Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Jenesis 1:1-50:26
  • Jenesis

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jenesis
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Jenesis

JENESIS

1 Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.+

2 E nweghị ihe dị n’ụwa. Ọ tọgbọ chakoo. Ọchịchịrị gbara n’elu ogbu mmiri,*+ ike Chineke*+ nọkwa na-erugharị n’elu mmiri ahụ.+

3 Chineke wee sị: “Ka ìhè dị.” Ìhè wee dị.+ 4 Mgbe e mechara, Chineke hụrụ na ìhè ahụ dị mma. Chineke wee malite ịkpa ókè n’etiti ìhè na ọchịchịrị. 5 Chineke kpọrọ ìhè ahụ Ehihie, ma ọ kpọrọ ọchịchịrị ahụ Abalị.+ E wee nwee mgbede, nweekwa ụtụtụ, ya abụrụ ụbọchị nke mbụ.

6 Chineke wee sị: “Ka e nwee mbara+ n’agbata mmiri ahụ, ka e kewaakwa mmiri ahụ ụzọ abụọ.”*+ 7 Chineke wee mee ka e nwee mbara ma kewaa mmiri ahụ. O mere ka e nwee mmiri nke ga-adị n’okpuru mbara ahụ na mmiri nke ga-adị n’elu mbara ahụ.+ O wee dị otú ahụ. 8 Chineke kpọrọ mbara ahụ Eluigwe.* E wee nwee mgbede, nweekwa ụtụtụ, ya abụrụ ụbọchị nke abụọ.

9 Chineke wee sị: “Ka mmiri ahụ dị n’ụwa* sọkọta otu ebe, ka ala nkịtị pụtakwa.”+ O wee dị otú ahụ. 10 Chineke kpọrọ ala nkịtị ahụ Ala.+ Ma ọ kpọrọ mmiri ahụ sọkọtara ọnụ Oké Osimiri.+ Chineke wee hụ na ha dị mma.+ 11 Chineke sịziri: “Ka ala puo ahịhịa na obere osisi ndị na-amị mkpụrụ nakwa nnukwu osisi ndị na-amị mkpụrụ n’ụdị ha dị iche iche, bụ́ ndị na-enwe mkpụrụ n’ime ha.” O wee dị otú ahụ. 12 Ala wee malite ipu ahịhịa, obere osisi ndị na-amị mkpụrụ+ nakwa nnukwu osisi ndị na-amị mkpụrụ n’ụdị ha dị iche iche, bụ́ ndị na-enwe mkpụrụ n’ime ha. Chineke wee hụ na ha dị mma. 13 E wee nwee mgbede, nweekwa ụtụtụ, ya abụrụ ụbọchị nke atọ.

14 Chineke wee sị: “Ka e nwee ihe ndị na-enye ìhè+ na mbara eluigwe iji kpaa ókè n’etiti ehihie na abalị.+ Ha ga-abụ ihe a ga-eji na-amata oge na ụbọchị na afọ.+ 15 Ha ga-abụ ihe ndị na-enye ìhè, ndị ga-adị na mbara eluigwe iji na-enye ìhè n’ụwa.” O wee dị otú ahụ. 16 Chineke wee mee ka e nwee nnukwu ihe abụọ na-enye ìhè. O mere ka nke ukwu na-enye ìhè n’ehihie,+ mee ka nke nta na-enye ìhè n’abalị. O mekwara ka e nwee kpakpando dị iche iche.+ 17 Chineke wee dowe ha na mbara eluigwe ka ha na-enye ìhè n’ụwa, 18 ka ha na-achị ehihie na abalị ma na-akpa ókè n’etiti ìhè na ọchịchịrị.+ Chineke wee hụ na ha dị mma. 19 E wee nwee mgbede, nweekwa ụtụtụ, ya abụrụ ụbọchị nke anọ.

20 Chineke wee sị: “Ka anụ dị iche iche* ju na mmiri. Ka anụ ndị na-efe efe na-efegharịkwa n’ụwa, na mbara eluigwe.”*+ 21 Chineke kere nnukwu anụ mmiri dị iche iche na anụ niile* na-agagharị n’ime mmiri n’ụdị ha dị iche iche nakwa anụ ọ bụla na-efe efe nwere nku, n’ụdị ya dị iche iche. Chineke wee hụ na ha dị mma. 22 Chineke wee gọzie ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jukwanụ n’oké osimiri.+ Ka anụ ndị na-efe efe dị ọtụtụ n’ụwa.” 23 E wee nwee mgbede, nweekwa ụtụtụ, ya abụrụ ụbọchị nke ise.

24 Chineke wee sị: “Ka anụ dị iche iche* dịrị n’ala n’ụdị ha dị iche iche, anụ ụlọ na anụ ndị na-arị arị* na anụ ọhịa n’ụdị ha dị iche iche.”+ O wee dị otú ahụ. 25 Chineke wee kee anụ ọhịa n’ụdị ha dị iche iche na anụ ụlọ n’ụdị ha dị iche iche nakwa anụ niile na-arị arị n’ụdị ha dị iche iche. Chineke wee hụ na ha dị mma.

26 Chineke wee sị: “Ka anyị+ kee mmadụ n’oyiyi anyị,+ ka ha dị ka anyị.+ Ka azụ̀ ndị juru n’oké osimiri na anụ ndị na-efegharị n’eluigwe na anụ ụlọ na anụ niile na-arị arị nọrọ n’okpuru ha, ka ha na-elekọtakwa ụwa niile.”+ 27 Chineke wee kee mmadụ n’oyiyi ya. Chineke kere ha ka ha yie ya. O kere ha nwoke na nwaanyị.+ 28 Chineke gọziri ha. Chineke sịkwara ha: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, junụ n’ụwa,+ na-elekọtakwanụ ya.+ Ka azụ̀ ndị juru n’oké osimiri na anụ ndị na-efegharị n’eluigwe na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’ala nọrọ n’okpuru unu.”+

29 Chineke wee sị: “Lee, enyela m unu obere osisi niile na-amị mkpụrụ bụ́ ndị dị n’ebe niile n’ụwa nakwa nnukwu osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ. Ha ga-abụ nri unu.+ 30 Ma, enyela m anụ ọhịa ọ bụla nọ n’ụwa na anụ ọ bụla na-efegharị n’eluigwe na ihe ọ bụla dị ndụ* na-agagharị n’ụwa ahịhịa ndụ niile ka ha bụrụ nri ha.”+ O wee dị otú ahụ.

31 Mgbe e mechara, Chineke lere ihe niile o kere wee hụ na ha dị nnọọ mma.+ E wee nwee mgbede, nweekwa ụtụtụ, ya abụrụ ụbọchị nke isii.

2 Otú ahụ ka e si kechaa eluigwe na ụwa na ihe niile dị na ha.+ 2 Mgbe ọ na-eru ụbọchị nke asaa, Chineke arụchaala ọrụ ọ nọ na-arụ. O wee malite izu ike n’ụbọchị nke asaa mgbe ọ rụchara ọrụ niile ọ nọ na-arụ.+ 3 Chineke wee gọzie ụbọchị nke asaa ma kwuo na ọ dị nsọ n’ihi na ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka Chineke nọ na-ezu ike mgbe o kechara ihe niile o zubere ike.

4 Ihe a bụ akụkọ otú e si kee eluigwe na ụwa n’oge e kere ha, n’ụbọchị Jehova* Chineke kere eluigwe na ụwa.+

5 Osisi adịbeghị n’ụwa, ahịhịa amalitebeghịkwa ipu n’ala n’ihi na Jehova Chineke emebeghị ka mmiri zoo n’ụwa. E nwebeghịkwa mmadụ ga na-akọ ihe n’ala. 6 Ma alụlụụ na-esi n’ụwa akwụgo elu, ọ na-edekwa ala niile mmiri.

7 Jehova Chineke wee jiri ájá si n’ala kpụọ mmadụ+ ma kunye ume ndụ+ n’imi ya, mmadụ ahụ wee ghọọ onye* dị ndụ.+ 8 Jehova Chineke kụkwara ubi n’Iden,+ n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ bụ n’ebe ahụ ka o mere ka mmadụ ahụ o kere biri.+ 9 Jehova Chineke wee mee ka osisi ọ bụla nke dị mma ile anya, nke mkpụrụ ya dịkwa mma oriri, puo n’ala. O mekwara ka osisi nke ndụ+ na osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ+ puo n’etiti ubi ahụ.

10 E nwere osimiri si n’Iden na-asọpụta ma na-ede ubi ahụ mmiri. Osimiri a kewara ghọọ osimiri anọ.* 11 Aha osimiri nke mbụ bụ Paịshọn. Ọ bụ ya gbara ala Havila niile gburugburu, bụ́ ebe e nwere ọlaedo. 12 Ọlaedo dị n’ala ahụ bụ ezigbo ọlaedo. Eso* deliọm na nkume ọnịks dịkwa na ya. 13 Aha osimiri nke abụọ bụ Gaịhọn. Ọ bụ ya gbara ala Kush niile gburugburu. 14 Aha osimiri nke atọ bụ Hidekel.*+ Ọ bụ ya na-asọga n’ebe ọwụwa anyanwụ Asiria.+ Osimiri nke anọ bụ Yufretis.+

15 Jehova Chineke kpọọrọ nwoke ahụ mee ka o biri n’ogige Iden ka ọ na-akọ ihe na ya ma na-elekọta ya.+ 16 Jehova Chineke nyekwara nwoke ahụ iwu, sị: “I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a rijuo afọ.+ 17 Ma erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na ị ga-anwụrịrị n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya.”+

18 Jehova Chineke wee sị: “Ọ dịghị mma ka nwoke a nọrọ naanị ya. M ga-enye ya onye inyeaka, ka ọ bụrụ onye ga-eme ka o zuo ezuo.”+ 19 Jehova Chineke ejirila ájá kpụọ anụ ọhịa ọ bụla na anụ ndị na-efegharị n’eluigwe. O wee malite ime ka ha na-abịakwute nwoke ahụ ka ọ mara aha ọ ga-akpọ nke ọ bụla. Ihe ọ bụla nwoke ahụ kpọrọ anụ nke ọ bụla,* ya abụrụ aha ya.+ 20 Nwoke ahụ wee gụọ anụ ụlọ niile na anụ ndị na-efegharị n’eluigwe na anụ ọhịa ọ bụla aha. Ma nwoke ahụ enweghị onye inyeaka ga-eme ka o zuo ezuo. 21 N’ihi ya, Jehova Chineke mere ka oké ụra buru nwoke ahụ. Ka ọ nọ na-ehi ụra, Chineke wepụtara otu n’ime ọgịrịga ya ma mechie ebe o si wepụta ya. 22 Jehova Chineke wee jiri ọgịrịga ahụ o wepụtara n’ahụ́ nwoke ahụ kpụọ nwaanyị ma kpọtara ya nwoke ahụ.+

23 Nwoke ahụ wee sị:

“Ehee! Onye a bụ ọkpụkpụ si n’ọkpụkpụ m

Na anụ ahụ́ si n’anụ ahụ́ m.

A ga-akpọ ya Nwaanyị

N’ihi na e ji ihe si n’ahụ́ nwoke kpụọ ya.”+

24 Ọ bụ ya mere nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya ma rapara n’ahụ́ nwunye ya,* ha abụrụzie otu anụ ahụ́.+ 25 Ha abụọ wee gbara ọtọ,+ nwoke ahụ na nwunye ya. Ma ihere anaghị eme ha.

3 Agwọ+ kacha dị akọ* n’anụ ọhịa niile Jehova Chineke kere. O wee sị nwaanyị ahụ: “Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke sịrị unu erila mkpụrụ si n’osisi ọ bụla dị n’ubi a?”+ 2 Nwaanyị ahụ wee sị agwọ ahụ: “Anyị nwere ike iri mkpụrụ si n’osisi ndị dị n’ubi a.+ 3 Ma Chineke gwara anyị gbasara mkpụrụ si n’osisi dị n’etiti ubi a,+ sị: ‘Unu erila mkpụrụ si na ya, unu emetụkwala ya aka ka unu ghara ịnwụ.’” 4 Agwọ ahụ sịziri nwaanyị ahụ: “Unu agaghị anwụ.+ 5 N’ihi na Chineke ma na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, anya unu ga-emeghe, unu adị ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.”+

6 Nwaanyị ahụ wee hụ na mkpụrụ osisi ahụ dị mma oriri nakwa na ọ na-agụ agụụ ma e lee ya anya. N’eziokwu, osisi ahụ mara mma ile anya. Nwaanyị ahụ wee ghọrọ mkpụrụ ya rie.+ Mgbe e mechara, o nyetụrụ di ya mgbe ya na ya nọ, di ya erie.+ 7 Anya ha abụọ meghere, ha amata na ha gba ọtọ. N’ihi ya, ha dụkọtara akwụkwọ osisi fig ma jiri ha kpuchie úkwù ha.+

8 Mgbe e mechara, nwoke ahụ na nwunye ya nụrụ olu Jehova Chineke mgbe ọ na-agagharị n’ubi ahụ n’oge ifufe ji efe n’ụbọchị.* Ha wee gaa zoo n’agbata osisi ndị dị n’ubi ahụ ka Jehova Chineke ghara ịhụ ha. 9 Jehova Chineke wee kpọwa nwoke ahụ, na-asị ya: “Olee ebe ị nọ?” 10 N’ikpeazụ, nwoke ahụ sịrị: “Anụrụ m olu gị n’ubi a, ma egwu nọ na-atụ m maka na m gba ọtọ. Ọ bụ ya mere m ji gaa zoo.” 11 Chineke wee sị: “Ònye gwara gị na ị gba ọtọ?+ Ì riela mkpụrụ si n’osisi ahụ m nyere gị iwu ka ị ghara iri?”+ 12 Nwoke ahụ sịrị: “Ọ bụ nwaanyị ahụ ị kpọnyere m ka mụ na ya biri. O nyere m mkpụrụ si n’osisi ahụ, mụ erie.” 13 Jehova Chineke wee sị nwaanyị ahụ: “Gịnị bụ ihe a i mere?” Nwaanyị ahụ zara, sị: “Agwọ ahụ duhiere m, m wee rie mkpụrụ osisi ahụ.”+

14 Jehova Chineke wee sị agwọ ahụ:+ “Ebe ọ bụ na i mere ihe a, ana m abụ gị ọnụ n’ime anụ ụlọ niile na anụ ọhịa niile. Ọ bụ afọ gị ka ị ga-eji na-agagharị, ị ga na-erikwa ájá n’oge niile ị dị ndụ. 15 M ga-eme ka gị+ na nwaanyị ahụ+ dịrị n’iro,+ meekwa ka nwa* gị+ na nwa* ya+ dịrị n’iro. Nwa ya ga-egwepịa gị isi,+ ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.”+

16 Chineke sịrị nwaanyị ahụ: “M ga-eme ka ahụ́ na-egbusi gị mgbu ike mgbe ị dị ime. Ahụ́ ga na-egbu gị mgbu mgbe ị na-amụ nwa. Gị na di gị ịnọ ga na-agụsi gị agụụ ike, di gị ga na-achịkwa gị.”

17 Chineke sịkwara Adam:* “Ebe ọ bụ na i gere nwunye gị ntị ma rie mkpụrụ si n’osisi ahụ m nyere gị iwu banyere ya,+ sị, ‘Erila mkpụrụ si na ya,’ ana m abụ ala ọnụ n’ihi gị.+ N’ụbọchị niile ị ga-adị ndụ, ị ga na-arụgbu onwe gị n’ọrụ tupu gị erie ihe ọ ga-emepụta.+ 18 Ọ ga na-epuru gị ogwu na uke, ọ bụkwa ihe ndị puru n’ala ka ị ga na-eri. 19 Ọsụsọ ga-agba gị n’ihu tupu gị erie ihe oriri ruo mgbe ị laghachiri n’ala, n’ihi na ọ bụ ebe i si.+ N’ihi na ị bụ ájá, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.”+

20 Mgbe e mechara, Adam gụrụ nwunye ya Iv,* n’ihi na ọ ga-abụ nne onye ọ bụla dị ndụ.+ 21 Jehova Chineke ji akpụkpọ anụ meere Adam na nwunye ya uwe gbadara agbada ka ha yiri.+ 22 Jehova Chineke wee sị: “Lee, mmadụ ahụ dịzi ka anyị. Ọ marala ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ.+ Ugbu a, ka o wee ghara ịmatị aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi nke ndụ+ rie ma dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,—” 23 Jehova Chineke wee chụpụ ya n’ogige Iden+ ahụ ka ọ gaa kọwa ihe n’ala, bụ́ ebe o si.+ 24 N’ihi ya, ọ chụpụrụ mmadụ ahụ ma dowe ndị cherob+ n’ebe ọwụwa anyanwụ ogige Iden, dowekwa mma agha nke na-enwu ọkụ ma na-atụgharị atụgharị. O dowere ha ebe ahụ ka ha nọchie ebe e si abanye n’ebe osisi nke ndụ dị.

4 Adam na Iv nwunye ya nwere mmekọahụ, ya adị ime.+ Mgbe Iv mụrụ Ken,+ ọ sịrị: “Jehova emeela ka m mụọ nwa nwoke.” 2 Mgbe e mechara, ọ mụrụ nwa ọzọ, bụ́ Ebel+ nwanne Ken.

Ebel ghọrọ onye na-azụ atụrụ, ma Ken ghọrọ onye na-akọ ugbo. 3 Mgbe oge gatụrụ, Ken wetara ụfọdụ mkpụrụ ala mịrị ma jiri ha chụọrọ Jehova àjà. 4 Ma Ebel si n’ìgwè atụrụ ya weta ụfọdụ atụrụ e bu ụzọ mụọ+ ma jiri ha na abụba ha chụọ àjà. Jehova lere Ebel na onyinye ya anya ọma,+ 5 ma o leghị Ken na onyinye ya anya ọma. Ken wee wee ezigbo iwe ma gbarụọ ihu. 6 Jehova wee sị Ken: “Gịnị mere i ji na-ewe oké iwe ma gbarụọ ihu? 7 Ọ bụrụ na ị gbanwee mewe ihe dị mma, ọ̀ bụ na agaghị m ele gị anya ọma? Ma ọ bụrụ na ị gbanweghị mewe ihe dị mma, mmehie nọ n’ọnụ ụzọ na-eche gị, ọ chọkwara inweta gị. Ma ị̀ ga-emerinụ ya?”

8 Mgbe e mechara, Ken gwara Ebel nwanne ya, sị: “Ka anyị gaa n’ọhịa.” Mgbe ha nọ n’ọhịa, Ken tiri Ebel nwanne ya ihe, tigbuo ya.+ 9 Mgbe e mechara, Jehova sịrị Ken: “Olee ebe Ebel nwanne gị nọ?” O wee sị: “Amaghị m. Àbụ m onye nche nwanne m?” 10 Chineke gwaziri ya, sị: “Gịnị bụ ihe a i mere? Gee ntị! Ọbara nwanne gị si n’ala na-ebesara m ákwá.+ 11 Ugbu a, ị bụ onye a bụrụ ọnụ, m na-achụpụkwa gị n’ala a nke mịịrị ọbara nwanne gị onye i gburu.+ 12 Ọ bụrụ na ị kọọ ihe n’ala, ọ gaghị emepụtara gị ihe nke ọma. Ị ga na-awagharị n’ụwa, ị gbara gaa ebe a, gị agbara gaa ebe a.” 13 Ken wee sị Jehova: “Ahụhụ ị na-ata m maka ihe ọjọọ m mere agaghị ekwe m odidi. 14 Taa, ị na-achụpụ m n’ala a, agaghịkwa m anọ n’ihu gị ọzọ. M ga na-awagharịkwa n’ụwa, m gbara gaa ebe a, mụ agbara gaa ebe a, onye ọ bụla hụrụ m ga-egbukwa m.” 15 Jehova gwaziri ya, sị: “N’ihi ya, onye ọ bụla gburu Ken, a ga-ata ya ahụhụ ugboro asaa.”

Jehova wee mee ka e nwee ihe àmà ga-eme ka onye ọ bụla hụrụ Ken ghara igbu ya. 16 Ken wee si n’ihu Jehova pụọ gaa biri n’ala Nọd,* n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Iden.+

17 Mgbe e mechara, Ken na nwunye ya nwere mmekọahụ,+ ya adị ime mụọ Ịnọk. Ken wee rụọ otu obodo ma kpọọ obodo ahụ aha nwa ya bụ́ Ịnọk. 18 Mgbe e mechara, a mụụrụ Ịnọk Aịrad. Aịrad wee mụọ Mehujel, Mehujel amụọ Metushel, Metushel amụọ Lemek.

19 Lemek lụrụ ụmụ nwaanyị abụọ. Aha nke mbụ bụ Eda, aha nke abụọ abụrụ Zila. 20 Eda mụrụ Jebal. Ọ bụ ya bụ onye mbụ biri n’ụlọikwuu ma na-azụ anụ ụlọ. 21 Aha nwanne ya nwoke bụ Jubal. Ọ bụ ya bụ onye mbụ kpọrọ ụbọ akwara, gbuokwa ọjà. 22 Zila mụrụ Tubal-ken, onye ji ọla kọpa na ígwè kpụọ ụdị ngwá ọrụ ọ bụla. Nwanne nwaanyị Tubal-ken bụ Neama. 23 Lemek gwara ndị nwunye ya bụ́ Eda na Zila, sị:

“Unu ndị nwunye Lemek, nụrụnụ olu m.

Geenụ ntị n’ihe m na-ekwu:

M gburu otu nwoke maka na o merụrụ m ahụ́.

M gburu nwa okorobịa ahụ maka na o tiri m ihe.

24 Ọ bụrụ na a ga-ata onye gburu Ken ahụhụ ugboro asaa,+

A ga-ata onye gburu Lemek ahụhụ ugboro iri asaa na asaa.”

25 Adam na nwunye ya nwere mmekọahụ ọzọ, nwunye ya wee mụọ nwa nwoke. Iv gụrụ ya Set*+ n’ihi na o kwuru, sị, “Chineke enyela m* nwa ọzọ ga-anọchi Ebel maka na Ken gburu ya.”+ 26 A mụkwaara Set nwa nwoke, ya agụọ ya Ịnọsh.+ N’oge ahụ, ndị mmadụ malitere ịkpọ aha Jehova.

5 Ihe a bụ akwụkwọ kọrọ akụkọ Adam. N’ụbọchị Chineke kere Adam, o kere ya ka ọ dị ka ya.+ 2 Chineke kere ha nwoke na nwaanyị.+ N’ụbọchị o kere ha,+ ọ gọziri ha ma kpọọ ha Mmadụ.*

3 Adam nọrọ ndụ otu narị afọ na iri atọ (130), o wee mụọ nwa nwoke yiri ya, onye dị ka ya. Ọ gụrụ ya Set.+ 4 Mgbe Adam mụchara Set, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ (800). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 5 Ụbọchị niile Adam dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri atọ (930), o wee nwụọ.+

6 Set nọrọ ndụ otu narị afọ na ise (105), o wee mụọ Ịnọsh.+ 7 Mgbe Set mụchara Ịnọsh, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ na asaa (807). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 8 Ụbọchị niile Set dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri na abụọ (912), o wee nwụọ.

9 Ịnọsh nọrọ ndụ afọ iri itoolu, o wee mụọ Kinan. 10 Mgbe Ịnọsh mụchara Kinan, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ na iri na ise (815). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 11 Ụbọchị niile Ịnọsh dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na ise (905), o wee nwụọ.

12 Kinan nọrọ ndụ afọ iri asaa, o wee mụọ Mahalalel.+ 13 Mgbe Kinan mụchara Mahalalel, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ na iri anọ (840). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 14 Ụbọchị niile Kinan dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri (910), o wee nwụọ.

15 Mahalalel nọrọ ndụ afọ iri isii na ise, o wee mụọ Jered.+ 16 Mgbe Mahalalel mụchara Jered, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ na iri atọ (830). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 17 Ụbọchị niile Mahalalel dịrị ndụ bụ narị afọ asatọ na iri itoolu na ise (895), o wee nwụọ.

18 Jered nọrọ ndụ otu narị afọ na iri isii na abụọ (162), o wee mụọ Ịnọk.+ 19 Mgbe Jered mụchara Ịnọk, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ (800). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 20 Ụbọchị niile Jered dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri isii na abụọ (962), o wee nwụọ.

21 Ịnọk nọrọ ndụ afọ iri isii na ise, o wee mụọ Metusela.+ 22 Mgbe Ịnọk mụchara Metusela, o so ezi Chineke* na-eje ije ruo narị afọ atọ (300). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 23 Ụbọchị niile Ịnọk dịrị ndụ bụ narị afọ atọ na iri isii na ise (365). 24 Ịnọk so ezi Chineke na-eje ije.+ E mechaa, a hụghịzi ya, n’ihi na Chineke kpọpụrụ ya.+

25 Metusela nọrọ ndụ otu narị afọ na iri asatọ na asaa (187), o wee mụọ Lemek.+ 26 Mgbe Metusela mụchara Lemek, ọ nọrọ ndụ narị afọ asaa na iri asatọ na abụọ (782). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 27 Ụbọchị niile Metusela dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri isii na itoolu (969), o wee nwụọ.

28 Lemek nọrọ ndụ otu narị afọ na iri asatọ na abụọ (182), o wee mụọ nwa nwoke. 29 Ọ gụrụ ya Noa,*+ sị: “Onye a ga-eme ka anyị zuo ike* n’ọrụ ike anyị na-arụ nakwa n’ọrụ anyị na-arụgbu onwe anyị maka na Jehova bụrụ ala ọnụ.”+ 30 Mgbe Lemek mụchara Noa, ọ nọrọ ndụ narị afọ ise na iri itoolu na ise (595). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 31 Ụbọchị niile Lemek dịrị ndụ bụ narị afọ asaa na iri asaa na asaa (777), o wee nwụọ.

32 Mgbe Noa ruru narị afọ ise (500), ọ malitere ịmụ ụmụ. Aha ha bụ Shem,+ Ham,+ na Jefet.+

6 Mgbe ndị mmadụ malitere ịdị ọtụtụ n’ụwa, ha amụọkwa ọtụtụ ụmụ nwaanyị, 2 ụmụ ezi Chineke*+ malitere ịhụ na ụmụ nwaanyị ndị mmadụ mụrụ mara mma. Ha wee na-alụrụ ụmụ nwaanyị ndị ha họọrọ. 3 Jehova wee sị: “Agaghị m* agbachi mmadụ nkịtị ruo mgbe ebighị ebi+ n’ihi na mmadụ bụ naanị anụ ahụ́.* N’ihi ya, ọ ga-adị ndụ otu narị afọ na iri abụọ (120).”+

4 Ndị Nefilim* nọ n’ụwa n’oge ahụ, ha nọkwa ruo oge ụfọdụ. Mgbe ahụ, ụmụ ezi Chineke na ụmụ nwaanyị ndị mmadụ mụrụ nwere mmekọahụ, ha wee mụọrọ ha ụmụ nwoke. Ọ bụ ha bụ ndị dike biri n’oge ochie, ụmụ nwoke a ma ama.

5 Jehova wee hụ na ihe ọjọọ mmadụ na-eme n’ụwa karịrị akarị nakwa na ihe mmadụ na-eche n’obi ya mgbe niile bụ naanị ihe ọjọọ.+ 6 O wutere Jehova na o kere mmadụ n’ụwa, obi adịghịkwa ya mma.+ 7 Jehova wee sị: “M ga-ekpochapụ ndị mmadụ m kere n’ụwa, ma mmadụ, ma anụ ụlọ, ma anụ ndị na-arị arị, ma anụ ndị na-efe efe, n’ihi na ọ na-ewute m na m kere ha.” 8 Ma ihe Noa masịrị Jehova.

9 Ihe a bụ akụkọ ndụ Noa.

Noa bụ onye ezi omume.+ O bighị ndụ ka ndị ya na ha dịkọrọ ndụ,* e nweghịkwa ihe a ga-eji taa ya ụta. Noa so ezi Chineke jee ije.+ 10 Ka oge na-aga, Noa mụrụ ụmụ nwoke atọ. Aha ha bụ Shem, Ham, na Jefet.+ 11 Ma n’anya ezi Chineke, ụwa emebiela, tigbuo zọgbuo jukwara na ya. 12 Chineke lere ụwa anya ma hụ na o mebiela.+ Mmadụ* niile na-eme ihe ọjọọ n’ụwa.+

13 Mgbe e mechara, Chineke sịrị Noa: “Ekpebiela m na m ga-ebibi mmadụ niile* maka na ndị juru n’ụwa bụ ndị tigbuo zọgbuo. N’ihi ya, m ga-ebibikọta ha na ụwa.+ 14 Jiri ezigbo osisi* rụọrọ onwe gị ụgbọ.+ Ị ga-arụnye nkebi dị iche iche n’ụgbọ ahụ ma jiri korota+ techie ime ya na azụ ya. 15 Otú a ka ị ga-esi arụ ya: Ụgbọ ahụ ga-adị narị kubit* atọ (300) n’ogologo, kubit iri ise n’obosara, na kubit iri atọ n’ịdị elu. 16 Ị ga-arụnye windo ebe ìhè ga-esi na-abata* n’ụgbọ ahụ. Malite n’elu ụgbọ ahụ ruo n’ebe ị ga-arụnye ya ga-adị otu kubit. Ị ga-arụnye ọnụ ụzọ ụgbọ ahụ n’akụkụ ya.+ Ị ga-arụ ụgbọ ahụ ka ọ dị okpukpu atọ, otu n’ala, otu n’etiti, otu n’elu.

17 “M ga-eme ka mmiri zoo tojuo+ n’ụwa. M ga-eji ya kpochapụ ihe niile na-eku ume n’ụwa.* Ihe ọ bụla dị n’ụwa ga-ala n’iyi.+ 18 Mụ na gị na-agba ndụ. Ị ga-abanye n’ụgbọ ahụ, gị na ụmụ gị na nwunye gị na ndị nwunye ụmụ gị.+ 19 Ị ga-achịbata ụdị anụmanụ ọ bụla dị ndụ+ abụọ abụọ n’ime ụgbọ ahụ ka e wee chebe ha ndụ. Ha ga-abụ oké na nne.+ 20 Anụ ndị ahụ ga-abịakwute gị abụọ abụọ n’ebe ahụ ka e wee chebe ha ndụ, ma anụ ufe n’ụdị ha dị iche iche, ma anụ ụlọ n’ụdị ha dị iche iche, ma anụ ndị ọzọ na-arị arị n’ụdị ha dị iche iche.+ 21 Ị ga-ewere ụdị ihe ọ bụla a na-eri eri+ ka ha bụrụ nri gị na anụmanụ ndị ahụ ga na-eri.”

22 Noa mere ihe niile Chineke nyere ya n’iwu. O mere nnọọ otú ahụ.+

7 Mgbe e mechara, Jehova sịrị Noa: “Banye n’ụgbọ ahụ, gị na ndị ezinụlọ gị niile, n’ihi na ọ bụ gị bụ onye ezi omume m hụrụ n’ọgbọ a.+ 2 Chịrị anụ ọ bụla dị ọcha asaa asaa,+ oké na nne. Chịrị anụ ọ bụla na-adịghị ọcha naanị abụọ abụọ, oké na nne. 3 Chịrịkwa anụ ndị na-efe efe asaa asaa, oké na nne, ka e wee chebe ụmụ ha ndụ n’ụwa niile.+ 4 N’ihi na ọ fọrọ naanị ụbọchị asaa ka m mee ka mmiri zoo+ n’ụwa ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị.+ M ga-ekpochapụkwa ihe ọ bụla dị ndụ m kere eke n’ụwa.”+ 5 Noa wee mee ihe niile Jehova nyere ya n’iwu.

6 Noa dị narị afọ isii (600) mgbe mmiri ahụ zoro tojuo ụwa.+ 7 Noa na ụmụ ya na nwunye ya na ndị nwunye ụmụ ya wee banye n’ụgbọ ahụ tupu nnukwu mmiri ahụ amalite izo.+ 8 Anụ ọ bụla dị ọcha na anụ ọ bụla na-adịghị ọcha na anụ ndị na-efe efe na ihe ọ bụla na-agagharị agagharị n’ala+ 9 banyere abụọ abụọ, oké na nne, n’ụgbọ ahụ. Ha gakwuuru Noa otú Chineke nyere Noa n’iwu. 10 Mgbe ụbọchị asaa gachara, nnukwu mmiri ahụ malitere izo n’ụwa.

11 N’abalị iri na asaa n’ọnwa nke abụọ n’afọ Noa gbara narị afọ isii (600), n’ụbọchị ahụ, a gbaghere nnukwu mmiri niile dị na mbara igwe, megheekwa ọnụ ụzọ mmiri niile dị n’eluigwe.+ 12 Mmiri wee zosie ike n’ụwa ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. 13 N’ụbọchị ahụ, Noa banyere n’ụgbọ ahụ, ya na ụmụ ya bụ́ Shem, Ham, na Jefet,+ nakwa nwunye Noa na ndị nwunye ụmụ ya atọ.+ 14 Ha banyere, ha na anụ ọhịa ọ bụla n’ụdị ya dị iche iche, na anụ ụlọ ọ bụla n’ụdị ya dị iche iche, na anụ ọ bụla na-arị arị n’ụdị ya dị iche iche, na anụ ọ bụla na-efe efe n’ụdị ya dị iche iche, ya bụ, nnụnụ ọ bụla na ihe ọ bụla nwere nku. 15 Ụdị anụ ọ bụla na-eku ume nọ na-agakwuru Noa abụọ abụọ n’ime ụgbọ ahụ. 16 Ha wee banye otú Chineke nyere Noa n’iwu. Ụdị anụ ọ bụla banyere oké na nne. Mgbe ha banyechara, Jehova mechiri ọnụ ụzọ ụgbọ ahụ.

17 Mmiri ahụ zogidere n’ụwa ruo ụbọchị iri anọ. Mmiri ahụ nọ na-eto wee malite ibu ụgbọ ahụ, ụgbọ ahụ nọkwa na-ese n’elu mmiri n’ụwa. 18 Mmiri ahụ wee karịa akarịa, na-etochikwa ebe niile n’ụwa. Ma ụgbọ ahụ nọ na-ese n’elu mmiri ahụ. 19 Mmiri ahụ karịrị akarị n’ụwa nke na o tochiri ugwu niile dị elu dị n’ụwa.*+ 20 Mmiri ahụ ji kubit* iri na ise tofee ugwu ndị ahụ.

21 Ihe niile e kere eke* na-agagharị n’ụwa wee laa n’iyi,+ ya bụ, anụ ndị na-efe efe, anụ ụlọ, anụ ọhịa, obere ụmụ anụmanụ ndị ọzọ,* na mmadụ niile.+ 22 Ihe ọ bụla na-eku ume nọ n’elu ala nwụrụ.+ 23 Chineke* wee kpochapụ ihe ọ bụla dị ndụ n’ụwa, ma mmadụ ma anụmanụ ma anụ ndị na-arị arị ma anụ ndị na-efe efe. O kpochapụrụ ha niile n’ụwa.+ Naanị Noa na ndị ya na ha nọ n’ụgbọ fọrọ ndụ.+ 24 Mmiri ahụ tochiri ụwa ruo otu narị ụbọchị na iri ise (150).+

8 Ma Chineke chetara Noa na anụ ọhịa niile na anụ ụlọ niile ya na ha nọ n’ụgbọ ahụ.+ Chineke wee mee ka ifufe fee n’ụwa, mmiri ahụ amalite ịta. 2 Nnukwu mmiri niile dị na mbara igwe na ọnụ ụzọ mmiri niile dị n’eluigwe mechiri. Mmiri nke si n’eluigwe na-ezo wee kwụsị izo.+ 3 Mmiri wee jiri nwayọọ nwayọọ na-ata n’ụwa. Mgbe otu narị ụbọchị na iri ise (150) gachara, mmiri ahụ atalatala. 4 N’abalị iri na asaa n’ọnwa nke asaa, ụgbọ ahụ kwụsịrị n’ugwu dị n’Ararat. 5 Mmiri ahụ ji nwayọọ nwayọọ na-atalata ruo n’ọnwa nke iri. N’abalị mbụ n’ọnwa nke iri, a hụwara elu ugwu dị iche iche.+

6 Mgbe ụbọchị iri anọ gachara, Noa meghere windo+ ahụ ọ rụnyere n’ụgbọ ahụ 7 ma zipụ otu ugoloọma. Ugoloọma ahụ nọ na-efegharị n’èzí, na-efebatakwa, ruo mgbe mmiri tara n’ụwa.

8 Mgbe e mechara, Noa zipụrụ otu nduru ka o wee mata ma mmiri ọ̀ tawala n’ala. 9 Ma nduru ahụ ahụghị ebe ọ bụla ọ ga-ebere. N’ihi ya, o feere lọghachikwute ya n’ụgbọ ahụ maka na mmiri ka kpuchiri ụwa niile.+ O wee sepụta aka ya nwụrụ ya nwụbata n’ime ụgbọ ahụ. 10 O cheere ụbọchị asaa ọzọ ma si n’ụgbọ ahụ zipụ nduru ahụ ọzọ. 11 Mgbe nduru ahụ feere bịakwute ya ná mgbede, ọ hụrụ na ọ kpụ akwụkwọ oliv ọ tụbitara ọhụrụ n’ọnụ ya. Noa wee mara na mmiri ataala n’ụwa.+ 12 O cheere ụbọchị asaa ọzọ wee zipụ nduru ahụ. Ma ọ lọghachikwuteghị ya ọzọ.

13 N’abalị mbụ n’ọnwa nke mbụ n’afọ nke narị isii na otu (601),+ mmiri ataala n’ụwa. Noa wee wepụ ihe e ji kpuchie elu ụgbọ ahụ ma hụ na ala akọwala. 14 N’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa nke abụọ, ụwa akọọla.

15 Chineke gwaziri Noa, sị: 16 “Si n’ụgbọ ahụ pụta, gị na nwunye gị na ụmụ gị na ndị nwunye ụmụ gị.+ 17 Chịrị ụdị anụ niile dị ndụ pụta,+ ma anụ ndị na-efe efe ma anụ ụlọ ma anụ ọhịa ma anụ niile na-arị arị, ka ha wee mụọ ọmụmụ n’ụwa, ka ha baa ụba ma dị ọtụtụ n’ụwa.”+

18 Noa na ụmụ ya+ na nwunye ya na ndị nwunye ụmụ ya wee si n’ụgbọ ahụ pụta. 19 Ihe niile dị ndụ, anụ niile na-arị arị, anụ niile na-efe efe, na ihe niile na-agagharị agagharị n’ụwa si n’ụgbọ ahụ pụta. Ha pụtara n’ụdị ha dị iche iche.+ 20 Noa wee rụọrọ Jehova ebe ịchụàjà+ ma were ụfọdụ n’anụ niile dị ọcha nakwa ụfọdụ n’anụ niile na-efe efe dị ọcha+ chụọ àjà a na-esu ọkụ n’ebe ịchụàjà ahụ.+ 21 Jehova wee malite ịnụrụ ísì ọma àjà ahụ na-esi. Jehova kwuziri n’obi ya, sị: “Agaghị m abụ ala ọnụ ọzọ+ n’ihi mmadụ, n’ihi na ihe dị mmadụ n’obi malite n’oge ọ bụ nwata bụ ihe ọjọọ.+ E nweghịkwa mgbe m ga-ebibi ihe niile dị ndụ ọzọ otú m mere.+ 22 Malite ugbu a gawa, e nweghị mgbe a ga-akwụsị inwe oge ịgha mkpụrụ na oge iwe ihe ubi n’ụwa, nakwa oge oyi na oge okpomọkụ, oge ọkọchị na oge udu mmiri, nakwa ehihie na abalị.”+

9 Chineke wee gọzie Noa na ụmụ ya, sị ha: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jukwanụ n’ụwa.+ 2 Ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ n’ụwa, ma anụ ọ bụla na-efe efe ma ihe ọ bụla na-agagharị n’ala ma azụ̀ niile dị n’oké osimiri, ga na-atụ unu ụjọ. M na-enyefe ha n’aka unu ugbu a.+ 3 Unu nwere ike iri anụ ọ bụla dị ndụ na-agagharị agagharị.+ M na-enye unu ha niile otú ahụ m nyere unu ihe ndị a na-eri eri na-epu n’ala.+ 4 Ma unu erikọtala anụmanụ na ọbara ya, ya bụ, ndụ* ya.+ 5 Ihe ọzọ bụ na m ga-ajụ ajụjụ maka ọbara unu nke bụ́ ndụ unu. Anụmanụ ọ bụla nke gburu mmadụ ga-anwụrịrị. Onye ọ bụla nke gburu* nwanne ya ga-aza ajụjụ maka ya.+ 6 Onye ọ bụla gburu mmadụ, mmadụ ga-egbu ya,*+ n’ihi na Chineke kere mmadụ n’oyiyi ya.+ 7 Ma ununwa, mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, junụ n’ụwa, dịkwanụ ọtụtụ.”+

8 Chineke wee gwa Noa na ụmụ ya, sị: 9 “Mụ na unu na ụmụ unu na-agba ndụ ugbu a.+ 10 Mụ na ihe ọ bụla dị ndụ unu na ya nọ na-agbakwa ndụ, ma nnụnụ, ma anụmanụ, ma ihe niile e kere eke dị ndụ n’ụwa ndị unu na ha nọ, ndị niile si n’ụgbọ pụta, ya bụ, ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ n’ụwa.+ 11 Mụ na unu na-agba ndụ na e nweghị mgbe ọ bụla ọzọ m ga-eji nnukwu mmiri ozuzo bibie mmadụ niile na anụmanụ niile.* E nweghịkwa mgbe ọ bụla ọzọ nnukwu mmiri ga-ezo laa ụwa n’iyi.”+

12 Chineke kwukwara, sị: “Ihe a bụ ihe àmà na-egosi na mụ na unu na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ unu na ya nọ na-agba ndụ. Ọgbụgba ndụ a ga-adịru ọgbọ niile na-abịa abịa. 13 M na-eme ka eke na egwurugwu m dịrị n’ígwé ojii. Ọ ga-abụ ihe àmà nke na-egosi na mụ na ụwa gbara ndụ. 14 Mgbe ọ bụla m mere ka mmiri rujuo n’ígwé, eke na egwurugwu ga-apụta n’ígwé ojii. 15 M ga-echetakwa ndụ mụ na unu na ụdị ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ gbara. E nweghịkwa mgbe ọ bụla ọzọ mmiri ga-etochi ebe niile bibie mmadụ niile na anụmanụ niile.*+ 16 Eke na egwurugwu ga-apụta n’ígwé ojii. M ga-ahụ ya wee cheta ọgbụgba ndụ ga-adịru ebighị ebi nke mụnwa bụ́ Chineke na ụdị ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ n’ụwa gbara.”

17 Chineke gwara Noa ọzọ, sị: “Ihe a bụ ihe àmà na-egosi na mụ na mmadụ niile na anụmanụ niile* nọ n’ụwa agbaala ndụ.”+

18 Ụmụ Noa ndị si n’ụgbọ ahụ pụta bụ Shem, Ham, na Jefet.+ Mgbe e mechara, Ham mụrụ Kenan.+ 19 Ọ bụ mmadụ atọ a bụ ụmụ Noa. Ọ bụ ha mụtara ndị niile bi n’ebe dị iche iche n’ụwa.+

20 Noa malitere ịrụ ọrụ ubi, ọ kọkwara ubi vaịn. 21 Mgbe ọ ṅụrụ mmanya si n’ubi ahụ, mmanya ahụ gbuwere ya, ya agbaa onwe ya ọtọ n’ime ụlọikwuu ya. 22 Ham, nna Kenan, hụrụ ọtọ nna ya ma gaa kọọrọ ya ụmụnne ya abụọ n’èzí. 23 Shem na Jefet wee chịrị ákwà chịlie ya elu ruo n’ubu ha. Ha jizi azụ banye n’ụlọikwuu ahụ. Ha wee chee ihu ha ebe ọzọ kpuchie ọtọ nna ha. Ha ahụghị ọtọ nna ha.

24 Mgbe Noa tetara n’ụra ma mata ihe ọdụdụ nwa ya mere ya, 25 ọ sịrị:

“Ana m abụ Kenan ọnụ.+

Ka ọ bụụrụ ụmụnne ya ohu kacha ala.”+

26 Ọ sịkwara:

“Ka e too Jehova, bụ́ Chineke Shem,

Ka Kenan bụrụkwa ohu Shem.+

27 Ka Chineke nye Jefet ebe sara mbara,

Ka Jefet birikwa n’ụlọikwuu Shem.

Ka Kenan bụrụkwa ohu ya.”

28 Mgbe Iju Mmiri gachara, Noa nọrọ ndụ narị afọ atọ na iri ise (350).+ 29 Ụbọchị niile Noa dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri ise (950), o wee nwụọ.

10 Ihe a bụ akụkọ ndụ ụmụ Noa, bụ́ Shem,+ Ham, na Jefet.

A mụụrụ ha ụmụ mgbe Iju Mmiri ahụ gachara.+ 2 Ụmụ Jefet bụ Goma,+ Megọg,+ Medaị, Jevan, Tubal,+ Mishek,+ na Taịras.+

3 Ụmụ Goma bụ Ashkenaz,+ Raịfat, na Togama.+

4 Ụmụ Jevan bụ Elaịsha,+ Tashish,+ Kitim,+ na Dodenim.

5 Ọ bụ ndị a mụtara ndị bi n’agwaetiti dị iche iche, ndị nke ọ bụla n’asụsụ ha dị iche iche, n’ezinụlọ ha dị iche iche, nakwa ná mba ha dị iche iche.

6 Ụmụ Ham bụ Kush, Mizrem,+ Pọt,+ na Kenan.+

7 Ụmụ Kush bụ Siba,+ Havila, Sabta, Reama,+ na Sabteka.

Ụmụ Reama bụ Shiba na Didan.

8 Kush mụrụ Nimrọd. Nimrọd bụ onye mbụ bụ dike n’ụwa. 9 Ọ bụ dinta* dị ike nke na-ama Jehova aka. Ọ bụ ya mere e ji asị mmadụ: “Ị dị ka Nimrọd bụ́ dinta* dị ike nke na-ama Jehova aka.” 10 Obodo ndị mbụ ọ chịrị bụ Babel,+ Irek,+ Akad, na Kalne. Ha dị n’ala Shaịna.+ 11 Nimrọd si n’ala ahụ banye n’Asiria+ ma rụọ Ninive,+ Rehobọt-Iye, Kela, 12 na Risen, nke dị n’agbata Ninive na Kela: Obodo a bụ nnukwu obodo.*

13 Mizrem mụrụ Ludim,+ Anamim, Lehebim, Naftuhim,+ 14 Patrusim,+ Kasluhim (onye ndị Filistia+ si n’agbụrụ ya), na Kaftorim.+

15 Kenan mụrụ Saịdọn+ na Het.+ Saịdọn bụ ọkpara ya. 16 Ọ mụkwara ndị Jebus,+ ndị Amọraịt,+ ndị Gegash, 17 ndị Haịvaịt,+ ndị Akaịt, ndị Saịnaịt, 18 ndị Avad,+ ndị Zemaraịt, na ndị Hemat.+ Mgbe e mechara, ezinụlọ ndị Kenan gara biri n’ebe dị iche iche. 19 N’ihi ya, ókè ala ndị Kenan malitere na Saịdọn ruo Gira,+ n’ebe dị nso na Gaza,+ ruokwa Sọdọm, Gọmọra,+ Adma, na Zeboyim.+ Obodo ndị a dị nso na Lesha. 20 Ọ bụ ha bụ ụmụ Ham n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’asụsụ ha dị iche iche, n’ala ha dị iche iche, nakwa ná mba ha dị iche iche.

21 A mụkwaara Shem ụmụ. Shem bụ nwanne Jefet. Ọ bụ Jefet tọrọ ụmụnne ya ndị ọzọ.* Iba+ na ụmụ ya niile sikwa n’agbụrụ Shem. 22 Ụmụ Shem bụ Ịlam,+ Ashọ,+ Apakshad,+ Lọd, na Eram.+

23 Ụmụ Eram bụ Ọz, Họl, Gita, na Mash.

24 Apakshad mụrụ Shila,+ Shila amụọ Iba.

25 A mụụrụ Iba ụmụ nwoke abụọ. Aha otu bụ Pileg,*+ n’ihi na ọ bụ n’oge ọ nọ ndụ ka ndị mmadụ gara biri n’ebe dị iche iche n’ụwa.* Aha nwanne ya nwoke bụ Jọktan.+

26 Jọktan mụrụ Almodad, Shilef, Hezamevet, Jira,+ 27 Hedoram, Yuzal, Dikla, 28 Obal, Abimel, Shiba, 29 Ofa,+ Havila, na Jobab. Ha niile bụ ụmụ Jọktan.

30 Ebe ha bi malitere na Misha ruo Sifa, bụ́ ebe bụ́ ugwu ugwu n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ.

31 Ọ bụ ha bụ ụmụ Shem n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’asụsụ ha dị iche iche, n’ala ha dị iche iche, nakwa ná mba ha dị iche iche.+

32 Ọ bụ ndị a bụ ndị ezinụlọ ụmụ Noa n’ọnụmara n’ọnụmara nakwa ná mba ha dị iche iche. Ọ bụ n’ezinụlọ ndị a ka mba dị iche iche si gbasaa n’ụwa mgbe Iju Mmiri ahụ gachara.+

11 N’oge ahụ, ndị niile bi n’ụwa na-asụ otu asụsụ, e nweghịkwa ihe dị iche n’otú ha niile si ekwu okwu. 2 Mgbe ha nọ na-aga n’ebe ọwụwa anyanwụ, ha hụrụ otu ndagwurugwu n’ala Shaịna,+ ha wee biri n’ebe ahụ. 3 Ha gwaziri ibe ha, sị: “Bịanụ ka anyị kpụọ brik ma nụchaa ya n’ọkụ.” Ha wee jiri brik mere nkume, jirikwa bitumen* mere ụrọ. 4 Ha kwuru, sị: “Bịanụ ka anyị rụọrọ onwe anyị obodo na ụlọ elu nke elu ya ga-eru n’eluigwe, ka anyị meekwa ka aha anyị na-ewu ewu, ka anyị wee ghara ịgbasa n’ebe niile n’ụwa.”+

5 Jehova wee gaa ka ọ hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ nọ na-arụ. 6 Jehova kwuziri, sị: “Ndị a dị n’otu, ha na-asụkwa otu asụsụ.+ Legodị ihe ha malitere ime. E nweghị ihe ọ bụla ha bu n’obi ime ha na-enweghị ike ime. 7 Bịa ka anyị+ gaa ebe ahụ ghagbuo asụsụ ha ka ha ghara ịghọta asụsụ ibe ha.” 8 Jehova wee chụsaa ha n’ebe ahụ, ha agaa biri n’ebe dị iche iche n’ụwa.+ Ha kwụsịziri ịrụ obodo ahụ. 9 Ọ bụ ya mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel*+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka Jehova gwagburu asụsụ ndị niile bi n’ụwa. Jehova chụsara ha n’ebe ahụ, ha agaa biri n’ebe dị iche iche n’ụwa.

10 Ihe a bụ akụkọ ndụ Shem.+

Shem dị otu narị afọ (100) mgbe ọ mụrụ Apakshad.+ Ọ mụrụ ya afọ abụọ Iju Mmiri ahụ gachara. 11 Mgbe Shem mụchara Apakshad, ọ nọrọ ndụ narị afọ ise (500). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.+

12 Apakshad nọrọ ndụ afọ iri atọ na ise, o wee mụọ Shila.+ 13 Mgbe Apakshad mụchara Shila, ọ nọrọ ndụ narị afọ anọ na atọ (403). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.

14 Shila nọrọ ndụ afọ iri atọ, o wee mụọ Iba.+ 15 Mgbe Shila mụchara Iba, ọ nọrọ ndụ narị afọ anọ na atọ (403). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.

16 Iba nọrọ ndụ afọ iri atọ na anọ, o wee mụọ Pileg.+ 17 Mgbe Iba mụchara Pileg, ọ nọrọ ndụ narị afọ anọ na iri atọ (430). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.

18 Pileg nọrọ ndụ afọ iri atọ, o wee mụọ Riu.+ 19 Mgbe Pileg mụchara Riu, ọ nọrọ ndụ narị afọ abụọ na itoolu (209). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.

20 Riu nọrọ ndụ afọ iri atọ na abụọ, o wee mụọ Sirọg. 21 Mgbe Riu mụchara Sirọg, ọ nọrọ ndụ narị afọ abụọ na asaa (207). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.

22 Sirọg nọrọ ndụ afọ iri atọ, o wee mụọ Nehọ. 23 Mgbe Sirọg mụchara Nehọ, ọ nọrọ ndụ narị afọ abụọ (200). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.

24 Nehọ nọrọ ndụ afọ iri abụọ na itoolu, o wee mụọ Tira.+ 25 Mgbe Nehọ mụchara Tira, ọ nọrọ ndụ otu narị afọ na iri na itoolu (119). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.

26 Tira nọrọ ndụ afọ iri asaa, o wee mụọ Ebram,+ Nehọ,+ na Heran.

27 Ihe a bụ akụkọ ndụ Tira.

Tira mụrụ Ebram, Nehọ, na Heran, Heran wee mụọ Lọt.+ 28 Mgbe Tira nna Heran ka nọ ndụ, Heran nwụrụ n’obodo ebe a mụrụ ya, ya bụ, n’obodo Ọọ+ nke ndị Kaldia.+ 29 Ebram lụrụ nwaanyị, Nehọ alụọkwa nwaanyị. Aha nwunye Ebram bụ Seraị,+ aha nwunye Nehọ abụrụ Milka,+ nwa Heran. Heran bụ nna Milka na Iska. 30 Seraị bụ nwaanyị aga.+ Ọ mụtaghị nwa.

31 Tira wee kpọrọ Ebram nwa ya na Lọt nwa nwa ya,+ bụ́ nwa Heran, kpọrọkwa Seraị nwunye nwa ya, bụ́ nwunye Ebram nwa ya. Ha wee soro ya si n’obodo Ọọ nke ndị Kaldia pụọ gawa Kenan.+ Mgbe e mechara, ha rutere Heran+ wee biri n’ebe ahụ. 32 Tira nọrọ ndụ narị afọ abụọ na ise (205). Tira wee nwụọ na Heran.

12 Jehova wee sị Ebram: “Kwapụ n’obodo gị, hapụkwa ndị ikwu gị na ezinụlọ nna gị, kwaga n’obodo m ga-egosi gị.+ 2 M ga-eme ka ị bụrụ nnukwu mba. M ga-agọzi gị. M ga-eme ka aha gị na-ede ude, a ga-esikwa n’aka gị gọzie ndị mmadụ.+ 3 M ga-agọzi ndị na-agọzi gị. M ga-abụ onye na-akpọ gị iyi ọnụ,+ a ga-esikwa n’aka gị gọzie ezinụlọ niile dị n’ụwa.”+

4 Ebram wee gawa otú Jehova gwara ya, Lọt sokwa ya gawa. Ebram dị afọ iri asaa na ise mgbe ọ hapụrụ Heran.+ 5 Ebram kpọọrọ Seraị nwunye ya+ na Lọt nwa nwanne ya,+ buru akụ̀ niile ha kpatara,+ kpọrọkwa ndị* na-ejere ha ozi ha nwetara na Heran. Ha wee kwapụ gawa Kenan.+ Mgbe ha rutere na Kenan, 6 Ebram gagidere n’ala ahụ ruo n’ebe a na-akpọ Shikem,+ n’akụkụ nnukwu osisi ndị dị na More.+ N’oge ahụ, ndị Kenan bi n’ala ahụ. 7 Jehova wee pụta n’ihu Ebram, sị ya: “Ọ bụ ụmụ* gị+ ka m ga-enye ala a.”+ O wee rụọrọ Jehova, onye pụtara n’ihu ya, ebe ịchụàjà n’ebe ahụ. 8 Mgbe e mechara, o si n’ebe ahụ kwaga n’ebe bụ́ ugwu ugwu nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Betel+ ma maa ụlọikwuu n’ebe ahụ. Betel dị n’ebe ọdịda anyanwụ ebe ahụ ọ mara ụlọikwuu, E-aị+ adịrị n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ rụụrụ Jehova ebe ịchụàjà+ n’ebe ahụ, malitekwa ịkpọku aha Jehova.+ 9 E mechaa, Ebram kwaliri gawa n’ebe chere ihu na Negeb.*+ Ọ nọ na-ama ụlọikwuu n’ebe dị iche iche ka ọ na-aga.

10 Ma ụnwụ dara na Kenan, Ebram wee gawa Ijipt ka ọ gaa bitụ* n’ebe ahụ+ maka na ụnwụ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ na Kenan.+ 11 Mgbe ọ chọrọ ịbanye n’Ijipt, ọ gwara Seraị nwunye ya, sị: “Biko, gee m ntị. Ama m na ị mara mma nwaanyị.+ 12 N’ihi ya, ndị Ijipt hụ gị, ha ga-asị, ‘Onye a bụ nwunye ya.’ Ha ga-egbu m ma hapụ gị ndụ. 13 Biko, kwuo na ị bụ nwanne m nwaanyị, ka ha wee kpaso m àgwà ọma n’ihi gị, ka ha ghara igbu m.”+

14 Ozugbo Ebram banyere Ijipt, ndị Ijipt hụrụ na nwaanyị ahụ mara ezigbo mma. 15 Ndị Fero mere ndị isi hụkwara ya, ha wee malite ịgwa Fero na ọ mara mma. Ihe a mere ka a kpọta nwaanyị ahụ n’ụlọ Fero. 16 Ọ kpasoro Ebram àgwà ọma n’ihi Seraị. O wee kpụnye Ebram atụrụ, ehi, oké jakị, nne jakị, na kamel, kpọnyekwa ya ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-eje ozi.+ 17 Jehova wee mee ka Fero na ndị ezinụlọ ya rịa ajọ ọrịa* n’ihi Seraị, nwunye Ebram.+ 18 Fero wee kpọọ Ebram, sị ya: “Gịnị bụ ihe a i mere m? Gịnị mere na ị gwaghị m na ọ bụ nwunye gị? 19 Gịnị mere i ji sị, ‘Ọ bụ nwanne m nwaanyị,’+ nke mere na ọ fọrọ obere ka m lụwa ya? Lekwa nwunye gị. Kpọrọ ya lawa!” 20 Fero nyeziri ụmụ nwoke na-ejere ya ozi iwu, ha wee duru Ebram na nwunye ya na ihe niile o nwere si n’ala ahụ pụọ.+

13 Ebram wee si n’Ijipt kwapụ gawa Negeb,*+ ya na nwunye ya na ihe niile o nwere, nakwa Lọt. 2 Ebram nwere ọtụtụ anụ ụlọ na ọlaọcha na ọlaedo.+ 3 Ka o si na Negeb na-aga Betel, ọ nọ na-ama ụlọikwuu n’ebe dị iche iche ruo mgbe o rutere n’ebe ọ maburu ụlọikwuu n’agbata Betel na E-aị.+ 4 Ebe ahụ bụ ebe ọ rụburu ebe ịchụàjà. Ebram kpọkuru aha Jehova n’ebe ahụ.

5 Lọt, onye ya na Ebram so na-aga, nwekwara atụrụ, ehi, na ụlọikwuu. 6 N’ihi ya, ala ahụ abaghị ha niile. Akụnụba ha ehiela nne nke na ha enweghị ike ibikọta ọnụ. 7 Ihe a meziri ka ndị na-azụrụ Ebram anụ ụlọ na ndị na-azụrụ Lọt anụ ụlọ sewe okwu. (N’oge ahụ, ndị Kenan na ndị Perizaịt bi n’ala ahụ.)+ 8 Ebram wee sị Lọt:+ “Biko, mụ na gị ekwesịghị ise okwu, ndị na-azụrụ m anụ na ndị na-azụrụ gị anụ ekwesịghịkwa ịna-ese okwu, maka na mụ na gị bụ nwanne. 9 I nwere ike ịhọrọ ebe ọ bụla dị gị mma n’ala a. Biko, kwaga ebe ọzọ. Ị gaa n’aka ekpe, m ga-aga n’aka nri. Ma ọ bụrụ na ị gaa n’aka nri, m ga-aga n’aka ekpe.” 10 Lọt wee legharịa anya malite ná mpaghara Osimiri Jọdan+ niile ruo Zoa.+ Ọ hụrụ na mmiri na-ede ógbè ahụ niile nke ọma (tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra), hụkwa na ọ dị ka ubi Jehova kụrụ,+ ka ala Ijipt. 11 Lọt wee họrọ mpaghara Osimiri Jọdan ahụ niile. Lọt gara maa ụlọikwuu ya n’ebe ọwụwa anyanwụ. Otú ahụ ka ha abụọ si biri iche iche. 12 Ebram bi na Kenan, ma Lọt bi n’obodo ndị dị ná mpaghara Osimiri Jọdan.+ N’ikpeazụ, Lọt mara ụlọikwuu ya n’ebe dị nso na Sọdọm. 13 Ndị Sọdọm bụ ndị ọjọọ, ha na-emehiekwa Jehova nke ukwuu.+

14 Mgbe Lọt kwapụchara, Jehova gwara Ebram, sị: “Biko, si n’ebe ị nọ lee anya n’ebe ugwu, n’ebe ndịda, n’ebe ọwụwa anyanwụ, nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ, 15 n’ihi na ọ bụ gị na ụmụ* gị ka m ga-enye ala a niile ị na-ahụ ka ọ bụrụ nke unu mgbe niile.+ 16 M ga-emekwa ka ụmụ* gị dị ọtụtụ ka ájá dị n’ala. Otú ahụ a na-enweghị ike ịgụta ájá dị n’ala ọnụ ka a na-agaghị enwe ike ịgụta ụmụ* gị ọnụ.+ 17 Bilie, gagharịa n’ala a. Gaa ya gburugburu n’ihi na ọ bụ gị ka m ga-enye ya.” 18 Ebram nọ na-ebi n’ụlọikwuu. Mgbe e mechara, ọ bịara biri n’akụkụ nnukwu osisi ndị dị na Mamri,+ bụ́ ndị dị na Hebrọn.+ Ọ bụ n’ebe ahụ ka ọ rụụrụ Jehova ebe ịchụàjà.+

14 N’oge ahụ, Amrafel eze Shaịna,+ Arịọk eze Elesa, Kedọlaoma+ eze Ịlam,+ na Taịdal eze Goyim 2 lusoro Bira eze Sọdọm,+ Biasha eze Gọmọra,+ Shaịnab eze Adma, Shemiba eze Zeboyim,+ na eze Bila, ya bụ, Zoa, agha. 3 Ndị a niile kpọkọtara ndị agha ha na Ndagwurugwu Sidim,+ ya bụ, Oké Osimiri Nnu.+

4 Kedọlaoma achịala ha afọ iri na abụọ, ma ha nupụrụ isi n’afọ nke iri na atọ. 5 N’afọ nke iri na anọ, Kedọlaoma na ndị eze ya na ha so bịara agha ma merie ndị Refeyim nọ n’Ashterọt-kaneyim, ndị Zuzim nọ na Ham, nakwa ndị Imim+ nọ na Sheve-kiriateyim, 6 Ha merikwara ndị Horaịt+ nọ n’ugwu ha bụ́ Sia.+ Ha meriri ha ruo El-peran, nke dị n’ala ịkpa. 7 Ha wee tụgharịa bịa En-mishpat, ya bụ, Kedesh,+ ma merie ógbè ndị Amalek+ niile, meriekwa ndị Amọraịt+ bi na Hazazọn-tema.+

8 Mgbe ahụ, eze Sọdọm gawara agha, ya na eze Gọmọra, eze Adma, eze Zeboyim, na eze Bila, ya bụ, Zoa. Ha haziri onwe ha na Ndagwurugwu Sidim ka ha lụọ agha, 9 ka ha lụso Kedọlaoma eze Ịlam agha, ya na Taịdal eze Goyim, Amrafel eze Shaịna, na Arịọk eze Elesa.+ Eze anọ na-alụso eze ise agha. 10 Olulu bitumen juru na Ndagwurugwu Sidim. Eze Sọdọm na eze Gọmọra wee chọọ ka ha gbalaga, ma ha dabara n’ime olulu ndị ahụ. Ndị fọrọ n’ime ha gbagara n’ebe bụ́ ugwu ugwu. 11 Ndị meriri n’agha ahụ wee bukọrọ ngwongwo ndị Sọdọm na Gọmọra niile, bukọrọkwa nri ha niile lawa.+ 12 Ha kpụkwaara Lọt nwa nwanne Ebram, onye bi na Sọdọm,+ bukọrọkwa ngwongwo ya lawa.

13 Mgbe e mechara, otu nwoke nke si n’ebe ahụ a lụrụ agha gbapụ bịara kọọrọ Ebram, onye Hibru, ihe merenụ. N’oge ahụ, Ebram bi* n’akụkụ ebe Mamri, onye Amọraịt,+ nwere nnukwu osisi dị iche iche. Mamri bụ nwanne Eshkọl na Ena.+ Ụmụ nwoke ndị a na Ebram kwekọrịtara na ha ga na-enyere ibe ha aka. 14 Otú a ka Ebram si nụ na a dọrọla onye ikwu* ya+ n’agha. O wee kpọkọta narị ndị ohu atọ na iri na asatọ (318) a mụrụ n’ụlọ ya, ya bụ, ụmụ nwoke a kụziiri otú e si alụ agha. Ha chụụrụ ndị agha ahụ gawa ruo Dan.+ 15 N’abalị, o kewara ndị agha ya, ya na ha wee lụso ndị ahụ agha ma merie ha. Ha chụụrụ ha gawa n’ebe ugwu, gafee Damaskọs ma ruo Hoba. 16 Ọ napụtara ha ngwongwo niile ha bụkọọrọ, napụtakwa Lọt onye ikwu ya na ngwongwo ya niile nakwa ụmụ nwaanyị na ndị ọzọ.

17 Mgbe Ebram merichara Kedọlaoma na ndị eze ya na ha so ma lọta, eze Sọdọm gara ka o zute Ebram na Ndagwurugwu Sheve, ya bụ, Ndagwurugwu Eze.+ 18 Melkizedek+ eze Selem,+ onye bụ́kwa onye nchụàjà Chineke Onye Kacha Elu,+ gakwara ka o zute Ebram. O nyere Ebram achịcha na mmanya.

19 O wee gọzie Ebram, sị:

“Ka Chineke, Onye Kacha Elu,

Onye kere eluigwe na ụwa, gọzie Ebram.

20 Ka otuto dịrị Chineke Onye Kacha Elu,

Onye nyefere ndị iro gị n’aka gị!”

Ebram wee nye ya otu ụzọ n’ụzọ iri n’ihe niile ọ kwatara n’agha.+

21 Mgbe e mechara, eze Sọdọm sịrị Ebram: “Kpọnye m ndị obodo m ma buru ngwongwo.” 22 Ma Ebram gwara eze Sọdọm, sị: “M weliri aka m na-aṅụ iyi n’ihu Jehova Chineke, Onye Kacha Elu, Onye kere eluigwe na ụwa, 23 na agaghị m ewere ihe ọ bụla bụ́ nke gị. Agaghịdị m ewere eri ma ọ bụ eriri akpụkpọ ụkwụ, ka ị ghara ịsị, ‘Ọ bụ m mere ka Ebram baa ọgaranya.’ 24 Agaghị m ewere ihe ọ bụla ọzọ ma e wepụ ihe ụmụ okorobịa a riri. Ma ka Ena, Eshkọl, na Mamri,+ bụ́ ụmụ nwoke ndị so m gaa agha, were òkè ha.”

15 Mgbe ihe a mechara, Jehova gwara Ebram okwu n’ọhụụ, sị: “Ebram, atụla egwu.+ Abụụrụ m gị ọta.+ Ụgwọ ọrụ gị ga-adị nnọọ ukwuu.”+ 2 Ebram sịrị ya: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, gịnị ka ị ga-enye m, ebe ọ bụ na amụtabeghị m nwa, ebe ọ bụkwa Eliiza+ onye Damaskọs ga-eketa ụlọ m?” 3 Ebram sịkwara: “E nweghị nwa*+ ọ bụla i nyere m, ọ bụkwa ohu m* ga-anọchi m.” 4 Ma, Jehova gwara ya, sị: “Nwoke a agaghị anọchi gị, kama ọ bụ nwa gị* ga-anọchi gị.”+

5 Chineke wee kpọpụta Ebram n’èzí, sị ya: “Biko, lelie anya n’eluigwe gụọ kpakpando ndị a ọnụ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịgụta ha ọnụ.” Chineke sịziri ya: “Otú a ka ụmụ* gị ga-adị ọtụtụ.”+ 6 O wee nwee okwukwe na Jehova,+ ya ejiri maka ya kpọọ ya onye ezi omume.+ 7 O kwukwara, sị: “Abụ m Jehova, onye kpọpụtara gị n’obodo Ọọ nke ndị Kaldia ka m wee nye gị ala a ka ọ bụrụ nke gị.”+ 8 O wee sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, olee otú m ga-esi mara na ọ ga-abụ nke m?” 9 Ọ sịrị ya: “Wetara m ehi gbara afọ atọ, nne ewu gbara afọ atọ, ebule gbara afọ atọ, otu nduru, na nwa kpalakwukwu.” 10 O wee weta ha niile, bọwaa ha abụọ abụọ ma dowe akụkụ nke ọ bụla ka ha chee ibe ha ihu. Ma ọ bọghị nnụnụ ndị ahụ abọ. 11 Nnụnụ ndị na-eri anụ wee malite ibe n’elu ozu anụ ndị ahụ, ma Ebram nọ na-achụpụ ha.

12 Mgbe anyanwụ chọwara ịda, oké ụra buuru Ebram, oké ọchịchịrị nke na-emenye ụjọ kpuchikwara ya. 13 Chineke wee sị Ebram: “Mara amara na ụmụ* gị ga-abụ ndị mbịarambịa n’ala na-abụghị nke ha. Ndị ala ahụ ga-eji ha mere ndị ohu ma mesie ha ike ruo narị afọ anọ (400).+ 14 Ma m ga-ekpe mba ahụ ha ga-agbara ohu ikpe.+ E mechaakwa, ụmụ gị ga-eburu ọtụtụ akụnụba laa.+ 15 Ma ị ga-anwụ n’udo mgbe i bichara ogologo ndụ.+ A ga-eli gị otú e liri ndị nna nna gị. 16 Ma ha ga-alọghachi n’ebe a+ n’ọgbọ nke anọ maka na iko ndị Amọraịt ejubeghị.”*+

17 Mgbe anyanwụ dara, oké ọchịchịrị agbaakwa, nnukwu ọkụ na-akwụ anwụrụ pụtara, ọwa ọkụ na-enwu ọkụ gafekwara n’agbata anụ ndị ahụ. 18 N’ụbọchị ahụ, Jehova na Ebram gbara ndụ.+ Ọ sịrị ya: “Ọ bụ ụmụ* gị ka m ga-enye ala a,+ malite n’osimiri Ijipt ruo ná nnukwu osimiri, bụ́ osimiri Yufretis,+ 19 ya bụ, ala ndị Kenaịt,+ ndị Kenizaịt, ndị Kadmọnaịt, 20 ndị Het,+ ndị Perizaịt,+ ndị Refeyim,+ 21 ndị Amọraịt, ndị Kenan, ndị Gegash, na ala ndị Jebus.”+

16 Seraị, nwunye Ebram, amụtaraghị ya nwa.+ Ma o nwere nwaanyị Ijipt na-ejere ya ozi aha ya bụ Hega.+ 2 Seraị sịrị Ebram: “Lee, Jehova egbochiela m ịmụ nwa. Biko, gị na nwaanyị na-ejere m ozi nwee mmekọahụ. Ma eleghị anya, ọ ga-amụtara m ụmụ.”+ Ebram wee kweta ime ihe Seraị kwuru. 3 Mgbe Ebram bichara afọ iri na Kenan, Seraị nwunye Ebram, kpọọrọ Hega, nwaanyị Ijipt na-ejere ya ozi, kpọnye di ya Ebram ka ọ bụrụ nwunye ya. 4 Ya na Hega wee nwee mmekọahụ, Hega adịrị ime. Mgbe ọ matara na ya dị ime, ọ malitere ileda nne ya ukwu anya.

5 Seraị wee sị Ebram: “Ọ bụ gị kpatara ihe ọjọọ a o mere m. Ọ bụ m kpọnyere gị nwaanyị na-ejere m ozi, ma mgbe ọ matara na ya adịla ime, ọ malitere ileda m anya. Ka Jehova kpee ikpe mụ na gị.” 6 Ebram wee sị Seraị: “Ebe ọ bụ nwaanyị na-ejere gị ozi, mee ya ihe ọ bụla masịrị gị.” Seraị wee megbuwe ya, ya esi n’ụlọ ya gbapụ.

7 Mgbe e mechara, mmụọ ozi Jehova hụrụ Hega n’otu isi iyi dị n’ala ịkpa. Isi iyi ahụ dị n’ụzọ gawara Shọọ.+ 8 O wee sị: “Hega, nwaanyị na-ejere Seraị ozi, olee ebe i si bịa, ebeekwa ka ị na-aga?” O wee zaa, sị: “M si n’ụlọ Seraị nne m ukwu na-agbapụ.” 9 Mmụọ ozi Jehova gwara ya, sị: “Laghachikwuru nne gị ukwu, wedakwa onwe gị n’okpuru ya.” 10 Mmụọ ozi Jehova sịkwara ya: “M ga-eme ka ụmụ* gị mụbaa nke ukwuu nke na a gaghị agụta ha ọnụ n’ihi otú ha ga-esi dị ọtụtụ.”+ 11 Mmụọ ozi Jehova kwukwara, sị: “Lee, ị dị ime. Ị ga-amụ nwa nwoke, ị ga-agụkwa ya Ishmel,* n’ihi na Jehova anụla na ị na-ata ahụhụ. 12 Ma ọ ga na-eme ka jakị ọhịa.* Ọ ga na-alụso onye ọ bụla ọgụ, onye ọ bụla ga na-alụsokwa ya ogụ. Ọ ga-amakwa ụlọikwuu ya n’ebe ga-eche ụmụnne ya niile ihu.”*

13 Hega wee too* aha Jehova, onye nọ na-agwa ya okwu. Ọ sịrị: “Ị bụ Chineke na-ahụ ụzọ.”+ O kwuru ihe a maka na ọ gwara onwe ya, sị: “M nọrọla ebe a hụ onye ahụ nke na-ahụ m.” 14 Ọ bụ ya mere e ji kpọọ olulu mmiri ahụ Bia-lehaị-rọị.* (Ọ dị n’agbata Kedesh na Bired.) 15 Hega wee mụọrọ Ebram nwa nwoke. Ebram wee gụọ nwa ya nwoke ahụ Hega mụụrụ ya Ishmel.+ 16 Ebram dị afọ iri asatọ na isii mgbe Hega mụụrụ ya Ishmel.

17 Mgbe Ebram dị afọ iri itoolu na itoolu, Jehova pụtara n’ihu Ebram, sị ya: “Abụ m Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Mewe ihe dị m mma,* bụrụkwa onye a na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta. 2 M ga-emezu ọgbụgba ndụ mụ na gị,+ m ga-emekwa ka ị mụbaa nke ukwuu.”+

3 Ebram wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, Chineke gwakwara ya, sị: 4 “Lee, mụ na gị agbaala ndụ,+ ị ga-abụkwa nna ọtụtụ mba.+ 5 Aha gị agaghịzi abụ Ebram.* Aha gị ga-abụzi Ebreham,* n’ihi na m ga-eme ka ị bụrụ nna ọtụtụ mba. 6 M ga-eme ka ị mụọ nnọọ ọtụtụ ụmụ, meekwa ka ị bụrụ mba dị iche iche, ndị eze ga-esikwa n’agbụrụ gị.+

7 “M ga-emezu ọgbụgba ndụ mụ na gị+ na nke mụ na ụmụ* gị n’ọgbọ ha niile. Ọ bụ ọgbụgba ndụ ga-adịru ebighị ebi, nke m ji ekwe gị nkwa na m ga-abụ Chineke gị nakwa Chineke ụmụ* gị. 8 M ga-enyekwa gị na umụ* gị ala ahụ i biri mgbe ị bụ onye mbịarambịa,+ ya bụ, ala Kenan niile. M ga-enye ya unu ka ọ bụrụ nke unu ruo mgbe niile. M ga-abụkwa Chineke ha.”+

9 Chineke gwakwara Ebreham, sị: “Gị na ụmụ* gị n’ọgbọ ha niile emebikwala ọgbụgba ndụ mụ na unu. 10 Ihe a bụ ndụ mụ na gị na-agba, nke gị na ụmụ* gị na-agaghị emebi: A ga-ebi nwoke ọ bụla n’ime unu úgwù.+ 11 Unu ga-ebi úgwù. Ọ ga-abụ ihe àmà na-egosi na mụ na unu gbara ndụ.+ 12 N’ọgbọ unu niile, a ga-ebi nwa nwoke ọ bụla a mụrụ n’ụlọ gị úgwù n’ụbọchị nke asatọ.+ A ga-ebikwa nwoke ọ bụla bi n’ụlọ gị e ji ego zụta n’aka onye mba ọzọ úgwù, ya bụ, onye na-abụghị nwa* gị. 13 A ga-ebi nwoke ọ bụla a mụrụ n’ụlọ gị nakwa nwoke ọ bụla e ji ego gị zụta úgwù.+ Ihe àmà a nke dị unu n’ahụ́ ga-egosi na mụ na unu agbaala ndụ ga-adịte aka. 14 Ọ bụrụ na nwoke ọ bụla ajụ ibi úgwù, a ga-egbu ya. O mebiela ọgbụgba ndụ m.”

15 Chineke wee gwa Ebreham, sị: “Akpọzila Seraị*+ nwunye gị Seraị n’ihi na aha ya ga-abụzi Sera.* 16 M ga-agọzi ya, meekwa ka ọ mụọrọ gị nwa nwoke.+ M ga-agọzi ya, ọ ga-abụkwa nne ọtụtụ mba. Ndị eze ga-esi n’agbụrụ ya.” 17 Ebreham wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, malite ịchị ọchị ma sị n’obi ya:+ “Nwoke gbara otu narị (100) afọ ọ̀ ka ga-amụ nwa? Sera, nwaanyị gbara afọ iri itoolu, ọ̀ ka ga-amụ nwa?”+

18 Ebreham gwaziri ezi Chineke, sị: “Biko, gọzie Ishmel.”+ 19 Chineke wee sị: “N’eziokwu, Sera nwunye gị ga-amụrụ gị nwa nwoke, ị ga-agụkwa ya Aịzik.*+ Mụ na ya ga-agba ndụ. Ọ ga-abụ ọgbụgba ndụ ga-adịru ebighị ebi. Ọ ga-abụkwa ọgbụgba ndụ mụ na ụmụ* ya ga-agba.+ 20 Ma anụla m ihe i kwuru banyere Ishmel. M ga-agọzi ya, mee ka ọ mụbaa ma mụọ nnọọ ọtụtụ ụmụ. Ọ ga-amụta ndị isi iri na abụọ, m ga-emekwa ka ọ bụrụ nnukwu mba.+ 21 Ma, mụ na Aịzik,+ bụ́ nwa Sera ga-amụrụ gị n’ụdị oge a n’afọ ọzọ,+ ga-agba ndụ.”

22 Mgbe Chineke na Ebreham kwuchara okwu, Chineke hapụrụ ya pụọ. 23 Ebreham wee kpọrọ Ishmel nwa ya na ụmụ nwoke niile a mụrụ n’ụlọ ya na onye ọ bụla o ji ego ya zụta, ya bụ, nwoke ọ bụla bi n’ụlọ Ebreham, ma bie ha úgwù n’ụbọchị ahụ, otú Chineke gwara ya.+ 24 Ebreham dị afọ iri itoolu na itoolu mgbe o biri úgwù.+ 25 Ishmel nwa ya dị afọ iri na atọ mgbe o biri úgwù.+ 26 Ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka e biri Ebreham úgwù, biekwa Ishmel nwa ya. 27 E biri Ebreham na ụmụ nwoke niile bi n’ụlọ ya úgwù, ma onye ọ bụla a mụrụ n’ụlọ ya ma onye ọ bụla o ji ego zụta n’aka onye mba ọzọ.

18 Mgbe e mechara, Jehova+ pụtara n’ihu Ebreham n’akụkụ nnukwu osisi ndị dị na Mamri.+ N’oge ahụ, Ebreham nọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ya n’oge ebe niile kacha ekpo ọkụ n’ụbọchị. 2 O leliri anya hụ ụmụ nwoke atọ ndị guzo n’ebe dịtụ anya.+ Mgbe ọ hụrụ ha, o si n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ gbara ọsọ gaa zute ha, ọ kpọkwara isiala. 3 Ọ sịziri: “Jehova,* ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, biko, bata na nke ohu gị. 4 Biko, ka e kute obere mmiri saa unu ụkwụ,+ unu anọrọzie n’okpuru osisi a zurutụ ike. 5 Ebe ọ bụ na unu bịara na nke ohu unu, ka m wetara unu achịcha ka unu taa nweta ume. E mechaa, unu agawa ebe unu na-aga.” Ha sịrị ya: “Ọ dị mma. I nwere ike ime ihe i kwuru.”

6 Ebreham wee mee ọsọ ọsọ gakwuru Sera n’ụlọikwuu ma sị ya: “Mee ọsọ ọsọ! Mata sia* ntụ ọka* atọ e gwere nke ọma. Gwọọ ya, jirikwa ya mee achịcha.” 7 Ebreham gbagara n’ebe ìgwè ehi ya dị họta obere oké ehi ahụ́ dị mma. Ọ kpụnyere ya onye na-ejere ya ozi, onye ahụ emee ọsọ ọsọ gbuo ya sie. 8 O wee buru bọta na mmiri ara ehi na anụ ahụ o siri dowe n’ihu ha. Ma ọ kwụ n’akụkụ ha n’okpuru osisi ahụ ka ha nọ na-eri nri.+

9 Ha jụrụ ya, sị: “Olee ebe Sera nwunye gị nọ?”+ Ọ zara ha, sị: “Ọ nọ n’ụlọikwuu.” 10 Otu onye n’ime ha wee sị: “M ga-abịakwute gị ọzọ n’ụdị oge a n’afọ ọzọ, Sera nwunye gị ga-amụkwa nwa nwoke.”+ Sera nọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ, nke dị n’azụ nwoke ahụ, na-ege ihe ha na-ekwu. 11 Ebreham na Sera emeela agadi, kaa ezigbo nká.+ Sera agafeela ịmụ nwa.*+ 12 N’ihi ya, Sera malitere ịchị ọchị n’obi ya, sị: “M̀ ga-enwe ụdị obi ụtọ a ebe ọ bụ na mụ akaala nká, onyenwe m emeekwala agadi?”+ 13 Jehova wee sị Ebreham: “Gịnị mere Sera ji chịa ọchị ma sị, ‘M̀ ga-amụ nwa n’eziokwu n’agbanyeghị na m meela agadi?’ 14 È nwere ihe nyịrị Jehova?+ M ga-abịakwute gị ọzọ n’ụdị oge a n’afọ ọzọ, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.” 15 Ma Sera gọrọ agọ, sị: “Achịghị m ọchị!” maka na egwu na-atụ ya. O wee sị: “Mba, ị chịrị ọchị.”

16 Mgbe ụmụ nwoke ndị ahụ biliri ka ha lawa, Ebreham so ha ka o dupụ ha. O du ha ruo n’ebe ha nọ hụ Sọdọm.+ 17 Jehova sịrị: “Agaghị m ezoro Ebreham ihe m chọrọ ime.+ 18 Ụmụ Ebreham ga-aghọ nnukwu mba dị ike, a ga-esikwa n’aka ya gọzie mba niile dị n’ụwa.+ 19 Amarala m ya, amakwa m na ọ ga-enye ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya niile iwu ka ha na-eme ihe Jehova kwuru ma na-eme ihe dị mma na ihe ziri ezi,+ ka Jehova wee meere Ebreham ihe o kwere ya ná nkwa.”

20 Jehova kwuziri, sị: “Ihe ọjọọ a na-ekwu na ndị Sọdọm na Gọmọra na-eme karịrị akarị,+ mmehie ha dịkwa oké njọ.+ 21 M ga-agbada ka m hụ ma ihe a na-ekwu gbasara ha ọ̀ bụ ihe ha na-eme n’eziokwu. Ọ bụrụ na ha anaghị eme otú ahụ, m ga-ama.”+

22 Ụmụ nwoke ahụ si n’ebe ahụ pụọ gawa Sọdọm, ma Jehova+ na Ebreham ka nọ. 23 Ebreham gakwuuru ya ma sị ya: “Ị̀ ga-ekpochapụkọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume?+ 24 Ọ bụrụ na e nwere ndị ezi omume iri ise n’obodo ahụ, ị̀ ka ga-ekpochapụ obodo ahụ? Ọ̀ bụ na ị gaghị agbaghara ndị bi na ya n’ihi ndị ezi omume iri ise ahụ? 25 O doro anya na ị gaghị egbukọta onye ezi omume na onye ajọ omume, o wee bụrụ otu ihe ga-eme onye ezi omume na onye ajọ omume.+ O doro anya na ị gaghị eme ya.+ Ọ̀ bụ na Onye na-ekpe ụwa niile ikpe agaghị eme ihe dị mma?”+ 26 Jehova wee sị: “Ọ bụrụ na m hụ ndị ezi omume iri ise na Sọdọm, m ga-agbaghara mmadụ niile bi na ya n’ihi ha.” 27 Ma Ebreham kwuru ọzọ, sị: “Jehova, biko, ewela iwe na m katara obi na-agwa gị okwu n’agbanyeghị na m bụ ájá na ntụ. 28 Ọ bụrụkwanụ na ọ fọrọ mmadụ ise ka ndị ezi omume ahụ zuo iri ise, ị̀ ga-ebibi ndị niile bi n’obodo ahụ n’ihi mmadụ ise ahụ ọ fọrọ ka ha zuo?” O wee sị: “Agaghị m ebibi ha ma m hụ mmadụ iri anọ na ise na ya.”+

29 Ma ọ gwara ya okwu ọzọ, sị: “Ọ bụrụkwanụ na a hụ ndị ezi omume iri anọ n’ebe ahụ?” Ọ sịrị: “Agaghị m ebibi obodo ahụ n’ihi mmadụ iri anọ ahụ.” 30 Ma o kwukwara, sị: “Jehova, biko, ewela oké iwe,+ kama ka m kwutụkwuo okwu: “Ọ bụrụkwanụ na a hụ naanị ndị ezi omume iri atọ n’ebe ahụ?” Ọ sịrị: “Agaghị m ebibi obodo ahụ ma m hụ ndị ezi omume iri atọ na ya.” 31 Ma o kwukwara, sị: “Jehova, biko, ewela iwe na m katara obi na-agwa gị okwu: Ọ bụrụkwanụ na a hụ naanị ndị ezi omume iri abụọ n’ebe ahụ?” Ọ sịrị: “Agaghị m ebibi obodo ahụ n’ihi mmadụ iri abụọ ahụ.” 32 N’ikpeazụ, ọ sịrị: “Jehova, biko ewela iwe, kama ka m kwuo okwu ọzọ naanị otu ugboro a: Ọ bụrụkwanụ na a hụ naanị ndị ezi omume iri n’ebe ahụ?” Ọ sịrị: “Agaghị m ebibi obodo ahụ n’ihi mmadụ iri ahụ.” 33 Mgbe Jehova na Ebreham kwuchara okwu, ọ gawara,+ ma Ebreham laghachiri n’ụlọ ya.

19 Ndị mmụọ ozi abụọ ahụ rutere Sọdọm ná mgbede. N’oge ahụ, Lọt nọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ámá Sọdọm. Mgbe Lọt hụrụ ha, o biliri gaa izute ha, ọ kpọkwara isiala.+ 2 Ọ sịrị ha: “Ndị nwe m, biko, batanụ n’ụlọ ohu unu, nọrọkwanụ ruo mgbe chi bọrọ, ka a saakwa unu ụkwụ, echi unu ebilie n’isi ụtụtụ gawa ebe unu na-aga.” Ha wee sị: “Mba, anyị ga-arahụ n’ámá obodo.” 3 Ma ọ rịọsiri ha arịrịọ ike, ha esorozie ya banye n’ụlọ ya. O wee siere ha ezigbo nri, meekwa achịcha na-ekoghị eko, ha erie.

4 Tupu ha alakpuo, ụmụ nwoke niile nọ n’obodo Sọdọm, ma nwata ma okenye, nuuru n’ìgwè bịa gbaa ụlọ ahụ gburugburu. 5 Ha nọ na-akpọ Lọt, na-asị ya: “Olee ebe ụmụ nwoke ndị ahụ bịakwutere gị n’abalị a nọ? Kpọpụtara anyị ha ka anyị na ha nwee mmekọahụ.”+

6 Lọt wee pụkwuru ha n’ọnụ ụzọ, ma ọ kpọchiri ụzọ mgbe ọ pụrụ. 7 Ọ sịrị ha: “Bikonụ, ụmụnne m, unu emela ihe na-adịghị mma. 8 Bikonụ, m nwere ụmụ nwaanyị abụọ ha na nwoke na-enwebeghị mmekọahụ. Biko, ka m kpọpụtara unu ha ka unu mee ha ihe ọ bụla dị unu mma. Ma unu emela ụmụ nwoke a ihe ọ bụla, n’ihi na ha abatala n’ụlọ m ka m chebe ha.”+ 9 Ha wee sị ya: “Pụọrọ anyị n’ụzọ!” Ha sịkwara: “Onye mbịarambịa a bịara biri ebe a, ma ụjọ anaghị atụ ya ikpe anyị ikpe. Ihe anyị ga-eme gị ugbu a ga-adị njọ karịa ihe anyị ga-eme ụmụ nwoke ahụ.” Ha wee nuru gakwuru Lọt, na-achọ ka ha kwakaa ibo ụzọ ahụ. 10 Ụmụ nwoke abụọ ahụ wee wepụta aka ha sebata Lọt n’ime ụlọ, ha mechikwara ụzọ. 11 Ma ha mere ka ụmụ nwoke ahụ nọ n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ kpuo ìsì, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu, nke mere na ike gwụrụ ha ebe ha nọ na-achọ ọnụ ụzọ ahụ.

12 Ụmụ nwoke abụọ ahụ sịziri Lọt: “È nwere onye ọzọ i nwere n’ebe a? Kpọrọ ha niile si n’obodo a pụọ, ma ndị ọgọ gị nwoke ma ụmụ gị ndị nwoke ma ụmụ gị ndị nwaanyị ma ndị ikwu gị niile bi n’obodo a! 13 N’ihi na anyị ga-ebibi ebe a, maka na Jehova anụla ihe ọjọọ a na-ekwu na ndị obodo a na-eme.+ Ọ bụ ya mere Jehova ji zite anyị ka anyị bịa bibie obodo a.” 14 N’ihi ya, Lọt gara na-agwa ndị ọgọ ya nwoke, bụ́ ndị chọrọ ịlụ ụmụ ya ndị nwaanyị, sị: “Ngwanụ! Ka anyị sinụ n’ebe a pụọ n’ihi na Jehova ga-ebibi obodo a!” Ma ndị ọgọ ya nwoke weere ya na ọ na-egwu egwu.+

15 Mgbe chi bọwara, ndị mmụọ ozi ahụ malitere ịgwa Lọt ka o mee ngwa ngwa. Ha sịrị ya: “Mee ngwa ngwa! Kpọrọ nwunye gị na ụmụ gị ndị nwaanyị abụọ ndị gị na ha nọ n’ebe a pụọ, ka a ghara ibibi unu mgbe a na-ebibi ndị obodo a maka mmehie ha!”+ 16 Mgbe ọ nọ na-egbu oge, Jehova meere ha ebere.+ Ụmụ nwoke ahụ wee dọkpụrụ ya na nwunye ya na ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ n’aka ma kpọrọ ha kpọpụ n’obodo ahụ.+ 17 Ozugbo ha kpọgara ha ná mpụga obodo ahụ, otu n’ime ha sịrị ya: “Gbalaga maka ndụ gị! Elela anya n’azụ,+ akwụrụkwala n’ebe ọ bụla n’ógbè ahụ!+ Gbaga n’ebe bụ́ ugwu ugwu ka a ghara ibibi gị!”

18 Lọt wee sị ha: “Biko, Jehova, ka m ghara ịgbaga ebe ahụ. 19 Biko, ihe ohu gị masịrị gị, i mekwaara m ebere na-enweghị atụ* wee dowe m ndụ.+ Ma agaghị m enwe ike ịgbaga n’ebe ahụ bụ́ ugwu ugwu n’ihi na ụjọ na-atụ m na ọdachi ga-adakwasị m, mụ anwụọ.+ 20 Obodo a dị nso. Biko, ka m gbaga na ya. Ọ bụghị nnukwu obodo. Biko, ka m gbaga na ya. Ọ bụghị nnukwu obodo. M gbaga na ya, e nweghị ihe ga-eme m.” 21 Chineke* wee sị ya: “Ọ dị mma, m ga-emekwara gị ihe a ị rịọrọ.+ Agaghị m ebibi obodo a i kwuru okwu ya.+ 22 Mee ọsọ ọsọ! Gbaga n’ebe ahụ, n’ihi na agaghị m eme ihe ọ bụla ruo mgbe i ruru n’ebe ahụ!”+ Ọ bụ ya mere o ji kpọọ obodo ahụ Zoa.*+

23 Anyanwụ awaala mgbe Lọt rutere n’obodo Zoa. 24 Jehova wee mee ka sọlfọ* na ọkụ zoo na Sọdọm na Gọmọra. Ọ bụ Jehova si n’eluigwe zite ọkụ ahụ.+ 25 O wee laa obodo ndị a n’iyi. Ọ lara ógbè ahụ niile n’iyi, ma ndị niile bi n’obodo ndị ahụ ma ihe ndị a kụrụ n’ala ndị ahụ.+ 26 Ma nwunye Lọt nọ n’azụ Lọt. O lere* anya n’azụ, o wee ghọọ ogidi nnu.+

27 Ebreham biliri n’isi ụtụtụ gaa n’ebe ọ kwụbu mgbe ya na Jehova kwuru okwu.+ 28 Mgbe o ledara anya lee Sọdọm na Gọmọra na ala niile dị n’ógbè ahụ, ihe ọ hụrụ tụrụ ya egwu. Nnukwu anwụrụ ọkụ si n’obodo ahụ na-akwụgo elu. Ọ dị ka nnukwu anwụrụ ọkụ si ná nnukwu ekwú.+ 29 Mgbe Chineke bibiri obodo ndị ahụ dị n’ógbè ahụ, Chineke chetara Ebreham wee mee ka Lọt pụọ n’obodo ndị ahụ o bibiri, bụ́ ebe Lọt bibu.+

30 Mgbe e mechara, Lọt na ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ si na Zoa kwapụ gaa biri n’ebe bụ́ ugwu ugwu+ maka na ụjọ ibi na Zoa+ na-atụ ya. Ya na ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ wee biri n’ọgba. 31 Nke ada gwara nke obere, sị: “Nna anyị emeela agadi, e nweghịkwa nwoke bi n’ala a anyị na ya ga-enwe mmekọahụ otú e si eme n’ebe niile n’ụwa. 32 Bịa ka anyị nye nna anyị mmanya ka ọ ṅụọ, ka anyị na ya nwee mmekọahụ* ka anyị wee si n’aka nna anyị mụta ụmụ.”

33 Ha wee gbaa nna ha mmanya n’abalị ahụ. Nke ada wee banye, ya na nna ya enwee mmekọahụ,* ma nna ya amaghị mgbe o dinara na mgbe o biliri. 34 N’echi ya, nke ada sịrị nke obere: “Mụ na nna m nwere mmekọahụ n’abalị ụnyaahụ. Ka anyị nyekwa ya mmanya n’abalị a. Ị ga-abanyezi ka gị na ya nwee mmekọahụ, ka anyị wee si n’aka nna anyị mụta ụmụ.” 35 Ha wee gbaa nna ha mmanya n’abalị ahụ. Nke obere banyere, ya na nna ya enwee mmekọahụ, ma nna ya amaghị mgbe o dinara na mgbe o biliri. 36 Lọt wee tụwa ụmụ ya abụọ ime. 37 Nke ada mụrụ nwa nwoke wee gụọ ya Moab.+ Ọ bụ ya bụ nna ndị Moab ndị nọ taa.+ 38 Nke obere mụkwara nwa nwoke wee gụọ ya Ben-amị. Ọ bụ ya bụ nna ndị Amọn+ ndị nọ taa.

20 Ebreham si n’ebe ahụ kwaga+ na Negeb* wee biri n’agbata Kedesh+ na Shọọ.+ O bikwara* na Gira.+ Mgbe o bi n’ebe ahụ, 2 o kwuru ọzọ na Sera nwunye ya bụ nwanne ya nwaanyị.+ Abimelek eze Gira wee zie ozi, a kpọtara ya Sera.+ 3 Mgbe e mechara, Chineke bịakwutere Abimelek ná nrọ n’abalị, sị ya: “Ị nwụọdịla anwụọ n’ihi nwaanyị ahụ ị kpọọrọ,+ n’ihi na ọ bụ nwunye nwoke ọzọ.”+ 4 Ma, Abimelek agabeghị ya nso.* N’ihi ya, ọ sịrị: “Jehova, ị̀ ga-ebibi mba aka ha dị ọcha? 5 Ọ̀ kwa ọ sịrị m, ‘Ọ bụ nwanne m nwaanyị’? Ọ̀ kwa nke nwaanyị sịkwara m, ‘Ọ bụ nwanne m nwoke’? Ebughị m ihe ọjọọ n’obi mee ihe a, aka m dịkwa ọcha.” 6 Ezi Chineke wee sị ya ná nrọ: “Ama m na i bughị ihe ọjọọ n’obi mee ihe a. Ọ bụ ya mere m ji gbochie gị imehie m. Ọ bụ ya mere na ekweghị m ka i metụ ya aka. 7 Ugbu a, kpọghachiri nwoke ahụ nwunye ya, n’ihi na ọ bụ onye amụma,+ ọ ga-arịọkwara gị arịrịọ+ ka ị dịrị ndụ. Ma ọ bụrụ na ị kpọghachighị ya, mara na ị ga-anwụrịrị, gị na ndị obodo gị niile.”

8 Abimelek biliri n’isi ụtụtụ kpọkọta ndị niile na-ejere ya ozi ma kọọrọ ha ihe a niile. Ezigbo ụjọ wee jide ha. 9 Abimelek kpọziri Ebreham, sị ya: “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Olee ihe ọjọọ m mere gị i ji chọọ ime ka mụ na ndị m na-achị mee nnukwu mmehie a? Ihe i mere m adịghị mma.” 10 Abimelek jụkwara Ebreham, sị: “Gịnị ka i bu n’obi mee ihe a?”+ 11 Ebreham sịrị: “Ọ bụ maka na m sịrị n’obi m, ‘N’eziokwu, ndị obodo a anaghị atụ egwu Chineke. Ha ga-egbu m ka ha kpọrọ nwunye m.’+ 12 Ma n’eziokwu, ọ bụ nwanne m nwaanyị. Ọ bụ otu nna ji anyị, ma ọ bụghị otu nne mụrụ anyị, m wee lụọ ya.+ 13 N’ihi ya, mgbe Chineke si n’ụlọ nna m zipụ m,+ m sịrị ya: ‘Otú a ka ị ga-esi gosi m na ị hụrụ m n’anya:* Ebe ọ bụla anyị gara, ị ga-agwa ndị mmadụ na m bụ nwanne gị nwoke.’”+

14 Abimelek wee kpụrụ atụrụ na ehi kpụnye Ebreham, kpọnyekwa ya ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-eje ozi. Ọ kpọnyekwara ya Sera nwunye ya. 15 Abimelek gwakwara ya, sị: “Ala a niile bụ nke m. Biri ebe ọ bụla dị gị mma.” 16 Ọ sịkwara Sera: “M na-enye nwanne gị nwoke otu puku (1,000) mkpụrụ ego ọlaọcha.+ Ọ bụ ihe ga-egosi ndị ezinụlọ gị niile na ndị niile ọzọ na aka gị dị ọcha, e kwesịghịkwa ịta gị ụta.” 17 Ebreham rịọsiri ezi Chineke arịrịọ ike. Chineke wee gwọọ Abimelek na nwunye ya na ndị ohu ya nwaanyị, ha amalitekwa ịmụ ụmụ, 18 n’ihi na Jehova mechiburu akpa nwa ụmụ nwaanyị niile nọ n’ezinụlọ Abimelek n’ihi Sera, nwunye Ebreham.+

21 Jehova chetara Sera otú o kwuru. Jehova meere Sera ihe o kwere ná nkwa.+ 2 Sera wee dị ime,+ mụọrọ Ebreham nwa nwoke mgbe Ebreham merela agadi. Ọ mụrụ nwa ahụ kpọmkwem n’oge Chineke kwere ya nkwa na Sera ga-amụ nwa.+ 3 Ebreham gụrụ nwa ya nwoke a mụrụ ọhụrụ Aịzik, bụ́ nwa Sera mụụrụ ya.+ 4 Ebreham wee bie Aịzik nwa ya nwoke úgwù n’ụbọchị nke asatọ, otú Chineke nyere ya n’iwu.+ 5 Ebreham dị otu narị (100) afọ mgbe a mụụrụ ya Aịzik. 6 Sera wee sị: “Chineke emeela ka m chịa ọchị. Onye ọ bụla nụrụ ya ga-eso m chịa ọchị.”* 7 Ọ sịkwara: “Ònye gaara agwa Ebreham, sị, ‘Sera ga-enye nwa ara?’ Ma, amụtarala m ya nwa nwoke mgbe o merela agadi?”

8 Aịzik toro, a kwụsị ya ara. Ebreham wee mee nnukwu oriri n’ụbọchị a kwụsịrị ya ara. 9 Ma, Sera nọ na-ahụ na nwa Hega+ onye Ijipt, bụ́ nwa Hega mụụrụ Ebreham, ji Aịzik na-eme ihe ọchị.+ 10 O wee gwa Ebreham, sị: “Chụpụ ohu nwaanyị a na nwa ya n’ihi na nwa ohu nwaanyị a agaghị eso Aịzik nwa m keta akụnụba gị.”+ 11 Ma ihe ahụ o kwuru gbasara nwa ahụ wutere nnọọ Ebreham.+ 12 Chineke wee sị Ebreham: “Ekwela ka ihe ọ bụla Sera na-agwa gị banyere nwa ahụ nakwa banyere ohu gị nwaanyị wute gị. Gee ya ntị, n’ihi na ọ bụ Aịzik ga-amụta ndị a ga-akpọ ụmụ* gị.+ 13 Ma m ga-eme ka nwa ohu nwaanyị+ ahụ bụrụ mba,+ n’ihi na ọ bụ nwa* gị.”

14 Ebreham wee bilie n’isi ụtụtụ were achịcha na karama akpụkpọ mmiri nye Hega. Ọ tụkwasịrị ihe ndị a n’ubu Hega ma chụpụ ya na nwata nwoke ahụ.+ Hega wee gawa, na-agagharị n’ala ịkpa Bia-shiba.+ 15 N’ikpeazụ, mmiri dị na karama akpụkpọ ahụ gwụrụ. O wee hapụ nwata nwoke ahụ n’okpuru otu n’ime osisi ndị dị n’ebe ahụ. 16 Ọ pụwara gaa nọdụ ala naanị ya n’ebe dịtụ anya,* maka na ọ sịrị: “Achọghị m ịhụ mgbe nwata a ga-anwụ.” N’ihi ya, ọ nọdụrụ ala n’ebe dịtụ anya malite ibesi ákwá ike.

17 Chineke nụrụ olu nwata nwoke ahụ.+ Mmụọ ozi Chineke wee si n’eluigwe kpọọ Hega òkù, sị ya:+ “Hega, gịnị na-eme gị? Atụla egwu n’ihi na Chineke anụla olu nwata nwoke ahụ n’ebe ahụ ọ nọ. 18 Bilie, kulite nwata nwoke ahụ, jidekwa ya aka, n’ihi na m ga-eme ka ọ bụrụ nnukwu mba.”+ 19 Chineke wee meghee anya ya, ya ahụ olulu mmiri. Ọ gara gbanye mmiri na karama akpụkpọ ahụ, nye nwa ya nwoke, ya aṅụọ. 20 Chineke nọnyeere nwata nwoke ahụ+ mgbe ọ na-eto. O biri n’ala ịkpa, mechaakwa bụrụ onye na-agba ụta. 21 Ọ gara biri n’ala ịkpa Peran.+ Nne ya wee lụtara ya nwaanyị n’Ijipt.

22 N’oge ahụ, Abimelek na Faịkọl, onyeisi ndị agha ya, sịrị Ebreham: “Chineke na-anọnyere gị n’ihe ọ bụla ị na-eme.+ 23 N’ihi ya, jiri aha Chineke ṅụọrọ m iyi na ị gaghị aghọ mụ na ụmụ m na ụmụ ụmụ m aghụghọ nakwa na ị ga-egosi mụ na ndị obodo m, ndị bi n’ala a i bi, na ị hụrụ anyị n’anya* otú m gosiri gị.”+ 24 Ebreham wee sị: “M na-aṅụrụ gị iyi.”

25 Ma, Ebreham gwara Abimelek banyere olulu mmiri ndị na-ejere Abimelek ozi weghaara n’ike.+ 26 Abimelek sịrị: “Amaghị m onye mere ihe a. Ị kọrọghị m banyere ya. Ọ bụ taa i kwuru ya ka m na-anụ ya.” 27 Ebreham wee kpụrụ atụrụ na ehi kpụnye Abimelek, ha abụọ agbaa ndụ. 28 Mgbe Ebreham si n’ìgwè atụrụ kpụpụta nne atụrụ asaa iche, 29 Abimelek sịrị Ebreham: “Gịnị mere i ji kpụpụta nne atụrụ asaa ndị a iche?” 30 O wee sị: “Ị ga-anara m nne atụrụ asaa ndị a ka ha bụrụ ihe àmà na ọ bụ m gwuru olulu mmiri a.” 31 Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ebe ahụ Bia-shiba,*+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ha abụọ ṅụrụ iyi. 32 Ha wee gbaa ndụ+ na Bia-shiba. Mgbe ha gbachara ndụ, Abimelek na Faịkọl, onyeisi ndị agha ya, biliri laghachi n’ala ndị Filistia.+ 33 Mgbe e mechara, Ebreham kụrụ osisi tamarisk na Bia-shiba ma nọrọ n’ebe ahụ kpọkuo aha Jehova,+ bụ́ Chineke na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.+ 34 Ebreham wee biri* n’ala ndị Filistia ruo ogologo oge.*+

22 Mgbe ihe ndị a mechara, ezi Chineke nwalere Ebreham.+ Ọ kpọrọ ya òkù, sị: “Ebreham!” ya azaa ya, sị: “Lee m!” 2 Chineke wee sị ya: “Biko, kpọrọ Aịzik+ nwa gị nwoke, otu mkpụrụ nwa ị mụrụ, onye ị hụrụ n’anya nke ukwuu,+ gaa n’ala Moraya.+ Jiri ya chụọ àjà a na-esu ọkụ n’ebe ahụ, n’otu n’ime ugwu m ga-egosi gị.”

3 Ebreham wee bilie n’isi ụtụtụ dokwasị ihe e ji anọ ọdụ n’elu jakị ya, kpọrọ mmadụ abụọ n’ime ndị na-ejere ya ozi, kpọrọkwa Aịzik nwa ya. Ọ wara nkụ ọ ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ. O biliziri gawa n’ebe ahụ ezi Chineke gwara ya. 4 N’ụbọchị nke atọ, Ebreham leliri anya ma nọrọ n’ebe dị anya hụ ebe ahụ ọ na-aga. 5 Ebreham sịrị ndị na-ejere ya ozi: “Unu na jakị a nọrọ ebe a ka mụ na nwa m nwoke gaa n’ebe ahụ fee Chineke. E mechaa, anyị ga-alọghachikwute unu.”

6 Ebreham wee bo Aịzik nwa ya nkụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ ma were ọkụ* na mma, ha abụọ esoro na-aga. 7 Aịzik wee sị Ebreham nna ya: “Nna m,” ya azaa ya, sị: “Ee, nwa m.” Aịzik wee sị: “Anyị ji ọkụ, anyị bukwa nkụ, oleekwanụ atụrụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ?” 8 Ebreham wee sị: “Nwa m, ọ bụ Chineke ga-eweta atụrụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ.”+ Ha abụọ wee soro na-aga.

9 N’ikpeazụ, ha rutere n’ebe ahụ ezi Chineke gwara ya ka ọ gaa. Ebreham wee rụọ ebe ịchụàjà n’ebe ahụ ma hazie nkụ ahụ n’elu ya. O kere Aịzik nwa ya eriri ụkwụ na aka ma kukwasị ya n’elu nkụ ahụ o dokwasịrị n’ebe ịchụàjà ahụ.+ 10 Ebreham matịziri aka were mma ahụ ka o gbuo nwa ya.+ 11 Ma mmụọ ozi Jehova si n’eluigwe kpọọ ya òkù, sị: “Ebreham, Ebreham!” ya azaa ya, sị: “Lee m!” 12 O wee sị ya: “Emerụla nwa ahụ ahụ́, emekwala ya ihe ọ bụla, n’ihi na amatala m ugbu a na ị na-atụ egwu Chineke ebe ọ bụ na ị jụghị inye m nwa gị nwoke, bụ́ otu mkpụrụ nwa ị mụrụ.”+ 13 Ebreham wee lelie anya hụ ebule mpi ya konyere n’osisi. Ebreham gara kpụrụ ebule ahụ, jiri ya chụọ àjà a na-esu ọkụ kama ịchụ nwa ya nwoke n’àjà. 14 Ebreham kpọrọ ebe ahụ Jehova-jaịre.* Ọ bụ ya mere a ka ji ekwu ruo taa, sị: “Jehova ga-eweta ihe ndị a chọrọ n’ugwu ya.”+

15 Mmụọ ozi Jehova wee si n’eluigwe kpọọ Ebreham òkù nke ugboro abụọ, 16 sị: “Jehova sịrị, ‘Eji m onwe m na-aṅụ iyi+ na ebe ọ bụ na i mere ihe a, ị jụghịkwa inye m nwa gị nwoke, bụ́ otu mkpụrụ nwa ị mụrụ,+ 17 n’eziokwu, m ga-agọzi gị. N’eziokwu, m ga-eme ka ụmụ* gị dị ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe nakwa ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri.+ Nwa* gị ga-ewegharakwa obodo* ndị iro ya.+ 18 M ga-esi n’aka nwa* gị+ gọzie mba niile dị n’ụwa n’ihi na i gere m ntị.’”+

19 Mgbe e mechara, Ebreham laghachikwutere ndị na-ejere ya ozi. Ha wee bilie soro Ebreham laghachi Bia-shiba,+ birikwa n’ebe ahụ.

20 Mgbe ihe ndị a mechara, e ziri Ebreham ozi, sị: “Milka amụọkwarala Nehọ nwanne gị nwoke ụmụ ndị nwoke:+ 21 Nwa nke mbụ bụ Ọz. Nke na-eso ya bụ Bọz, ndị nke ọzọ abụrụ Kemuel (nna Eram), 22 Kised, Hezọ, Pildash, Jidlaf, na Betuel.”+ 23 Betuel bụ nna Ribeka.+ Ọ bụ mmadụ asatọ ahụ ka Milka mụụrụ Nehọ nwanne Ebreham. 24 Ruma, bụ́ iko nwaanyị Nehọ, mụkwaara Nehọ ụmụ nwoke. Ha bụ: Tiba, Geham, Tehash, na Meaka.

23 Sera nọrọ ndụ otu narị afọ na iri abụọ na asaa (127). Ọ bụ afọ ole a ka Sera dịrị ndụ.+ 2 Sera wee nwụọ na Kiriat-aba,+ ya bụ, Hebrọn,+ n’ala ndị Kenan.+ Ebreham malitere ibe ákwá na iruru Sera uju. 3 Ebreham wee si n’ebe a dọsara ozu nwunye ya bilie gaa gwa ụmụ Het+ okwu. Ọ sịrị ha: 4 “Abụ m onye mbịarambịa bi n’ala unu.+ Sinụ n’ala unu nye m ala ebe m ga na-eli ozu ka m lie nwunye m.” 5 Ụmụ Het wee gwa Ebreham, sị: 6 “Onyenwe anyị, gee anyị ntị. Anyị weere gị ka onyeisi Chineke họpụtara.*+ I nwere ike ili nwunye gị n’ebe kacha mma n’ebe anyị na-eli ozu. E nweghị onye ọ bụla n’ime anyị ga-ajụ ka ị ghara ili nwunye gị n’ebe ọ na-eli ozu.”

7 Ebreham biliri kpọọrọ ndị ala ahụ, ya bụ, ụmụ Het,+ isiala. 8 Ọ sịkwara ha: “Ọ bụrụ na unu* kwetara ka m lie nwunye m, geenụ m ntị ma rịọrọnụ m Ifrọn nwa Zoha arịrịọ 9 ka o resị m ọgba Mak-pila. Ọ bụ ya nwe ọgba ahụ. Ọ dị na nsọtụ ala ya. Ya nọrọ n’ihu unu resị m ya. M ga-akwụ ya ọlaọcha ole ọgba ahụ bụ,+ ka ọgba ahụ bụrụzie ebe m ga na-eli ozu.”+

10 Ifrọn so n’ụmụ Het ndị nọ n’ebe ahụ. N’ihi ya, Ifrọn onye Het zara Ebreham n’ihu ụmụ Het nakwa n’ihu ndị niile zukọrọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ,+ sị: 11 “Mba, onyenwe m. Gee m ntị. M na-enye gị ma ala ahụ ma ọgba dị na ya. M nọ n’ihu ụmụnna m na-enye gị ha. Lie nwunye gị n’ebe ahụ.” 12 Ebreham wee kpọọrọ ndị ala ahụ isiala 13 ma gwa Ifrọn n’ihu ha, sị: “Biko, gee m ntị. M ga-akwụ gị ọlaọcha ole ala ahụ bụ. Nara m ya, ka m lie nwunye m n’ebe ahụ.”

14 Ifrọn gwaziri Ebreham, sị: 15 “Onyenwe m, gee m ntị. Ihe m ga-ereta ala a bụ narị shekel* ọlaọcha anọ (400). Ma e nweghị ihe ọ bụ. Gaa lie nwunye gị n’ebe ahụ.” 16 Ebreham gere Ifrọn ntị, Ebreham wee tụọ ọlaọcha ole ahụ Ifrọn kwuru n’ihu ụmụ Het ma nye ya Ifrọn. Ọ dị narị shekel* ọlaọcha anọ (400). E ji ihe ndị ahịa ji atụ̀ ihe tụọ ya.+ 17 E si otú a mee ka o doo anya na ala Ifrọn, nke dị na Mak-pila, n’ihu Mamri, ma ala ahụ ma ọgba dị na ya ma osisi niile dị na ya, bụzi 18 nke Ebreham. Ọ zụrụ ya n’ihu ụmụ Het, n’ihu ndị niile zukọtara n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ. 19 Mgbe e mechara, Ebreham liri Sera nwunye ya n’ọgba dị na Mak-pila, n’ihu Mamri, ya bụ, Hebrọn, n’ala ndị Kenan. 20 Otú a ka ụmụ Het si nye Ebreham ala ahụ na ọgba dị na ya ka ọ bụrụ ebe ọ ga na-eli ozu.+

24 Ugbu a, Ebreham emeela agadi, kaa ezigbo nká. Jehova gọzikwara Ebreham n’ihe niile.+ 2 Ebreham gwara onye na-ejere ya ozi, onye kacha bụrụ okenye n’ezinụlọ ya, bụ́ onye na-elekọta ihe niile o nwere,+ sị: “Biko, tinye aka gị n’okpuru apata ụkwụ m,* 3 jiri aha Jehova, bụ́ Chineke nke eluigwe na ụwa, ṅụọrọ m iyi na ị gaghị alụtara nwa m nwoke otu n’ime ụmụ nwaanyị ndị Kenan, bụ́ ndị m bi n’obodo ha.+ 4 Kama ị ga-aga n’obodo m, na nke ndị ikwu m,+ lụtara Aịzik nwa m nwoke nwaanyị.”

5 Ma, onye na-ejere ya ozi jụrụ ya, sị: “Ọ bụrụkwanụ na nwaanyị ahụ achọghị iso m lọta n’ala a? Ọ̀ bụ m kpọrọ nwa gị nwoke laghachi n’ala i si bịa?”+ 6 Ebreham sịrị ya: “Akpọghachikwala nwa m nwoke n’ebe ahụ.+ 7 Jehova bụ́ Chineke nke eluigwe, onye si n’ụlọ nna m nakwa n’ala ndị ikwu m kpọrọ m,+ onye gwakwara m okwu ma ṅụọrọ m iyi,+ sị: ‘Ọ bụ ụmụ* gị+ ka m ga-enye ala a,’+ ga-ezite mmụọ ozi ya ka o butere gị ụzọ.+ Ị ga-esikwa n’ebe ahụ lụtara nwa m nwoke nwaanyị.+ 8 Ma ọ bụrụ na nwaanyị ahụ ekweghị eso gị alọta, iyi a ị ga-aṅụ agaghị eme gị ihe ọ bụla. Ma akpọgala nwa m nwoke n’ebe ahụ.” 9 Onye ahụ na-ejere Ebreham ozi wee tinye aka ya n’okpuru apata ụkwụ Ebreham nna ya ukwu ma ṅụọrọ ya iyi na ọ ga-eme ihe o kwuru.+

10 Onye ahụ na-ejere Ebreham ozi kpụụrụ kamel iri n’ime kamel nna ya ukwu, werekwa ụdị onyinye dị iche iche nna ya ukwu nwere, gawa. Ọ gawara n’obodo Nehọ, nke dị na Mesopotemia. 11 Mgbe o rutere n’otu olulu mmiri dị tupu a banye n’obodo ahụ, o mere ka kamel ndị ahụ ọ kpụ makpuru ala n’ebe ahụ. Ọ bụ n’oge mgbede, mgbe ụmụ nwaanyị na-apụtakarị ka ha sere mmiri. 12 O wee kpee ekpere, sị: “Jehova Chineke nna m ukwu Ebreham, biko, mee ka ihe gaziere m taa, gosikwa na ị hụrụ nna m ukwu Ebreham n’anya.* 13 Lee, m guzo n’akụkụ olulu mmiri a, ụmụ agbọghọ obodo a na-apụtakwa ka ha sere mmiri. 14 Biko, ka nwa agbọghọ m ga-asị, ‘Biko, butuo ite mmiri gị nye m mmiri ka m ṅụọ,’ nke ga-asịkwa m, ‘Ṅụọ, m ga-enyekwa kamel gị mmiri,’ bụrụ nwa agbọghọ ị họtaara Aịzik ohu gị. Biko, meere m ihe a ka m jiri ya mara na ị hụrụ nna m ukwu n’anya.”*

15 Tupu ya ekwuchaadị ihe ọ na-ekwu, Ribeka nwa Betuel+ bu ite mmiri ya n’ubu pụta. (Betuel bụ nwa Milka.+ Milka bụ nwunye Nehọ.+ Nehọ bụ nwanne Ebreham.) 16 Ribeka bụ nwa agbọghọ mara ezigbo mma, e nwebeghịkwa nwoke ya na ya nwere mmekọahụ. Ọ gbadara na mmiri ahụ, gbanye mmiri n’ite mmiri ya ma si na mmiri ahụ pụta. 17 Onye na-ejere Ebreham ozi gbakwuuru ya ozugbo, sị ya: “Biko, si n’ite mmiri gị nye m mmiri ka m ṅụrụtụ.” 18 O wee sị ya: “Onyenwe m, ṅụọ.” O wee butulata ite mmiri ya ọsọ ọsọ ma nye ya mmiri. 19 Mgbe o nyechara ya mmiri, ọ sịrị ya: “M ga-esetakwara kamel gị mmiri ruo mgbe ha ṅụjuru afọ.” 20 Ozugbo ahụ, ọ wụnyere mmiri dị n’ite mmiri ya n’ihe anụ ụlọ ji aṅụ mmiri ma gbaga n’olulu mmiri ahụ ugboro ugboro na-eseta mmiri. Ọ nọ na-esetara kamel ahụ niile mmiri. 21 Ihe niile a juru nwoke ahụ anya, ya agba nkịtị na-ele ya n’anya n’anya, na-eche ma ọ̀ ga-abụ na Jehova emeela ka ihe ọ bịara nwee isi ka ọ̀ bụ na o mebeghị ka o nwee isi.

22 Mgbe kamel ndị ahụ ṅụchara mmiri, nwoke ahụ wepụtara ọla imi e ji ọlaedo mee nke dị ọkara shekel* n’arọ nakwa ọla aka abụọ e ji ọlaedo mee ndị dị shekel* iri n’arọ ma were ha nye ya. 23 Ọ sịkwara nwa agbọghọ ahụ: “Biko, gwa m, ị̀ bụ nwa onye? È nwere ebe anyị ga-arahụ n’ụlọ nna gị?” 24 Ọ zara ya, sị: “Abụ m nwa Betuel.+ Ọ bụ Milka na Nehọ+ mụrụ nna m.” 25 Ọ gwakwara ya, sị: “Anyị nwere okporo ọka, nwejuokwa nri anụ enwejuo. Anyị nwekwara ebe unu ga-arahụ.” 26 Nwoke ahụ wee hulata kpọọrọ Jehova isiala, 27 sị: “Ka e too Jehova bụ́ Chineke nna m ukwu Ebreham n’ihi na ọ ka na-egosi na ọ hụrụ nna m ukwu n’anya,* na-emezukwa nkwa o kwere ya. Jehova edurutela m n’ụlọ ụmụnne nna m ukwu.”

28 Nwa agbọghọ ahụ gbaara ọsọ gaa n’ụlọ nne ya kọọrọ ha ihe ndị a merenụ. 29 Ribeka nwere nwanne nwoke aha ya bụ Leban.+ Leban wee gbara ọsọ gakwuru nwoke ahụ nọ ná mpụga obodo, n’akụkụ olulu mmiri. 30 Mgbe Leban hụrụ ọla imi ahụ nakwa ọla aka ndị nwanne ya nwaanyị gba n’aka ma nụ ihe Ribeka nwanne ya nwaanyị kwuru, sị: “Ọ bụ ihe a ka nwoke ahụ gwara m,” Leban gakwuuru nwoke ahụ n’ebe ahụ ọ ka guzo n’akụkụ kamel ya, n’olulu mmiri ahụ. 31 Ozugbo ahụ, Leban sịrị ya: “Onye Jehova gọziri agọzi, bịawa. Gịnị mere ị ka ji guzoro n’èzí ebe a? M doziela ụlọ, kwadebekwa ebe kamel ndị a ga-anọ.” 32 Nwoke ahụ wee bata n’ụlọ. O* wee tọpụ kamel ndị ahụ ihe e kere ha ma nye kamel ndị ahụ okporo ọka na nri anụ. O kutekwara mmiri a ga-eji saa nwoke ahụ na ụmụ nwoke ya na ha so ụkwụ. 33 Ma mgbe e buteere ya ihe ọ ga-eri, ọ sịrị: “Agaghị m eri ihe ruo mgbe m gwara unu ihe mere m ji bịa.” Leban sịziri ya: “Kwuwe.”

34 O wee sị: “Abụ m onye na-ejere Ebreham ozi.+ 35 Jehova agọziela nnọọ nna m ukwu, o meekwala ka ọ baa ezigbo ọgaranya ma nye ya atụrụ na ehi, ọlaọcha na ọlaedo, ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-eje ozi, nakwa kamel na jakị.+ 36 Sera, nwunye nna m ukwu, mụkwaara nna m ukwu nwa nwoke mgbe o merela agadi.+ Ọ bụ ya ka nna m ukwu ga-enye ihe niile o nwere.+ 37 N’ihi ya, nna m ukwu mere ka m ṅụọ iyi. Ọ sịrị m: ‘Alụtarala nwa m nwoke otu n’ime ụmụ nwaanyị ndị Kenan, bụ́ ndị m bi n’obodo ha.+ 38 Mba, kama ị ga-aga n’ụlọ nna m nakwa n’ezinụlọ m+ lụtara Aịzik nwa m nwoke nwaanyị.’+ 39 Ma m sịrị nna m ukwu, ‘Ọ bụrụkwanụ na nwaanyị ahụ achọghị iso m lọta?’+ 40 O wee sị m, ‘Jehova, onye m na-efe,+ ga-ezite mmụọ ozi ya+ ka ọ nọnyere gị, ọ ga-emekwa ka ihe ị na-aga nwee isi. Ị ga-esi n’ezinụlọ m nakwa n’ụlọ nna m lụtara nwa m nwoke nwaanyị.+ 41 Iyi ị ṅụụrụ m agaghị eme gị ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na ị gaa n’ezinụlọ m ha ajụ ịkpọnye gị nwaanyị ahụ. Ọ bụ ya ga-eme ka i nwere onwe gị n’iyi ị ṅụrụ.’+

42 “Mgbe m rutere n’olulu mmiri ahụ taa, m kpere ekpere, sị: ‘Jehova Chineke nna m ukwu Ebreham, ọ bụrụ na ị ga-eme ka ihe m bịara nwee isi, 43 lee, m guzo n’akụkụ olulu mmiri. Ọ bụrụ na nwa agbọghọ+ apụta isere mmiri, m ga-asị ya: “Biko, ka m ṅụrụtụ mmiri n’ite gị.” 44 Ọ bụrụ na ọ sị m: “Ṅụọ, m ga-esetakwara kamel gị mmiri,” ka ọ bụrụ nwaanyị ahụ bụ onye Jehova họtaara nwa nna m ukwu.’+

45 “Tupu mụ ekwuchaa ihe a n’obi m, lekwa ka Ribeka bu ite mmiri ya n’ubu na-apụta! Ọ gbadara n’olulu mmiri ahụ malite isere mmiri. M wee sị ya: ‘Biko, nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.’+ 46 O butulatara ite mmiri ya ọsọ ọsọ, sị m: ‘Ṅụọ mmiri,+ m ga-enyekwa kamel gị mmiri.’ M wee ṅụọ mmiri, o nyekwara kamel m mmiri. 47 Mgbe e mechara, m jụrụ ya, sị, ‘Ị̀ bụ nwa onye?’ ya azaa m, sị, ‘Abụ m nwa Betuel. Ọ bụ Nehọ na Milka mụrụ nna m.’ M wee gbanye ya ọla n’imi, gbanyekwa ya ọla aka n’aka.+ 48 M hulataziri kpọọrọ Jehova isiala ma too Jehova bụ́ Chineke nna m ukwu Ebreham,+ onye dutere m n’ebe m kwesịrị ịbịa ka m lụta nwa nwanne nna m ukwu ka ọ bụrụ nwunye nwa ya. 49 Ugbu a, ọ bụrụ na unu chọrọ igosi na unu hụrụ nna m ukwu n’anya nakwa na unu bụ ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi, gwanụ m. Ma ọ bụrụ na unu achọghị ime otú ahụ, gwanụ m, ka m mara ma m̀ ga-agawa ihu ka m̀ ga-agawa azụ.”+

50 Leban na Betuel wee, sị ya: “Ihe a si n’aka Jehova. Anyị enweghị ike ịsị gị ee ma ọ bụ ee e.* 51 Lekwa Ribeka n’ihu gị. Kpọrọ ya lawa, ka ọ bụrụ nwunye nwa nna gị ukwu, otú Jehova kwuru.” 52 Mgbe onye na-ejere Ebreham ozi nụrụ ihe ha kwuru, ọ kpọọrọ Jehova isiala ozugbo. 53 Onye ahụ na-ejere Ebreham ozi wee chịpụta uwe nakwa ihe ndị e ji ọlaọcha na ọlaedo mee ma chịnye ha Ribeka. O nyekwara nwanne ya nwoke na nne ya ihe ndị bara ezigbo uru. 54 Mgbe e mechara, ya na ụmụ nwoke so ya riri ihe ma ṅụọ mmanya, ha rahụkwara n’ebe ahụ.

Mgbe o biliri n’ụtụtụ, ọ sịrị: “Hapụnụ m ka m lakwuru nna m ukwu.” 55 Nwanne nwoke Ribeka na nne ya wee sị: “Ka anyị na nwa agbọghọ a nọọ ụbọchị iri, ma ọ dịkarịa ala. E mechaa, o nweziri ike ịlawa.” 56 Ma ọ sịrị ha: “Ebe ọ bụ na Jehova emeela ka ihe m bịara nwee isi, unu egbochila m ịla. Hapụnụ m ka m lawa gakwuru nna m ukwu.” 57 Ha kwuziri, sị: “Ka anyị kpọọ nwa agbọghọ ahụ jụọ ya ihe o chere.” 58 Ha kpọrọ Ribeka, jụọ ya, sị: “Ị̀ ga-eso nwoke a laa?” Ọ zara, sị: “M ga-eso ya ala.”

59 Ha wee hapụ Ribeka nwanne ha nwaanyị+ na onye nyere ya ara*+ na onye na-ejere Ebreham ozi na ụmụ nwoke ya na ha so ka ha lawa. 60 Ha gọziri Ribeka, sị ya: “Nwanne anyị nwaanyị, ka ụmụ gị dịrị puku kwuru iri puku, ka ụmụ* gị wegharakwa obodo* ndị kpọrọ ha asị.”+ 61 Ribeka na ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi biliziri nọkwasị na kamel sowe nwoke ahụ. Onye ahụ na-ejere Ebreham ozi wee kpọrọ Ribeka lawa.

62 Ugbu a, Aịzik si n’ụzọ gara Bia-lehaị-rọị+ lọta, n’ihi na o bi n’ógbè Negeb.*+ 63 Aịzik pụtara ná mgbede na-ejegharị n’ọhịa ka ọ tụgharịa uche.+ Mgbe o lepụrụ anya, ọ hụrụ ka kamel na-abịa. 64 Mgbe Ribeka lepụrụ anya, ọ hụrụ Aịzik, ya esi na kamel ọ nọ na ya rịtuo ozugbo. 65 O wee jụọ onye na-ejere Ebreham ozi, sị: “Ònye bụ nwoke ahụ si n’ọhịa na-abịa izute anyị?” Onye na-ejere Ebreham ozi sịrị ya: “Ọ bụ nna m ukwu.” Ribeka wee were ákwà kpuchie ihu ya. 66 Onye na-ejere Ebreham ozi wee kọọrọ Aịzik ihe niile o* mere. 67 Mgbe e mechara, Aịzik kpọbatara Ribeka n’ụlọikwuu Sera nne ya.+ Aịzik si otú a lụọ Ribeka. O wee hụ Ribeka n’anya.+ E si otú a kasie Aịzik obi mgbe nne ya nwụchara.+

25 Ebreham lụrụ nwaanyị ọzọ. Aha ya bụ Ketura. 2 Ka oge na-aga, Ketura mụụrụ ya Zimran, Jọkshan, Midan, Midian,+ Ishbak, na Shua.+

3 Jọkshan mụrụ Shiba na Didan.

Ụmụ Didan bụ Ashurim, Letushim, na Leumim.

4 Ụmụ Midian bụ Ifa, Ife, Henọk, Abaịda, na Eldea.

Ha niile bụ ụmụ Ketura.

5 Mgbe e mechara, Ebreham nyere Aịzik ihe niile o nwere,+ 6 ma Ebreham nyere ụmụ ndị iko ya mụụrụ ya onyinye. Mgbe ọ ka nọ ndụ, ọ gwara ha ka ha si n’ebe Aịzik nọ kwapụ.+ Ha wee kwaga n’ala ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. 7 Ebreham dịrị ndụ otu narị afọ na iri asaa na ise (175). 8 Ebreham wee kubie ume ma nwụọ mgbe o mere ezigbo agadi. Ọ kara nká, ndụ ya jukwara ya afọ. E wee lie ya otú e liri ndị nna nna ya. 9 Aịzik na Ishmel ụmụ ya liri ya n’ọgba dị na Mak-pila, n’ala Ifrọn nwa Zoha onye Het, nke dị n’ihu Mamri,+ 10 ya bụ, ala Ebreham zụrụ n’aka ụmụ Het. Ọ bụ n’ebe ahụ ka e liri Ebreham na Sera nwunye ya.+ 11 Mgbe Ebreham nwụchara, Chineke nọ na-agọzi Aịzik nwa ya.+ Aịzik bi nso na Bia-lehaị-rọị.+

12 Ihe a bụ akụkọ ndụ Ishmel+ nwa Ebreham, onye Hega,+ nwaanyị Ijipt na-ejere Sera ozi, mụụrụ Ebreham.

13 Ihe a bụ aha ụmụ Ishmel n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Ọkpara Ishmel bụ Nebeyọt.+ Ụmụ ya ndị ọzọ bụ Kida,+ Adbiel, Mibsam,+ 14 Mishma, Duma, Masa, 15 Hedad, Tima, Jitọ, Nefish, na Kedema. 16 Ọ bụ ha bụ ụmụ Ishmel, ọ bụkwa ihe a bụ aha ha n’ọnụmara n’ọnụmara nakwa n’ebe ha mara ụlọikwuu ha. Ha dị ndị isi iri na abụọ. Onye nke ọ bụla nwere ọnụmara nke ya.+ 17 Ishmel dịrị ndụ otu narị afọ na iri atọ na asaa (137). O wee kubie ume nwụọ, e lie ya otú e liri ndị nna nna ya. 18 Ụmụ ya wee biri malite na Havila+ n’akụkụ Shọọ,+ bụ́ ebe dị nso n’Ijipt, ruo Asiria. Ha bi ụmụnne ha niile nso.*+

19 Ihe a bụ akụkọ ndụ Aịzik nwa Ebreham.+

Ebreham mụrụ Aịzik. 20 Aịzik dị afọ iri anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka nwa Betuel+ onye Eram* nke dị na Padan-eram. Ribeka bụ nwanne Leban onye Eram. 21 Aịzik nọ na-arịọsi Jehova arịrịọ ike maka nwunye ya, n’ihi na ọ bụ nwaanyị aga. Jehova nụrụ arịrịọ ya, Ribeka nwunye ya wee dị ime. 22 Ụmụ o bu n’afọ malitere ịgba mgba,+ ya asị: “Ọ bụrụ otú a ka ọ na-adị, ànọ m ndụ eme gịnị?” O wee kpee ekpere jụọ Jehova ihe mere ihe a ji na-eme. 23 Jehova sịrị ya: “Mba abụọ nọ gị n’afọ,+ mba abụọ ga-esikwa n’afọ gị pụta.+ Otu mba ga-aka mba nke ọzọ ike,+ nke okenye ga-ejekwara nke nwata ozi.”+

24 Mgbe oge ọ ga-amụ nwa ruru, ọ mụrụ ejima. 25 Mgbe nwa nke mbụ pụtara, ahụ́ ya niile na-acha ọbara ọbara, ajị jukwara ya ahụ́.+ Ha wee gụọ ya Ịsọ.*+ 26 Mgbe nwa nke abụọ na-apụta, o jidere Ịsọ nwanne ya aka n’ikiri ụkwụ.+ Aịzik wee gụọ ya Jekọb.*+ Aịzik dị afọ iri isii mgbe Ribeka mụrụ ha.

27 Mgbe ụmụaka ahụ na-eto, Ịsọ ghọrọ dinta,+ nwoke na-aga n’ọhịa. Ma Jekọb bụ nwoke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, onye bi n’ụlọikwuu.+ 28 Aịzik hụrụ Ịsọ n’anya maka na ọ na-egbutere ya anụ ọ na-ata, ma Ribeka hụrụ Jekọb n’anya.+ 29 Otu mgbe, Jekọb nọ na-esi ofe mgbe Ịsọ si n’ọhịa lọta, ike gwụkwara ya. 30 Ịsọ wee sị Jekọb: “Biko, kunyetụ m ofe a na-acha ọbara ọbara ngwa ngwa, n’ihi na ike gwụrụ m.” Ọ bụ ya mere aha ya ji bụrụ Ịdọm.*+ 31 Jekọb wee sị ya: “Buru ụzọ nyefee m ihe i kwesịrị inweta dị ka ọkpara.”+ 32 Ịsọ wee sị ya: “Ị̀ hụkwara na agụụ na-achọ ịgụgbu m? Olee uru ọ baara m na m bụ ọkpara?” 33 Jekọb sịziri ya: “Buru ụzọ ṅụọrọ m iyi.” O wee ṅụọrọ ya iyi ma kwuo na ya enyefeela ya ihe o kwesịrị inweta dị ka ọkpara.+ 34 Jekọb wee nye Ịsọ achịcha ma kunye ya ofe lentil,* ya erie, ṅụọ ma bilie pụọ. Ịsọ si otú a gosi na o jighị ọkpara ọ bụ kpọrọ ihe.

26 Ụnwụ dara n’ala ahụ. Ụnwụ a abụghị nke mbụ ahụ dara n’oge Ebreham nọ ndụ.+ N’ihi ya, Aịzik gakwuuru Abimelek n’obodo Gira. Abimelek bụ eze ndị Filistia. 2 Jehova wee pụta n’ihu Aịzik, sị ya: “Agala Ijipt. Biri n’ala m ga-egosi gị. 3 Bụrụ onye mbịarambịa n’ala a.+ M ga-anọnyere gị ma gọzie gị n’ihi na ọ bụ gị na ụmụ* gị ka m ga-enye ala a niile.+ M ga-emezu iyi a m ṅụụrụ Ebreham nna gị:+ 4 ‘M ga-eme ka ụmụ* gị dị ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe,+ m ga-enyekwa ụmụ* gị ala a niile.+ A ga-esi n’aka nwa* gị gọzie mba niile dị n’ụwa.’+ 5 M ga-eme ihe ndị a maka na Ebreham gere m ntị, rubere m isi, debe iwu m ma soro ntụziaka m.”+ 6 Aịzik wee biri na Gira.+

7 Ọ na-abụ ụmụ nwoke obodo ahụ jụọ ya banyere nwunye ya, ọ na-asị ha: “Ọ bụ nwanne m nwaanyị.”+ Egwu na-atụ ya ịsị ha na ọ bụ nwunye ya, n’ihi na ọ sịrị, “Ụmụ nwoke obodo a nwere ike igbu m n’ihi Ribeka,” maka na ọ mara mma.+ 8 Mgbe obere oge gafere, Abimelek, eze ndị Filistia, si na windo na-elepụ anya, o wee hụ ka Aịzik na Ribeka nwunye ya na-egwuri egwu.*+ 9 Ozugbo ahụ, Abimelek kpọrọ Aịzik, sị ya: “Nwaanyị a bụ nwunye gị. Gịnị mere i ji sị na ọ bụ nwanne gị nwaanyị?” Aịzik sịrị ya: “M kwuru otú ahụ ka a ghara igbu m n’ihi ya.”+ 10 Ma Abimelek sịrị ya: “Gịnị bụ ihe a i mere anyị?+ A sị na otu n’ime ndị obodo m gara dinaa nwunye gị, anyị gaara abụ ndị ikpe mara.”+ 11 Abimelek wee nye ndị obodo ya niile iwu, sị: “Onye ọ bụla metụrụ nwoke a na nwunye ya aka, a ga-egbu ya!”

12 Aịzik malitere ịgha mkpụrụ n’ala ahụ. N’afọ ahụ, ihe o nwetara n’ubi bụ okpukpu otu narị (100) mkpụrụ ọ ghara, maka na Jehova nọ na-agọzi ya.+ 13 Nwoke ahụ wee baa ọgaranya, ihe nọkwa na-agaziri ya ruo mgbe ọ ghọrọ nnukwute ọgaranya. 14 O nwetara ọtụtụ ìgwè atụrụ na ìgwè ehi nakwa ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi.+ Ndị Filistia wee malite inwere ya anyaụfụ.

15 N’ihi ya, ndị Filistia kpooro ájá kpochie olulu mmiri niile ndị na-ejere Ebreham nna ya ozi gwuru n’oge Ebreham nọ ndụ.+ 16 Abimelek wee sị Aịzik: “Si n’ógbè anyị kwapụ, n’ihi na ị kazi anyị ike.” 17 N’ihi ya, Aịzik si n’ebe ahụ kwapụ gaa maa ụlọikwuu na ndagwurugwu Gira+ ma birizie n’ebe ahụ. 18 Aịzik gwughachiri olulu mmiri ndị ahụ e gwuru n’oge Ebreham nna ya nọ ndụ, ya bụ, olulu mmiri ndị ahụ ndị Filistia kpochiri mgbe Ebreham nwụchara.+ Ọ kpọkwara olulu mmiri ndị ahụ aha nna ya kpọburu ha.+

19 Mgbe ndị na-ejere Aịzik ozi nọ na-egwu olulu na ndagwurugwu ahụ, ha hụrụ olulu mmiri nke mmiri ya dị mma. 20 Ndị na-azụ atụrụ na Gira sesawara ndị na-azụrụ Aịzik atụrụ okwu. Ha sịrị: “Ọ bụ anyị nwe mmiri a!” N’ihi ya, Aịzik kpọrọ olulu mmiri ahụ Isek,* maka na ha sesara ya okwu. 21 Ha malitere igwu olulu mmiri ọzọ, ha amalitekwa isere ya okwu. N’ihi ya, Aịzik kpọrọ ya Sitna.* 22 Mgbe e mechara, o si ebe ahụ kwapụ gaa ebe ọzọ ma gwuo olulu mmiri ọzọ. Ma ha esereghị ya okwu. N’ihi ya, ọ kpọrọ ya Rehobọt* ma sị: “Ọ bụ maka na Jehova enyela anyị ebe sara mbara, meekwa ka anyị mụọ ọmụmụ n’ala a.”+

23 O wee si n’ebe ahụ gaa Bia-shiba.+ 24 N’abalị ahụ, Jehova pụtara n’ihu ya, sị ya: “Abụ m Chineke Ebreham nna gị.+ Atụla egwu,+ n’ihi na m nọnyeere gị. M ga-agọzi gị ma mee ka ụmụ* gị dị ọtụtụ n’ihi Ebreham ohu m.”+ 25 Aịzik wee rụọ ebe ịchụàjà n’ebe ahụ ma kpọkuo aha Jehova.+ Ọ mara ụlọikwuu ya n’ebe ahụ,+ ndị na-ejere ya ozi gwukwara olulu mmiri n’ebe ahụ.

26 Mgbe e mechara, Abimelek si na Gira bịakwute ya, ya na Ahọzat onye ndụmọdụ ya nakwa Faịkọl onyeisi ndị agha ya.+ 27 Aịzik sịrị ha: “Gịnị mere unu ji bịakwute m ebe ọ bụ na unu kpọrọ m asị wee chụpụ m n’ógbè unu?” 28 Ha wee sị ya: “O doola anyị anya na Jehova nọnyeere gị.+ Ọ bụ ya mere anyị ji kpebie na anyị ga-agwa gị, sị, ‘Biko, ka anyị na gị ṅụọ iyi, ka anyị na gị gbaakwa ndụ+ 29 na ị gaghị eme anyị ihe ọjọọ ọ bụla otú ahụ anyị na-emeghị gị ihe ọjọọ, ebe ọ bụ naanị ihe ọma ka anyị meere gị wee hapụ gị ka ị lawa n’udo. Ị bụ onye Jehova gọziri agọzi.’” 30 O wee meere ha oriri. Ha wee rie nri, ṅụọkwa mmanya. 31 Ha biliri n’isi ụtụtụ ṅụọrọ ibe ha iyi.+ Mgbe e mechara, Aịzik hapụrụ ha ka ha lawa. Ha wee si n’ebe ahụ lawa n’udo.

32 N’ụbọchị ahụ, ndị na-ejere Aịzik ozi bịara kọọrọ ya banyere olulu mmiri ha gwuru.+ Ha sịrị ya: “Anyị egwutela mmiri!” 33 N’ihi ya, ọ kpọrọ ya Shaịba. Ọ bụ ya mere aha obodo ahụ ji bụrụ Bia-shiba+ ruo taa.

34 Mgbe Ịsọ dị afọ iri anọ, ọ lụrụ Judit nwa Beiraị onye Het, lụọkwa Basemat nwa Ịlọn onye Het.+ 35 Ihe ụmụ nwaanyị a na-eme nọ na-agbawa Aịzik na Ribeka obi.+

27 Mgbe Aịzik mere agadi, mgbe ọ na-anaghịkwa ahụcha ụzọ, ọ kpọrọ Ịsọ+ nwa ya nke okenye, sị ya: “Nwa m.” Ya azaa ya, sị: “Ee, nna m.” 2 Ọ gwara ya, sị: “Emeela m agadi. Amaghị m ụbọchị m ga-anwụ. 3 Ugbu a, biko, were ihe i ji achụ nta, akpa akụ́ gị na ụta gị, gaa n’ọhịa gbatara m anụ.+ 4 Siere m ụdị nri dị ụtọ na-amasị m, butekwara m ya. M ga-eri ya ma gọzie gị tupu mụ anwụọ.”

5 Ma, Ribeka nọ na-ege ntị mgbe Aịzik nọ na-agwa Ịsọ nwa ya okwu. Ịsọ wee gawa n’ọhịa ka ọ gaa gbute anụ bulata.+ 6 Ribeka gwara Jekọb nwa ya,+ sị: “M ka nụrụ ka nna gị na-agwa Ịsọ nwanne gị, sị, 7 ‘Gbutere m anụ, siere m nri dị ụtọ. M ga-eri ya ma gọzie gị n’ihu Jehova tupu mụ anwụọ.’+ 8 Ugbu a, nwa m, gee m ntị nke ọma ma mee ihe m na-agwa gị.+ 9 Biko, gaa n’ebe ìgwè anụ ụlọ nọ kpụtara m ụmụ ewu abụọ kacha mma, ka m were ha siere nna gị nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị ya. 10 Ị ga-ebugara ya nna gị ka o rie, ka o wee gọzie gị tupu ya anwụọ.”

11 Jekọb sịrị Ribeka nne ya: “Ahụ́ Ịsọ nwanne m bụ ajị ajị,+ ma ahụ́ m na-akwọ mụrụmụrụ. 12 Ọ bụrụkwanụ na nna m emetụ m aka n’ahụ́?+ Ọ ga-adịzi ka m̀ na-akwa ya emo, ya emezie ka ọ bụọ m ọnụ kama ịgọzi m.” 13 Nne ya wee sị ya: “Nwa m, ka ọnụ a ga-abụ gị mezuo n’isi m. Naanị mee ihe m kwuru ma gaa kpụtara m ha.”+ 14 O wee gaa kpụrụ ha kpụtara nne ya. Nne ya ji ha sie nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị nna ya. 15 Mgbe Ribeka sichara, ọ chịịrị ọmarịcha uwe Ịsọ nwa ya nke okenye, nke o dowere n’ụlọ, yiwe Jekọb nwa ya nke nta.+ 16 O wekwaara akpụkpọ ụmụ ewu ahụ kee ya n’aka nakwa n’ebe ajị na-adịghị n’olu ya.+ 17 O wee bunye Jekọb nwa ya nri ahụ dị ụtọ na achịcha o mere.+

18 O wee bakwuru nna ya, sị ya: “Nna m.” Ya azaa ya, sị: “Ee, nwa m, ị̀ bụ onye?” 19 Jekọb sịrị nna ya: “Abụ m ọkpara gị Ịsọ.+ Emeela m ihe ị gwara m. Biko, bilie, nọrọ ọdụ rie anụ m gbutere, ka i* wee gọzie m.”+ 20 Aịzik jụziri nwa ya, sị: “Nwa m, olee otú i si hụ ya ọsọ ọsọ otú a?” Ọ zara ya, sị: “N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị nyeere m aka mụ ahụ ya.” 21 Aịzik wee sị Jekọb: “Nwa m, biko, bịa nso ka m metụ gị aka, ka m mara ma ị̀ bụ nwa m Ịsọ n’eziokwu ka ọ̀ bụ na ị bụghị.”+ 22 Jekọb wee bịa Aịzik nna ya nso, ya emetụ ya aka. Ọ sịziri: “Olu a bụ olu Jekọb, ma aka a bụ aka Ịsọ.”+ 23 Ọ mataghị na ọ bụ Jekọb maka na aka ya dị ajị ajị ka aka Ịsọ nwanne ya. N’ihi ya, ọ gọziri ya.+

24 O mechara jụọ ya, sị: “Ị̀ bụ nwa m Ịsọ n’eziokwu?” ya asị: “Ee, abụ m.” 25 O wee sị ya: “Nwa m, butere m anụ i gbutere ka m rie wee gọzie gị.” O buteere ya anụ ahụ, ya erie. O butekwaara ya mmanya, ya aṅụọ. 26 Aịzik nna ya wee sị ya: “Nwa m, biko, bịa nso susuo m ọnụ.” + 27 Ọ bịara nso susuo ya ọnụ, ya anụ ísìsì uwe ya.+ O wee gọzie ya, sị:

“Lee, ísìsì nwa m dị ka ísìsì nke ọhịa Jehova gọziri agọzi. 28 Ka ezi Chineke nye gị igirigi nke eluigwe+ nakwa ala nke na-eme nri,+ ka o nyekwa gị ọka* na mmanya ọhụrụ n’ụba.+ 29 Ka ndị dị iche iche jeere gị ozi, ka mba dị iche iche kpọọkwara gị isiala. Bụrụ onyeisi ụmụnne gị, ka ụmụnne gị kpọọkwara gị isiala.+ Ka onye ọ bụla bụrụ gị ọnụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ, ka onye ọ bụla gọziri gị bụrụkwa onye a gọziri agọzi.”+

30 Mgbe Aịzik gọzichara nnọọ Jekọb, Jekọb esi n’ebe Aịzik nna ya nọ pụta, Ịsọ nwanne ya si ịchụ nta lọta.+ 31 Ịsọ siri nri dị ụtọ ma butere ya nna ya. Ọ sịrị nna ya: “Nna m, bilie rie anụ nwa gị gbutere, ka i* wee gọzie m.” 32 Aịzik nna ya jụrụ ya, sị: “Ị̀ bụ onye?” ya azaa ya, sị: “Abụ m Ịsọ nwa gị, ọkpara gị.”+ 33 Aịzik malitere ịma jijiji nke ukwuu, ọ sịrị: “Ònyekwanụ gbutere anụ wetara m? M richaala ya tupu gị abata. M gọziri ya, ọ ga-abụkwa onye a gọziri agọzi!”

34 Mgbe Ịsọ nụrụ ihe nna ya kwuru, ọ malitere ibe ákwá ma na-etisi mkpu ike, sị nna ya: “Gọzie m, nna m, gọziekwa mụnwa!”+ 35 Ma ọ sịrị ya: “Nwanne gị nwoke ji aghụghọ bịa nara ngọzi ị gaara enweta.” 36 Ịsọ wee sị: “Ọ̀ bụ na ọ bụghị ya mere e ji gụọ ya Jekọb,* ka o wee napụ m ihe ruuru m ugboro abụọ a?+ Ọ narala m ihe m kwesịrị inweta dị ka ọkpara.+ Ugbu a, ọ narakwala ngọzi m.”+ Ọ sịkwara: “Ọ̀ bụ na e nweghị ngọzi i doweere m?” 37 Ma Aịzik zara Ịsọ, sị: “Lee, emeela m ya onyeisi gị.+ Ekwuola m na ụmụnne ya niile ga-abụ ndị na-ejere ya ozi nakwa na ọ ga-enwe ọka* na mmanya ọhụrụ n’ụba.+ Nwa m, olee ihe fọrọnụ m ga-emere gị?”

38 Ịsọ sịrị nna ya: “Nna m, ọ̀ bụ naanị otu ngọzi ka i nwere? Gọzie m, nna m, gọziekwa mụnwa!” Ịsọ wee besiwe ákwá ike.+ 39 Aịzik nna ya sịziri ya:

“Lee, ị ga-ebi n’ala na-anaghị eme nri, igirigi nke eluigwe agaghịkwa na-adara gị.+ 40 Ị ga na-ebu mma agha gị n’oge niile ị nọ ndụ,+ ị ga-ejekwara nwanne gị nwoke ozi.+ Ma, mgbe ọ na-ekweghịzi gị odidi, ị ga-akwụsị ịgbara ya ohu.”*+

41 Ma, Ịsọ buuru Jekọb iwe n’obi maka na ọ bụ Jekọb ka nna ya gọziri.+ Ịsọ nọ na-asị n’obi ya: “Oge a ga-eru uju nna m na-eru nso.+ E mechaa, m ga-egbu Jekọb nwanne m nwoke.” 42 Mgbe a kọọrọ Ribeka ihe Ịsọ nwa ya nke okenye kwuru, o ziri ozi ozugbo kpọọ Jekọb nwa ya nke nta ma sị ya: “Ịsọ nwanne gị na-akpa nkata igbu gị ka o wee megwara gị ihe i mere ya. 43 Nwa m, ngwa mee ihe m na-agwa gị. Bilie, gbaga na nke Leban nwanne m nwoke n’obodo Heran.+ 44 Biri na nke ya ruo mgbe ọnụma nwanne gị nwoke dajụrụ, 45 ruo mgbe obi ga-ajụrụ nwanne gị nwoke, ya echefuokwa ihe i mere ya. M ga-ezizi gị ozi ka ị lọta. Gịnị mere m ga-eji gbara aka unu abụọ n’otu ụbọchị?”

46 Mgbe e mechara, Ribeka nọ na-agwa Aịzik, sị: “Ụmụ nwaanyị Het a emeela ka ike ndụ gwụ m.+ Ọ bụrụ na Jekọb anwaa anwaa lụta otu n’ime ụmụ nwaanyị Het, dị ka ụmụ nwaanyị a bụ́ ndị obodo a, olee uru ndụ m baara m?”+

28 Aịzik wee kpọọ Jekọb gọzie ya ma nye ya iwu, sị: “Alụla nwaanyị Kenan.+ 2 Gaa Padan-eram, n’ụlọ Betuel nna mama gị, ma lụọ otu n’ime ụmụ Leban,+ nwanne mama gị. 3 Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ga-agọzi gị, mee ka ị mụọ ọmụmụ ma mụbaa. Ị ga-aghọkwa nnukwu mba.+ 4 Ọ ga-agọzi gị na ụmụ* gị otú ọ gọziri Ebreham,+ ka i wee nweta ala Chineke kwere Ebreham ná nkwa, bụ́ ebe ị bụ onye mbịarambịa.”+

5 Aịzik zipụrụ Jekọb, ya agawa Padan-eram, na nke Leban nwa Betuel onye Eram.*+ Leban bụ nwanne Ribeka+ nne Jekọb na Ịsọ.

6 Ịsọ hụrụ na Aịzik agọziela Jekọb ma ziga ya Padan-eram ka ọ gaa lụrụ nwaanyị n’ebe ahụ nakwa na mgbe ọ gọziri ya, o nyere ya iwu, sị: “Alụla nwaanyị Kenan.”+ 7 Ọ hụkwara na Jekọb rubeere nne na nna ya isi ma gawa Padan-eram.+ 8 Ịsọ ghọtaziri na Aịzik nna ya enweghị mmasị n’ụmụ nwaanyị Kenan.+ 9 N’ihi ya, Ịsọ gara n’ezinụlọ Ishmel lụrụ Mehalat nwa Ishmel nwa Ebreham. Mehalat bụ nwanne nwaanyị Nebeyọt. Ịsọ lụrụ ya n’elu ụmụ nwaanyị ndị nke ọ lụrụla.+

10 Jekọb si na Bia-shiba gawa Heran.+ 11 Mgbe e mechara, o rutere otu ebe ma kpebie na ọ ga-arahụ n’ebe ahụ maka na chi ejiwela. O buuru otu n’ime nkume ndị dị n’ebe ahụ ka o jiri ya hiwe isi. O wee dinara n’ebe ahụ.+ 12 Ọ rọwara nrọ. Ná nrọ ahụ, ọ hụrụ steepụ* si n’ụwa ruo n’eluigwe. Ọ hụkwara ka ndị mmụọ ozi Chineke nọ na-agbago ma na-agbadata na ya.+ 13 Jehova guzokwa n’elu elu steepụ ahụ wee sị:

“Abụ m Jehova Chineke Ebreham nna gị na Chineke Aịzik.+ Ọ bụ gị na ụmụ* gị ka m ga-enye ala a i dina na ya.+ 14 Ụmụ* gị ga-adị ọtụtụ ka ájá dị n’ala.+ Ụmụ* gị ga-amụba ruo n’ebe ọdịda anyanwụ, ruo n’ebe ọwụwa anyanwụ, ruo n’ebe ugwu nakwa n’ebe ndịda. A ga-esikwa n’aka gị na ụmụ* gị gọzie ezinụlọ niile dị n’ụwa.+ 15 M nọnyeere gị. M ga-echebe gị n’ebe ọ bụla ị na-aga, m ga-akpọghachikwa gị n’ala a.+ Agaghị m ahapụ gị ruo mgbe m mere ihe m kwere gị ná nkwa.”+

16 Jekọb wee teta n’ụra, sị: “N’eziokwu, Jehova nọ n’ebe a, ma amaghị m.” 17 Ụjọ wee jide ya, ya asị: “Ebe a dị egwu! Ebe a ga-abụrịrị ụlọ Chineke,+ ihe a bụkwa ọnụ ụzọ ámá eluigwe.”+ 18 Jekọb biliziri n’isi ụtụtụ buru nkume ahụ o ji hiwe isi ma kwụwa ya ka ọ bụrụ ogidi, ọ wụsakwara mmanụ n’elu ya.+ 19 O wee kpọọ ebe ahụ Betel,* ma aha obodo ahụ bụbu Lọz.+

20 Jekọb wee kwe nkwa, sị: “Ọ bụrụ na Chineke anọnyere m ma chebe m n’ihe a m na-eje ma nye m nri m ga-eri nakwa uwe m ga-eyi, 21 ọ bụrụkwa na mụ alọta n’ụlọ nna m n’udo, ọ pụtara na Jehova egosila m na ọ bụ Chineke m. 22 Nkume a m kwụwara ka ọ bụrụ ogidi ga-abụ ụlọ Chineke,+ m ga-enyekwa gị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ọ bụla ị ga-enye m.”

29 Mgbe e mechara, Jekọb bidokwara ije ya ma gawa n’ala ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ. 2 N’ebe ahụ, ọ hụrụ otu olulu mmiri nke dị n’ọhịa, hụkwa ka ìgwè atụrụ atọ makpu n’akụkụ olulu mmiri ahụ maka na ọ bụ n’olulu mmiri ahụ ka ndị na-azụ atụrụ si enweta mmiri ha na-enye ìgwè anụ ha. E nwere nnukwu nkume e ji dọchie ọnụ olulu mmiri ahụ. 3 Ọ na-abụ a chịkọtachaa ìgwè anụ niile n’ebe ahụ, ndị na-azụ atụrụ na-akwapụ nkume ahụ e ji dọchie ọnụ olulu mmiri ahụ ma nye ìgwè anụ ha mmiri. Ha ṅụchaa, ndị na-azụ atụrụ na-akwaghachi nkume ahụ n’ọnụ olulu mmiri ahụ.

4 Jekọb sịrị ha: “Ụmụnne m, ebee ka unu si?” Ha sịrị ya: “Anyị si Heran.”+ 5 O wee jụọ ha, sị: “Ùnu ma Leban+ nwa nwa Nehọ?”+ ha asị ya: “Anyị ma ya.” 6 O wee jụọ ha, sị: “Ahụ́ ọ̀ dịkwa ya?” Ha sịrị ya: “Ahụ́ dị ya. Lekwa Rechel nwa ya+ ka o du atụrụ na-abịa.” 7 Ọ sịziri ha: “Ihe a ka bụ ehihie. Oge e ji achịkọta anụ ụlọ erubeghị. Nyenụ atụrụ ndị a mmiri, unu akpọrọzie ha gaa ebe ha ga-ata ahịhịa.” 8 Ha wee sị ya: “A naghị ekwe ka anyị mee otú ahụ ruo mgbe a chịkọtachara ìgwè anụ niile, a kwapụzie nkume n’ọnụ olulu mmiri. Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị ga-enye atụrụ mmiri.”

9 Ka ha na Jekọb nọ na-ekwu okwu, Rechel du atụrụ nna ya bịa, maka na ọ bụ nwaanyị na-azụ atụrụ. 10 Mgbe Jekọb hụrụ Rechel nwa Leban nwanne mama ya nakwa atụrụ Leban, Jekọb gara ozugbo kwapụ nkume ahụ e ji dọchie ọnụ olulu mmiri ahụ ma nye atụrụ Leban nwanne mama ya mmiri. 11 Jekọb susuru Rechel ọnụ* ma bewe ezigbo ákwá. 12 Jekọb wee gwawa Rechel na ya bụ onye ikwu* nna ya nakwa na ya bụ nwa Ribeka. Rechel gbaara ọsọ gaa kọọrọ nna ya.

13 Ozugbo Leban+ nụrụ banyere Jekọb nwa nwanne ya nwaanyị, ọ gbaara ọsọ gakwuru ya n’ebe ọ nọ. Ọ makụrụ ya, susuo ya ọnụ* ma kpọbata ya n’ụlọ ya. Jekọb wee kọọrọ Leban ihe niile merenụ. 14 Leban sịrị ya: “N’eziokwu, mụ na gị bụ otu ọbara.”* Ya na ya wee bie otu ọnwa zuru ezu.

15 Leban sịziri Jekọb: “Ị̀ ga-ejere m ozi n’efu naanị maka na ị bụ onye ikwu* m?+ Gwa m ihe m ga-eji kwụọ gị ụgwọ?”+ 16 Leban mụrụ ụmụ nwaanyị abụọ. Aha nke okenye bụ Lia, aha nke nta abụrụ Rechel.+ 17 Anya Lia amaghị mma, ma Rechel mara mma ahụ́, maakwa mma ihu. 18 Jekọb hụrụ Rechel n’anya. N’ihi ya, ọ sịrị: “Achọrọ m ijere gị ozi afọ asaa maka Rechel nwa gị nwaanyị nke nta.”+ 19 Leban wee sị ya: “Ọ kaara m mma ịkpọnye gị ya kama ịkpọnye ya nwoke ọzọ. Biri n’ụlọ m.” 20 Jekọb wee jeere Leban ozi afọ asaa maka Rechel.+ Ma n’anya ya, ọ dị ka ụbọchị ole na ole n’ihi otú o si hụ Rechel n’anya.

21 Jekọb sịziri Leban: “Kpọnye m nwunye m n’ihi na oge anyị kwuru ezuola, ka mụ na ya nwee mmekọahụ.” 22 Leban wee kpọkọta ndị* niile bi n’ebe ahụ ma mee oriri. 23 Ma ná mgbede, ọ kpọọrọ ada ya Lia kpọgara Jekọb ka ya na ya nwee mmekọahụ. 24 Leban kpọkwaara Zilpa, bụ́ nwaanyị na-ejere ya ozi, kpọnye Lia ka o jewere ya ozi.+ 25 N’ụtụtụ, Jekọb hụrụ na ọ bụ Lia ka a kpọnyere ya. N’ihi ya, ọ sịrị Leban: “Gịnị bụkwanụ ihe a i mere m? Ọ̀ bụ na ọ bụghị maka Rechel ka m ji jeere gị ozi? Gịnịzi mere i ji ghọọ m aghụghọ?”+ 26 Leban wee sị ya: “N’omenala anyị, a naghị ebu ụzọ eke nwa agbọghọ nke nta di tupu nke ada. 27 Mechagodị ememme e kwesịrị imere Lia n’izu a. E mechaa, a ga-akpọnyekwu gị nwanne ya nwaanyị maka ozi ị ga-ejere m afọ asaa ọzọ.”+ 28 Jekọb mere otú ahụ. O meere Lia ememme e kwesịrị imere ya n’izu ahụ. Mgbe e mechara, Leban kpọnyere ya Rechel nwa ya ka ọ bụrụ nwunye ya. 29 Leban kpọkwaara Bilha,+ bụ́ nwaanyị na-ejere ya ozi, kpọnye Rechel nwa ya ka o jewere ya ozi.+

30 Jekọb na Rechel nwekwara mmekọahụ. O wee hụ Rechel n’anya karịa Lia, o jekwaara Leban ozi afọ asaa ọzọ.+ 31 Mgbe Jehova hụrụ na Jekọb ahụghị Lia n’anya,* o mere ka o nwee ike ịdị ime.*+ Ma Rechel bụ nwaanyị aga.+ 32 Lia wee dị ime ma mechaa mụọ nwa nwoke. Ọ gụrụ ya Ruben*+ maka na ọ sịrị: “Ọ bụ maka na Jehova ahụla nsogbu m nọ na ya,+ n’ihi na di m ga-ebidozi hụwa m n’anya.” 33 O wee dị ime ọzọ mụọ nwa nwoke ma sị: “Ọ bụ maka na Jehova egeela m ntị wee nyekwa m nwa a maka na di m ahụghị m n’anya.” Ọ gụrụ ya Simiọn.*+ 34 Ọ dịkwara ime ọzọ ma mụọ nwa nwoke wee sị: “Ugbu a, di m ga-arapara m n’ahụ́ maka na m mụọrọla ya ụmụ nwoke atọ.” N’ihi ya, a gụrụ ya Livaị.*+ 35 O wee dị ime ọzọ mụọ nwa nwoke ma sị: “Ugbu a, m ga-eto Jehova.” N’ihi ya, ọ gụrụ ya Juda.*+ Mgbe ọ mụchara ya, ọ kwụsịrị ịmụ nwa.

30 Mgbe Rechel hụrụ na ya amụtaghịrị Jekọb nwa, Rechel malitere imere nwanne ya nwaanyị anyaụfụ. O wee malite ịsị Jekọb: “Nye m nwa, ma ọ́ bụghị ya, m ga-anwụ.” 2 Jekọb wee weso Rechel nnukwu iwe ma sị ya: “Àbụ m Chineke, onye mere ka ị ghara ịmụta nwa?”* 3 Rechel wee sị: “Lekwa Bilha ohu m nwaanyị.+ Gị na ya nwee mmekọahụ ka ọ mụtara m nwa,* ka m wee si n’aka ya nweta ụmụ.” 4 Ọ kpọnyeziri Jekọb Bilha bụ́ nwaanyị na-ejere ya ozi ka ọ bụrụ nwunye ya, ya na Jekọb wee nwee mmekọahụ.+ 5 Bilha wee dịrị ime, mechaa mụọrọ Jekọb nwa nwoke. 6 Rechel wee sị: “Chineke ekpeerela m ikpe. O geela m ntị, nke mere na o nyere m nwa nwoke.” Ọ bụ ya mere o ji gụọ ya Dan.*+ 7 Bilha, nwaanyị na-ejere Rechel ozi, wee dịrị ime ọzọ, mechaa mụọrọ Jekọb nwa nwoke nke abụọ. 8 Rechel wee sị: “Mụ na nwanne m nwaanyị agbaala ezigbo mgba. Emeriekwala m ya.” O wee gụọ ya Naftalaị.*+

9 Mgbe Lia hụrụ na ya akwụsịla ịmụ nwa, ọ kpọọrọ Zilpa, bụ́ nwaanyị na-ejere ya ozi, kpọnye Jekọb ka ọ bụrụ nwunye ya.+ 10 Zilpa, bụ́ nwaanyị na-ejere Lia ozi, wee mụọrọ Jekọb nwa nwoke. 11 Lia wee sị: “Ihe ọma adabarala m.” O wee gụọ ya Gad.*+ 12 Zilpa, bụ́ nwaanyị na-ejere Lia ozi, mechara mụọrọ Jekọb nwa nwoke nke abụọ. 13 Lia wee sị: “Obi atọgbuola m! N’ihi na ụmụ nwaanyị ga-akpọ m onye obi ụtọ.”+ O wee gụọ ya Asha.*+

14 N’oge a na-ewe ọka wit n’ubi, Ruben+ nọ na-agagharị, o wee hụ mkpụrụ mandrek* n’ubi. Ọ chịtaara ha Lia nne ya. Rechel wee sị Lia: “Biko, nye m ụfọdụ n’ime mkpụrụ mandrek nwa gị wetara.” 15 Lia sịrị ya: “Ọ̀ bụ na di m ị naara m ezubereghị gị?+ Ị̀ chọkwuru ịnara m mkpụrụ mandrek nwa m wetara?” Rechel wee sị ya: “Nsogbu adịghị. Gị na Jekọb ga-edina n’abalị a ka m jiri ya kwụọ gị ụgwọ mkpụrụ mandrek nwa gị wetara.”

16 Mgbe Jekọb si n’ọhịa na-alọta ná mgbede, Lia gakwuuru ya ma sị ya: “Ọ bụ mụ na gị ga-enwe mmekọahụ, n’ihi na ejirila m mkpụrụ mandrek nwa m wetara gobie gị.” Ya na ya wee dinaa n’abalị ahụ. 17 Chineke nụrụ olu Lia ma za ya. O wee dị ime, mechaa mụọrọ Jekọb nwa nwoke nke ise. 18 Lia wee sị: “Chineke akwụọla m ụgwọ ọrụ m* maka na m kpọnyere di m nwaanyị na-ejere m ozi.” O wee gụọ ya Ịsaka.*+ 19 Lia wee dị ime ọzọ, mechaa mụọrọ Jekọb nwa nwoke nke isii.+ 20 Lia sịziri: “Chineke enyela m ezigbo onyinye. N’ikpeazụ, di m ga-anabata m,+ n’ihi na amụọrọla m ya ụmụ nwoke isii.”+ O wee gụọ ya Zebulọn.*+ 21 Lia mechara mụọ nwa nwaanyị ma gụọ ya Daịna.+

22 N’ikpeazụ, Chineke chetara Rechel. Chineke wee nụ olu ya, za ya ekpere ma mee ka o nwee ike ịdị ime.*+ 23 O wee dị ime mụọ nwa nwoke, sị: “Chineke ewepụla nkọcha a na-akọcha m.”+ 24 O wee gụọ ya Josef,*+ sị: “Jehova enyela m nwa nwoke ọzọ.”

25 Mgbe Rechel mụchara Josef, Jekọb gwara Leban ozugbo, sị: “Hapụ m ka m laa n’ụlọ m, n’obodo m.+ 26 Kpọnye m ndị nwunye m na ụmụ m, ndị m ji maka ha jeere gị ozi, ka m kpọrọ ha laa, n’ihi na ị ma na m ji obi m niile jeere gị ozi.”+ 27 Leban wee sị ya: “Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị,—ihe àmà* egosila m na Jehova na-agọzi m n’ihi gị.” 28 O kwukwara, sị: “Gwa m ihe m ga-eji kwụọ gị ụgwọ ọrụ, m ga-enyekwa gị ya.”+ 29 Jekọb sịrị ya: “Ị ma otú m si jiri obi m niile jeere gị ozi na otú m si lekọta ìgwè anụ gị nke ọma.+ 30 E nweghị oké ihe i nwere tupu mụ abịa, ma ìgwè anụ gị amụbaala, dịkwa ọtụtụ, Jehova agọziekwala gị kemgbe m bịara. Oleekwanụ mgbe m ga-emere ndị ezinụlọ nke m ihe?”+

31 Leban wee sị ya: “Gịnị ka m ga-enye gị?” Jekọb sịrị ya: “Enyela m ihe ọ bụla. M ka ga na-azụrụ gị ìgwè anụ gị ma na-elekọta ha ma i meere m ihe a.+ 32 Anyị ga-aga leruo ìgwè anụ gị niile anya taa. Kpụrụ atụrụ ọ bụla tụrụ àgwà na nke nwere ụcha dị iche iche na ebule ọ bụla na-acha nchara nchara nakwa nne ewu ọ bụla tụrụ àgwà na nke nwere ụcha dị iche iche. Si ugbu a gawa, nke ọ bụla ga-adị otú ahụ ga-abụzi ụgwọ ọrụ m.+ 33 Ụbọchị ọ bụla ị ga-abịa ileru ụgwọ ọrụ m anya, ị ga-ahụ na m bụ onye ezi omume.* Ọ bụrụ na ị hụ na m nwere nne ewu na-atụghị àgwà na nke na-enweghị ụcha dị iche iche nakwa ebule na-anaghị acha nchara nchara, mara na m zuru ya ezu.”

34 Leban wee sị: “Ọ dị mma. Ka ọ dị otú i kwuru.”+ 35 N’ụbọchị ahụ, Leban kpụụrụ mkpi ndị nwere ụcha dị iche iche na ndị tụrụ àgwà na nne ewu niile tụrụ àgwà na ndị nwere ụcha dị iche iche nakwa ebule ọ bụla tụrụ àgwà ọcha na nke ọ bụla na-acha nchara nchara kpụnye ụmụ ya ndị nwoke ka ha lekọtawa. 36 Mgbe e mechara, ọ kpụụrụ ha si n’ebe Jekọb nọ gaa n’ebe ga-ewe ụbọchị atọ iru. Jekọb nọkwa na-azụ ìgwè anụ Leban ndị fọrọ afọ.

37 Jekọb wee gbute osisi stọraks, osisi almọnd, na osisi plen, kpechatụ azụ ha ka e nwee ike ịna-ahụ ebe ndị na-acha ọcha n’okporo osisi ndị ahụ. 38 O dosaziri okporo osisi ndị ahụ o kpechatụrụ ekpecha n’ihu ìgwè anụ ahụ, n’ọwa mmiri ha, n’efere anụ ndị ahụ ji aṅụ mmiri, bụ́ ebe ìgwè anụ ahụ na-abịa aṅụ mmiri, ka ha wee gbaa ibe ha n’ihu osisi ndị ahụ mgbe ha bịara ịṅụ mmiri.

39 Ìgwè anụ ahụ wee na-agba ibe ha n’ihu okporo osisi ndị ahụ. Ha na-amụkwa ụmụ ndị nwere ụcha dị iche iche na ndị tụrụ àgwà. 40 Jekọb wee kpụpụta ebule iche ma chee ìgwè anụ ahụ ihu n’ebe ndị ahụ nwere ụcha dị iche iche nọ nakwa n’ebe ndị niile na-acha nchara nchara n’ìgwè anụ Leban nọ. Ọ kpụpụziri ìgwè anụ nke ya iche. O dokọtaghị ha na ìgwè anụ Leban. 41 Mgbe ọ bụla anụ ndị siri ike chọrọ ịgba anụ ibe ha, Jekọb na-edosa okporo osisi ndị ahụ n’ọwa mmiri ahụ, n’ihu ìgwè anụ ahụ, ka ha gbaa ibe ha n’akụkụ okporo osisi ndị ahụ. 42 Ma ọ naghị edosa okporo osisi ndị ahụ n’ihu anụ ndị na-esighị ike. N’ihi ya, anụ ndị na-esighị ike na-abụ nke Leban, ma ndị siri ike na-abụ nke Jekọb.+

43 Nwoke ahụ* wee baa ezigbo ọgaranya. O nwere ọtụtụ ìgwè anụ ụlọ, nweekwa ụmụ nwaanyị na ụmụ nwoke ndị na-ejere ya ozi nakwa ọtụtụ kamel na ọtụtụ jakị.+

31 Ka oge na-aga, Jekọb nụrụ ihe ụmụ Leban ndị nwoke nọ na-ekwu, sị: “Jekọb ewerela ihe niile nna anyị nwere. Ọ bụ n’akụnụba nna anyị ka o si nweta akụ̀ a niile.”+ 2 Mgbe ọ bụla Jekọb lere Leban anya n’ihu, ọ na-ahụ na ihu ya anaghịzi adị otú ọ na-adịbu.+ 3 N’ikpeazụ, Jehova sịrị Jekọb: “Laghachi n’ala nna gị hà. Laghachikwuru ndị ikwu gị.+ M ka ga na-anọnyere gị.” 4 Jekọb wee zie ozi ka Rechel na Lia bịakwute ya n’ọhịa n’ebe ìgwè anụ ya nọ. 5 Ọ sịrị ha:

“Ahụla m na nna unu anaghịzi ele m anya otú o si ele m anya na mbụ,+ ma Chineke nke nna m ka nọnyeere m.+ 6 O doro unu anya na m ji ike m niile jeere nna unu ozi.+ 7 Nna unu gbalịrị ka ọ ghọgbuo m, ọ gbanwekwara ụgwọ ọrụ m ugboro iri. Ma Chineke ekweghị ka o merụọ m ahụ́. 8 Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Anụ ndị tụrụ àgwà ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ ìgwè anụ ahụ niile na-amụ ụmụ tụrụ àgwà. Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Anụ ndị nwere ụcha dị iche iche ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ ìgwè anụ ahụ niile na-amụ ụmụ nwere ụcha dị iche iche.+ 9 Chineke nọ na-anapụ nna unu ìgwè anụ ya na-enye m. 10 N’otu oge, mgbe o ruru ka ìgwè anụ ahụ gbaa ibe ha, m rọrọ nrọ. Ná nrọ ahụ, m hụrụ na ọ bụ mkpi ndị nwere ụcha dị iche iche na ndị tụrụ àgwà na-agba ìgwè ewu ahụ.+ 11 Mmụọ ozi nke ezi Chineke wee kpọọ m ná nrọ ahụ, sị, ‘Jekọb!’ m wee sị ya, ‘Lee m.’ 12 O wee sị m, ‘Biko, legodị anya. Ị ga-ahụ na ọ bụ mkpi ndị nwere ụcha dị iche iche na ndị tụrụ àgwà na-agba ìgwè ewu ahụ, n’ihi na ahụla m ihe niile Leban na-eme gị.+ 13 Abụ m ezi Chineke nke pụtara n’ihu gị na Betel,+ bụ́ ebe ị nọ wụsa mmanụ n’elu otu ogidi* ma kwee m nkwa.+ Ugbu a, bilie, si n’ala a kwapụ, laghachi n’ala a mụrụ gị.’”+

14 Rechel na Lia wee sị ya: “À ka nwere ihe anyị ga-eketa n’ụlọ nna anyị? 15 Ọ̀ bụ na o wereghị anyị ka ndị mbịarambịa ebe ọ bụ na o reela anyị ma na-eri ego a kwụrụ n’isi anyị?+ 16 Akụnụba niile Chineke napụrụ nna anyị bụ nke anyị na ụmụ anyị.+ N’ihi ya, mee ihe ọ bụla Chineke gwara gị.”+

17 Jekọb wee bilie kugoro ụmụ ya na ndị nwunye ya n’elu kamel.+ 18 Ọ chịịrị ìgwè anụ ya niile, burukwa akụnụba niile ọ kpatara,+ ya bụ, anụ ụlọ ya ndị o nwetara na Padan-eram, ka ọ lakwuru Aịzik nna ya n’obodo Kenan.+

19 N’oge ahụ, Leban gara ịkpacha ajị atụrụ ya. Rechel wee zuru arụsị ezinụlọ*+ nna ya.+ 20 Jekọb ji akọ hapụ Leban onye Eram.* Ọ gwaghị Leban na ya ga-agbapụ. 21 Ya na ndị ezinụlọ ya bu ihe niile ha nwere gbapụ ma gafee Osimiri Yufretis.+ Ọ gawaziri n’ala Gilied bụ́ ugwu ugwu.+ 22 N’ụbọchị nke atọ, a gwara Leban na Jekọb agbapụla. 23 N’ihi ya, Leban kpọọrọ ụmụnne* ya chụwa ya. O were ha ụbọchị asaa tupu ha achụkwute ya n’ala Gilied bụ́ ugwu ugwu. 24 Chineke wee gwa Leban onye Eram*+ okwu ná nrọ n’abalị+ ma sị ya: “Kpachara anya n’ihe ị ga-agwa Jekọb, ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ.”+

25 Leban wee bịakwute Jekọb. Jekọb mara ụlọikwuu ya n’ugwu, Leban na ụmụnne ya amaa ụlọikwuu nke ha n’ala Gilied bụ́ ugwu ugwu. 26 Leban sịziri Jekọb: “Gịnị bụ ihe a i mere? Gịnị mere i ji ghọgbuo m wee kpọrọ ụmụ m ndị nwaanyị lawa ka à ga-asị na ha bụ ndị e ji mma agha dọrọ n’agha? 27 Gịnị mere i ji ghọgbuo m wee zoro ezoro gbapụ n’agwaghị m agwa? Ọ bụrụ na ị gwara m, m gaara eji ọṅụ sị gị gaa nke ọma. M gakwaara agụrụ gị egwú, kụọrọ gị obere ịgbà ma kpọọrọ gị ụbọ akwara. 28 I nyeghịkwa m ohere ka m susuo ụmụ ụmụ m* na ụmụ m ndị nwaanyị ọnụ. I zuzuru nzuzu. 29 M nwere ike ime gị ihe ọjọọ, ma Chineke nke nna unu gwara m okwu n’abalị ụnyaahụ, sị: ‘Kpachara anya n’ihe ị ga-agwa Jekọb, ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ.’+ 30 Ugbu a, ị lawala maka na o teela ọ gụwara gị agụụ ịlaghachi n’ụlọ nna gị, ma gịnị mere i ji zuru chi m?”+

31 Jekọb sịrị Leban: “Ọ bụ maka na egwu tụrụ m, n’ihi na m kwuru n’obi m, sị, ‘I nwere ike ịnapụ m ụmụ gị ndị nwaanyị n’ike.’ 32 Ka e gbuo onye ọ bụla ị hụrụ chi gị n’aka ya. Nọrọ n’ihu ụmụnne anyị chọọ ha ná ngwongwo m niile, ị chọta ha, were ha.” Ma Jekọb amaghị na Rechel zuuru ha. 33 Leban wee banye n’ụlọikwuu Jekọb, banyekwa n’ụlọikwuu Lia nakwa n’ụlọikwuu ụmụ nwaanyị abụọ ahụ na-eje ozi,+ ma ọ hụghị ha. O sizi n’ụlọikwuu Lia pụta banye n’ụlọikwuu Rechel. 34 Ma, Rechel weere arụsị* ndị ahụ tinye n’ihe a kpara akpa ụmụ nwaanyị ji anọ ọdụ n’elu kamel ma nọrọ ọdụ n’elu ya. Leban wee chọọ ha n’ụlọikwuu ahụ niile, ma ọ hụghị ha. 35 Rechel wee sị nna ya: “Onyenwe m, ewela iwe n’ihi na enweghị m ike ibili n’ihu gị maka na ihe ahụ na-emekarị ụmụ nwaanyị ji m aka.”+ O wee chọkwuo arụsị* ndị ahụ nke ọma, ma ọ hụghị ha.+

36 Jekọb wee wee iwe ma malite ịbara Leban mba. Jekọb gwara Leban, sị: “Kedụ otú m si mejọọ gị? Olee mmehie m mere nke mere i ji na-achụ m ọnwụ ọnwụ? 37 Ugbu a ị chọgharịchara ihe gị ná ngwongwo m niile, è nwere ihe si n’ụlọ gị ị hụrụ? Dowe ya ebe a n’ihu ụmụnne m na ụmụnne gị ka ha kpeere anyị abụọ ikpe. 38 N’ime afọ iri abụọ a mụ na gị biri, e nweghị atụrụ gị ma ọ bụ ewu gị ime pụrụ.+ E nweghịkwa mgbe m riri ebule si n’ìgwè anụ gị. 39 E nweghị mgbe m bulataara gị anụ ọ bụla anụ ọhịa dọgburu.+ Ọ bụ m na-akwụ ụgwọ ya. Ma è zuru anụ gị n’ehihie ma è zuru ya n’abalị, ị na-asị m kwụọ ụgwọ ya. 40 Okpomọkụ na-anyụ m ịkpakwụ n’ehihie. Oyi na-atụgbu m n’abalị, ụra na-apụkwa m n’anya.+ 41 Ihe a bụ afọ iri abụọ m biri n’ụlọ gị. M jeerela gị ozi afọ iri na anọ maka ụmụ gị ndị nwaanyị abụọ, jeekwa ozi afọ isii maka anụ ụlọ gị, ma ị nọ na-agbanwe ụgwọ ọrụ m ruo ugboro iri.+ 42 A sị na Chineke nke nna m,+ bụ́ Chineke Ebreham nakwa Onye Aịzik na-efe,*+ anọnyereghị m, ị gaara agbawa m aka sị m lawa. Chineke ahụla otú m si taa ahụhụ, hụkwa otú m si rụgbuo onwe m n’ọrụ. Ọ bụ ya mere o ji baara gị mba n’abalị ụnyaahụ.”+

43 Leban sịziri Jekọb: “Ụmụ nwaanyị ndị a bụ ụmụ m, ụmụaka a bụkwa ụmụ m. Anụ ụlọ ndị a bụ anụ ụlọ m. Ihe ọ bụla ị na-ele anya ebe a bụ nke m, bụrụkwa nke ụmụ m ndị nwaanyị. È nwere ihe ọjọọ m ga-eme ha na ụmụ ha mụtara? 44 Bịa ka mụ na gị gbaa ndụ, ọ ga-abụkwara anyị ihe àmà.” 45 N’ihi ya, Jekọb buuru nkume ma kwụwa ya ka ọ bụrụ ogidi.+ 46 Jekọb wee sị ụmụnne ya: “Butewenụ nkume.” Ha wee bute nkume ma tụkọta ha ọnụ, ha abụrụ ikpo nkume. Ha riziri nri n’ebe ahụ, n’elu ikpo nkume ahụ. 47 Leban wee kpọọ ya Jiga-sahaduta,* ma Jekọb kpọrọ ya Galied.*

48 Leban sịziri ya: “Ikpo nkume a bụụrụ mụ na gị ihe àmà taa.” Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ya Galied,+ 49 kpọọkwa ya Ụlọ Nche, n’ihi na Leban sịrị: “Ka Jehova bụụrụ mụ na gị onye nche mgbe anyị nọ n’ebe anyị na-anaghị ahụ ibe anyị. 50 Ọ bụrụ na i megbuo ụmụ m ndị nwaanyị, ọ bụrụkwa na ị lụọ ụmụ nwaanyị ọzọ n’elu ụmụ m ndị ị lụrụla, ọ bụrụgodị na e nweghị onye ga-ahụ anyị, cheta na Chineke ga-ahụ ya. Ọ bụụrụ* mụ na gị onye àmà.” 51 Leban sịkwara Jekọb: “Lekwa ikpo nkume a, lekwa ogidi m kwụwara n’etiti mụ na gị. 52 Ikpo nkume a bụ ihe àmà, ogidi a bụkwa ihe na-agba àmà,+ na agaghị m agafe ikpo nkume a ka m mee gị ihe ọjọọ nakwa na ị gaghị agafe ikpo nkume a na ogidi a ka i mee m ihe ọjọọ. 53 Ka Chineke Ebreham+ na Chineke Nehọ, bụ́ Chineke nna ha, kpee ikpe mụ na gị.” Ma Jekọb ji Onye Aịzik nna ya na-efe*+ ṅụọ iyi.

54 Mgbe e mechara, Jekọb chụrụ àjà n’ugwu ahụ, kpọọkwa ụmụnne ya ka ha rie nri. Ha wee rie nri ma rahụ n’ugwu ahụ. 55 Ma, Leban biliri n’isi ụtụtụ susuo ụmụ ụmụ ya*+ na ụmụ ya ndị nwaanyị ọnụ ma gọzie ha.+ Leban hapụziri ha lawa n’ụlọ ya.+

32 Jekọb lawaziri, ndị mmụọ ozi Chineke wee bịakwute ya. 2 Ozugbo Jekọb hụrụ ha, ọ sịrị: “Ndị a bụ ndị agha Chineke.” N’ihi ya, ọ kpọrọ ebe ahụ Mahaneyim.*

3 Jekọb zipụziri ndị ozi ka ha buru ya ụzọ gakwuru Ịsọ nwanne ya n’ala Sia,+ bụ́ ebe a na-akpọkwa Ịdọm.+ 4 Jekọb nyere ha iwu, sị: “Ihe a bụ ihe unu ga-agwa onyenwe m Ịsọ, ‘Ohu gị Jekọb kwuru, sị: “Ebiela m n’ụlọ Leban ogologo oge.+ 5 Enweela m ehi, jakị, atụrụ, na ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-eje ozi.+ Ana m ezitere onyenwe m ozi a ka ihe m wee masị gị.”’”

6 Mgbe e mechara, ndị ozi ahụ lọghachikwutere Jekọb, sị ya: “Anyị gakwuuru nwanne gị Ịsọ, ọ na-abịakwa izute gị, ya na narị ụmụ nwoke anọ (400) so.”+ 7 Ezigbo ụjọ wee jide Jekọb, ya echegbuwe onwe ya.+ N’ihi ya, o kewara ndị ya na ha so nakwa ìgwè ewu na atụrụ ya na ehi ya na kamel ya ụzọ abụọ. 8 Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na Ịsọ alụso otu ìgwè ọgụ, ìgwè nke ọzọ ga-agbalaga.”

9 Jekọb kpeziri ekpere, sị: “Chineke nke nna m Ebreham na Chineke nke nna m Aịzik, Jehova, ọ bụ gị gwara m, sị, ‘Laghachi n’ala gị, laghachikwuru ndị ikwu gị, m ga-emekwara gị ihe ọma.’+ 10 Ma, erughị m eru ka ị hụ ohu gị n’anya otú a ma meere m amara niile a,+ n’ihi na ọ bụ naanị mkpara m ka m ji gafee Osimiri Jọdan a. Ma ugbu a, anyị dịzi ìgwè abụọ.+ 11 Ana m arịọ gị+ ka ị napụta m n’aka nwanne m nwoke Ịsọ, n’ihi na egwu na-atụ m na o nwere ike ịbịa lụso m ọgụ,+ lụsokwa ụmụ nwaanyị ndị a na ụmụ ha ọgụ. 12 Ma i kwuru, sị ‘N’eziokwu, m ga-emere gị ihe ọma, m ga-emekwa ka ụmụ* gị dị ọtụtụ ka ájá dị n’oké osimiri, nke a na-enweghị ike ịgụta ọnụ.’”+

13 O wee rahụ n’ebe ahụ n’abalị ahụ. O si n’ihe ndị o nwere wepụta onyinye ndị a ọ ga-enye Ịsọ nwanne ya:+ 14 narị nne ewu abụọ (200), mkpi iri abụọ, narị nne atụrụ abụọ (200), ebule iri abụọ, 15 kamel iri atọ ndị ka na-enye ụmụ ha ara na ụmụ ha, nne ehi iri anọ, oké ehi iri, nne jakị iri abụọ, na oké jakị iri.+

16 Ọ kpụụrụ ha n’ìgwè n’ìgwè kpụnye ndị na-ejere ya ozi ma sị ha: “Burunụ m ụzọ gawa. Unu agakọla ọnụ. Otu ìgwè ga-anọ n’ebe dịtụ anya n’ebe ìgwè nke ọzọ nọ.” 17 O nyekwara onye ga-ebute ụzọ iwu, sị: “Ọ bụrụ na Ịsọ nwanne m abịakwute gị ma jụọ gị, sị, ‘Ònye bụ onyenwe gị? Ebee ka ị na-aga? Ònyekwa nwe anụ ndị a na-aga n’ihu gị?’ 18 ị ga-asị ya, ‘Ọ bụ ohu gị Jekọb. Ihe ndị a bụ onyinye ọ sịrị ka e nye onyenwe m Ịsọ.+ Ọ na-abịa n’azụ anyị.’” 19 O nyekwara onye nke abụọ na onye nke atọ na ndị niile na-achị ìgwè anụ ndị ahụ iwu, sị: “Ọ bụ ihe a ka unu ga-agwa Ịsọ ma unu bịakwute ya. 20 Unu ga-asịkwa ya, ‘Ohu gị Jekọb na-abịa n’azụ anyị.’” Jekọb kwuru ihe a maka na ọ sịrị n’obi ya: “Ọ bụrụ na m jiri onyinye ndị a m ga-ebu ụzọ zigara ya mee ka obi jụrụ ya,+ o nwere ike iji obiọma nabata m mgbe m ga-emecha hụ ya.” 21 Ndị ozi ahụ wee chịrị onyinye ndị ahụ buru Jekọb ụzọ gawa. Ma n’abalị ahụ, Jekọb rahụrụ n’ebe ya na ndị ezinụlọ ya mara ụlọikwuu.

22 Mgbe e mechara n’abalị ahụ, o biliri kpọrọ ndị nwunye ya abụọ+ na ụmụ nwaanyị abụọ na-ejere ya ozi+ na ụmụ ya ndị nwoke iri na otu ma si n’ebe a na-eji ụkwụ agafe mmiri Jabọk gafee.+ 23 Ọ kpọọrọ ha kpọfee mmiri* ahụ, o bufetakwara ihe ndị ọzọ o nwere.

24 Jekọb mechaziri nọrọ naanị ya. Ya na otu nwoke wee malite ịgba mgba ruo mgbe chi bọrọ.+ 25 Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ya emerighị Jekọb, o metụrụ Jekọb aka n’ọkpụkpụ úkwù ya, úkwù Jekọb wee chipụ ka ya na ya na-agba mgba.+ 26 Nwoke ahụ sịziri Jekọb: “Hapụ m ka m laa maka na chi abọwala.” Jekọb wee sị ya: “Agaghị m ahapụ gị ka ị laa ruo mgbe ị gọziri m.”+ 27 N’ihi ya, ọ jụrụ Jekọb, sị: “Gịnị bụ aha gị?” ya azaa ya, sị: “Jekọb.” 28 Nwoke ahụ sịziri ya: “Aha gị agaghịzi abụ Jekọb, kama ọ ga-abụzi Izrel*+ maka na gị na Chineke na ndị mmadụ agbaala mgba,+ n’ikpeazụ, gị emerie.” 29 Jekọb sịziri ya: “Biko, gwa m aha gị.” Ma ọ jụrụ Jekọb, sị: “Gịnị mere i ji na-ajụ m aha m?”+ O wee gọzie Jekọb n’ebe ahụ. 30 N’ihi ya, Jekọb kpọrọ ebe ahụ Penayel,*+ n’ihi na o kwuru, sị, “Ahụla m Chineke ihu na ihu, ma anwụghị m.”+

31 Anyanwụ malitere ịcha ozugbo Jekọb hapụrụ Penuel,* ma ọ nọ na-ete ụkwụ.+ 32 Ọ bụ ya mere na ruo taa, ụmụ Izrel anaghị eri akwara na-adị n’úkwù anụ, n’ọkpụkpụ úkwù anụ, maka na nwoke ahụ metụrụ Jekọb aka n’úkwù, n’akụkụ akwara dị n’úkwù ya.

33 Jekọb lepụrụ anya hụ ka Ịsọ na-abịa, ya na narị ụmụ nwoke anọ (400) ndị so ya.+ N’ihi ya, Jekọb kpọọrọ ụmụ ya ụfọdụ kpọnye Lia, kpọrọ ụfọdụ kpọnye Rechel, kpọrọkwa ụfọdụ kpọnye ụmụ nwaanyị abụọ na-ejere ya ozi.+ 2 O dowere ụmụ nwaanyị na-ejere ya ozi na ụmụ ha n’ihu,+ Lia na ụmụ ya anọrọ ha n’azụ,+ Rechel+ na Josef anọrọzie n’azụ azụ. 3 Jekọb gaziri nọrọ n’ihu ha niile. Ọ kpọrọ isiala ugboro asaa ruo mgbe o rutere n’ebe nwanne ya nọ.

4 Ma Ịsọ gbaara ọsọ gakwuru ya, makụọ ya ma susuo ya ọnụ,* ha abụọ amalite ibe ákwá. 5 Mgbe Ịsọ leliri anya hụ ụmụ nwaanyị ahụ na ụmụ ha, ọ jụrụ Jekọb, sị: “Ole ndị bụ ndị a so gị?” ya azaa ya, sị: “Ha bụ ụmụ Chineke ji meere ohu gị amara.”+ 6 Ụmụ nwaanyị ahụ na-eje ozi na ụmụ ha wee bịarute, kpọọrọ Ịsọ isiala. 7 Lia na ụmụ ya bịarutere kpọọrọ ya isiala. Josef na Rechel bịarutekwara kpọọrọ ya isiala.+

8 Ịsọ jụrụ Jekọb, sị: “Gịnị mere i ji zite ndị ozi ahụ na ìgwè anụ niile ahụ m hụrụ?”+ Ọ zara ya, sị: “Ọ bụ ka ihe m wee masị onyenwe m.”+ 9 Ịsọ sịrị ya: “Nwanne m, enwere m nnọọ ọtụtụ ihe.+ Jidewe ihe gị.” 10 Ma Jekọb sịrị ya: “Mba, biko. Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, nara m onyinye ndị a m na-enye gị, n’ihi na m wetara ha ka m nwee ike ịhụ ihu gị. Ahụkwala m ihu gị ka à ga-asị na m hụrụ ihu Chineke, i jikwa obi ụtọ nabata m.+ 11 Biko, nara onyinye m wetara iji gọzie gị, n’ihi na Chineke emeerela m amara,+ enwekwara m ihe niile dị mụ mkpa.”+ O wee na-arịọsi ya ike ka ọ nara ya onyinye ndị ahụ, ya anara ya ha.

12 Mgbe e mechara, Ịsọ sịrị ya: “Ka anyị kwalie lawa, ka m butere gị ụzọ.” 13 Ma Jekọb sịrị ya: “Onyenwe m ma na ụmụaka a esighị ike,+ marakwa na m na-elekọta atụrụ na ehi ndị na-enye ụmụ ha ara. Ọ bụrụ na a chịa ha n’ike otu ụbọchị, ìgwè anụ a niile ga-anwụ. 14 Biko, ka onyenwe m buru ohu ya ụzọ gawa, ma m ga na-abịa nwayọọ nwayọọ otú ike kwere anụ ụlọ ndị a na ụmụaka m ruo mgbe m ga-abịakwute onyenwe m n’obodo Sia.”+ 15 Ịsọ wee sị ya: “Biko, ka m hapụrụ gị ụfọdụ n’ime ndị so m.” Jekọb sịrị ya: “Ọ̀ bakwaranụ uru ịhapụ ha? Naanị ihe m chọrọ bụ ka ihe m masị onyenwe m.” 16 N’ihi ya, Ịsọ lawara Sia n’ụbọchị ahụ.

17 Jekọb wee gawa Sọkọt.+ N’ebe ahụ, ọ rụụrụ onwe ya ụlọ, rụọkwara ìgwè anụ ya ụlọ ndò. Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ebe ahụ Sọkọt.*

18 Mgbe Jekọb si Padan-eram+ na-alọta, o rutere n’obodo Shikem,+ nke dị na Kenan,+ n’enweghị nsogbu ọ bụla. O wee maa ụlọikwuu n’akụkụ obodo ahụ. 19 Ọ zụrụ ibé ala ahụ ọ mara ụlọikwuu ya n’aka ụmụ Hemọ, nna Shikem. Ọ zụrụ ya otu narị (100) mkpụrụ ego.+ 20 Ọ rụrụ ebe ịchụàjà n’ebe ahụ ma kpọọ ya Chineke bụ Chineke Izrel.+

34 Daịna, nwa nwaanyị Lia mụụrụ Jekọb,+ na-adị agakwuru ụmụ agbọghọ obodo ahụ ka ha na ya nọrịa.*+ 2 Mgbe Shikem hụrụ Daịna, ọ kpọọrọ ya dinaa ya ma merụọ ya. Shikem bụ nwa Hemọ onye Haịvaịt.+ Hemọ bụ onyeisi n’obodo ahụ. 3 Obi Shikem ekweghị apụ apụ n’ebe Daịna nwa Jekọb nọ. Ọ hụrụ nwa agbọghọ ahụ n’anya ma na-agwa ya okwu ga-eru ya n’obi. 4 N’ikpeazụ, Shikem gwara Hemọ+ nna ya, sị: “Lụtara m nwa agbọghọ a ka ọ bụrụ nwunye m.”

5 Mgbe Jekọb nụrụ na Shikem emerụọla Daịna nwa ya nwaanyị, ụmụ ya ndị nwoke nọ n’ọhịa na-azụ ìgwè anụ ya. N’ihi ya, Jekọb gbara nkịtị ruo mgbe ha lọtara. 6 Mgbe e mechara, Hemọ, nna Shikem, gakwuuru Jekọb ka ya na ya kpaa. 7 Ma ụmụ Jekọb ndị nwoke nụrụ ihe merenụ, ha esi n’ọhịa lọta ozugbo. O wutere ha nke ukwuu, ha ewee ezigbo iwe, n’ihi na Shikem dinara ada Jekọb+ wee mechuo Izrel ihu, bụ́ ihe ọjọọ a na-ekwesịghị ime eme.+

8 Hemọ gwara ha, sị: “Obi Shikem nwa m dị n’ebe ada unu nọ. Biko, kpọnyenụ ya nwa agbọghọ ahụ ka ọ bụrụ nwunye ya. 9 Ka anyị na unu gọwa ọgọ. Anyị ga na-alụrụ ụmụ unu ndị nwaanyị, unu ana-alụrụkwa ụmụ anyị ndị nwaanyị.+ 10 Unu nwere ike ibiri n’ala anyị, unu nwekwara ike ime ihe ọ bụla n’ala a. Birinụ na ya zụwa ahịa, werekwanụ ya ka ala unu.” 11 Shikem wee gwa nna nwa agbọghọ ahụ na ụmụnne ya ndị nwoke, sị: “Ka ihe m masị unu, m ga-enyekwa unu ihe ọ bụla unu ga-asị m weta. 12 Unu nwere ike ibuli ego isi ya ma gwa m ka m weta onyinye buru ibu.+ M ga-enye unu ihe ọ bụla unu ga-asị m weta. Naanị ihe m chọrọ bụ ka unu kpọnye m nwa agbọghọ ahụ ka ọ bụrụ nwunye m.”

13 Ụmụ Jekọb ndị nwoke wee jiri aghụghọ zaa Shikem na Hemọ nna ya maka na Shikem merụrụ Daịna nwanne ha nwaanyị. 14 Ụmụ Jekọb sịrị ha: “Anyị agaghị anwa anwa kpọrọ nwanne anyị nwaanyị kpọnye nwoke a na-ebighị úgwù,+ n’ihi na ime otú ahụ bụ imechu onwe anyị ihu. 15 Anyị ga-eme ihe unu kwuru naanị ma ọ bụrụ na a ga-ebi unu úgwù, unu adịrị ka anyị.+ 16 Unu mee ya, unu ga na-alụrụ ụmụ anyị ndị nwaanyị, anyị ana-alụrụkwa ụmụ unu ndị nwaanyị. Anyị na unu ga-ebi, anyị abụrụzie otu ndị. 17 Ma ọ bụrụ na unu egeghị anyị ntị wee ghara ibi úgwù, anyị ga-akpọrọ ada anyị laa.”

18 Ihe ha kwuru dị Hemọ+ na Shikem, nwa Hemọ,+ mma. 19 Nwa okorobịa ahụ mere ihe ha gwara ya ozugbo+ n’ihi na ada Jekọb masịrị ya, ọ bụkwa onye a kacha akwanyere ùgwù n’ezinụlọ nna ya.

20 Hemọ na Shikem nwa ya wee gaa n’ọnụ ụzọ ámá obodo ha ma gwa ndị obodo ha,+ sị: 21 “Ndị a chọrọ ka anyị na ha dịrị n’udo. Kwetanụ ka ha biri n’obodo anyị zụwa ahịa ebe ọ bụ na obodo anyị buru ibu nke na ọ ga-aba ha. Anyị ga na-alụrụ ụmụ ha ndị nwaanyị, ha ga na-alụrụkwa ụmụ anyị ndị nwaanyị.+ 22 Naanị ihe ga-eme ka ha kweta ka anyị na ha biri wee bụrụ otu ndị bụ ma ọ bụrụ na e bie nwoke ọ bụla n’ime anyị úgwù otú e biri ha.+ 23 Anyị na ha bụrụ otu, ọ̀ bụ na ihe ndị ha nwere na akụnụba ha na anụ ụlọ ha niile agaghị abụ nke anyị? N’ihi ya, ka anyị kweta ihe ha kwuru ka anyị na ha wee biri.” 24 Ndị niile na-ezukọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ gere Hemọ na Shikem nwa ya ntị. E wee bie ụmụ nwoke obodo ahụ niile úgwù, ya bụ, ndị niile na-ezukọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ.

25 Ma n’ụbọchị nke atọ, mgbe úgwù ahụ ha biri ka na-afụ ha ụfụ, Simiọn na Livaị, bụ́ ụmụ Jekọb, ụmụnne Daịna,+ weere mma agha ha banye n’obodo ahụ otú a na-enweghị onye ga-amata ihe ha bu n’obi. Ha wee gbuo ụmụ nwoke obodo ahụ niile.+ 26 Ha ji mma agha gbuo Hemọ na Shikem nwa ya, sizie n’ụlọ Shikem kpọrọ Daịna lawa. 27 Ụmụ Jekọb ndị ọzọ gara n’ebe ụmụ nwoke ndị ahụ e gburu egbu nọ bukọrọ ihe dị n’obodo ahụ, maka na ha merụrụ nwanne ha nwaanyị.+ 28 Ha kpụụrụ ìgwè ewu na atụrụ ha, ìgwè ehi ha, na jakị ha, werekwa ihe niile dị n’obodo ahụ nakwa n’ubi ha. 29 Ha wekwaara ihe niile ha nwere, kpụrụkwa ụmụntakịrị ha na ndị nwunye ha ma bukọrọ ihe niile dị n’ụlọ ha.

30 Jekọb wee gwa Simiọn na Livaị,+ sị: “Unu ebuterela m nsogbu wee mee ka m siwe ndị bi n’ala a ísì, ya bụ, ndị Kenan na ndị Perizaịt. Ebe m dị ole na ole, ha ga-ezukọta lụso m ọgụ ma kpochapụ mụ na ndị ezinụlọ m.” 31 Ma ha sịrị: “Mmadụ ò kwesịrị imeso nwanne anyị nwaanyị ka à ga-asị na ọ bụ akwụna?”

35 Mgbe e mechara, Chineke gwara Jekọb, sị: “Bilie, kwaga Betel+ ma biri n’ebe ahụ, rụọkwara mụnwa bụ́ ezi Chineke ebe ịchụàjà n’ebe ahụ m pụtara n’ihu gị mgbe ị na-agbara Ịsọ nwanne gị ọsọ.”+

2 Jekọb wee gwa ndị ezinụlọ ya na ndị niile ya na ha nọ, sị: “Tụfuonụ chi ndị mba ọzọ unu ji.+ Dowenụ onwe unu ọcha. Gbanweenụ uwe unu, 3 biliekwanụ ka anyị kwaga Betel. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m ga-arụrụ ezi Chineke ebe ịchụàjà, bụ́ onye zara m n’oge m nọ ná nsogbu, onye nọnyekwaara m n’ebe ọ bụla m gara.”+ 4 N’ihi ya, ha nyere Jekọb chi ndị mba ọzọ niile ha ji, ha chịnyekwara ya ọla ntị ha kwụ ná ntị. Jekọb wee lie* ha n’okpuru nnukwu osisi dị nso na Shikem.

5 N’oge ha kwapụrụ na-aga Betel, Chineke mere ka ụjọ jide ndị bi n’obodo ndị gbara ha gburugburu, nke mere na ha achụrụghị ụmụ Jekọb gawa. 6 Jekọb na ndị niile so ya mechara rute Lọz,+ ya bụ, Betel, nke dị na Kenan. 7 Ọ rụrụ ebe ịchụàjà n’ebe ahụ ma kpọọ ebe ahụ El-betel* maka na ọ bụ n’ebe ahụ ka ezi Chineke pụtara n’ihu ya mgbe ọ nọ na-agbara nwanne ya ọsọ.+ 8 Mgbe e mechara, Debora+ onye nyere Ribeka ara nwụrụ, e lie ya n’ebe dị nso na Betel, n’okpuru osisi ook. Jekọb wee kpọọ ebe ahụ Alọn-bakọt.*

9 Chineke pụtara n’ihu Jekọb ọzọ mgbe o si Padan-eram na-alọta ma gọzie ya. 10 Chineke sịrị ya: “Aha gị bụ Jekọb.+ A gaghịzi na-akpọ gị Jekọb, kama aha gị ga-abụzi Izrel.” Ọ maliteziri ịkpọ ya Izrel.+ 11 Chineke gwakwara ya, sị: “Abụ m Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba. Ị ga-abụ nna mba dị iche iche na ọtụtụ ìgwè mmadụ,+ ndị eze ga-esikwa n’agbụrụ gị.*+ 12 Ọ bụ gị ka m ga-enye ala m nyere Ebreham na Aịzik, ọ bụkwa ụmụ* gị ka m ga-enye ala ahụ.”+ 13 Chineke wee hapụ Jekọb, si n’ebe ahụ ya na ya nọ kwuo okwu pụọ.

14 N’ihi ya, Jekọb kwụwara otu nkume n’ebe ahụ ya na Chineke nọ kwuo okwu ka ọ bụrụ ogidi. O wee wụsa àjà mmanya n’elu ya, wụsakwa mmanụ n’elu ya.+ 15 Jekọb kpọkwara ebe ahụ ya na Chineke nọ kwuo okwu Betel.+

16 Ha wee si na Betel kwalie. Mgbe ha ka nọ n’ebe dịtụ anya n’Efrat, ime mewere Rechel, o sikwaara ya ezigbo ike ịmụ nwa ya. 17 Ma mgbe ọ nọ na-esiri ya ike ịmụpụta nwa ahụ, nwaanyị na-aghọ́ nwa sịrị ya: “Atụla egwu, maka na ị ga-amụkwa nwa nwoke a.”+ 18 Mgbe Rechel na-ekubi ume (maka na ọ nọzi n’ọnụ ọnwụ), ọ gụrụ nwa ahụ Ben-onaị,* ma nna ya gụrụ ya Benjamin.*+ 19 Rechel wee nwụọ, e lie ya n’akụkụ ụzọ gara Efrat, ya bụ, Betlehem.+ 20 Jekọb kwụwara otu nnukwu nkume n’elu ili ya. Ọ bụ ogidi ili Rechel ruo taa.

21 Mgbe e mechara, Izrel kwapụrụ gaa maa ụlọikwuu ya ma a gafetụ ụlọ elu Ịda. 22 N’oge Izrel bi n’ala ahụ, e nwere mgbe Ruben gara dinaa Bilha iko nna ya, Izrel nụkwara ya.+

Ụmụ nwoke Jekọb mụrụ dị iri na abụọ. 23 Ụmụ nwoke ndị Lia mụrụ bụ Ruben, ọkpara Jekọb,+ Simiọn, Livaị, Juda, Ịsaka, na Zebulọn. 24 Ụmụ Rechel mụrụ bụ Josef na Benjamin. 25 Ụmụ Bilha, nwaanyị na-ejere Rechel ozi, mụrụ bụ Dan na Naftalaị. 26 Ụmụ Zilpa, nwaanyị na-ejere Lia ozi, mụrụ bụ Gad na Asha. Ọ bụ ha bụ ụmụ Jekọb ndị nwoke, ndị a mụụrụ ya na Padan-eram.

27 Jekọb mechara lọta n’ebe Aịzik nna ya nọ na Mamri,+ na Kiriat-aba, ya bụ, Hebrọn, bụ́ ebe Ebreham bi mgbe ọ bụ onye mbịarambịa, bụrụkwa ebe Aịzik bụ onye mbịarambịa.+ 28 Aịzik dịrị ndụ otu narị afọ na iri asatọ (180).+ 29 Aịzik wee kubie ume nwụọ, e lie ya otú e liri ndị nna nna ya. O mere agadi, ndụ ya jukwara ya afọ. Ịsọ na Jekọb ụmụ ya wee lie ya.+

36 Ihe a bụ akụkọ ndụ Ịsọ, ya bụ, Ịdọm.+

2 Ịsọ lụrụ ụmụ nwaanyị ndị Kenan. Ha bụ: Eda+ nwa Ịlọn onye Het,+ Oholibema+ nwa Ena, nwa nwa Zibiọn onye Haịvaịt, 3 nakwa Basemat,+ nwa Ishmel. Basemat bụ nwanne nwaanyị Nebeyọt.+

4 Eda mụụrụ Ịsọ Elifaz, Basemat amụọ Ruel,

5 Oholibema amụọ Jiọsh, Jelam, na Kora.+

Ọ bụ ha bụ ụmụ Ịsọ ndị nwoke, ndị a mụụrụ ya na Kenan. 6 Mgbe e mechara, Ịsọ kpọọrọ ndị nwunye ya, ụmụ ya ndị nwoke, ụmụ ya ndị nwaanyị, na ndị niile nọ n’ụlọ ya, chịrị ehi ya na anụ ya niile ndị ọzọ, burukwa akụnụba niile ọ kpatara+ na Kenan gaa n’ala ọzọ nke dịtụ anya n’ebe Jekọb nwanne ya bi.+ 7 Ọ kwapụrụ maka na akụnụba ha ehiela nne nke ukwuu nke na ha enweghị ike ibikọta otu ebe, ala ebe ha bi* enweghịkwa ike ịba ha n’ihi ìgwè anụ ha. 8 Ịsọ wee biri n’ala Sia bụ́ ugwu ugwu.+ Ọ bụ Ịsọ bụ Ịdọm.+

9 Ihe a bụ akụkọ ndụ Ịsọ, nna ndị Ịdọm, ndị bi n’ala Sia bụ́ ugwu ugwu.+

10 Ihe a bụ aha ụmụ Ịsọ ndị nwoke: Elifaz nwa Eda nwunye Ịsọ; Ruel nwa Basemat nwunye Ịsọ.+

11 Ụmụ Elifaz ndị nwoke bụ Timan,+ Oma, Zifo, Getam, na Kinaz.+ 12 Elifaz, nwa Ịsọ, nwere iko nwaanyị aha ya bụ Timna. Ka oge na-aga, ọ mụụrụ Elifaz Amalek.+ Ọ bụ ha bụ ụmụ* Eda, nwunye Ịsọ.

13 Ndị a bụ ụmụ Ruel ndị nwoke: Nehat, Zira, Shama, na Miza. Ọ bụ ha bụ ụmụ* Basemat,+ nwunye Ịsọ.

14 Ndị a bụ ụmụ nwoke Oholibema nwunye Ịsọ mụụrụ Ịsọ: Jiọsh, Jelam, na Kora. Oholibema bụ nwa Ena, bụrụkwa nwa nwa Zibiọn.

15 Ndị a bụ ndị isi n’ime ụmụ Ịsọ ndị nwoke:+ Ụmụ nwoke ndị a bụ ndị isi Elifaz, ọkpara Ịsọ, mụrụ: Timan, Oma, Zifo, Kinaz,+ 16 Kora, Getam, na Amalek. Ọ bụ ha bụ ndị isi n’ụmụ Elifaz+ n’ala Ịdọm. Ha bụ ụmụ* Eda.

17 Ụmụ nwoke ndị a bụ ndị isi Ruel, nwa Ịsọ, mụrụ: Nehat, Zira, Shama, na Miza. Ọ bụ ha bụ ndị isi n’ụmụ Ruel n’ala Ịdọm.+ Ha bụ ụmụ* Basemat, nwunye Ịsọ.

18 Ụmụ nwoke ndị a bụ ndị isi Oholibema, nwunye Ịsọ, mụrụ: Jiọsh, Jelam, na Kora. Ọ bụ ha bụ ndị isi Oholibema, nwunye Ịsọ, mụrụ. Oholibema bụ nwa Ena.

19 Ọ bụ ndị a bụ ndị ezinụlọ Ịsọ, ọ bụkwa ndị a bụ ndị isi ha. Ọ bụ Ịsọ bụ Ịdọm.+

20 Ndị a bụ ụmụ nwoke Sia onye Horaịt mụrụ, bụ́ ndị nwe ala ahụ:+ Lotan, Shobal, Zibiọn, Ena,+ 21 Daịshọn, Iza, na Daịshan.+ Ọ bụ ha bụ ndị isi ndị Horaịt, ụmụ Sia, n’ala Ịdọm.

22 Ụmụ nwoke ndị Lotan mụrụ bụ Horaị na Himam. Nwanne nwaanyị Lotan bụ Timna.+

23 Ndị a bụ ụmụ nwoke Shobal mụrụ: Alvan, Manahat, Ịbal, Shifo, na Onam.

24 Ndị a bụ ụmụ nwoke Zibiọn mụrụ:+ Eya na Ena. Ọ bụ Ena a hụrụ mmiri na-ekpo ọkụ n’ala ịkpa mgbe ọ na-elekọtara Zibiọn nna ya jakị.

25 Ndị a bụ ụmụ Ena: Daịshọn na Oholibema. Oholibema bụ nwa Ena.

26 Ndị a bụ ụmụ nwoke Daịshọn mụrụ: Hemdan, Eshban, Itran, na Kiran.+

27 Ndị a bụ ụmụ nwoke Iza mụrụ: Bilhan, Zeavan, na Ekan.

28 Ndị a bụ ụmụ nwoke Daịshan mụrụ: Ọz na Eran.+

29 Ndị a bụ ndị isi ndị Horaịt: Lotan, Shobal, Zibiọn, Ena, 30 Daịshọn, Iza, na Daịshan.+ Ọ bụ ha bụ ndị isi ndị Horaịt n’ala Sia.

31 Ndị a bụ ndị eze chịrị ndị Ịdọm+ tupu eze ọ bụla achịa ndị Izrel.+ 32 Bila nwa Biọ chịrị n’Ịdọm. Aha obodo ya bụ Dinhaba. 33 Mgbe Bila nwụrụ, Jobab nwa Zira, onye Bọzra, nọchiri ya malite ịchị. 34 Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye Timan, nọchiri ya malite ịchị. 35 Mgbe Husham nwụrụ, Hedad nwa Bidad, onye meriri ndị Midian+ n’ala Moab, nọchiri ya malite ịchị. Aha obodo ya bụ Evit. 36 Mgbe Hedad nwụrụ, Samla onye Masrika nọchiri ya malite ịchị. 37 Mgbe Samla nwụrụ, Sheọl onye Rehobọt, nọchiri ya malite ịchị. Rehobọt a dị n’akụkụ osimiri. 38 Mgbe Sheọl nwụrụ, Bel-henan nwa Akbọ nọchiri ya malite ịchị. 39 Mgbe Bel-henan nwa Akbọ nwụrụ, Heda nọchiri ya malite ịchị. Aha obodo ya bụ Peyu. Aha nwunye ya bụ Mehetabel. Mehetabel bụ nwa Metred, Metred abụrụ nwa Mizahab.

40 Ndị a bụ ndị isi Ịsọ mụrụ, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’obodo n’obodo, n’aha n’aha: Timna, Alva, Jitet,+ 41 Oholibema, Ila, Paịnọn, 42 Kinaz, Timan, Mibza, 43 Magdiel, na Aịram. Ọ bụ ha bụ ndị isi Ịdọm, ọ bụkwa n’ebe ndị a ka ha biri n’ala ha. Ọ bụ onye a bụ Ịsọ,+ nna ndị Ịdọm.+

37 Jekọb bi n’ala Kenan, ala ebe nna ya bụbu onye mbịarambịa.+

2 Ihe a bụ akụkọ ndụ Jekọb.

Mgbe Josef+ dị afọ iri na asaa, o so ụmụ Bilha+ na ụmụ Zilpa,+ ndị nwunye nna ya, na-elekọta atụrụ.+ N’otu oge, Josef kọọrọ nna ha ihe ọjọọ ha mere. 3 Izrel hụrụ Josef n’anya karịa ụmụ ya niile ndị ọzọ+ n’ihi na ọ bụ nwa ọ mụrụ n’agadi. Ọ kwakwaara ya uwe pụrụ iche.* 4 Mgbe ụmụnne ya hụrụ na nna ha hụrụ ya n’anya karịa ụmụnne ya niile, ha malitere ịkpọ ya asị, ha anaghịkwa eji obiọma agwa ya okwu.

5 Mgbe e mechara, Josef rọrọ nrọ ma kọọrọ ya ụmụnne ya.+ Ha wee hụkwuo ihe mere ha ga-eji kpọọ ya asị. 6 Ọ sịrị ha: “Biko, nụrụnụ nrọ a m rọrọ. 7 Anyị nọ n’etiti ubi na-eke ọka* n’ùkwù n’ùkwù. Ùkwù ọka nke m wee bilie guzo ọtọ, ùkwù ọka nke unu agbaa ùkwù ọka nke m gburugburu kpọọrọ ya isiala.”+ 8 Ụmụnne ya sịrị ya: “Ị̀ na-ekwu na ị ga-eme onwe gị eze ma chịwa anyị?”+ Ha wee hụ ihe ọzọ mere ha ga-eji kpọọ ya asị maka nrọ ọ rọrọ nakwa ihe o kwuru.

9 Mgbe e mechara, ọ rọrọ nrọ ọzọ ma kọọrọ ya ụmụnne ya, sị: “Arọrọ m nrọ ọzọ. Ná nrọ a, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu nọ na-akpọrọ m isiala.”+ 10 O wee kọọrọ nna ya nrọ a, kọọkwara ya ụmụnne ya. Nna ya baara ya mba, sị ya: “Gịnị ka nrọ a ị rọrọ pụtara? Ị̀ na-ekwu na mụ na nne gị na ụmụnne gị ga-abịa kpọọrọ gị isiala?” 11 Ụmụnne ya wee nwewere ya anyaụfụ,+ ma nna ya buuru ihe ahụ o kwuru n’obi.

12 Ụmụnne ya du ìgwè anụ nna ha gaa n’ebe ha ga-ata ahịhịa n’ebe dị nso na Shikem.+ 13 Mgbe e mechara, Izrel gwara Josef, sị: “Ọ̀ kwa ụmụnne gị nọ n’ebe dị nso na Shikem na-elekọta ìgwè anụ? Bịa ka m ziga gị ka ị gakwuru ha.” Josef sịrị ya: “Ejikerela m.” 14 Nna ya sịrị ya: “Biko, gaa mata ma ahụ́ ọ̀ dịkwa ụmụnne gị. Chọpụta otú ìgwè anụ ndị ahụ mere, gị abịa kọọrọ m.” O wee si na ndagwurugwu Hebrọn zipụ ya,+ ya agawa n’ụzọ e si aga Shikem. 15 Mgbe e mechara, otu nwoke hụrụ ya ka ọ na-akpagharị n’ọhịa. Nwoke ahụ jụrụ ya, sị: “Gịnị ka ị na-achọ?” 16 O wee sị ya: “M na-achọ ụmụnne m. Biko, gwa m, olee ebe ha nọ na-elekọta ìgwè anụ?” 17 Nwoke ahụ sịrị ya: “Ha esila ebe a pụọ, n’ihi na anụrụ m ka ha na-ekwu, sị, ‘Ka anyị gaanụ Dotan.’” Josef wee chọrọ ụmụnne ya gawa ma hụ ha na Dotan.

18 Ha hụrụ ya ka ọ nọ n’ebe dị anya. Tupu ya erute n’ebe ha nọ, ha malitere ịkpa nkata ka ha gbuo ya. 19 Ha wee gwa ibe ha, sị: “Lee, ọrọ nrọ abịawala.+ 20 Bịanụ ka anyị gbuo ya ma tụba ya n’otu n’ime olulu* ndị dị n’ebe a. Anyị ga-asịzi na ajọ anụ ọhịa adọgbuola ya. Ka anyị hụzie otú nrọ ya ga-esi mezuo.” 21 Mgbe Ruben+ nụrụ ihe a, ọ gbara mbọ ka ọ napụta ya n’aka ha. Ọ sịrị ha: “Ka anyị ghara igbu ya.”+ 22 Ruben sịziri ha: “Unu egbula mmadụ.*+ Tụbanụ ya n’olulu a dị n’ala ịkpa. Unu emerụla ya ahụ́.”+ O bu n’obi ịnapụta ya n’aka ha ka ọ kpọghachiri ya nna ya.

23 Ozugbo Josef bịakwutere ụmụnne ya, ha yipụrụ Josef uwe ya, ya bụ, uwe pụrụ iche o yi.+ 24 Ha kpọọrọ ya tụba n’olulu ahụ. N’oge ahụ, mmiri adịghị n’olulu ahụ.

25 Ha wee nọdụ ala ka ha rie nri. Mgbe ha lepụrụ anya, ha hụrụ ìgwè ndị Ishmel+ ka ha si Gilied na-abịa. Kamel ha bu mmanụ labdanọm, mmanụ balsam, na azụ osisi.*+ Ha na-aga Ijipt. 26 Juda wee sị ụmụnne ya: “Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị gbuo nwanne anyị ma kpuchie ọbara ya?+ 27 Bịanụ ka anyị resị ya+ ndị Ishmel, ka aka anyị ghara imetụ ya. A sị ka e kwuwe, ọ bụ nwanne anyị. Anyị na ya bụ otu ahụ́.” Ha wee gee nwanne ha ntị. 28 Mgbe ndị Ishmel, ya bụ, ndị Midian+ ndị na-azụ ahịa, na-agafe, ha dọpụtara Josef n’olulu ahụ ma resị ya ndị Ishmel. Ha rere ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri abụọ.+ Ndị ahụ kpọọrọ Josef banye n’Ijipt.

29 Mgbe e mechara, Ruben gaghachiri n’olulu ahụ ma hụ na Josef anọghị n’olulu ahụ, ya adọwaa uwe ya. 30 Mgbe ọ gaghachiri n’ebe ụmụnne ya nọ, o tiri mkpu, sị: “Nwatakịrị ahụ anọghịzi n’ebe ahụ! Gịnị ka m ga-eme?”

31 N’ihi ya, ha chịịrị uwe Josef, gbuo otu mkpi, bịanye uwe ahụ n’ọbara mkpi ahụ. 32 Mgbe e mechara, ha chịgaara nna ha uwe ahụ pụrụ iche, wee sị ya: “Lee ihe anyị hụrụ. Biko, leruo ya anya ka ị mara ma ọ̀ bụ uwe nwa gị ka ọ̀ bụ na ọ bụghị ya.”+ 33 O wee leruo ya anya ma tie mkpu, sị: “Ọ bụ uwe nwa m! Ọ ga-abụ na ajọ anụ ọhịa atagbuola Josef! Ọ ga-abụ na anụ ọhịa adọriela ya!” 34 Jekọb wee dọwaa uwe ya, kee ákwà iru uju n’úkwù ya ma ruoro nwa ya uju ọtụtụ ụbọchị. 35 Ụmụ ya ndị nwoke niile na ụmụ ya ndị nwaanyị niile nọ na-akasi ya obi, ma o kweghị ka a kasie ya obi. Ọ nọ na-asị: “M ga na-eruru nwa m uju ruo n’ili.”*+ Nna ya wee na-ebere ya ákwá.

36 Mgbe ndị Midian ruru Ijipt, ha resịrị Pọtịfa Josef. Pọtịfa na-eje ozi n’obí Fero,+ ọ bụkwa onyeisi ndị nche Fero.+

38 N’oge ahụ, Juda hapụrụ ụmụnne ya gaa maa ụlọikwuu ya n’ebe dị nso n’ebe otu nwoke Adọlam bi. Aha nwoke ahụ bụ Haịra. 2 Juda hụrụ nwa nwaanyị otu nwoke Kenan+ n’ebe ahụ. Aha nwoke ahụ bụ Shua. Juda wee lụọ nwa ya nwaanyị ahụ, ya na ya enwee mmekọahụ. 3 Nwaanyị ahụ wee dị ime, mechaa mụọ nwa nwoke. Juda wee gụọ ya Ea.+ 4 Ọ dịkwara ime ọzọ ma mụọ nwa nwoke wee gụọ ya Onan. 5 Ọ mụkwara nwa nwoke ọzọ ma gụọ ya Shila. Ha* nọ n’Akzib+ mgbe ọ mụrụ nwa ahụ.

6 Ka oge na-aga, Juda lụtaara Ea, ọkpara ya, nwaanyị. Aha nwaanyị ahụ bụ Tema.+ 7 Ma àgwà Ea, ọkpara Juda, adịghị Jehova mma. Jehova wee gbuo ya. 8 N’ihi ya, Juda gwara Onan, sị: “Gị na nwunye nwanne gị nwee mmekọahụ. Kuchie ya ka ị mụtara nwanne gị nwoke nwa.”+ 9 Ma Onan ma na nwa ọ ga-amụta agaghị abụ nke ya.+ N’ihi ya, mgbe ya na nwunye nwanne ya na-enwe mmekọahụ, ọ na-anyụfusị ọbara ọcha ya n’ala ka o wee ghara ịmụtara nwanne ya nwoke nwa.+ 10 Ihe ahụ o mere dị njọ n’anya Jehova. N’ihi ya, o gbukwara ya.+ 11 Juda sịziri Tema, nwunye nwa ya: “Biri n’ụlọ nna gị, alụkwala di ọzọ, ruo mgbe Shila nwa m toro.” Juda gwara ya ihe a maka na o kwuru n’obi ya, sị: “Shila nwekwara ike ịnwụ otú ụmụnne ya nwụrụ.”+ N’ihi ya, Tema gara biri n’ụlọ nna ya.

12 Mgbe obere oge gafere, nwunye Juda, bụ́ nwa Shua,+ nwụrụ. Juda wee ruoro ya uju. Mgbe Juda ruchaara ya uju, ọ gawara Timna,+ n’ebe ndị na-akpachara ya ajị atụrụ nọ. Ya na Haịra enyi ya, onye Adọlam,+ so gaa. 13 A kọọrọ Tema, sị: “Nna di gị na-aga Timna ịkpacha ajị atụrụ ya.” 14 N’ihi ya, o yipụrụ ákwà o yi na-eruru di ya uju, yiri ákwà ọzọ, jirikwa ákwà kpuchie onwe ya ka a ghara ịmata onye ọ bụ. Ọ gaziri nọrọ ọdụ n’ebe e si abanye Eneyim. Eneyim dị n’ụzọ gara Timna. Ihe mere Tema ji mee ihe a bụ na ọ hụrụ na Shila etoola, ma nna di ya akpọrọghị ya kpọnye Shila ka ọ lụwa ya.+

15 Mgbe Juda hụrụ Tema, o chere ozugbo na ọ bụ nwaanyị akwụna maka na o ji ákwà kpuchie ihu ya. 16 N’ihi ya, ọ gakwuuru ya n’akụkụ ụzọ, sị ya: “Biko, ka mụ na gị nwee mmekọahụ,” n’ihi na ọ maghị na ọ bụ nwunye nwa ya.+ Ma, Tema jụrụ ya, sị: “Gịnị ka ị ga-enye m ka mụ na gị nwee mmekọahụ?” 17 Juda wee sị ya: “M ga-esi n’ìgwè anụ m kpụtara gị nwa ewu.” Ma Tema jụrụ ya, sị: “Ị̀ ga-enye m ihe ibé ka m jide ruo mgbe ị ga-akpụnye m ya?” 18 Juda jụziri ya, sị: “Olee ihe ibé ị chọrọ ka m nye gị?” Tema zara ya, sị: “Mgbaaka i ji aka ihe akara+ na eriri gị na mkpara i ji n’aka.” O wee chịrị ha chịnye ya. Ya na ya nwere mmekọahụ, o wee dị ime. 19 Tema biliziri lawa gaa yipụ ákwà ahụ ma yiri ákwà o ji na-eruru di ya uju.

20 Juda dunyere enyi ya, onye Adọlam,+ ka ọ gaa kpụgara nwaanyị ahụ nwa ewu ahụ ma nata ya ihe ibé ahụ. Ma enyi ya ahụghị nwaanyị ahụ. 21 Enyi ya jụrụ ndị obodo nwaanyị ahụ, sị: “Olee akwụna ahụ* nke na-anọ n’akụkụ ụzọ Eneyim?” Ma ha sịrị ya: “E nwetụbeghị akwụna n’ebe a.” 22 N’ikpeazụ, enyi Juda laghachikwuuru Juda, sị ya: “Ahụghị m nwaanyị ahụ. Ndị obodo ahụ sịkwara na e nwetụbeghị akwụna n’ebe ahụ.” 23 N’ihi ya, Juda sịrị: “Hapụ ya ka o werewe ihe ndị ahụ ka anyị ghara ibutere onwe anyị mkparị. A sị ka e kwuwe, m kpụnyere gị nwa ewu a ka ị gaa kpụnye ya, ma ị hụghị ya.”

24 Ma mgbe ihe dị ka ọnwa atọ gachara, a kọọrọ Juda, sị: “Tema nwunye nwa gị agbaala akwụna, ọ tụrụkwala ime n’akwụna ọ gbara.” Juda wee sị: “Kpọpụtanụ ya ka a kpọọ ya ọkụ.”+ 25 Mgbe a na-akpọpụta ya, o zigaara nna di ya ozi, sị: “Ọ bụ nwoke nwe ihe ndị a tụwara m ime.” Ọ sịkwara: “Biko, leruo ihe ndị a anya ka ị mata onye nwe ha, ya bụ, mgbaaka e ji aka ihe akara na eriri na mkpara.”+ 26 Juda wee leruo ha anya, sị: “Ọ bụ onye ezi omume karịa m maka na akpọrọghị m ya kpọnye Shila nwa m.”+ Juda na Tema enweghịkwa mmekọahụ ọzọ.

27 Mgbe oge ruru ka ọ mụọ nwa, ọ bụ ejima ka o bu n’afọ. 28 Mgbe ọ na-amụ nwa, otu n’ime ụmụ ya sepụtara aka ya. Ozugbo ahụ, nwaanyị na-aghọ́ nwa kere ya ibé ákwà na-acha uhie uhie n’aka, sị: “Ọ bụ onye a bu ụzọ pụta.” 29 Ma ozugbo nwa ahụ seere aka ya, nwanne ya nwoke pụtara. Nwaanyị na-aghọ́ nwa wee tie mkpu, sị: “Legodị otú ahụ́ nne gị si gbawaa mgbe ị na-apụta!” N’ihi ya, a gụrụ ya Pirez.*+ 30 Mgbe e mechara, nwanne ya ahụ e kere ibé ákwà na-acha uhie uhie n’aka pụtara, a gụọ ya Zira.+

39 A kpọọrọ Josef gbadata n’Ijipt,+ Pọtịfa+ onye Ijipt wee zụrụ ya. Pọtịfa na-eje ozi n’obí Fero, ọ bụkwa onyeisi ndị nche Fero. Ọ zụrụ Josef n’aka ndị Ishmel+ ahụ kpọ ya gbadata n’Ijipt. 2 Ma Jehova nọnyeere Josef.+ N’ihi ya, ihe nọ na-agaziri ya, e mekwara ya onye na-elekọta ụlọ nna ya ukwu, onye Ijipt. 3 Nna ya ukwu hụrụ na Jehova nọnyeere ya nakwa na Jehova na-eme ka ihe niile ọ na-eme na-aga nke ọma.

4 Ihe Josef nọ na-amasị nna ya ukwu, Josef ghọkwara onye ozi ya ọ tụkwasịrị obi. N’ihi ya, o mere ya onye na-elekọta ụlọ ya, o nyefekwara ya ihe niile o nwere. 5 Malite n’oge o mere ya onye na-elekọta ụlọ ya na onye na-ahụ maka ihe niile o nwere, Jehova nọ na-agọzi ụlọ onye Ijipt ahụ n’ihi Josef. Jehova nọkwa na-agọzi ihe niile o nwere n’ụlọ nakwa n’ubi.+ 6 O nyefeziri Josef ihe niile o nwere ka o lekọtawa. E nweghịkwa ihe ọ bụla ọ na-etinye uche na ya, ma e wepụ nri ọ na-eri. Josef bịakwara gbaa dimkpa ma maa mma nwoke.

7 Mgbe ihe ndị a mechara, nwunye nna ukwu Josef malitere ile Josef anya, na-asị ya: “Ka mụ na gị dinaa.” 8 Ma Josef jụrụ, ọ gwakwara nwunye nna ya ukwu, sị: “Lee, nna m ukwu amaghị ihe ndị dị n’aka m n’ụlọ a. O nyefeekwala m ihe niile o nwere ka m lekọtawa. 9 E nweghị onye karịrị m n’ụlọ a. O nyefere ihe niile n’aka m ma e wepụ gị maka na ị bụ nwunye ya. Gịnịzi mere m ga-eji eme ihe a jọgburu onwe ya ma mehie Chineke?”+

10 Kwa ụbọchị, nwaanyị ahụ na-enye Josef nsogbu, ma Josef ekweghị ka ya na ya dinaa ma ọ bụ ka ya na ya nọrọ. 11 Otu ụbọchị, Josef banyere n’ụlọ ka ọ rụọ ọrụ ya, ma e nweghị otu onye n’ime ndị na-eje ozi n’ụlọ ahụ nọ n’ụlọ. 12 Nwaanyị ahụ jidere ya n’uwe, sị ya: “Ka mụ na gị dinaa!” Ma Josef hapụụrụ ya uwe ya gbapụ n’èzí. 13 Ozugbo ọ hụrụ na Josef hapụụrụ ya uwe ya gbapụ n’èzí, 14 ọ malitere iti mkpu, na-agwa ụmụ nwoke na-eje ozi n’ụlọ ya, sị: “Leenụ, ọ kpọtaara anyị nwoke Hibru a ka o jiri anyị mere ihe ọchị. Ọ bịakwutere m ka o dinaa m, ma m malitere itisi mkpu ike. 15 Ozugbo ọ nụrụ mkpu m na-eti, ọ hapụrụ uwe ya n’akụkụ m gbapụ n’èzí.” 16 Mgbe e mechara, nwaanyị ahụ chịsara uwe Josef n’akụkụ ya ruo mgbe nna ukwu Josef lọtara.

17 O wee gwa di ya otu ihe ahụ, sị: “Onye Hibru ahụ na-eje ozi ị kpọtaara anyị bịakwutere m ka o jiri m mere ihe ọchị. 18 Ma ozugbo m malitere iti mkpu, ọ hapụrụ uwe ya n’akụkụ m gbapụ n’èzí.” 19 Ozugbo nna ukwu Josef nụrụ ihe nwunye ya kwuru, sị: “Ọ bụ ihe a ka onye na-ejere gị ozi mere m,” o were oké iwe. 20 N’ihi ya, nna ukwu Josef kpọọrọ ya tụba n’ụlọ mkpọrọ, n’ebe a na-akpọchi ndị mkpọrọ eze. O wee nọrọ n’ebe ahụ, n’ụlọ mkpọrọ.+

21 Ma Jehova ka nọnyeere Josef, ọ hụkwara ya n’anya* ma na-eme ka ihe ya na-amasị onyeisi ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ.+ 22 N’ihi ya, onyeisi ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ nyefere ndị mkpọrọ niile nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ n’aka Josef. Ọ bụ Josef na-ahụ na ha mere ihe niile ha kwesịrị ime n’ebe ahụ.+ 23 Onyeisi ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ anaghị etinye anya n’ihe ọ bụla o nyefere n’aka Josef maka na Jehova nọnyeere Josef. Jehova mekwara ka ihe niile Josef na-eme na-aga nke ọma.+

40 Mgbe ihe ndị a mechara, onyeisi ndị na-ebunye eze Ijipt mmanya+ na onyeisi ndị na-emere ya achịcha mejọrọ onyenwe ha, bụ́ eze Ijipt. 2 N’ihi ya, Fero wesara mmadụ abụọ ahụ na-ejere ya ozi iwe, ya bụ, onyeisi ndị na-ebunye ya mmanya na onyeisi ndị na-emere ya achịcha.+ 3 O wee tụba ha n’ụlọ nga dị n’ụlọ onyeisi ndị nche,+ bụ́ ebe a tụrụ Josef mkpọrọ.+ 4 Onyeisi ndị nche nyefeziri ha n’aka Josef ka o lekọtawa ha.+ Ha wee nọrọ n’ụlọ nga ruo oge* ụfọdụ.

5 Onye na-ebunye eze Ijipt mmanya na onye na-emere ya achịcha, bụ́ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ, rọrọ nrọ n’otu abalị. Nrọ onye nke ọ bụla n’ime ha nwere ihe ọ pụtara. 6 Mgbe chi bọrọ, Josef batara hụ ha, ma ihu ha gbarụrụ agbarụ. 7 N’ihi ya, Josef jụrụ ndị ahụ na-ejere Fero ozi, bụ́ ndị ya na ha nọ n’ụlọ nga dị n’ụlọ nna ya ukwu, sị: “Gịnị mere ihu unu ji gbarụọ taa?” 8 Ha wee sị ya: “Anyị abụọ n’otu n’otu rọrọ nrọ, ma e nweghị onye na-akọwa nrọ anyị na ya nọ.” Josef sịziri ha: “Ọ̀ bụ na ọ bụghị Chineke na-akọwa nrọ?+ Biko, kọọrọnụ m ya.”

9 Onyeisi ndị na-ebunye eze mmanya wee kọọrọ Josef nrọ ya, sị: “Ná nrọ m, e nwere osisi vaịn dị n’ihu m. 10 Osisi vaịn ahụ nwekwara alaka atọ. Mgbe ọ na-epu akwụkwọ ọhụrụ, ọ mara ifuru, mkpụrụ ọ mịrị n’ụyọkọ n’ụyọkọ chakwara. 11 Eji m iko Fero n’aka, m wee were mkpụrụ vaịn ndị ahụ pịnye mmiri ha n’iko Fero. Mgbe m pịnyechara ha, m bunyere Fero iko ahụ.” 12 Josef sịziri ya: “Lee ihe nrọ gị pụtara: Alaka atọ ahụ bụ ụbọchị atọ. 13 N’ụbọchị atọ taa, Fero ga-akpọpụta gị, nyeghachi gị ọrụ gị.+ Ị ga-ebunyekwa Fero iko ya otú ị na-emebu mgbe ị bụ onye na-ebunye ya mmanya.+ 14 Ma, chetakwa m mgbe ihe gaziiri gị. Biko, meere m ebere* ma kọọrọ Fero banyere m, ka e wee kpọpụta m n’ebe a. 15 N’eziokwu, e si n’ala ndị Hibru tọrọ m,+ emeghịkwa m ihe ọ bụla n’ebe a mere ha ga-eji tụba m n’ụlọ mkpọrọ.”*+

16 Mgbe onyeisi ndị na-emere eze achịcha hụrụ na ihe Josef kọwara dị mma, ọ gwara Josef, sị: “Ná nrọ nke m, ebu m nkata atọ n’isi, achịcha na-acha ọcha dịkwa n’ime nkata ndị ahụ. 17 Ụdị achịcha dị iche iche e meere Fero dịkwa n’ime nkata nke dị n’elu elu. E nwekwara nnụnụ ndị nọ na-eri achịcha ndị ahụ dị na nkata ahụ m bu n’isi.” 18 Josef gwaziri ya, sị: “Lee ihe nrọ gị pụtara: Nkata atọ ahụ bụ ụbọchị atọ. 19 N’ụbọchị atọ taa, Fero ga-egbupụ gị isi ma kwụwa gị n’osisi, nnụnụ ga-erikwa anụ gị.”+

20 Ụbọchị nke atọ ahụ bụ ụbọchị Fero na-echeta ụbọchị a mụrụ ya.+ O wee meere ndị niile na-ejere ya ozi oriri. Ọ kpọpụtara onyeisi ndị na-ebunye ya mmanya na onyeisi ndị na-emere ya achịcha n’ihu ndị na-ejere ya ozi. 21 Fero nyeghachiri onyeisi ndị na-ebunye ya mmanya ọrụ ọ na-arụbu, ya ebunyewekwa ya mmanya. 22 Ma ọ kwụwara onyeisi ndị na-emere ya achịcha n’osisi, otú Josef kwuru mgbe ọ na-akọwara ha nrọ.+ 23 Ma, onyeisi ndị na-ebunye eze mmanya echetaghị Josef. O chefuru ya.+

41 Mgbe afọ abụọ gwụrụ, Fero rọrọ nrọ+ ebe o guzo n’akụkụ Osimiri Naịl. 2 Ná nrọ ahụ, ọ hụrụ ka ehi asaa mara mma ma buo ibu si n’Osimiri Naịl na-apụta, ha nọkwa na-ata ahịhịa ndị dị n’akụkụ osimiri ahụ.+ 3 Ọ hụkwara ehi asaa ọzọ jọrọ njọ ma taa ahụ́ ka ha si n’Osimiri Naịl na-apụta mgbe ndị nke mbụ ahụ pụtachara. Ha guzo n’akụkụ ehi ndị ahụ buru ibu ndị nọ n’akụkụ Osimiri Naịl. 4 Ehi ndị ahụ jọrọ njọ ma taa ahụ́ maliteziri iri ehi asaa ahụ mara mma ma buo ibu. Fero wee teta.

5 Ụra buuru Fero ọzọ, o wee rọọ nrọ ọzọ. Ná nrọ a, ọ hụrụ oko ọka* asaa mịrị n’otu okporo ọka. Ọka ndị ahụ juru eju, maakwa mma n’anya.+ 6 Ọ hụkwara oko ọka asaa ọzọ ndị mịrị mgbe ndị nke mbụ ahụ mịchara. Ọka ndị ahụ fịkpọrọ afịkpọ, ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ mekwara ka ha kpọọ nkụ. 7 Oko ọka ndị ahụ fịkpọrọ afịkpọ malitekwara ilo oko ọka asaa ahụ juru eju ma mma mma n’anya. Fero wee teta n’ụra ma ghọta na ọ bụ nrọ ka ọ na-arọ.

8 Ma n’ụtụtụ, obi ezughị ya ike. N’ihi ya, o ziri ozi, e wee kpọọrọ ya ndị niile bụ́ ndị dibia anwansi n’Ijipt na ndị niile ma ihe n’Ijipt. Fero kọọrọ ha nrọ ndị ọ rọrọ, ma e nweghị onye nwere ike ịkọwara Fero nrọ ndị ahụ.

9 Onyeisi ndị na-ebunye Fero mmanya wee gwa Fero, sị: “Ana m ekwupụta mmehie m taa. 10 Fero wesara ndị na-ejere ya ozi iwe. N’ihi ya, ọ tụbara m n’ụlọ nga nke dị n’ụlọ onyeisi ndị nche, ma mụnwa ma onyeisi ndị na-emere ya achịcha.+ 11 Mgbe e mechara, anyị abụọ n’otu n’otu rọrọ nrọ n’otu abalị. Nrọ onye nke ọ bụla n’ime anyị nwere ihe ọ pụtara.+ 12 Ma e nwere nwa okorobịa Hibru anyị na ya nọ n’ebe ahụ. Ọ bụ onye na-ejere onyeisi ndị nche ozi.+ Mgbe anyị kọọrọ ya nrọ anyị,+ ọ kọwaara onye nke ọ bụla n’ime anyị ihe nrọ ya pụtara. 13 Ihe niile mere kpọmkwem otú o si kọwaara anyị ha. E nyeghachiri m ọrụ m, ma a kwụwara onye nke ọzọ n’osisi.”+

14 Fero wee zie ozi ka a kpọọ Josef,+ ha sikwa n’ụlọ mkpọrọ* kpọpụta ya ngwa ngwa.+ Ọ kpụrụ isi ya na ajị agba ya, gbanweekwa uwe ya ma gakwuru Fero. 15 Fero gwaziri Josef, sị: “Arọrọ m nrọ, ma e nweghị onye nwere ike ịkọwa ya. Ma, anụla m na ọ bụrụ na a kọọrọ gị nrọ na i nwere ike ịkọwa ya.”+ 16 Josef wee sị Fero: “E nweghị ihe m bụ. Ọ bụ Chineke ga-agwa Fero ihe ga-adị ya mma.”+

17 Fero wee kọọrọ Josef, sị: “Arọrọ m nrọ ebe m guzo n’akụkụ Osimiri Naịl. 18 Ná nrọ ahụ, m hụrụ ka ehi asaa mara mma ma buo ibu si n’Osimiri Naịl na-apụta. Ha malitekwara ịta ahịhịa ndị dị n’akụkụ Osimiri Naịl.+ 19 M hụziri ehi asaa ọzọ ndị pụtara mgbe ndị nke mbụ ahụ pụtachara. Ha na-asọ oyi, jọọkwa njọ ma taa ahụ́. Ahụtụbeghị m ehi jọrọ njọ otú ahụ n’Ijipt niile. 20 Ehi ndị ahụ tara ahụ́ ma jọọ njọ malitere iri ehi asaa mbụ ahụ buru ibu. 21 Ma mgbe ha richara ha, mmadụ enweghị ike ịma na ha riri anụ ndị ahụ n’ihi na ha ka jọrọ njọ ma taa ahụ́ otú ha dịbu. M wee teta.

22 “M mechara rọọ nrọ ọzọ. Ná nrọ a, m hụrụ oko ọka asaa mịrị n’otu okporo ọka. Ọka ndị ahụ juru eju, maakwa mma n’anya.+ 23 M hụkwara oko ọka asaa ọzọ ndị mịrị mgbe ndị nke mbụ ahụ mịchara. Ọka ndị ahụ fịkpọrọ afịkpọ, pee mpe, ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ mekwara ka ha kpọọ nkụ. 24 Oko ọka ndị ahụ pere mpe malitere ilo oko ọka asaa ahụ mara mma n’anya. M wee kọọrọ ndị dibia anwansi+ ihe a m rọrọ ná nrọ, ma e nweghị onye nwere ike ịkọwara m ya.”+

25 Josef wee sị Fero: “Nrọ Fero rọrọ bụ otu. Ọ bụ ihe ezi Chineke ga-eme ka ọ gwara Fero.+ 26 Ehi asaa ahụ mara mma bụ afọ asaa. Oko ọka asaa ahụ dị mma bụkwa afọ asaa. Nrọ abụọ ahụ bụ otu. 27 Ehi asaa ahụ tara ahụ́ ma jọọ njọ, bụ́ ndị pụtara mgbe ndị nke mbụ ahụ pụtachara, bụ afọ asaa. Oko ọka asaa ahụ ihe na-adịghị, bụ́ ndị ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ mere ka ha kpọọ nkụ, ga-abụ afọ asaa a ga-enwe ụnwụ. 28 Ọ bụ nnọọ ihe ahụ m gwara Fero: Ezi Chineke emeela ka Fero hụ ihe ọ chọrọ ime.

29 “A ga-enwe afọ asaa nri ga-eju ebe niile n’Ijipt. 30 Ma afọ asaa ahụ gachaa, a ga-enwe afọ asaa ụnwụ ga-adị ebe niile. A ga-echefukwa oge ahụ nri juru ebe niile n’Ijipt. Ụnwụ ahụ ga-emebisị ala a.+ 31 Ụnwụ ahụ ga-emekwa ka a ghara icheta na e nwere mgbe nri juru n’ala a n’ihi na ọ ga-akpụ ọkụ n’ọnụ. 32 E mere ka Fero rọọ nrọ ahụ ugboro abụọ maka na ezi Chineke ekpebiela na ihe a ga-emerịrị. Ezi Chineke ga-eme ya n’oge na-adịghị anya.

33 “Ugbu a, ka Fero chọta nwoke nwere uche, nke makwa ihe ma mee ya onyeisi n’ala Ijipt. 34 Ka Fero mee ihe a: ka ọ họpụta ndị ga na-elekọta ebe dị iche iche n’ala a. Fero ga-achịkọtakwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ihe niile ala Ijipt ga-emepụta n’ime afọ asaa ahụ nri ga-eju ebe niile.+ 35 Ka ha chịkọta nri niile ala ga-emepụta n’afọ ndị a nri ga-eju ebe niile. Ka ha kpokọtakwa ọka n’obodo dị iche iche ma chekwaa ha n’ebe ahụ. Ọka ndị a ga-abụ nke Fero.+ 36 A ga na-eri ihe oriri ndị ahụ n’ime afọ asaa ahụ ụnwụ ga-adị n’Ijipt, ka ụnwụ ahụ ghara ịla ala a n’iyi.”+

37 Ihe a o kwuru dị Fero na ndị niile na-ejere ya ozi mma. 38 Fero wee gwa ndị na-ejere ya ozi, sị: “È nwere ike ịchọta nwoke ọzọ dị ka onye a mmụọ Chineke na-arụ ọrụ n’ime ya?” 39 Fero gwaziri Josef, sị: “Ebe ọ bụ na Chineke emeela ka ị mara ihe a niile, e nweghị onye nwere uche ma mara ihe ka gị. 40 Ọ bụ gị ga na-elekọta ụlọ m, ndị obodo m niile ga na-erubekwara gị isi.+ Ọ bụ naanị mụnwa bụ́ eze ga-aka gị ukwuu.” 41 Fero gwakwara Josef, sị: “Lee, m na-eme gị onyeisi n’ala Ijipt niile.”+ 42 Fero wee gbapụta mgbaaka o ji aka ihe akara gbanye ya Josef n’aka ma yiwe ya ezigbo uwe e ji ákwà linin kpaa, nyawakwa ya ihe olu ọlaedo n’olu. 43 O nyekwara ya ụgbọ ịnyịnya ya nke abụọ kacha mma ka o jiri ya gbagharịa. Mgbe ọ nọ n’elu ụgbọ ịnyịnya ahụ, ndị mmadụ nọ na-eti mkpu n’ihu ya, sị, “Avrek!”* Fero si otú a mee ya onyeisi n’ala Ijipt niile.

44 Fero gwakwara Josef, sị: “Ọ bụ m bụ Fero, ma e nweghị onye ga-eme otu mkpụrụ ihe* n’Ijipt niile ma ọ bụrụ na i nyeghị onye ahụ ikike.”+ 45 Mgbe e mechara, Fero gụrụ Josef Zafenat-pania ma kpọnye ya Asinat+ nwa Pọtifera ka ọ bụrụ nwunye ya. Pọtifera bụ onye nchụàjà Ọn.* Josef wee malite ilekọta Ijipt.*+ 46 Josef dị afọ iri atọ+ mgbe ọ bịara n’ihu Fero eze Ijipt.*

Josef wee si n’ihu Fero pụọ gagharịa Ijipt niile. 47 N’ime afọ asaa ahụ nri juru ebe niile, ala ahụ mepụtara nri nke ukwuu. 48 Ọ nọ na-achịkọta nri niile ala Ijipt mepụtara n’afọ asaa ahụ. Ọ na-ekpokọta ha n’obodo dị iche iche. N’obodo nke ọ bụla, ọ na-achịkọta nri si n’ubi ndị gbara obodo ahụ gburugburu ma chekwaa ha n’obodo ahụ. 49 Josef nọ na-ekpokọta ọka n’ụba. Ọka ndị ahụ hiri nnọọ nne ka ájá dị n’oké osimiri. Ọ nọ na-ekpokọta ha ruo mgbe ha mechara kwụsị ịtụ ha atụ̀ maka na e nweghịzi ike ịtụ ha atụ̀.

50 Tupu afọ a ga-enwe ụnwụ ahụ eruo, a mụụrụ Josef ụmụ nwoke abụọ.+ Ọ bụ Asinat nwa Pọtifera, onye nchụàjà Ọn,* mụụrụ ya ụmụ ahụ. 51 Josef gụrụ nke ọkpara Manase,*+ maka na ọ sịrị, “Chineke emeela ka m chefuo nsogbu m niile nakwa ezinụlọ nna m niile.” 52 Ọ gụkwara nwa ya nke abụọ Ifrem,*+ maka na ọ sịrị, “Chineke emeela ka m mụọ ọmụmụ n’ala ebe m nọ hụjuo anya.”+

53 Afọ asaa ahụ nri juru ebe niile n’Ijipt wee gwụ.+ 54 Afọ asaa ahụ a ga-enwe ụnwụ wee malite otú Josef kwuru.+ Ụnwụ ahụ dara n’ebe niile. Ma nri* dị n’Ijipt niile.+ 55 N’ikpeazụ, ụnwụ ahụ malitere ịkpa ndị mmadụ aka n’ebe niile n’Ijipt. Ndị mmadụ wee malite ịrịọ Fero ka o nye ha nri.+ Fero gwaziri ndị Ijipt niile, sị: “Gakwurunụ Josef. Meenụ ihe ọ bụla ọ gwara unu.”+ 56 Ụnwụ ahụ nọ na-akpa ndị bi n’ebe niile n’ụwa aka ọjọọ.+ Josef wee malite imeghe ebe niile e kposara ọka ma na-eresị ya ndị Ijipt+ maka na ụnwụ ahụ na-akpazi ndị Ijipt aka ọjọọ. 57 Ndị si n’ebe niile n’ụwa bịakwara n’Ijipt ka ha si n’aka Josef zụrụ nri, n’ihi na ụnwụ ahụ nọ na-akpa ndị bi n’ebe niile n’ụwa aka ọjọọ.+

42 Mgbe Jekọb nụrụ na ọka* dị n’Ijipt,+ ọ gwara ụmụ ya ndị nwoke, sị: “Gịnị mere unu ji nọrọ na-ele ibe unu n’anya?” 2 Ọ sịkwara ha: “Anụrụ m na ọka dị n’Ijipt. Gaanụ ebe ahụ zụtara anyị ọka, ka anyị wee dị ndụ ma ghara ịnwụ.”+ 3 Ụmụnne Josef iri+ wee gawa ịzụta ọka n’Ijipt. 4 Ma Jekọb ekweghị ka Benjamin,+ nwanne Josef, soro ụmụnne ya ndị nke ọzọ gaa, n’ihi na ọ sịrị: “Ihe nwere ike ime ya, ya anwụọ.”+

5 Ụmụ Izrel* wee rute Ijipt, ha na ndị ọzọ bịara ịzụ ihe oriri, n’ihi na ụnwụ ahụ ruru Kenan.+ 6 Ọ bụ Josef bụ onyeisi n’Ijipt,+ ọ bụkwa ya na-eresị ndị si n’ebe niile n’ụwa ọka.+ N’ihi ya, ụmụnne Josef bịara hulata kpọọrọ ya isiala.+ 7 Mgbe Josef hụrụ ụmụnne ya, ọ matara ha ozugbo, ma o mere ka ha ghara ịmata ya.+ N’ihi ya, o ji olu ike gwa ha okwu, sị ha: “Ebee ka unu si bịa?” Ha sịrị ya: “Anyị si Kenan bịa ka anyị zụrụ ihe oriri.”+

8 Otú ahụ ka Josef si mata ụmụnne ya, ma ha amataghị ya. 9 Ozugbo ahụ, Josef chetara nrọ ndị ọ rọrọ banyere ha.+ O wee gwa ha, sị: “Unu bụ ndị nnyopụta! Unu bịara ka unu chọpụta ebe ndị unu nwere ike isi bata lụso anyị agha.” 10 Ha wee sị ya: “Mba, onyenwe anyị, kama ndị ohu gị bịara ịzụ ihe oriri. 11 Ọ bụ otu nwoke mụrụ anyị niile. Anyị na-akwụwa aka ọtọ. Ndị ohu gị abụghị ndị nnyopụta.” 12 Ma ọ sịrị ha: “Ọ bụghị eziokwu! Unu bịara ka unu chọpụta ebe ndị unu nwere ike isi bata lụso anyị agha.” 13 Ha sịziri ya: “Ndị ohu gị dị ụmụnne iri na abụọ.+ Ọ bụ otu nwoke bi na Kenan mụrụ anyị niile.+ Nwanne anyị nke ọdụdụ na nna anyị nọ ugbu a,+ ma onye nke ọzọ anọghịzi.”+

14 Ma Josef sịrị ha: “Ihe m gwara unu bụ otú ọ dị. ‘Unu bụ ndị nnyopụta.’ 15 M ga-eji ihe a nwalee unu: Eji m Fero aṅụ iyi na unu agaghị esi ebe a laa, ọ gwụla ma nwanne unu nke ọdụdụ ọ̀ bịara ebe a.+ 16 Zipụnụ otu onye n’ime unu ka ọ gaa kpọta nwanne unu, ma a ga-akpọchi unu. M ga-esi otú a mara ma ùnu na-ekwu eziokwu. Ma ọ bụrụ na unu emeghị ihe a, eji m Fero na-aṅụ iyi, na-agwa unu na unu bụ ndị nnyopụta.” 17 O wee tụba ha n’otu ụlọ mkpọrọ ruo ụbọchị atọ.

18 N’ụbọchị nke atọ, Josef gwara ha, sị: “Meenụ ihe a ka unu wee dịrị ndụ, n’ihi na m na-atụ egwu Chineke. 19 Ọ bụrụ na unu na-akwụwa aka ọtọ, ka otu n’ime ụmụnne unu nọrọ n’ụlọ ebe a kpọchiri unu. Ma ndị nke ọzọ n’ime unu nwere ike ịga buru ọka bulaara ndị ezinụlọ unu ụnwụ na-akpa aka ọjọọ.+ 20 Unu ga-akpọtaziri m nwanne unu nke ọdụdụ, ka unu wee gosi na ihe unu kwuru bụ eziokwu, unu agaghịkwa anwụ.” Ha wee mee otú ahụ.

21 Ha gwara ibe ha, sị: “O doro anya na ọ bụ n’ihi nwanne anyị nwoke ka e ji na-ata anyị ahụhụ,+ maka na anyị hụrụ otú o si na-ewute ya mgbe ọ na-arịọ anyị ka anyị meere ya ebere, ma anyị egeghị ya ntị. Ọ bụ ya mere nsogbu a ji bịara anyị.” 22 Ruben wee gwa ha, sị: “Ọ̀ bụ na mụ asịghị unu, ‘Unu emela nwata ahụ ihe ọjọọ,’* ma unu egeghị m ntị?+ Ugbu a, anyị na-aza ajụjụ maka ọbara ya.”+ 23 Ma ha amaghị na Josef ghọtara ihe ha na-ekwu ebe ọ bụ na e nwere onye na-asụgharị ihe ha na-ekwu. 24 Josef sizi n’ebe ha nọ pụọ wee malite ibe ákwá.+ Mgbe ọ lọghachiri, ya na ha kwuru okwu ọzọ, ya akpọrọzie Simiọn+ kee ya agbụ n’ihu ha.+ 25 Josef nyere iwu ka e kpojuo ọka n’akpa ha, ka e tinye ego onye nke ọ bụla n’ime akpa ya, nakwa ka e nye ha ihe ha ga-eri n’ụzọ. E meere ha otú ahụ.

26 Ha wee bukwasị ọka ha n’elu jakị ha, si n’ebe ahụ lawa. 27 Mgbe otu onye n’ime ha meghere akpa ya n’ebe ha ga-arahụ ka o nye jakị ya nri, ọ hụrụ ego ya n’ọnụ akpa ya. 28 O wee gwa ụmụnne ya, sị: “E weghachiri ego m. Ọ dị n’akpa m!” Obi wee wụnye ha n’afọ, ahụ́ mawakwara ha jijiji, ha asị ibe ha: “Gịnị bụ ihe a Chineke mere anyị?”

29 Mgbe ha lọghachikwutere Jekọb nna ha na Kenan, ha kọọrọ ya ihe niile mere ha. Ha sịrị ya: 30 “Onyeisi obodo ahụ ji olu ike gwa anyị okwu.+ Ọ sịkwara na anyị bịara inyopụta obodo ahụ. 31 Ma anyị gwara ya, sị, ‘Anyị na-akwụwa aka ọtọ. Anyị abụghị ndị nnyopụta.+ 32 Anyị dị ụmụnne iri na abụọ.+ Ọ bụ otu nna mụrụ anyị. Otu onye anọghịzi.+ Nwanne anyị nke ọdụdụ na nna anyị nọkwa ugbu a na Kenan.’+ 33 Ma onyeisi obodo ahụ sịrị anyị, ‘M ga-eji ihe a mara na unu na-akwụwa aka ọtọ: Hapụnụ otu nwanne unu ka mụ na ya nọrọ.+ Burunụ nri lawa ka unu bulaara ndị ezinụlọ unu ụnwụ na-akpa aka ọjọọ.+ 34 Kpọtaranụ m nwanne unu nke ọdụdụ, ka m wee mara na unu abụghị ndị nnyopụta, kama na unu na-akwụwa aka ọtọ. M ga-akpọnyezi unu nwanne unu, unu ga na-azụrụkwa nri n’ala a.’”

35 Mgbe ha na-ewepụtasị ihe dị n’akpa ha, ego onye nke ọ bụla dị n’akpa ya. Mgbe ha na nna ha hụrụ akpa ego ha, egwu tụwara ha. 36 Jekọb nna ha tiri mkpu, sị ha: “Ọ bụ m ka unu na-agbawa aka ụmụ!+ Josef anọghịzi.+ Simiọn anọghịzi,+ unu chọkwara ịkpọrọ Benjamin! Ọ bụ m ka ihe a niile na-eme!” 37 Ma Ruben gwara nna ya, sị: “I nwere ike igbu ụmụ m abụọ ma ọ bụrụ na mụ akpọghachighịrị gị ya.+ Nyefee m ya n’aka. M ga-akpọghachitere gị ya.”+ 38 Ma, Jekọb sịrị: “Nwa m agaghị eso unu gaa, n’ihi na nwanne ya nwoke anwụọla. Ọ bụ naanị ya fọrọ.+ Ọ bụrụ na ihe emee ya n’ụzọ, ya anwụọ, unu ga-eme ka m rugide uju+ n’isi awọ́ m nwụọ.”+

43 Ụnwụ ahụ ji ndị mmadụ aka ọjọọ n’ala ahụ.+ 2 Mgbe ha richara ọka* ha butere n’Ijipt,+ nna ha sịrị ha: “Gaghachinụ zụta obere ihe oriri anyị ga-eri.” 3 Juda wee sị ya: “Nwoke ahụ dọsiri anyị aka ná ntị ike, sị, ‘Unu abịakwala ịhụ m ọzọ ma ọ bụrụ na nwanne unu esoghị unu bịa.’+ 4 Ọ bụrụ na i kwe ka nwanne anyị soro anyị, anyị ga-aga zụtara gị ihe oriri. 5 Ma ọ bụrụ na i kweghị ka o soro anyị, anyị agaghị aga, n’ihi na nwoke ahụ gwara anyị, sị, ‘Unu abịakwala ịhụ m ọzọ ma ọ bụrụ na nwanne unu esoghị unu bịa.’”+ 6 Izrel+ wee jụọ ha, sị: “Gịnị mere unu ji gwa nwoke ahụ na unu nwere nwanne nwoke ọzọ wee kpatara m nsogbu a?” 7 Ha zara ya, sị: “Nwoke ahụ jụrụ ajụjụ kpọmkwem banyere anyị na ndị ezinụlọ anyị, sị, ‘Nna unu ọ̀ ka nọ ndụ? Ùnu nwere nwanne nwoke ọzọ?’ anyị wee gwa ya eziokwu.+ È nwere otú anyị ga-esi ama na ọ ga-asị anyị, ‘Kpọtanụ nwanne unu nwoke’?”+

8 Juda gwaziri Izrel nna ya, sị: “Kpọnye m nwa a ka anyị gawa,+ ka anyị wee dị ndụ ghara ịnwụ,+ ma anyịnwa ma gịnwa ma ụmụ anyị.+ 9 M ga-ahụ na e nweghị ihe ga-eme ya.+ Ọ bụ m ga-aza ajụjụ maka ya. Ọ bụrụ na mụ akpọlataghị ya kpọnye gị, ọ pụtara na emehiela m gị ná ndụ m niile. 10 Ma a sị na ọ bụghị oge anyị nọ na-egbu, anyị gaarala aga ebe ahụ ugboro abụọ lọta.”

11 Izrel nna ha wee sị ha: “Ọ bụrụ na ọ ga-esorịrị unu, meenụ ihe a: Werenụ ihe ndị a kacha mma ala a mepụtara tinye n’akpa unu, burukwanụ ha bugara nwoke ahụ ka ọ bụrụ onyinye unu ga-enye ya:+ obere mmanụ balsam,+ obere mmanụ aṅụ, eso* labdanọm, azụ osisi,*+ mkpụrụ pistashio, na almọnd. 12 Werenụ ego ole unu jibu gaa okpukpu abụọ, nyeghachikwanụ ha ego ahụ e tinyere n’ọnụ akpa unu.+ O nwere ike ịbụ na e tinyere ha n’amaghị ụma. 13 Kpọrọnụ nwanne unu gawa. Gaghachikwurunụ nwoke ahụ. 14 Ka Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile mee ka nwoke ahụ metere unu ebere, ka o wee hapụrụ unu Simiọn ma ghara ịkpọchi Benjamin. Ma, ọ bụrụ na m ga-agbara aka ụmụ, mụ agbaranụ aka ụmụ.”+

15 Ụmụ Izrel* wee buru onyinye ndị ahụ, were ego ole ha jibu gaa okpukpu abụọ ma kpọrọ Benjamin. Ha biliziri gawa Ijipt. Mgbe ha ruru, ha guzoro n’ihu Josef.+ 16 Mgbe Josef hụrụ Benjamin ka ha na ya so, ọ gwara onye na-elekọta ụlọ ya ozugbo, sị: “Kpọga ụmụ nwoke ndị a n’ụlọ m ma gbuo anụ, siekwa ihe oriri, n’ihi na mụ na ha ga-eri nri n’ehihie.” 17 Ozugbo ahụ, nwoke ahụ mere nnọọ ihe Josef kwuru,+ kpọga ha n’ụlọ Josef. 18 Ma egwu tụwara ụmụ nwoke ndị ahụ maka na a kpọgara ha n’ụlọ Josef. Ha malitere ịsị: “Ọ bụ n’ihi ego ahụ e tinyeghachiri n’akpa anyị mgbe mbụ anyị bịara mere e ji kpọta anyị ebe a. Ugbu a, ha ga-alụso anyị ọgụ ma jiri anyị mere ndị ohu, kpụrụkwa jakị anyị.”+

19 N’ihi ya, ha gakwuuru nwoke ahụ na-elekọta ụlọ Josef ma gwa ya okwu n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ. 20 Ha sịrị ya: “Ewela iwe, onyenwe m. Anyị bịaburu ebe a zụọ ihe oriri.+ 21 Ma mgbe anyị ruru n’ebe anyị rahụrụ ma bido imeghe akpa anyị, onye nke ọ bụla n’ime anyị hụrụ ego ya n’ọnụ akpa ya. Ego anyị zuru nnọọ ezu.+ N’ihi ya, anyị chọrọ iji aka anyị nyeghachi ya unu. 22 Anyị amaghị onye tinyere ego anyị n’akpa anyị. Anyị wetakwuru ego anyị ga-eji zụrụ ihe oriri.”+ 23 Ọ sịrị ha: “Nsogbu adịghị. Unu atụla egwu. Ọ bụ Chineke unu na Chineke nna unu tinyere akụ̀ n’akpa unu. Ego unu bu ụzọ ruo m aka.” Ọ kpọpụtaziiri ha Simiọn.+

24 Nwoke ahụ wee kpọbata ụmụ nwoke ndị ahụ n’ụlọ Josef, kunye ha mmiri ka ha saa ụkwụ ha, nyekwa jakị ha nri. 25 Ha kwadebekwara onyinye+ ha ga-enye Josef mgbe ọ ga-abịa n’ehihie, maka na ha nụrụ na ha ga-eri ihe oriri n’ebe ahụ.+ 26 Mgbe Josef banyere n’ụlọ ahụ, ha wetaara ya onyinye ha ji bịa ma kpọọrọ ya isiala.+ 27 Mgbe e mechara, ọ jụrụ ha otú ha mere ma sị ha: “Nna unu merela agadi unu gwaburu m maka ya, olee otú o mere? Ọ̀ ka nọkwa ndụ?”+ 28 Ha sịrị ya: “Ohu gị nna anyị dị mma. Ọ ka nọ ndụ.” Ha wee hulata kpọọrọ ya isiala.+

29 Mgbe o lepụrụ anya hụ Benjamin nwanne ya, onye nne ji ya na ya,+ ọ sịrị: “Onye a ọ̀ bụ nwanne unu nke ọdụdụ, onye unu gwara m okwu ya?”+ Ọ sịkwara Benjamin: “Nwa m, ka Chineke meere gị amara.” 30 Josef meziri ọsọ ọsọ pụọ, gaa chọọ ebe ọ ga-anọ bee ákwá, n’ihi na obi nwanne mewere ya. N’ihi ya, ọ banyere n’ọnụ ụlọ ọzọ bee ákwá.+ 31 Mgbe o bechara ákwá, o jikọtara onwe ya, saa ihu ya ma pụta, sị: “Butewenụ nri.” 32 Ha bunyere ya nri nke ya iche, bunye ụmụnne ya nke ha iche. Ndị Ijipt ya na ha nọ riri nri nke ha iche n’ihi na ndị Ijipt enweghị ike iso ndị Hibru rie ihe, maka na ime otú ahụ bụ arụ n’anya ndị Ijipt.+

33 Ụmụnne ya* nọ n’ebe chere ihu n’ebe yanwa nọ, malite n’onye bụ́ ọkpara, bụ́ onye nwe ihe ruuru ọkpara,+ ruo n’onye bụ́ ọdụdụ nwa. Ha nọ na-ele ibe ha n’anya n’anya maka na ihe na-emenụ riri ha ọnụ. 34 Josef si na tebụl ya na-ebunye ha nri. Ma ọ na-eme ka nke a na-ebunye Benjamin jiri okpukpu ise karịa nke ụmụnne ya niile.+ Ya na ha wee na-eri, na-aṅụ, ruo mgbe afọ juru ha.

44 Mgbe e mechara, Josef nyere onye na-elekọta ụlọ ya iwu, sị: “Kponye ihe oriri n’akpa ụmụ nwoke ahụ otú ha ga-ebuli, tinyekwa ego onye nke ọ bụla n’ọnụ akpa ya.+ 2 Ma ị ga-etinye iko m, ya bụ, iko ọlaọcha m, n’ọnụ akpa nke ọdụdụ nwa, ya na ego o ji bịa ịzụ ọka.” O wee mee ihe Josef gwara ya.

3 Mgbe chi bọrọ n’ụtụtụ, a hapụrụ ụmụ nwoke ahụ, ha akpụrụ jakị ha lawa. 4 Mgbe ọ na-adịchabeghị anya ha hapụrụ obodo ahụ, Josef gwara onye na-elekọta ụlọ ya, sị: “Bilie! Chụwa ụmụ nwoke ndị ahụ. Ị chụkwuru ha, sị ha, ‘Gịnị mere unu ji jiri ihe ọjọọ kwụọ nna m ukwu ụgwọ ihe ọma? 5 Gịnị mere unu ji were iko nna m ukwu ji aṅụ mmanya, nke o jikwa amata kpọmkwem ihe ga-eme n’ọdịnihu? Ihe a unu mere bụ ihe ọjọọ.’”

6 Onye na-elekọta ụlọ Josef wee chụkwuru ha ma gwa ha ihe a. 7 Ma ha sịrị ya: “Gịnị mere onyenwe m ji ekwu ụdị ihe a? Ndị ohu gị agaghị anwa anwa eme ụdị ihe a. 8 Ọ̀ kwa anyị si na Kenan weghachiri gị ego anyị hụrụ n’ọnụ akpa anyị?+ Oleezi otú anyị ga-esi zuru ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo n’ụlọ nna gị ukwu? 9 Ka e gbuo onye ọ bụla n’ime ndị ohu gị a hụrụ ya n’akpa ya, ndị fọrọ n’ime anyị ga-abụkwara nna m ukwu ndị ohu.” 10 O wee sị ha: “Ka ọ dị otú unu kwuru: Onye a hụrụ ya n’akpa ya ga-abụ ohu m, ma a ga-ewere ndị fọrọ n’ime unu ka ndị aka ha dị ọcha.” 11 N’ihi ya, onye nke ọ bụla n’ime ha buturu akpa ya ọsọ ọsọ ma meghee ya. 12 Ọ chọrọ iko ahụ nke ọma. Ọ malitere n’akpa nke okenye wee kwụsị na nke ọdụdụ nwa. N’ikpeazụ, a hụrụ iko ahụ n’akpa Benjamin.+

13 Ha wee dọwaa ákwà ha. Onye nke ọ bụla n’ime ha buuru ibu ya dọkwasị n’elu jakị ya. Ha wee laghachi n’obodo ahụ. 14 Mgbe Juda+ na ụmụnne ya banyere n’ụlọ Josef, ọ ka nọ n’ebe ahụ. Ha wee daara ya n’ala.+ 15 Josef sịrị ha: “Gịnị mere unu ji mee ihe a? Ọ̀ bụ na unu amaghị na nwoke dị ka m na-amata kpọmkwem ihe ga-eme n’ọdịnihu?”+ 16 Juda zara ya, sị: “Gịnị ka anyị ga-agwa nna m ukwu? Gịnị ka anyị ga-ekwu? Oleekwa otú anyị ga-esi gosi na anyị bụ ndị ezi omume? Ọ bụ ezi Chineke na-akwụ ndị ohu gị ụgwọ mmehie ha.+ Anyị bụzi ndị ohu nna m ukwu, ma anyịnwa ma onye a hụrụ iko a n’akpa ya.” 17 Ma Josef sịrị: “Agaghị m anwa anwa mee otú a. Ọ bụ onye a hụrụ iko a n’akpa ya ga-abụ ohu m.+ Ma ndị nke ọzọ n’ime unu, lawanụ n’udo lakwuru nna unu.”

18 Juda gara ya nso, sị ya: “Nna m ukwu, m na-arịọ gị arịrịọ. Biko, ka ohu gị gwatụ gị okwu. Ewesala ohu gị iwe, n’ihi na gị na Fero bụ otu.+ 19 Nna m ukwu jụrụ ndị ohu ya, sị, ‘Nna unu ọ̀ ka nọ ndụ? Ùnu nwere nwanne nwoke ọzọ?’ 20 N’ihi ya, anyị zara nna m ukwu, sị, ‘Ee, nna anyị ka nọ ndụ. O meela agadi. Anyị nwekwara nwanne nwoke nke nna anyị mụrụ n’agadi ya, bụ́ ọdụdụ nwa ya.+ Ma onye nne ji ya na ya anwụọla.+ Ọ bụ naanị ya fọrọ n’ime ha,+ nna ya hụkwara ya n’anya.’ 21 Ị gwaziri ndị ohu gị, sị, ‘Kpọtaranụ m ya ka m hụ ya.’+ 22 Ma anyị gwara nna m ukwu, sị, ‘Nwa ahụ agaghị ahapụli nna ya. Nna ya ga-anwụ ma ọ hapụ ya.’+ 23 Ị gwaziri ndị ohu gị, sị, ‘Ọ bụrụ na nwanne unu nke ọdụdụ agaghị eso unu bịa, unu abịakwala ịhụ m ọzọ.’+

24 “N’ihi ya, anyị lakwuuru ohu gị nna m kọọrọ ya ihe nna m ukwu kwuru. 25 Mgbe e mechara, nna anyị sịrị anyị, ‘Gaghachinụ zụta obere ihe oriri anyị ga-eri.’+ 26 Ma anyị sịrị ya, ‘Anyị agaghị aga. Ọ bụrụ na nwanne anyị nke ọdụdụ ga-eso anyị, anyị ga-aga, maka na nwoke ahụ agaghị ekwe ka anyị hụ ya ma ọ bụrụ na nwanne anyị nke ọdụdụ esoghị anyị.’+ 27 Ohu gị nna m gwaziri anyị, sị, ‘Unu ma nke ọma na nwunye m mụụrụ m naanị ụmụ nwoke abụọ.+ 28 Ma, otu n’ime ha anọghịzi. M wee sị: “Ọ ga-abụrịrị na anụ ọhịa adọriela ya!”+ Ahụbeghịkwa m ya ruo ugbu a. 29 Ọ bụrụ na unu akpọrọkwa onye nke a pụọ, ihe emee ya, ya anwụọ, unu ga-eme ka obi mgbawa gbuo m.’+

30 “Ugbu a, ọ bụrụ na mụ edughị nwa a lakwuru ohu gị nna m, ebe ọ bụ na nna m hụrụ nwa a n’anya otú ọ hụrụ onwe ya, 31 ọ ga-anwụ ozugbo ọ hụrụ na nwa a esoghị anyị. Ọ pụtara na ndị ohu gị emeela ka ohu gị nna anyị rugide uju n’isi awọ́ ya nwụọ. 32 Ohu gị kwere nna m nkwa n’ihi nwa a, sị, ‘Ọ bụrụ na mụ akpọlataghị ya kpọnye gị, ọ pụtara na emehiela m nna m ruo mgbe ebighị ebi.’+ 33 N’ihi ya, kama nwa a ga-anọ, m na-arịọ ka ohu gị nọrọ ma bụrụ ohu nna m ukwu, ka nwa a wee soro ụmụnne ya laa. 34 Olee otú m ga-esi lakwuru nna m ma ọ bụrụ na nwa a esoghị m? Agaghị m achọ ịhụ ihe ọjọọ ga-eme nna m.”

45 Ugbu a, Josef enweghịzi ike ijide onwe ya n’ihu ndị niile na-ejere ya ozi.+ O wee jiri olu ike sị ha: “Unu niile, sinụ ebe a pụọ!” E nweghị onye ọzọ ya na Josef nọ mgbe o mere ka ụmụnne ya mata onye ọ bụ.+

2 O wee malite ibe ákwá. O besiri ya ike nke na ndị Ijipt na ndị ezinụlọ Fero nụrụ ya. 3 N’ikpeazụ, Josef gwara ụmụnne ya, sị: “Abụ m Josef. Nna m ọ̀ ka nọ ndụ?” Ma ụmụnne ya enweghị ike ịza ya ihe ọ bụla maka na ihe na-emenụ riri ha ọnụ. 4 N’ihi ya, Josef gwara ụmụnne ya, sị: “Biko, bịanụ m nso.” Ha wee bịa ya nso.

Ọ sịziri: “Abụ m Josef nwanne unu, onye unu resịrị ndị Ijipt.+ 5 Ma obi ajọla unu njọ, unu atakwala ibe unu ụta maka na unu rere m, e wee kpọta m n’ebe a, n’ihi na ọ bụ Chineke zitere m ka m buru unu ụzọ bịa ebe a ka e wee dowe anyị ndụ.+ 6 Afọ a bụ afọ nke abụọ ụnwụ ga-adị.+ A ka nwere afọ ise a na-agaghị akọ ihe ma ọ bụ wee ihe ubi. 7 Ma Chineke zitere m ka m buru unu ụzọ bịa ebe a ka e wee nwee ndị ga-afọrọ unu ndụ+ n’ụwa nakwa ka o si n’ụzọ dị ebube napụta unu. 8 N’ihi ya, ọ bụghị unu zitere m ebe a, kama ọ bụ ezi Chineke zitere m ka o wee mee ka m bụrụ onye ndụmọdụ* Fero, meekwa ka m bụrụ onyeisi n’ụlọ ya niile na onye na-achị Ijipt niile.+

9 “Laghachikwurunụ nna m ọsọ ọsọ. Unu ga-asị ya, ‘Nwa gị Josef kwuru, sị: “Chineke emeela ka m bụrụ onyeisi n’Ijipt niile.+ Bịakwute m. Egbula oge.+ 10 Ị ga-ebi n’ala Goshen,+ bụ́ ebe ị ga-anọ m nso, gị na ụmụ gị na ụmụ ụmụ gị na ìgwè ewu na atụrụ gị na ìgwè ehi gị na ihe niile i nwere. 11 M ga na-enye gị ihe oriri n’ebe ahụ, n’ihi na a ka nwere afọ ise ụnwụ ga-adị,+ ka gị na ezinụlọ gị wee ghara ịda ogbenye, ihe niile i nwere alaakwa n’iyi.”’ 12 Unu na Benjamin nwanne m ji anya unu na-ahụ na ọ bụ mụnwa na-agwa unu okwu.+ 13 N’ihi ya, kọọrọnụ nna m na m bụzi onye ukwu n’Ijipt, kọọkwaranụ ya ihe niile unu hụrụ. Ngwa, meenụ ọsọ ọsọ gaa kpọta nna m n’ebe a.”

14 Josef wee makụọ Benjamin nwanne ya, bewe ákwá. Benjamin bewekwara ákwá mgbe Josef makụrụ ya.+ 15 Josef susuru ụmụnne ya niile ọnụ, makụọ ha, beekwa ákwá. Mgbe e mechara, ya na ụmụnne ya kparịtara ụka.

16 Akụkọ ihe na-emenụ ruru ndị nọ n’ụlọ Fero ntị. A gwara ha, sị: “Ụmụnne Josef bịara!” Ihe a Fero na ndị na-ejere ya ozi nụrụ tọrọ ha ụtọ. 17 Fero wee sị Josef: “Gwa ụmụnne gị, sị, ‘Meenụ ihe a: Jirinụ jakị unu buru nri gaa Kenan. 18 Kpọrọnụ nna unu na ndị ezinụlọ unu bịakwute m n’ebe a. M ga-enye unu ihe ọma ndị dị n’ala Ijipt, unu ga-erikwa ihe ndị kacha mma dị n’ala a.’+ 19 Ana m enyekwa gị iwu ka ị gwa ha,+ sị: ‘Meenụ ihe a: Sinụ n’Ijipt buru ụgbọala+ ndị unu ga-eji bute ụmụntakịrị unu na ndị nwunye unu. Unu ga-ejikwa otu bute nna unu n’ebe a.+ 20 Unu echegbula onwe unu maka ihe ndị unu nwere,+ n’ihi na ihe ọma ndị dị n’Ijipt niile bụ nke unu.’”

21 Ụmụ Izrel* wee mee otú ahụ. Josef bunyere ha ụgbọala otú Fero nyere n’iwu. O nyekwara ha ihe ha ga-eri n’ụzọ. 22 Ọ chịnyere onye ọ bụla n’ime ha uwe ọhụrụ, ma o nyere Benjamin narị mkpụrụ ego ọlaọcha atọ (300), chịnyekwa ya uwe ọhụrụ ise.+ 23 O zigaara nna ya ihe ndị a: jakị iri ndị bu ihe ọma ndị si n’Ijipt na nne jakị iri ndị bu ọka wit na achịcha nakwa ihe nna ya ga-eri n’ụzọ. 24 O wee hapụ ụmụnne ya ka ha lawa. Mgbe ha na-ala, ọ sịrị ha: “Unu ewesala ibe unu iwe n’ụzọ.”+

25 Ha wee si n’Ijipt lawa ma lọghachikwuru Jekọb nna ha na Kenan. 26 Ha wee kọọrọ ya, sị: “Josef ka nọ ndụ, ọ bụkwa ya na-achị Ijipt niile!”+ Ma nna ha atụpụghị ọnụ, n’ihi na o kwetaghị ihe ha kwuru.+ 27 Mgbe ha nọ na-agwa Jekọb nna ha ihe niile Josef gwara ha, ya ahụkwa ụgbọala ndị Josef zitere ka e were bute ya, obi tọwara ya ụtọ. 28 Izrel sịziri: “O zuolanụ! Josef nwa m ka nọ ndụ! M ga-aga hụ ya tupu mụ anwụọ!”+

46 Izrel wee kpọrọ ndị ezinụlọ ya niile, kwakọrọkwa ihe niile o nwere gawa. Mgbe o rutere Bia-shiba,+ ọ chụụrụ Chineke nna ya Aịzik àjà.+ 2 N’abalị, Chineke gwara Izrel okwu n’ọhụụ. Ọ kpọrọ ya, sị: “Jekọb, Jekọb!” ya azaa ya, sị: “Lee m!” 3 Chineke sịrị ya: “Abụ m ezi Chineke, Chineke nke nna gị.+ Atụla egwu ịga Ijipt, n’ihi na m ga-eme ka ị bụrụ nnukwu mba n’ebe ahụ.+ 4 M ga-eso gị gaa Ijipt, m ga-esikwa n’ebe ahụ kpọghachi gị.+ Ọ bụ Josef ga-emechi anya gị mgbe ị ga-anwụ.”*+

5 Mgbe e mechara, Jekọb si na Bia-shiba pụọ, ụmụ Izrel* jikwa ụgbọala ndị ahụ Fero nyere ka e were bute Jekọb buru Jekọb nna ha na ụmụntakịrị ha na ndị nwunye ha. 6 Ha chịịrị ìgwè anụ ha, burukwa ngwongwo ha ndị ha nwetara na Kenan. Otú a ka Jekọb na ụmụ ya niile si bata n’Ijipt. 7 Jekọb kpọọrọ ụmụ ya niile bata n’Ijipt, ma ụmụ ya ndị nwoke ma ụmụ ụmụ ya ndị nwoke ma ụmụ ya ndị nwaanyị ma ụmụ ụmụ ya ndị nwaanyị.

8 Ihe a bụ aha ụmụ Izrel ndị nwoke, ndị batara n’Ijipt,+ ya bụ, ụmụ* Jekọb: ọkpara Jekọb bụ Ruben.+

9 Ụmụ Ruben ndị nwoke bụ Henọk, Palu, Hezrọn, na Kamaị.+

10 Ụmụ Simiọn+ ndị nwoke bụ Jemuel, Jemin, Ohad, Jekin, Zoha, na Sheọl.+ Ọ bụ nwaanyị Kenan mụrụ Sheọl.

11 Ụmụ Livaị+ ndị nwoke bụ Geshọn, Kohat, na Meraraị.+

12 Ụmụ Juda+ ndị nwoke bụ Ea, Onan, Shila,+ Pirez,+ na Zira.+ Ma Ea na Onan nwụrụ na Kenan.+

Ụmụ nwoke Pirez mụrụ bụ Hezrọn na Hemọl.+

13 Ụmụ Ịsaka ndị nwoke bụ Tola, Puva, Yọb, na Shimrọn.+

14 Ụmụ Zebulọn+ ndị nwoke bụ Sired, Ịlọn, na Jaliel.+

15 Ọ bụ ha bụ ụmụ ndị nwoke Lia mụụrụ Jekọb na Padan-eram. Ọ mụkwaara ya nwa nwaanyị aha ya bụ Daịna.+ Ụmụ nwoke niile na ụmụ nwaanyị niile ọ mụụrụ ya dị iri atọ na atọ.

16 Ụmụ Gad+ ndị nwoke bụ Zifiọn, Hagaị, Shunaị, Ezbọn, Iraị, Arodaị, na Arilaị.+

17 Ụmụ Asha+ ndị nwoke bụ Imna, Ishva, Ishvaị, na Beraya. Aha nwanne ha nwaanyị bụ Sira.

Ụmụ Beraya ndị nwoke bụ Hiba na Malkiel.+

18 Ọ bụ ha bụ ụmụ ndị nwoke Zilpa+ mụrụ. Zilpa bụ onye Leban kpọnyere ada ya Lia. Ụmụ niile Zilpa mụụrụ Jekọb dị mmadụ* iri na isii.

19 Ụmụ Rechel, nwunye Jekọb, bụ Josef+ na Benjamin.+

20 A mụụrụ Josef Manase+ na Ifrem+ n’Ijipt. Ọ bụ Asinat+ nwa Pọtifera, onye nchụàjà Ọn,* mụụrụ ya ụmụ ahụ.

21 Ụmụ Benjamin+ ndị nwoke bụ Bila, Bika, Ashbel, Gira,+ Neeman, Ihaị, Rọsh, Mọpim, Họpim,+ na Ad.+

22 Ọ bụ ha bụ ụmụ nwoke Rechel mụụrụ Jekọb. Ha niile dị mmadụ* iri na anọ.

23 Nwa* nwoke Dan+ mụrụ bụ Hushim.+

24 Ụmụ Naftalaị+ ndị nwoke bụ Jaziel, Gunaị, Jiza, na Shilem.+

25 Ọ bụ ha bụ ụmụ nwoke Bilha mụrụ. Bilha bụ onye Leban kpọnyere Rechel nwa ya nwaanyị. Ụmụ niile Bilha mụụrụ Jekọb dị mmadụ* asaa.

26 Ndị ezinụlọ Jekọb niile ndị so ya bata n’Ijipt dị mmadụ* iri isii na isii,+ ma e wepụ ndị nwunye ụmụ Jekọb. 27 Ụmụ nwoke a mụụrụ Josef n’Ijipt dị mmadụ* abụọ. Ndị ezinụlọ Jekọb niile ndị batara n’Ijipt dị mmadụ* iri asaa.+

28 Jekọb dunyere Juda+ ka ọ gaa gwa Josef na ya abịawala Goshen. Mgbe ha batara na Goshen,+ 29 a kwadebeere Josef ụgbọ ịnyịnya ya, ya agbara ya gaa Goshen ịhụ Izrel nna ya. Mgbe Josef bịakwutere ya, Izrel makụrụ ya ozugbo bewe ákwá. 30 Izrel wee gwa Josef, sị: “Ọnwụ nweziri ike ịbịa gburu m ugbu a. Ahụla m gị wee mata na ị ka nọ ndụ.”

31 Josef gwaziri ụmụnne ya na ndị ezinụlọ nna ya, sị: “Ka m gaa hụ Fero ma gwa ya,+ sị, ‘Ụmụnne m na ndị ezinụlọ nna m, ndị bibu na Kenan, abịakwutela m n’ebe a.+ 32 Ha bụ ndị na-azụ atụrụ+ na ndị na-akpa anụ.+ Ha chị ìgwè ewu na atụrụ ha na ìgwè ehi ha bịa, ha bukwa ihe niile ha nwere bịa.’+ 33 Ọ bụrụ na Fero akpọọ unu ma jụọ unu, sị, ‘Gịnị ka unu na-arụ?’ 34 unu ga-asị ya, ‘Ndị ohu gị bụ ndị na-akpa anụ malite n’oge anyị bụ ụmụaka ruo ugbu a, ma anyịnwa ma nna nna anyị hà.’+ Ọ ga-ahapụzi unu ka unu biri na Goshen,+ n’ihi na ndị Ijipt kpọrọ onye ọ bụla na-azụ atụrụ asị.”+

47 Josef wee gakwuru Fero, gwa ya,+ sị: “Nna m na ụmụnne m esila Kenan bịa. Ha chị ìgwè ewu na atụrụ ha na ìgwè ehi ha, ha bukwa ihe niile ha nwere bịa. Ha nọ na Goshen.”+ 2 Ọ kpọ mmadụ ise n’ime ụmụnne ya ndị nwoke bịa gosi Fero.+

3 Fero jụrụ ụmụnne ya, sị: “Gịnị ka unu na-arụ?” Ha zara Fero, sị: “Ndị ohu gị bụ ndị na-azụ atụrụ, ma anyịnwa ma nna nna anyị hà.”+ 4 Ha gwaziri Fero, sị: “Anyị bịara ka anyị biri n’ala a+ maka na e nweghị ahịhịa ìgwè anụ ndị ohu gị ga na-ata, n’ihi na ụnwụ a karịrị akarị na Kenan.+ Biko, ka ndị ohu gị biri na Goshen.”+ 5 Fero wee sị Josef: “Nna gị na ụmụnne gị abịakwutela gị n’ebe a. 6 Ala Ijipt dị gị n’aka. Mee ka nna gị na ụmụnne gị biri n’ebe kacha mma n’ala a.+ Ka ha biri n’ala Goshen. Ọ bụrụ na ị ma ndị aka siri ike n’ime ha, họpụta ha ka ha bụrụ ndị isi ndị na-azụ ìgwè anụ m.”

7 Josef kpọbataziri Jekọb nna ya gosi Fero. Jekọb wee gọzie Fero. 8 Fero jụrụ Jekọb, sị: “Ị̀ dị afọ ole?” 9 Jekọb zara Fero, sị: “Adị m otu narị afọ na iri atọ (130). Kemgbe ndụ m, ọ na-abụ m kwara gaa ebe a, mụ akwara gaa ebe a.* Afọ ole na ole a m nọrọla ndụ bụ nsogbu nsogbu.+ Ha erubeghịdị afọ ole nna m hà nọruru n’oge niile ha nọ na-akwagharị n’ebe dị iche iche.”*+ 10 Mgbe ha kwuchara, Jekọb gọziri Fero ma si n’ihu ya pụọ.

11 Josef wee nye nna ya na ụmụnne ya ala ebe ha ga-ebi n’Ijipt. O nyere ha ala n’ebe kacha mma n’Ijipt, ya bụ, n’ala Ramesis,*+ otú Fero nyere ya n’iwu. 12 Josef nọkwa na-enye nna ya na ụmụnne ya na ezinụlọ nna ya niile ihe oriri.* Ọ na-enye ezinụlọ nke ọ bụla ihe ga-ezuru ha na ụmụ ha.

13 Ihe oriri* mechara gwụ n’Ijipt nakwa na Kenan maka na ụnwụ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ike wee gwụ ndị bi n’ala ndị a n’ihi ụnwụ ahụ.+ 14 Josef nọ na-anara ndị Ijipt na ndị Kenan ego niile dị n’obodo ha ma na-eresị ha ọka.*+ Josef nọkwa na-ewebata ego ndị ahụ n’ụlọ Fero. 15 Ka oge na-aga, ego ndị Ijipt na ndị Kenan gwụrụ. Ndị Ijipt niile bịakwuteweziri Josef, na-asị ya: “Nye anyị ihe oriri! Ị̀ ga-anọ na-ele anyị n’anya n’anya anyị anwụọ maka na ego anyị agwụla?” 16 Josef sịziri ha: “Ọ bụrụ na ego unu agwụla, kpụtawanụ anụmanụ unu. M ga-enye unu ihe oriri ma unu kpụnye m anụmanụ unu.” 17 N’ihi ya, ha malitere ịkpụtara Josef anụmanụ ha, ya bụ, ịnyịnya ha, ìgwè ewu na atụrụ ha, ìgwè ehi ha, na jakị ha. Josef nọkwa na-enye ha ihe oriri maka anụmanụ ndị ahụ ha nọ na-akpụtara ya. N’afọ ahụ, ha nọ na-akpụtara ya anụmanụ ha, ya ana-enye ha ihe oriri.

18 Mgbe afọ ahụ gwụrụ, ha malitere ịbịakwute ya n’afọ na-eso ya, na-asị ya: “Anyị agaghị ezoro onyenwe anyị ọnụ. Anyị enyechaala onyenwe anyị ego niile anyị nwere, kpụnyekwa ya anụmanụ niile anyị nwere. E nweghịzi ihe anyị nwere anyị ga-enye onyenwe anyị ma e wepụ onwe anyị na ala anyị. 19 Ị̀ ga-anọ na-ele anyị n’anya n’anya anyị anwụọ, ala anyị alaakwa n’iyi? Zụrụ anyị, zụrụkwa ala anyị ka i wee na-enye anyị ihe oriri. Anyị ga-abụzi ndị ohu Fero, ala anyị abụrụkwa nke ya. Nye anyị mkpụrụ ka anyị kụọ, ka anyị wee dị ndụ ma ghara ịnwụ, ka ala anyị gharakwa ịtọgbọ nkịtị.” 20 Josef wee zụtara Fero ala ndị Ijipt niile n’ihi na onye Ijipt ọ bụla rere ala ya maka na ụnwụ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ala ha wee bụrụzie nke Fero.

21 Josef kpọpụtara ndị bi n’ime ime obodo niile dị n’Ijipt kpọga ha n’obodo ndị mepere emepe n’Ijipt.+ 22 Ọ bụ naanị ala ndị nchụàjà ka ọ na-azụrụghị+ maka na ọ bụ Fero na-enye ndị nchụàjà nri. Ọ bụ ihe ọ bụla Fero nyere ha ka ha na-eri. Ọ bụ ya mere na ha ereghị ala ha. 23 Josef gwaziri ndị Ijipt, sị: “Lee, m zụrụla unu na ala unu taa. Ọ bụ Fero nwezi unu na ala unu. Lekwanụ mkpụrụ. Werenụ ya kụọ n’ala. 24 Mgbe ọ ga-amị mkpụrụ, unu ga-enye Fero otu ụzọ n’ụzọ ise,+ ma ụzọ anọ ga-abụ nke unu. Ha ga-abụ mkpụrụ unu ga-akụ n’ubi nakwa nke unu na ndị bi n’ụlọ unu na ụmụntakịrị unu ga na-eri.” 25 Ha wee sị ya: “Ị zọọla anyị ndụ.+ Ọ bụrụ na ihe anyị masịrị onyenwe anyị, ka anyị gbawara Fero ohu.”+ 26 Josef wee tie iwu nke onye ọ bụla n’Ijipt niile na-edebe ruo taa, na onye ọ bụla ga na-enye Fero otu ụzọ n’ụzọ ise nke mkpụrụ ọ bụla ọ kụrụ. Ọ bụ naanị ala ndị nchụàjà bụ ala na-abụghị nke Fero.+

27 Ndị ezinụlọ Izrel wee biri n’Ijipt, n’ala Goshen.+ Ha kpatara akụ̀ n’ebe ahụ, mụọ ọmụmụ ma baa nnọọ ụba.+ 28 Jekọb biri afọ iri na asaa n’Ijipt. Afọ niile Jekọb dịrị ndụ wee bụrụ otu narị afọ na iri anọ na asaa (147).+

29 Mgbe Izrel ghọtara na oge ọ ga-anwụ eruwela,+ ọ kpọrọ Josef nwa ya, sị ya: “Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, biko, tinye aka gị n’okpuru apata ụkwụ m* ma gosi m na ị hụrụ m n’anya* nakwa na ị bụ onye m ga-atụkwasịli obi. Biko, elila m n’Ijipt.+ 30 M nwụọ,* buru ozu m pụọ n’Ijipt gaa lie m n’ebe e liri nna nna m hà.”+ Josef sịrị ya: “M ga-eme nnọọ otú i kwuru.” 31 Izrel sịziri ya: “Ṅụọrọ m iyi.” O wee ṅụọrọ ya iyi.+ Izrel wee chee ihu n’isi àkwà* ya kpọọrọ Chineke isiala.+

48 Mgbe ihe ndị a mechara, a gwara Josef, sị: “Ike agwụwala nna gị.” Josef wee kpọrọ ụmụ ya ndị nwoke abụọ, ya bụ, Manase na Ifrem, gawa ịhụ Jekọb.+ 2 A gwara Jekọb, sị: “Josef nwa gị abịala ịhụ gị.” Izrel wee gbalịsie ike bilie ma nọrọ ọdụ n’ebe o dina ala.* 3 Jekọb sịrị Josef:

“Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile pụtara n’ihu m na Lọz nke dị na Kenan ma gọzie m.+ 4 Ọ sịrị m, ‘M ga-eme ka ị mụọ ọmụmụ ma baa ụba. M ga-eme ka ị ghọọ nnukwu mba,+ m ga-enyekwa ụmụ* gị ala a ka ọ bụrụ nke ha ruo mgbe ebighị ebi.’+ 5 Ụmụ nwoke abụọ a mụụrụ gị n’Ijipt tupu mụ abịakwute gị n’Ijipt ebe a bụ ụmụ m.+ Ifrem na Manase ga-abụ ụmụ m otú Ruben na Simiọn bụ ụmụ m.+ 6 Ma, ụmụ a ga-amụrụ gị, bụ́ ndị ha ga-atọ, ga-abụ ụmụ gị. Ha ga-aza aha ụmụnne ha abụọ a ma keta ala n’ala e kenyere ha.+ 7 Mgbe m si Padan na-alọta, Rechel nọ n’akụkụ m nwụọ+ na Kenan, mgbe anyị ka nọ n’ebe dị anya n’Efrat.+ M wee lie ya n’ebe ahụ n’ụzọ e si aga Efrat, ya bụ, Betlehem.”+

8 Mgbe Izrel hụrụ ụmụ Josef, ọ jụrụ, sị: “Ole ndị bụ ndị a?” 9 Josef wee sị nna ya: “Ha bụ ụmụ Chineke nyere m n’ebe a.”+ Izrel sịrị ya: “Biko, kpọtara m ha ka m gọzie ha.”+ 10 Izrel na-ahụzi inyoghi inyoghi n’ihi nká. O nweghịzi ike ịhụ ụzọ. N’ihi ya, Josef kpọtara ụmụ ya nso n’ebe Izrel nọ, ya esusuo ha ọnụ, makụọkwa ha. 11 Izrel sịrị Josef: “Atụghịdị m anya na m ga-ahụ gị ọzọ,+ ma Chineke emeela ka m hụ ma gị ma ụmụ* gị.” 12 Josef sizi n’akụkụ ikpere Izrel kpọpụta ha. Josef wee kpọọ isiala.

13 Josef seere Ifrem+ n’aka nri ya, sere Manase+ n’aka ekpe ya ma kpọta ha nso n’ebe Izrel nọ. Ifrem wee nọrọ Izrel n’aka ekpe, Manase anọrọ Izrel n’aka nri. 14 Ma Izrel bikwasịrị aka nri ya n’isi Ifrem n’agbanyeghị na ọ bụ ya bụ nke nta, o bikwasịkwara aka ekpe ya n’isi Manase. Ọ ma ụma bikwasị ha aka otú ahụ n’agbanyeghị na ọ bụ Manase bụ ọkpara.+ 15 O wee gọzie Josef, sị:+

“Ezi Chineke, onye Ebreham na Aịzik nna m hà jeere ozi,*+

Ezi Chineke, onye na-azụ m ka atụrụ ná ndụ m niile ruo taa,+

16 Onye ji mmụọ ozi ya na-anapụta m n’ọdachi niile na-abịara m,+ gọzie ụmụaka a.+

Ka ha zawa aha m na aha Ebreham na Aịzik nna m hà,

Ka ha mụbaa ma dị ọtụtụ n’ụwa.”+

17 Mgbe Josef hụrụ na nna ya bikwasịrị aka nri ya n’isi Ifrem, ọ dịghị ya mma. N’ihi ya, ọ gbalịrị ka o wepụ aka nna ya n’isi Ifrem ma tụkwasị ya n’isi Manase. 18 Josef sịrị nna ya: “Nna m, ọ dịghị mma otú a, n’ihi na ọ bụ onye nke a bụ ọkpara.+ Bikwasị aka nri gị n’isi ya.” 19 Ma nna ya ekweghị. Ọ sịrị Josef: “Nwa m, ama m, ama m. Yanwa ga-aghọkwa mba, ọ ga-abụkwa onye ukwu. Ma nwanne ya nke nta ga-aka ya.+ Ụmụ* ya ga-adị nnọọ ọtụtụ nke na ha ga-aghọ ọtụtụ mba.”+ 20 Ọ gọzikwuru ha n’ụbọchị ahụ,+ sị:

“Ka ndị Izrel na-akpọ aha gị mgbe ha na-agọzi ndị mmadụ. Ka ha na-asị,

‘Ka Chineke mee ka ị dị ka Ifrem na Manase.’”

Otú ahụ ka o si na-akpọ Ifrem aha tupu ya akpọọ Manase.

21 Izrel sịziri Josef: “Anwụwala m,+ ma Chineke ga na-anọnyere unu, ọ ga-akpọghachikwa unu n’ala nna nna unu hà.+ 22 Ma ana m enyekwu gị otu ibé ala karịa nke m nyere ụmụnne gị, ya bụ, ala m ji mma agha m na ụta m nara ndị Amọraịt.”

49 Jekọb kpọrọ ụmụ ya ndị nwoke, sị ha: “Zukọtanụ ka m gwa unu ihe ga-eme ná ndụ unu n’ọdịnihu.* 2 Unu ụmụ Jekọb, zukọtanụ gee ntị. Geenụ Izrel nna unu ntị.

3 “Ruben,+ ọ bụ gị bụ ọkpara m,+ ike m na onye m bu ụzọ mụọ.* Ọ bụ gị ka a kacha akwanyere ùgwù, ọ bụkwa gị kacha dị ike. 4 Ma, ị gaghị akarị ụmụnne gị ebe ọ bụ na i mere ka idei mmiri na-ekwo ekwo wee ghara ijide onwe gị, n’ihi na i dinara nwunye* nna gị.+ N’eziokwu, i dinara nwunye m. Ọ bụ ihe i mere.

5 “Simiọn na Livaị bụ ụmụnne.+ Ha ji mma agha ha gbuo ndị mmadụ.+ 6 Mkpụrụ obi m,* gị na ha akpala. Obi m,* esonyela n’òtù ha, n’ihi na ha ji iwe gbuo ụmụ nwoke,+ ha sekwara ehi akwara iji mee onwe ha obi ụtọ. 7 Ana m abụ iwe ha na ọnụma ha ọnụ n’ihi na o mere ka ha mee ihe jọgburu onwe ya na ihe na-agbawa obi.+ Ka m kesaa ha n’ebe dị iche iche n’ala Jekọb, ka m meekwa ka ha gbasasịa n’ala Izrel.+

8 “Ma Juda,+ ụmụnne gị ga-eto gị.+ Ị ga-emeri ndị iro gị.*+ Ndị nna gị mụrụ ga-akpọrọ gị isiala.+ 9 Juda bụ nwa ọdụm.+ Nwa m, ị ga-ebili ma i richaa anụ i gburu. Ọ makpurula, ọ gbatịakwala onwe ya ka ọdụm. Ebe ọ dị ka ọdụm, ònye ga-anwa anwa chọọ ya okwu? 10 Mkpanaka eze agaghị apụ apụ na Juda,+ mkpara onye na-achị achị agaghịkwa apụ n’agbata ụkwụ ya, ruo mgbe Shaịlo* ga-abịa.+ Ọ* bụ ya ka mba dị iche iche ga-erubere isi.+ 11 Ọ ga-eliwe jakị ya n’osisi vaịn, liwekwa nwa jakị ya n’ezigbo osisi vaịn. Ọ ga-eji mmanya saa ákwà ya, jirikwa mmanya a zọchapụtara ná mkpụrụ vaịn saa uwe ya. 12 Anya ya na-acha ọbara ọbara n’ihi mmanya, ezé ya na-achakwa ọcha n’ihi mmiri ara ehi.*

13 “Zebulọn+ ga-ebi n’ụsọ oké osimiri, n’ikpere mmiri ebe a na-adọsa ụgbọ mmiri.+ Ngwụcha ngwụcha ókè ya ga-abụ n’ebe gawara Saịdọn.+

14 “Ịsaka+ bụ jakị ọkpụkpụ ya siri ike, nke bu ibu abụọ e bukwasịrị ya makpuru ala. 15 Ọ ga-achọpụta na ebe ọ na-ezu ike dị mma nakwa na ala ahụ mara mma. Ọ ga-ehulata ubu ya buru ibu na-anyị arọ, ọ ga-arụkwa ọrụ a manyere ya ịrụ.

16 “Dan+ ga-ekpe ndị ya ikpe. Ọ bụ otu n’ime ebo e nwere n’Izrel.+ 17 Ka Dan bụrụ agwọ nọ n’akụkụ ụzọ, agwọ nwere mpi nke nọ n’akụkụ ụzọ, nke na-ata ịnyịnya arụ n’ikiri ụkwụ, onye na-agba ya ejiri azụ daa.+ 18 Jehova, m ga-echere ruo mgbe ị ga-azọpụta anyị.

19 “Gad,+ ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ga-alụso gị ọgụ, ma ị ga-achụrụ ha n’azụ lụso ha ọgụ.+

20 “Asha+ ga-enweju nri* enweju, ọ ga na-emepụtakwa ụdị nri ndị eze na-eri.+

21 “Naftalaị+ bụ nne ele dị garagara. Ọ na-ekwu okwu na-atọ ụtọ.+

22 “Josef+ bụ alaka nke osisi na-amị mkpụrụ. Ọ bụ alaka nke osisi dị n’akụkụ isi mmiri. Alaka osisi ahụ na-awasa gafere mgbidi. 23 Ma ndị na-agba ụta kpọrọ ya asị. Ha nọ na-enye ya nsogbu, ha gbakwara ya ụta.+ 24 Ma ọ mịpụtaghị ụta ya,+ aka ya sikwara ike ma dị garagara.+ Onye mere ka ọ dị otú ahụ bụ dike na-enyere Jekọb aka, ya bụ, onye na-azụ ya ka atụrụ, onye bụ́kwa nkume Izrel. 25 O* si n’aka Chineke nke nna ya, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nọnyekwaara ya. Ọ ga-enyere gị aka ma gọzie gị. Ọ ga-enye gị mmiri si n’eluigwe na mmiri dị n’osimiri,+ nyekwa gị ọtụtụ ụmụ na ọtụtụ anụ ụlọ. 26 Ngọzi nna gị gọziri gị ga-akarị ihe ọma ndị a na-enweta ná nnukwu ugwu ndị na-adịru mgbe ebighị ebi, karịakwa ihe ndị bara ezigbo uru a na-enweta n’obere ugwu ndị na-adịte aka.+ Ọ bụ Josef, onye a họpụtara n’ime ụmụnne ya, ga na-enweta ngọzi ndị a.*+

27 “Benjamin+ ga na-adọri ndị iro ya otú anụ ọhịa wolf si adọri anụ.+ N’ụtụtụ, ọ ga-eri ndị iro ya ka anụ. Ná mgbede, ọ ga-eke ihe ndị ọ kwatara.”+

28 Ọ bụ ná ndị a niile ka e si nweta ebo iri na abụọ nke Izrel. Ọ bụ ihe ndị a ka nna ha gwara ha mgbe ọ na-agọzi ha. Ọ gọziri onye nke ọ bụla n’ime ha otú kwesịrị ekwesị.+

29 Mgbe ọ gọzichara ha, o nyere ha iwu, sị: “M na-aga ịnwụ otú nna m hà nwụrụ.+ Lienụ m n’ebe e liri nna m hà, n’ọgba dị n’ala Ifrọn onye Het.+ 30 Ọgba ahụ dị n’ala dị na Mak-pila, n’ihu Mamri nke dị na Kenan. Ala ahụ bụ ala Ebreham zụrụ Ifrọn onye Het ka ọ bụrụ ebe ọ ga na-eli ozu. 31 Ọ bụ n’ebe ahụ ka e liri Ebreham na Sera nwunye ya.+ Ọ bụ n’ebe ahụ ka e liri Aịzik+ na Ribeka nwunye ya, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka m liri Lia. 32 Ọ bụ ụmụ Het ka a zụrụ ala ahụ na ọgba dị na ya.”+

33 Otú a ka Jekọb si nyechaa ụmụ ya ndị nwoke ntụziaka. Ọ chịgoziri ụkwụ ya n’àkwà* ya, dinara ala ma kubie ume. O wee nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ.+

50 Josef wee dakwasị nna ya,+ bee ákwá ma susuo ya ọnụ. 2 Josef nyeziri ndị dibịa na-ejere ya ozi iwu ka ha gbasie ozu+ nna ya. N’ihi ya, ndị dibịa ahụ gbasiri ozu Izrel. 3 Ha ji ụbọchị iri anọ zuru ezu gbasie ya n’ihi na ọ bụ ụbọchị ole ha ji agbasi ozu. Ndị Ijipt nọkwa na-ebere ya ákwá ruo ụbọchị iri asaa.

4 Mgbe ha ruchaara ya uju, Josef gwara ndị na-ejere Fero ozi,* sị: “Ọ bụrụ na ihe m masịrị unu, zierenụ m Fero, sị: 5 ‘Nna m mere ka m ṅụọrọ ya iyi.+ Ọ sịrị m: “Anwụwala m.+ Ị ga-eli m n’ili+ m gwuru na Kenan.”+ Biko, ka m gaa lie nna m. M lichaa ya, mụ alọghachi.’” 6 Fero sịrị ya: “Gaa lie nna gị otú o mere ka ị ṅụọrọ ya iyi na ị ga-eme.”+

7 Josef wee gawa ili nna ya. Ndị niile na-ejere Fero ozi, ndị isi+ na-eje ozi n’obí* ya, na ndị isi* niile e nwere n’Ijipt so Josef gaa. 8 Ndị ezinụlọ Josef niile na ụmụnne ya na ndị ezinụlọ nna ya sokwa gaa.+ Ọ bụ naanị ụmụntakịrị ha na ìgwè ewu na atụrụ ha na ìgwè ehi ha ka ha hapụrụ na Goshen. 9 Ndị na-agba ụgbọ ịnyịnya+ na ndị na-agba ịnyịnya sokwa ya gaa. Ndị gara dị nnọọ ọtụtụ. 10 Ha wee rute n’ebe a na-azọcha mkpụrụ nke dị n’Etad. Ọ dị ná mpaghara Osimiri Jọdan. Ha bere nnukwu ákwá n’ebe ahụ, Josef rukwaara nna ya uju ruo ụbọchị asaa. 11 Ndị Kenan, bụ́ ndị bi n’ala ahụ, hụrụ ka ha na-ebe ákwá n’ebe a na-azọcha mkpụrụ nke dị n’Etad, ha wee tie mkpu, sị: “Uju a ndị Ijipt na-eru abụghị obere uju!” Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ebe ahụ Ebel-mizreyim.* Ọ dị ná mpaghara Osimiri Jọdan.

12 Ụmụ Jekọb wee mee kpọmkwem ihe ọ gwara ha.+ 13 Ha buuru ozu ya gaa Kenan ma lie ya n’ọgba dị n’ala dị na Mak-pila, n’ihu Mamri. Ọ bụ ala Ebreham zụrụ Ifrọn onye Het ka ọ bụrụ ebe ọ ga na-eli ozu.+ 14 Mgbe Josef lichara nna ya, ya na ụmụnne ya na ndị niile so ya gaa lie nna ya laghachiri Ijipt.

15 Mgbe ụmụnne Josef hụrụ na nna ha anọghịzi ndụ, ha sịrị: “O nwere ike ịbụ na Josef buuru anyị iwe n’obi, o nwekwara ike ịbụ na ọ ga-akwụ anyị ụgwọ ihe ọjọọ niile anyị mere ya.”+ 16 N’ihi ya, ha ziri Josef ozi, sị: “Nna gị nyere iwu tupu ya anwụọ, sị: 17 ‘Unu ga-agwa Josef, sị: “Biko, ana m arịọ gị ka ị gbaghara ụmụnne gị mmehie ha na ihe ọjọọ ha mere gị.”’ Ugbu a, biko, gbaghara ndị ohu Chineke nke nna gị mmehie ha.” Josef bewere ákwá mgbe ha gwara ya ihe a. 18 Ụmụnne ya wee bịa daara ya n’ala, sị ya: “Anyị bụ ndị ohu gị!”+ 19 Josef sịziri ha: “Unu atụla egwu. Ọ̀ bụ m bụ Chineke? 20 Ọ bụ eziokwu na unu bu n’obi ime m ihe ọjọọ,+ ma Chineke bu n’obi ime ka ọ ghọọ ihe ọma, ka o wee si otú a zọọ ọtụtụ ndị ndụ, otú ọ na-eme taa.+ 21 N’ihi ya, unu atụla egwu. M ga na-enye unu na ụmụntakịrị unu ihe oriri.”+ O si otú a kasie ha obi ma mee ka obi sie ha ike.

22 Josef na ndị ezinụlọ nna ya wee biri n’Ijipt. Josef dịrị ndụ otu narị afọ na iri (110). 23 Josef hụrụ ụmụ Ifrem na ụmụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ụmụ ya.+ Ọ hụkwara ụmụ Mekia,+ nwa Manase. Josef weere ha ka ụmụ ya.* 24 Mgbe e mechara, Josef sịrị ụmụnne ya: “Anwụwala m, ma Chineke ga-agbatara unu ọsọ enyemaka+ ma kpọpụta unu n’ala a. Ọ ga-akpọgakwa unu n’ala ọ ṅụụrụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb iyi na ọ ga-enye ha.”+ 25 N’ihi ya, Josef mere ka ụmụ Izrel* ṅụọrọ ya iyi. Ọ sịrị ha: “Chineke ga-agbatara unu ọsọ enyemaka. Chịrịnụ ọkpụkpụ m mgbe unu na-apụ n’ebe a.”+ 26 Josef wee nwụọ mgbe ọ dị otu narị afọ na iri (110). Ha gbasiri ozu ya+ ma tinye ya n’igbe ozu n’Ijipt.

Ma ọ bụ “mmiri na-asọ asọ.”

Ma ọ bụ “mmụọ nsọ Chineke.”

Ya bụ, ka a kpaa ókè n’etiti mmiri dị n’elu na mmiri dị n’ụwa.

Ma ọ bụ “Mbara Igwe.”

Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi dị iche iche dị ndụ.”

Ma ọ bụ “mbara igwe.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi niile dị ndụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi dị iche iche dị ndụ.”

Ma ọ bụ “anụ ndị na-akpụ akpụ.” Anụ ndị dị ka agwọ, òké, na ụmụ ahụhụ nwere ike iso na ha.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ.”

Ebe a bụ ebe mbụ aha Chineke bụ́ יהוה (YHWH) gbara na Baịbụl. Aha a mere ka Chineke dị iche na chi ndị ọzọ. Gụọ A4.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.” N’asụsụ Hibru, ne′phesh. Ọ pụtara “ihe na-eku ume.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “isi anọ.”

Ma ọ bụ “Gọm.”

Ma ọ bụ “Taịgris.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi nke ọ bụla dị ndụ.”

Ma ọ bụ “ya na nwunye ya anọgide.”

Ma ọ bụ “mara ihe; aghụghọ.”

Ma ọ bụ “n’oge mgbede.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Adam pụtara “Mmadụ.”

Iv pụtara “Onye Dị Ndụ.”

Ala Nọd pụtara ala ndị a chụpụrụ achụpụ.

Set pụtara “Onye A Họpụtara.”

Ma ọ bụ “Chineke ahọpụtarala m.”

Ma ọ bụ “Adam.”

Na Hibru, “Chineke ahụ.” Gụọ Nkọwa Okwu.

O nwere ike ịbụ na Noa pụtara “Ezumike; Nkasi Obi.”

Ma ọ bụ “ga-akasi anyị obi.”

 Ihe a bụ akpaala okwu Hibru nke pụtara ụmụ Chineke bụ́ ndị mmụọ ozi.

Na Hibru, “Mmụọ m agaghị.”

Ma ọ bụ “n’ihi na ọ na-eme ihe ahụ́ ya chọrọ.”

O nwere ike ịbụ na Nefilim pụtara “ndị na-akwatu ndị mmadụ n’ala.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Ndị Nefilim.”

Na Hibru, “ndị ọgbọ ya.”

Na Hibru, “Anụ ahụ́.”

Na Hibru, “anụ ahụ́ niile.”

Na Hibru, “osisi gofa,” o nwere ike ịbụ osisi saịpres.

Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.

N’asụsụ Hibru, tso′har. Otú ọzọ e si ghọta tso′har bụ na ọ bụ ihe a ga-arụnye n’elu ụgbọ ahụ nke ga-adị otu kubit. Ọ bụghị windo ma ọ bụ ebe ìhè si abata.

Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”

Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”

Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.

Na Hibru, “Anụ ahụ́ niile.”

O nwere ike ịbụ obere ụmụ anụmanụ ndị na-ebikọ ọnụ.

Na Hibru, “O.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Na Hibru, “wụfuru ọbara.”

Na Hibru, “Onye ọ bụla wụfuru ọbara mmadụ, mmadụ ga-awụfu ọbara ya.”

Ma ọ bụ “ihe niile dị ndụ.” Na Hibru, “anụ ahụ́ niile.”

Na Hibru, “anụ ahụ́ niile.”

Na Hibru, “anụ ahụ́ niile.”

Ma ọ bụ “onye agha.”

Ma ọ bụ “onye agha.”

O nwere ike ịbụ, “Obodo niile a bụ otu nnukwu obodo.”

O nwere ike ịbụ, “Ọ bụ Shem tọrọ Jefet.”

Pileg pụtara “Nkewa.”

Na Hibru, “ka e kewara ụwa.”

Ma ọ bụ “korota.”

Babel pụtara “Ọgba Aghara.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”

Ma ọ bụ “gaa bụrụ onye mbịarambịa.”

Ma ọ bụ “mee ka ọdachi dakwasị Fero na ndị ezinụlọ ya.”

Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “bi n’ụlọikwuu.”

Na Hibru, “nwanne.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “nwa ụlọ m.”

Na Hibru, “onye si n’ahụ́ gị pụta.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “maka na oge a ga-ata ndị Amọraịt ahụhụ maka mmehie ha erubeghị.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ishmel pụtara “Chineke Na-anụ.”

Ụfọdụ na-ekwu na anụ e kwuru okwu ya ebe a bụ ịnyịnya ọhịa. O nwere ike ịbụ na ihe ọ pụtara bụ na Ishmel agaghị achọ ịnọ n’okpuru onye ọ bụla.

O nwere ike ịbụ, “Ya na ụmụnne ya niile agaghị ebi n’udo.”

Na Hibru, “kpọkuo.”

Bia-lehaị-rọị pụtara “Olulu Mmiri Onye Dị Ndụ nke Na-ahụ M.”

Na Hibru, “Na-eje ije n’ihu m.”

Ebram pụtara “Nna Dị Elu (E Buliri Nna Elu).”

Ebreham pụtara “Nna Ìgwè Mmadụ; Nna Ọtụtụ Ndị.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ọ ga-abụ na Seraị pụtara “Onye Na-ese Okwu.”

Sera pụtara “Ada Eze.”

Aịzik pụtara “Ọchị.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ebreham kpọrọ otu n’ime ndị mmụọ ozi ahụ “Jehova” maka na ọ bụ ya ka mmụọ ozi ahụ nọchitere anya ya.

Sia bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu sia bụ lita 7.33. Gụọ B14.

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Ma ọ bụ “Sera anaghịzi ahụ nsọ ya.”

Ma ọ bụ “i gosikwara m ịhụnanya pụrụ iche.”

Ya bụ, mmụọ ozi ahụ nke na-anọchite anya Chineke.

Zoa pụtara “Obere.”

Okwu a sụgharịrị sọlfọ ebe a pụtara ụdị nkume na-ere ọkụ.

Ma ọ bụ “Ọ nọ na-ele.”

Na Hibru, “dinaa.”

Na Hibru, “edinaa.”

Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”

Ma ọ bụ “Ọ bụkwa onye mbịarambịa.”

Ya bụ, ya na ya enwebeghị mmekọahụ.

Ma ọ bụ “gosi m ịhụnanya pụrụ iche.”

O nwere ike ịbụ, “ga-achị m ọchị.”

Ma ọ bụ “onye a ga-akpọ nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “n’ebe akụ́ ụta ga-eru ma a gbapụ ya.”

Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”

Ọ ga-abụ na Bia-shiba pụtara “Olulu Mmiri Ịṅụ Iyi; Olulu Mmiri Asaa.”

Ma ọ bụ “bụrụ onye mbịarambịa.”

Na Hibru, “ọtụtụ ụbọchị.”

O nwere ike ịbụ icheku ọkụ ka a na-ekwu.

Jehova-jaịre pụtara “Jehova Ga-eweta; Jehova Ga-ahụ Maka Ya.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “Mkpụrụ.”

Na Hibru, “ọnụ ụzọ ámá.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

O nwere ike ịbụ, “nnukwu onyeisi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”

Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Ihe a nwere ike ịbụ otú ndị oge ochie si aṅụrụ mmadụ iyi.

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “gosikwa nna m ukwu Ebreham ịhụnanya pụrụ iche.”

Ma ọ bụ “i gosila nna m ukwu ịhụnanya pụrụ iche.”

Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Ma ọ bụ “na-egosi nna m ukwu ịhụnanya pụrụ iche.”

O nwere ike ịbụ Leban ka a na-ekwu.

Ma ọ bụ “ịgwa gị ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ.”

Ya bụ, onye nyere ya ara nke bụzi onye na-ejere ya ozi ugbu a.

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “ọnụ ụzọ ámá.”

Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”

Ya bụ, onye na-ejere Ebreham ozi.

O nwere ike ịbụ, “Ha na ụmụnne ha niile ebighị n’udo.”

Ma ọ bụ “Siria.”

Ịsọ pụtara “Ajị Ajị.”

Jekọb pụtara “Onye Jidere Ikiri Ụkwụ; Onye Na-anapụ Onye Ọzọ Ihe Ya.”

Ịdọm pụtara “Ọbara Ọbara.”

Mkpụrụ lentil na-adị ka mkpụrụ àgwà.

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “na-amakụ ibe ha.”

Isek pụtara “Esemokwu.”

Sitna pụtara “Ebubo.”

Rehobọt pụtara “Ebe Sara Mbara.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”

Jekọb pụtara “Onye Jidere Ikiri Ụkwụ; Onye Na-anapụ Onye Ọzọ Ihe Ya.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Na Hibru, “ị ga-agbajipụ yok ya n’olu gị.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “Siria.”

Ma ọ bụ “ubube.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Betel pụtara “Ụlọ Chineke.”

Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.

Na Hibru, “nwanne.”

Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.

Ma ọ bụ “otu ọkpụkpụ na otu anụ ahụ́.”

Na Hibru, “nwanne.”

Na Hibru, “ụmụ nwoke.”

Na Hibru, “kpọrọ Lia asị.”

Na Hibru, “meghere akpa nwa ya.”

Ruben pụtara “Lee, Ọ Bụ Nwa Nwoke!”

Simiọn pụtara “Ige Ntị.”

Livaị pụtara “Ịrapara; Njikọta.”

Juda pụtara “Onye A Na-eto.”

Ma ọ bụ “onye jụrụ inye gị mkpụrụ nke afọ.”

Na Hibru, “ọ mụọ nwa n’ikpere m.”

Dan pụtara “Onyeikpe.”

Naftalaị pụtara “Mgba M Gbara.”

Gad pụtara “Ihe Ndabara Ọma.”

Asha pụtara “Obi Ụtọ.”

Ụmụ nwaanyị na-eri mkpụrụ ahịhịa a maka na ha chere na ọ ga-eme ka ha dị ime.

Ma ọ bụ “ụgwọ ọrụ onye e goro ọrụ.”

Ịsaka pụtara “Ọ Bụ Ụgwọ Ọrụ.”

Zebulọn pụtara “Nnabata”

Na Hibru, “Chineke wee gee ya ntị ma meghee akpa nwa ya.”

Josef bụ mkpọbiri aha bụ́ Josifaya. Ọ pụtara “Ka Jaa Gbakwụnye Ihe (Mụbaa).”

Ma ọ bụ “ihe m gbatara n’afa.”

Ma ọ bụ “m na-akwụwa aka ọtọ.”

Ya bụ, Jekọb.

Na Hibru, “ebe ị nọ tee otu ogidi mmanụ.”

Na Hibru, “terafim.”

Ma ọ bụ “Siria.”

Ma ọ bụ “ndị ikwu.”

Ma ọ bụ “Siria.”

Na Hibru, “ụmụ m ndị nwoke.”

Na Hibru, “terafim.”

Na Hibru, “terafim.”

Ma ọ bụ “na-atụ egwu ya.”

Jiga-sahaduta bụ okwu Arameik. Ọ pụtara “Ikpo Ihe Àmà.”

Galied bụ okwu Hibru. Ọ pụtara “Ikpo Ihe Àmà.”

Na Hibru, “ọ bụrụgodị na e nweghị onye anyị na ya nọ, cheta na Chineke ga-abụrụ.”

Ma ọ bụ “na-atụ egwu ya.”

Na Hibru, “ụmụ ya ndị nwoke.”

Mahaneyim pụtara “Ìgwè Ndị Agha Abụọ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ma ọ bụ “ndagwurugwu.”

Izrel pụtara “Onye Ya na Chineke Gbara Mgba” ma ọ bụ “Chineke Na-agba Mgba.”

Penayel pụtara “Ihu Chineke.”

Ma ọ bụ “Penayel.”

Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.

Sọkọt pụtara “Ụlọ Ndò.”

Ma ọ bụ “na-adị aga ahụ ụmụ agbọghọ obodo ahụ.”

Ma ọ bụ “zoo.”

El-betel pụtara “Chineke Betel.”

Alọn-bakọt pụtara “Osisi Ook A Nọ n’Okpuru Ya Bee Ákwá.”

Na Hibru, “ndị eze ga-esi n’úkwù gị pụta.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Ben-onaị pụtara “Nwa Iru Uju M.”

Benjamin pụtara “Nwa Aka Nri.”

Ma ọ bụ “ala ebe ha bụ ndị mbịarambịa.”

Ma ọ bụ “ụmụ ụmụ.”

Ma ọ bụ “ụmụ ụmụ.”

Ma ọ bụ “ụmụ ụmụ.”

Ma ọ bụ “ụmụ ụmụ.”

Ma ọ bụ “uwe mwụda mara mma.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Ọ ga-abụ na e gwuru olulu ndị a ka mmiri na-asọba na ha.

Na Hibru, “awụfula ọbara.”

Ma ọ bụ “ụgbụgbọ osisi.” A na-eji eso si n’azụ osisi a eme ihe na-esi ísì ọma.

Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Hibru, “Ọ,” ya bụ, Juda.

Ma ọ bụ “onye na-agba akwụna n’ụlọ arụsị.” O nwere ike ịbụ na ịgba akwụna a bụ ụdị nke e ji efe chi dị iche iche.

Pirez pụtara “Mgbawa.” O nwere ike ịbụ ahụ́ nne ya merụrụ mgbe ọ na-amụ ya ka a na-ekwu.

Ma ọ bụ “nọkwa na-egosi ya ịhụnanya pụrụ iche.”

Na Hibru, “ụbọchị.”

Ma ọ bụ “gosi m ịhụnanya pụrụ iche.”

Na Hibru, “n’olulu.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Na Hibru, “n’olulu.”

“Avrek” nwere ike ịbụ mkpu a na-eti iji gwa ndị mmadụ ka ha kwanyere mmadụ ùgwù.

Na Hibru, “ga-eweli aka ya ma ọ bụ zọlie ụkwụ ya.”

Ya bụ, Heliopolis.

Ma ọ bụ “ịgagharị n’Ijipt.”

Ma ọ bụ “mgbe ọ malitere ijere Fero ozi.”

Ya bụ, Heliopolis.

Manase pụtara “Onye Na-eme Ka E Chefuo Ihe.”

Ifrem pụtara “Ịmụ Ọmụmụ Okpukpu Okpukpu.”

Na Hibru, “achịcha.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Ya bụ, ụmụ Jekọb.

Na Hibru, “emehiela nwata ahụ.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Ma ọ bụ “gọm.”

Ma ọ bụ “ụgbụgbọ osisi.” A na-eji eso si n’azụ osisi a eme ihe na-esi ísì ọma.

Ya bụ, ụmụ Jekọb.

Na Hibru, “Ha.”

Na Hibru, “nna.”

Ya bụ, ụmụ Jekọb.

Na Hibru, “ga-ebikwasị aka ya n’anya gị.”

Ya bụ, ụmụ Jekọb.

Okwu Hibru a sụgharịrị “ụmụ” nwere ike ịbụ ma ụmụ ma ụmụ ụmụ ma ụmụ ụmụ ụmụ.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ya bụ, Heliopolis.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Na Hibru, “Ụmụ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “abụ m onye mbịarambịa.”

Ma ọ bụ “n’oge ha bụ ndị mbịarambịa.”

O nwere ike ịbụ na Ramesis bụ ógbè dị na Goshen ma ọ bụkwanụ ya abụrụ aha ọzọ a na-akpọ Goshen.

Na Hibru, “achịcha.”

Na Hibru, “Achịcha.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Ihe a nwere ike ịbụ otú ndị oge ochie si aṅụrụ mmadụ iyi.

Ma ọ bụ “gosi m ịhụnanya pụrụ iche.”

Na Hibru, “M soro nna m hà dinara.”

Ma ọ bụ “n’isi ihe ndina.”

Ma ọ bụ “n’àkwà ya.”

Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “jere ije n’ihu ya.”

Na Hibru, “mkpụrụ.”

Na Hibru, “ná ngwụcha ụbọchị ndị ahụ.”

Ma ọ bụ “onye mbụ m ji ike m ji amụ nwa mụọ.”

Na Hibru, “ị rịgooro n’àkwà.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “Ùgwù m.”

Na Hibru, “Aka gị ga-adị n’olu ndị iro gị.”

Shaịlo pụtara “Onye Ọ Bụ nke Ya.”

Ọ ga-abụ Shaịlo ka a na-ekwu.

Ihe a pụtara na Juda ga-enweju mmanya na mmiri ara ehi enweju.

Na Hibru, “achịcha.”

Ya bụ, Josef.

Na Hibru, “Ha ga na-adị n’isi Josef.”

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”

Ma ọ bụ “ndị ezinụlọ Fero.”

Ma ọ bụ “ndị bụ́ okenye n’ezinụlọ.”

Ma ọ bụ “ndị okenye.”

Ebel-mizreyim pụtara “Uju Ndị Ijipt Ruru.”

Na Hibru, “A mụrụ ha n’ikpere Josef.”

Ya bụ, ụmụ Jekọb.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya