DIUTERỌNỌMI
1 Ihe a bụ okwu Mosis gwara ndị Izrel niile ná mpaghara Osimiri Jọdan nke dị n’ala ịkpa, n’ọzara dị n’ihu Sọf, n’agbata Peran, Tofel, Leban, Hazirọt, na Daịzahab. 2 Ọ na-ewe ụbọchị iri na otu isi na Horeb ruo Kedesh-bania,+ ma e si n’ụzọ Ugwu Sia gawa ya. 3 N’afọ nke iri anọ,+ n’abalị mbụ n’ọnwa nke iri na otu, Mosis gwara ndị Izrel ihe niile Jehova gwara ya ka ọ gwa ha. 4 Ihe a bụ n’oge o merichara Saịhọn+ eze ndị Amọraịt, onye bi na Heshbọn, nakwa Ọg+ eze Beshan, onye bi n’Ashtarọt, n’Edraị.+ 5 Mosis malitere ịkọwa Iwu a+ ná mpaghara Osimiri Jọdan nke dị na Moab. Ọ sịrị:
6 “Jehova bụ́ Chineke anyị gwara anyị okwu na Horeb, sị, ‘Unu ebiteela aka n’ebe a bụ́ ugwu ugwu.+ 7 Tụgharịanụ gawa n’ala ndị Amọraịt bụ́ ugwu ugwu+ nakwa obodo niile ha na ha gbara agbata obi n’Araba,+ bụ́ ebe ugwu, ya bụ, Shefila, Negeb,* na ala dị n’ụsọ oké osimiri,+ bụ́ ala ndị Kenan, nakwa Lebanọn,*+ ruo ná nnukwu osimiri, bụ́ osimiri Yufretis.+ 8 Lee, edowerela m unu ala ahụ. Banyenụ weghara ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna unu hà, bụ́ Ebreham, Aịzik,+ na Jekọb,+ iyi na ọ ga-enye ha na ụmụ* ha ndị ga-anọchi ha.’+
9 “M gwakwara unu n’oge ahụ, sị, ‘Naanị m agaghị enwe ike idu unu.+ 10 Jehova bụ́ Chineke unu emeela ka unu mụbaa. Taa, unu dịzi ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe.+ 11 Ka Jehova, bụ́ Chineke nna nna unu hà, mee ka unu mụbakwuo+ okpukpu otu puku karịa ole unu dị, ka ọ gọziekwa unu otú o kwere unu ná nkwa.+ 12 Olee otú naanị m ga-esi buru ibu unu na nsogbu unu na okwu na ụka unu?+ 13 Sinụ n’ebo unu niile họpụta ụmụ nwoke ma ihe, ndị nwere uche, na ndị ma nke a na-akọ. M ga-eme ha ndị isi unu.’+ 14 Unu gwara m, sị, ‘Ihe ị gwara anyị mee dị mma.’ 15 M wee kpọọ ndị isi ebo unu niile, bụ́ ụmụ nwoke ma ihe, ndị makwa nke a na-akọ. M mere ha ndị isi unu, ya bụ, ndị isi otu puku otu puku mmadụ, ndị isi otu narị otu narị mmadụ, ndị isi mmadụ iri ise mmadụ iri ise, ndị isi mmadụ iri mmadụ iri, nakwa ndị ọzọ bụ́ ndị isi n’ebo unu.+
16 “N’oge ahụ, m gwara ndị ikpe unu, sị, ‘Mgbe unu na-ekpere ụmụnne unu ikpe, kpeenụ ikpe ziri ezi+ n’etiti mmadụ na nwanne ya ma ọ bụ onye mbịarambịa.+ 17 Unu elela mmadụ anya n’ihu mgbe unu na-ekpe ikpe.+ Unu ga-ege ma onye ukwu ma onye nta ntị.+ Unu atụla mmadụ egwu+ n’ihi na ọ bụ Chineke ka unu na-ekpere ikpe.+ E nwee ikpe siiri unu oké ike, unu ga-ewetara m ya, m ga-elebakwa ya anya.’+ 18 N’oge ahụ, m nyere unu ntụziaka banyere ihe niile unu ga-eme.
19 “Anyị sizi na Horeb pụọ, si ná nnukwu ala ịkpa niile na-atụ ụjọ gafee,+ otú Jehova bụ́ Chineke anyị nyere anyị n’iwu, ya bụ, ala ịkpa unu hụrụ n’ụzọ e si aga n’ala ndị Amọraịt bụ́ ugwu ugwu.+ Anyị mechaziri bịarute Kedesh-bania.+ 20 M wee sị unu, ‘Unu abịarutela n’ala ndị Amọraịt bụ́ ugwu ugwu, nke Jehova bụ́ Chineke anyị na-enye anyị. 21 Lee, Jehova bụ́ Chineke unu enyefeela unu ala a. Gbagoonụ weghara ya, otú Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà gwara unu.+ Unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ.’
22 “Ma, unu niile bịakwutere m, sị, ‘Ka anyị ziga ụmụ nwoke ka ha buru ụzọ gaa nyopụta otú ala ahụ dị, bịazie kọọrọ anyị ụzọ anyị ga-esi nakwa ụdị obodo ndị anyị ga-ahụ.’+ 23 Ihe ahụ unu kwuru dị m mma. N’ihi ya, m họpụtara ụmụ nwoke iri na abụọ n’ime unu, otu onye n’ebo nke ọ bụla.+ 24 Ha gawara, gbagoo n’ebe bụ́ ugwu ugwu+ ma ruo na Ndagwurugwu Eshkọl. Ha wee nyopụta otú ọ dị. 25 Ha buuru ụfọdụ n’ime mkpụrụ dị n’ala ahụ butere anyị. Ha kọkwaara anyị, sị, ‘Ala Jehova bụ́ Chineke anyị na-enye anyị dị mma.’+ 26 Ma unu ekweghị agbago, unu nupụkwara isi n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu nyere.+ 27 Unu nọ n’ụlọikwuu unu na-atamu ntamu, sị, ‘Ọ bụ maka na Jehova kpọrọ anyị asị mere o ji kpọpụta anyị n’Ijipt ka o nyefee anyị n’aka ndị Amọraịt ka ha laa anyị n’iyi. 28 Olee ụdị ebe anyị na-aga? Ụmụnne anyị mere ka obi mapụ anyị.*+ Ha sịrị: “Ndị bi n’ebe ahụ dị ukwuu ma too ogologo karịa anyị. Obodo ha dị ukwuu, a rụsikwara ha ike ruo n’eluigwe.*+ Anyị hụkwara ndị Anakim+ n’ebe ahụ.”’
29 “M wee sị unu, ‘Unu atụla ụjọ, unu atụkwala egwu n’ihi ha.+ 30 Jehova bụ́ Chineke unu na-ebutere unu ụzọ. Ọ ga-alụkwara unu agha+ otú o mere n’Ijipt n’ihu unu.+ 31 Unu hụkwara n’ala ịkpa otú Jehova bụ́ Chineke unu si kuru unu n’ebe niile unu gara, otú nwoke si eku nwa ya nwoke, ruo mgbe unu rutere ebe a.’ 32 Ma n’agbanyeghị ihe a niile, unu enweghị okwukwe na Jehova bụ́ Chineke unu,+ 33 onye na-ebutere unu ụzọ ka ọ chọtara unu ebe unu ga-ama ụlọikwuu. O ji ọkụ duo unu n’abalị, jirikwa ígwé ojii duo unu n’ehihie ka o wee gosi unu ụzọ unu kwesịrị iso.+
34 “N’oge ahụ niile, Jehova nụrụ ihe unu na-ekwu. Iwe wee wee ya, ya aṅụọ iyi, sị,+ 35 ‘E nweghị otu onye n’ime ụmụ nwoke so n’ọgbọ ọjọọ a ga-ahụ ezigbo ala ahụ m ṅụrụ iyi na m ga-enye nna nna unu hà,+ 36 ma e wepụ Keleb nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ya. M ga-enyekwa ya na ụmụ ya ala ahụ ọ gara na ya n’ihi na o ji obi ya niile soro Jehova.+ 37 (Jehova wesadịrị m iwe n’ihi unu. Ọ sịrị m, “Gịnwa agaghịkwa abanye n’ebe ahụ.+ 38 Ọ bụ Joshụa nwa Nọn, onye na-ejere gị ozi,*+ ga-abanye n’ala ahụ.’+ Mee ka ọ dị ike+ n’ihi na ọ bụ ya ga-eduru ndị Izrel banye n’ala ahụ ka ha nweta ya.”) 39 Ọ bụ ụmụaka unu, ndị unu kwuru na a ga-achịkọrọ+ na ụmụ unu ndị nwoke ndị na-amaghị ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ taa, ga-abanye n’ebe ahụ. Ọ bụkwa ha ka m ga-enye ya ka ha biri na ya.+ 40 Ma ununwa, tụgharịanụ soro ụzọ Oké Osimiri Uhie gawa n’ala ịkpa.’+
41 “Unu wee sị m, ‘Anyị emehiela Jehova. Anyị ga-agbago n’ugwu ahụ gaa lụọ ọgụ otú Jehova bụ́ Chineke anyị nyere anyị n’iwu.’ Onye ọ bụla n’ime unu wee kere ngwá agha ya. Unu chekwara na ịgbago n’ugwu ahụ dị mfe.+ 42 Ma Jehova sịrị m, ‘Gwa ha, sị: “Unu agbagola ịlụ agha n’ihi na agaghị m anọnyere unu.+ Ọ bụrụ na unu agbagoo, ndị iro unu ga-emeri unu.”’ 43 M gwara unu ihe a, ma unu egeghị ntị. Kama unu nupụrụ isi n’iwu Jehova nyere. Unu gbalịkwara ka unu gbagoo n’ugwu ahụ maka na unu dị mpako. 44 Ndị Amọraịt, bụ́ ndị bi n’ugwu ahụ, wee pụta ịlụso unu agha. Ha chụwara unu ọsọ ka aṅụ. Ha chụsasịkwara unu ruo Sia, ruokwa Họma. 45 Unu wee lọta bewe ákwá n’ihu Jehova. Ma Jehova egeghị unu ntị, ọ tụpụrụghị unu ọnụ. 46 Ọ bụ ya mere unu ji biri na Kedesh ruo ọtụtụ ụbọchị ahụ unu biri na ya.
2 “Anyị wee tụgharịa si n’ụzọ gara Oké Osimiri Uhie gawa n’ala ịkpa, otú Jehova gwara m.+ Anyị nọ na-agagharị n’Ugwu Sia ruo ọtụtụ ụbọchị. 2 N’ikpeazụ, Jehova gwara m, sị, 3 ‘O teela unu gagharịwara n’ugwu a. Tụgharịanụ gawa n’ebe ugwu. 4 Nyekwa ndị Izrel iwu, sị: “Unu ga-esi na Sia gafere, bụ́ ala ebe ụmụnne unu, bụ́ ụmụ Ịsọ,+ bi.+ Egwu unu ga-ejide ha.+ Kpacharanụ anya. 5 Unu alụsola ha ọgụ* n’ihi na agaghị m enye unu ala ha ọ bụla. Agaghịdị m enye unu ihe ruru otu ọbụ ụkwụ na ya n’ihi na m nyela Ịsọ Ugwu Sia ka ọ bụrụ nke ya.+ 6 Unu ga-akwụ ha ụgwọ nri unu ga-eri, unu ga-akwụkwa ha ụgwọ mmiri unu ga-aṅụ.+ 7 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu agọziela unu n’ihe niile unu merela. Ọ ma nnọọ otú unu si na-agagharị ná nnukwu ala ịkpa a. Jehova bụ́ Chineke unu nọnyeere unu afọ iri anọ a, e nweghịkwa ihe kọrọ unu.”’+ 8 Anyị wee si na nke ụmụnne anyị, bụ́ ụmụ Ịsọ+ ndị bi na Sia, gafere. Anyị abanyeghị n’ụzọ e si aga Araba, Ilat, nakwa Iziọn-giba.+
“Anyị tụgharịziri soro ụzọ gawara ala ịkpa Moab.+ 9 Jehova wee sị m, ‘Esesala Moab okwu ma ọ bụ lụso ya agha n’ihi na agaghị m enye gị ala ya ọ bụla ka ọ bụrụ nke gị maka na ọ bụ ụmụ Lọt ka m nyere Aa ka ọ bụrụ nke ha.+ 10 (Ndị Imim+ bibu n’ebe ahụ. Ha siri ike, dịkwa ọtụtụ ma too ogologo ka ndị Anakim. 11 E wekwaara ndị Refeyim+ ka ndị Anakim.+ Ndị Moab na-akpọbu ha ndị Imim. 12 Ndị Horaịt+ bibu na Sia, ma ụmụ Ịsọ napụrụ ha ala ha, bibie ha wee bichie n’ebe ha bi,+ otú ndị Izrel ga-eme ala ha ga-enweta, bụ́ nke Jehova ga-enye ha.) 13 Ugbu a, gawanụ ka unu gafere Ndagwurugwu Zired.’ Anyị wee gafere Ndagwurugwu Zired.+ 14 Anyị si na Kedesh-bania gagide ije gafere Ndagwurugwu Zired. Ije a were anyị afọ iri atọ na asatọ, ruo mgbe ọgbọ ụmụ nwoke so ná ndị agha nwụchara, otú Jehova ṅụụrụ ha iyi.+ 15 Jehova ji ike* ya bibie ha ruo mgbe ha nwụchara.+
16 “Ozugbo ụmụ nwoke niile ahụ so ná ndị agha nwụchara,+ 17 Jehova gwara m okwu ọzọ, sị, 18 ‘Taa, unu ga-esi n’ala Moab, ya bụ, Aa, gafere. 19 Mgbe unu ga-erute n’ebe ndị Amọn bi, unu alụsola ha ọgụ, unu akpasukwala ha iwe n’ihi na agaghị m enye unu ala ọ bụla n’ala ndị Amọn ka ọ bụrụ nke unu, n’ihi na enyela m ya ụmụ Lọt ka ọ bụrụ nke ha.+ 20 E webuuru ya ka ala ndị Refeyim.+ (Ndị Refeyim bibu na ya, ndị Amọn na-akpọbukwa ha ndị Zamzọmim. 21 Ha dị ike, dị ọtụtụ, tookwa ogologo ka ndị Anakim.+ Ma, Jehova nyeere ndị Amọn aka, ha alaa ha n’iyi, chụpụ ha ma bichie n’ala ha. 22 Ọ bụ ihe o meere ụmụ Ịsọ, bụ́ ndị bi na Sia,+ mgbe o nyeere ha aka ha alaa ndị Horaịt n’iyi,+ ha enwee ike ịnapụ ha ala ha ma bichie ya ruo taa. 23 Ma ndị Avim bi n’ógbè n’ógbè ruo Gaza+ ruo mgbe ndị Kaftọrim,+ bụ́ ndị si na Kaftọ,* bibiri ha ma bichie ha.)
24 “‘Bilienụ, gafere Ndagwurugwu Anọn.+ Lee, m nyefeela Saịhọn+ onye Amọraịt, bụ́ eze Heshbọn, n’aka unu. N’ihi ya, malitenụ iweghara ala ya, lụsokwanụ ya agha. 25 Taa, m ga-amalite ime ka ndị niile nọ n’ụwa,* bụ́ ndị ga-anụ akụkọ unu, na-atụ unu egwu. Obi ga-alọ ha mmiri, ha ga-amakwa jijiji n’ihi unu.’+
26 “M wee si n’ala ịkpa Kedemọt+ zigara Eze Saịhọn onye na-achị Heshbọn ndị ozi ka ha gwa ya okwu ga-eme ka anyị na ya dịrị n’udo.+ M sịrị ya, 27 ‘Ka anyị si n’ala gị gafere. Ọ bụ n’okporo ụzọ ka anyị ga-aga. Anyị agaghị abanye n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.+ 28 Ọ bụ naanị nri ị ga-eresị anyị ka anyị ga-eri, ọ bụkwa naanị mmiri ị ga-eresị anyị ka anyị ga-aṅụ. Naanị ihe anyị chọrọ bụ ka i kwe ka anyị jiri ụkwụ gafere. 29 Ọ bụ ihe ụmụ Ịsọ ndị bi na Sia na ndị Moab ndị bi na Aa meere anyị, ruo mgbe anyị gafere Osimiri Jọdan banye n’ala Jehova bụ́ Chineke anyị na-enye anyị.’ 30 Ma Eze Saịhọn onye na-achị Heshbọn ekweghị ka anyị gafere n’ihi na Jehova bụ́ Chineke anyị* kwere ka obi ya kpọchie,+ ka o wee nyefee ya n’aka anyị otú o merela.+
31 “Jehova wee sị m, ‘Lee, amalitela m inyefe Saịhọn na ala ya n’aka unu. Malitenụ iweghara ala ya.’+ 32 Mgbe Saịhọn na ndị obodo ya niile pụtara ka ha lụso anyị agha na Jehaz,+ 33 Jehova bụ́ Chineke anyị nyefere ya n’aka anyị, anyị wee merie ya na ụmụ ya ndị nwoke, na ndị obodo ya niile. 34 Anyị weghaara obodo ya niile n’oge ahụ ma bibie ha niile, gbuokwa ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka. E nweghị onye anyị hapụrụ ndụ.+ 35 Ọ bụ naanị anụ ụlọ na ihe ndị anyị kwatara n’obodo ndị anyị weghaara ka anyị chịkọọrọ. 36 E nweghị obodo siiri anyị ike imeri malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ Ndagwurugwu Anọn (nakwa obodo dị na ndagwurugwu ahụ), ruo Gilied. Jehova bụ́ Chineke anyị nyefere ha niile n’aka anyị.+ 37 Ma, anyị agaghị n’ala ndị Amọn,+ ya bụ, Ndagwurugwu Jabọk niile+ na obodo ndị dị n’ebe bụ́ ugwu ugwu. Anyị agaghịkwa n’ebe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke anyị na-achọghị ka anyị gaa.
3 “Anyị wee tụgharịa gbagowe n’Ụzọ E Si Aga Beshan. Ọg eze Beshan na ndị agha ya niile pụtara ịlụso anyị agha n’Edraị.+ 2 Jehova wee sị m, ‘Atụla ya egwu n’ihi na m ga-enyefe ya na ndị agha ya niile nakwa ala ya n’aka gị. Ị ga-eme ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọraịt, onye bibu na Heshbọn.’ 3 Jehova bụ́ Chineke anyị nyefekwara Eze Ọg onye na-achị Beshan n’aka anyị, ya na ndị agha ya niile. Anyị nọ na-egbu ha ruo mgbe a na-enweghịzi onye obodo ya fọrọ. 4 Anyị wee weghara obodo ya niile. E nweghị obodo anyị na-anapụghị ha. Anyị napụrụ ha obodo iri isii n’ógbè Agọb niile, ya bụ, alaeze Ọg nke dị n’obodo Beshan.+ 5 A rụsiri obodo ndị a niile anyị weghaara ike. Ha nwere mgbidi dị elu na ọnụ ụzọ àmà na ihe e ji atụchi ha, nweekwa ọtụtụ ime ime obodo. 6 Ma anyị bibiri ha+ otú anyị bibiri Eze Saịhọn onye chịrị Heshbọn. Anyị bibiri obodo ahụ niile, gbuokwa ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka.+ 7 Anyị wee chịkọrọ anụ ụlọ ha niile na ihe niile anyị kwatara n’obodo ndị ahụ.
8 “N’oge ahụ, anyị weghaara ala ndị eze abụọ bụ́ ndị Amọraịt,+ ndị nọ ná mpaghara Osimiri Jọdan, malite na Ndagwurugwu Anọn ruo n’Ugwu Hemọn+ 9 (ugwu ndị Saịdọn na-akpọbu Siriọn, ndị Amọraịt na-akpọbukwa ya Sina), 10 obodo niile ndị dị n’ala dị larịị, Gilied niile, na Beshan niile ruo Saleka na Edraị,+ bụ́ obodo ndị dị n’alaeze Ọg n’obodo Beshan. 11 N’ihi na ọ bụ Eze Ọg onye chịrị Beshan bụ onye ikpeazụ fọrọ ná ndị Refeyim. Ọ bụ ígwè ka e ji rụọ ihe e ji dọsa ozu* ya. Ọ ka dịkwa na Raba, bụ́ obodo ndị Amọn. Ọ dị kubit* itoolu n’ogologo, dịrịkwa kubit anọ n’obosara, ma e jiri ezigbo kubit tụọ ya. 12 N’oge ahụ, anyị weghaara ala a: malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ Ndagwurugwu Anọn, na ọkara ala Gilied bụ́ ugwu ugwu. M nyela ụmụ Ruben na ụmụ Gad+ obodo ya dị iche iche. 13 M nyekwala ọkara ebo Manase+ ebe fọrọ na Gilied nakwa Beshan niile bụ́ alaeze Ọg. A mabu ógbè Agọb niile, nke dị na Beshan, ka ala ndị Refeyim.
14 “Jeya+ nwa Manase weere ógbè Agọb niile+ ruo n’ókè ndị Geshọ na ndị Meaka.+ Ọ kpọkwara ime ime obodo ndị dị na Beshan aha ya, ya bụ, Havọt-jeya.*+ Ha na-aza aha ahụ ruo taa. 15 M nyela Mekia Gilied.+ 16 M nyekwala ụmụ Ruben na ụmụ Gad+ ala malite na Gilied ruo na Ndagwurugwu Anọn, (etiti ndagwurugwu ahụ bụ ókè ya) ruokwa Jabọk, ya bụ, ndagwurugwu nke bụ́ ókè ndị Amọn, 17 nakwa Araba na Osimiri Jọdan na ókè ya, malite na Kineret ruo n’Oké Osimiri Araba, ya bụ, Oké Osimiri Nnu, n’ala ala mkpọda Pisga n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ.+
18 “M wee nye unu* iwu, sị: ‘Jehova bụ́ Chineke unu enyela unu ala a ka ọ bụrụ nke unu. Ndị dike unu niile ga-ejikere agha ma gafee n’ihu ụmụnne unu, bụ́ ndị Izrel.+ 19 Ọ bụ naanị ndị nwunye unu, ụmụ unu, na anụ ụlọ unu ga-anọrọ n’obodo ndị m nyere unu (o doro m anya na unu nwere ọtụtụ anụ ụlọ), 20 ruo mgbe Jehova ga-eme ka ụmụnne unu zuru ike, otú o meere unu, ha ebirikwa n’ala Jehova bụ́ Chineke unu ga-enye ha n’ofe Osimiri Jọdan. Mgbe ahụ, onye ọ bụla n’ime unu ga-alọghachi n’ebe o ketara ala n’ala m nyere unu.’+
21 “N’oge ahụ, m nyere Joshụa iwu a:+ ‘I jirila anya gị hụ ihe Jehova bụ́ Chineke unu mere eze abụọ ndị a. Jehova ga-eme alaeze niile unu ga-agafe otu ihe ahụ.+ 22 Unu atụla ha egwu n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-alụrụ unu agha.’+
23 “M rịọrọ Jehova n’oge ahụ, sị, 24 ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ị malitela ime ka ohu gị hụ na ị dị ebube, hụkwa na ị dị ike,*+ n’ihi na olee chi nọ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa nke na-arụ ụdị nnukwu ọrụ ndị ị na-arụ?+ 25 Biko, ka m gafeenụ hụ ezigbo ala ahụ nke dị n’ofe Osimiri Jọdan, bụ́ ọmarịcha ebe a bụ́ ugwu ugwu nakwa Lebanọn.’+ 26 Ma Jehova ka nọ na-ewere m iwe n’ihi unu,+ o geghịkwa m ntị. Kama, Jehova sịrị m, ‘O zuolara gị! Agwakwala m okwu banyere ihe a ọzọ. 27 Gbagoo n’elu Pisga,+ lee anya n’ebe ọdịda anyanwụ na n’ebe ugwu na n’ebe ndịda nakwa n’ebe ọwụwa anyanwụ. Jiri anya gị hụrụ ala ahụ n’ihi na ị gaghị agafe Osimiri Jọdan a.+ 28 Mee Joshụa onye ndú,+ gbaa ya ume ma mee ka ọ dị ike, n’ihi na ọ bụ ya ga-ebutere ndị a ụzọ.+ Ọ bụkwa ya ga-eduru ha ka ha nweta ala ahụ ị ga-ahụ.’ 29 Ihe a niile mere mgbe anyị bi na ndagwurugwu nke dị n’ihu Bet-piọ.+
4 “Ugbu a, ndị Izrel, geenụ ntị ná ntụziaka na iwu ndị m na-akụziri unu ka unu na-edebe, ka unu wee dị ndụ+ banye n’ala Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà na-enye unu ma weghara ya. 2 Unu etinyela ihe n’ihe m na-enye unu n’iwu, unu ewepụkwala ihe na ya,+ ka unu wee na-eme ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere n’iwu, nke m na-agwa unu.
3 “Unu ejirila anya unu hụ ihe Jehova mere n’ihi Bel nke Piọ. Jehova bụ́ Chineke unu bibiri onye ọ bụla n’ime unu nke sooro Bel nke Piọ.+ 4 Ma unu niile ndị na-ahapụghị Jehova bụ́ Chineke unu dịcha ndụ taa. 5 Lee, m kụzierela unu ntụziaka na iwu dị iche iche,+ otú Jehova bụ́ Chineke m nyere m n’iwu, ka unu wee na-eme ha n’ala ahụ unu ga-ebi na ya. 6 Lezienụ anya na-eme ha+ n’ihi na ọ ga-eme ka ndị ga-anụ banyere ntụziaka niile a mata na unu ma ihe+ nakwa na unu na-aghọta ihe.+ Ha ga-asịkwa, ‘N’eziokwu, mba ukwu a bụ mba ndị bi na ya ma ihe, na-aghọtakwa ihe.’+ 7 N’ihi na olee mba ukwu nke nwere chi nọ ya nso otú Jehova bụ́ Chineke anyị si nọrọ anyị nso mgbe ọ bụla anyị kpọrọ ya?+ 8 Oleekwa mba ukwu nke nwere ezigbo ntụziaka na ihe ndị e kpebiri ka ndị bi na ya na-eme bụ́ ndị yiri Iwu a niile m na-enye unu taa?+
9 “Lezienụ anya, kpachapụrụnụ onwe unu anya, ka unu ghara ichefu ihe ndị anya unu hụrụ, ka ha gharakwa ịpụ apụ n’obi unu n’oge niile unu dị ndụ. Unu ga-emekwa ka ụmụ unu na ụmụ ụmụ unu mara ha.+ 10 N’ụbọchị unu guzo n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu na Horeb, Jehova sịrị m, ‘Kpọkọtara m ndị a niile ka m mee ka ha nụ okwu m,+ ka ha wee mụta ịtụ egwu m+ n’oge niile ha ga-adị ndụ n’ala ahụ, ka ha kụziekwara ya ụmụ ha.’+
11 “Unu wee bịa nso ma guzo n’ala ala ugwu ahụ. Ugwu ahụ nọ na-ere ọkụ, anwụrụ ọkụ ya rukwara na mbara igwe. Itiri na oké ọchịchịrị gbara, ígwé ojii gbachikwara.+ 12 Jehova wee si n’ọkụ ahụ gwawa unu okwu.+ Unu nụrụ naanị okwu, ma e nweghị onye unu hụrụ.+ Naanị olu ka unu nụrụ.+ 13 O wee gwa unu banyere ọgbụgba ndụ unu na ya,+ nke o nyere unu iwu ka unu na-edebe, ya bụ, Iwu Iri ahụ.*+ Mgbe e mechara, o dere ha ná mbadamba nkume abụọ.+ 14 N’oge ahụ, Jehova nyere m iwu ka m kụziere unu ntụziaka na iwu dị iche iche, bụ́ ndị unu ga na-edebe n’ala unu ga-abanye iweghara.
15 “N’ihi ya, kpachapụrụnụ onwe unu anya, ebe ọ bụ na e nweghị onye unu hụrụ n’ụbọchị ahụ Jehova si n’etiti ọkụ gwa unu okwu na Horeb, 16 ka unu ghara imere onwe unu arụsị a pịrị apị nke yiri ihe ọ bụla, si otú ahụ merụọ onwe unu. Unu emela ihe ọ bụla yiri nwoke ma ọ bụ nwaanyị,+ 17 ihe yiri anụmanụ ọ bụla dị n’ụwa ma ọ bụ ihe yiri nnụnụ ọ bụla na-efe na mbara igwe,+ 18 ihe yiri ihe ọ bụla na-arịgharị n’ala ma ọ bụ ihe yiri azụ̀ ọ bụla dị na mmiri ndị dị n’ụwa.+ 19 Mgbe unu lere anya n’eluigwe hụ anyanwụ na ọnwa na kpakpando, ya bụ, ihe niile dị n’eluigwe, unu ekwela ka a rafuo unu, unu ewee kpọwara ha isiala ma fewe ha.+ Jehova bụ́ Chineke unu enyela ha ndị niile nọ n’ụwa* niile. 20 Ma, ọ bụ unu ka Jehova si n’Ijipt, n’ọkụ na-agbaze ígwè, kpọpụta, ka unu bụrụ ndị nke ya,*+ otú unu bụ nke ya taa.
21 “Jehova wesara m iwe n’ihi unu,+ ọ ṅụkwara iyi na agaghị m agafe Osimiri Jọdan ma ọ bụ banye n’ezigbo ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ ihe unu ketara.+ 22 N’ihi na m ga-anwụ n’ala a. Agaghị m agafe Osimiri Jọdan.+ Ma unu ga-agafe ya weghara ezigbo ala ahụ. 23 Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ unu na Jehova bụ́ Chineke unu gbara.+ Unu emekwarala onwe unu arụsị a pịrị apị, nke yiri ihe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu iwu banyere ya.+ 24 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ ọkụ na-erechapụ ihe,+ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.+
25 “Ọ bụrụ na unu amụọ ụmụ, mụtakwa ụmụ ụmụ, ọ bụrụkwa na unu ebie ogologo oge n’ala ahụ ma mee omume ọjọọ, meekwa ụdị arụsị ọ bụla a pịrị apị+ ma mee ihe dị njọ n’anya Jehova bụ́ Chineke unu ka unu kpasuo ya iwe,+ 26 eluigwe na ụwa bụụrụ m ndị akaebe taa na a ga-ebibirịrị unu ngwa ngwa n’ala ahụ unu na-agafe Osimiri Jọdan ka unu weghara. Unu agaghị ebite aka na ya, kama a ga-ala unu n’iyi kpamkpam.+ 27 Jehova ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche.+ Naanị mmadụ ole na ole n’ime unu ga-afọ+ ná mba ndị Jehova ga-achụga unu. 28 N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche ndị mmadụ ji osisi na nkume mee,+ chi ndị na-enweghị ike ịhụ ụzọ ma ọ bụ ịnụ ihe ma ọ bụ iri ihe ma ọ bụ ịnụ ísì.
29 “Ọ bụrụ na unu anọrọ n’ebe ahụ chọọ Jehova bụ́ Chineke unu, unu ga-achọta ya+ ma unu jiri obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile jụọ ase ya.+ 30 Mgbe unu na-ahụsi anya, ihe a niile emechaakwa mee unu, unu ga-alọghachikwute Jehova bụ́ Chineke unu ma gee ntị n’olu ya.+ 31 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ Chineke na-eme ebere.+ Ọ gaghị ahapụ unu ma ọ bụ bibie unu ma ọ bụ chefuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu hà gbara.+
32 “Cheenụ echiche banyere oge gara aga tupu oge unu, malite n’ụbọchị Chineke kere mmadụ n’ụwa. Sikwanụ n’otu nsọtụ eluigwe chọwa ruo na nsọtụ ọzọ nke eluigwe. Ụdị nnukwu ihe a ò metụla? È nwere onye nụtụrụla ihe dị ka ya?+ 33 È nwere ndị ọzọ nụtụrụla olu Chineke ka o si n’ọkụ na-ekwu okwu otú unu nụrụ ya ma ka dịrị ndụ?+ 34 Ka è nwetụla mgbe Chineke ji ikpe ya, ihe àmà, ọrụ ebube,+ agha,+ aka ya siri ike,+ ike ya, na ihe ndị na-atụ egwu o mere+ gbalịa ka o si ná mba ọzọ kpọpụtara onwe ya otu mba, otú Jehova bụ́ Chineke unu meere unu n’Ijipt n’ihu unu? 35 E gosila unu ihe ndị a ka unu wee mara na Jehova bụ ezi Chineke.+ E nweghị Chineke ọzọ ma e wepụ ya.+ 36 O mere ka unu nụ olu ya mgbe o si n’eluigwe na-agwa unu okwu ka ọ dọọ unu aka ná ntị. O mekwara ka unu hụ oké ọkụ ya n’ụwa, unu sikwa n’ọkụ nụ olu ya.+
37 “Ebe ọ bụ na ọ hụrụ nna nna unu hà n’anya ma họrọ ụmụ* ha ndị nọchiri ha,+ ọ nọnyeere unu ma jiri ike ya dị ukwuu kpọpụta unu n’Ijipt. 38 Ọ chụpụụrụ unu mba ndị dị ukwuu ma dị ike karịa unu, ka ọ kpọbata unu n’ala ha ma nye ya unu ka ọ bụrụ nke unu, otú ọ bụ nke unu taa.+ 39 N’ihi ya, maranụ taa, burukwanụ n’obi na Jehova bụ ezi Chineke n’eluigwe nakwa n’ụwa.+ E nweghị Chineke ọzọ.+ 40 Unu ga na-edebe iwu ya na ntụziaka ya ndị m na-agwa unu taa, ka ihe wee gaziere unu na ụmụ unu ndị ga-anọchi unu, ka unu wee bitee aka n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu.”+
41 N’oge ahụ, Mosis wepụtara obodo atọ n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan.+ 42 Ọ bụrụ na mmadụ egbuo mmadụ ibe ya n’amaghị ụma, ya abụrụkwa na ọ kpọbughị ya asị,+ ọ ga-agbaga n’otu n’ime obodo ndị a wee dịrị ndụ.+ 43 Obodo nke mbụ bụ Biza+ nke dị n’ala ịkpa, n’ala dị larịị. Ọ bụ maka ụmụ Ruben. Nke abụọ bụ Remọt+ nke dị na Gilied. Ọ bụ maka ụmụ Gad. Nke atọ bụ Golan+ nke dị na Beshan. Ọ bụ maka ụmụ Manase.+
44 Ihe a bụ Iwu+ Mosis nyere ndị Izrel. 45 Ihe ndị a bụ ihe Mosis chetaara ndị Izrel, na ntụziaka na iwu ndị o nyere ha. Mosis gwara ha ihe ndị a mgbe ha pụtachara n’Ijipt,+ 46 ná mpaghara Osimiri Jọdan, na ndagwurugwu chere Bet-piọ ihu,+ n’ala Eze Saịhọn onye chịrị ndị Amọraịt, onye biri na Heshbọn,+ onye Mosis na ndị Izrel meriri mgbe ha pụtachara n’Ijipt.+ 47 Ha wee weghara ala ya nakwa ala Eze Ọg+ onye chịrị Beshan, ya bụ, ndị eze abụọ chịrị ndị Amọraịt bụ́ ndị bi n’ógbè dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, 48 malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ Ndagwurugwu Anọn, ruo n’Ugwu Sayọn, ya bụ, Hemọn,+ 49 nakwa Araba niile nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, ruo n’Oké Osimiri Araba,* n’ala ala mkpọda Pisga.+
5 Mosis wee kpọkọta ndị Izrel niile, sị ha: “Ndị Izrel, nụrụnụ ntụziaka na iwu ndị m na-enye unu taa. Mụtanụ ha, leziekwanụ anya ka unu na-edebe ha. 2 Anyị na Jehova bụ́ Chineke anyị gbara ndụ na Horeb.+ 3 Ọ bụghị nna nna anyị hà ka ha na Jehova gbara ndụ a, kama ọ bụ anyị na ya, ya bụ, anyị niile ndị dị ndụ ebe a taa. 4 Jehova si n’ọkụ+ gwa unu okwu ihu na ihu n’ugwu ahụ. 5 M guzo n’agbata unu na Jehova n’oge ahụ+ ka m gwa unu ihe Jehova kwuru maka na unu tụrụ egwu n’ihi ọkụ ahụ, unu agbagoghịkwa n’ugwu ahụ.+ Chineke sịrị:
6 “‘Abụ m Jehova bụ́ Chineke gị, onye kpọpụtara gị n’Ijipt, bụ́ ebe ị nọ na-agba ohu.*+ 7 Ya enwela mgbe ị ga-enwe chi ọ bụla ọzọ ma e wepụ m.+
8 “‘Emerela onwe gị arụsị a pịrị apị+ ma ọ bụ ihe yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ ihe dị n’ụwa ma ọ bụ ihe dị na mmiri ndị dị n’ụwa. 9 Akpọrọla ha isiala, ekwekwala ka e mee ka i fee ha ofufe,+ n’ihi na mụnwa bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.+ M na-ata ụmụ ndị kpọrọ m asị ahụhụ, na-atakwa ọgbọ ha nke atọ nakwa ọgbọ ha nke anọ ahụhụ n’ihi mmehie ndị nna ha.+ 10 Ma m na-egosi otu puku ọgbọ nke ndị hụrụ m n’anya ma na-edebe iwu m na m hụrụ ha n’anya.
11 “‘Ejila aha Jehova bụ́ Chineke gị eme ihe efu+ n’ihi na Jehova ga-ata onye ọ bụla ji aha ya eme ihe efu ahụhụ.+
12 “‘Debe Ụbọchị Izu Ike ka i doo ya nsọ, otú Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị n’iwu.+ 13 Ị ga-eji ụbọchị isii jee ozi ma rụọ ọrụ gị niile,+ 14 ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike a ga na-edebere Jehova bụ́ Chineke gị.+ Arụla ọrụ ọ bụla,+ ma gị ma nwa gị nwoke ma nwa gị nwaanyị ma ohu gị nwoke ma ohu gị nwaanyị ma ehi gị ma jakị gị ma anụ ụlọ gị ọ bụla ma onye mbịarambịa nọ n’obodo gị,+ ka ohu gị nwoke na ohu gị nwaanyị wee zuo ike otú ị ga-ezu.+ 15 Cheta na ị nọ na-agba ohu n’Ijipt nakwa na Jehova bụ́ Chineke gị ji aka ya siri ike na ike ya kpọpụta gị n’ebe ahụ.+ Ọ bụ ya mere Jehova bụ́ Chineke gị ji nye gị iwu ka ị na-edebe Ụbọchị Izu Ike.
16 “‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,+ otú Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị n’iwu, ka i wee dị ogologo ndụ, ihe agaziekwara gị n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị ga-enye gị.+
20 “‘Agbagidela mmadụ ibe gị akaebe ụgha.+
21 “‘Agụụ nwunye mmadụ ibe gị agụla gị.+ Agụụ iweghara ụlọ mmadụ ibe gị ma ọ bụ ubi ya ma ọ bụ ehi ya ma ọ bụ jakị ya agụla gị. Agụụ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị ma ọ bụ ihe ọ bụla bụ́ nke mmadụ ibe gị agụla gị.’+
22 “Ọ bụ iwu ndị a ka Jehova nyere ọgbakọ unu niile n’ugwu ahụ. O si n’ọkụ, n’ígwé ojii, nakwa n’oké ọchịchịrị+ kwuo ya n’olu dara ụda, e nweghịkwa ihe ọzọ ọ gbakwụnyere na ya. O deziri ha ná mbadamba nkume abụọ ma nye m ha.+
23 “Ma ozugbo unu nụrụ olu ahụ nke si n’ọchịchịrị ahụ na-ekwu okwu n’oge ugwu ahụ nọ na-ere ọkụ,+ ndị niile bụ́ ndị isi n’ebo unu na ndị okenye unu bịakwutere m. 24 Unu wee sị, ‘Jehova bụ́ Chineke anyị egosila anyị na ọ dị ebube, meekwa ka anyị hụ na ọ dị ike, anyị esikwala n’ọkụ nụ olu ya.+ Taa, anyị ahụla na Chineke nwere ike ịgwa mmadụ okwu, onye ahụ aka dị ndụ.+ 25 Gịnịzi mere anyị ga-eji akpatara onwe anyị ọnwụ? N’ihi na oké ọkụ a nwere ike iregbu anyị. Ọ bụrụ na anyị anọrọ na-anụ olu Jehova bụ́ Chineke anyị, anyị ga-anwụrịrị. 26 N’ihi na olee onye nụtụrụla olu Chineke dị ndụ ka o si n’ọkụ na-ekwu okwu otú anyị nụrụ ya ma ka dịrị ndụ? 27 Gịnwa gaa nso ka ị nụ ihe niile Jehova bụ́ Chineke anyị ga-ekwu. Ọ bụ gị ga-agwa anyị ihe niile Jehova bụ́ Chineke anyị ga-agwa gị. Anyị ga-egekwa ntị ma mee ha.’+
28 “Jehova nụrụ ihe unu gwara m. Jehova wee sị m, ‘Anụla m ihe ndị a gwara gị. Ihe niile ha kwuru dị mma.+ 29 A sị nnọọ na ha ga-azụ obi ha ka ha na-atụ egwu m mgbe niile+ ma na-edebe ihe niile m nyere n’iwu,+ ihe ga-agaziri ha na ụmụ ha ruo mgbe ebighị ebi.+ 30 Gaa sị ha: “Laghachinụ n’ụlọikwuu unu.” 31 Ma ị ga-eso m nọrọ ebe a ka m mee ka ị mata iwu niile, ntụziaka, na ihe ndị m kpebiri, bụ́ ndị ị ga-akụziri ha, ndị ha ga na-edebekwa n’ala m na-enye ha ka ọ bụrụ nke ha.’ 32 Lezienụ anya ka unu na-eme nnọọ ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu n’iwu.+ Unu ahapụla ya mewe ihe ọzọ.+ 33 Na-emenụ ihe niile Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu n’iwu,+ ka unu wee dị ndụ, ka ihe wee gaziere unu, ka unu wee bitee aka n’ala ahụ unu ga-enweta.+
6 “Ihe ndị a bụ iwu, ntụziaka, na ihe ndị Jehova bụ́ Chineke unu kpebiri, ndị ọ gwara m ka m kụziere unu, ka unu wee na-eme ha mgbe unu gafere n’ala ahụ unu ga-enweta, 2 ka unu wee na-atụ egwu Jehova bụ́ Chineke unu, na-eme ihe niile o kwuru, na-edebekwa iwu ya ndị m na-agwa unu, ma ununwa ma ụmụ unu ma ụmụ ụmụ unu,+ n’oge niile unu dị ndụ, ka unu wee dị ogologo ndụ.+ 3 Unu ga-egekwa ntị, unu Izrel, ma lezie anya na-eme ha eme, ka ihe gaziere unu, unu adịkwa nnọọ ọtụtụ n’ala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,* otú Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà kwere unu ná nkwa.
4 “Nụrụ, Izrel: Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova.+ 5 Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi* gị niile+ na ike gị niile*+ hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya. 6 Ihe ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị. 7 Kụziere ha ụmụ gị+ ka o ruo ha n’obi,* na-ekwukwa banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-aga ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala nakwa mgbe i biliri ọtọ.+ 8 Kee ha n’aka gị ka i wee na-echeta ha. Ha ga-adịkwa ka ihe ị na-ekegide n’egedege ihu gị.*+ 9 Dee ha n’awara ụzọ ụlọ gị nakwa n’ọnụ ụzọ ámá gị.
10 “Mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-akpọbata gị n’ala ọ ṅụụrụ nna nna gị hà, bụ́ Ebreham, Aịzik, na Jekọb iyi na ọ ga-enye gị,+ bụ́ nnukwu obodo mara mma ndị ọ na-abụghị gị rụrụ,+ 11 ụlọ ndị ụdị ihe ọma dị iche iche juru bụ́ ndị ị na-arụghị ọrụ nweta, olulu mmiri ndị ọ na-abụghị gị gwuru, nakwa ubi vaịn na osisi oliv ndị ọ na-abụghị gị kụrụ, gị erie ihe rijuo afọ,+ 12 lezie anya ka ị ghara ichefu Jehova,+ onye kpọpụtara gị n’ala Ijipt, n’ebe ị nọ na-agba ohu.* 13 Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị ga-atụ egwu.+ Ọ bụ ya ka ị ga-efe.+ Ọ bụkwa aha ya ka ị ga-eji aṅụ iyi.+ 14 Unu efela chi ọzọ, chi ọ bụla nke ndị gbara unu gburugburu na-efe,+ 15 n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu, onye nọ n’etiti unu, bụ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.+ Ọ bụrụ na unu efee chi ọzọ, Jehova bụ́ Chineke unu ga-ewesa unu nnukwu iwe,+ ọ ga-ekpochapụkwa unu n’ụwa.+
16 “Unu anwala Jehova bụ́ Chineke unu ọnwụnwa,+ otú unu nwara ya na Masa.+ 17 Jirinụ obi unu niile na-eme ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu n’iwu na ihe ndị ọ na-echetara unu ka unu na-eme nakwa ntụziaka ya. 18 Meenụ ihe ziri ezi na ihe dị mma n’anya Jehova, ka ihe wee gaziere unu, ka unu wee banye ma biri n’ezigbo ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na ọ ga-enye ha.+ 19 Unu ga-achụpụkwa ndị iro unu niile, otú Jehova kwere ná nkwa.+
20 “Mgbe nwa gị ga-ajụ gị n’ọdịnihu, sị, ‘Gịnị mere Jehova bụ́ Chineke anyị ji nye unu iwu ndị a, ntụziaka, na ihe ndị a o kpebiri ka unu na-eme?’ 21 ị ga-agwa nwa gị, sị, ‘Anyị nọ na-agbara Fero ohu n’Ijipt, ma Jehova ji aka ya dị ike kpọpụta anyị n’Ijipt. 22 Jehova wee na-eme ihe àmà ma na-arụ ọrụ ebube ndị dị ukwuu na ndị kpataara Ijipt+ na Fero na ezinụlọ ya niile ahụhụ n’ihu anyị.+ 23 Ọ kpọpụtara anyị n’ebe ahụ ka ọ kpọta anyị ebe a, ka o wee nye anyị ala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna anyị hà iyi na ọ ga-enye ha.+ 24 Jehova wee nye anyị iwu ka anyị na-eme ihe a niile o kwuru ma na-atụ egwu Jehova bụ́ Chineke anyị ka ihe dịrị anyị mma mgbe niile,+ ka anyị wee dị ndụ+ otú anyị dị taa. 25 Ọ bụrụ na anyị erubere Jehova bụ́ Chineke anyị isi wee lezie anya na-edebe iwu a niile otú o nyere anyị ha n’iwu, anyị ga-abụ ndị ezi omume.’+
7 “Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu ga-akpọbata unu n’ala ahụ unu ga-abanye ma biri na ya,+ ọ ga-ekpochapụrụ unu mba ndị dị ọtụtụ,+ ya bụ, ndị Het, ndị Gegash, ndị Amọraịt,+ ndị Kenan, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus,+ mba asaa ndị dị ọtụtụ ma dị ike karịa unu.+ 2 Jehova bụ́ Chineke unu ga-enyefe ha n’aka unu, unu ga-emerikwa ha.+ Hụnụ na unu bibiri ha.+ Unu na ha agbala ndụ. Unu emekwarala ha ebere ọ bụla.+ 3 Unu na ha agọla ọgọ. Unu akpọrọla ụmụ unu ndị nwaanyị kpọnye ụmụ ha ndị nwoke. Unu alụtakwarala ụmụ unu ndị nwoke ụmụ ha ndị nwaanyị.+ 4 N’ihi na ha ga-eme ka ụmụ unu kwụsị ife m wee fewe chi ọzọ dị iche iche.+ Jehova ga-ewesazi unu oké iwe, ọ ga-ebibikwa unu n’egbughị oge.+
5 “Kama, ihe a ka unu ga-eme ha: Kwatusịanụ ebe ịchụàjà ha, kụtusịanụ ogidi arụsị ha,+ gbutusịanụ ogwe osisi arụsị* ha,+ kpọọkwanụ arụsị ha a pịrị apị ọkụ.+ 6 N’ihi na unu bụụrụ Jehova bụ́ Chineke unu ndị dị nsọ, Jehova bụ́ Chineke unu ahọrọkwala unu ka unu bụrụ ndị ya, ndị pụrụ iche n’ime ndị niile nọ n’ụwa.+
7 “Ihe mere Jehova ji hụ unu n’anya ma họrọ unu abụghị maka na unu dị ọtụtụ karịa ndị ọzọ niile,+ n’ihi na ọ bụ unu kacha nta ná ndị niile.+ 8 Kama, ọ bụ maka na Jehova hụrụ unu n’anya nakwa maka na ọ na-emezu iyi ọ ṅụụrụ nna nna unu hà+ mere Jehova ji jiri aka ya dị ike kpọpụta unu, ka o wee napụta unu n’ebe unu nọ na-agba ohu,*+ n’aka Fero eze Ijipt. 9 O dokwara unu anya na Jehova bụ́ Chineke unu bụ ezi Chineke, Chineke e kwesịrị ịtụkwasị obi, onye na-anaghị emebi ọgbụgba ndụ ya na ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe iwu ya gbara, na-ahụkwa ha n’anya* ruo otu puku ọgbọ.+ 10 Ma ọ na-ebibi ndị kpọrọ ya asị, si otú ahụ kwụọ ha ụgwọ ihe ha metara.+ Ọ gaghị egbu oge ịta ndị kpọrọ ya asị ahụhụ. Ọ ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha metara. 11 N’ihi ya, lezienụ anya ka unu na-edebe iwu ya, na-eso ntụziaka ya, na-emekwa ihe ndị o kpebiri ka unu na-eme, bụ́ ihe ndị m na-enye unu n’iwu taa.
12 “Ọ bụrụ na unu ana-erube isi n’ihe ndị Jehova bụ́ Chineke unu kpebiri ka unu na-eme, na-emekwa ha, ọ ga-emezu ọgbụgba ndụ ya ma hụ unu n’anya* otú ọ ṅụụrụ nna nna unu hà n’iyi. 13 Ọ ga-ahụ unu n’anya, gọzie unu ma mee ka unu mụbaa. Ọ ga-eme ka unu mụta ọtụtụ ụmụ.*+ Ọ ga-agọzikwa ihe unu kụrụ n’ala unu, ọka* unu, mmanya ọhụrụ unu, mmanụ unu,+ ụmụ ehi unu na ụmụ ìgwè ewu na atụrụ unu, n’ala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na ọ ga-enye unu.+ 14 Unu ga-abụ ndị a kacha gọzie agọzie n’ime ndị ọzọ niile.+ A gaghị enwe nwoke ma ọ bụ nwaanyị n’ime unu na-agaghị amụta nwa. A gaghịkwa enwe anụ ụlọ unu na-agaghị amụta nwa.+ 15 Jehova ga-ewepụrụ unu ọrịa niile. Ọ gaghị eme ka unu rịa ọrịa ọjọọ ọ bụla unu hụrụ n’Ijipt.+ Kama, ọ ga-eme ka ndị niile kpọrọ unu asị rịa ha. 16 Unu ga-ebibi ndị niile Jehova bụ́ Chineke unu na-enyefe n’aka unu.+ Unu* emerela ha ebere.+ Unu efekwala chi ha dị iche iche ofufe,+ n’ihi na ọ ga-abụrụ unu ọnyà.+
17 “Ọ bụrụ na unu ekwuo n’obi unu, sị, ‘Mba ndị a dị ọtụtụ karịa anyị. Olee otú anyị ga-esi achụpụ ha?’+ 18 unu atụla ha egwu.+ Chetaranụ onwe unu ihe Jehova bụ́ Chineke unu mere Fero na Ijipt niile,+ 19 nnukwu ahụhụ a tara ha nke unu ji anya unu hụ na ihe àmà na ọrụ ebube+ na aka siri ike na ike Jehova bụ́ Chineke unu ji kpọpụta unu.+ Ọ bụ ihe Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ndị niile unu na-atụ egwu.+ 20 Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka egwu jide ha ruo mgbe ndị fọrọ afọ+ na ndị na-ezoro unu onwe ha nwụchara. 21 Unu atụla ha ụjọ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu nọnyeere unu.+ Ọ bụ onye ukwu na Chineke e kwesịrị ịtụ egwu.+
22 “Jehova bụ́ Chineke unu ga-eji nke nta nke nta chụpụrụ unu mba ndị a.+ A gaghị ekwe ka unu bibie ha ọsọ ọsọ, ka anụ ọhịa ghara ịmụba tagbusiwe unu. 23 Jehova bụ́ Chineke unu ga-enyefe ha n’aka unu ma merie ha kpamkpam ruo mgbe e bibichara ha.+ 24 Ọ ga-enyefe ndị eze ha n’aka unu.+ Unu ga-ehichapụkwa aha ha n’ụwa.*+ E nweghị onye ga-anọchiri unu ụzọ+ ruo mgbe unu kpochapụrụ ha.+ 25 Unu ga-akpọ arụsị ha a pịrị apị, bụ́ ndị ha ji mere chi, ọkụ.+ Agụụ ọlaọcha na ọlaedo dị n’arụsị ndị ahụ agụla unu.+ Unu ewerekwala ha, ka ha ghara ịbụrụ unu ọnyà, n’ihi na ọ bụ arụ n’anya Jehova bụ́ Chineke unu.+ 26 Unu ewebatala ihe Chineke kpọrọ asị n’ụlọ unu wee si otú ahụ bụrụ ndị a ga-ebibi ebibi otú a ga-ebibi ihe ahụ. Unu ga-asọ ihe ahụ oyi, kpọọkwa ya asị n’ihi na ọ bụ ihe a ga-ebibi ebibi.
8 “Lezienụ anya ka unu na-edebe iwu niile m na-enye unu taa, ka unu wee dịrị ndụ+ ma mụbaa. Ka unu wee banye ma biri n’ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na ọ ga-enye ha.+ 2 Chetanụ ogologo ụzọ Jehova bụ́ Chineke unu mere ka unu gaa n’ala ịkpa n’ime afọ iri anọ a+ iji mee ka unu dị umeala n’obi na iji nwalee unu+ ka o wee mata ihe dị unu n’obi,+ ma ùnu ga-edebe ihe o nyere n’iwu ka ọ̀ bụ na unu agaghị edebe ya. 3 O mere ka unu dị umeala n’obi ma kwe ka agụụ gụọ unu.+ O nyekwara unu mana,+ bụ́ ihe unu na nna unu hà na-amabughị, ka o wee mee ka unu mara na ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova pụta.+ 4 Ákwà unu yi akaghị nká, ụkwụ unu azaghịkwa aza n’ime afọ iri anọ a.+ 5 O doro unu anya na ọ bụ otú mmadụ si adọ nwa ya aka ná ntị ka Jehova bụ́ Chineke unu si na-adọ unu aka ná ntị.+
6 “Na-edebenụ iwu Jehova bụ́ Chineke unu. Otú unu ga-esi eme ya bụ irubere ya isi na ịtụ egwu ya. 7 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu na-akpọbata unu n’ezigbo ala,+ ala iyi dị iche iche juru na ya, ebe isi mmiri dị iche iche na mmiri miri emi na-asọpụta n’ala dị larịị, na-asọpụtakwa n’ebe bụ́ ugwu ugwu, 8 ala ọka wit, ọka bali, mkpụrụ vaịn, mkpụrụ fig, pomigranet,+ mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ juru na ya,+ 9 ala nri na-agaghị akọ ụkọ na ya, nke a na-enweghịkwa ihe ga-akọ unu na ya, ala nke ígwè juru na nkume ndị dị na ya. Unu ga-egwutekwa ọla kọpa n’ugwu ndị dị na ya.
10 “Mgbe unu riri ihe rijuo afọ, unu ga-eto Jehova bụ́ Chineke unu maka ezigbo ala o nyere unu.+ 11 Kpacharanụ anya ka unu ghara ichefu Jehova bụ́ Chineke unu wee ghara idebe iwu ya, jụ iso ntụziaka ya, gharakwa ime ihe ndị o kpebiri ka unu na-eme, bụ́ ndị m na-enye unu n’iwu taa. 12 Mgbe unu riri ihe rijuo afọ, rụọ ọmarịcha ụlọ dị iche iche biri na ha,+ 13 mgbe ìgwè ehi unu na ìgwè ewu na atụrụ unu mụbara, mgbe unu nwere ọtụtụ ọlaọcha na ọlaedo, nwejuokwa ihe niile enwejuo, 14 unu adịla mpako*+ wee chefuo Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt, n’ebe unu nọ na-agba ohu,*+ 15 onye mere ka unu gafere nnukwu ala ịkpa na-atụ ụjọ,+ bụ́ ebe e nwere agwọ ọjọọ na akpị, bụ́ ala kpọrọ nkụ nke na-enweghị mmiri ọ bụla. O mere ka mmiri si n’oké nkume siri ike gbapụta,+ 16 nyekwa unu mana unu riri+ n’ala ịkpa, bụ́ nke nna unu hà na-amaghị, iji mee ka unu dị umeala n’obi+ nakwa iji nwalee unu ka o wee meere unu ihe ọma n’ọdịnihu.+ 17 Ọ bụrụ na unu asị n’obi unu, ‘Ọ bụ ike anyị na ọkpụkpụ aka anyị ka anyị ji kpatara onwe anyị akụ̀ ndị a,’+ 18 chetanụ na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ike unu ji akpata akụ̀,+ ka o wee mezuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu hà gbara, otú ọ na-eme taa.+
19 “Ọ bụrụ na unu anwaa anwaa chefuo Jehova bụ́ Chineke unu, wee soro chi ọzọ dị iche iche, fee ha ofufe, kpọọkwara ha isiala, ana m agwa unu taa na a ga-ebibirịrị unu.+ 20 Otú Jehova si na-ebibiri unu mba dị iche iche ka a ga-ebibi unu maka na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu.+
9 “Ndị Izrel, nụrụnụ. Taa, unu na-agafe Osimiri Jọdan+ ka unu gaa weghara ala nke mba ndị dị ukwuu ma dị ike karịa unu,+ bụ́ obodo ndị dị ukwuu, ndị a rụsikwara ike ruo n’eluigwe.*+ 2 Ndị bi na ha dị ike ma too ogologo. Ha bụ ndị Anakim+ ndị unu ma gbasara ha, ndị unu nụrụ na e kwuru gbasara ha, sị, ‘Ònye nwere ike imeri ụmụ Anak?’ 3 N’ihi ya, maranụ taa na Jehova bụ́ Chineke unu ga-ebutere unu ụzọ.+ Ọ bụ ọkụ na-erechapụ ihe.+ Ọ ga-alakwa ha n’iyi. Ọ ga-emeri ha, unu ejiri anya unu hụ ya, ka unu wee chụpụ ha ma bibie ha n’egbughị oge, otú Jehova kwere unu ná nkwa.+
4 “Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu ga-achụpụrụ unu ha, unu asịla n’obi unu, ‘Ọ bụ maka na anyị bụ ndị ezi omume mere Jehova ji kpọbata anyị n’ala a ka anyị biri na ya.’+ Kama, ọ bụ n’ihi ihe ọjọọ mba ndị a na-eme+ mere Jehova ji na-achụpụrụ unu ha. 5 Ọ bụghị maka na unu bụ ndị ezi omume ma ọ bụ maka na unu nwere ezigbo obi mere unu ji na-abanye ka unu biri n’ala ha. Kama, ọ bụ n’ihi ihe ọjọọ mba ndị a na-eme mere Jehova bụ́ Chineke unu ji na-achụpụrụ unu ha+ nakwa ka Jehova mezuo iyi ọ ṅụụrụ nna nna unu hà, bụ́ Ebreham,+ Aịzik,+ na Jekọb.+ 6 Maranụ na ọ bụghị maka na unu na-eme ezi omume mere Jehova bụ́ Chineke unu ji enye unu ezigbo ala a ka unu biri na ya, n’ihi na unu bụ ndị isi ike.*+
7 “Chetanụ otú unu si kpasuo Jehova bụ́ Chineke unu iwe n’ala ịkpa,+ unu echefula. Malite n’ụbọchị unu si n’Ijipt pụta ruo mgbe unu rutere ebe a, unu nọ na-enupụrụ Jehova isi.+ 8 Unu kpasudịrị Jehova iwe na Horeb, Jehova wee wesa unu oké iwe nke na ọ chọrọ ịla unu n’iyi.+ 9 Mgbe m gbagoro n’ugwu ịnata mbadamba nkume abụọ ahụ,+ ya bụ, mbadamba nkume ndị e dere ihe Jehova kwuru mgbe unu na ya gbara ndụ,+ m nọgidere n’ugwu ahụ ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị.+ Erighị m nri, aṅụghịkwa m mmiri. 10 Jehova bunyeziri m mbadamba nkume abụọ o ji mkpịsị aka ya dee ihe na ha. Ihe e dere na ha bụ ihe niile Jehova gwara unu n’ugwu ahụ mgbe o si n’ọkụ gwa unu okwu n’ụbọchị unu zukọtara.+ 11 Mgbe ụbọchị iri anọ ahụ (ehihie na abalị) gwụrụ, Jehova bunyere m mbadamba nkume abụọ ahụ, bụ́ mbadamba nkume ndị e dere ihe unu na Chineke gbara ná ndụ. 12 Jehova sịkwara m, ‘Bilie, si n’ebe a gbadaa ọsọ ọsọ, n’ihi na ndị gị ị kpọpụtara n’Ijipt emerụọla onwe ha.+ N’egbughị oge, ha ahapụla iwu m nyere ha ka ha na-edebe. Ha emeerela onwe ha arụsị a kpụrụ akpụ.’+ 13 Jehova sịziri m, ‘Ahụla m ndị a, ha bụ ndị isi ike.*+ 14 Hapụ m ka m laa ha n’iyi ma hichapụ aha ha n’ụwa,* ka m meekwa ka ị bụrụ mba dị ike, nke nwere ọtụtụ mmadụ karịa ha.’+
15 “M wee tụgharịa si n’ugwu ahụ gbadata mgbe ugwu ahụ ka na-ere ọkụ,+ ebukwa m mbadamba nkume abụọ ahụ e dere ihe unu na Chineke gbara ná ndụ n’aka m abụọ.+ 16 M lere anya hụ na unu emehiela Jehova bụ́ Chineke unu. Unu emeerela onwe unu nwa ehi a kpụrụ akpụ. N’egbughị oge, unu ahapụla iwu Jehova nyere unu ka unu na-edebe.+ 17 M wee buru mbadamba nkume abụọ ahụ m bu n’aka m abụọ kụrisịa ha n’ihu unu.+ 18 M makpuuru ala n’ihu Jehova ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị, otú m mere na mbụ. Erighị m nri, aṅụghịkwa m mmiri+ n’ihi mmehie niile unu mere mgbe unu mere ihe ọjọọ n’anya Jehova ma kpasuo ya iwe. 19 N’ihi na egwu tụrụ m maka nnukwu iwe Jehova wesara unu,+ nke na ọ chọdịrị ịla unu n’iyi.+ Ma, Jehova gekwara m ntị n’oge ahụ.
20 “Jehova wesara Erọn ezigbo iwe nke na ọ chọrọ igbu ya.+ Ma n’oge ahụ, m rịọsikwara arịrịọ ike maka Erọn. 21 M wee buru nwa ehi ahụ unu kpụrụ,+ nke bụ́ mmehie unu mere, kpọọ ya ọkụ. M gweriri ya nke ọma ruo mgbe ọ dị ka ntụ. M wụnyeziri ntụ ahụ n’iyi si n’ugwu ahụ na-asọda.+
22 “Na Tabera,+ Masa,+ nakwa na Kibrọt-hateeva,+ unu kpasukwara Jehova iwe. 23 Mgbe Jehova gwara unu ka unu si na Kedesh-bania+ pụọ, sị, ‘Gaanụ weghara ala ahụ m ga-enye unu,’ unu nupụrụ isi ọzọ n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu.+ Unu enweghịkwa okwukwe+ na ya, unu erubereghị ya isi. 24 Unu na-enupụrụ Jehova isi kemgbe m ma unu.
25 “M wee makpuru ala n’ihu Jehova ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị.+ M makpuuru ala otú a maka na Jehova sịrị na ya ga-ala unu n’iyi. 26 M malitere ịrịọsi Jehova arịrịọ ike, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, biko, ebibila ndị gị. Ha bụ ndị nke gị,*+ ndị i ji ike gị gbapụta, jirikwa aka gị dị ike kpọpụta n’Ijipt.+ 27 Cheta Ebreham, Aịzik, na Jekọb,+ bụ́ ndị ohu gị. Leghara isi ike ndị a na-eme anya nakwa omume ọjọọ ha na mmehie ha.+ 28 Ma ọ́ bụghị ya, ndị bi n’ala i si kpọpụta ha nwere ike ịsị: “Jehova enweghị ike ịkpọba ha n’ala o kwere ha ná nkwa, ọ kpọkwara ha asị. Ọ bụ ya mere o ji kpọpụta ha ka o gbuo ha n’ala ịkpa.”+ 29 N’ihi na ha bụ ndị gị, ndị nke gị,*+ ndị i ji aka gị siri ike na nnukwu ike gị kpọpụta.’+
10 “N’oge ahụ, Jehova gwara m, sị, ‘Wapụtara onwe gị mbadamba nkume abụọ ndị dị ka ndị mbụ ahụ,+ bịakwute m n’ugwu. Jirikwa osisi rụọrọ onwe gị igbe. 2 M ga-ede okwu ndị dị ná mbadamba nkume ndị mbụ ahụ ị kụriri ná mbadamba nkume ndị a. Ị ga-etinyekwa ha n’igbe ahụ.’ 3 M wee jiri osisi akeshịa rụọ igbe, wapụtakwa mbadamba nkume abụọ ndị dị ka ndị mbụ ahụ. M bu mbadamba nkume abụọ ahụ n’aka+ gbagoo n’ugwu ahụ. 4 O wee dee ihe ahụ o deburu ná mbadamba nkume ndị mbụ ahụ+ ná mbadamba nkume ndị a, ya bụ, Iwu Iri ahụ,*+ bụ́ ihe Jehova si n’ọkụ gwa unu n’ugwu ahụ+ n’ụbọchị unu zukọtara.+ Jehova bunyekwara m ha. 5 M wee tụgharịa si n’ugwu ahụ gbadata+ ma tinye mbadamba nkume ndị ahụ n’igbe ahụ m rụrụ, bụ́ ebe ha ka dị, otú Jehova nyere m n’iwu.
6 “Ndị Izrel sizi Bierọt Bene-jeekan pụọ gawa Mosira. N’ebe ahụ ka Erọn nwụrụ, e liekwa ya n’ebe ahụ.+ Elieza nwa ya nwoke wee nọchie ya, malite ịrụ ọrụ nchụàjà.+ 7 Ha si ebe ahụ pụọ gawa Gọdgọda, sikwa na Gọdgọda gawa Jọtbata,+ bụ́ ala iyi dị iche iche na-asọ na ya.
8 “N’oge ahụ, Jehova họpụtara ebo Livaị+ ka ha na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Jehova,+ ka ha nọrọ n’ihu Jehova na-ejere ya ozi, jirikwa aha ya na-agọzi ndị mmadụ,+ otú ha na-eme ruo taa. 9 Ọ bụ ya mere na ebo Livaị enwetaghị òkè ọ bụla n’ihe e kenyere ụmụnne ya. Ọ bụ Jehova ka ha ketara, otú Jehova bụ́ Chineke unu gwara ha.+ 10 Anọrọ m n’ugwu ahụ ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị,+ otú m nọrọ n’oge mbụ. Jehova gekwara m ntị n’oge ahụ.+ Jehova achọghị ibibi unu. 11 Jehova wee sị m, ‘Gaa duru ndị a. Kwadebe ka unu pụọ, ka ha wee banye weghara ala m ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na m ga-enye ha.’+
12 “Ugbu a, Izrel, gịnị ka Jehova bụ́ Chineke gị chọrọ n’aka gị?+ Ọ bụ naanị ihe a: ka ị na-atụ egwu Jehova bụ́ Chineke gị,+ ka ị na-eme uche ya n’ihe niile,+ ka ị hụ ya n’anya, ka i jiri obi gị niile na mkpụrụ obi* gị niile na-efe Jehova bụ́ Chineke gị,*+ 13 nakwa ka ị na-edebe iwu Jehova ma na-eso ntụziaka ya ndị m na-enye gị n’iwu taa, ka ihe dịrị gị ná mma.+ 14 Lee, ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị nwe eluigwe, ya bụ, eluigwe niile, nakwa ụwa na ihe niile dị n’ime ya.+ 15 Ma ọ bụ naanị nna nna unu hà ka Jehova mere ka ha bịa ya nso, ọ hụkwara ha n’anya. O si ná ndị niile họrọ unu, bụ́ ụmụ ha,+ otú o merela taa. 16 Meenụ ka obi unu dị ọcha,*+ kwụsịkwanụ ime isi ike.+ 17 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ Chi kacha chi niile+ na Onyenwenụ kacha ndị nwenụ niile, Chineke dị ebube, onye dị ike, na onye e kwesịrị ịna-atụ egwu, onye na-anaghị ele onye ọ bụla anya n’ihu,+ ọ naghịkwa anara aka azụ.* 18 Ọ na-ekpe nwa na-enweghị nna* na nwaanyị di ya nwụrụ+ ikpe ziri ezi. Ọ hụkwara onye mbịarambịa n’anya,+ na-enye ya nri na ákwà. 19 Unu ga-ahụkwa onye mbịarambịa n’anya n’ihi na unu bụbu ndị mbịarambịa n’Ijipt.+
20 “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu ka unu ga-atụ egwu. Ọ bụ ya ka unu ga-efe,*+ unu ahapụkwala ya.* Ọ bụkwa aha ya ka unu ga-eji ṅụọ iyi. 21 Ọ bụ ya ka unu ga-eto.+ Ọ bụ Chineke unu, onye meere unu nnukwu ihe a niile na ihe ndị a dị egwu unu ji anya unu hụ.+ 22 Nna nna unu hà kpọ mmadụ* iri asaa gaa Ijipt,+ ma ugbu a, Jehova bụ́ Chineke unu emeela ka unu dị ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe.+
11 “Hụnụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya,+ na-emenụ ihe ndị unu kwesịrị imere ya, na-edebenụ iwu ya, na-emekwanụ ihe ndị o kpebiri ka unu na-eme mgbe niile. 2 O doro unu anya taa na ọ bụ ununwa ka m na-agwa, ọ bụghị ụmụ unu ndị na-amaghị otú Jehova bụ́ Chineke unu si adọ mmadụ aka ná ntị,+ ndị na-ahụbeghịkwa aka ya siri ike,+ ike ya,+ na otú o si dị ebube. 3 Ha ahụghị ihe àmà ya na ihe ndị o mere Fero eze Ijipt nakwa ala Ijipt ya niile+ 4 ma ọ bụ ihe o mere ndị agha Ijipt nakwa ịnyịnya Fero na ụgbọ ịnyịnya agha ya ndị mmiri Oké Osimiri Uhie riri mgbe ha na-achụ unu ọsọ, Jehova wee bibie ha kpamkpam.*+ 5 Ha ahụghị ihe o meere* unu n’ala ịkpa ruo mgbe unu bịarutere ebe a 6 ma ọ bụ ihe o mere Detan na Abaịram bụ́ ụmụ Elayab nwa Ruben, mgbe ala meghere loo ha na ezinụlọ ha na ụlọikwuu ha nakwa ihe niile dị ndụ ha na ha nọ, n’ihu ndị Izrel niile.+ 7 Unu ejirila anya unu hụ oké ihe niile Jehova mere.
8 “Debenụ iwu niile m na-enye unu taa, ka unu wee dị ike ma banye n’ala ahụ weghara ya, 9 nakwa ka unu wee bitee aka+ n’ala ahụ Jehova ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu hà na ụmụ* ha,+ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+
10 “Ala ahụ unu na-aga iweghara adịghị ka ala Ijipt unu si pụta, bụ́ ebe ọ na-abụ unu ghaa mkpụrụ, unu ana-arụgbu onwe unu n’ọrụ na-agba ya mmiri,* otú e si agba ubi akwụkwọ nri mmiri. 11 Kama ala unu na-abanye iweghara bụ ala ugwu na ndagwurugwu juru na ya.+ Mmiri na-esikwa n’eluigwe ede ya.+ 12 Ọ bụ ala Jehova bụ́ Chineke unu na-elekọta. Anya Jehova bụ́ Chineke unu dị na ya mgbe niile, si ná mmalite afọ ruo ná ngwụcha afọ.
13 Ọ bụrụ na unu agbasie mbọ ike na-erube isi n’iwu ndị m na-enye unu taa wee hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya ma jiri obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile na-efe ya,*+ 14 m ga-emekwa ka mmiri zoo n’ala unu n’oge ya, ma n’ụbịa mmiri ma n’ụla mmiri. Unu ga-ekpokọta ọka* unu, bubatakwa mmanya ọhụrụ unu na mmanụ unu.+ 15 M ga-eme ka ahịhịa na-epu n’ala unu maka anụ ụlọ unu. Unu ga-erikwa ihe rijuo afọ.+ 16 Kpacharanụ anya ka unu ghara ikwe ka a rata unu* ka unu mehie, unu ewee fee chi ọzọ dị iche iche ma kpọọrọ ha isiala.+ 17 Ọ bụrụ na unu efee ha, Jehova ga-ewesa unu ezigbo iwe. Ọ ga-emechi eluigwe ka mmiri ghara izo,+ ala agaghịkwa emepụta ihe. Unu ga-anwụkwa ọsọ ọsọ n’ezigbo ala ahụ Jehova na-enye unu.+
18 “Meenụ ka okwu ndị a m na-agwa unu bamie n’obi unu nakwa ná mkpụrụ obi* unu. Keekwanụ ha n’aka unu ka unu wee na-echeta ha. Ha ga-adị ka ihe unu na-ekegide n’egedege ihu unu.*+ 19 Kụzierenụ ha ụmụ unu. Na-ekwunụ banyere ha mgbe unu nọ ọdụ n’ụlọ unu na mgbe unu na-aga ije n’okporo ụzọ na mgbe unu dina ala nakwa mgbe unu biliri ọtọ.+ 20 Deenụ ha n’awara ụzọ ụlọ unu nakwa n’ọnụ ụzọ ámá unu, 21 ka unu na ụmụ unu wee bitee aka+ n’ala ahụ Jehova ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu hà,+ n’oge niile ụwa dị n’okpuru eluigwe.
22 “Ọ bụrụ na unu elezie anya na-edebe iwu a m na-enye unu ma na-eme ya, ka unu wee hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya,+ na-eme ihe niile o kwuru, gharakwa ịhapụ ya,*+ 23 Jehova ga-achụpụrụ unu mba ndị a niile,+ unu ga-anapụkwa mba ndị dị ukwuu ma dị ọtụtụ karịa unu ala ha.+ 24 Ebe ọ bụla unu zọrọ ụkwụ ga-abụ nke unu.+ Ókè unu ga-amalite n’ala ịkpa ruo Lebanọn, malite n’Osimiri, ya bụ, Osimiri Yufretis, ruo n’oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ.*+ 25 E nweghị onye ga-anọchiri unu ụzọ.+ Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka ụjọ unu na egwu unu jide ndị bi n’ala niile unu ga-aga na ha,+ otú o kwere unu ná nkwa.
26 “Taa, e nwere ihe abụọ m chọrọ ka unu họrọ otu n’ime ha. Otu bụ ka a gọzie unu, nke ọzọ abụrụ ka a bụọ unu ọnụ:+ 27 a ga-agọzi unu ma unu rube isi n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu nke m na-enye unu taa.+ 28 A ga-abụ unu ọnụ ma ọ bụrụ na unu erubeghị isi n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu,+ ghara ime ihe m na-agwa unu taa ka unu na-eme ma fewe chi ọzọ ndị unu na-amaghị.
29 “Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu ga-akpọba unu n’ala ahụ unu na-aga ibi na ya, ọ bụ n’Ugwu Gerizim ka unu ga-anọ gọzie ndị Izrel, nọrọ n’Ugwu Ịbal bụọ ndị Izrel ọnụ.+ 30 Ọ̀ bụ na ugwu ndị ahụ adịghị n’akụkụ nke ọzọ nke Osimiri Jọdan, n’ebe ọdịda anyanwụ, n’ala ndị Kenan ndị bi n’Araba, n’ebe chere Gilgal ihu, n’akụkụ nnukwu osisi ndị dị na More?+ 31 N’ihi na unu na-agafe Osimiri Jọdan ka unu banye weghara ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu.+ Mgbe unu ga-eweghara ya ma biri na ya, 32 lezienụ anya ka unu soro ntụziaka na iwu niile m na-enye unu taa.+
12 “Ihe ndị a bụ ntụziaka na iwu ndị unu ga-elezi anya na-edebe n’oge niile unu ga-adị ndụ n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà ga-enye unu ka unu biri na ya. 2 Unu ga-ebibicha ebe niile mba ndị unu ga-anapụ ala ha na-anọ efe chi ha dị iche iche,+ ma ọ̀ bụ n’ugwu ndị dị elu ma ọ̀ bụ n’obere ugwu ma ọ̀ bụ n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko. 3 Unu ga-akwatu ebe ịchụàjà ha, kụrisịa ogidi arụsị ha,+ kpọọ ogwe osisi arụsị* ha ọkụ, gbutusịakwa arụsị ha a pịrị apị,+ wee mee ka a ghara ịnụkwa aha ha n’ebe ahụ.+
4 “Unu efela Jehova bụ́ Chineke unu otú ahụ.+ 5 Kama, gaanụ fee Jehova bụ́ Chineke unu n’ebe ọ bụla ọ họọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya n’ebo unu niile nakwa n’ebe ọ họọrọ ka ọ bụrụ ebe ọ ga-ebi.+ 6 Ọ bụ n’ebe ahụ ka unu ga-eweta àjà unu a na-esu ọkụ,+ àjà unu ndị ọzọ, otu ụzọ n’ụzọ iri unu,+ onyinye unu kwere ná nkwa, onyinye si unu n’obi,+ anụmanụ ọ bụla ehi unu na ewu na atụrụ unu bu ụzọ mụọ,+ na onyinye ọ bụla ọzọ unu chọrọ inye.+ 7 Unu na ndị ezinụlọ unu ga-anọ n’ebe ahụ rie ihe n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu+ ma ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe niile unu mere+ maka na Jehova bụ́ Chineke unu agọziela unu.
8 “Unu emela otú anyị na-eme n’ebe a taa, ya bụ, otú a onye ọ bụla na-eme ihe dị mma n’anya ya* 9 maka na unu abanyebeghị n’ebe unu ga-ezu ike+ nakwa n’ala unu ga-eketa, nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu. 10 Mgbe unu ga-agafe Osimiri Jọdan+ ma biri n’ala Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka unu biri, ọ ga-eme ka unu zuoro ndị iro unu niile gbara unu gburugburu ike, obi ga-erukwa unu ala.+ 11 Ọ bụ n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya+ ka unu ga-eweta ihe niile m na-enye unu n’iwu ka unu weta, ya bụ, àjà unu a na-esu ọkụ, àjà unu ndị ọzọ, otu ụzọ n’ụzọ iri unu,+ onyinye ọ bụla unu kwere Jehova ná nkwa, na onyinye ọ bụla ọzọ unu chọrọ inye. 12 Unu ga-aṅụrị ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu,+ unu na ụmụ unu ndị nwoke, ụmụ unu ndị nwaanyị, ohu unu ndị nwoke, ohu unu ndị nwaanyị, na onye Livaị nke bi n’obodo unu, ebe ọ bụ na e nweghị ihe ọ bụla o so unu keta.+ 13 Lezienụ anya ka unu ghara ịchụ àjà unu a na-esu ọkụ n’ebe ọ bụla ọzọ dị unu mma.+ 14 Unu ga-achụ àjà unu a na-esu ọkụ naanị n’ebe Jehova ga-ahọrọ n’otu n’ime ebo unu. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka unu ga-eme ihe niile m na-enye unu n’iwu.+
15 “Ma mgbe ọ bụla anụ gụrụ unu,* unu nwere ike iji otú Jehova bụ́ Chineke unu gọziruru unu n’obodo unu niile mara anụ ole unu ga-egbu rie.+ Onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha nwere ike iri ya, otú unu si eri ele ma ọ bụ mgbada. 16 Ma unu erila ọbara ya.+ Unu ga-awụpụ ya n’ala ka mmiri.+ 17 A gaghị ekwe ka unu nọrọ n’obodo unu dị iche iche rie otu ụzọ n’ụzọ iri nke ọka* unu, nke mmanya ọhụrụ unu, nke mmanụ unu, ma ọ bụ anụmanụ ọ bụla ehi unu na ewu na atụrụ unu bu ụzọ mụọ+ ma ọ bụ onyinye ọ bụla unu kwere ná nkwa, onyinye si unu n’obi, ma ọ bụkwanụ onyinye ọ bụla ọzọ unu chọrọ inye. 18 Unu ga-eri ha n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ,+ unu na ụmụ unu ndị nwoke, ụmụ unu ndị nwaanyị, ohu unu ndị nwoke na ohu unu ndị nwaanyị, nakwa onye Livaị nke bi n’obodo unu. Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu n’ihe niile unu na-eme. 19 Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ndị Livaị+ n’oge niile unu ga-ebi n’ala unu.
20 “Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka ala unu bukwuo ibu+ otú o kwere unu ná nkwa,+ unu asị, ‘Anyị chọrọ ịta anụ,’ maka na anụ na-agụ unu,* unu nwere ike ịta anụ mgbe ọ bụla ọ gụrụ unu.*+ 21 Ọ bụrụ na ebe Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya+ dị unu anya, unu ga-egbu ụfọdụ n’ime ìgwè ehi unu ma ọ bụ ụfọdụ n’ime ìgwè ewu na atụrụ unu ndị Jehova nyere unu, otú m nyere unu n’iwu, unu ga-anọkwa n’obodo unu rie ha mgbe ọ bụla ọ gụrụ unu.* 22 Unu nwere ike iri ya otú unu si eri ele na mgbada.+ Ma onye dị ọcha ma onye na-adịghị ọcha nwere ike iri ya. 23 Kpebisienụ ike na unu agaghị eri ọbara ya,+ n’ihi na ọbara ya bụ ndụ* ya.+ Unu erikọtakwala ndụ* ya na anụ ya. 24 Unu erila ya. Unu ga-awụpụ ya n’ala ka mmiri.+ 25 Unu erila ya, ka ihe wee gaziere unu na ụmụ unu ndị ga-anọchi unu maka na unu na-eme ihe dị mma n’anya Jehova. 26 Mgbe unu na-abịa n’ebe Jehova ga-ahọrọ, unu ga-eji naanị ihe ndị dị nsọ, ndị bụ́ nke unu, nakwa onyinye ndị unu kwere ná nkwa. 27 Ọ bụ n’ebe ahụ ka unu ga-achụ àjà unu ndị a na-esu ọkụ, ma anụ ha ma ọbara ha,+ n’ebe ịchụàjà Jehova bụ́ Chineke unu. A ga-awụpụkwa ọbara anụ unu ji chụọ àjà unu ndị ọzọ n’akụkụ ebe ịchụàjà+ Jehova bụ́ Chineke unu, ma unu nwere ike iri anụ ha.
28 “Lezienụ anya ka unu na-erube isi n’ihe a niile m na-enye unu n’iwu, ka ihe wee na-agaziri unu na ụmụ unu ndị ga-anọchi unu maka na unu na-eme ihe dị mma na ihe ziri ezi n’anya Jehova bụ́ Chineke unu.
29 “Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ebibi mba ndị unu ga-anapụ ala ha,+ unu ga-ebiri n’ala ha. 30 Ma mgbe o bibichara ha, kpacharanụ anya ka unu ghara ime ihe ndị ha mere. Unu ajụla ase gbasara chi ha, sị, ‘Olee otú mba ndị a si fee chi ha dị iche iche? Anyị ga-emekwa ka ha.’+ 31 Unu emesola Jehova bụ́ Chineke unu otú ahụ n’ihi na ihe ha na-emere chi ha dị iche iche bụ ihe rụrụ arụ Jehova kpọrọ asị. Ha na-akpọdị ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị ọkụ iji chụọrọ chi ha àjà.+ 32 Unu ga-elezi anya na-eme ihe niile m na-enye unu n’iwu.+ Unu etinyela ihe na ya, unu ewepụkwala ihe na ya.+
13 “Ọ bụrụ na e nwee onye amụma n’obodo unu ma ọ bụ onye na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu n’ihi ihe ọ rọrọ ná nrọ, ya agwa unu na e nwere ihe àmà ma ọ bụ ihe ịtụnanya ga-eme n’ọdịnihu, 2 ihe àmà ahụ ma ọ bụ ihe ịtụnanya ahụ ọ gwara unu emechaa mee, ya asị unu, ‘Ka anyị soro chi ọzọ,’ chi ndị unu na-amaghị, ‘ka anyị feekwa ha ofufe,’ 3 unu egela ntị n’ihe onye amụma ahụ ma ọ bụ ọrọ nrọ ahụ kwuru+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu chọrọ ịnwale unu+ ka ọ mara ma ùnu ji obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya.+ 4 Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu ka unu ga-eso. Ọ bụ ya ka unu ga-atụ egwu. Unu ga-edebe ihe o nyere n’iwu, geekwa ntị n’olu ya. Ọ bụ ya ka unu ga-efe,* unu ahapụkwala ya.*+ 5 Ma, a ga-egbu onye amụma ahụ ma ọ bụ ọrọ nrọ ahụ+ n’ihi na ọ gbara unu ume ka unu nupụrụ Jehova bụ́ Chineke unu isi, bụ́ onye kpọpụtara unu n’Ijipt ma napụta unu n’ebe unu nọ na-agba ohu.* Ọ chọrọ ime ka unu hapụ ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu iwu ka unu na-eme. Unu ga-ewepụkwa ihe ọjọọ n’obodo unu.+
6 “Ọ bụrụ na nwanne gị nwoke, nwa nwoke nne gị mụrụ, ma ọ bụ nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị ma ọ bụ nwunye gị ị hụrụ n’anya ma ọ bụ ezigbote enyi gị anwaa ịrafu gị na nzuzo, sị, ‘Ka anyị gaa fee chi ọzọ,’+ chi ndị gịnwa ma ọ bụ nna nna gị hà na-amaghị 7 n’ime chi dị iche iche ndị niile gbara unu gburugburu na-efe, ma ọ̀ bụ nke ndị bi unu nso ma ọ̀ bụ nke ndị bi unu n’ebe dị anya, malite n’otu nsọtụ ala ahụ ruo na nsọtụ ya nke ọzọ, 8 ekwetala ihe o kwuru. Egela ya ntị.+ Emerela ya ebere ma ọ bụ nweere ya ọmịiko, echebekwala ya. 9 Kama, unu ga-egburịrị ya.+ Ọ bụ gị ga-ebu ụzọ tụọ ya nkume, ndị Izrel niile esorozie gị tụọ ya nkume.+ 10 Jirinụ nkume tụgbuo ya+ n’ihi na ọ chọrọ ime ka unu hapụ Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt, n’ebe unu nọ na-agba ohu.* 11 Izrel niile ga-anụ ya wee tụọ egwu. Ha agaghịkwa eme ụdị ihe ọjọọ a ọzọ n’obodo unu.+
12 “Ọ bụrụ na unu anụ ka a na-ekwu n’otu n’ime obodo ndị Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka unu biri, sị, 13 ‘E nwere ụmụ nwoke ndị na-abaghị uru bụ́ ndị pụtara ka ha duhie ndị bi n’obodo ha. Ha na-asị: “Ka anyị gaa fee chi ọzọ,” chi ndị unu na-amaghị,’ 14 unu ga-eleba okwu ahụ anya, sie imi n’ala, jụọkwa ase nke ọma.+ Ọ bụrụ na o doro anya n’eziokwu na e mere arụ a n’obodo unu, 15 unu ga-ejirịrị mma agha gbuo ndị bi n’obodo ahụ.+ Jirinụ mma agha bibie obodo ahụ na ihe niile nọ na ya, ma anụ ụlọ ha.+ 16 Unu ga-akwakọta ihe niile dị n’obodo ahụ n’etiti ámá obodo ahụ. Unu ga-agba obodo ahụ na ihe niile ahụ a kwakọtara ọkụ ka ọ bụrụ àjà a na-esuru Jehova bụ́ Chineke unu ọkụ. Obodo ahụ ga-abụzi ebe e bibiri ebibi ruo mgbe ebighị ebi. E nweghị mgbe a ga-arụghachi ya. 17 Unu ekwesịghị iwere ihe ọ bụla a ga-ebibi ebibi,+ ka Jehova wee kwụsị nnukwu iwe ọ na-ewe ma meere unu ebere, nweere unu ọmịiko, meekwa ka unu mụbaa, otú ọ ṅụụrụ nna nna unu hà n’iyi.+ 18 N’ihi na unu kwesịrị ịna-erubere* Jehova bụ́ Chineke unu isi. Otú unu ga-esi eme ya bụ idebe iwu ya niile m na-enye unu taa, si otú ahụ na-eme ihe dị mma n’anya Jehova bụ́ Chineke unu.+
14 “Unu bụ ụmụ Jehova bụ́ Chineke unu. Unu ebekasịla ahụ́ unu,+ unu akpụchapụkwala ntutu dị n’ihu isi unu* n’ihi onye nwụrụ anwụ.+ 2 N’ihi na unu bụụrụ Jehova bụ́ Chineke unu ndị dị nsọ.+ Jehova ahọrọkwala unu ka unu bụrụ ndị ya, ndị pụrụ iche n’ime ndị niile nọ n’ụwa.+
3 “Unu erila ihe ọ bụla rụrụ arụ.+ 4 Ọ bụ anụmanụ ndị a ka unu nwere ike iri:+ ehi, atụrụ, ewu, 5 mgbada, anịgọ, mmoro, ewu ọhịa, ele, atụrụ ọhịa, na atụrụ na-ebi n’ugwu. 6 Unu nwere ike iri anụmanụ ọ bụla ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ nke na-atagharịkwa ọnụ. 7 Ma, unu erila anụmanụ ndị a na-atagharị ọnụ ma ọ bụ ndị ụkwụ ha kebiri abụọ: kamel, ùrúrù,* na ewi nkume, n’ihi na ha na-atagharị ọnụ, ma ọbụ ụkwụ ha ekebighị abụọ. Ha bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha.+ 8 Unu erikwala ézì n’ihi na ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ, ma ọ naghị atagharị ọnụ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. Unu erila anụ ha, unu emetụkwala ozu ha aka.
9 “N’ime anụ niile bi na mmiri, unu nwere ike iri ndị a: Unu nwere ike iri ihe ọ bụla nwere nku* na akpịrịkpa.+ 10 Ma, unu erila ihe ọ bụla na-enweghị nku* na akpịrịkpa. Ọ bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.
11 “Unu nwere ike iri nnụnụ ọ bụla so ná nnụnụ dị ọcha. 12 Ma unu erila ndị a: ugo, ugo na-eri azụ̀, udele ojii,+ 13 égbé uhie, égbé ojii, ụdị ndagbù ọ bụla, 14 ụdị ugoloọma ọ bụla, 15 enyí nnụnụ, ikwiikwii, nnụnụ mmiri, ụdị agụ nkwọ ọ bụla, 16 ikwiikwii nta, ikwiikwii ntị ogologo, ọbọgwụ mmiri, 17 okwolo, udele, nnụnụ mmiri a na-akpọ kọmọrant, 18 ụgbala ọcha,* ụdị ụgbala mmiri ọ bụla, nnụnụ a na-akpọ huupu, na ụsụ. 19 Obere ụmụ anụmanụ* ọ bụla nwere nku bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. A gaghị eri ha eri. 20 Unu nwere ike iri anụ ọ bụla na-efe efe bụ́ anụ dị ọcha.
21 “Unu erila anụ ọ bụla nwụrụ anwụ.+ Unu nwere ike inye ya onye mbịarambịa bi n’otu n’ime obodo unu, o nwekwara ike iri ya. Ma ọ bụ, e nwere ike iresị ya onye mba ọzọ. N’ihi na unu bụụrụ Jehova bụ́ Chineke unu ndị dị nsọ.
“Esila nwa ewu n’ime mmiri ara nne ya.+
22 “Unu ga-enyerịrị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile mkpụrụ unu ghara n’ubi mịpụtara kwa afọ.+ 23 Unu ga-eri otu ụzọ n’ụzọ iri nke ọka* unu, nke mmanya ọhụrụ unu, nke mmanụ unu, na anụmanụ ndị ehi unu na ewu na atụrụ unu bu ụzọ mụọ. Unu ga-eri ha n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu, n’ebe ọ ga-ahọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya,+ ka unu wee mụta ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke unu mgbe niile.+
24 “Ma ọ bụrụ na unu ga-aga ogologo ije tupu unu eruo n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya,+ ya abụrụkwa na unu agaghị enwe ike ibu ihe ndị ahụ gaa n’ebe ahụ n’ihi na ebe ahụ dị unu anya (n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu ga-agọzi unu), 25 unu nwere ike ire ha, jiri ego unu retara gaa n’ebe ahụ Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ. 26 Unu ga-ejizi ego ahụ zụta ihe ọ bụla dị unu* mma, ya bụ, ehi, atụrụ, ewu, mmanya na ihe ọ bụla ọzọ na-aba n’anya, nakwa ihe ọ bụla dị unu mma. Unu ga-erikwa ihe n’ebe ahụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu ma ṅụrịa ọṅụ, unu na ndị ezinụlọ unu.+ 27 Unu echefula onye Livaị bi n’obodo unu+ ebe ọ bụ na e nweghị ihe ọ bụla o so unu keta.+
28 “Ná ngwụcha afọ atọ ọ bụla, unu ga-ewepụta otu ụzọ n’ụzọ iri niile nke ihe mkpụrụ unu ghara n’afọ ahụ mepụtara ma dosa ha n’obodo unu.+ 29 Onye Livaị, bụ́ onye na-esoghị unu keta ihe ọ bụla, na onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna,* nakwa nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ ndị bi n’obodo unu, ga-abịa rijuo afọ,+ ka Jehova bụ́ Chineke unu wee gọzie unu n’ihe niile unu na-eme.+
15 “Ná ngwụcha afọ asaa ọ bụla, unu ga-akagbu ụgwọ e ji unu.+ 2 Otú a ka unu ga-esi kagbuo ụgwọ e ji unu: Onye ọ bụla e ji ụgwọ ga-akagbu ụgwọ onye agbata obi ya ji ya. Ọ gaghị agba onye agbata obi ya ma ọ bụ nwanne ya ụgwọ, n’ihi na a ga-ama ọkwa ka onye ọ bụla kagbuo ụgwọ e ji ya n’ihi Jehova.+ 3 Unu nwere ike ịgba onye mba ọzọ ụgwọ,+ ma unu ga-akagbu ụgwọ ọ bụla nwanne unu ji unu. 4 Ma, e nweghị onye kwesịrị ịda ogbenye n’ime unu n’ihi na o doro anya na Jehova ga-agọzi unu+ n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu, 5 naanị ma ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu a niile m na-enye unu taa.+ 6 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu ga-agọzi unu otú o kwere unu ná nkwa. Unu ga na-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma unu agaghị agbaziri ihe ọ bụla.+ Unu ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị unu.+
7 “Ọ bụrụ na otu n’ime ụmụnne unu adaa ogbenye n’otu n’ime obodo unu, n’ala Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu, unu akpọchila obi unu ma ọ bụ jụ inyere nwanne unu dara ogbenye aka.+ 8 Unu ga-emesapụrụ ya aka+ ma gbazinye ya ihe ọ bụla na-akpa ya. 9 Lezienụ anya ka unu ghara ichewe echiche ọjọọ n’obi unu, sị: ‘Afọ nke asaa, bụ́ afọ mmadụ ji akagbu ụgwọ e ji ya, eruwela,’+ unu ewee ghara imere nwanne unu dara ogbenye ebere, gharakwa inye ya ihe ọ bụla. Ọ bụrụ na o besara Jehova ákwá n’ihi unu, ọ ga-abụrụ unu mmehie.+ 10 Unu kwesịrị imesapụrụ ya aka,+ ya ewutekwala unu* na unu na-enye ya ihe, n’ihi na ọ bụ ya mere Jehova bụ́ Chineke unu ga-eji gọzie ihe ọ bụla unu na-eme na ihe ọ bụla unu na-arụ.+ 11 N’ihi na e nweghị mgbe a na-agaghị enwe onye dara ogbenye n’ala unu.+ Ọ bụ ya mere m ji na-enye unu iwu, sị, ‘Mesapụrụnụ nwanne unu nọ n’ahụhụ nke dakwara ogbenye n’ala unu aka.’+
12 “Ọ bụrụ na e resịrị gị nwanne gị, ya bụ, nwoke Hibru ma ọ bụ nwaanyị Hibru, ya abụrụ na o jeerela gị ozi afọ isii, ị ga-ahapụ ya ka o nwere onwe ya n’afọ nke asaa.+ 13 Ọ bụrụ na o nwere onwe ya, agbawala ya aka mgbe ị na-ahapụ ya ka ọ lawa. 14 Ị ga-esi n’ìgwè ewu na atụrụ gị, ebe ị na-azọcha ọka* gị, ebe ị na-azọchapụta mmanya, nakwa n’ebe ị na-azọchapụta mmanụ were ọtụtụ ihe nye ya. Ị ga-enye ya ihe ndị a otú Jehova bụ́ Chineke gị si gọzie gị. 15 Cheta na ị nọ na-agba ohu n’Ijipt, Jehova bụ́ Chineke gị wee gbapụta gị. Ọ bụ ya mere m ji na-enye gị iwu taa ka i mee ihe a.
16 “Ma ọ bụrụ na ọ sị gị, ‘Agaghị m ahapụ gị,’ maka na ọ hụrụ gị na ezinụlọ gị n’anya, n’ihi na obi dị ya ụtọ kemgbe gị na ya nọ,+ 17 ị ga-edokwasị ntị ya n’ibo ụzọ, were ihe e ji akpọpu ntị kpọpuo ya ntị. Ọ ga-abụzi ohu gị ná ndụ ya niile. Otu ihe a ka ị ga-eme ohu gị nwaanyị. 18 Mgbe ị na-ahapụ ya ka ọ lawa nwere onwe ya, echela na e megburu gị emegbu, n’ihi na ozi o jeere gị afọ isii ji okpukpu abụọ karịa ihe onye ọrụ e goro ego gaara arụrụ gị, Jehova bụ́ Chineke gị gọzikwara gị n’ihe niile.
19 “Ị ga-edo oké ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi gị nakwa n’ìgwè ewu na atụrụ gị nsọ ka ọ bụrụ nke Jehova bụ́ Chineke gị.+ Ejila ehi* e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi gị rụọ ọrụ. Akpachakwala ajị ewu ma ọ bụ ajị atụrụ gị e bu ụzọ mụọ. 20 Gị na ezinụlọ gị ga na-eri ya n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị kwa afọ n’ebe Jehova bụ́ Chineke gị ga-ahọrọ.+ 21 Ma ọ bụrụ na anụ ahụ nwere nkwarụ, ya bụ, na ọ dara ngwọrọ ma ọ bụ kpuo ìsì ma ọ bụ nwee nkwarụ ọ bụla ọzọ dị njọ, achụrụla ya Jehova bụ́ Chineke gị n’àjà.+ 22 Ị ga-anọ n’obodo gị rie ya. Onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha ga-eri ya otú e si eri ele ma ọ bụ mgbada.+ 23 Ma, erila ọbara ya.+ Ị ga-awụpụ ya n’ala ka mmiri.+
16 “Na-echetanụ ọnwa Ebib,* na-emekwaranụ Jehova bụ́ Chineke unu Ememme Ngabiga+ na ya, n’ihi na ọ bụ n’ọnwa Ebib ka Jehova bụ́ Chineke unu kpọpụtara unu n’Ijipt, n’abalị.+ 2 Unu ga-esi n’ìgwè ewu na atụrụ nakwa n’ìgwè ehi+ were anụ chụọrọ Jehova bụ́ Chineke unu àjà+ Ememme Ngabiga n’ebe Jehova họọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya.+ 3 Unu erikọtala ya na ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha.+ Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko, bụ́ achịcha ahụhụ, ụbọchị asaa, n’ihi na unu si n’Ijipt pụta ọkụ ọkụ.+ Na-emenụ ihe a ka unu wee na-echeta ụbọchị unu si n’Ijipt pụta n’oge niile unu dị ndụ.+ 4 A gaghị ahụ ihe na-eko achịcha n’aka unu n’ala unu niile ruo ụbọchị asaa.+ Anụ ọ bụla unu ga-achụ n’àjà ná mgbede ụbọchị mbụ agaghị afọ ruo ụtụtụ.+ 5 A gaghị ekwe ka unu nọrọ n’obodo ọ bụla dị unu mma n’ime obodo ndị Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu chụọ anụ e ji eme Ememme Ngabiga n’àjà. 6 Kama ọ bụ n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya ka unu ga-anọ chụọ ya. Unu ga-achụ anụ e ji eme Ememme Ngabiga n’àjà ná mgbede, ozugbo anyanwụ dara,+ kpọmkwem n’ụbọchị dabara n’ụbọchị unu si n’Ijipt pụta. 7 Unu ga-esi ya, riekwa ya+ n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ.+ N’ụtụtụ, unu ga-alaghachi n’ụlọikwuu unu. 8 Ụbọchị isii ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko. N’ụbọchị nke asaa, a ga-enwe nzukọ pụrụ iche maka Jehova bụ́ Chineke unu. Unu arụla ọrụ ọ bụla.+
9 “Unu ga-agụ izu asaa. Unu ga-ebido ịgụ izu asaa ahụ n’oge mbụ unu ji mma e ji ewe ihe ubi gbute ọka bali n’ubi unu.+ 10 Unu ga-ejizi onyinye si unu n’obi, bụ́ ndị unu wetara, meere Jehova bụ́ Chineke unu Ememme Izu.+ Unu ga-eweta onyinye ndị ahụ otú Jehova bụ́ Chineke unu si agọzi unu.+ 11 Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu, unu na ụmụ unu ndị nwoke, ụmụ unu ndị nwaanyị, ohu unu ndị nwoke, ohu unu ndị nwaanyị, onye Livaị nke bi n’obodo unu, onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna,* nakwa nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ ndị bi n’obodo unu, n’ebe ahụ Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya.+ 12 Chetanụ na unu nọ na-agba ohu n’Ijipt.+ Soronụ ntụziaka ndị a, na-emekwanụ ha.
13 “Unu ga-eme Ememme Ụlọ Ndò+ ụbọchị asaa mgbe unu si n’ebe unu na-azọcha ọka* na ebe unu na-azọchapụta mmanụ nakwa n’ebe unu na-azọchapụta mmanya na-ebubata ihe ubi unu mepụtara. 14 Unu ga-aṅụrị ọṅụ n’oge ememme unu,+ unu na ụmụ unu ndị nwoke, ụmụ unu ndị nwaanyị, ohu unu ndị nwoke, ohu unu ndị nwaanyị, onye Livaị, onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna, nakwa nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ ndị bi n’obodo unu. 15 Ụbọchị asaa ka unu ga-emere Jehova bụ́ Chineke unu ememme+ n’ebe Jehova ga-ahọrọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu ga-agọzi ihe niile ala unu mepụtara nakwa ihe niile unu na-eme.+ Unu ga na-aṅụrị naanị ọṅụ.+
16 “Ugboro atọ n’afọ ka ụmụ nwoke unu niile ga-abịa n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu n’ebe ọ ga-ahọrọ: n’Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko,+ n’Ememme Izu,+ nakwa n’Ememme Ụlọ Ndò.+ E nweghị onye n’ime ha ga-agba aka bịa n’ihu Jehova. 17 Onye ọ bụla n’ime unu ga-eweta onyinye otú Jehova bụ́ Chineke unu si gọzie ya.+
18 “Unu ga-ahọpụta ndị ikpe+ na ndị isi maka ebo nke ọ bụla n’obodo niile Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu. Ha ga na-ekpere ndị Izrel ikpe ziri ezi. 19 Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi.+ Unu elela mmadụ anya n’ihu.+ Unu anakwala aka azụ n’ihi na ịna aka azụ na-emechi anya ndị ma ihe,+ na-emekwa ka ndị bụ́ ezigbo mmadụ gbanwee okwu ha. 20 Na-ekpenụ naanị ikpe ziri ezi mgbe niile,+ ka unu wee dịrị ndụ ma nweta ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu.
21 “Unu akụla ụdị osisi ọ bụla ka ọ bụrụ ogwe osisi arụsị*+ n’akụkụ ebe ịchụàjà unu ga-arụrụ Jehova bụ́ Chineke unu.
22 “Unu agaghịkwa arụrụ onwe unu ogidi arụsị,+ bụ́ ihe Jehova Chineke unu kpọrọ asị.
17 “Unu ejila ehi ma ọ bụ atụrụ nwere nkwarụ ma ọ bụ nke nwere nsogbu ọ bụla ọzọ chụọrọ Jehova bụ́ Chineke unu àjà, n’ihi na ọ ga-abụ arụ n’anya Jehova bụ́ Chineke unu.+
2 “Ọ bụrụ na a hụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị n’otu n’ime obodo unu ndị Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu nke na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova bụ́ Chineke unu ma na-emebi ọgbụgba ndụ unu na Chineke,+ 3 o wee mehie gaa fee chi ọzọ dị iche iche ma kpọọrọ ha isiala ma ọ bụ kpọọrọ anyanwụ ma ọ bụ ọnwa ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ dị n’eluigwe isiala,+ bụ́ ihe m na-enyeghị n’iwu,+ 4 unu ga-eleba okwu ahụ anya nke ọma mgbe a kọọrọ ya unu ma ọ bụ mgbe unu nụrụ ya. Ọ bụrụ na a chọpụta n’eziokwu+ na e mere arụ a n’Izrel, 5 unu ga-akpọpụta nwoke ahụ ma ọ bụ nwaanyị ahụ nke mere ihe ọjọọ a n’ọnụ ụzọ ámá obodo unu. A ga-ejikwa nkume tụgbuo nwoke ahụ ma ọ bụ nwaanyị ahụ.+ 6 A ga-egbu onye ahụ e kwesịrị igbu egbu ma mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ gbaa akaebe+ na o mere ihe ahụ. A gaghị egbu ya ma ọ bụrụ otu onye gbara akaebe.+ 7 Ọ bụ ndị akaebe ahụ ga-ebu ụzọ tụọ ya nkume, ndị Izrel niile esorozie tụgbuo ya. Unu ga-ewepụ ihe ọjọọ n’obodo unu.+
8 “Ọ bụrụ na e nwee okwu siiri unu ezigbo ike ikpebi n’otu n’ime obodo unu, ma ọ̀ bụ okwu gbasara onye gburu mmadụ*+ ma ọ bụ onye gbara mmadụ akwụkwọ ma ọ bụ merụọ mmadụ ahụ́ ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na e nwere ihe ọzọ na-ese okwu, unu ga-ewere okwu ahụ gaa n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ.+ 9 Gakwurunụ ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, nakwa onye bụ́ onyeikpe+ n’oge ahụ. Kọọrọnụ ha ihe merenụ. Ha ga-ekpebiri unu okwu ahụ.+ 10 Unu ga-eme ihe ha kpebiri bụ́ nke ha ga-agwa unu n’ebe ahụ Jehova họọrọ. Lezienụ anya ka unu mee ihe niile ha ga-agwa unu. 11 Meenụ ihe e kwuru n’iwu ha ga-egosi unu, meekwanụ ihe ha kpebiri nke ha ga-agwa unu.+ Unu ahapụla ihe ha kpebiri, bụ́ nke ha ga-agwa unu, mewe ihe ọzọ.+ 12 Onye ọ bụla mpako mere ka ọ ghara ige onye nchụàjà ntị, bụ́ onye na-ejere Jehova bụ́ Chineke unu ozi, ma ọ bụ ghara ige onyeikpe ntị, ga-anwụ.+ Unu ga-ewepụ ihe ọjọọ n’Izrel.+ 13 Mmadụ niile ga-anụ ya wee tụọ egwu, ha agaghịkwa adị mpako ọzọ.+
14 “Mgbe unu ga-abanye n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu, unu eweghara ya ma biri na ya, unu asịzie, ‘Ka anyị họpụtara onwe anyị eze otú mba niile gbara anyị gburugburu mere,’+ 15 onye unu ga-eme eze ga-abụrịrị onye Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ.+ Ọ bụ otu n’ime ụmụnne unu ka unu ga-eme eze. A gaghị ekwe ka unu mee onye mba ọzọ na-abụghị nwanne unu eze ga-achị unu. 16 Ma, eze ahụ agaghị enweta ọtụtụ ịnyịnya+ ma ọ bụ mee ka ndị Izrel laghachi n’Ijipt ka ha gaa nwetakwuo ịnyịnya+ n’ihi na Jehova gwara unu, sị, ‘Unu anwakwala anwa laghachi n’Ijipt.’ 17 Ọ gaghịkwa alụ ọtụtụ ụmụ nwaanyị, ka obi ya ghara ịpụ n’ebe m nọ.+ Ọ gaghịkwa akpakọju ọtụtụ ọlaọcha na ọlaedo.+ 18 Mgbe ọ ga-anọrọ n’ocheeze n’alaeze ya, ọ ga-elere anya n’akwụkwọ Iwu a, nke ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị ji, depụtara onwe ya Iwu a n’akwụkwọ.*+
19 “Ọ ga-ejide akwụkwọ ahụ, ọ ga na-agụkwa ya n’oge niile ọ dị ndụ,+ ka o wee mụta ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke ya, na-emekwa ihe niile e kwuru n’Iwu a ma soro ntụziaka ndị a.+ 20 Ọ bụrụ na o mee ihe a, ọ gaghị eche na ya ka ụmụnne ya mma, ọ gaghịkwa ahapụ ihe ndị a e nyere n’iwu mewe ihe ọzọ, ka o wee chịtee aka n’alaeze ya n’Izrel, ma ya ma ụmụ ya.
18 “Ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị na ndị niile si n’ebo Livaị agaghị eketa òkè ma ọ bụ ala n’Izrel. Ha ga na-eri àjà Jehova ndị a na-esu ọkụ, nke bụ́ ihe o ketara.+ 2 N’ihi ya, ha agaghị eso ụmụnne ha keta ihe ọ bụla. Ọ bụ Jehova ka ha ketara, otú ọ gwara ha.
3 “Ihe ndị a ga-abụ ihe ruuru ndị nchụàjà n’ihe ndị mmadụ ga na-eweta: Onye ọ bụla chụrụ àjà, ma ọ̀ bụ ehi ma ọ̀ bụ atụrụ ka ọ chụrụ, ga-enye onye nchụàjà ubu ya, agba ya, na afọ ya. 4 Unu ga-enye ya ọka* mbụ unu, mmanya ọhụrụ mbụ unu, mmanụ mbụ unu, nakwa ajị anụ mbụ a kpachapụtara n’ìgwè ewu na atụrụ unu.+ 5 Jehova bụ́ Chineke unu ahọrọla Livaị na ụmụ ya ndị nwoke n’ebo unu niile ka ha na-eje ozi n’aha Jehova mgbe niile.+
6 “Ma, ọ bụrụ na onye Livaị ahapụ ebe o bi n’otu n’ime obodo unu n’Izrel,+ chọọ* ịga n’ebe Jehova họọrọ,*+ 7 o nwere ike ije ozi n’ebe ahụ n’aha Jehova bụ́ Chineke ya otú ụmụnne ya niile, bụ́ ndị Livaị, ndị na-eje ozi n’ebe ahụ n’ihu Jehova, na-eme.+ 8 Ihe oriri ọ ga na-eketa ga-aha ka nke ha na-eketa,+ ma e wepụ ihe o nwetara ná ngwongwo nna nna ya hà o rere.
9 “Mgbe unu banyere n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu, unu amụtala ime arụ mba ndị ahụ na-eme.+ 10 E kwesịghị inwe onye ọ bụla n’ime unu nke na-akpọ nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị ọkụ iji chụọ àjà,+ onye ọ bụla nke na-agba afa,+ onye ọ bụla nke na-eme anwansi,*+ onye ọ bụla nke na-agba afa ka ọ mata ihe ga-eme n’ọdịnihu,+ dibịa anwansi,+ 11 onye ọ bụla nke na-akọ ndị ọzọ ọgwụ, onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa+ ma ọ bụ onye na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu+ ase, ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase.+ 12 N’ihi na Jehova kpọrọ onye ọ bụla na-eme ihe ndị a asị. Ọ bụkwa n’ihi arụ ndị a ka Jehova bụ́ Chineke unu ji na-achụpụrụ unu mba ndị ahụ. 13 Unu ga-egosi na unu bụ ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu.+
14 “N’ihi na mba ndị a unu na-anapụ ala ha na-ege ndị na-eme anwansi*+ na ndị na-agba afa+ ntị. Ma, Jehova bụ́ Chineke unu achọghị ka unu mee ụdị ihe a. 15 Jehova bụ́ Chineke unu ga-esi n’ụmụnne unu họpụtara unu onye amụma nke dị ka m. Geenụ ya ntị.+ 16 Ọ bụ maka na unu rịọrọ Jehova bụ́ Chineke unu na Horeb n’ụbọchị unu zukọtara,+ sị, ‘Ka anyị ghara ịnụ olu Jehova bụ́ Chineke anyị ọzọ, ka anyị gharakwa ịhụ nnukwu ọkụ a ọzọ, ka anyị ghara ịnwụ.’+ 17 Jehova sịziri m, ‘Ihe ha kwuru dị mma. 18 M ga-esi n’ụmụnne ha họpụtara ha onye amụma nke dị ka gị.+ M ga-agwa ya ihe ọ ga-ekwu,+ ọ ga-agwakwa ha ihe niile m ga-enye ya n’iwu.+ 19 N’eziokwu, m ga-eme ka onye na-egeghị ntị n’okwu m ndị ọ ga-ekwu n’aha m zaa ajụjụ.+
20 “‘Ọ bụrụ na mpako emee ka onye amụma ọ bụla jiri aha m kwuo ihe m na-enyeghị ya iwu ka o kwuo ma ọ bụ jiri aha chi ọzọ kwuo okwu, onye amụma ahụ ga-anwụ.+ 21 Ma, unu nwere ike ikwu n’obi unu, sị: “Olee otú anyị ga-esi amata na ọ bụghị Jehova kwuru okwu ahụ?” 22 Ọ bụrụ na onye amụma ahụ ji aha Jehova kwuo okwu, ma ihe o kwuru emezughị, ọ bụghị Jehova kwuru okwu ahụ. Ọ bụ mpako mere onye amụma ahụ ji kwuo ya. Unu atụla ya ụjọ.’
19 “Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ebibi mba ndị Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ala ha, unu ewee chụpụ ha ma biri n’obodo ha nakwa n’ụlọ ha,+ 2 unu ga-ewepụta obodo atọ n’ala unu nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka unu biri.+ 3 Unu ga-eke ala Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu ka unu biri ụzọ atọ, doziekwa ụzọ e si aga na ha ka onye gburu mmadụ nwee ike ịgbaga n’otu n’ime obodo ndị ahụ.
4 Ihe a bụ ihe onye gburu mmadụ, bụ́ onye nwere ike ịgbaga ebe ahụ, ga-eme ka o wee dịrị ndụ: Ọ bụrụ na o gburu mmadụ ibe ya n’amaghị ụma, ya abụrụkwa na ọ kpọbughị onye ahụ asị,+ 5 dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ya na mmadụ ibe ya abanye n’ọhịa ịkpata nkụ, ya ewelie aka ya ka o jiri anyụike gbutuo osisi, ma isi anyụike ahụ efepụ n’osisi ya kụgbuo mmadụ ibe ya, onye ahụ gburu ya kwesịrị ịgbaga n’otu n’ime obodo ndị a ka o wee dịrị ndụ.+ 6 Ma ọ́ bụghị ya, onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ+ nwere ike iji iwe chụwa onye ahụ gburu mmadụ, chụkwute ya ma gbuo ya maka na obodo ọ na-agbaga dị ezigbo anya. Ma, ebe ọ bụ na ọ kpọbughị onye ahụ asị,+ o kwesịghị ịnwụ. 7 Ọ bụ ya mere m ji na-enye unu iwu, sị: ‘Wepụtanụ obodo atọ.’
8 “Ọ bụrụ na Jehova bụ́ Chineke unu emee ka ala unu sakwuo mbara otú ọ ṅụụrụ nna nna unu hà n’iyi,+ nyekwa unu ala niile o kwere nkwa inye nna nna unu hà,+ 9 (ma ọ bụrụhaala na unu ejiri obi unu niile na-eme ihe a niile m na-enye unu n’iwu taa, ya bụ, ịhụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya na ime ihe o kwuru mgbe niile)+ unu ga-ewepụtazi obodo atọ ọzọ n’elu obodo atọ ndị a.+ 10 Ihe a ga-eme ka a ghara igbu* onye aka ya dị ọcha+ n’ala unu nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu. Ikpe ọbara agaghịkwa ama unu.+
11 “Ma, ọ bụrụ na mmadụ kpọrọ mmadụ ibe ya asị+ wee chechie ya, lụso ya* ọgụ ma kụgbuo ya, o wee gbaga n’otu n’ime obodo ndị a, 12 ndị okenye obodo ya ga-ezi ozi ka e si ebe ahụ kpọpụta ya. Ha ga-enyefe ya n’aka onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ, ọ ga-egbukwa ya.+ 13 Unu* agaghị emere ya ebere. Unu ga-emekwa ka ikpe ọbara onye aka ya dị ọcha ghara ịma ndị Izrel,+ ka ihe wee gaziere unu.
14 “Mgbe unu ga-enweta ebe unu ketara n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu ga-enye unu ka unu biri, unu ewelala ihe e ji kpaa ókè n’ala onye agbata obi unu azụ+ wee mee ka ọ gharazie ịdị n’ebe nna nna unu hà kpara ókè.
15 “A gaghị ama mmadụ ikpe ma ọ bụrụ naanị otu onye gbara akaebe na o mere mmehie ma ọ bụ na ọ dara iwu.+ A ga-esi n’àmà* ndị akaebe abụọ ma ọ bụ n’àmà ndị akaebe atọ gbara mara na okwu ahụ bụ eziokwu.+ 16 Ọ bụrụ na onye chọrọ ịrụsa mmadụ arụrụala agbaa akaebe wee bo onye ahụ ebubo na e nwere iwu ọ dara,+ 17 mmadụ abụọ ahụ na-ese okwu ga-eguzo n’ihu Jehova, n’ihu ndị nchụàjà nakwa n’ihu ndị ikpe bụ́ ndị ga na-eje ozi n’oge ahụ.+ 18 Ndị ikpe ahụ ga-eleba okwu ahụ anya nke ọma.+ Ọ bụrụ na onye ahụ gbara akaebe ghara ụgha, ọ bụrụkwa na ọ bụ ebubo ụgha ka o boro nwanne ya, 19 unu ga-eme ya ihe ahụ ọ kpara nkata ime nwanne ya,+ unu ga-ewepụkwa ihe ọjọọ n’obodo unu.+ 20 Ndị fọrọ ga-anụ ya wee tụọ egwu, ha agaghịkwa eme ụdị ihe ọjọọ a ọzọ n’obodo unu.+ 21 Unu* agaghị emere ya ebere:+ Onye gburu mmadụ,* a ga-egbu ya. Onye kụkpọrọ mmadụ anya, a ga-akụkpọ ya anya. Onye kụpụrụ mmadụ ezé, a ga-akụpụ ya ezé. Onye gbajiri mmadụ aka, a ga-agbaji ya aka. Onye gbajiri mmadụ ụkwụ, a ga-agbaji ya ụkwụ.+
20 “Ọ bụrụ na unu agaa ịlụso ndị iro unu agha, unu ahụ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya na ndị agha dị ọtụtụ karịa unu, unu atụla ha egwu, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt, nọnyeere unu.+ 2 Mgbe unu chọrọ ibido ịlụ agha, onye nchụàjà ga-abịa gwa ndị agha okwu.+ 3 Ọ ga-agwa ha, sị, ‘Ndị Izrel nụrụnụ, unu na-aga ịlụso ndị iro unu agha. Obi amapụla unu. Unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ ma ọ bụ maa jijiji n’ihi ha, 4 n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu so unu na-aga. Ọ ga-alụso ndị iro unu agha, zọpụtakwa unu.’+
5 “Ndị isi ndị agha ga-agwakwa ha, sị, ‘È nwere onye rụrụ ụlọ ọhụrụ, ma ọ gbapebeghị ya? Ya laghachi n’ụlọ ya. Ọ bụrụ na ọ laghachighị, o nwere ike ịnwụ n’agha, nwoke ọzọ agbapee ụlọ ya. 6 È nwere onye kọrọ ubi vaịn, ma ọ malitebeghị ịghọrọ mkpụrụ ya? Ya laghachi n’ụlọ ya. Ọ bụrụ na ọ laghachighị, o nwere ike ịnwụ n’agha, onye ọzọ amalite ịghọrọ mkpụrụ ya. 7 È nwere onye kwere nwaanyị nkwa na ọ ga-alụ ya, ma ọ lụbeghị ya? Ya laghachi n’ụlọ ya.+ Ọ bụrụ na ọ laghachighị, o nwere ike ịnwụ n’agha, nwoke ọzọ alụrụ nwaanyị ahụ.’ 8 Ndị isi ndị agha ga-ajụkwa ha, sị, ‘È nwere onye ụjọ na-atụ, nke obi na-amapụkwa?+ Ya laghachi n’ụlọ ya, ka ọ ghara ime ka obi mapụwa ụmụnna ya otú ọ na-amapụ ya.’*+ 9 Mgbe ndị isi ndị agha gwachara ha okwu, ha ga-ahọpụta ndị ọchịagha ga-edu ha.
10 “Ọ bụrụ na unu erute obodo nso ka unu lụso ya agha, unu ga-agwa ndị obodo ahụ ihe ha ga-eme ka unu na ha mee udo.+ 11 Ọ bụrụ na ha ekwuo na ha chọrọ udo ma megheere unu ọnụ ụzọ ámá ha, ndị niile nọ n’obodo ahụ ga-abụ ndị ohu unu, ha ga na-ejekwara unu ozi.+ 12 Ma, ọ bụrụ na ha ekweghị ka unu na ha mee udo, kama ha alụsowa unu agha, nọchibidonụ obodo ahụ, 13 Jehova bụ́ Chineke unu ga-enyefe ya n’aka unu. Unu ga-eji mma agha gbuo nwoke ọ bụla nọ na ya. 14 Ma, unu nwere ike ịchịkọrọ ụmụ nwaanyị ha, ụmụ ha, na anụ ụlọ ha, bukọrọkwa ihe niile dị n’obodo ahụ, ya bụ, ihe niile unu kwatara.+ Unu ga-ewere ihe niile unu kwatara n’obodo ndị iro unu, bụ́ ndị Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu.+
15 “Ọ bụ ihe a ka unu ga-eme obodo niile dị unu ezigbo anya, ya bụ, obodo ndị na-esoghị ná mba ndị a dị unu nso. 16 Ma, unu agaghị ahapụ ihe ọ bụla na-eku ume ka ọ dịrị ndụ n’obodo ndị a Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ha bụrụ nke unu.+ 17 Kama, unu ga-ebibi ha kpamkpam, ya bụ, ndị Het, ndị Amọraịt, ndị Kenan, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus,+ otú Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu n’iwu, 18 ka ha wee ghara ịkụziri unu arụ niile ha na-eme mgbe ha na-efe chi ha, mezie ka unu mehie Jehova bụ́ Chineke unu.+
19 “Ọ bụrụ na unu anọchibido obodo ka unu weghara ya, unu alụsowakwa ya agha ruo ọtụtụ ụbọchị, unu ejila anyụike gbutusịa osisi ndị dị na ya. Unu nwere ike iri mkpụrụ ha, ma unu egbutula ha.+ Ùnu kwesịrị ibibisị osisi dị n’ọhịa otú e si ebibi mmadụ? 20 Unu nwere ike ibibi naanị osisi ndị unu ma na a naghị eri mkpụrụ ha eri. Unu nwere ike igbutu ha ma jiri ha rụọ ihe unu ga-eji nọchibido obodo ahụ nke na-alụso unu agha, ruo mgbe unu meriri obodo ahụ.
21 “Ọ bụrụ na a hụ onye e gburu egbu ka ọ tọgbọ n’ọhịa n’ala Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu, ma a maghị onye gburu ya, 2 ndị okenye unu na ndị ikpe unu+ ga-aga tụọ ebe ahụ, malite n’ebe onye ahụ nwụrụ anwụ tọgbọ ruo n’obodo ndị dị ya gburugburu. 3 Ndị okenye nke obodo kacha dịrị nso n’ebe onye ahụ nwụrụ anwụ tọgbọ ga-esi n’ìgwè ehi kpụta ehi a na-ejitụbeghị rụọ ọrụ, nke a na-anyakwasịtụbeghị yok. 4 Ndị okenye obodo ahụ ga-akpụrụ ehi ahụ gaa na ndagwurugwu nke iyi na-asọ na ya, bụ́ ebe a na-akọbeghị ihe, ebe a na-aghabeghịkwa mkpụrụ. Ha ga-akụjikwa ehi ahụ olu n’ebe ahụ, na ndagwurugwu ahụ.+
5 “Ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, ga-abịa, n’ihi na ọ bụ ha ka Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ ka ha na-ejere ya ozi,+ ka ha jiri aha Jehova na-agọzi ndị mmadụ.+ Ha ga-ekwu otú a ga-esi edozi esemokwu ọ bụla gbasara iti mmadụ ihe ma ọ bụ igbu mmadụ.+ 6 Ndị niile bụ́ ndị okenye n’obodo ahụ kacha nso n’ebe onye ahụ nwụrụ anwụ tọgbọ ga-akwọ aka ha+ n’elu ehi ahụ a kụjiri olu na ndagwurugwu ahụ. 7 Ha ga-asịkwa, ‘Ọ bụghị anyị gburu onye a.* Anyị ahụghịkwa mgbe e gburu ya. 8 Jehova, biko, emela ka ndị gị Izrel, bụ́ ndị ị napụtara,+ zaa ajụjụ maka onye a e gburu egbu. Emekwala ka ikpe ọbara onye aka ya dị ọcha ma ndị gị Izrel.’+ Ikpe ọbara ahụ agaghị ama ha. 9 Ọ bụrụ na unu emee ihe dị mma n’anya Jehova, unu ga-esi otú a mee ka ikpe ọbara onye aka ya dị ọcha ghara ịma unu.
10 “Ọ bụrụ na unu agaa lụso ndị iro unu agha, Jehova bụ́ Chineke unu ewee meriere unu ha, unu adọrọkwa ha n’agha,+ 11 gị ahụ nwaanyị mara mma ná ndị ahụ unu dọọrọ n’agha, ihe ya wee masị gị, gị achọọkwa ịkpọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye gị, 12 i nwere ike ịkpọrọ ya laa n’ụlọ gị. Ọ ga-akpụ isi ya, bee mbọ́ ya, 13 yipụkwa ákwà o yi mgbe a dọọrọ ya n’agha, birizie n’ụlọ gị. Ọ ga-ebere nne ya na nna ya ákwá otu ọnwa zuru ezu.+ E mechaa, gị na ya nweziri ike inwe mmekọahụ. Ị ga-abụ di ya, ya abụrụ nwunye gị. 14 Ma ọ bụrụ na ihe ya adịghịzi gị mma, ị ga-ahapụ ya ka ọ gawa+ ebe ọ bụla ọ chọrọ. Ma ị gaghị ere ya ere ma ọ bụ megbuo ya, ebe ọ bụ na ị manyere ya ka ọ bụrụ nwunye gị.
15 “Ọ bụrụ na nwoke lụrụ nwaanyị abụọ, ya ahụ otu n’anya karịa ibe ya,* ya abụrụ na ha abụọ mụụrụ ya ụmụ nwoke, ya abụrụkwa nke ọ na-ahụchaghị n’anya mụụrụ ya ọkpara,+ 16 n’ụbọchị ọ ga-ekere ụmụ ya ndị nwoke ihe o nwere, a gaghị ekwe ka o were nwa nke nwaanyị ahụ ọ kacha hụ n’anya mere ọkpara ma hapụ nwa nke nwaanyị ahụ ọ na-ahụchaghị n’anya, bụ́ ọkpara ya. 17 O kwesịrị iwere nwa nke nwaanyị ahụ ọ na-ahụchaghị n’anya ka ọkpara ya ma kenye ya ụzọ abụọ nke ihe niile o nwere, n’ihi na ọ bụ ya ka o bu ụzọ mụọ. Ọ bụ ya nwe ihe ruuru ọkpara.+
18 “Ọ bụrụ na mmadụ nwere nwa nwoke na-eme isi ike, nke na-enupụ isi, ọ naghịkwa erubere nne ya ma ọ bụ nna ya isi,+ ha agbalịakwala dọọ ya aka ná ntị, ma o kweghị ege ha ntị,+ 19 nne ya na nna ya ga-akpọrọ ya kpọpụtara ndị okenye n’ọnụ ụzọ ámá obodo ha. 20 Ha ga-agwa ndị okenye obodo ha, sị, ‘Nwa anyị nwoke a dị isi ike, na-enupụkwa isi, ọ naghịkwa erubere anyị isi. Ọ na-eri oké nri,+ bụrụkwa onye aṅụrụma.’+ 21 Ụmụ nwoke niile nọ n’obodo ha ga-eji nkume tụgbuo ya. Unu ga-esi otú ahụ wepụ ihe ọjọọ n’obodo unu. Ndị Izrel niile ga-anụ ihe merenụ wee tụọ egwu.+
22 “Ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie ga-eme ka a ma ya ikpe ọnwụ, e wee gbuo ya,+ kwụwa ya n’osisi,+ 23 ozu ya agaghị adị n’elu osisi abalị niile.+ Kama, unu ga-ahụ na e liri ya n’ụbọchị ahụ, n’ihi na onye a kwụwara n’osisi bụ onye Chineke bụrụ ọnụ.+ Unu emerụla ala unu nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu.+
22 “Ọ bụrụ na ị hụ ehi nwanne gị ma ọ bụ atụrụ ya ka ọ na-akpafu, amala ụma hapụ ya.+ Hụ na ị kpụghachiiri ya nwanne gị. 2 Ma, ọ bụrụ na nwanne gị ebighị gị nso ma ọ bụ na ị maghị onye ọ bụ, ị ga-akpụrụ anụ ahụ lọta n’ụlọ gị. Ọ ga-anọkwa n’ụlọ gị ruo mgbe nwanne gị chọọrọ ya bịa. Ị ga-akpụrụzi ya kpụnye ya.+ 3 Ọ bụ ihe ị ga-eme ma ị hụ jakị ya, ákwà ya ma ọ bụ ihe ọ bụla furu efu bụ́ nke nwanne gị. Ahapụla ya.
4 “Ọ bụrụ na ị hụ jakị nwanne gị ma ọ bụ ehi ya ka ọ dara n’ụzọ, amala ụma hapụ ya. Hụ na i nyeere nwanne gị aka mee ka anụmanụ ahụ bilie.+
5 “Nwaanyị ekwesịghị iyi ákwà nwoke, nwoke ekwesịghịkwa iyi ákwà nwaanyị. N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu kpọrọ onye ọ bụla nke na-eme otú ahụ asị.
6 “Ọ bụrụ na ị na-aga n’ụzọ hụ akwụ́ nnụnụ nke ụmụ nnụnụ ma ọ bụ àkwá nnụnụ dị n’ime ya, ma ị̀ hụrụ ya n’elu osisi ma ọ̀ bụ n’ala, ya abụrụkwa na nne nnụnụ ahụ kpu n’elu ụmụ ya ma ọ bụ n’elu àkwá ndị ahụ, anwụrụkọtala nne nnụnụ ahụ na ụmụ ya.+ 7 Hụ na ị chụpụrụ nne nnụnụ ahụ, ma i nwere ike ịnwụrụ ụmụ ya. Mee ihe a ka ihe wee gaziere gị, ka ị dịteekwa ndụ aka.
8 “Ọ bụrụ na ị rụọ ụlọ ọhụrụ, rụbichie ihe n’elu ụlọ ahụ+ ka mmadụ ghara isi na ya dapụ, ikpe ọbara ama ezinụlọ gị.
9 “Aghala ụdị mkpụrụ abụọ n’ubi vaịn gị.+ I mee otú ahụ, ihe niile mkpụrụ ị ghara mịrị na ihe ubi vaịn gị mepụtara ga-abụzi maka ebe nsọ.
10 “Ejikọtala ehi na jakị ọnụ jiri ha kọọ ihe.+
11 “Eyila uwe e ji ajị anụ na eri linin e jikọtara ọnụ kpaa.+
12 “Ị ga-adụnye ihe dị yọrị yọrị n’isi anọ nke ákwà ị na-eyi.+
13 “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwunye, ya na ya enwee mmekọahụ, ma ya emechaa kpọọ nwaanyị ahụ asị,* 14 wee bo ya ebubo na o mere ihe ọjọọ, mebiekwa aha ya, sị, ‘M lụrụ nwaanyị a, ma mgbe mụ na ya nwere mmekọahụ, ahụghị m ihe gosiri na ọ mabeghị nwoke,’ 15 nne na nna nwa agbọghọ ahụ ga-ewetara ndị okenye nọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ihe gosiri na nwa ha nwaanyị ahụ amabeghị nwoke. 16 Nna nwa agbọghọ ahụ ga-agwa ndị okenye ahụ, sị, ‘Akpọnyere m nwoke a nwa m nwaanyị ka ọ lụwa, ma ọ kpọọla ya asị,* 17 na-ebokwa ya ebubo na o mere ihe ọjọọ, sị: “Achọpụtala m na e nweghị ihe gosiri na nwa gị nwaanyị amabeghị nwoke.” Lekwanụ ihe gosiri na nwa m nwaanyị amabeghị nwoke.’ Nne na nna nwa agbọghọ ahụ ga-agbasazi ákwà ahụ n’ihu ndị okenye obodo ahụ. 18 Ndị okenye obodo ahụ+ ga-akpọrọ nwoke ahụ taa ya ahụhụ.+ 19 Ha ga-eri ya iwu otu narị (100) shekel* ọlaọcha ma were ya nye nna nwa agbọghọ ahụ, n’ihi na nwoke ahụ mebiri aha nwa agbọghọ Izrel na-amaghị nwoke.+ Ọ ka ga-abụkwa nwunye ya. A gaghị ekwe ka ọ gbaa nwaanyị ahụ alụkwaghịm n’oge niile ọ dị ndụ.
20 “Ma ọ bụrụ na ebubo ahụ bụ eziokwu, ya abụrụkwa na e nweghị ihe gosiri na nwa agbọghọ ahụ amabeghị nwoke, 21 ha ga-akpọpụta nwa agbọghọ ahụ n’ọnụ ụzọ ụlọ nna ya. Ụmụ nwoke obodo ha ga-eji nkume tụgbuo ya maka na ọ kwara iko* n’ụlọ nna ya+ wee mechuo ndị Izrel ihu.+ Unu ga-esi otú a wepụ ihe ọjọọ n’obodo unu.+
22 “Ọ bụrụ na a hụ ka nwoke na nwunye nwoke ọzọ na-enwe mmekọahụ, a ga-egbukọta ha abụọ, ma nwoke ahụ ma nwaanyị ahụ ya na ya nwere mmekọahụ.+ Unu ga-esi otú a wepụ ihe ọjọọ n’Izrel.
23 “Ọ bụrụ na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nwere nwoke kwere ya nkwa na ọ ga-alụ ya, ma nwoke ọzọ ahụ ya n’obodo, ya na ya enwee mmekọahụ, 24 unu ga-akpọpụta ha abụọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ ma jiri nkume tụgbuo ha. Nwa agbọghọ ahụ ga-anwụ maka na o tighị mkpu n’obodo, nwoke ahụ ga-anwụkwa maka na o merụrụ nwunye nwoke ibe ya.+ Unu ga-esi otú a wepụ ihe ọjọọ n’obodo unu.
25 “Ma, ọ bụrụ na ọ bụ n’ọhịa ka nwoke ahụ hụrụ nwa agbọghọ onye ọzọ kwere nkwa na ọ ga-alụ, nwoke ahụ abagide ya ma dinaa ya, ọ bụ naanị nwoke ahụ dinara ya ga-anwụ. 26 Unu emela nwa agbọghọ ahụ ihe ọ bụla. Nwa agbọghọ ahụ emeghị mmehie kwesịrị ọnwụ. Ihe a merenụ yiri ebe mmadụ lụsoro mmadụ ibe ya ọgụ ma gbuo ya.+ 27 Ọ bụ n’ọhịa ka nwoke ahụ hụrụ ya. Nwa agbọghọ ahụ onye ọzọ kwere nkwa ịlụ tiri mkpu, ma e nweghị onye nọnụ ga-anapụta ya.
28 “Ọ bụrụ na nwoke hụrụ nwa agbọghọ na-enwebeghị onye kwere ya nkwa na ọ ga-alụ ya, ya abagide nwa agbọghọ ahụ dinaa ya, e wee chọpụta ihe merenụ,+ 29 nwoke ahụ dinara ya ga-enye nna nwa agbọghọ ahụ shekel ọlaọcha iri ise. Nwa agbọghọ ahụ ga-abụzi nwunye ya.+ Ebe ọ bụ na o merụrụ nwa agbọghọ ahụ, a gaghị ekwe ka ọ gbaa ya alụkwaghịm n’oge niile ọ dị ndụ.
30 “E nweghị nwoke kwesịrị ịlụrụ nwunye nna ya, ka ọ ghara ịkparị nna ya.*+
23 “E nweghị nwoke a pịrị amụ, ya bụ, nke a kụpịara mkpụrụ amụ ya, ma ọ bụ nke e bepụrụ ihe o ji bụrụ nwoke ga-eso n’ọgbakọ Jehova.+
2 “E nweghị nwa a kwatara n’iko ga-eso n’ọgbakọ Jehova.+ Nwa ya ọ bụla agaghị eso n’ọgbakọ Jehova, ruokwa n’ọgbọ nke iri n’ụmụ ya.
3 “E nweghị onye Amọn ma ọ bụ onye Moab ga-eso n’ọgbakọ Jehova.+ E nweghị mgbe nwa ha ọ bụla ga-eso n’ọgbakọ Jehova, ruokwa n’ọgbọ nke iri n’ụmụ ha, 4 n’ihi na ha ewetaraghị unu nri na mmiri mgbe unu si n’Ijipt na-apụta+ nakwa n’ihi na ha goro Belam nwa Biọ, onye Pitọ nke dị na Mesopotemia, ka ọ bụọ unu ọnụ.*+ 5 Ma, Jehova bụ́ Chineke unu egeghị Belam ntị.+ Kama Jehova bụ́ Chineke unu mere ka ọnụ ọ gaara abụ unu bụrụzie ngọzi,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu hụrụ unu n’anya.+ 6 Ya enwela mgbe unu ga-eme ihe ga-eme ka udo dịrị ha ma ọ bụ ihe ga-eme ka ihe dịrị ha ná mma n’oge niile unu dị ndụ.+
7 “Akpọla onye Ịdọm asị, n’ihi na ọ bụ nwanne gị.+
“Akpọla onye Ijipt asị, n’ihi na ị bụbu onye mbịarambịa n’obodo ya.+ 8 Ọgbọ nke atọ n’ụmụ ha, ya bụ, ụmụ ụmụ ụmụ ha, nwere ike iso n’ọgbakọ Jehova.
9 “Mgbe unu mara ụlọikwuu ka unu lụso ndị iro unu agha, unu emela ihe ọ bụla dị njọ.*+ 10 Ọ bụrụ na nwoke adịghị ọcha maka na ọbara ọcha gbapụtara ya n’ahụ́ n’abalị,+ ọ ga-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu pụọ, ọ gaghịkwa abataghachi na ya. 11 Ná mgbede, ọ ga-eji mmiri saa ahụ́. O nweziri ike ịbataghachi n’ebe unu mara ụlọikwuu mgbe anyanwụ dara.+ 12 A ga-ewepụta ebe unu ga na-aga mposi n’ebe dị anya n’ebe unu mara ụlọikwuu. Ọ bụ ebe ahụ ka unu ga na-aga. 13 Mbazụ* so n’ihe unu ga-enwe. Mgbe unu ga-etukwuru ná mpụga ebe ahụ ka unu nyụọ nsị, unu ga-eji ya gwuo ala, unu ga-ekpochikwa nsị unu. 14 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu na-agagharị n’ebe unu mara ụlọikwuu+ ka ọ napụta unu ma nyefee ndị iro unu n’aka unu. Ebe unu mara ụlọikwuu kwesịrị ịdị nsọ,+ ka ọ ghara ịhụ ihe ọ bụla na-adịghị mma n’ebe unu nọ, ya akwụsị iso unu.
15 “Ọ bụrụ na ohu agbapụ n’aka nna ya ukwu gbakwute gị, enyefela ya n’aka nna ya ukwu. 16 O nwere ike iso unu biri n’ebe ọ bụla masịrị ya n’otu n’ime obodo unu nke ọ họọrọ. Emegbula ya.+
17 “E nweghị nwaanyị ọ bụla bụ́ onye Izrel ga-abụ akwụna,*+ e nweghịkwa nwoke ọ bụla bụ́ onye Izrel ga-abụ akwụna.+ 18 Ewebatala ego a kwụrụ nwaanyị na-agba akwụna ma ọ bụ ego a kwụrụ nwoke na-agba akwụna* n’ụlọ Jehova bụ́ Chineke unu ka i jiri ya mezuo nkwa i kwere, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu kpọrọ ndị ahụ asị.
19 “Agwala nwanne gị ka ọ kwụọ ọmụrụ nwa,+ ma ọ̀ bụ ịkwụ ọmụrụ nwa n’ego ma ọ̀ bụ n’ihe oriri ma ọ̀ bụ n’ihe ọ bụla e nwere ike ịgwa mmadụ ka ọ kwụọ ọmụrụ nwa na ya. 20 I nwere ike ịgwa onye mba ọzọ ka ọ kwụọ gị ọmụrụ nwa,+ ma agwala nwanne gị ka ọ kwụọ gị ọmụrụ nwa,+ ka Jehova bụ́ Chineke gị wee gọzie gị n’ihe ọ bụla ị ga-eme n’ala unu na-aga iweghara.+
21 “Ọ bụrụ na i kwe Jehova bụ́ Chineke gị nkwa,+ egbula oge imezu ihe i kwere ná nkwa.+ N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị ga-achọrịrị ka i mezuo ya. Ọ bụrụ na i mezughị ya, i mehiela.+ 22 Ma, ọ bụrụ na i kweghị nkwa, e nweghị mmehie i mere.+ 23 I kwesịrị imezu ihe ọ bụla i kwuru.+ Ị ga-enyekwa Jehova bụ́ Chineke gị onyinye ọ bụla si gị n’obi nke i kwere nkwa na ị ga-enye ya.+
24 “Ọ bụrụ na ị banye n’ubi vaịn onye agbata obi gị, i nwere ike ịracha mkpụrụ vaịn ole ga-eju gị* afọ, ma i kwesịghị itinye nke ọ bụla n’akpa gị.+
25 “Ọ bụrụ na ị banye n’ubi ọka onye agbata obi gị, i nwere ike iji aka ghọrọ ọka chara acha, ma i kwesịghị iji mma e ji ewe ihe ubi gburu ọka onye agbata obi gị.+
24 “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị, ma nwaanyị ahụ amasịghịzi ya maka na ọ chọpụtara na nwaanyị ahụ mere ihe na-eme ihere, nwoke ahụ ga-edere ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm,+ were ya nye ya ma chụpụ ya n’ụlọ ya.+ 2 Mgbe o si n’ụlọ nwoke ahụ pụọ, o nwere ike ịga ka nwoke ọzọ lụrụ ya.+ 3 Ọ bụrụ na nwoke nke abụọ a akpọọ ya asị* ma deere ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm, were ya nye ya ma chụpụ ya n’ụlọ ya, ma ọ bụ, ọ bụrụ na nwoke nke abụọ a lụrụ ya anwụọ, 4 a gaghị ekwe ka di mbụ ya, bụ́ onye chụpụrụ ya, kpọrọ ya ọzọ ka ọ bụrụ nwunye ya mgbe e merụcharala ya, n’ihi na ọ bụ arụ n’anya Jehova. Unu emela mmehie n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu.
5 “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị ọhụrụ, ọ gaghị eso ndị agha gaa agha. A gaghịkwa ekenye ya ọrụ ọ bụla ọzọ. A gaghị ekenye ya ọrụ ọ bụla ruo otu afọ. Ọ ga-anọ n’ụlọ na-eme nwunye ya obi ụtọ.+
6 “E nweghị onye kwesịrị iburu nkume onye o binyere ego ji egwe nri ma ọ bụ aka nkume o ji egwe nri ka ọ bụrụ ihe ibé maka ego o binyere ya,+ n’ihi na ime otú ahụ dị ka ịnara mmadụ ihe o ji akpa afọ ya* ka ọ bụrụ ihe ibé.
7 “Ọ bụrụ na a hụ na mmadụ tọọrọ nwanne ya bụ́ onye Izrel, taa ya ahụhụ ma ree ya,+ onye ahụ tọọrọ mmadụ ga-anwụ.+ Unu ga-ewepụ ihe ọjọọ n’obodo unu.+
8 “Ọ bụrụ na ọrịa ekpenta* arịawa mmadụ, lezienụ anya ka unu mee ihe niile ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, ga-agwa unu.+ Lezienụ anya ka unu mee kpọmkwem ihe m nyere ha n’iwu. 9 Chetanụ ihe Jehova bụ́ Chineke unu mere Miriam n’ụzọ, mgbe unu si n’Ijipt na-apụta.+
10 “Ọ bụrụ na ị gbazinye onye agbata obi gị ụdị ihe ọ bụla,+ abanyela n’ụlọ ya ka ị nara ya ihe ibé ọ chọrọ inye gị. 11 Ị ga-eguzo n’èzí, onye ahụ ị gbazinyere ihe ewetara gị ihe ibé ọ chọrọ inye gị n’èzí. 12 Ọ bụrụ na onye ahụ bụ ogbenye, ka uwe o nyere gị ka ọ bụrụ ihe ibé ghara ịdị gị n’aka ruo echi ya.+ 13 Hụ na ị chịghachiiri ya uwe ahụ ozugbo anyanwụ dara, bụ́ nke o nyere gị ka ọ bụrụ ihe ibé. Ọ ga-eji uwe ya hie ụra,+ ọ ga-agọzikwa gị. Jehova bụ́ Chineke gị ga-ewere ya na i meela ezi omume.
14 “Erigbula onye ọrụ e goro ego ihe siiri ike, nke dakwara ogbenye, ma ọ̀ bụ nwanne gị ma ọ̀ bụ onye mbịarambịa nke bi n’ala unu, n’otu n’ime obodo unu.+ 15 I kwesịrị ịkwụ ya ụgwọ ọrụ ya n’ụbọchị ọ rụụrụ gị ọrụ,+ tupu anyanwụ adaa, n’ihi na ọ dara ogbenye, ọ bụkwa ụgwọ ọrụ ya bụ ihe o chekwubere. Ọ bụrụ na ị kwụghị ya ụgwọ ọrụ ya, ọ ga-ebesara Jehova ákwá n’ihi gị, ikpe mmehie ga-amakwa gị.+
16 “A gaghị egbu ndị nna n’ihi ihe ụmụ ha mere, a gaghịkwa egbu ụmụ n’ihi ihe nna ha mere.+ Ọ bụ naanị mmehie mmadụ mere ga-eme ka e gbuo ya.+
17 “Ekpela ikpe na-ezighị ezi mgbe ị na-ekpe ikpe onye mbịarambịa ma ọ bụ ikpe nwa na-enweghị nna.*+ Achịrịkwala uwe nwaanyị di ya nwụrụ ka ọ bụrụ ihe ibé maka ego i binyere ya.+ 18 Cheta na ị nọ na-agba ohu n’Ijipt, ma Jehova bụ́ Chineke gị gbapụtara gị n’ebe ahụ.+ Ọ bụ ya mere m ji na-enye gị iwu ka i mee ihe a.
19 “Ọ bụrụ na ị gaa wee ihe ubi ndị dị n’ubi gị, gị echefuo ùkwù ọka* n’ubi, agaghachila ka i buru ya. A ga-ahapụrụ ya onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna,* nakwa nwaanyị di ya nwụrụ,+ ka Jehova bụ́ Chineke gị wee gọzie gị n’ihe niile ị na-eme.+
20 “Ọ bụrụ na ị ghọọ mkpụrụ osisi oliv gị, agaghachila ka ị ghọrọ ndị fọrọ n’alaka ya. Ndị fọrọnụ ga-abụ maka onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna, nakwa nwaanyị di ya nwụrụ.+
21 “Ọ bụrụ na ị ghọọ mkpụrụ vaịn n’ubi vaịn gị, agaghachila ka ị ghọrọ ndị fọrọ afọ. A ga-ahapụ ha maka onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna, nakwa nwaanyị di ya nwụrụ. 22 Cheta na ị nọ na-agba ohu n’Ijipt. Ọ bụ ya mere m ji na-enye gị iwu ka i mee ihe a.
25 “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ esee okwu, ha nwere ike ịgakwuru ndị ikpe.+ Ndị ikpe ga-ekpere ha ikpe ma kpebie onye nke aka ya dị ọcha na onye nke mere ihe na-adịghị mma.+ 2 Ọ bụrụ na e kwesịrị ịpịa onye nke mere ihe na-adịghị mma ihe,+ onyeikpe ga-eme ka o dinara ala, a ga-anọkwa n’ihu onyeikpe ahụ pịa ya ihe. Ihe a ga-eji mara ọnụ ụtarị ole a ga-apịa ya bụ otú ihe o mere dịruru njọ. 3 E nwere ike ịpịaru ya ọnụ ụtarị iri anọ,+ ma ọ gaghị akarị iri anọ. Ọ bụrụ na a pịa ya karịa ole a, a ga-emenye nwanne gị ihere n’ihu unu.
4 “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha ọka.*+
5 “Ọ bụrụ na ụmụnne bikọtara ọnụ, otu n’ime ha anwụọ n’amụtaghị nwa nwoke, nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ agaghị alụ nwoke si n’ezinụlọ ọzọ. Nwanne di ya ga-agakwuru ya, kpọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye ya ma kuchie ya.+ 6 Nwa nwoke mbụ nwaanyị ahụ ga-amụ ga-aza aha nwanne ya nwoke nwụrụ anwụ,+ ka aha ya ghara ifu n’Izrel.+
7 “Ma ọ bụrụ na nwoke ahụ achọghị ịlụ nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ, nwunye nwanne ya ahụ ga-agakwuru ndị okenye n’ọnụ ụzọ ámá obodo ma sị, ‘Nwanne di m jụrụ ime ka aha nwanne ya nwoke ghara ifu n’Izrel. O kweghị ekuchi m.’ 8 Ndị okenye obodo ha ga-akpọ nwoke ahụ gwa ya okwu. Ọ bụrụ na o sie ọnwụ, sị, ‘Achọghị m ịlụ ya,’ 9 nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ ga-abịakwute ya n’ihu ndị okenye ahụ, yipụ ya otu akpụkpọ ụkwụ ya,+ gbụọ ya asọ mmiri n’ihu ma sị, ‘Ọ bụ ihe a ka a ga-eme nwoke na-ekweghị eme ka ámá nwanne ya nwoke ghara ichi.’ 10 Ihe a ga-ejizi mara ezinụlọ ya n’Izrel bụ ‘Ezinụlọ onye e yipụrụ akpụkpọ ụkwụ ya.’
11 “Ọ bụrụ na ụmụ nwoke abụọ na-alụ ọgụ, nwunye otu n’ime ha abịa ịnapụta di ya n’aka onye na-eti ya ihe, nwaanyị ahụ wee matịa aka jide nwoke ahụ n’ihe o ji bụrụ nwoke, 12 unu ga-egbupụ nwaanyị ahụ aka. Unu* emerela ya ebere.
13 “Enwela ụdị nkume abụọ e ji atụ̀ ihe n’akpa gị,+ nke ukwu na nke nta. 14 Enwela ụdị efere abụọ e ji atụ̀ ihe*+ n’ụlọ gị, nke ukwu na nke nta. 15 Ị ga-enwe ezigbo ihe e ji atụ̀ ihe nke zuru ezu, nweekwa ezigbo efere e ji atụ̀ ihe nke zuru ezu, ka i wee dịtee ndụ aka n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị.+ 16 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị kpọrọ onye ọ bụla na-aghọ aghụghọ, nke na-eme ihe ndị a, asị.+
17 “Chetanụ ihe ndị Amalek mere unu n’ụzọ mgbe unu si n’Ijipt na-apụta,+ 18 otú ha si zute unu n’ụzọ ma lụso ndị niile nọ n’azụ azụ na-anaghị agasi ike agha, mgbe ike gwụrụ unu. Ha atụghị egwu Chineke. 19 Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu mere ka unu zuoro ndị iro unu niile gbara unu gburugburu ike n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu,+ unu ga-ekpochapụ ndị Amalek ka a ghara ịnụkwa aha ha n’ụwa.*+ Unu echefula.
26 “Mgbe unu ga-emecha banye n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu, unu ewee weghara ya ma biri na ya, 2 unu ga-eweta ụfọdụ n’ime mkpụrụ mbụ nke ihe niile ala ahụ mepụtara, bụ́ ndị unu ga-eweta n’ala Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu. Unu ga-etinye ha na nkata ma buru ha gaa n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya.+ 3 Unu ga-agakwuru onye nchụàjà na-eje ozi n’oge ahụ ma sị ya, ‘Taa, m bịara ịgwa Jehova bụ́ Chineke gị na abatala m n’ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna anyị hà iyi na ọ ga-enye anyị.’+
4 “Onye nchụàjà ga-eburu nkata ahụ unu butere ma busa ya n’ihu ebe ịchụàjà Jehova bụ́ Chineke unu. 5 Ị ga-ekwuzi n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị, sị, ‘Nna m bụ onye Eram*+ na-agagharị agagharị.* Ọ gara n’Ijipt+ bụrụ onye mbịarambịa n’ebe ahụ, ya na mmadụ ole na ole bụ́ ndị ezinụlọ ya.+ Ma ọ nọ n’ebe ahụ ghọọ mba ukwu, nke ndị ya dị ike ma dị ọtụtụ.+ 6 Ndị Ijipt mesiri anyị ike ma megbuo anyị, jiri anyị mere ndị ohu, chiekwa anyị ọnụ n’ala.+ 7 Anyị wee malite ibesara Jehova bụ́ Chineke nna nna anyị hà ákwá. Jehova wee nụ olu anyị ma hụ na a na-emekpa anyị ahụ́, na anyị nọ ná nsogbu, nakwa na a na-emegbu anyị.+ 8 N’ikpeazụ, Jehova ji aka ya siri ike na ike ya kpọpụta anyị n’Ijipt.+ O mekwara ihe ndị dị egwu na ihe àmà dị iche iche, rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche mgbe ọ na-akpọpụta anyị.+ 9 O wee kpọta anyị n’ebe a ma nye anyị ala a, bụ́ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ 10 Ugbu a, ewetala m mkpụrụ mbụ nke ihe ala Jehova nyere m mepụtara.’+
“Ị ga-ebusa ha n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị ma kpọọ isiala n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị. 11 Ị ga-aṅụrịzi ọṅụ maka ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị na ezinụlọ gị, gị na onye Livaị na onye mbịarambịa nke bi n’obodo unu.+
12 “Mgbe i wekọtachara otu ụzọ n’ụzọ iri+ nke ihe niile ala gị mepụtara n’afọ nke atọ, bụ́ afọ a na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri, ị ga-enye ya onye Livaị, onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna,* na nwaanyị di ya nwụrụ. Ha ga-eri ya n’ime obodo gị rijuo afọ.+ 13 Ị ga-ekwuzi n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị, sị, ‘Ewepụla m ihe dị nsọ n’ụlọ m. Enyekwala m ya onye Livaị, onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna, na nwaanyị di ya nwụrụ,+ otú i nyere m n’iwu. Emebighị m ihe ndị i nyere n’iwu, elegharaghị m ha anya. 14 Erighị m ihe ọ bụla si na ya n’oge m na-eru uju. Ewepụghị m ihe na ya mgbe m na-adịghị ọcha. Enyeghịkwa m nke ọ bụla n’ime ya maka onye nwụrụ anwụ. M gere ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke m. Emeekwala m ihe niile i nyere m n’iwu. 15 Si n’eluigwe, bụ́ ebe dị nsọ i bi, ledata anya gọzie ndị gị bụ́ Izrel, gọziekwa ala i nyere anyị,+ otú ị ṅụụrụ nna nna anyị hà n’iyi,+ bụ́ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.’*+
16 “Taa, Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu iwu ka unu soro ntụziaka ndị a, na-emekwa ihe ndị o kpebiri. Jirinụ obi unu niile+ na mkpụrụ obi* unu niile na-edebe ha ma na-eme ha. 17 Taa, Jehova agwala unu na ya ga-abụ Chineke unu nakwa na unu ga-eme ihe o nyere unu n’iwu, soro ntụziaka ya,+ debe iwu ya+ ma na-eme ihe ndị o kpebiri,+ nakwa na unu ga-ege ntị n’olu ya. 18 Taa, unu agwakwala Jehova na unu ga-abụ ndị ya, ndị ya pụrụ iche,+ otú o kwere unu ná nkwa, nakwa na unu ga-edebe ihe niile o nyere n’iwu, 19 nakwa na ọ ga-eme ka unu ka mba ndị ọzọ niile o kere,+ mee ka a na-eto unu, ka a mara unu ama nakwa ka unu dị ebube otú o kwere ná nkwa, ma ọ bụrụ na unu abụụrụ Jehova bụ́ Chineke unu ndị dị nsọ.”+
27 Mosis na ndị okenye Izrel wee nye ndị Izrel iwu, sị: “Meenụ ihe niile m na-enye unu n’iwu taa. 2 N’ụbọchị unu ga-agafe Osimiri Jọdan banye n’ala Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu, unu ga-ebute nkume ndị buru ibu, dokọta ha ọnụ ma were ụrọ tee ha.*+ 3 Mgbe unu gafechara, deenụ ihe niile e kwuru n’Iwu a na ha, ka unu wee banye n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu, bụ́ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,* otú Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà kwere unu ná nkwa.+ 4 Mgbe unu gafechara Osimiri Jọdan, unu ga-ebute nkume ndị ahụ ma dokọta ha ọnụ n’Ugwu Ịbal,+ werekwa ụrọ tee ha,* otú m na-enye unu n’iwu taa. 5 Unu ga-arụkwara Jehova bụ́ Chineke unu ebe ịchụàjà n’ebe ahụ, ya bụ, ebe ịchụàjà e ji nkume rụọ. Unu ejila ngwá ọrụ e ji ígwè rụọ waa ha.+ 6 Unu ga-eji nkume ndị a na-awaghị awa rụọ ebe ịchụàjà Jehova bụ́ Chineke unu, chụọkwara Jehova bụ́ Chineke unu àjà a na-esu ọkụ na ya. 7 Unu ga-achụ àjà udo+ n’ebe ahụ ma rie ha n’ebe ahụ.+ Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu.+ 8 Unu ga-edepụta ihe niile e kwuru n’Iwu a na nkume ndị ahụ nke ọma.”+
9 Mosis na ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, wee gwa ndị Izrel niile okwu, sị: “Ndị Izrel, nọrọnụ jụụ, geekwanụ ntị. Taa, ọ bụzi Jehova bụ́ Chineke unu nwe unu.+ 10 Geenụ ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu, meenụ ihe ndị o nyere n’iwu,+ sorokwanụ ntụziaka ya ndị m na-enye unu n’iwu taa.”
11 N’ụbọchị ahụ, Mosis nyere ndị Izrel iwu, sị: 12 “Ebo ndị a ga-eguzo n’Ugwu Gerizim+ gọzie ndị mmadụ mgbe unu gafechara Osimiri Jọdan: Simiọn, Livaị, Juda, Ịsaka, Josef, na Benjamin. 13 Ebo ndị a ga-eguzo n’Ugwu Ịbal+ bụọ ndị mmadụ ọnụ: Ruben, Gad, Asha, Zebulọn, Dan, na Naftalaị. 14 Ndị Livaị ga-agwa ndị Izrel niile okwu n’oké olu, sị:+
15 “‘Onye mere arụsị a pịrị apị+ ma ọ bụ arụsị a kpụrụ akpụ,+ nke onye na-eme nkà rụrụ, ma zoo ya, a ga-abụ ya ọnụ, n’ihi na arụsị bụ ihe rụrụ arụ n’anya Jehova.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’*)
16 “‘Onye na-elelị nne ya ma ọ bụ nna ya, a ga-abụ ya ọnụ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
17 “‘Onye na-ewela ihe e ji kpaa ókè n’ala onye agbata obi ya azụ,+ a ga-abụ ya ọnụ.’ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
18 “‘Onye na-eme ka onye ìsì gahie ụzọ,+ a ga-abụ ya ọnụ.’ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
19 “‘Onye na-ekpe onye mbịarambịa ma ọ bụ nwa na-enweghị nna* ma ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ+ ikpe na-ezighị ezi,+ a ga-abụ ya ọnụ.’ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
20 “‘Onye ya na nwunye nna ya nwere mmekọahụ, a ga-abụ ya ọnụ, n’ihi na ọ kparịala nna ya.’*+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
21 “‘Onye ya na anụmanụ ọ bụla nwere mmekọahụ,+ a ga-abụ ya ọnụ.’ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
22 “‘Onye ya na nwanne ya nwaanyị, ya bụ, nwaanyị nna ya mụrụ ma ọ bụ nwaanyị nne ya mụrụ, nwere mmekọahụ,+ a ga-abụ ya ọnụ.’ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
23 “‘Onye ya na nne nwunye ya nwere mmekọahụ, a ga-abụ ya ọnụ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
24 “‘Onye si n’ebe o zoro pụta gbuo onye agbata obi ya, a ga-abụ ya ọnụ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
25 “‘Onye na-anara aka azụ ka o gbuo onye aka ya dị ọcha, a ga-abụ ya ọnụ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
26 “‘Onye na-anaghị akwado ihe ndị e kwuru n’Iwu a ma na-eme ha eme, a ga-abụ ya ọnụ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
28 “Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu ya niile m na-enye unu taa, Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka unu ka mba ndị ọzọ niile dị n’ụwa.+ 2 A ga-agọzi unu nke ukwuu, ihe ọma niile a ga-abịakwara unu+ maka na unu na-ege ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu:
3 “A ga-agọzi unu n’obodo, gọziekwa unu n’ubi.+
4 “A ga-agọzi ụmụ* unu+ na ihe ala unu na-emepụta nakwa ụmụ anụ ụlọ unu, ya bụ, ehi unu na atụrụ unu.+
5 “A ga-agọzi nkata unu+ na efere unu ji agwọ ntụ ọka.*+
6 “A ga-agọzi unu mgbe unu na-abata abata, gọziekwa unu mgbe unu na-apụ apụ.
7 “Jehova ga-eme ka unu merie ndị iro unu na-alụso unu agha.+ Ha ga-esi n’otu ụzọ bịa ịlụso unu agha, ma ha ga-esi n’ụzọ asaa gbapụ n’ihu unu.+ 8 Jehova ga-agọzi ebe unu na-akwasa ihe,+ gọziekwa ihe ọ bụla unu na-eme. Ọ ga-agọzi unu n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu. 9 Jehova ga-eme ka unu bụrụ ndị ya dị nsọ,+ otú ọ ṅụụrụ unu n’iyi,+ maka na unu na-edebe ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere n’iwu ma na-eme uche ya. 10 Ndị niile bi n’ụwa ga-ahụ na unu na-aza aha Jehova,+ ha ga-atụkwa unu egwu.+
11 “Jehova ga-eme ka unu nwee ọtụtụ ụmụ na ọtụtụ anụ ụlọ, meekwa ka ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na ọ ga-enye unu+ na-emepụta ihe n’ụba.+ 12 Jehova ga-emepere unu eluigwe ya otú mmadụ si emepe ebe ọ kwasara ezigbo ihe ma mee ka mmiri zoo n’ala unu n’oge ya,+ gọziekwa ihe niile unu na-eme. Unu ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma e nweghị ihe ga-eme ka unu gbaziri ihe.+ 13 Jehova ga-eme ka unu bụrụ ndị isi, ọ bụghị ndị ọdụ. Unu ga-anọ n’elu,+ ọ bụghị n’ala, ma ọ bụrụ na unu ana-erube isi n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu, bụ́ ndị m na-enye unu taa ka unu na-edebe ma na-eme. 14 Unu anwala anwa hapụ ihe niile m na-enye unu n’iwu taa gaa mewe ihe ọzọ,+ ka unu wee soro chi ọzọ dị iche iche ma fewe ha ofufe.+
15 “Ma ọ bụrụ na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu ya niile, na-emekwa ihe ndị o kpebiri bụ́ ndị m na-agwa unu taa, a ga-abụrịrị unu ọnụ, ihe ọjọọ a niile ga-emekwa unu:+
16 “A ga-abụ unu ọnụ n’obodo, bụọkwa unu ọnụ n’ubi.+
17 “A ga-abụ nkata unu+ na efere unu ji agwọ ntụ ọka ọnụ.+
18 “A ga-abụ ụmụ* unu+ na ihe ala unu na-emepụta ọnụ, bụọkwa ụmụ ehi unu na atụrụ unu ọnụ.+
19 “A ga-abụ unu ọnụ mgbe unu na-abata abata, bụọkwa unu ọnụ mgbe unu na-apụ apụ.
20 “Jehova ga-abụ unu ọnụ, mee ka unu nọrọ n’ọgba aghara, taakwa unu ahụhụ n’ihe ọ bụla unu na-eme ruo mgbe e bibiri unu, unu ewee laa n’iyi n’egbughị oge, n’ihi omume ọjọọ unu nakwa n’ihi na unu hapụrụ ya.*+ 21 Jehova ga-eme ka unu rịawa ọrịa na-anaghị ala ala ruo mgbe o bibichara unu n’ala ahụ unu na-aga iweghara.+ 22 Jehova ga-eme ka unu rịawa ụkwara nta, oké ahụ́ ọkụ,+ ahụ́ ọzịza, na oké okpomọkụ. Ọ ga-eme ka a lụso unu agha,+ meekwa ka ihe unu kụrụ kpọnwụọ nakwa ka ha maa ebù.+ Ihe ndị a ga-emegide unu ruo mgbe unu ga-anwụcha. 23 Mbara igwe unu ga-adị ka ọla kọpa,* ala unu ga-adịkwa ka ígwè.*+ 24 Jehova ga-eme ka ntụ na uzuzu si n’eluigwe na-ezo n’ala unu ka mmiri ruo mgbe unu lara n’iyi. 25 Jehova ga-eme ka ndị iro unu merie unu.+ Unu ga-esi n’otu ụzọ gaa ịlụso ha agha, ma unu ga-esi n’ụzọ asaa gbapụ n’ihu ha. Alaeze niile dị n’ụwa ga-atụ ụjọ mgbe ha ga-ahụ ihe ọjọọ ndị na-eme unu.+ 26 Ozu unu ga-abụrụ nnụnụ niile na-efe n’eluigwe na anụmanụ ndị na-agagharị n’ala ihe oriri, e nweghịkwa onye ga-achụpụ ha.+
27 “Jehova ga-eme ka etuto toro ndị Ijipt too unu, meekwa ka ọkpụ ikè, ụ́gwọ̀, na ọkọ, bụ́ ndị a na-agaghị agwọ agwọ, mee unu. 28 Jehova ga-eme ka ara gbaa unu, mee ka unu kpuo ìsì,+ meekwa ka uche ghara ịkpakọ unu ọnụ. 29 Unu ga na-asọgharị ìsì n’ehihie otú onye ìsì si asọgharị ìsì n’ọchịchịrị,+ e nweghịkwa ihe unu na-eme ga-agara unu nke ọma. A ga na-erigbu unu mgbe niile, na-ezu unu ohi, e nweghịkwa onye ga-azọpụta unu.+ 30 Unu ga-ekwe nwaanyị nkwa na unu ga-alụ ya, ma nwoke ọzọ ga-edina ya n’ike. Unu ga-arụ ụlọ, ma unu agaghị ebi na ya.+ Unu ga-akọ ubi vaịn, ma unu agaghị amalite iri mkpụrụ ya.+ 31 A ga-egbu ehi unu n’ihu unu, ma unu agaghị eri anụ ya ọ bụla. A ga-ezuru jakị unu n’ihu unu, ma a gaghị akpọghachiri ya unu. A ga-akpụnye ndị iro unu atụrụ unu, ma e nweghị onye ga-azọpụta unu. 32 Unu ga na-ele anya a kpọrọ ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị kpọnye ndị ọzọ.+ Agụụ ịhụ ha ga na-agụ unu mgbe niile, ma e nweghị ihe unu ga-emeli. 33 Ndị unu na-amaghị ga-eri ihe ala unu mepụtara na ihe niile unu rụtara.+ A ga na-erigbu unu mgbe niile, na-echikwa unu ọnụ n’ala. 34 Ihe unu ga-eji anya unu ahụ ga-agbaka unu isi.
35 “Jehova ga-eme ka etuto na-afụ ụfụ nke a na-anaghị agwọta agwọta too unu n’ikpere nakwa n’ụkwụ, malite n’ọbụ ụkwụ unu ruo n’opu isi unu. 36 Jehova ga-achụga unu na onye unu ga-eme eze ná mba unu na nna nna unu hà na-amaghị.+ Unu ga-efe chi ọzọ dị iche iche n’ebe ahụ, chi ndị e ji osisi na nkume mee.+ 37 Ihe ndị ga-eme unu ga-emenye ndị bi n’ebe niile Jehova ga-achụga unu ụjọ. Ha ga-eji unu mere ihe ọchị,* ha agaghịkwa eji unu kpọrọ ihe.+
38 “Unu ga-agha ọtụtụ mkpụrụ n’ubi, ma ihe unu ga-eweta ga-adị ole na ole,+ n’ihi na igurube ga-erichapụ ha. 39 Unu ga-akọ ubi vaịn, lekọtakwa ya, ma unu agaghị aṅụ mmanya ọ bụla, unu agaghịkwa aghọta ihe ọ bụla,+ n’ihi na ọtị ga-erichapụ ya. 40 Unu ga-enwe osisi oliv n’ala unu niile, ma unu agaghị ete mmanụ ọ bụla n’ahụ́, n’ihi na mkpụrụ oliv unu ga-adapụcha. 41 Unu ga-amụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị, ma ha agaghị abụ nke unu, n’ihi na a ga-adọrọ ha n’agha.+ 42 Ụmụ ahụhụ dị iche iche ga-eju n’osisi unu niile nakwa n’ihe ala unu mepụtara. 43 Onye mbịarambịa nke binyeere unu ga na-adị ike karịa unu, ma ike ga na-agwụkwu unu. 44 Ọ ga-agbazinye unu ihe, ma unu agaghị agbazinye ya ihe.+ Ọ ga-abụ onyeisi, ma unu ga-abụ ndị ọdụ.+
45 “A ga-abụrịrị unu ọnụ,+ ihe ọjọọ niile a ga-emekwa unu ruo mgbe unu lara n’iyi,+ n’ihi na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu, unu edebeghị iwu ya ma soro ntụziaka ndị o nyere unu.+ 46 Unu na ụmụ unu ga na-abụ ndị a bụrụ ọnụ. Ọnụ ahụ a bụrụ unu ga-abụkwa ihe àmà ga-adịgide adịgide na ihe ịdọ aka ná ntị,+ 47 n’ihi na unu ejighị ọṅụ na obi ụtọ fee Jehova bụ́ Chineke unu* mgbe unu nwejuru ihe niile enweju.+ 48 Jehova ga-eme ka ndị iro unu bịa lụso unu agha, unu ga-ejekwara ha ozi.+ N’oge ahụ, agụụ ga na-agụ unu,+ mmiri ga na-agụkwa unu, unu agaghị eyi ezigbo ákwà, ihe niile ga-akọkwa unu. Ọ ga-anyawa unu yok ígwè n’olu ruo mgbe ọ lara unu n’iyi.
49 “Jehova ga-eme ka mba dị n’ebe dị anya si n’ebe ụwa sọtụrụ bịa lụso unu agha.+ Ọ ga-alụso unu agha n’ike otú ugo si efekwasị n’ihe ọ chọrọ iburu.+ Ọ ga-abụ mba unu na-agaghị aghọta asụsụ ha,+ 50 mba nke na-emenye mmadụ ụjọ, nke na-agaghị akwanyere agadi ùgwù ma ọ bụ meere onye na-eto eto ebere.+ 51 Ha ga-eri ụmụ anụ ụlọ unu na ihe ala unu mepụtara ruo mgbe e kpochapụrụ unu. Ha agaghị ahapụrụ unu ọka* ọ bụla, mmanya ọhụrụ ma ọ bụ mmanụ ọ bụla, ụmụ ehi ma ọ bụ ụmụ atụrụ ọ bụla ruo mgbe ha bibiri unu.+ 52 Ha ga-anọchibido unu, ghara ikwe ka unu si n’obodo niile dị n’ala unu pụta, ruo mgbe mgbidi ndị dị elu unu rụsiri ike, bụ́ ndị unu tụkwasịrị obi, ga-ada. N’eziokwu, ha ga-anọchibido unu n’obodo niile dị n’ala unu nke Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu.+ 53 N’ihi otú ihe ga-esi siere unu ike mgbe ndị iro unu ga-anọchibido unu nakwa otú ha ga-esi na-echi unu ọnụ n’ala, unu ga-eri ụmụ* unu, ya bụ, anụ ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị,+ bụ́ ụmụ Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu.
54 “Nwoke nke na-eme nwayọọ nwayọọ, nke ihe kacha emetụ n’ahụ́ n’ime unu, agaghịdị emetere nwanne ya nwoke ma ọ bụ nwunye ya ọ hụrụ n’anya ma ọ bụ ụmụ ya ndị fọrọ afọ ebere. 55 Ọ gaghịkwa enyetụ ha anụ nwa ya nke ọ bụla ọ ga-eri, n’ihi na e nweghị ihe ọ bụla ọzọ o nwere n’ihi otú ihe ga-esi siere unu ike mgbe ndị iro unu ga-anọchibido unu nakwa otú ha ga-esi na-echi unu ọnụ n’ala.+ 56 Nwaanyị nke na-eme nwayọọ nwayọọ, nke ihe na-emetụkwa n’ahụ́, nke na-agaghịdị eche echiche ịzọ ụkwụ ya n’ala maka na ọ na-eme nwayọọ nwayọọ+ agaghị emetere di ya ọ hụrụ n’anya ma ọ bụ nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị ebere. 57 Ọ gaghịdị enyetụ ha ihe ọ bụla na-esi n’ahụ́ ya apụta mgbe ọ mụchara nwa nakwa anụ ụmụ ndị ọ ga-amụ. Ọ ga-eri ha na nzuzo n’ihi otú ihe ga-esi siere unu ike mgbe ndị iro unu ga-anọchibido unu nakwa n’ihi otú ha ga-esi na-echi unu ọnụ n’ala.
58 “Ọ bụrụ na unu elezighị anya mee ihe niile e kwuru n’Iwu a, bụ́ ndị e dere n’akwụkwọ a,+ gharakwa ịtụ egwu aha a dị ebube ma dị egwu,+ ya bụ, aha Jehova+ Chineke unu, 59 Jehova ga-ata unu na ụmụ unu ezigbo ahụhụ, nnukwu ahụhụ na-agaghị ebi ebi,+ meekwa ka unu rịawa ajọ ọrịa ndị na-anaghị ala ala. 60 Ọ ga-eme ka unu rịa ọrịa niile ndị Ijipt rịara, bụ́ ọrịa ndị unu na-atụ egwu, ndị na-agaghịkwa ala ala. 61 Jehova ga-emedị ka unu rịa ọrịa ọ bụla a na-edeghị n’akwụkwọ Iwu a, taakwa unu ahụhụ ọ bụla a na-edeghị n’akwụkwọ Iwu a ruo mgbe unu lara n’iyi. 62 N’agbanyeghị na unu adịla ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe,+ unu ga-afọ mmadụ ole na ole+ maka na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu.
63 “Otú ahụ obi dị Jehova mma ime ka ihe gaziere unu nakwa ka unu mụbaa ka obi ga-adịkwa Jehova mma ibibi unu na ịla unu n’iyi. A ga-ekpochapụkwa unu n’ala ahụ unu na-aga iweghara.
64 “Jehova ga-achụsasị unu ná mba niile, malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ya nke ọzọ.+ N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche e ji osisi na nkume mee, chi ndị unu na nna nna unu hà na-amaghị.+ 65 Obi agaghị eru unu ala ná mba ndị ahụ,+ unu agaghịkwa ahụ ebe ụkwụ unu ga-ezu ike. Kama, Jehova ga-eme ka obi koro unu n’elu,+ ka ike gwụ anya unu, nakwa ka unu daa mbà n’obi.+ 66 Ihe ndị ga-ata isi unu ga-agba unu gburugburu, ụjọ ga na-atụkwa unu abalị na ehihie. Unu agaghị eji ndụ unu n’aka. 67 N’ụtụtụ, unu ga-asị, ‘A sị nnọọ na ọ bụ mgbede!’ Ná mgbede, unu ga-asịkwa, ‘A sị nnọọ na ọ bụ ụtụtụ!’ n’ihi na unu ga-achị obi unu n’aka nakwa n’ihi ihe anya unu ga-ahụ. 68 Jehova ga-eji ụgbọ mmiri bughachi unu n’Ijipt, bụ́ ebe m gwara unu banyere ya, sị, ‘Unu agaghị ahụ ya ọzọ.’ N’ebe ahụ, unu ga-achọ ka unu resị ndị iro unu onwe unu ka unu bụrụ ohu ha ndị nwoke na ohu ha ndị nwaanyị, ma e nweghị onye ga-azụrụ unu.”
29 Ihe ndị a bụ okwu Jehova nyere Mosis n’iwu ka ọ gwa ndị Izrel mgbe ya na ha gbara ndụ na Moab, ma e wepụ ọgbụgba ndụ ya na ha gbara na Horeb.+
2 Mosis wee kpọkọta ndị Izrel niile, sị ha: “Unu ahụla ihe niile Jehova mere Fero n’Ijipt, ya na ndị niile na-ejere ya ozi nakwa ala ya niile n’ihu unu,+ 3 nnukwu ahụhụ a tara ha unu ji anya unu hụ, nnukwu ihe àmà na ọrụ ebube ndị ahụ.+ 4 Ma ruo taa, Jehova enyebeghị unu obi unu ga-eji na-aghọta ihe na anya unu ga-eji na-ahụ ụzọ na ntị unu ga-eji na-anụ ihe.+ 5 ‘N’ime afọ iri anọ m nọ na-edu unu n’ala ịkpa,+ uwe unu yi n’ahụ́ akaghị nká, akpụkpọ ụkwụ unu yi n’ụkwụ akaghịkwa nká.+ 6 Unu erighị achịcha, unu aṅụghịkwa mmanya ma ọ bụ ihe ọ bụla na-aba n’anya, ka unu wee mara na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’ 7 Unu mechara rute ebe a. Saịhọn eze Heshbọn+ na Ọg eze Beshan+ pụtakwara ka ha lụso anyị agha, ma anyị meriri ha.+ 8 Mgbe e mechara, anyị weghaara ala ha ma nye ya ụmụ Ruben, ụmụ Gad, na ọkara ebo ụmụ Manase ka ọ bụrụ ala ha ketara.+ 9 N’ihi ya, na-emenụ ihe ndị e kwuru n’ọgbụgba ndụ a, na-erubekwanụ isi na ha, ka ihe niile unu na-eme wee gaa nke ọma.+
10 “Taa, unu niile guzo n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu, ya bụ, ndị isi ebo unu dị iche iche, ndị okenye unu, ndị isi unu, nwoke ọ bụla n’Izrel, 11 ụmụ unu, ndị nwunye unu,+ ndị mbịarambịa+ bụ́ ndị bi n’ebe unu mara ụlọikwuu, malite n’onye na-akpatara unu nkụ ruo n’onye na-esetara unu mmiri. 12 Unu nọ ebe a ka unu ṅụọ iyi na unu na Jehova bụ́ Chineke unu na-agba ndụ, bụ́ ndụ unu na Jehova bụ́ Chineke unu na-agba taa,+ 13 ka o wee mee ka unu bụrụ ndị ya taa+ nakwa ka ọ bụrụ Chineke unu,+ otú o kwere unu ná nkwa nakwa otú ọ ṅụụrụ nna nna unu hà, bụ́ Ebreham,+ Aịzik,+ na Jekọb,+ n’iyi.
14 “Ọ bụghị naanị mụ na unu na-agba ndụ a ma na-aṅụ iyi a, 15 kama ọ bụ anyị na ndị anyị na ha guzo n’ebe a taa n’ihu Jehova bụ́ Chineke anyị nakwa ndị na-esoghị anyị nọrọ n’ebe a taa. 16 (N’ihi na unu ma nke ọma otú anyị si bie n’Ijipt nakwa otú anyị si si ná mba dị iche iche gafere mgbe anyị na-apụta.+ 17 Unu nọkwa na-ahụ chi ha dị iche iche rụrụ arụ na arụsị ha ndị na-asọ oyi,*+ ndị ha ji osisi na nkume nakwa ọlaọcha na ọlaedo mee.) 18 Kpacharanụ anya taa ka a ghara inwe nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ezinụlọ ma ọ bụ ebo ọ bụla n’obodo unu nke ga-ekwe ka obi ya si n’ebe Jehova bụ́ Chineke anyị nọ pụọ, ya agaa fee chi dị iche iche mba ndị ahụ na-efe.+ Onye ahụ ga-adị ka mgbọrọgwụ nke na-amịpụta mkpụrụ osisi na-egbu mmadụ nakwa ahịhịa na-elu ilu.+
19 “Ma ọ bụrụ na mmadụ anụ ihe e kwuru n’iyi a a ṅụrụ, ya etuo ọnụ ma kwuo n’obi ya, sị, ‘E nweghị ihe ga-eme m n’agbanyeghị na ọ bụ ihe dị m n’obi ka m ga na-eme,’ nke ga-eme ka e bibie onye ọ bụla* nọ ya nso, 20 Jehova agaghị agbaghara ya.+ Kama, Jehova ga-ewesa onye ahụ iwe dị ọkụ. A ga-abụkwa ya ọnụ niile e dere n’akwụkwọ a.+ Jehova ga-ehichapụ aha ya n’ụwa.* 21 Jehova ga-esi n’ebo niile e nwere n’Izrel kpọpụta onye ahụ iche ka nsogbu bịara ya, bụ́ nsogbu niile e kwuru okwu ha n’ọgbụgba ndụ ahụ e dere n’akwụkwọ Iwu a.
22 “Mgbe ọgbọ ndị ga-esote unu, ya bụ, ụmụ unu nakwa onye mba ọzọ nke ga-esi n’ala dị anya bịa, ga-ahụ ahụhụ ala ahụ na-ata, nsogbu niile Jehova ga-eweta n’ala ahụ, 23 ya bụ, sọlfọ na nnu na ọkụ, nke ga-eme ka a ghara ịkọ ihe n’ala ahụ niile, ka ihe ghara ipu na ya, ahịhịa ndụ agharakwa ipu na ya, otú ọ dị mgbe e bibiri Sọdọm na Gọmọra,+ Adma na Zeboyim,+ bụ́ obodo ndị Jehova ji iwe na ọnụma ya bibie, 24 ha na mba niile ga-asị, ‘Gịnị mere Jehova ji mee ala a ihe a?+ Gịnị kpatara nnukwu iwe a?’ 25 A ga-aza ha, sị, ‘Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ ndụ ha na Jehova, bụ́ Chineke ndị nna nna ha, gbara,+ nke ya na ha gbara mgbe ọ kpọpụtara ha n’Ijipt.+ 26 Ha wee gaa fee chi ọzọ dị iche iche ma kpọọrọ ha isiala, chi dị iche iche ha na-amaghị, ndị ọ na-achọghịkwa ka ha fee.+ 27 Jehova wee wesa ala a iwe dị ọkụ, mee ka ihe ọjọọ niile e dere n’akwụkwọ a mezuo na ya.+ 28 N’ihi ya, Jehova ji oké iwe na ọnụma chụpụ ha+ n’ala ha ma chụga ha n’ala ọzọ, bụ́ ebe ha nọ taa.’+
29 “Jehova bụ́ Chineke anyị ma ihe niile e zoro ezo.+ Ma ọ na-eme ka anyị na ụmụ niile anyị ga-amụta mara ihe ndị ọ chọrọ ka anyị mara, ka anyị wee na-eme ihe niile e kwuru n’Iwu a.+
30 “Mgbe okwu a niile ga-emezu n’isi unu, ya bụ, ngọzi na ọbụbụ ọnụ nke m gwara unu ka unu họrọ otu n’ime ha,+ unu echetazie ha+ mgbe unu nọ ná mba niile Jehova bụ́ Chineke unu chụgara unu,+ 2 unu na ụmụ unu ewee jiri obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile+ lọghachikwute Jehova bụ́ Chineke unu+ ma gewe ntị n’olu ya, mewekwa ihe niile m na-enye unu n’iwu taa, 3 Jehova bụ́ Chineke unu ga-esi n’ebe a dọọrọ unu n’agha kpọlata unu,+ meere unu ebere+ ma si n’ebe niile Jehova bụ́ Chineke unu chụsasịrị unu kpọghachite unu.+ 4 Ọ bụrụgodị na ọ bụ na nsọtụ ụwa ka a chụgara unu, Jehova bụ́ Chineke unu ga-esi n’ebe ahụ kpọkọta unu ma kpọlata unu.+ 5 Jehova bụ́ Chineke unu ga-akpọbata unu n’ala nna unu hà biri na ya. Unu ga-ebirikwa na ya. Ọ ga-eme ka ihe gaziere unu, meekwa ka unu mụbaa karịa nna unu hà.+ 6 Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka obi unu na obi ụmụ unu dị ọcha,*+ ka unu wee jiri obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya, unu adịkwa ndụ.+ 7 Jehova bụ́ Chineke unu ga-emezi ka ihe ọjọọ a niile mee ndị iro unu bụ́ ndị kpọrọ unu asị ma na-akpagbu unu.+
8 “Unu ga-alaghachi gee ntị n’olu Jehova ma debe iwu ya niile m na-enye unu taa. 9 Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka ihe niile unu na-arụ na-agara unu nke ọma nke ọma,+ mee ka ụmụ unu na anụ ụlọ unu na ihe ala unu na-emepụta dị ọtụtụ, n’ihi na ọ ga-amasị Jehova ọzọ ime ka ihe na-agaziri unu, otú ọ masịrị ya ime ka ihe gaziere nna nna unu hà.+ 10 Unu ga-egezi ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma debe ihe ndị o nyere n’iwu, sorokwa ntụziaka ya ndị e dere n’akwụkwọ Iwu a. Unu ga-ejikwa obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile lọghachikwute Jehova bụ́ Chineke unu.+
11 “Iwu a m na-enye unu taa esighịrị unu oké ike, ọ dịghịkwa n’ebe aka unu na-agaghị eru.*+ 12 Ọ dịghị n’eluigwe, nke ga-eme ka unu sị, ‘Ònye ga-arịgo n’eluigwe wetara anyị ya, ka anyị wee nụ ya ma mee ya?’+ 13 Ọ dịghịkwa n’ofe nke ọzọ nke oké osimiri, nke ga-eme ka unu sị, ‘Ònye ga-aga n’ofe nke ọzọ nke oké osimiri wetara anyị ya, ka anyị wee nụ ya ma mee ya?’ 14 N’ihi na okwu ahụ dị unu ezigbo nso, n’ọnụ unu nakwa n’obi unu,+ ka unu wee mee ya.+
15 “Taa, e nwere ihe abụọ m chọrọ ka unu họrọ otu n’ime ha. Otu bụ ndụ na ihe ọma, nke ọzọ abụrụ ọnwụ na ihe ọjọọ.+ 16 Ọ bụrụ na unu egee ntị n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu, nke m na-enye unu taa, unu ewee hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya,+ na-eme uche ya, na-edebe ihe o nyere n’iwu, na-eso ntụziaka ya, na-emekwa ihe ndị o kpebiri, unu ga-adị ndụ+ ma mụbaa, Jehova bụ́ Chineke unu ga-agọzikwa unu n’ala ahụ unu na-aga iweghara.+
17 “Ma, ọ bụrụ na obi unu apụọ n’ebe Chineke nọ,+ unu aghara ige ya ntị, e wee rafuo unu, unu akpọọrọ chi ọzọ dị iche iche isiala, feekwa ha ofufe,+ 18 ana m agwa unu taa na a ga-ebibirịrị unu.+ Unu agaghị ebite aka n’ala ahụ unu na-agafe Osimiri Jọdan ka unu gaa biri. 19 Eluigwe na ụwa bụụrụ m ndị akaebe taa na agwala m unu ihe abụọ unu ga-ahọrọ otu n’ime ha. Ha bụ ndụ na ọnwụ, ka a gọzie unu ma ọ bụ ka a bụọ unu ọnụ.+ Unu ga-ahọrọ ndụ ka unu wee dịrị ndụ,+ unu na ụmụ unu.+ 20 Otú unu ga-esi eme ya bụ na unu ga-ahụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya,+ na-ege ntị n’olu ya, gharakwa ịhapụ ya,+ n’ihi na ọ bụ ya na-enye unu ndụ, ọ bụkwa ya ga-eme ka unu bitee aka n’ala ahụ Jehova ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu hà, bụ́ Ebreham, Aịzik, na Jekọb.”+
31 Mosis wee gaa gwa ndị Izrel niile okwu ndị a, 2 sị ha: “Adị m otu narị afọ na iri abụọ (120) taa.+ A gaghịzi ekwe ka m na-edu unu,* n’ihi na Jehova agwala m, sị, ‘Ị gaghị agafe Osimiri Jọdan a.’+ 3 Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu ga-ebutere unu ụzọ. Ọ ga-ebibi mba ndị a n’ihu unu, unu ga-achụpụkwa ha.+ Ọ bụ Joshụa ga-edu unu agafe,+ otú Jehova kwuru. 4 Jehova ga-eme ha ihe o mere Saịhọn+ na Ọg,+ bụ́ ndị eze ndị Amọraịt, nakwa ihe o mere ala ha, mgbe ọ lara ha n’iyi.+ 5 Jehova ga-emeriri unu ha, unu ga-emekwa ha ihe niile m nyere unu n’iwu.+ 6 Nweenụ obi ike, dịkwanụ ike.+ Unu atụla ha egwu, unu atụkwala ha ụjọ,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu so unu na-aga. Ọ gaghị ahapụ unu, ọ gaghịkwa agbakụta unu azụ.”+
7 Mosis wee kpọọ Joshụa ma gwa ya n’ihu ndị Izrel niile, sị: “Nwee obi ike, dịkwa ike,+ n’ihi na ọ bụ gị ga-akpọba ndị a n’ala ahụ Jehova ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na ọ ga-enye ha. Ọ bụkwa gị ga-enye ha ya ka ọ bụrụ ala ha ketara.+ 8 Ọ bụ Jehova na-ebutere gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị.+ Ọ gaghị ahapụ gị, ọ gaghịkwa agbakụta gị azụ. Atụla egwu, atụkwala ụjọ.”+
9 Mosis wee dee Iwu a+ n’akwụkwọ ma nye ya ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị, ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Jehova, nyekwa ya ndị okenye niile e nwere n’Izrel. 10 Mosis nyere ha iwu, sị: “Ná ngwụcha afọ asaa ọ bụla, n’oge a kara aka n’afọ unu ji akagbu ụgwọ e ji unu,+ n’oge Ememme Ụlọ Ndò,+ 11 mgbe ndị Izrel niile na-abịa n’ihu Jehova+ bụ́ Chineke unu n’ebe ọ ga-ahọrọ, unu ga-agụrụ ndị Izrel niile Iwu a ka ha nụ.+ 12 Kpọkọtanụ ndị Izrel,+ ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, ụmụntakịrị, na onye mbịarambịa nke bi n’obodo unu, ka ha gee ntị ma mụta banyere Jehova bụ́ Chineke unu, ka ha tụọ egwu ya ma lezie anya na-eme ihe niile e kwuru n’Iwu a. 13 Ụmụ ha ndị na-amabeghị Iwu a ga-ege ntị+ ma mụta ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke unu n’oge niile unu na-adị ndụ n’ala ahụ unu na-agafe Osimiri Jọdan ka unu weghara.”+
14 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Lee, oge ị ga-anwụ adịla nso.+ Kpọọ Joshụa, gaakwanụ guzo n’ụlọikwuu nzute, ka m mee ya onye ndú.”+ Mosis na Joshụa wee gaa guzoro n’ụlọikwuu nzute. 15 Jehova wee pụta n’ụlọikwuu ahụ n’ogidi ígwé ojii. Ogidi ígwé ojii ahụ wee kwụrụ n’akụkụ ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ.+
16 Jehova gwara Mosis, sị: “Lee, oge ị ga-anwụ* eruwela. Ndị a ga-amalitekwa ịkpa àgwà ka ndị akwụna hapụ m gaa fee chi ndị mba ọzọ gbara ha gburugburu n’ala ahụ ha na-aga.+ Ha ga-ahapụ m+ ma mebie ndụ mụ na ha gbara.+ 17 N’oge ahụ, m ga-ewesa ha ezigbo iwe,+ m ga-ahapụkwa ha.+ Agaghịkwa m enyere ha aka*+ ruo mgbe e bibiri ha. Mgbe ọtụtụ nsogbu bịachaara ha, ha ataakwa nnukwu ahụhụ,+ ha ga-asị, ‘Ọ̀ bụ na ọ bụghị maka na Chineke anyị anọnyereghị anyị mere nsogbu ndị a ji bịara anyị?’+ 18 Ma, agaghị m enyere ha aka n’ụbọchị ahụ n’ihi ihe ọjọọ niile ha mere wee fee chi ọzọ dị iche iche.+
19 “Ugbu a, deerenụ onwe unu abụ a+ n’akwụkwọ, kụziekwara ya ndị Izrel.+ Meenụ ka ha mụta ya,* ka abụ a wee na-echetara ndị Izrel ihe ga-eme ma ha nupụrụ Chineke isi.+ 20 Mgbe m ga-eduba ha n’ala ahụ m ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi banyere ya,+ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,*+ ha ewee rijuo afọ, ihe agaziwekwara ha,*+ ha ga-agakwuru chi ọzọ dị iche iche, fee ha ofufe ma leda m anya, mebiekwa ndụ mụ na ha gbara.+ 21 Mgbe ọtụtụ nsogbu ga-abịara ha, ha ataakwa nnukwu ahụhụ,+ abụ a ga-echetara ha ihe ndị m gwara ha ga-eme ha (n’ihi na ụmụ ha ekwesịghị ichefu ya), n’ihi na ama m ihe dị ha n’obi+ tupu mụ akpọba ha n’ala ahụ m ṅụrụ iyi na m ga-enye ha.”
22 Mosis wee dee abụ a n’akwụkwọ n’ụbọchị ahụ ma kụziere ya ndị Izrel.
23 O* meziri Joshụa nwa Nọn onye ndú,+ wee sị ya: “Nwee obi ike, dịkwa ike,+ n’ihi na ọ bụ gị ga-akpọba ndị Izrel n’ala ahụ m ṅụụrụ ha iyi na m ga-enye ha,+ m ga-anọnyekwara gị.”
24 Ozugbo Mosis dechara ihe niile dị n’Iwu a n’akwụkwọ,+ 25 Mosis nyere ndị Livaị, bụ́ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Jehova, iwu, sị: 26 “Werenụ akwụkwọ Iwu a+ dowe n’akụkụ igbe+ ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke unu. Ọ ga-abụ ihe akaebe a ga-eji ekpe unu ikpe. 27 N’ihi na ama m nke ọma na unu bụ ndị nnupụisi+ na ndị isi ike.+ Ọ bụrụ na unu na-enupụrụ Jehova isi otú a mgbe m ka nọ ndụ, unu ga-aka enupụ isi ma m nwụọ. 28 Kpọkọtaranụ m ndị okenye niile e nwere n’ebo unu dị iche iche na ndị isi unu, ka m kwuo ihe ndị a ná ntị ha, ka eluigwe na ụwa bụụrụ m ndị akaebe.+ 29 N’ihi na ama m nke ọma na m nwụọ, unu ga-akpa àgwà ọjọọ+ ma ghara idebe iwu ndị m na-enye unu. Nsogbu ga-abịakwara unu+ ná ngwụcha ụbọchị ndị ahụ, n’ihi na unu ga-eme ihe dị njọ n’anya Jehova, jirikwa ihe ndị unu ga-eme kpasuo ya iwe.”
30 Mosis wee gụọrọ ọgbakọ Izrel niile okwu ndị dị n’abụ a, malite n’isi ruo n’ebe ọ gwụrụ, sị:+
32 “Eluigwe, gee ntị ka m kwuo okwu,
Ka ụwa nụrụkwa okwu si m n’ọnụ.
2 Ntụziaka m ga-ezo ka mmiri.
Okwu m ga na-adasị ka igirigi,
Ka mmiri nke na-abụsa n’ahịhịa,
Nakwa ka nnukwu mmiri nke na-ezosa n’ahịhịa ndụ.
3 N’ihi na m ga-akọsa aha Jehova.+
Meenụ ka a mara otú Chineke anyị si dị ebube!+
Ọ bụ Chineke e kwesịrị ịtụkwasị obi,+ onye na-anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.+
Ọ bụ onye ezi omume na onye na-eme ihe ziri ezi.+
5 Ọ bụ ha mere ihe na-adịghị mma.+
Ha abụghị ụmụ ya. Ọ bụ ha ka nsogbu si n’aka.+
Ha bụ ọgbọ jọgburu onwe ya, nke rụkwara arụ.+
Ọ̀ bụ na ọ bụghị ya bụ Nna unu onye mere ka unu dịrị,+
Onye kere unu ma mee ka unu bụrụ mba?
7 Chetanụ oge ochie.
Chebaranụ ihe ndị mere n’ọgbọ ndị gara aga echiche.
Jụọnụ nna unu, ha ga-akọrọ unu.+
Jụọkwanụ ndị okenye unu, ha ga-agwa unu.
8 Mgbe Onye Kacha Elu kenyere mba dị iche iche ala ha,+
Mgbe o kewara ụmụ Adam,* otu onye na ibe ya,+
O ji otú ndị Izrel hà+
Kpaara ndị dị iche iche ókè.+
9 N’ihi na òkè Jehova bụ ndị ya.+
Ọ bụ Jekọb ka o ketara.+
11 Otú ahụ ugo si eme ka ụmụ ya si n’akwụ́ fepụ mgbe ọ na-akụziri ha ife efe,
Na-erugharị n’elu ụmụ ya,
Gbasaa nku ya, buru ha,
Buru ha na nku ya,+
E nweghị chi mba ọzọ so ya.+
13 O mere ka ọ nọkwasị n’ebe ndị dị elu n’ụwa.+
O wee rie ihe ubi mepụtara.+
O nyere ya mmanụ aṅụ nke si ná nnukwu nkume
Na mmanụ nke si n’oké nkume siri ike,
14 Nyekwa ya bọta e ji mmiri ara ehi mee na mmiri ara ewu na atụrụ,
Ha na atụrụ ndị kacha mma*
Na ebule ndị si Beshan na mkpi,
Nakwa ọka wit kacha mma.+
Ị ṅụkwara mmanya a zọchapụtara ná mkpụrụ vaịn.
15 Mgbe Jeshurọn* buru ibu, o nupụrụ isi.
I buola ibu, ị gbaala agba, afọ gị ebuola ibu.+
O wee hapụ Chineke, onye kere ya,+
Ledakwa Oké Nkume na-azọpụta ya anya.
16 Ha fere chi ndị mba ọzọ wee kpasuo ya iwe.+
Ha jikwa ihe dị iche iche rụrụ arụ na-eme ka obi jọọ ya njọ.+
17 Ha nọ na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ àjà, ọ bụghị Chineke,+
Chi dị iche iche ha na-amaghị,
Chi ndị pụtara ọhụrụ,
Chi dị iche iche nna nna unu hà na-amaghị.
18 I chefuru Oké Nkume+ ahụ bụ́ nna gị.
I chetaghịkwa Chineke, onye mere ka ị dịrị.+
19 Mgbe Jehova hụrụ ihe ha mere, ọ jụrụ ha,+
N’ihi na ụmụ ya ndị nwoke na ụmụ ya ndị nwaanyị kpasuru ya iwe.
20 O wee sị, ‘Agaghị m enyere ha aka.*+
M ga-ahụ ihe ga-emecha mee ha.
21 Ha efeela ihe na-abụghị chi wee kpasuo m iwe.+
Ha efeela arụsị ha na-abaghị uru wee mee ka obi jọọ m njọ.+
N’ihi ya, m ga-eji ndị na-enweghị ihe ha bụ mee ka obi jọọ ha njọ.+
M ga-ejikwa mba dị nzuzu kpasuo ha iwe.+
22 N’ihi na iwe m enwurula ka ọkụ.+
Ọ ga-erechapụkwa ụwa na ihe dị n’ime ya,
Mụnyekwa ntọala ugwu dị iche iche ọkụ.
23 M ga-eme ka nsogbu ndị na-abịara ha dịkwuo ọtụtụ.
M ga-agbacha ha akụ́ m niile.
24 Ike ga-agwụ ha n’ihi agụụ.+
Oké ahụ́ ọkụ ga-eregbu ha, e bibiekwa ha kpamkpam.+
M ga-ezite anụ ọhịa ndị ga-ata ha,+
Nakwa anụ ndị na-arị arị ka ha tanye ha elò n’ahụ́.
25 A ga-eji mma agha gbawa ndị nọ n’èzí aka nwa.+
Ụjọ ga-ejide ndị nọ n’ime ụlọ,+
Ma nwa okorobịa ma nwa agbọghọ na-amaghị nwoke,
Ma nwa a mụrụ ọhụrụ ma nwoke isi awọ́.+
26 M gaara asị: “M ga-achụsasị ha.
M ga-eme ka ndị mmadụ ghara icheta ha ọzọ.”
27 Ma ekwughị m otú ahụ n’ihi ihe ndị iro m ga-ekwu,+
N’ihi na ndị iro m nwere ike ịghọtahie ihe merenụ.+
Ha nwere ike ịsị: “Anyị ji ike anyị merie ha.+
Ọ bụghị Jehova mere ihe a niile.”
29 A sị nnọọ na ha ma ihe,+ ha gaara echebara ihe a echiche.+
Ha gaara echebara ihe ga-emecha mee ha echiche.+
30 Olee otú otu onye ga-esi chụọ otu puku (1,000) mmadụ ọsọ,
Mmadụ abụọ achụọkwa puku mmadụ iri (10,000) ọsọ?+
Ọ gwụla ma Oké Nkume ha ọ̀ hapụrụ ha,+
Jehova enyefeekwa ha n’aka ndị iro ha.
Mkpụrụ vaịn ha bụ mkpụrụ vaịn na-egbu mmadụ,
Ụyọkọ ha na-elu ilu.+
33 Mmanya ha bụ elò agwọ,
Bụrụkwa elò agwọ ubí.
34 Ọ̀ bụ na amaghị m ihe niile ha mere?
Ọ̀ bụ na akwasaghị m ha n’ebe m na-akwasa ihe?+
35 Ọ bụ m ga-abọ ọbọ, ọ bụkwa m ga-akwụ ụgwọ,+
N’oge a kara aka mgbe ụkwụ ha ga-amịchapụ,+
N’ihi na ụbọchị nsogbu ga-abịara ha eruwela.
A ga-emekwa ha ihe e kwesịrị ime ha n’egbughị oge.’
36 N’ihi na Jehova ga-ekpe ndị ya ikpe.+
Ọ ga-emetekwara ndị ohu ya ebere+
Mgbe ọ hụrụ na ike agwụla ha
Nakwa mgbe ọ hụrụ na ọ bụ naanị onye na-enweghị onye na-enyere ya aka na onye na-enweghị ume fọrọ.
37 Ọ ga-asịzi, ‘Olee ebe chi ha dị iche iche nọ,+
Ndị bụ́ oké nkume ha gbabara na ya ka ha chebe ha,
38 Bụ́ ndị na-eri abụba anụ ndị ha ji chụọ àjà dị iche iche,*
Na-aṅụkwa mmanya ha ji chụọ àjà mmanya?+
Ka ha bilie nyere unu aka.
Ka ha bụrụ ebe unu ga-agbaba.
E nweghị chi ọzọ ma e wepụ m.+
M na-eme ka a nwụọ, m na-emekwa ka a dị ndụ.+
40 N’ihi na m na-eweli aka m elu
Ṅụọ iyi, sị: “Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,”+
41 Mgbe m ga-amụ mma agha m nke na-egbu maramara,
Ma jikere ikpe ikpe,+
M ga-abọ ọbọ n’isi ndị iro m,+
Kwụọkwa ndị kpọrọ m asị ụgwọ.
42 M ga-eme ka akụ́ m ṅụgide ọbara, ya egbuwe ya ka mmanya.
Mma agha m ga-erikwa anụ ahụ́.
Ọ ga-aṅụ ọbara ndị e gburu egbu na nke ndị a dọtara n’agha,
Riekwa isi ndị ndú nke onye iro.’
44 Mosis bịara gụpụta okwu niile dị n’abụ a ná ntị ndị Izrel,+ ya na Hoshia*+ nwa Nọn. 45 Mgbe Mosis gwachara ndị Izrel niile ihe a niile, 46 ọ sịrị ha: “Burunụ okwu niile m ji na-adọ unu aka ná ntị taa n’obi,+ ka unu wee nye ụmụ unu iwu ka ha lezie anya na-eme ihe niile e kwuru n’Iwu a.+ 47 N’ihi na ọ bụghị okwu na-agaghị abara unu uru, kama ọ bụ okwu ga-eme ka unu dị ndụ.+ Okwu a ga-emekwa ka unu bitee aka n’ala ahụ unu na-agafe Osimiri Jọdan ka unu nweta.”
48 Jehova gwakwara Mosis n’ụbọchị ahụ, sị: 49 “Gbagoo n’ugwu Abarim a,+ bụ́ Ugwu Nibo,+ nke dị n’ala Moab, nke chere ihu na Jeriko, ka ị hụ ala Kenan, bụ́ ala m na-enye ndị Izrel ka ọ bụrụ nke ha.+ 50 Ị ga-anwụ n’ugwu ahụ ị na-agbago, e lie gị otú e liri ndị nna nna gị, otú Erọn nwanne gị nwụrụ n’Ugwu Họọ,+ e lie ya otú e liri ndị nna nna ya, 51 n’ihi na unu abụọ erubereghị m isi n’ihu ndị Izrel, na mmiri Meriba+ nke dị na Kedesh, n’ala ịkpa Zin, n’ihi na unu edoghị m nsọ n’ihu ndị Izrel.+ 52 Ị ga-anọ n’ebe dị anya hụ ala ahụ, ma ị gaghị abanye n’ala ahụ m na-enye ndị Izrel.”+
33 Ihe a bụ ihe Mosis, bụ́ onye nke ezi Chineke, kwuru mgbe ọ na-agọzi ndị Izrel tupu ya anwụọ.+ 2 Ọ sịrị:
“Jehova si na Saịnaị bịa.+
O sikwa na Sia nwukwasị ha ka ìhè.
O si na Peran bụ́ ugwu ugwu mee ka ebube ya nwuo ka ìhè.+
Ọtụtụ iri puku ndị mmụọ ozi* sokwa ya.+
Ndị agha ya nọkwa ya n’aka nri.+
Ndị nsọ ha niile nọ n’aka gị.+
Ha nọ ọdụ n’ụkwụ gị.+
Ha malitere ige ntị n’okwu gị.+
Ha na ebo niile e nwere n’Izrel.+
“Jehova, biko, nụrụ olu Juda.+
Kpọrọ ya kpọghachitere ndị ya.
O jirila ike ya lụọ ọgụ maka ihe bụ́ nke ya,
Biko, nyere ya aka lụso ndị iro ya ọgụ.”+
Gị na ya malitere ịgba mgba na mmiri Meriba,+
9 Onye sịrị nne ya na nna ya, ‘E nweghị ihe m ji unu kpọrọ.’
Ọ kwadoghịdị ụmụnne ya.+
O leghaara ụmụ ya anya.
N’ihi na ha rubeere okwu gị isi,
Ha mekwara ihe ndị e kwuru n’ọgbụgba ndụ gị na ha.+
Ka ha mụnyere gị insens ọkụ ka ị nụrụ ísì ya+
Ma chụọkwa onyinye a na-esucha ọkụ n’àjà n’ebe ịchụàjà gị.+
11 Jehova, biko, gọzie ya nye ya ike.
Ka ihe ọ na-eme meekwa gị obi ụtọ.
Kụjie ụkwụ* ndị na-alụso ya ọgụ,
Ka ndị kpọrọ ya asị ghara ibili ọzọ.”
12 O kwuru banyere Benjamin, sị:+
“Ka onye Jehova hụrụ n’anya biri n’akụkụ ya, obi eruo ya ala.
Ọ ga-ebi n’agbata ubu ya abụọ,
Ka ọ na-echebe ya ụbọchị niile.”
13 O kwuru banyere Josef, sị:+
“Ka Jehova gọzie ala ya.+
Ka o jiri ihe ndị dị mma dị n’eluigwe
Na igirigi na mmiri si n’ala agbapụta gọzie ala ya,+
14 Na ihe ọma dị iche iche anyanwụ na-eme ka ha puo,
Na ihe ọma ndị na-amị n’ọnwa n’ọnwa,+
15 Na ihe kacha mma ndị si n’ugwu ndị dịwara kemgbe oge ochie,*+
Na ihe ọma ndị si n’obere ugwu ndị na-adịte aka,
Ka Onye ahụ nke pụtara n’osisi ogwu+ kwadokwa ya.
Ka ha dịrị n’isi Josef,
N’opu isi onye e si n’ụmụnne ya họrọ.+
17 Ebube ya dị ka nke oké ehi e bu ụzọ mụọ,
Mpi ya bụkwa mpi atụ́.
Ọ ga-eji ha nuru* ndị dị iche iche,
Nuru ha niile ruo na nsọtụ ụwa.
Ha bụ nke iri puku kwuru iri puku ndị agha Ifrem,+
Ha bụkwa nke puku kwuru puku ndị agha Manase.”
18 O kwuru banyere Zebulọn, sị:+
19 Ha ga-akpọ ndị dị iche iche ka ha bịa n’ugwu.
N’ebe ahụ, ha ga-eji ezigbo obi chụọ àjà.
N’ihi na ha ga-enweta akụ̀ dị ukwuu n’oké osimiri dị iche iche,
Nwetakwa akụ̀ zoro ezo ndị juru n’ájá.”
“A ga-agọzi onye na-eme ka Gad nwetakwuo ala.+
Ọ makpu n’ebe ahụ ka ọdụm.
Ọ dị njikere ịdọpụ ogwe aka ndị iro ya, dọpụkwa opu isi ha.
Ndị isi nke ndị ya ga-ezukọta.
Ọ ga-emere Jehova ihe dị mma,
Meekwa ihe o kpebiri gbasara Izrel.”
“Dan bụ nwa ọdụm.+
Ọ ga-esi na Beshan mapụta.”+
23 O kwuru banyere Naftalaị, sị:+
“Naftalaị ga-enwe obi ụtọ na Jehova meere ya amara,
Gọziekwa ya n’ụba.
Weghara ala dị n’ebe ọdịda anyanwụ nakwa n’ebe ndịda.”
“A ga-eji ụmụ gọzie Asha.
Ka ihe ya masị ụmụnne ya,
Ka ọ zọnyekwa ụkwụ* ya na mmanụ.
25 Ígwè na ọla kọpa bụ ihe i ji akpọchi ọnụ ụzọ ámá gị.+
Obi ga-erukwa gị ala n’oge niile ị dị ndụ.
26 E nweghị onye dị ka ezi Chineke+ nke Jeshurọn,+
Onye si n’eluigwe enyere gị aka,
Onye nọkwa n’elu ígwé ojii n’ebube.+
27 Chineke bụ ebe mgbaba kemgbe oge ochie.+
O ji ogwe aka ya na-adịru mgbe ebighị ebi na-akwado gị.+
Ọ ga-achụpụrụ gị onye iro gị.+
Ọ ga-asịkwa, ‘Bibie ha!’+
28 Obi ga-eru Izrel ala n’ebe o bi.
Isi iyi Jekọb ga na-asọ n’enweghị ihe na-enye ya nsogbu
N’ala nke na-emepụta ọka* na mmanya ọhụrụ,+
Nke igirigi ga-esi na mbara igwe ya na-ada.+
29 Ndị Izrel, obi dị unu ụtọ.+
Ndị iro unu ga-atụ egwu n’ihu unu,+
Unu ga-azọkwa ha ụkwụ n’azụ.”
34 Mosis wee si n’ọzara Moab gbagoo n’Ugwu Nibo,+ n’elu Pisga,+ nke chere Jeriko ihu.+ Jehova gosiri ya ala ahụ niile, malite na Gilied ruo Dan,+ 2 na Naftalaị niile na ala Ifrem na Manase, nakwa ala Juda niile ruo n’oké osimiri nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ,*+ 3 nakwa Negeb*+ ná mpaghara Osimiri Jọdan,+ ya bu, ndagwurugwu Jeriko, bụ́ obodo nkwụ, ruo Zoa.+
4 Jehova gwaziri ya, sị: “Ọ bụ ala a ka m ṅụụrụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb iyi banyere ya, sị, ‘M ga-enye ya ụmụ* gị.’+ Ekwela m ka i jiri anya gị hụ ya, ma ị gaghị agafe banye na ya.”+
5 Mgbe e mechara, Mosis ohu Jehova nwụrụ n’ebe ahụ n’ala Moab otú Jehova kwuru.+ 6 O liri ya na ndagwurugwu dị n’ala Moab, n’ebe chere Bet-piọ ihu. E nweghịkwa onye ma ebe e liri ya ruo taa.+ 7 Mosis dị otu narị afọ na iri abụọ (120) mgbe ọ nwụrụ.+ Anya ya ka na-ahụ ụzọ nke ọma, ahụ́ ka sikwara ya ike. 8 Ndị Izrel beere Mosis ákwá ụbọchị iri atọ+ n’ọzara Moab. Ụbọchị niile ha ji beere Mosis ákwá ma ruoro ya uju wee gwụ.
9 Joshụa nwa Nọn nwere amamihe nke ukwuu* n’ihi na Mosis bikwasịrị ya aka n’isi.+ Ndị Izrel malitere ige ya ntị. Ha mekwara nnọọ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.+ 10 Ma e nwebeghị onye amụma ọzọ n’Izrel nke dị ka Mosis,+ onye Jehova ma ihu na ihu.+ 11 O mere ihe àmà niile, rụọkwa ọrụ ebube niile Jehova dunyere ya ka ọ rụọ n’Ijipt, n’ihu Fero nakwa n’ihu ndị niile na-ejere ya ozi nakwa n’ala ya niile.+ 12 Mosis kpakwara nnukwu ike ma jiri aka dị ike rụọ ọrụ n’ihu ndị Izrel niile.+
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
Ọ ga-abụ ugwu ndị dị na Lebanọn ka a na-ekwu.
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “ka obi anyị gbazee.”
Ya bụ, obodo ndị mgbidi ha dị ezigbo elu.
Na Hibru, “onye na-eguzo n’ihu gị.”
Ma ọ bụ “Unu akpasula ha iwe.”
Na Hibru, “aka.”
Ya bụ, Krit.
Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”
Na Hibru, “Chineke gị.”
Ma ọ bụ “igbe ozu.”
Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.
Havọt-jeya pụtara “Obodo Jeya Ndị A Mara Ụlọikwuu.”
Ọ bụ ebo Ruben, Gad, na ọkara ebo Manase ka Mosis na-agwa.
Na Hibru, “aka gị dị ike.”
Na Hibru, “Okwu Iri.”
Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”
Ma ọ bụ “ndị o nwe.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ya bụ, Oké Osimiri Nnu.
Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”
Ma ọ bụ “Egbula ọchụ.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ume gị niile; ihe niile i nwere.”
Ma ọ bụ “na-agwa ha ụmụ gị ugboro ugboro.”
Na Hibru, “n’agbata anya gị abụọ.”
Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”
Ma ọ bụ “na-egosi ha ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “gosi unu ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “Ọ ga-agọzi mkpụrụ nke afọ unu.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “Anya unu.”
Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”
Na Hibru, “unu ekwela ka obi unu mee ka unu dị mpako.”
Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”
Ya bụ, obodo ndị mgbidi ha dị ezigbo elu.
Na Hibru, “ndị na-ekwesi olu ike.”
Na Hibru, “ndị na-ekwesi olu ike.”
Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”
Ma ọ bụ “ndị i ketara.”
Ma ọ bụ “ndị i ketara.”
Na Hibru, “Okwu Iri.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “na-ejere Chineke ozi.”
Na Hibru, “Bienụ obi unu úgwù.”
Ma ọ bụ “eri ngarị.”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Na Hibru, “ga-ejere ozi.”
Na Hibru, “unu ga-arapara ya n’ahụ́.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “bibie ha ruo taa.”
Ma ọ bụ “ihe o mere.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Ma ọ bụ “unu ejiri ụkwụ unu na-agba ya mmiri.” O nwere ike ịbụ na e nwere ihe a rụrụ arụ ọ na-abụ ha na-azọ ya ụkwụ, mmiri ana-agbapụta, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha na-egwu ọwa mmiri ndị mmiri na-esi asọba n’ubi.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “na-ejere ya ozi.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “obi unu.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “n’agbata anya unu abụọ.”
Na Hibru, “raparakwa ya n’ahụ́.”
Ya bụ, Oké Osimiri Mediterenian.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ihe o chere dị mma.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ga-ejere ozi.”
Na Hibru, “ga-arapara ya n’ahụ́.”
Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”
Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”
Ma ọ bụ “ịna-ege ntị n’olu.”
Na Hibru, “n’agbata anya unu abụọ.”
Anụmanụ a yiri òké bekee, ma ntị ya na ụkwụ ya na-adị ogologo karịa nke òké bekee.
Ma ọ bụ “ntù.”
Ma ọ bụ “ntù.”
Ma ọ bụ “shekeleke.”
Ma ọ bụ “Ahụhụ.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Na Hibru, “obi unu.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “oké ehi.”
Gụọ B15.
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “wụfuru ọbara.”
Ma ọ bụ “n’akwụkwọ mpịakọta.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya achọọ.”
Ya bụ, n’ebe Jehova họọrọ ka ọ bụrụ ebe ndị mmadụ ga-abịa na-efe ya.
Ma ọ bụ “majik.”
Ma ọ bụ “majik.”
Na Hibru, “ịwụfu ọbara.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “Anya unu.”
Na Hibru, “n’ọnụ.”
Na Hibru, “Anya unu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “ka obi wụba ụmụnna ya n’afọ otú obi wụbara ya.”
Na Hibru, “Ọ bụghị anyị wụfuru ọbara a.”
Na Hibru, “ya ahụ otu n’anya, kpọọ nke ọzọ asị.”
Ma ọ bụ “ya emechaa jụ nwaanyị ahụ.”
Ma ọ bụ “ọ jụla ya.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “gbara akwụna.”
Na Hibru, “ghara ịchịli uwe mwụda nna ya elu.”
Ma ọ bụ “ka ọ kpọọ unu iyi.”
Ma ọ bụ “ihe ọ bụla ga-emerụ unu.”
Ma ọ bụ “Obere ọ́gụ̀.”
Ma ọ bụ “onye na-agba akwụna n’ụlọ arụsị.” O nwere ike ịbụ na ịgba akwụna a bụ ụdị nke e ji efe chi dị iche iche.
Na Hibru, “ego e retara ná nkịta.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị”
Ma ọ bụ “ajụ ya.”
Ma ọ bụ “ịnapụ mmadụ ndụ.”
Okwu Hibru a sụgharịrị “ekpenta” pụtara ọtụtụ ihe. Ọtụtụ ọrịa na-efe efe nke na-eme mmadụ n’akpụkpọ ahụ́ nwere ike iso na ya. Nje ụfọdụ na-atapara n’ákwà nakwa n’ụlọ nwekwara ike iso na ya.
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “Anya unu.”
Na Hibru, “ụdị efa abụọ.” Gụọ B14.
Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”
Ma ọ bụ “Siria.”
O nwere ike ịbụ, “na-anwụ anwụ.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “were nzụ na-acha ọcha tee ha.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Ma ọ bụ “were nzụ na-acha ọcha tee ha.”
Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ!”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Na Hibru, “chịliela uwe mwụda nna ya elu.”
Na Hibru, “mkpụrụ nke afọ.”
Ya bụ, na ọka ga na-adị na nkata ha, ntụ ọka ga na-adịkwa n’efere ha ji agwọ ntụ ọka.
Na Hibru, “mkpụrụ nke afọ.”
Na Hibru, “m.”
Ya bụ, mmiri agaghị ezo.
Ya bụ, ala ga-akpọ nkụ.
Na Hibru, “ga-eji unu na-atụ ilu.”
Na Hibru, “jeere ya ozi.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “mkpụrụ nke afọ.”
Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Na Hibru, “ka e bibie ma onye na-aṅụju mmiri afọ ma onye akpịrị na-akpọ nkụ.”
Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “ga-ebi obi unu na obi ụmụ unu úgwù.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “ọ dịghịkwa n’ebe dị anya.”
Na Hibru, “m na-apụ apụ ma na-abata abata.”
Na Hibru, “oge ị ga-esoro nna gị hà dinara.”
Na Hibru, “M ga-ezoro ha ihu m.”
Na Hibru, “Tinyenụ ya n’ọnụ ha.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Na Hibru, “ha amaakwa abụba.”
Ọ ga-abụ Chineke.
O nwere ike ịbụ, “agbụrụ ụmụ mmadụ.”
Ya bụ, Jekọb.
Na Hibru, “Ha na abụba atụrụ.”
Jeshurọn pụtara “Onye Ezi Omume.” Ọ bụ aha a na-etu Izrel.
Na Hibru, “M ga-ezoro ha ihu m.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “na-anaghị anara ndụmọdụ.”
Ma ọ bụ “na-eri ihe ndị kacha mma n’àjà ha dị iche iche.”
Ma ọ bụ “Meekwa ka ala ndị ya dị ọcha.”
Hoshia bụ ezigbo aha Joshụa. Ọ bụ mkpọbiri Hoshaya, nke pụtara “Onye Jaa Zọpụtara; Jaa Azọpụtala.”
Ma ọ bụ “Ọtụtụ iri puku ndị nsọ.”
Jeshurọn pụtara “Onye Ezi Omume.” Ọ bụ aha a na-etu Izrel.
“Gị” na “ị” dị n’amaokwu a nọchiri anya Chineke.
Ma ọ bụ “úkwù.”
O nwere ike ịbụ, “n’ugwu ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ.”
Ma ọ bụ “sọọ.”
Na Hibru, “n’ọpụpụ gị.”
Ma ọ bụ “saa ụkwụ.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ya bụ, Oké Osimiri Mediterenian.
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “amamihe mmụọ Chineke nyere ya.”