-amụta otú ọ ga-esi na-akpa àgwà ka onye ma ihe.+

Mmadụ ga-ebukwa ụzọ dị umeala n’obi tupu a kwanyere ya ùgwù.+

16 Mmadụ na-ahazi ihe dị ya n’obi ọ ga-ekwu,

Ma ọ bụ Jehova na-eme ka ọ mara ihe* ọ ga-aza.+

 2 Ihe niile mmadụ na-eme na-adị mma n’anya ya,*+

Ma Jehova na-enyocha ihe mmadụ bu n’obi.+

 3 Tinye ihe ọ bụla ị na-eme n’aka Jehova,+

Ihe ndị ị chọrọ ime ga-agakwa nke ọma.

 4 Jehova na-eme ka ihe niile mezuo nzube ya,

Ka e wee bibie ndị ajọ omume n’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ha.+

 5 Jehova kpọrọ onye ọ bụla dị mpako asị.+

Ka obi sie gị ike na a ga-atarịrị ya ahụhụ.

 6 Ịhụnanya na eziokwu na-eme ka a gbaghara mmehie,+

Ịtụ egwu Jehova na-emekwa ka mmadụ kwụsị ime ihe ọjọọ.+

 7 Ọ bụrụ na ihe mmadụ na-eme dị Jehova mma,

Ọ na-emedị ka onye ahụ na ndị iro ya dịrị ná

mma.+

 8 Ọ ka mma mmadụ inwe obere ihe ma bụrụ onye ezi omume+

Kama mmadụ ịkpataju akụ̀ ma ya abụrụ na ọ naghị akwụwa aka ọtọ.+

 9 Mmadụ nwere ike ichepụta ihe ọ ga-eme,

Ma ọ bụ Jehova na-eduzi nzọụkwụ ya.+

10 Eze kwesịrị ịna-ekwu ihe Chineke kpebiri.+

O kwesịghị ikpe ikpe na-ezighị ezi.+

11 Ọ bụ Jehova nwe ihe dị iche iche zuru ezu e ji atụ̀ ihe.

Ọ bụ ya mere ka e nwee ihe niile e ji atụ̀ otú ihe dịruru arọ.+

12 Ndị eze kpọrọ ajọ omume asị,+

N’ihi na ọ bụ ezi omume na-eme ka ọchịchị* kwụsie ike.+

13 Obi na-atọ ndị eze ụtọ ma mmadụ kwuo ihe dị mma.

Ha hụrụ onye na-ekwu eziokwu n’anya.+

14 Iwe eze nwere ike ime ka e gbuo mmadụ,+

Ma onye ma ihe na-eme ka iwe eze dajụọ.*+

15 Onye eze lere anya ọma ga-adị ndụ.

Amara ya dị ka mmiri na-ezo n’ụla mmiri.+

16 Ọ kacha mma ka mmadụ nweta amamihe kama inweta ọlaedo.+

Ọ ka mma ka mmadụ họrọ ịghọta ihe kama ịhọrọ ọlaọcha.+

17 Ndị ezi omume anaghị etinye aka n’ihe ọjọọ.

Onye ọ bụla nke na-echebara otú o si ebi ndụ echiche na-echebe ndụ* ya.+

18 Nganga na-ala mmadụ n’iyi,

Mpako na-emekwa ka mmadụ daa.+

19 Ọ ka mma na mmadụ wedara onwe ya ala soro ndị dị umeala n’obi nọrọ+

Kama mmadụ iso ndị mpako kee ihe ha kwatara.

20 Ihe ga-agaziri mmadụ ma ọ bụrụ na e nwee okwu pụtaranụ, ya akpaa àgwà gosiri na ọ na-aghọta ihe,

Onye tụkwasịrị Jehova obi na-enwekwa obi ụtọ.

21 A ga-ewere onye ma ihe ka onye na-aghọta ihe.+

Onye na-ekwu okwu ọma na-ekwu ihe* na-eru mmadụ n’obi.+

22 Ịghọta ihe na-eme ka mmadụ dị ndụ,

Ma ahụhụ ndị nzuzu na-ata bụ na ha ga na-ezuzu nzuzu.

23 Onye ma ihe na-echebara ihe ọ na-ekwu echiche nke ọma,+

Ọ na-ekwukwa okwu otú ga-eru mmadụ n’obi.

24 Okwu ọma dị ka ezigbo mmanụ aṅụ.

Ọ na-atọ ụtọ, na-agwọkwa mmadụ.*+

25 E nwere ihe na-adị mma n’anya mmadụ,

Ma ọ na-emecha butere mmadụ ọnwụ.+

26 Agụụ nke na-agụ* onye ọrụ na-eme ka ọ rụrụ ọrụ na-aga,

N’ihi na ọ na-arụsi ọrụ ike ka o nweta ihe ọ ga-eri.+

27 Onye nzuzu na-akpa nkata ọjọọ.+

Okwu ya na-erekwa ka ọkụ nke na-enwusi ike.+

28 Onye okwu na ụka* na-akpata esemokwu,+

Onye asịrị na-ekewakwa ndị bụ́ ezigbo enyi.+

29 Onye tigbuo zọgbuo na-arata onye agbata obi ya

Ma duba ya n’ụzọ ọjọọ.

30 Ọ na-atabi anya ya mgbe ọ na-akpa nkata ọjọọ.

Ọ na-atagide egbugbere ọnụ ya ezé ma ọ rụwa arụrụala o chepụtara.

31 Isi awọ́ bụ okpueze mara mma*+

Ma ọ bụrụ na onye nwere ya na-ebi ndụ dị mma.+

32 Onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ+ ka dike mma,

Onye na-ejide onwe ya ma iwe wewe ya kakwa onye meriri obodo mma.+

33 Mmadụ na-efe nza,*+

Ma ọ bụ Jehova na-ekpebi ihe niile a na-efeta na nza.+

17 Ọ ka mma na mmadụ na-ata ibé achịcha kpọrọ nkụ n’ebe udo dị+

Kama ịnọ na-eri oriri n’ụlọ ebe a na-ese okwu.+

 2 Ohu nke na-aghọta ihe ga-achị nwa na-emechu mmadụ ihu.

Ohu ahụ ga-eso ụmụ nna ya ukwu keta akụ̀ ka à ga-asị na ọ bụ nwanne ha.

 3 A na-eji ite na ọkụ anụcha ọlaọcha na ọlaedo,+

Ma, ọ bụ Jehova na-enyocha obi.+

 4 Onye ọjọọ na-ege okwu ọjọọ,

Onye aghụghọ na-egekwa asịrị.+

 5 Onye na-akwa ogbenye emo na-akparị Onye kere ya,+

A ga-atakwa onye ọ bụla na-aṅụrị ọṅụ maka ọdachi dakwasịrị onye ọzọ ahụhụ.+

 6 Okpueze ndị agadi bụ ụmụ ụmụ ha,

A na-akwanyekwara ụmụ ùgwù n’ihi nna* ha.

 7 A naghị atụ anya na onye nzuzu ga-ekwu okwu dị mma,+

Onye ọchịchị* ekwesịghịkwa ịna-agha ụgha.+

 8 Onye na-enye onyinye na-ewere onyinye ya ka nkume dị oké ọnụ.*+

Ebe ọ bụla ọ gara, onyinye ya na-eme ka ihe gaziere ya.+

 9 Onye na-agbaghara* ihe ọjọọ e mere ya na-egosi na ọ hụrụ ndị ọzọ

n’anya,+

Ma onye na-ekwukarị gbasara ihe ọjọọ e mere ya na-ekewa ndị bụ́ ezigbo enyi.+

10 Mba a baara onye na-aghọta ihe na-abara ya ezigbo uru+

Karịa ihe a pịara onye iberiibe ugboro otu narị.+

11 Onye ọjọọ na-enupụ isi mgbe niile,

Ma a ga-eziga onye ozi obi tara mmiri ka ọ taa ya ahụhụ.+

12 Ọ kaara mmadụ mma na ya na anụ ọhịa bea a napụrụ ụmụ ya zutere

Kama ọ ga-ezute onye nzuzu mgbe ọ na-eme iberiibe.+

13 Ọ bụrụ na mmadụ na-eji ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọma,

Ihe ọjọọ agaghị apụ apụ n’ụlọ ya.+

14 Ịmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere idei mmiri ụzọ.

Tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.+

15 Jehova kpọrọ onye na-ekwu na ikpe amaghị onye ajọ omume asị,+

Kpọọkwa onye na-ekwu na ikpe mara onye ezi omume asị.

16 Ọ bụrụ na onye nzuzu achọghị ịma ihe,

È nwere uru ọ bara na ọ ma ihe ọ ga-eme ka ọ mara ihe?+

17 Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya.+

Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.+

18 Onye na-enweghị uche na-anọ n’ihu onye agbata obi ya kwe nkwa* ma kweta

Na ya ga-ana onye ọzọ n’ibé.+

19 Onye hụrụ esemokwu n’anya hụrụ mmehie n’anya.+

Onye ọ bụla nke na-eme ka ọnụ ụzọ ụlọ ya dị elu ga-ada.+

20 Ihe agaghị agaziri onye obi ya jọrọ njọ,*+

Onye na-aghọgbu ndị ọzọ ga-alakwa n’iyi.

21 Onye ọ bụla bụ́ nna nwa nzuzu ga na-eru uju.

Nna nwa na-enweghị uche anaghịkwa enwe obi ụtọ.+

22 Obi ụtọ bụ ezigbo ọgwụ nke na-agwọ mmadụ ọrịa,+

Ma obi ọjọọ na-eme ka ike na-agwụ mmadụ.*+

23 Onye ajọ omume ga-anara aka azụ* na nzuzo,

Ka o wee mee ka a ghara ikpe ikpe ziri ezi.+

24 Onye na-aghọta ihe na-agbalịsi ike ka ọ mara ihe,

Ma anya onye nzuzu anaghị adị otu ebe.+

25 Nwa nzuzu na-eme ka nna ya na-eru uju,

Ọ na-emekwa ka obi gbawaa nne ya.+

26 Ịta onye ezi omume ahụhụ* adịghị mma,

Ịpịa onye a na-akwanyere ùgwù ihe adịghịkwa mma.

27 Onye ma ihe anaghị ekwu ọtụtụ okwu,+

Onye na-aghọta ihe na-anọkwa jụụ.+

28 A ga-eweredị onye nzuzu nke gbachiri nkịtị ka onye ma ihe,

Werekwa onye na-ejide ọnụ ya aka ka onye na-aghọta ihe.

18 Onye na-anọ* iche na-achọ ihe ga-abara naanị ya uru.

Ọ naghị anabata ezigbo amamihe.*

 2 Onye nzuzu anaghị achọ ịghọta ihe.

Ọ bụ naanị ihe dị ya n’obi ka ọ na-achọ ikwu.+

 3 Onye ajọ omume bata, a na-eleda mmadụ anya.

Mmadụ mewe iberiibe, a na-emenye ya ihere.+

 4 Okwu na-esi mmadụ n’ọnụ apụta yiri mmiri miri emi.+

Ebe e si enweta amamihe dị ka iyi nke na-asọ asọ.

 5 Imenyere onye ajọ omume adịghị mma,+

Ikpe onye ezi omume ikpe na-ezighị ezi adịghịkwa mma.+

 6 Ihe onye nzuzu na-ekwu na-akpata esemokwu,+

Ọ na-ejikwa ọnụ ya ekwu ihe ga-eme ka e tie ya ihe.+

 7 Ihe onye nzuzu na-ekwu ga-ala ya n’iyi,+

Ọ na-ejikwa ọnụ ya ekwute ihe nwere ike ịta isi ya.*

 8 Okwu onye na-ekwutọ mmadụ dị ka nri na-atọ ụtọ.+

A na-elo ya ngwa ngwa, ya abanye n’afọ.+

 9 Onye ọ bụla nke dị umengwụ n’ọrụ ọ na-arụ

Na onye na-ala ihe n’iyi bụ nwanne.+

10 Aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike.+

Onye ezi omume na-agbaba na ya, e chebe ya.+

11 Akụ̀ onye ọgaranya bụụrụ ya obodo a rụsiri ike.

N’anya ya, ọ dị ka mgbidi nke na-echebe ya.+

12 Mmadụ na-ebu ụzọ adị mpako tupu ya adaa,+

Mmadụ na-ebukwa ụzọ adị umeala n’obi tupu a kwanyere ya ùgwù.+

13 Ọ bụrụ na mmadụ azaa okwu tupu ya anụ ihe merenụ,

Ọ na-egosi na ọ dị iberiibe, na-emechukwa onwe ya ihu.+

14 Mmadụ ga-edili ọrịa ma ọ bụrụ na obi siri ya ike,+

Ma è nwere ihe mmadụ ga-emeli ma ọ bụrụ na obi dara ya mbà?+

15 Onye na-aghọta ihe na-amụta ihe,+

Ndị ma ihe na-egekwa ntị ka ha mụta ihe.

16 Onyinye mmadụ na-enye na-emeghere ya ụzọ,+

Ọ na-emekwa ka ọ bịa n’ihu ndị ukwu.

17 Mmadụ na ibe ya nwee okwu, ọ na-adị ka ọ̀ bụ onye bu ụzọ kwuo ihe na-ese na-ekwu eziokwu+

Ruo mgbe onye nke ọzọ bịara gbaa ya ajụjụ.+

18 Ife nza na-eme ka esemokwu bie,+

Ọ na-edozikwara dike na dike okwu.

19 Ọ na-esi ezigbo ike ime ka obi jụrụ nwanne e mejọrọ karịa otú ọ na-esi ike imeri obodo a rụsiri ike.+

Esemokwu na-ekewakwa ndị mmadụ otú ọnụ ụzọ ámá a tụchiri atụchi n’obodo a rụsiri ike si ekewa ndị nọ n’ime ya na ndị nọ n’èzí.+

20 Ihe mmadụ na-ekwu dị ka nri na-abanye ya n’afọ.+

Ihe ọ bụla ọ na-ekwu ga-adị ya n’isi.

21 Mmadụ nwere ike iji ire ya kwutere onwe ya ndụ ma ọ bụ ọnwụ.+

Ndị ọ na-amasị ikwu okwu ga-anata ụgwọ ihe ha kwuru.+

22 Onye lụtara ezigbo nwaanyị nwetara ezigbo ihe,+

Jehova na-emekwara ya amara.+

23 Onye dara ogbenye na-arịọ arịrịọ ma o kwuwe okwu,

Ma onye bara ọgaranya na-eji olu ike asa okwu.

24 E nwere ndị enyi dị njikere ịla ibe ha n’iyi,+

Ma e nwere enyi hụrụ enyi ya n’anya karịa nwanne ya.+

19 Ọ ka mma mmadụ ịda ogbenye ma na-eme ihe dị mma+

Kama mmadụ ga-abụ onye nzuzu na onye ụgha.+

 2 Ọ dịghị mma mmadụ ịnọ n’amaghị ihe,+

Onye na-emekwa ihe n’echeghị echiche na-eme mmehie.

 3 Ọ bụ nzuzu mmadụ na-ezuzu na-eme ka ọ na-eme ihe na-adịghị mma,

Ya ewesawazie Jehova oké iwe.

 4 Akụnụba na-eme ka mmadụ nwee ọtụtụ ndị enyi,

Ma ndị mmadụ ga-agbara ogbenye ọsọ, enyi ya ga-agbadịrị ya ọsọ.+

 5 A ga-atarịrị onye akaebe nke na-anaghị ekwu eziokwu ahụhụ,+

A ga-atakwa onye ụgha juru ọnụ ahụhụ.+

 6 Ọtụtụ ndị na-achọ ka ha na onye a ma ama* dịrị ná mma,

Mmadụ niile na-emetakwa onye na-enye onyinye enyi.

 7 Ndị niile bụ́ ụmụnne onye dara ogbenye kpọrọ ya asị.+

Ndị enyi ya na-agbadịrị ya ọsọ.+

Ọ na-arịọ ha arịrịọ, ma e nweghị onye na-atụpụrụ ya ọnụ.

 8 Onye na-agbalị ka ọ mara ihe* ji ndụ ya kpọrọ ihe.+

Ihe ga-agaziri onye ọ bụla na-agbalị ka ọ ghọta ihe.+

 9 A ga-atarịrị onye akaebe nke na-anaghị ekwu eziokwu ahụhụ,

Onye ụgha juru ọnụ ga-alakwa n’iyi.+

10 Ọ dịghị mma ka onye nzuzu baa ọgaranya,

Ọ dịghịkwa mma ka ohu chịwa ndị isi.+

11 Ọ bụrụ na mmadụ aghọta ihe, ọ gaghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+

A ga-ajakwa ya mma ma o leghara ihe ọjọọ e mere ya anya.+

12 Eze wee iwe, iwe ya na-adị ka ebe ọdụm na-agbọ ụja,+

Ma amara ya na-adị ka igirigi nke dara n’elu ahịhịa.

13 Nwa nzuzu na-akpatara nna ya nsogbu.+

Nwaanyị nke na-esekarị okwu yiri elu ụlọ nke na-ehi mmiri mgbe niile.+

14 Ihe ụmụ na-eketa n’aka nna ha bụ ụlọ na akụ̀,

Ma ọ bụ Jehova na-enye mmadụ nwunye nwere uche.+

15 Umengwụ na-eme ka mmadụ na-ehi oké ụra,

Onye umengwụ ga-anọkwa agụụ.+

16 Onye na-edebe iwu ga-adị ndụ.+

Onye na-anaghị echebara otú o si ebi ndụ echiche ga-anwụ.+

17 Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe ọma na-agbazinye Jehova ihe,+

Ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe ọ na-eme.+

18 Dọọ nwa gị aka ná ntị mgbe olileanya ka dị,+

Ekwekwala ka ọ bụrụ gị ga-akpatara ya ọnwụ.+

19 Onye na-ewe iwe ọkụ ga-ata ahụhụ iwe ọkụ ya.

Ọ bụrụ na ị gbalịa napụta ya, ị ka ga-eme ya ugboro ugboro.+

20 Nụrụ ndụmọdụ, nabatakwa aka ná ntị a na-adọ gị,+

Ka i wee mara ihe n’ọdịnihu.+

21 Mmadụ na-eme ọtụtụ atụmatụ,

Ma ọ bụ uche* Jehova ga-eme.+

22 Ọ bụ ịhụ ndị ọzọ n’anya na-eme ka mmadụ bụrụ ezigbo mmadụ.+

Ọ ka mma na mmadụ bụ ogbenye karịa na mmadụ bụ onye ụgha.

23 Ịtụ egwu Jehova na-eme ka mmadụ dị ndụ.+

Obi ga-eru onye na-atụ egwu ya ala, e nweghịkwa ihe ọ bụla ga-eme ya.+

24 Onye umengwụ na-amanye aka n’efere nri,

Ma ike iwere nri tinye n’ọnụ ya adịghịdị ya.+

25 Tie onye na-akwa emo ihe+ ka onye na-amaghị ihe mara ihe,+

Baakwara onye na-aghọta ihe mba ka ọ mụtakwuo ihe.+

26 Nwa nke na-emesi nna ya ike, nke na-achụpụkwa nne ya,

Na-emenye mmadụ ihere, na-emechukwa mmadụ ihu.+

27 Nwa m, ọ bụrụ na ị kwụsị ịnabata aka ná ntị a na-adọ gị,

Ọ ga-eme ka ị kwụsị ime ihe ndị dị mma ị mụtara.

28 Onye akaebe na-anaghị ekwu eziokwu ejighị ikpe ziri ezi kpọrọ ihe,+

Ime ihe ọjọọ na-atọkwa ndị ajọ omume ụtọ ka nri.+

29 A ga-ekpe ndị na-akwa emo ikpe,+

A ga na-etikwa ndị nzuzu ihe n’azụ.+

20 Mmanya na-eme ka mmadụ na-eme ihe a ga-eji na-achị ya ọchị,*+ mmanya na-emekwa ka mmadụ ghara ịna-ejide onwe ya.+

Onye ọ bụla o mere ka ọ kpafuo amaghị ihe.+

 2 Ndị mmadụ na-atụ eze egwu otú ha si atụ egwu ma ọdụm gbọwa ụja.+

Onye ọ bụla nke na-akpasu eze iwe na-akpọ ọnwụ òkù.+

 3 Ọ bụrụ na mmadụ na-agbara esemokwu ọsọ, a ga na-akwanyere ya ùgwù,+

Ma onye ọ bụla bụ́ onye nzuzu na-esekarị okwu.+

 4 Onye umengwụ anaghị akọ ihe n’oge oyi.

N’ihi ya, ọ ga na-arịọ arịrịọ n’oge a na-ewe ihe ubi, mgbe ọ na-enweghị ihe ọ bụla.*+

 5 Ihe mmadụ na-eche n’obi ya dị ka mmiri miri emi,

Ma onye na-aghọta ihe ga-esepụta ya.

 6 Ọtụtụ ndị na-ekwu na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya,*

Ma o siri ike ịhụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi n’eziokwu.

 7 Onye ezi omume na-akwụwa aka ọtọ.+

Ụmụ ya, bụ́ ndị ga-anọchi ya, ga-enwe obi ụtọ.+

 8 Mgbe eze nọdụrụ ala n’ocheeze ka o kpee ikpe,+

Ọ na-eleru anya ala chọpụta ihe ọjọọ niile.+

 9 Ònye ga-ekwu, sị: “Emeela m ka obi m dị ọcha.+

Abụghịzi m onye mmehie”?+

10 Jehova kpọrọ ihe na-ezughị ezu e ji atụ̀ ihe

Na ụdị nkume abụọ e ji atụ̀ ihe asị.+

11 Ọ bụ ihe nwatakịrị na-eme ka e ji ama

Ma ọ̀ na-akpa ezigbo àgwà ma na-eme ihe dị mma.+

12 Ọ bụ Jehova kere

Ntị e ji anụ ihe na anya e ji ahụ ụzọ.+

13 Anọla na-ehi naanị ụra, ka i wee ghara ịda ogbenye.+

Meghee anya gị, ị ga-erijukwa nri afọ.+

14 Onye na-azụ ihe na-ekwu, sị: “Ọ dịghị mma, ọ dịghị mma.”

Ma ọ na-ala, gaa nyawa isi.+

15 Mmadụ nwere ike inwe ọlaedo ma ọ bụ nwee ọtụtụ nkume kọral,*

Ma onye na-ekwu okwu otú gosiri na ọ ma ihe bara uru karịa.+

16 Chịrị uwe mmadụ ma ọ bụrụ na ọ nara onye ọ na-amaghị n’ibé.+

Nara ya ihe ibé ma ọ bụrụ nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ* ka ọ nara n’ibé.+

17 Nri e ji aghụghọ nweta na-atọ mmadụ ụtọ,

Ma e mechaa, ájá* ga-eju ya ọnụ.+

18 Atụmatụ na-aga nke ọma ma a gbaa izu.+

Soro ezigbo ntụziaka mgbe ị na-alụ agha.+

19 Onye na-ekwutọ mmadụ na-agagharị na-akọsa ihe a na-achọghị ka ndị ọzọ mara.+

Gị na onye asịrị na-atọ ụtọ* akpala.

20 Onye ọ bụla nke na-akpọ nne ya na nna ya iyi,

Ọkụ* ya ga-anyụ ma ọchịchịrị gbaa.+

21 Ọ bụrụ na mmadụ ji anyaukwu nweta ihe,*

Ọ gaghị enwe obi ụtọ* n’ikpeazụ.+

22 Asịla: “M ga-emegwara ihe ọjọọ e mere m.”+

Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ,+ ọ ga-azọpụta gị.+

23 Jehova kpọrọ ihe na-ezughị ezu e ji atụ̀ ihe* asị.

Ihe e ji atụ̀ ihe nke e ji aghọgbu mmadụ adịghị mma.

24 Ọ bụ Jehova na-eduzi nzọụkwụ mmadụ.+

Ndị mmadụ hà ga-aghọtali ụzọ ha?*

25 Mmadụ na-esiri onwe ya ọnyà ma ọ bụrụ na o kwe Chineke nkwa n’echeghị echiche,*+

Mechazie chebawara nkwa o kwere echiche.+

26 Eze ma ihe na-ewepụ ndị ajọ omume+

Otú e si ewepụ mkpo ọka n’ọka.*+

27 Ihe mmadụ na-ekwu* yiri mpanaka* Jehova,

Nke na-eme ka a mata ihe dị n’ime ime obi mmadụ.

28 Ịhụnanya na eziokwu na-echebe eze.+

Ịhụnanya na-eme ka ọ chịrị na-aga.+

29 Mma ụmụ okorobịa bụ ike ha.+

Mma ndị agadi bụ isi awọ́ ha.+

30 Ịta mmadụ ahụhụ* na-eme ka a kwụsị ime ihe ọjọọ,+

Ịdọ mmadụ aka ná ntị* na-emekwa ka ime ime obi mmadụ dị ọcha.

21 Obi eze dị ka iyi n’aka Jehova.+

Ọ na-eme ka ọ gaa ebe ọ bụla ọ chọrọ.+

 2 Ihe niile mmadụ na-eme na-adị mma n’anya ya,*+

Ma Jehova na-enyocha obi.*+

 3 Ime ihe dị mma na ihe ziri ezi

Na-amasị Jehova karịa ịchụ àjà.+

 4 Mpako na nganga*

Dị ka ọkụ* ndị ajọ omume ji ahụ ụzọ, ha bụkwa mmehie.+

 5 Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya,*+

Ma ndị niile ọ na-adị ngwa ngwa na-ada ogbenye.+

 6 Akụ̀ a ghara ụgha kpata

Dị ka alụlụụ na-anaghị anọte aka, dịrịkwa ka ọnyà nke nwere ike igbu mmadụ.*+

 7 Ike ndị ajọ omume na-akpa ga-ala ha n’iyi,+

Maka na ha jụrụ ime ihe ziri ezi.

 8 Ihe onye ikpe mara na-eme rụrụ arụ,

Ma onye aka ya dị ọcha na-eme ihe ziri ezi.+

 9 Ọ ka mma na mmadụ gara biri n’otu akụkụ elu ụlọ

Kama ya na nwaanyị na-esekarị okwu ibi n’otu ụlọ.+

10 Ihe ọjọọ na-agụsi onye ajọ omume agụụ ike.+

Ọ naghị emetere onye agbata obi ya ebere.+

11 A taa onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-amaghị ihe amara ihe.

Onye ma ihe ghọtakwuo ihe, ọ na-amụta ihe.*+

12 Chineke bụ́ Onye Ezi Omume na-ahụ ụlọ onye ajọ omume.

Ọ na-eme ka ọdachi dakwasị ndị ajọ omume.+

13 Onye ọ bụla nke na-emechi ntị ya ka ọ ghara ịnụ ákwá onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-ebe

Ga-akpọ òkù ma a gaghị aza ya.+

14 Onyinye a naara na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ,+

Aka azụ a naara na nzuzo na-emekwa ka ọnụma dajụọ.

15 Ime ihe ziri ezi na-eme onye ezi omume obi ụtọ,+

Ma ndị ajọ omume kpọrọ ihe ziri ezi asị.

16 Onye ọ bụla nke kwụsịrị ịghọta ihe

Ga-anwụ.+

17 Onye oriri na nkwari na-amasịkarị ga-ada ogbenye.+

Onye na-anaghị eji anya ahụ mmanya na mmanụ agaghị aba ọgaranya.

18 A na-eji onye ajọ omume agbapụta onye ezi omume,

A ga-akpụrụkwa onye aghụghọ kama ịkpụrụ onye ezi omume.+

19 Ọ ka mma na mmadụ bi n’ala ịkpa

Kama ya na nwaanyị na-esekarị okwu, nke na-ewekwa iwe ọsọ ọsọ, ga-ebi.+

20 Akụ̀ dị oké ọnụ na mmanụ na-adị n’ụlọ onye ma ihe,+

Ma onye nzuzu ga-emefucha* ihe o nwere.+

21 Onye na-agbalị ime ezi omume ma na-ahụ ndị ọzọ n’anya

Ga-adị ndụ. Ọ ga-abụ onye ezi omume, a ga na-akwanyekwara ya ùgwù.+

22 Onye ma ihe nwere ike ịrị mgbidi obodo ndị dike

Ma bata n’obodo ha kwatuo ebe a rụsiri ike nke ha tụkwasịrị obi.+

23 Onye na-eche ọnụ ya na ire ya nche

Na-agbara nsogbu ọsọ.+

24 A na-asị na mmadụ dị mpako nakwa na ọ na-etu ọnụ

Ma ọ bụrụ na ọ naghị eche echiche eme ihe maka na onwe ya na-ebu ya isi.+

25 Ihe na-agụ onye umengwụ agụụ ga-egbu ya

N’ihi na ọ chọghị ịrụ ọrụ.+

26 Anyaukwu na-eme ka ihe ọ na-eche mgbe niile bụrụ ihe ọ ga-enwetakwu,

Ma onye ezi omume na-enye ndị mmadụ ihe, e nweghịkwa ihe ọ na-ajụ inye.+

27 Chineke kpọrọ àjà ndị ajọ omume asị,+

Ma ya fọdụzie mgbe ha bu ihe ọjọọ n’obi na-achụ ya.*

28 Onye akaebe nke na-anaghị ekwu eziokwu ga-ala n’iyi,+

Ma a ga-anabata akaebe onye na-ege ntị nke ọma gbara.

29 Ihere anaghị eme onye ajọ omume,+

Ma onye ezi omume na-ahọrọ ụzọ dị mma ọ ga-eso.+

30 E nweghị amamihe ma ọ bụ nghọta ma ọ bụ ndụmọdụ ọ bụla ga-aghasali nzube Jehova.+

31 A na-akwadebe ịnyịnya maka ụbọchị agha,+

Ma, ọ bụ Jehova na-azọpụta mmadụ.+

22 Ọ ka mma inwe ezigbo aha kama inweju akụnụba.+

Ọ ka mma ịbụ onye a na-akwanyere ùgwù kama inwe ọlaọcha na ọlaedo.

 2 Ihe jikọrọ ọgaranya na ogbenye bụ na

Ọ bụ Jehova kere ha abụọ.+

 3 Onye ma ihe hụ nsogbu, ọ na-aga zoo,

Ma ndị na-amaghị ihe na-agara banye ná nsogbu, ha na-atakwa ahụhụ ya.

 4 Ịdị umeala n’obi na ịtụ egwu Jehova

Na-eme ka mmadụ baa ọgaranya, dịrị ndụ ma bụrụ onye a na-akwanyere ùgwù.+

 5 Ogwu na ọnyà dị n’ụzọ onye aghụghọ,

Ma onye ọ bụla ji ndụ ya kpọrọ ihe anaghị aga ha nso.+

 6 Zụọ nwata ka o soro ụzọ o kwesịrị iso.+

Ọ bụrụgodị na o mee okenye, ọ gaghị ahapụ ụzọ ahụ.+

 7 Ọgaranya na-achị ogbenye,

Onye gbazitere ihe bụkwa ohu onye gbazinyere ya ihe.+

 8 Onye na-akụ ajọ omume ka mkpụrụ ga-aghọrọ nsogbu,+

A ga-emekwa ka ike ọ na-akpa* kwụsị.+

 9 A ga-agọzi onye na-emesapụ aka

Maka na ọ na-enyetụ ogbenye nri.+

10 Chụpụ onye na-akwa mmadụ emo

Ka okwu na ụka bie.

Esemokwu na mkparị ga-akwụsịkwa.

11 Onye obi ya dị ọcha, nke na-ekwukwa okwu ọma,

Ga-abụ enyi eze.+

12 Jehova na-echebe onye ma ihe,

Ma ọ naghị ege ntị n’okwu ndị aghụghọ.+

13 Onye umengwụ na-asị: “Ọdụm nọ n’èzí!

Ọ ga-adọgbu m n’ámá obodo!”+

14 Ọnụ ụmụ nwaanyị ndị rụrụ arụ* dị ka olulu miri emi.+

Onye Jehova mara ikpe ga-adaba na ya.

15 Ụmụaka na-ezuzu nzuzu,+

Ma ha ga-akwụsị izuzu nzuzu ma e jiri ụtarị dọọ ha aka ná ntị.+

16 Onye na-erigbu ogbenye ka o wee bakwuo ọgaranya+

Nakwa onye na-enye ọgaranya onyinye

Ga-ada ogbenye.

17 Tọọ ntị n’ala nụrụ, geekwa ntị n’ihe onye ma ihe na-ekwu,+

Ka i wee jiri obi gị nabata ihe m na-akụzi,+

18 N’ihi na ọ dị mma ka i mee ka ha bamie gị n’ime ime obi,+

Ka i wee na-ekwu gbasara ha mgbe niile.+

19 M na-eme ka ị mụta ihe taa,

Ka i wee tụkwasị Jehova obi.

20 E nwere ihe ndị m dere nye gị,

Bụ́ ndị m ji dụọ gị ọdụ ma mee ka ị mụta ihe,

21 Ka m wee kụziere gị eziokwu,

Ka i wee laghachi kọọrọ onye zitere gị ihe ndị bụ́ eziokwu.

22 Apụnarala ogbenye ihe ya maka na ọ dara ogbenye,+

Emegbukwala ogbenye n’ọnụ ụzọ ámá obodo,+

23 N’ihi na Jehova ga-ekpechitere ha ọnụ ha,+

Ọ ga-egbukwa ndị na-erigbu ha.

24 Gị na onye na-ewe iwe ọkụ akpala,

Gị na onye na-ewekarị iwe emekọkwala ihe,

25 Ka ị ghara ịmụta àgwà ya

Wee tinye onwe gị ná nsogbu.+

26 Esola ná ndị na-ekweta* na ha ga-ana onye ọzọ n’ibé,

Ndị na-ekwe nkwa na ha ga-akwụ ego onye ọzọ bitere.+

27 Ọ bụrụ na i nweghị ihe ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ,

A ga-eburu àkwà* i dina na ya.

28 Ewelala ihe e ji kpaa ókè n’ala unu n’oge ochie azụ,

Bụ́ ókè nna nna gị hà kpara.+

29 Ọ bụrụ na mmadụ ma ọrụ ya nke ọma,

Ọ ga-eguzo n’ihu ndị eze.+

Ọ gaghị eguzo n’ihu ndị nkịtị.

23 Ị nọdụ ala ka gị na eze rie ihe,

Chebara ihe ị ga-eme echiche nke ọma.

 2 Ọ bụrụ na ị na-eri oké nri,

Jide akpịrị gị aka.*

 3 Ekwela ka nri ya a kwọrọ aka sie gụọ gị agụụ,

Ka o wee ghara ịbụrụ gị ọnyà.

 4 Adọgbula onwe gị n’ọrụ ka ị kpata akụ̀.+

Kwụsị ime otú ahụ, kama gosi na ị na-aghọta ihe.*

 5 I lee ya anya, ị ga-ahụ na ọ dịghịzi+

N’ihi na ọ ga-epu nku ka ugo fega na mbara igwe.+

 6 Erila nri onye aka ntagide.

Ekwela ka nri ya a kwọrọ aka sie gụọ gị agụụ,

 7 N’ihi na ọ na-agbakọ ihe niile ị na-eri.

Ọ na-asị gị, “Rie nri, ṅụọkwa mmanya,” ma o sighị ya n’obi.

 8 Ị ga-agbọ nri i riri,

Ekele niile i kelere ya ga-alakwa n’iyi.

 9 Agwala onye nzuzu okwu,+

N’ihi na ọ gaghị eji okwu bara uru ị gwara ya kpọrọ ihe.+

10 Ewelala ihe e ji kpaa ókè n’ala unu n’oge ochie azụ,+

Abanyekwala n’ubi ụmụ na-enweghị nna.

11 N’ihi na Onye na-agbachitere* ha siri ike.

Ọ ga-ekpechite ọnụ ha ma mesie gị ike.+

12 Jiri obi gị nabata aka ná ntị m na-adọ gị,

Geekwa ntị n’okwu onye ma ihe na-ekwu.

13 Ahapụla ịdọ nwatakịrị aka ná ntị.+

Ọ bụrụ na ị pịa ya ụtarị, ọ gaghị anwụ.

14 I kwesịrị ịpịa ya ụtarị

Ka ị zọọ ya ndụ.*

15 Nwa m, ọ bụrụ na ị mara ihe,

Obi ga-adị m ụtọ.+

16 M ga-aṅụrị ọṅụ n’ime ime obi m*

Mgbe i ji ọnụ gị na-ekwu ihe dị mma.

17 Enwerela ndị mmehie anyaụfụ n’ime obi gị.+

Kama, na-atụ egwu Jehova mgbe niile.+

18 I mee otú ahụ, ihe ga-adịrị gị mma n’ọdịnihu,+

Ihe ndị ị na-atụ anya ha ga-emekwara gị.

19 Nwa m, gee ntị ka i wee mara ihe,

Duziekwa obi gị ka i wee na-eme ihe dị mma.

20 Esola ná ndị na-aṅụ oké mmanya,+

Esokwala ná ndị na-atafe anụ ókè,+

21 N’ihi na onye aṅụrụma na onye na-eri oké nri ga-ada ogbenye,+

Ụra ha na-ehi ga-eyiwekwa ha nkịrịka ákwà.

22 Gee nna mụrụ gị ntị,

Eledakwala nne gị anya maka na o meela agadi.+

23 Zụta eziokwu, erekwala ya,+

Zụtakwa amamihe na ndụmọdụ* na nghọta.+

24 Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ.

Onye ọ bụla bụ́ nna onye ma ihe ga-enwekwa obi ụtọ n’ihi nwa ya.

25 Nne gị na nna gị ga-aṅụrị ọṅụ,

Nwaanyị mụrụ gị ga-enwekwa obi ụtọ.

26 Nwa m, mee ka obi gị dịrị n’ebe m nọ,

Ka ime ihe ndị m kwuru na-atọkwa gị ụtọ.+

27 N’ihi na nwaanyị akwụna dị ka olulu miri emi,

Nwaanyị na-akwa iko* dịkwa ka olulu mmiri dị warara.+

28 Ọ na-echechi mmadụ n’ụzọ ka onye ohi.+

Ọ na-eme ka ụmụ nwoke ndị na-eme ihe ọjọọ na-adịkwu ọtụtụ.

29 Ònye na-ata ahụhụ? Ònye ka ahụ́ na-anaghị eru ala?

Ònye na-ese okwu? Ònye na-ekpesa mkpesa?

Ònye ka ọnyá juru ahụ́ mgbe a na-etighị ya ihe? Ònye ka anya ya na-ahụ inyoghi inyoghi?

30 Ọ bụ ndị na-aṅụte mmanya aka.+

Ndị na-achọ ebe mmanya a gwara agwa dị.

31 Ekwela ka otú mmanya si acha ọbara ọbara masị gị,

Ekwekwala ka otú o si egbuke egbuke n’iko na otú o si eji nwayọọ agbada n’akpịrị masị gị.

32 N’ihi na n’ikpeazụ, ọ na-ata ka agwọ,

Ọ na-atanyekwa mmadụ elò ka ajụala.

33 Anya gị ga na-ahụ ihe na-enweghị isi na ọdụ,

Obi gị ga-emekwa ka ị na-ekwu okwu rụrụ arụ.+

34 Ọ ga-adị gị ka ì dina ala n’etiti oké osimiri,

Ka à ga-asị na i dina ala n’elu osisi e ji ejide ákwà ụgbọ mmiri.

35 Ị ga-asị: “Ha etiela m ihe, ma o rughị m n’ahụ́.*

Ha kụrụ m ihe, ma amaghị m na ha kụrụ m ihe.

Olee mgbe m ga-eteta?+

M ka chọrọ ịṅụ ọzọ.”

24 Enwerela ndị ọjọọ anyaụfụ,

Achọkwala ka gị na ha na-akpa,+

 2 N’ihi na ihe ha na-eche n’obi ha bụ otú ha ga-esi mesie mmadụ ike,

Ihe ha na-ekwukwa mgbe niile bụ ihe ọjọọ ha ga-eme.

 3 A na-eji amamihe arụ ụlọ,*+

A na-ejikwa nghọta eme ka o sie ike.

 4 Mmadụ na-eji ihe ọ na-amụta

Eme ka ihe niile bara uru na ihe ọma niile ju n’ọnụ ụlọ ya dị iche iche.+

 5 Onye ma ihe na-akpa ike,+

Ihe ndị ọ na-amụta na-emekwa ka ọ na-akpakwu ike.

 6 Ezigbo ntụziaka ga-enyere gị aka ịlụ agha,+

Ọtụtụ ndị ndụmọdụ ga-emekwa ka i merie.+

 7 E nweghị ihe ga-eme ka onye nzuzu nwee ezigbo amamihe.+

E nweghị ihe ọ ma ọ ga-ekwu n’ọnụ ụzọ ámá obodo.

 8 A ga-akpọ onye ọ bụla nke na-akpa nkata ọjọọ

Eze aghụghọ.+

 9 Nkata ndị nzuzu na-akpa na-eme ka ha mee mmehie,

Ndị mmadụ na-akpọkwa onye na-akwa emo asị.+

10 Ọ bụrụ na obi adaa gị mbà ma nsogbu bịara gị,

Ike ga-agwụ gị.

11 Napụta ndị e du na-aga ka e gbuo,

Zọpụtakwa ndị na-adagharị na-aga n’ebe a ga-egbu ha.+

12 Ma ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe a,”

Ọ̀ bụ na Onye na-enyocha obi amaghị ihe dị gị n’obi?+

N’eziokwu, Onye na-ahụ gị ga-ama,

Ọ ga-akwụkwa onye ọ bụla ụgwọ ọrụ ya.+

13 Nwa m, na-aracha mmanụ aṅụ maka na ọ dị mma.

Mmanụ aṅụ nke si n’ụgbụgbọ aṅụ na-atapụta na-atọ ụtọ.

14 Marakwa na amamihe ga-abara gị uru.+

Ọ bụrụ na ị mara ihe, ihe ga-adịrị gị mma n’ọdịnihu,

Ihe ndị ị na-atụ anya ha ga-emekwara gị.+

15 Ezola n’akụkụ ụlọ onye ezi omume ka i mee ya ihe ọjọọ,

Emebikwala ebe o bi.

16 N’ihi na onye ezi omume nwere ike ịda ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.+

Ma ọdachi ga-eme ka ndị ajọ omume daa daruo ala.+

17 Onye iro gị daa, enwela obi ụtọ.

Ọ bụrụ na ọ zọhie ụkwụ, aṅụrịla ọṅụ.+

18 Ọ bụrụ na ị ṅụrịa ọṅụ, Jehova ga-ahụ gị, ọ ga-ewutekwa ya,

Ọ ga-akwụsịkwa iwesa ya* iwe.+

19 Ewerela ndị na-eme ihe ọjọọ iwe.

Enwerela ndị ajọ omume anyaụfụ,

20 N’ihi na ihe agaghị adịrị onye ọ bụla na-eme ihe ọjọọ mma n’ọdịnihu.+

A ga-emenyụ ọkụ* ndị ajọ omume.+

21 Nwa m, tụọ egwu Jehova, tụọkwa egwu eze.+

Gị na ndị nnupụisi* akpala,+

22 N’ihi na ọdachi ga-adakwasị ha na mberede.+

Ònye ma ụdị mbibi ha abụọ* ga-ebibi ndị nnupụisi a?+

23 Ndị ma ihe na-ekwukwa, sị:

Ile mmadụ anya n’ihu mgbe a na-ekpe ikpe adịghị mma.+

24 Onye ọ bụla nke sịrị onye ajọ omume, “Ị bụ onye ezi omume,”+

Ndị mmadụ ga-abụ ya ọnụ, mba dị iche iche ga-akatọkwa ya.

25 Ma ihe ga-agaziri ndị na-abara onye ajọ omume mba.+

A ga-eji ọtụtụ ihe ọma gọzie ha.+

26 Ọ bụrụ na mmadụ na-ekwu eziokwu mgbe ọ na-asa okwu, ndị mmadụ ga-akwanyere ya ùgwù.*+

27 Hazie ọrụ gị dị n’èzí, kwadebekwa ihe niile n’ubi.

I mechaa, rụọ ụlọ* gị.

28 Agbala akaebe na e nwere ihe onye agbata obi gị mere ma ọ bụrụ na i jighị n’aka na o mere ihe ahụ.+

Ekwula ihe ga-eduhie ndị ọzọ.+

29 Asịla: “M ga-emegwara ya ihe o mere m.

M ga-akwụ ya ụgwọ ihe o mere m.”+

30 M gafere n’akụkụ ubi onye umengwụ,+

N’akụkụ ubi vaịn onye na-enweghị uche.

31 Ahụrụ m na ahịhịa eruchiela ya.

Ahịhịa akụwa* juru na ya,

A kwatusịkwara mgbidi ya e ji nkume rụọ.+

32 Ahụrụ m ihe a ma chebara ya echiche.

M hụrụ ya wee mụta na

33 Ihitụ ụra, irotụ ụra,

Na ịkụkụwatụ aka ka i zuo ike

34 Ga-eme ka ị daa ogbenye na mberede ka à ga-asị na onye ohi zuru gị ohi na mberede.

Ị ga-adakwa ụkpa ka à ga-asị na mmadụ ji ngwá ọgụ bịa nakọrọ gị ihe niile i nwere.+

25 Ilu ndị a sokwa n’ilu Solomọn tụrụ.+ Ọ bụ ndị na-ejere Hezekaya+ eze Juda ozi dere ha:

 2 A na-eto Chineke n’ihi ihe ọ ma ndị mmadụ na-amaghị.+

A na-akwanyekwara ndị eze ùgwù maka na ha na-esi imi n’ala achọpụta ihe.

 3 Otú ahụ eluigwe si dị elu, ụwa emiekwa emie,

Ka a na-enweghịkwa ike ịchọpụta ihe dị ndị eze n’obi.

 4 Nụchaa ọlaọcha ma wepụsịa irighiri ihe na-adịghị mma na ya,

Ọlaọcha ahụ ga-aghọ ezigbo ọlaọcha.+

 5 Chụpụ onye ajọ omume n’ihu eze,

Ezi omume ga-eme ka ọchịchị* eze kwụsie ike.+

 6 Ebulila onwe gị elu n’ihu eze,+

Agakwala nọrọ n’ebe ndị ukwu nọ,+

 7 N’ihi na ọ ka mma na ọ sịrị gị: “Gbagote ebe a,”

Kama imechu gị ihu n’ihu onye a ma ama.+

 8 Ya adịla gị ọsọ ọsọ ịgba onye agbata obi gị akwụkwọ.

Gịnịzi ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na o menye gị ihere?+

 9 Rịọ onye agbata obi gị arịrịọ ka gị na ya kpezie,+

Ma akọsala ihe a gwara gị nke a na-achọghị ka ndị ọzọ nụ,+

10 Ka onye nụrụ ihe i kwuru wee ghara imenye gị ihere,

Ya abụrụ na ị kọsaala akụkọ ọjọọ nke ị na-enweghịzi ike ime ka ndị ọzọ ghara ịnụ.

11 Otú apụl ndị e ji ọlaedo kpụọ si ama mma ma e tinye ha n’efere e ji ọlaọcha kpụọ

Ka okwu e kwuru n’oge kwesịrị ekwesị si adị mma.+

12 Otú ahụ e si eji ọla ntị e ji ọlaedo rụọ nakwa ihe e ji achọ mma e ji ezigbo ọlaedo rụọ akpọrọ ihe

Ka onye na-anabata aka ná ntị onye ma ihe na-adọ ya na-eji onye ahụ na-adọ ya aka ná ntị akpọrọ ihe.+

13 Otú ahụ snoo si eme ka ahụ́ jụọ mmadụ oyi n’oge okpomọkụ mgbe a na-ewe ihe ubi

Ka onye ozi a tụkwasịrị obi na-eme ka obi ruo ndị dunyere ya ozi ala,

N’ihi na ọ na-eme ka obi dị nna ya ukwu mma.+

14 Onye ji onyinye ọ na-enyebeghị enye na-etu ọnụ

Dị ka ebe mmiri rujuru n’elu, ifufe efeekwa, ma mmiri ezoghị.+

15 Ọ bụ ndidi ka e ji enweta obi onyeisi,

Okwu ọma na-emekwa ka obi jụrụ mmadụ.*+

16 Ị hụ mmanụ aṅụ, rachaa naanị nke ga-ezuru gị,

N’ihi na ị rachaa ya gafee ókè, i nwere ike ịgbọ ya.+

17 Adịla na-aga n’ụlọ onye agbata obi gị mgbe niile,

Ka ihe gị ghara ịgbụ ya, ya akpọọ gị asị.

18 Onye na-agbagide onye agbata obi ya akaebe

Dị ka okpiri e ji alụ agha na mma agha nakwa akụ́ ọnụ ya pịrị apị.+

19 Mmadụ ịtụkwasị onye a na-ekwesịghị ịtụkwasị obi* obi n’oge nsogbu

Dị ka ebe mmadụ ji ezé gbajiri agbaji na-ata ihe ma ọ bụ ebe mmadụ ji ụkwụ ya nke na-ama jijiji na-aga ije.

20 Onye na-abụrụ onye obi na-adịghị mma abụ

Dị ka onye yipụrụ uwe ya n’ụbọchị oyi na-atụ,

Ọ dịkwa ka ịwụsa mmanya gbara ụka n’elu akanwụ.*+

21 Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị,* nye ya nri ka o rie.

Ọ bụrụ na mmiri na-agụ ya, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ,+

22 N’ihi na i mee otú ahụ, ị na-ekpokwasị icheku ọkụ n’isi ya,*+

Jehova ga-akwụkwa gị ụgwọ.

23 Ifufe nke si n’ebe ugwu na-eme ka nnukwu mmiri zoo,

Ire onye na-agba asịrị na-akpasukwa mmadụ iwe.+

24 Ọ ka mma na mmadụ gara biri n’otu akụkụ elu ụlọ

Kama ya na nwaanyị na-esekarị okwu ibi n’otu ụlọ.+

25 Akụkọ ọma nke si n’ala dị anya

Dị ka mmiri jụrụ oyi nke na-eme ka onye* ike gwụrụ nweta ume.+

26 Onye ezi omume nke kwere ka onye ajọ omume mebie ya

Dị ka isi iyi a gbarụrụ agbarụ na olulu mmiri e metọrọ emetọ.

27 Ịracha mmanụ aṅụ gafee ókè adịghị mma,+

Mmadụ ịchọ ka a na-eto ya adịghịkwa mma.+

28 Onye na-anaghị ejide onwe ya ma a kpasuo ya iwe

Dị ka obodo a kwaturu mgbidi ya akwatu.+

26 Otú ahụ snoo na-ekwesịghị ịda n’oge okpomọkụ, nakwa otú ahụ mmiri na-ekwesịghị izo n’oge a na-ewe ihe ubi,

Ka a na-ekwesịghị ịkwanyere onye nzuzu ùgwù.+

 2 A naghị abụ mmadụ ọnụ ma ọ bụrụ na e nweghị ezigbo ihe kpatara ya,*

Otú ahụ nnụnụ na elekentịọba na-anaghị efeli ma ọ bụrụ na e nweghị ihe kpatara ya.

 3 E mere apịpịa maka ịnyịnya, mee ihe e ji achịkwa anụ maka jakị,+

Ma e mere ụtarị maka azụ ndị nzuzu.+

 4 Azala onye nzuzu okwu otú o si gwa gị okwu,

Ka ị ghara ịbụ onye nzuzu otú ọ bụ.*

 5 Zaa onye nzuzu okwu otú o si gwa gị okwu,

Ka ọ ghara iche na ya ma ihe.+

 6 Onye na-enyefe onye nzuzu ihe n’aka

Dị ka onye na-egbupụ onwe ya ụkwụ ma na-emerụ onwe ya ahụ́.

 7 Otú ahụ onye na-ete ụkwụ na-enweghị ike ịga ije nke ọma

Ka onye nzuzu na-enweghị ike ịtụ ezigbo ilu.+

 8 Ito onye nzuzu

Dị ka mmadụ ikenye okwute n’èbè.*+

 9 Ilu onye nzuzu na-atụ

Dị ka ahịhịa ogwu onye aṅụrụma ji n’aka.

10 Onye na-ego onye nzuzu ma ọ bụkwanụ ndị na-agafe agafe ọrụ

Dị ka onye na-agba ụta nke ji ụta ya na-agba ihe ọ bụla ọ hụrụ.*

11 Onye nzuzu nke na-emeghachi iberiibe o meburu

Dị ka nkịta nke na-alaghachi n’agbọ ọ gbọrọ.+

12 Ụfọdụ ndị chere na ha ma ihe.+

Ma ọ dị mfe inyere onye nzuzu aka karịa inyere ụdị ndị ahụ aka.

13 Onye umengwụ na-asị: “Ọdụm nọ n’ụzọ!

Ọdụm nọ n’ámá obodo!”+

14 Otú ọnụ ụzọ si emeghe ma na-emechi

Ka onye umengwụ si atụgharị n’àkwà* ya.+

15 Onye umengwụ na-amanye aka n’efere nri,

Ma ike iwere nri tinye n’ọnụ ya anaghị adị ya.+

16 Onye umengwụ na-eche na ya ma ihe

Karịa mmadụ asaa ndị na-aza ihe bara uru.

17 Ọ bụrụ na mmadụ na-agafe agafe wee malite iwe oké iwe maka esemokwu na-agbasaghị ya,

O yiri onye jidesiri nkịta aka ná ntị ike.+

18 Onye ara na-agbapụ akụ́ ụta na-ere ọkụ nakwa akụ́ nke na-atụgbu mmadụ.

19 Ọ bụ otú ahụ ka onye ghọrọ onye agbata obi ya aghụghọ, ma sị ya na ọ bụ egwuregwu, dị.+

20 Ọ bụrụ na nkụ adịghị, ọkụ na-anyụ.

Ọ bụrụkwa na e nweghị onye na-ekwutọ mmadụ, esemokwu na-akwụsị.+

21 Otú ahụ icheku ọkụ na-eme ka ọkụ na-eke, nkụ ana-emekwa ka ọkụ na-enwu,

Ka onye okwu na ụka na-eme ka esemokwu malite.+

22 Okwu onye na-ekwutọ mmadụ dị ka nri na-atọ ụtọ.

A na-elo ya ngwa ngwa, ya abanye n’afọ.+

23 Okwu ọma onye obi ọjọọ na-ekwu

Dị ka ọlaọcha a gbazere agbaze nke e ji machie mpekere ite ụrọ.+

24 Onye kpọrọ ndị ọzọ asị na-ekwu okwu ọma iji mee ka a ghara ịmata ihe dị ya n’obi,

Ma ihe juru ya obi bụ aghụghọ ọ ga-aghọ.

25 N’agbanyeghị na ọ na-ekwu okwu ọma, atụkwasịla ya obi,

N’ihi na ihe asaa jọgburu onwe ha dị ya n’obi.*

26 N’agbanyeghị na o ji aghụghọ na-eme ka a ghara ịma na ọ kpọrọ ndị ọzọ asị,

A ga-eme ka ndị mmadụ mata ihe ọjọọ ọ na-eme.

27 Onye na-egwu olulu ga-adaba na ya.

Onye na-akwapụ nkume, nkume ahụ ga-alaghachi dakwasị ya.+

28 Onye ụgha na-akpọ onye ụgha ọ ghara kpataara nsogbu asị,

Onye na-eto mmadụ otuto elu ọnụ na-alakwa mmadụ n’iyi.+

27 Ejila echi anya isi,

N’ihi na ị maghị ihe echi ga-abụ.+

 2 Ka onye ọzọ* too gị, ejila ọnụ gị eto onwe gị.

Ka ndị ọzọ* too gị, etola onwe gị.+

 3 Nkume na-anyị arọ, ájá dịkwa arọ,

Ma iwe onye nzuzu na-akpasu mmadụ karịrị ha abụọ.+

 4 Ọnụma adịghị mma, iwe na-emebikwa ihe ka idei mmiri,

Ma ekworo ka ha abụọ njọ.+

 5 Ọ ka mma ịbara mmadụ mba n’ihu ọha kama ịhụ mmadụ n’anya ma ghara igosi ya na a hụrụ ya n’anya.+

 6 Ọnyá ezigbo enyi mmadụ na-emepụ ya dị mma+

Karịa ọnụ onye kpọrọ mmadụ asị na-esusu ya ọtụtụ ugboro.*

 7 Onye afọ juru enweghịdị ihe o ji ezigbo mmanụ aṅụ kpọrọ,*

Ma ihe na-elu ilu na-atọdị onye agụụ na-agụ ụtọ.

 8 Nwoke hapụrụ ụlọ ya gbapụ

Dị ka nnụnụ fepụrụ n’akwụ́ ya.

 9 Mmanụ na ihe na-esi ísì ọma* na-eme ka obi dị mmadụ ụtọ.

Ezigbo ndụmọdụ enyi nyere enyi ya na-emekwa ka obi dị enyi ya ụtọ.+

10 Ahapụla enyi gị ma ọ bụ enyi nna gị,

Abanyekwala n’ụlọ nwanne gị n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị gị.

Onye agbata obi nke nọ nso ka nwanne nke nọ n’ebe dị anya mma.+

11 Nwa m, mara ihe ma mee m obi ụtọ,+

Ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.+

12 Onye ma ihe hụ nsogbu, ọ na-aga zoo.+

Ma ndị na-amaghị ihe na-agara banye ná nsogbu, ha na-atakwa ahụhụ ya.

13 Chịrị uwe mmadụ ma ọ bụrụ na ọ nara onye ọ na-amaghị n’ibé.

Nara ya ihe ibé ma ọ bụrụ nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ* ka ọ nara n’ibé.+

14 Ọ bụrụ na mmadụ ejiri olu dara ụda na-agọzi mmadụ ibe ya n’isi ụtụtụ,

A ga-ewere ya na ọ na-abụ onye ahụ ọnụ.

15 Nwaanyị nke na-esekarị okwu dị ka elu ụlọ nke na-ehi mmiri n’akwụsịghị akwụsị n’ụbọchị mmiri na-ezo.+

16 Onye ọ bụla nke ga-ejiteli nwaanyị ahụ ga-ejideli ifufe,

Ọ ga-ejidelikwa mmanụ n’aka nri ya.

17 Otú ahụ a na-eji ígwè amụcha ígwè

Ka mmadụ na-amụcha enyi ya.+

18 Onye na-elekọta osisi fig ga-eri mkpụrụ ya,+

A ga-akwanyekwara onye na-elekọta nna ya ukwu ùgwù.+

19 Otú ahụ mmadụ na-ahụ ihu ya ma o lee anya na mmiri

Ka mmadụ na-eji ihe dị ya n’obi amata ihe dị mmadụ ibe ya n’obi.

20 Afọ anaghị eju ili nakwa ebe ndị mmadụ na-anọ erekasị,*+

Afọ anaghịkwa eju anya mmadụ.

21 Otú ahụ a na-eji ite na ọkụ anụcha ọlaọcha na ọlaedo+

Ka a na-eji otuto a na-eto mmadụ amata ụdị onye ọ bụ.

22 Ọ bụrụgodị na i jiri ọdụ sụrie onye nzuzu

Otú e si asụri ọka n’ikwe,

Nzuzu ya agaghị apụ ya apụ n’ahụ́.

23 I kwesịrị ịma ìgwè atụrụ gị nke ọma.

Na-elekọta atụrụ gị nke ọma,*+

24 N’ihi na akụnụba anaghị adịru mgbe ebighị ebi,+

Okpueze anaghịkwa adịru ọgbọ niile.

25 Ahịhịa na-akpọnwụ, ahịhịa ọhụrụ epupụta,

A na-egbutekwara anụmanụ ahịhịa ndị dị n’ugwu.

26 Ị na-esi n’ebule enweta uwe gị,

A na-ejikwa mkpi akwụ ụgwọ ala.

27 A ga-enwekwa mmiri ara ewu ga-ezuru gị

Na ndị ezinụlọ gị nakwa ụmụ agbọghọ na-ejere gị ozi.

28 Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe a na-enweghị onye na-achụ ha,

Ma obi na-esi ndị ezi omume ike ka ọdụm.+

 2 Mgbe ndị obodo na-emebi iwu, otu onyeisi chịtụ, ibe ya anọchie ya.+

Ma ọ bụrụ na e nwere onye na-aghọta ihe nke ma ihe, otu onyeisi ga-achịte aka.+

 3 Ogbenye nke na-erigbu onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya+

Dị ka mmiri ozuzo nke na-eburu nri niile bufuo.

 4 Ndị na-anaghị edebe iwu na-eto onye ajọ omume,

Ma ndị na-edebe iwu na-akpọ ha asị.+

 5 Ndị na-eme ihe ọjọọ enweghị ike ịghọta ikpe ziri ezi,

Ma ndị na-achọ Jehova na-aghọta ihe niile.+

 6 Onye dara ogbenye ma na-akwụwa aka ọtọ

Ka ọgaranya nke na-anaghị akwụwa aka ọtọ mma.+

 7 Nwa na-aghọta ihe na-edebe iwu,

Ma onye ya na ndị na-eri oké nri na-akpa na-emechu nna ya ihu.+

 8 Onye na-anara ọmụrụ nwa ma na-aghọ aghụghọ ka o wee kpatakwuo akụ̀+

Na-akpakọtara ya onye na-emere ndị ogbenye amara.+

 9 Onye na-ekweghị eme ihe iwu kwuru,

Chineke ga-eweredị ekpere ya ka ihe rụrụ arụ.+

10 Onye na-eduhie ndị ezi omume ka ha wee mewe ihe ọjọọ ga-adaba n’olulu o gwuru,+

Ma ihe ọma ga-abịara ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta.+

11 Ọgaranya na-eche na ya ma ihe,+

Ma ogbenye nke na-aghọta ihe ga-achọpụta ụdị onye ọgaranya ahụ bụ.+

12 Ndị ezi omume merie, a na-aṅụrị nnukwu ọṅụ,

Ma ndị ajọ omume malite ịchị, ndị mmadụ na-aga zoo.+

13 Ihe agaghị agaziri onye na-ezochi mmehie ya,+

Ma a ga-emere onye ọ bụla kwupụtara mmehie ya ma hapụ ya ebere.+

14 Onye na-akpachapụ anya* mgbe niile na-enwe obi ụtọ,

Ma onye na-akpọchi obi ya ga-adaba ná nsogbu.+

15 Onye ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka

Dị ka ọdụm na-agbọ ụja na anụ ọhịa bea nke ji ọsọ na-aga ịdọri anụ.+

16 Onye ndú nke na-enweghị uche na-emegbu ndị ọ na-edu,+

Ma onye kpọrọ uru e ji aghụghọ erite asị ga-adịte ndụ aka.+

17 Onye ikpe ọbara mara maka na o gburu mmadụ ga-agbagide ọsọ ruo mgbe ọ banyere n’ili.*+

Ya enwela onye ga-akwado ya.

18 A ga-azọpụta onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta,+

Ma onye na-aghọ aghụghọ* ga-ada na mberede.+

19 Onye na-akọ ubi ya ga-enweju ihe oriri enweju,

Ma onye na-achụ ihe na-abaghị uru ga-ada ezigbote ogbenye.+

20 Ọtụtụ ngọzi ga-abịara onye a tụkwasịrị obi,+

Ma onye na-achọ ka ọ baa ọgaranya ngwa ngwa ga-etinyerịrị aka n’ihe ọjọọ.+

21 Ile mmadụ anya n’ihu adịghị mma.+

Ma mmadụ nwere ike ime ihe ọjọọ n’ihi otu ibé achịcha.

22 Onye anyaụfụ* na-agbasi mbọ ike ka ọ baa ọgaranya,

Ma ọ maghị na ọ ga-ada ogbenye.

23 E mechaa, a ga-ele onye na-abara mmadụ mba anya ọma+

Karịa onye na-eto mmadụ otuto elu ọnụ.

24 Onye na-ezu nne ya na nna ya ohi ma na-asị, “Ọ bụghị ihe ọjọọ,”+

Ya na onye na-ala ihe n’iyi bụ otu.+

25 Onye anyaukwu* na-akpata esemokwu,

Ma ihe ga-agaziri onye tụkwasịrị Jehova obi.+

26 Onye tụkwasịrị onwe ya* obi dị nzuzu,+

Ma onye na-akpa àgwà otú gosiri na ọ ma ihe agaghị abanye ná nsogbu.+

27 E nweghị ihe ga-akọ onye na-enye ogbenye ihe.+

Ma onye na-eme anya ka à ga-asị na ọ naghị ahụ ogbenye, a ga-abụ ya ọnụ.

28 Mgbe ndị ajọ omume malitere ịchị, ndị mmadụ na-ezo,

Ma mgbe ha lara n’iyi, ndị ezi omume na-adị ọtụtụ.+

29 Onye a dọrọ aka ná ntị ugboro ugboro ma ya agbaa isi akwara,+

A ga-ala ya n’iyi kpamkpam na mberede.+

 2 Mgbe ndị ezi omume dị ọtụtụ, ndị mmadụ na-aṅụrị ọṅụ,

Ma mgbe onye ajọ omume na-achị, ndị mmadụ na-asụ ude.+

 3 Onye ji amamihe kpọrọ ihe na-eme nna ya obi ụtọ,+

Ma onye ya na ndị akwụna na-akpa na-ala akụ̀ ya n’iyi.+

 4 Ọ bụrụ na eze na-ekpe ikpe ziri ezi, ihe na-adị mma n’obodo,+

Ma onye na-achọ ka e nye ya aka azụ na-ala obodo n’iyi.

 5 Onye na-eto onye agbata obi ya otuto elu ọnụ

Na-agbasara ya ụgbụ ka ọ zọnye ụkwụ.+

 6 Mmehie onye ajọ omume ga-eme ka ọ ma n’ọnyà,+

Ma onye ezi omume na-eti mkpu ọṅụ ma na-enwe obi ụtọ.+

 7 Onye ezi omume na-achọ ka e meere ndị ogbenye ihe ruuru ha,+

Ma onye ajọ omume achọghịdị ịma gbasara ha.+

 8 Ndị na-etu ọnụ na-amụnye obodo ọkụ,+

Ma ndị ma ihe na-eme ka iwe dajụọ.+

 9 Ọ bụrụ na onye ma ihe ekwe ka ya na onye iberiibe rụwa ụka,

Mba na ịkwa emo ga-arị ibe ha elu, ma onye ahụ ma ihe agaghị ezu ike.+

10 Ndị na-egbu mmadụ na-akpọ onye ọ bụla aka ya dị ọcha asị,+

Ha na-achọkwa ka ha gbuo ndị ezi omume.*

11 Onye nzuzu na-ewe iwe ruo n’isi,*+

Ma onye ma ihe na-ejide onwe ya.+

12 Ọ bụrụ na onye ọchịchị na-ege okwu ụgha,

Ndị niile na-ejere ya ozi ga-abụ ndị ajọ omume.+

13 Ihe jikọrọ ogbenye na onye na-emegbu ya bụ na

Ọ bụ Jehova nyere ha abụọ ndụ.*

14 Mgbe eze na-ekpe ndị ogbenye ikpe ziri ezi,+

Ọchịchị ya agaghị enwe nsogbu ọ bụla.+

15 Ụtarị* na mba na-eme ka mmadụ mara ihe,+

Ma nwatakịrị a hapụrụ ka ọ na-eme otú masịrị ya na-emenye nne ya ihere.

16 Mgbe ndị ajọ omume dị ọtụtụ, mmehie na-adị ọtụtụ,

Ma ndị ezi omume ga-ahụ ka ndị ajọ omume na-ada.+

17 Dọọ nwa gị aka ná ntị, ọ ga-eme ka obi ruo gị ala.

Ọ ga-emekwa ka i* nwee ezigbo obi ụtọ.+

18 N’ebe a na-enweghị ndị amụma na-ahụ ọhụụ,* ndị mmadụ na-eme ihe masịrị ha.+

Ma ndị na-edebe iwu na-enwe obi ụtọ.+

19 Onye na-eje ozi agaghị anabata okwu a gwara ya mgbe a na-adọ ya aka ná ntị.

N’agbanyeghị na ọ na-aghọta ihe a gwara ya, ọ naghị erube isi.+

20 Ọ dị mfe inyere onye nzuzu aka+

Karịa inyere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche aka.+

21 Ọ bụrụ na mmadụ esi n’oge onye na-ejere ya ozi bụ nwata zụtọọ ya,

E mechaa, onye na-ejere ya ozi agaghị eji ya kpọrọ ihe.

22 Onye na-ewekarị iwe na-eme ka e sewe okwu.+

Onye ọ bụla nke na-ewekarị oké iwe na-eme ọtụtụ mmehie.+

23 Onye dị mpako ga-ada,+

Ma a ga-akwanyere onye ọ bụla dị umeala n’obi ùgwù.+

24 Onye na-enyere onye ohi aka kpọrọ onwe* ya asị.

O nwere ike ịnụ òkù a kpọrọ ya ka ọ bịa gbaa akaebe,* ma e nweghị ihe ọ ga-ekwu.+

25 Ịtụ mmadụ egwu na-eme ka mmadụ ma n’ọnyà,+

Ma a ga-echebe onye tụkwasịrị Jehova obi.+

26 Ọtụtụ ndị na-achọ ka ha hụ onye ọchịchị,*

Ma ọ bụ Jehova na-eme ka e kpee mmadụ ikpe ziri ezi.+

27 Ndị ezi omume kpọrọ onye na-anaghị akwụwa aka ọtọ asị,+

Ma onye ajọ omume kpọrọ onye na-eme ihe ziri ezi asị.+

30 Okwu gbara ọkpụrụkpụ Egọ nwa Jeke kwuru, nke ọ gwara Itiel na Yukal.

 2 Mmadụ niile ma ihe karịa m,+

Anaghịkwa m aghọta ihe otú mmadụ kwesịrị isi ghọta ihe.

 3 Amụtabeghị m ihe bụ́ amamihe,

Amaghịkwa m ihe Onye Kacha Nsọ ma.

 4 Ònye gbagorola n’eluigwe ma gbadata?+

Ònye ji ọbụ aka ya abụọ kpokọta ifufe?

Ònye ji ákwà kechie mmiri?+

Ònye kere ebe niile ụwa sọtụrụ?+

Gịnị bụ aha ya, gịnịkwa bụ aha ọkpara ya, ma ọ bụrụ na ị ma?

 5 Okwu niile Chineke na-ekwu enweghị ntụpọ.*+

Chineke bụụrụ ndị na-agbaba n’ime ya ọta.+

 6 Etinyela ihe ọ bụla n’okwu ya,+

Ka ọ ghara ịbara gị mba,

Gị abụrụzie onye ụgha.

 7 Chineke, m na-arịọ gị ihe abụọ.

Ajụla imere m ha tupu mụ anwụọ.

 8 Nyere m aka ka m ghara ịna-ekwu ihe na-abụghị eziokwu, ka m ghara ịna-agha ụgha.+

Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba.

Naanị nye m nri ga-ezuru m,+

 9 Ka afọ wee ghara iju m, mụ agọnahụ gị, sị, “Ònye bụ Jehova?”+

Ekwekwala ka m daa ogbenye, ka m wee ghara izu ohi ma mebie aha Chineke m.

10 Ekwutọla onye na-eje ozi ná ntị nna ya ukwu,

Ka onye ahụ na-eje ozi ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe ewee ma gị.+

11 E nwere ndị* na-akpọ nna ha iyi,*

Ha anaghịkwa agọzi nne ha.+

12 E nwere ndị* chere na ha dị ọcha,+

Ma a sapụbeghị ha unyi dị ha n’ahụ́.*

13 E nwere ndị* na-ebuli onwe ha elu,

Ndị dịkwa nnọọ mpako.+

14 E nwere ndị* ezé ha dị ka mma agha,

Ndị agba ha dịkwa ka mma e ji egbu anụ.

Ha na-eripịa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha

Nakwa ndị ogbenye.+

15 Etu mụrụ ụmụ abụọ ndị na-ebe ákwá, sị: “Nye m! Nye m!”

E nwere ihe atọ afọ na-anaghị eju eju,

Ihe anọ na-anaghị asị, “O zuola!”

16 Ha bụ ili*+ na akpa nwa nwaanyị aga

Na ala na-anaghị enweta mmiri,

Nakwa ọkụ nke na-anaghị asị, “O zuola!”

17 Onye na-akwa nna ya emo ma na-eleda nne ya anya,+

Ugoloọma nke ndagwurugwu ga-aghụpụta anya ya,

Ụmụ ugo ga-erikwa ya.*+

18 E nwere ihe atọ gbara m gharịị,

Ihe anọ m na-aghọtabeghị:

19 Otú ugo si efegharị n’eluigwe,

Otú agwọ si arịgharị n’elu nkume,

Otú ụgbọ mmiri si aga n’oké osimiri,

Nakwa ije nwoke na nwaanyị.

20 Ihe nwaanyị na-akwa iko na-eme bụ:

O richaa, ya ehichaa ọnụ ya,

Sịzie, “E nweghị ihe ọjọọ m mere.”+

21 E nwere ihe atọ na-emenye ụwa egwu,

Ihe anọ ndị mmadụ na-enweghị ike idi:

22 Mgbe ohu ghọrọ eze,+

Mgbe onye iberiibe rifere nri ókè,

23 Mgbe ọ bụ nwaanyị a kpọrọ asị ka nwoke gara lụọ,

Nakwa mgbe nwa agbọghọ na-eje ozi nọchiri nne ya ukwu.+

24 E nwere ihe anọ so n’ihe ndị kacha nta n’ụwa,

Ma ha ma nnọọ ihe:*+

25 Ndanda esighị ike,

Ma ha na-akwadebe ihe oriri ha n’ọkọchị.+

26 Ewi nkume+ esighị ike,

Ma ha na-arụ ụlọ ha ná nnukwu nkume.+

27 Igurube+ enweghị eze na-achị ha,

Ma ha niile na-aga n’usoro.*+

28 Agụ ụlọ*+ na-agagidesi aka ike n’ihe,

Ọ na-abanyekwa n’obí eze.

29 E nwere ihe atọ otú ha si aga mara ezigbo mma,

Ihe anọ otú ha si aga dị ebube.

30 Ha bụ ọdụm, bụ́ anụ kacha anụ ọhịa niile ike,

Nke na-anaghị agbara onye ọ bụla ọsọ;+

31 Na nkịta ntá; na mkpi;

Nakwa eze nke ya na ìgwè ndị agha ya so.

32 Ọ bụrụ na i zuzurula bulie onwe gị elu+

Ma ọ bụ na i cheela echiche ime otú ahụ,

Kpuchie ọnụ gị aka.+

33 N’ihi na otú ahụ a na-enweta bọta ma a kpagharịsie mmiri ara ehi ike

Nakwa otú ahụ ọzọimi* na-agba mmadụ ma a pịsie ya aka n’imi ike,

Ka esemokwu na-amalite ma a kpasuo mmadụ

iwe.+

31 Okwu Eze Lemuel, bụ́ okwu gbara ọkpụrụkpụ nne ya gwara ya mgbe ọ na-adụ ya ọdụ:+

 2 Nwa m, gịnị ka m ga-agwa gị?

Nwa m buru n’afọ,

Nwa m ji maka ya kwee nkwa,+ gịnị ka m ga-agwa gị?

 3 Emefusịla ike gị n’ahụ́ ụmụ nwaanyị,+

Ebikwala ụdị ndụ na-ala ndị eze n’iyi.+

 4 Lemuel, eze ekwesịghị ime ihe a,

Eze ekwesịghị ịṅụ mmanya,

Onye na-achị achị ekwesịghịkwa ịsị, “Olee ebe mmanya m dị?”+

 5 Ka ọ ghara ịṅụ mmanya wee chefuo ihe iwu kwuru

Ma napụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ihe ruuru ha.

 6 Nyenụ ndị nọ n’ọnụ ọnwụ mmanya na-aba n’anya,+

Nyekwanụ ndị obi na-adịghị mma mmanya.+

 7 Ka ha ṅụọ mmanya wee chefuo na ha dara ogbenye;

Ka ha ghara icheta nsogbu ha ọzọ.

 8 Kwuchitere onye ogbi ọnụ ya.

Gbachitere ndị niile nọ n’ọnụ ọnwụ.+

 9 Kwuo okwu ma kpee ikpe ziri ezi.

Gbachitere* ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya.+

א [Alef]

10 Ònye ga-achọtali ezigbo nwaanyị?+

Ọ bara ezigbo uru karịa nkume kọral.*

ב [Bet]

11 Di ya tụkwasịrị ya obi,

E nweghịkwa ihe bara uru kọrọ di ya.

ג [Gimel]

12 Ná ndụ ya niile,

Ọ na-eji ihe ọma akwụ di ya ụgwọ, ọ bụghị ihe ọjọọ.

ד [Dalet]

13 Ọ na-achọta ajị anụ na ákwà linin.

Obi na-atọ ya ụtọ iji aka ya arụ ọrụ.+

ה [Hee]

14 Ọ dị ka ụgbọ mmiri nke onye na-azụ ahịa.+

Ọ na-esi n’ebe dị anya ebubata nri.

ו [Wọọ]

15 Ọ na-ebilikwa mgbe chi na-abọchabeghị

Kwadebere ndị ezinụlọ ya ihe ha ga-eri,

Nyekwa ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi òkè nke ha.*+

ז [Zayin]

16 Ọ na-eleru ala anya zụta ya.

Ọ na-eji ihe ọ rụtara* akụ ubi vaịn.

ח [Het]

17 Ọ na-akwadebe onwe ya maka ịrụ ọrụ siri ike,+

Ọ na-emekwa ka aka sie ya ike n’ọrụ ya.

ט [Tet]

18 Ọ na-achọpụta na ọ na-erite uru n’ahịa ọ na-azụ.

Ọkụ* ya anaghị anyụ n’abalị.

י [Yod]

19 Ọ na-eji osisi e ji akpa ákwà n’aka ya,

Jirikwa mkpịsị aka ya jide mkpịsị e ji akpa ákwà.+

כ [Kaf]

20 Ọ na-enyere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya aka,

Ọ na-emesapụkwara ogbenye aka.+

ל [Lamed]

21 Ọ naghị echegbu onwe ya maka ndị ezinụlọ ya n’oge oyi,

N’ihi na ndị ezinụlọ ya niile yi uwe e ji achụ oyi.*

מ [Mem]

22 Ọ na-eji aka ya akpa ákwà ọ na-agbasa n’elu ihe o ji edina ala.*

E ji ákwà linin na ajị anụ na-acha pọpụl kpaa uwe ya.

נ [Nun]

23 A ma di ya ama n’ọnụ ụzọ ámá obodo,+

N’ebe ya na ndị okenye obodo na-anọ ọdụ.

ס [Samek]

24 Ọ na-eji ákwà linin akpa uwe* ma na-ere,

Ọ na-ebugakwara ndị ahịa ájị̀* ọ kpara.

ע [Ayin]

25 O siri ike, a na-akwanyekwara ya ùgwù.

Ọ naghị atụ ụjọ ihe echi ga-abụ.

פ [Pee]

26 Okwu ya na-egosi na ọ ma ihe.+

Iwu obiọma na-achị ire ya.*

צ [Sadee]

27 Ọ na-eleru anya n’ihe ndị na-eme n’ezinụlọ ya,

Ọ naghịkwa eri nri umengwụ.+

ק [Kof]

28 Ụmụ ya na-ebili too ya.

Di ya na-ebili jaa ya mma.

ר [Resh]

29 E nwere ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị bụ́ ezigbo ụmụ nwaanyị,

Ma ị ka ha niile mma.

ש [Shin]

30 Mma nwere ike iduhie mmadụ, nwaanyị nwekwara ike ịma mma taa, echi mma ya alaa,+

Ma a ga na-aja nwaanyị nke na-atụ egwu Jehova mma.+

ת [Tọọ]

31 Kwụọnụ ya ụgwọ ihe ọ na-eme,+

Ka ọrụ ọ na-arụ meekwa ka e too ya n’ọnụ ụzọ ámá obodo.+

Ma ọ bụ “onye na-ekpebi ime ihe ziri ezi.”

Na Hibru, “ṅaa ntị n’aka ná ntị.”

Ma ọ bụ “iwu.”

Na Hibru, “wụfuo ọbara.”

Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “ụkwụ ha.”

Na Hibru, “awụfu ọbara.”

Na Hibru, “wụfuo ọbara.”

Na Hibru, “ga-awụsa unu mmụọ m.” O nwere ike ịbụ amamihe nke mmụọ nsọ Chineke na-eme ka mmadụ nwee.

Na Hibru, “ha.” N’ebe niile e dere “unu” n’amaokwu a nakwa n’amaokwu 29 ruo 31, ihe ọ bụ n’asụsụ Hibru bụ “ha.”

Na Hibru, “ha ga-eri mkpụrụ ụzọ ha mịpụtara.”

Na Hibru, “Ndụmọdụ.”

Ma ọ bụ “ga-atọchi unu akpịrị.”

Na Hibru, “mkpụrụ obi gị.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “nwaanyị bịara abịa.” Ọ bụ nwaanyị na-ebi ndụ na-adịghị Chineke mma.

Na Hibru, “nwaanyị mba ọzọ.” Ọ bụ nwaanyị na-ebi ndụ na-adịghị Chineke mma.

Ma ọ bụ “di.”

Ma ọ bụ “ndị kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ.”

Ma ọ bụ “iwu m.”

Ma ọ bụ “igosi ndị ọzọ ịhụnanya pụrụ iche.”

Ma ọ bụ “onye eziokwu.”

Na Hibru, “Adaberela ná nghọta gị.”

Na Hibru, “ka ụzọ gị dị larịị.”

Na Hibru, “Ọkpụkpụ.”

Ma ọ bụ “ihe kacha mma.”

Ma ọ bụ “ihe ọ bụla ị kpatara.”

Ma ọ bụ “Irite ya n’uru.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ya bụ, àgwà Chineke ndị e kwuru okwu ha n’amaokwu ndị bu nke a ụzọ.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”

Na Hibru, “oké ifufe ga-efekwasị.”

Na Hibru, “ụkwụ gị.”

Ma ọ bụ “iwu m na-enye.”

Ma ọ bụ “bụ isi.”

O nwere ike ịbụ, “Chebara ụzọ ị na-aga echiche nke ọma.”

Na Hibru, “egbugbere ọnụ.”

Na Hibru, “nwaanyị bịara abịa.” Gụọ Ilu 2:16.

Na Hibru, “Ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.”

Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Okwu Hibru a sụgharịrị ebe a pụtara mmiri dị n’ihe a rụrụ n’ime ala nke mmiri na-asọba.

Ma ọ bụ “na-egbu gị ka mmanya.”

Na Hibru, “nwaanyị bịara abịa.” Gụọ Ilu 2:16.

Na Hibru, “nwaanyị mba ọzọ.” Gụọ Ilu Ilu 2:16.

Na Hibru, “na gị na onye ị na-amaghị ekwee n’aka.”

Na Hibru, “Anya dị mpako na ire ụgha.”

Na Hibru, “ịwụfu ọbara.”

Na Hibru, “Obi nke na-akpa.”

Na Hibru, “ụkwụ na-agbaga n’ihe ọjọọ ngwa ngwa.”

Ma ọ bụ “iwu.”

Ma ọ bụ “ga-akụziri gị ihe.”

Ma ọ bụ “bụ oriọna.”

Ma ọ bụ “Iwu Chineke.”

Na Hibru, “nwaanyị mba ọzọ.” Gụọ Ilu 2:16.

Na Hibru, “na-eme ka ọ bụrụzie naanị otu ogbe achịcha ga-afọrọ nwoke.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”

Ma ọ bụ “iwu.”

Na Hibru, “nwaanyị bịara abịa.” Gụọ Ilu 2:16.

Na Hibru, “nwaanyị mba ọzọ.” Gụọ Ilu Ilu 2:16.

Na Hibru, “Ụkwụ ya anaghị anọ n’ụlọ.”

Ma ọ bụ “ihe ndina m.”

Ma ọ bụ “ihe ndina m.”

Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “kwụsie ike.”

Na Hibru, “Ṅaanụ ntị n’aka ná ntị.”

Ma ọ bụ “na-amụ anya n’ọnụ ụzọ m.”

Ma ọ bụ “Ọ wapụtala.”

Ma ọ bụ “Hapụ ndị na-amaghị ihe.”

Na Hibru, “Na-eje ije n’ụzọ nghọta.”

Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “ọnụ.”

Na Hibru, “ga-ere ure.”

Ma ọ bụ “iwu.”

Na Hibru, “Ọnụ.”

O nwere ike ịbụ, “nọ n’ụzọ nke ndụ.”

Ma ọ bụ “na-akọsa asịrị.”

Ma ọ bụ “na-eduzi ọtụtụ ndị.”

Ma ọ bụ “ihe mgbu.”

Ma ọ bụ “onye ọ na-arụrụ ọrụ.”

Ma ọ bụ “Olileanya ndị ezi omume.”

Na Hibru, “Ụzọ Jehova.”

Ya bụ, ihe Chineke na-eme.

Ma ọ bụ “nkume zuru ezu e ji atụ̀ ihe.”

Ma ọ bụ “oké iwe Chineke.”

Na Hibru, “ga-eme ka ụzọ ya kwụrụ ọtọ.”

Na Hibru, “Ma onye ajọ omume ga-ada.”

Ma ọ bụ “Onye na-anaghị asọpụrụ Chineke.”

Ma ọ bụ “Ma a na-azọpụta ndị mmadụ.”

Ma ọ bụ “Onye ọ bụla nke nara onye ọ na-amaghị n’ibé.”

Na Hibru, “ka ya na mmadụ kwee n’aka.”

Ma ọ bụ “nwaanyị mara mma.”

Ma ọ bụ “na-emechu onwe ya ihu.”

Na Hibru, “onye na-akụ mkpụrụ ezi omume.”

Ma ọ bụ “ndị obi ha gbagọrọ agbagọ.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Ma ọ bụ “na-emenye ezinụlọ ya ihere.”

Na Hibru, “Mkpụrụ onye ezi omume na-amị bụ.”

Ma ọ bụ “dị ka onye chechiri mmadụ ka o gbuo ya.”

Ma ọ bụ “onye obi ya gbagọrọ agbagọ.”

Na Hibru, “achịcha.”

Ma ọ bụ “n’otu ụbọchị ahụ.”

Na Hibru, “na-ekpuchi mkparị.”

Ma ọ bụ “aghụghọ.”

Na Hibru, “ire ndị ma ihe.”

Ma ọ bụ “ihe ọ na-ekwu.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Na Hibru, “na-aṅụrị ọṅụ.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “ndị na-agba izu.”

Na Hibru, “ihe ọ na-atụ anya ya bụ osisi nke ndụ ma o mezuo.”

Ma ọ bụ “Iwu onye ma ihe.”

Na Hibru, “na-eje ije.”

Ma ọ bụ “ka onye ahụ.”

Ma ọ bụ “na-anaghị adọ nwa ya aka ná ntị.”

O nwere ike ịbụ, “na-adọ ya aka ná ntị ozugbo.”

Na Hibru, “onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ.”

O nwere ike ịbụ, “ihe ndị nzuzu ji eduhie ndị ọzọ.”

Ma ọ bụ “na-ewe iwe ọkụ.”

Ma ọ bụ “e jiri nwayọọ.”

Ma ọ bụ “okwu na-agbawa obi.”

Na Hibru, “bụ osisi nke ndụ.”

Ma ọ bụ “mba a na-abara ya.”

Ma ọ bụ “na-enweta.”

Ma ọ bụ “na-ewere aka ná ntị a na-adọ ya ka ịta ya nnukwu ahụhụ.”

Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “n’Abadọn.”

Ma ọ bụ “onye na-adọ ya aka ná ntị.”

Ma ọ bụ “onye obi na-adịghị mma.”

Ma ọ bụ “ma nọrọ ná mgbagwoju anya.”

Ma ọ bụ “Ụzọ onye umengwụ dị ka ogige e ji osisi ogwu gbaa.”

Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “na-emechu ezinụlọ ya ihu.”

Ma ọ bụ “na-echebara ihe ọ ga-aza ezigbo echiche; na-eche echiche tupu ya ekwuo okwu.”

Na Hibru, “na-eme ka ọkpụkpụ sie ike.”

Ma ọ bụ “ihe kwesịrị ekwesị.”

Ya bụ, n’anya mmadụ.

Ma ọ bụ “ocheeze.”

Ma ọ bụ “na-ezere iwe eze.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “Okwu dị ụtọ.”

Na Hibru, “na-agwọkwa ọkpụkpụ.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “Onye na-akpa nkata ọjọọ.”

Ma ọ bụ “dị ebube.”

Na Hibru, “Ọ bụ n’apata ụkwụ ka a na-efe nza.”

Ma ọ bụ “ndị mụrụ.”

Ma ọ bụ “Onye a ma ama.”

Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”

Na Hibru, “na-ekpuchi.”

Na Hibru, “kwee mmadụ n’aka.”

Ma ọ bụ “onye obi ya gbagọrọ agbagọ.”

Ma ọ bụ “na-amịkpọ ọkpụkpụ.”

Ma ọ bụ “ga-eri ngarị.”

Ma ọ bụ “Iri onye ezi omume iwu.”

Ma ọ bụ “na-akpa.”

Ma ọ bụ “E nweghị ihe o ji ezigbo amamihe kpọrọ.”

Na Hibru, “Egbugbere ọnụ ya na-abụrụ mkpụrụ obi ya ọnyà.”

Ma ọ bụ “onye na-emesapụ aka.”

Ma ọ bụ “ka o nwee uche.”

Ma ọ bụ “nzube.”

Ma ọ bụ “ka mmadụ na-eji ndị ọzọ eme ihe ọchị.”

O nwere ike ịbụ, “Ọ ga-achọ nri n’oge a na-ewe ihe ubi, ma e nweghị ihe ọ ga-ahụ.”

Ma ọ bụ “na-egosi ndị ọzọ ịhụnanya pụrụ iche.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “onye mba ọzọ.”

Ma ọ bụ “okwute.”

Ma ọ bụ “onye na-eji ọnụ ya arata ndị mmadụ.”

Ma ọ bụ “Oriọna.”

Na Hibru, “ihe nketa.”

Ma ọ bụ “Chineke agaghị agọzi ya.”

Ma ọ bụ “nkume abụọ dị iche e ji atụ̀ ihe.”

Ma ọ bụ “ụzọ ha ga-eso.”

Ma ọ bụ “o kwuo n’echeghị echiche, sị, “Ọ dị nsọ!”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Na Hibru, “Ume mmadụ na-eku.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Na Hibru, “Ọnyá.”

Na Hibru, “Iti ihe.”

Ya bụ, n’anya mmadụ.

Ma ọ bụ “ihe mmadụ bu n’obi.”

Na Hibru, “Anya dị mpako na obi dị nganga.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “na-abara ya uru.”

O nwere ike ịbụ, “Ga-abụrụ ndị ọnwụ na-agụ alụlụụ na-anaghị anọte aka.”

Ma ọ bụ “ọ na-ama ihe o kwesịrị ime.”

Na Hibru, “ga-elo.”

Ma ọ bụ “mgbe ha na-achụ ya, na-emekwa omume na-eme ihere.”

Na Hibru, “A ga-agbajikwa mkpanaka nke iwe ya.”

Na Hibru, “ụmụ nwaanyị bịara abịa.” Gụọ Ilu 2:16.

Ma ọ bụ “na-ekwe n’aka.”

Ma ọ bụ “ihe ndina.”

Na Hibru, “Tinye mma n’akpịrị gị.”

O nwere ike ịbụ, “Kwụsị iso nghọta gị.”

Na Hibru, “Onye na-agbapụta.”

Na Hibru, “Ka ị napụta ya na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “Akụrụ m ga-aṅụrị ọṅụ.”

Na Hibru, “ịdọ aka ná ntị.”

Na Hibru, “Nwaanyị mba ọzọ.” Gụọ Ilu 2:16.

Ma ọ bụ “ọ fụghị m ụfụ.”

Ma ọ bụ “eme ka ezinụlọ sie ike.”

Ya bụ, onye iro gị.

Ma ọ bụ “oriọna.”

Ma ọ bụ “ndị na-achọkarị ka a gbanwee ihe.”

Ya bụ, Jehova na eze.

O nwere ike ịbụ, “Ịsa okwu n’etinyeghị ya nnu na ose yiri isusu mmadụ ọnụ.”

Ma ọ bụ “wulite ezinụlọ.”

Ma ọ bụ “Ahịhịa ogwu.”

Ma ọ bụ “ocheeze.”

Na Hibru, “Ire ọma na-agbajikwa ọkpụkpụ.”

O nwere ike ịbụ, “onye aghụghọ.”

Akanwụ e kwuru okwu ya n’ebe a bụ ihe a na-egwute n’ala. E tinye ya ná mmanya gbara ụka, ọ na-eji ike gbọpụtasịa ụfụfụ.

Na Hibru, “onye kpọrọ gị asị.”

Ya bụ, ime ka obi onye ahụ jụrụ.

Na Hibru, “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.

O nwere ike ịbụ, “Ọnụ na-ekwesịghị ekwesị a bụrụ mmadụ anaghị ere.”

Ma ọ bụ “Ka ị ghara ime ka gị na ya hara.”

Èbè bụ ihe yiri katapọt.

Ma ọ bụ “na-emerụ onye ọ bụla ahụ́.”

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”

Ma ọ bụ “N’ihi na obi ya jọgburu onwe ya.”

Na Hibru, “onye bịara abịa.”

Na Hibru, “onye mba ọzọ.”

O nwere ike ịbụ, “ọnụ onye kpọrọ mmadụ asị na-esusu ya nke na-esighị ya n’obi.”

Na Hibru, “na-azọ mmanụ aṅụ ụkwụ.”

Na Hibru, “insens.”

Ma ọ bụ “onye mba ọzọ.”

Ma ọ bụ “Shiol na Abadọn.”

Ma ọ bụ “Mee ka obi gị dịrị n’ebe atụrụ gị nọ.”

Ma ọ bụ “Onye na-atụ egwu.”

Ma ọ bụ “n’olulu.”

Ma ọ bụ “onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ.”

Ma ọ bụ “Onye anyaukwu.”

O nwere ike ịbụ, “Onye dị mpako.”

Na Hibru, “obi ya.”

O nwere ike ịbụ, “Ma onye ezi omume na-agbalị ka o chebe ya ndụ.”

Ma ọ bụ “na-egosicha otú obi dị ya.”

Na Hibru, “na-eme ka anya ha abụọ na-ahụ ìhè.”

Ma ọ bụ “Ịdọ aka ná ntị.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”

Na Hibru, “a na-enweghị ọhụụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “ịnụ ọnụ a bụrụ.”

O nwere ike ịbụ, “na-achọ ka ha na onye ọchịchị dị ná mma.” Na Hibru, “na-achọ ihu onye ọchịchị.”

Ma ọ bụ “bụ okwu e ji ọkụ nụchaa.”

Na Hibru, “ọgbọ.”

Ma ọ bụ “na-abụ nna ha ọnụ.”

Na Hibru, “ọgbọ.”

Na Hibru, “nsị ha.”

Na Hibru, “ọgbọ.”

Na Hibru, “ọgbọ.”

Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ya bụ, anya ya.

Ma ọ bụ “ha bu amamihe pụta ụwa.”

Ma ọ bụ “ha na-aga n’ìgwè n’ìgwè.”

Ma ọ bụ “Ncheke.”

Ma ọ bụ “ọbara.”

Ma ọ bụ “Kpechite ọnụ.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

O nwere ike ịbụ, “ọrụ ha ga-arụ.”

Ma ọ bụ “ihe ọ kpatara.”

Ma ọ bụ “Oriọna.”

Na Hibru, “uwe abụọ abụọ.”

Ma ọ bụ “n’elu àkwà ya.”

Ma ọ bụ “uwe ime.”

Ya bụ, belt.

Ma ọ bụ “Ọ na-eji obiọma akụzi ihe.” Na Hibru, “Iwu ịhụnanya pụrụ iche dị n’ire ya.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya