ABỤ ỌMA
AKWỤKWỌ NKE MBỤ
(Abụ Ọma 1-41)
1 Onye ọ bụla nke na-anaghị eso ndụmọdụ ndị ajọ omume,
Nke na-anaghị eso ụzọ ndị mmehie,+
Nke na-anaghịkwa anọ n’ebe ndị na-akwa emo nọ,+ na-enwe obi ụtọ.
3 Ọ ga-adị ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,
Osisi nke na-amị mkpụrụ n’oge ya,
Nke akwụkwọ ya na-anaghị akpọnwụ akpọnwụ.
Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.+
4 Ndị ajọ omume adịghị otú ahụ.
Ha dị ka mkpo ọka* ifufe na-efesasị.
5 Ọ bụ ya mere a ga-eji ama ndị ajọ omume ikpe,+
Ndị mmehie agaghịkwa anọgide n’ebe ndị ezi omume zukọrọ.+
2 Ndị eze ụwa na-ejikere,
Ndị isi na-ezukọtakwa ka otu ndị+
Ka ha lụso Jehova na onye o tere mmanụ ọgụ.+
3 Ha na-asị: “Ka anyị dọbisịa agbụ ha kere anyị,
Tụfusịakwa ụdọ ha.”
4 Onye nọ n’ocheeze n’eluigwe ga-achị ọchị.
Jehova ga-akwa ha emo.
5 N’oge ahụ, ọ ga-eji iwe gwa ha okwu,
Jirikwa oké iwe na-ewe ya yie ha egwu.
7 Ka m kọsaa ihe Jehova kwuru.
Ọ gwara m, sị: “Ị bụ ọkpara m.+
Abụrụla m nna gị taa.+
8 Rịọ m, m ga-enye gị mba dị iche iche ka ha bụrụ ihe i ketara,
Nyekwa gị ebe niile ụwa sọtụrụ ka ha bụrụ nke gị.+
10 Ugbu a, unu ndị eze, gosinụ na unu na-aghọta ihe.
Unu ndị na-ekpe ikpe n’ụwa, nabatanụ aka ná ntị a na-adọ unu.*
11 Na-atụnụ egwu Jehova mgbe unu na-efe ya,
Na-amakwanụ jijiji mgbe unu na-aṅụrị ọṅụ.
12 Kwanyerenụ ọkpara ya ùgwù,*+ ma ọ́ bụghị ya, Chineke* ga-ewe iwe,
Unu ewee laa n’iyi,+
N’ihi na o nwere ike iwe iwe ngwa ngwa.
Ndị niile na-agbaba n’ime ya na-enwe obi ụtọ.
Abụ Devid bụrụ mgbe ọ na-agba ọsọ n’ihi Absalọm nwa ya.+
3 Jehova, gịnị mere ndị iro m ji dị nnọọ ọtụtụ?+
Gịnị mere ọtụtụ ndị ji na-alụso m agha?+
2 Ọtụtụ ndị na-ekwu banyere m,* sị:
“Chineke agaghị azọpụta ya.”+ (Sila)*
5 M ga-edina ala rahụ ụra.
M ga-etetakwa n’udo,
N’ihi na Jehova na-akwado m.+
7 Jehova, biko, bilie. Zọpụta m,+ Chineke m.
N’ihi na ị ga-akụ ndị iro m niile ihe n’agba.
Ị ga-akụpịasị ezé ndị ajọ omume.+
8 Jehova, ọ bụ gị bụ Onye Nzọpụta.+
Ị na-agọzi ndị gị. (Sila)
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya. Abụ Devid.
4 Mgbe m kpọrọ gị, biko za m, Chineke m onye ezi omume.+
Meere m ụzọ m ga-esi gbapụ* n’ahụhụ m na-ata.
Meere m amara, nụkwa ekpere m.
2 Unu ụmụ mmadụ, olee mgbe unu ga-akwụsị ịkpụ ùgwù m n’ala?
Olee mgbe unu ga-akwụsị ịhụ ihe efu n’anya na ịchọgharị ihe na-abụghị eziokwu? (Sila)
3 Maranụ na Jehova ga-emeso onye jisiri ya aka ike ihe otú pụrụ iche.
Jehova ga-anụ olu m ma m kpọọ ya.
4 Weenụ iwe, ma unu emehiela.+
Kwuonụ ihe unu chọrọ ikwu n’obi unu, n’elu àkwà* unu, ma gbanụ nkịtị. (Sila)
6 E nwere ọtụtụ ndị na-ajụ, sị: “Ònye ga-eme ka ihe ọma ruo anyị aka?”
Jehova, biko, meere anyị amara.*+
7 I meela ka ọṅụ ju m obi
Karịa ọṅụ ndị mmadụ na-enwe mgbe ha nwetara ọka na mmanya ọhụrụ buru ibu n’ubi ha.
Maka onye na-eduzi Nihilọt.* Abụ Devid.
5 Jehova, biko, gee ntị n’ihe m na-ekwu.+
Nụrụ ude m na-asụ.
2 Eze m na Chineke m, biko, ṅaa ntị n’ákwá m na-ebe ka i nyere m aka,
N’ihi na ọ bụ gị ka m na-arịọ.
3 Jehova, biko, ị ga-anụ olu m n’ụtụtụ.+
N’ụtụtụ, m ga-akọrọ gị ihe na-echegbu m,+ m ga-atụsikwa anya ike ka ị za m.
4 N’ihi na ị bụghị Chineke nke ajọ omume na-atọ ụtọ.+
E nweghị onye na-eme ihe ọjọọ ị ga-ahapụ ka gị na ya biri.+
5 E nweghị onye na-etu ọnụ ga-eguzo n’ihu gị.
Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị.+
6 Ị ga-ebibi ndị na-agha ụgha.+
Jehova, ị kpọrọ ndị tigbuo zọgbuo na ndị na-aghọ aghụghọ* asị.+
7 Ma m ga-abata n’ụlọ gị+ n’ihi ịhụnanya gị* nke dị ukwuu.+
M ga-eche ihu n’ụlọ nsọ gị kpọọ isiala n’ihi na m na-akwanyere gị ezigbo ùgwù.+
8 Jehova, ị bụ onye ezi omume. Biko, duo m n’ihi ndị iro m.
Mee ka m nwee ike ịga n’ụzọ gị n’enweghị ihe ga-eme ka m daa.+
9 N’ihi na e nweghị ihe ha na-ekwu e nwere ike ịtụkwasị obi.
Ihe juru ha n’obi bụ naanị ịkpọasị.
Ọnụ* ha dị ka ili ghe oghe.
Ha na-eto mmadụ otuto elu ọnụ.+
10 Ma, Chineke, ị ga-ekwu na ikpe mara ha.
Atụmatụ ha ga-akpatara ha ọdachi.+
Ka a chụpụ ha n’ihi na ihe ọjọọ ha na-eme dị ọtụtụ,
N’ihi na ha enupụrụla gị isi.
11 Ma ndị niile na-agbaba n’ime gị ga-aṅụrị ọṅụ.+
Ha ga na-eti mkpu ọṅụ mgbe niile.
Ị ga-echebe ha,
Ndị ji aha gị kpọrọ ihe ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi gị.
12 N’ihi na gịnwa bụ́ Jehova ga-agọzi onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume.
Ị ga-eji amara* gị gbaa ya gburugburu ka ebe e ji ọta ukwu gbaa mmadụ gburugburu.+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya n’ụda Sheminit.* Abụ Devid.
2 Jehova, biko, meere m amara,* n’ihi na ike na-agwụ m.
Jehova, biko, gwọọ m,+ n’ihi na ọkpụkpụ m na-ama jijiji.
4 Jehova, biko, lọghachi ka ị napụta m.*+
5 N’ihi na onye nwụrụ anwụ anaghị akpọ aha* gị.
6 Ude m na-asụ emeela ka ike gwụ m.+
Anya mmiri m na-ede àkwà* m abalị niile.
Ákwá m na-ebe na-eme ka anya mmiri m dee ihe m ji edina ala.+
7 Uju m na-eru emeela ka anya m gharazie ịna-ahụcha ụzọ.+
Ọ na-ahụzi inyoghi inyoghi n’ihi ndị niile na-achọ m okwu.
9 Jehova ga-anụ arịrịọ m na-arịọ ka o meere m amara.+
Jehova ga-aza ekpere m.
10 A ga-eme ka ihere mee ndị iro m niile, obi adaa ha mbà.
Ihere ga-ejide ha na mberede, ha alaghachi azụ.+
Abụ iru uju* Devid bụrụ mgbe ọ na-agwa Jehova ihe Kush onye si n’ebo Benjamin kwuru.
7 Jehova Chineke m, ọ bụ gị ka m ji mere ebe mgbaba.+
Zọpụta m n’aka ndị niile na-akpagbu m, napụtakwa m.+
2 Ma ọ́ bụghị ya, ha ga-adọri m* otú ọdụm si adọri anụ,+
Ha ga-adọkpụrụ m pụọ n’enweghị onye ga-anapụta m.
3 Jehova Chineke m, ọ bụrụ na e nwere ihe ọjọọ m mere,
Ọ bụrụ na e nwere ihe na-adịghị mma m mere,
4 Ọ bụrụ na m mejọrọ onye na-emere m ihe ọma,+
Ma ọ bụ, ọ bụrụ na m bukọọrọ ihe onye iro m mgbe ọ na-enweghị ihe o mere,*
Ka ọ zọda m* n’ala
Wee mee ka a kpụọ ùgwù m n’ala. (Sila)
6 Jehova, biko, jiri iwe bilie.
Bilie lebara oké iwe ndị iro m na-ewesa m anya.+
Bilie ka i nyere m aka. Nye iwu ka e kpee ikpe ziri ezi.+
7 Ka mba dị iche iche gbaa gị gburugburu.
Ị ga-esikwa n’elu mesie ha ike.
8 Jehova ga-ekwu ihe o kpebiri ime ndị dị iche iche.+
Jehova, biko, mgbe ị na-ekpe m ikpe,
Cheta ezi omume m na-eme nakwa otú m si akwụwa aka ọtọ.+
9 Biko, mee ka ihe ọjọọ ndị ajọ omume na-eme kwụsị.
Ma, chebe onye ezi omume,+
Ebe ọ bụ na ị bụ Chineke ezi omume,+ onye na-enyocha obi+ na ihe dị n’ala ala obi.*+
10 Chineke bụ ọta m,+ Onye na-azọpụta ndị obi ha dị ọcha.+
11 Chineke bụ Onyeikpe nke na-ekpe ikpe ziri ezi.+
Chineke na-ama ndị ajọ omume ikpe kwa ụbọchị.
12 Ọ bụrụ na mmadụ ajụ ichegharị,+ Chineke na-amụ mma agha ya.+
Ọ na-ekwe ụta ya, kwadebekwa ya.+
13 Ọ na-akwadebe ngwá ọgụ ndị na-egbu mmadụ.
Ọ na-akwadebe akụ́ ya ndị na-ere ọkụ.+
14 Legodị onye na-akpa nkata ọjọọ.*
Ọ na-echepụta ihe ọjọọ, ihe sikwa ya n’ọnụ apụta bụ ụgha.+
16 Ọ ga-eji isi ya buru nsogbu ọ na-akpata.+
Arụrụala ọ na-arụ ga-ala ya n’isi.
17 M ga-eto Jehova maka na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi.+
M ga-abụ abụ iji too aha Jehova+ Onye Kacha Elu.+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ; nke ụda Gitit.* Abụ Devid.
8 Onyenwe anyị Jehova, aha gị dị nnọọ ebube n’ebe niile n’ụwa.
I meela ka ebube gị dị ukwuu karịa eluigwe.*+
2 N’ihi ndị iro gị,
I sila n’ọnụ ụmụaka na ụmụ ọhụrụ+ gosi ike gị,
Ka i wee mee ka onye iro na onye na-emegide gị mechie ọnụ.
3 Mgbe m hụrụ eluigwe gị, bụ́ ọrụ aka* gị,
Ọnwa na kpakpando ndị i kere,+
4 Gịnị ka mmadụ efu bụ nke mere i ji na-echeta ya?
Gịnịkwa ka nwa nke mmadụ bụ nke mere i ji na-elekọta ya?+
5 I mere ka ndị mmụọ ozi* katụ ya.
I ji ebube na ùgwù chọọ ya mma.
6 I mere ka o lekọtawa ọrụ aka gị.+
I mere ka ihe niile nọrọ n’okpuru ya:
7 Ìgwè ewu na atụrụ niile na ehi,
Nakwa anụ ọhịa dị iche iche,+
8 Nnụnụ na azụ̀,
Ihe ọ bụla na-egwugharị n’oké osimiri.
9 Onyenwe anyị Jehova, aha gị dị nnọọ ebube n’ebe niile n’ụwa.
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ; nke ụda Mọt-laben.* Abụ Devid.
א [Alef]
9 Jehova, m ga-eji obi m niile too gị.
M ga-akọsa ọrụ niile dị ebube ị na-arụ.+
2 M ga-aṅụrị ọṅụ ma nwee obi ụtọ n’ihi gị.
Gị Onye Kacha Elu, m ga-abụ abụ iji too aha gị.+
ב [Bet]
4 N’ihi na ị na-ekpechite ọnụ m ka e wee kpee m ikpe ziri ezi.
Ị nọ ọdụ n’ocheeze gị na-ekpe ikpe ziri ezi.+
ג [Gimel]
5 Ị baarala mba dị iche iche mba,+ bibiekwa ndị ajọ omume,
Wee hichapụ aha ha ruo mgbe niile ebighị ebi.
6 E bibiela onye iro ruo mgbe ebighị ebi.
I bibiri obodo ha,
A gaghịkwa echeta ha ọzọ.+
ה [Hee]
7 Ma Jehova ga-anọ n’ocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi.+
Ọ nọrọla n’ocheeze ya ka o kpee ikpe ziri ezi.+
8 Ọ ga-ekpe ụwa* ikpe ziri ezi.+
Ọ ga-ekpere mba dị iche iche ikpe ziri ezi.+
ו [Wọọ]
9 Jehova ga-abụrụ ndị a na-emegbu emegbu ebe ha ga-agbaba, aka aghara ịkpa ha,+
Ebe ndị nọ ná nsogbu ga-agbaba.+
10 Ndị ma aha gị ga-atụkwasị gị obi.+
Jehova, ị gaghị ahapụ ndị na-achọ gị.+
ז [Zayin]
11 Bụkuonụ Jehova, onye bi na Zayọn, abụ otuto.
Kọọrọnụ mba dị iche iche ihe ndị ọ na-eme.+
12 N’ihi na ọ ga-echeta ndị na-ata ahụhụ ma bọọ ọbọ ọbara ha.+
Ọ gaghị echefu ákwá ha na-ebe.+
ח [Het]
13 Jehova, biko, meere m amara; hụrụ otú ndị kpọrọ m asị si na-emesi m ike,
Gị onye si n’ọnụ ọnwụ kpọpụta m,+
14 Ka m wee nọrọ n’ọnụ ụzọ ámá Zayọn*+ kọsaa ọrụ ọma niile ị na-arụ
Ma ṅụrịa ọṅụ maka na ị na-azọpụta m.+
ט [Tet]
15 Mba dị iche iche adabala n’olulu ha gwuru.
Ụgbụ ha ji sie ọnyà ejidela ha n’ụkwụ.+
16 Ikpe Jehova na-ekpe emeela ka a mara ya.+
Ihe onye ajọ omume na-eme emeela ka ọnyà ma ya.+
Higeyọn.* (Sila)
י [Yod]
17 Ndị ajọ omume ga-aga n’ili.*
Ọ bụ ebe mba niile chefuru Chineke ga-aga.
18 Ma, a gaghị echefu ndị ogbenye mgbe niile.+
Ihe ndị dị umeala n’obi na-ele anya ya ga-emekwa.+
כ [Kaf]
19 Jehova, biko, bilie. Ekwela ka mmadụ efu merie gị.
Ka e kpee mba dị iche iche ikpe n’ihu gị.+
ל [Lamed]
10 Jehova, gịnị mere i ji guzoro n’ebe dị anya?
Gịnị mere i ji zoo n’oge m na-ata ahụhụ?+
2 Mpako na-eme ka onye ajọ omume na-achụ onye na-enweghị onye na-enyere ya aka,+
Ma nkata ọjọọ ọ na-akpa ga-ekpudo ya.+
נ [Nun]
Ọ na-elelị Jehova anya.
4 Mpako na-eme ka onye ajọ omume ghara ime nchọpụta.
Naanị ihe ọ na-eche n’obi ya bụ na Chineke adịghị.+
Ọ na-achị ndị iro ya niile ọchị.
6 Ọ na-ekwu n’obi ya, sị: “E nweghị ihe ga-eme ka m daa.*
Ọdachi agaghị adakwasị m+
Malite n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.”
פ [Pee]
7 Ọ na-abụ ndị mmadụ ọnụ mgbe niile, na-agha ụgha, na-eyikwa ndị mmadụ egwu.+
Ọ na-eji ire ya akpata nsogbu, jirikwa ya na-ekwu okwu ọjọọ.+
8 Ọ na-ezo n’ebe dị nso n’obodo chechie ndị mmadụ.
Ọ na-esi n’ebe o zoro pụta gbuo onye aka ya dị ọcha.+
ע [Ayin]
Ọ na-achagharị anya, na-achọ onye ga-adaba n’aka ya.+
9 Ọ na-echere n’ebe o zoro ka ọdụm nọ n’ọgba ya.*+
Ọ na-echere ka o jide onye na-enweghị onye na-enyere ya aka.
Ọ na-esechi ụgbụ ya, onye na-enweghị onye na-enyere ya aka atọ n’ime ya.+
10 Ọ na-echi onye o jidere ọnụ n’ala ma kwatuo ya.
Ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na-adaba n’aka ya.
11 Ọ na-asị n’obi ya: “Chineke echefuola.+
O wepụla ihu ya.
Ọ naghị ahụ ihe na-eme.”+
ק [Kof]
12 Jehova, biko, bilie.+ Chineke, biko, kpaa ike.*+
Echefula ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka.+
13 Gịnị mere onye ajọ omume ji lelịa Chineke?
Ọ na-asị n’obi ya: “Ị gaghị asị m zaa ajụjụ ihe m mere.”
ר [Resh]
14 Ma ị na-ahụ ndị ahụ na-akpata nsogbu na ahụhụ.
Ị na-ele anya hụ ha ma lebara ha anya.+
Onye dabara n’aka ha na-arịọ gị ka i nyere ya aka.+
Ọ bụ gị na-enyere nwa na-enweghị nna* aka.+
ש [Shin]
16 Jehova bụ Eze ruo mgbe niile ebighị ebi.+
E bibiela mba dị iche iche, e wepụkwala ha n’ụwa.+
ת [Tọọ]
17 Ma Jehova, ị ga-anụ arịrịọ ndị dị umeala n’obi na-arịọ gị.+
Ị ga-eme ka obi sie ha ike+ ma gee ha ntị.+
18 Ị ga-ekpere ụmụ na-enweghị nna na ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi,+
Ka mmadụ efu ọ bụla nọ n’ụwa wee ghara ime ka ha tụọ egwu ọzọ.+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
11 Ọ bụ Jehova ka m ji mere ebe mgbaba.+
Oleezi ihe mere unu ji asị m:*
“Fere ka nnụnụ gaa n’ugwu?
2 Legodị otú ndị ajọ omume si na-ekwe ụta.
Ha na-etinye akụ́ ha n’eriri ụta ha
Ka ha nọrọ n’ọchịchịrị gbaa ya ndị obi ha dị ọcha.
3 Gịnị ka ndị ezi omume ga-eme
Mgbe a na-anaghịzi ekpe ikpe ziri ezi, mgbe a na-enweghịzi ihe e ji iwu kpọrọ?”*
Ocheeze Jehova dị n’eluigwe.+
Anya ya na-ahụ ihe niile. Anya ya nke na-ahụ ụzọ nke ọma* na-eleru ndị mmadụ anya.+
5 Jehova na-eleru ma onye ezi omume ma onye ajọ omume anya.+
Ọ* kpọrọ onye ọ bụla tigbuo zọgbuo na-amasị asị.+
6 Ọ ga-esiri ndị ajọ omume ọnyà aghara aghara.*
Ọ ga-eji ọkụ na sọlfọ+ na ifufe na-ekpo ọkụ bibie ha.
7 N’ihi na Jehova bụ onye ezi omume;+ ezi omume na-amasị ya.+
Ndị ezi omume ga-ahụ ihu ya.*+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. E ji ụda Sheminit* kpọọ ya. Abụ Devid.
12 Jehova, biko zọpụta m, n’ihi na ndị na-eme ezi omume agwụla.
Ndị a tụkwasịrị obi anọghịzi.
2 Ndị mmadụ na-agwa ibe ha okwu ụgha.
Ha na-eto ndị ọzọ otuto elu ọnụ, na-eduhiekwa ha.+
3 Jehova ga-ebepụ ọnụ* ndị niile na-eto ndị ọzọ otuto elu ọnụ
Nakwa ire ndị na-etu ọnụ,+
4 Ndị na-asị: “Anyị ga-eji ire anyị merie.
Anyị ga-eji ọnụ* anyị na-ekwu ihe masịrị anyị.
Ònye ga-abụ nna anyị ukwu?”+
5 Jehova kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na a na-emegbu ndị na-ata ahụhụ,
Ebe ọ bụ na ndị ogbenye na-asụ ude,+
M ga-ebili kpaa ike.
M ga-azọpụta ha n’aka ndị na-ejighị ha kpọrọ ihe.”
Ha dị ka ọlaọcha a nụchara anụcha, nke a nụchara ugboro asaa n’ekwú e ji ụrọ kpụọ.
Ị ga-echebe onye ọ bụla n’ime ha n’aka ọgbọ a ruo mgbe ebighị ebi.
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
13 Jehova, ruo ole mgbe ka ị ga-echefu m? Ọ̀ bụ ruo mgbe ebighị ebi?
Olee mgbe ị ga-akwụsị izoro m ihu gị?+
Olee mgbe onye iro m ga-akwụsị imeri m?+
3 Jehova Chineke m, biko, lee m anya za m.
Ekwela ka ndị iro m ṅụrịa ọṅụ maka na m dara.+
5 M tụkwasịrị ịhụnanya gị* obi.+
Obi ga-atọ m ụtọ maka na ị na-azọpụta m.+
6 M ga-abụku Jehova abụ n’ihi na o jirila ọtụtụ ihe ọma kwụọ m ụgwọ.+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ọma Devid.
14 Ndị nzuzu* na-asị n’obi ha:
“Jehova adịghị.”+
Ha na-eme omume rụrụ arụ, na-emekwa ihe ọjọọ dị iche iche.
E nweghị onye na-eme ihe dị mma.+
2 Ma Jehova si n’eluigwe na-ele ndị mmadụ anya
Ka ọ hụ ma è nwere onye na-aghọta ihe, ma è nwere onye na-achọ Jehova.+
3 Ha niile akwụsịla ime ihe dị mma.+
Ha niile rụrụ arụ.
E nweghị onye na-eme ihe dị mma,
E nweghịdị otu onye.
4 Ọ̀ bụ na e nweghị onye na-aghọta ihe n’ime ndị na-eme ihe ọjọọ?
Ha na-eri ndị m ka à ga-asị na ha na-eri nri.*
Ha anaghị efe Jehova.
6 Unu ndị ajọ omume na-agbalị ka unu mebie atụmatụ nke onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya,
Ma Jehova bụ ebe mgbaba ya.+
7 Ọ dị m ka ya bụrụ na a ga-esi na Zayọn zọpụta ndị Izrel.+
Ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka ndị Izrel nweekwa obi ụtọ
Mgbe Jehova ga-akpọlata ndị ya a dọọrọ n’agha.
Abụ Devid.
15 Jehova, ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị?
Ònye ga-ebi n’ugwu nsọ gị?+
2 Ọ bụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta,*+
Onye na-eme ezi ihe,+
Onye na-ekwukwa eziokwu n’obi ya.+
Ọ na-emezu nkwa o kwere,* ọ bụrụgodị na imezu ya ga-akpa ya aka ọjọọ.+
A gaghị eme ka onye ọ bụla na-eme ihe ndị a daa.*+
Miktam* Devid.
16 Chineke, biko chebe m, n’ihi na ọ bụ gị ka m ji mere ebe mgbaba.+
2 M sịrị Jehova: “Ị bụ Jehova. Ihe ọma niile na-emere m* si n’aka gị.
4 Ndị ji obi ha niile na-efe chi ọzọ na-akpatara onwe ha ọtụtụ nsogbu.+
E nweghị mgbe m ga-eso ha chụọ àjà mmanya ha nke ha na-eji ọbara achụ,
5 Jehova, ị bụ òkè e kenyere m,+ bụrụkwa iko m.+
Ị naghị ekwe ka ihe ọ bụla mee ihe m ketara.
6 Ebe e kenyere m mara mma.
N’eziokwu, ihe m ketara dị m mma.+
7 M ga-eto Jehova, onye dụrụ m ọdụ.+
N’abalị, ihe m na-eche n’ime ime obi m na-akụziri m ihe.*+
8 M mere ka Jehova nọrọ n’ihu m mgbe niile.+
Ebe ọ bụ na ọ nọ m n’aka nri, e nweghị ihe ga-eme ka m daa.*+
9 N’ihi ya, obi na-atọ m ụtọ. Ana m enwe* ezigbo aṅụrị.
Ahụ́ rukwara m ala.
10 N’ihi na ị gaghị ahapụ m* n’ili.*+
Ị gaghị ekwe ka onye jisiri gị aka ike nọrọ n’ili.*+
11 Ị na-eme ka m mara ụzọ ndụ.+
Onye nọ n’ihu gị na-enwe ọṅụ na-enweghị atụ.+
Onye nọ n’aka nri gị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.
Ekpere Devid.
17 Jehova, biko, nụrụ arịrịọ m na-arịọ ka e kpee m ikpe ziri ezi.
Ṅaa ntị n’ákwá m na-ebe ka i nyere m aka.
Gee ntị n’ekpere m, nke m na-ejighị aghụghọ ekpe.+
2 Biko, kpebie ihe ziri ezi nke ga-abara m uru.+
Biko, ka anya gị hụ ihe ziri ezi.
3 I nyochaala obi m. I leruola m anya n’abalị.+
Ị nụchaala m.+
Ị ga-achọpụta na e nweghị nkata ọjọọ m kpara,
Ejighịkwa m ọnụ m kwuo ihe ọjọọ.
6 Chineke, m na-akpọ gị ka i nyere m aka maka na ị ga-aza m.+
Gee m ntị.* Nụrụ ihe m na-ekwu.+
7 Gị Onye na-azọpụta ndị na-agbaba n’aka gị siri ike,*
Onye na-azọpụta ha n’aka ndị na-enupụrụ gị isi,
Biko, mee ihe dị ebube iji gosi ịhụnanya gị.+
Zoo m n’okpuru nku gị.+
9 Napụta m n’aka ndị ajọ omume ndị na-alụso m ọgụ,
N’aka ndị iro m gbara m gburugburu ma na-achọ igbu m.+
10 Ihe anaghịzi emetụ ha n’ahụ́.*
Ha na-etu ọnụ.
11 Ugbu a, ha agbaala anyị gburugburu.+
Ha na-ele anyị anya ka ha chọta ohere ha ga-eji eme ka anyị daa.
12 Onye ajọ omume dị ka ọdụm chọrọ ịdọri anụ,
Ka ọdụm makpu n’ebe zoro ezo.
13 Jehova, biko, bilie lụso ya ọgụ+ ma merie ya.
Jiri mma agha gị napụta m* n’aka onye ajọ omume.
14 Jehova, biko, jiri aka gị napụta m
N’aka ndị nọ n’ụwa a,* ndị ihe ha ketara bụ ndụ ha dị ugbu a,+
Ndị i ji ihe ọma ndị ị na-enye ndị mmadụ eme ka afọ ju,+
Ndị na-ahapụrụ ọtụtụ ụmụ ha mụrụ akụ̀ ha ga-eketa.
15 Ma ezi omume m na-eme ga-eme ka m hụ ihu gị.
Obi na-atọ m ụtọ ma m teta hụ na ị nọnyeere m.+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ohu Jehova bụ́ Devid bụkuru Jehova. Ọ bụrụ abụ a n’ụbọchị Jehova napụtara ya n’aka ndị iro ya niile nakwa n’aka Sọl. Ọ sịrị:+
18 Jehova, m hụrụ gị n’anya. Ị bụ ike m.+
2 Jehova bụ nkume m dị elu na ebe m a rụsiri ike na Onye na-anapụta m.+
Chineke m bụ oké nkume m.+ M na-agbaba n’ime ya.
Ọ bụ ọta m na mpi* nke na-azọpụta m.* Ọ bụ ebe m na-agbaba, aka aghara ịkpa m.+
3 M na-akpọku Jehova, onye e kwesịrị ịna-eto.
Ọ ga-anapụta m n’aka ndị iro m.+
4 Ọnwụ kere m ụdọ gburugburu.+
Ndị na-abaghị uru, bụ́ ndị yiri nnukwu idei mmiri, menyere m ụjọ.+
Ọnwụ siri ọnyà n’ihu m.+
6 N’oge m na-ata ahụhụ, m kpọrọ Jehova ka o nyere m aka,
M nọ na-ebesara Chineke m ákwá ka o nyere m aka.
7 Ụwa wee malite ịṅagharị na ịma jijiji.+
Ntọala ugwu dị iche iche mara jijiji,
Ṅagharịakwa n’ihi na a kpasuola Chineke iwe.+
Icheku ọkụ na-eke ọkụ n’ihu ya.
10 Ọ nọ n’elu cherob, fere efe bịa.+
Ọ nọ n’elu nku otu mmụọ ozi, fere ọsọ fedata.+
11 O jizi ọchịchịrị kpuchie onwe ya,+
Jirikwa mmiri rujuru n’ígwé
Kpuchie onwe ya otú ụlọikwuu si ekpuchi mmadụ.+
12 Akụ́ mmiri ígwé na icheku ọkụ
Si n’ìhè nke na-enwu n’ihu ya na-adapụtasị n’ígwé ojii.
13 Jehova wee nọrọ n’eluigwe malite ibigbọ.+
Onye Kacha Elu mere ka a nụ olu ya,+
Akụ́ mmiri ígwé na icheku ọkụ ana-adasịkwa.
14 Ọ gbapụrụ akụ́ ya wee chụsasịa ndị iro ya.+
O mekwara ka àmụ̀mà gbuo, ha agharazie ịma ihe ha ga-eme eme.+
16 O si n’elu matịa aka ya.
O jidere m aka dọpụta m na mmiri miri emi.+
19 Ọ kpọpụtara m kpọba m ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme m.*
Ọ napụtara m n’ihi na ihe m masịrị ya.+
20 Jehova na-akwụ m ụgwọ maka na m bụ onye ezi omume.+
Ọ na-akwụ m ụgwọ maka na aka m dị ọcha.+
21 M na-eme ihe dị Jehova mma,
Ahapụghịkwa m Chineke m, nke bụ́ ihe ọjọọ.
22 M na-echeta ihe niile o kpebiri,
Agaghị m eleda ntụziaka ya anya.
25 Ị naghị ahapụ onye jisiri gị aka ike.+
Ị na-egosi onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta na ị bụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.+
26 Ị na-egosi onye na-akwụwa aka ọtọ na ị na-akwụwa aka ọtọ,+
Ma ị ga-egosi onye dị aghụghọ na ị ma ihe.+
27 Ị na-azọpụta ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha.*+
Ma ị na-eweda ndị dị mpako ala.+
29 M ga-alụsoli ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ọgụ maka na ị na-enyere m aka.+
M ga-awụfeli mgbidi n’ihi ike Chineke na-enye m.+
30 Ihe ezi Chineke na-eme zuru okè.+
Chineke bụụrụ ndị niile na-agbaba n’ime ya ọta.+
31 N’ihi na ònye bụ Chineke ma e wepụ Jehova?+
Ònyekwa bụ oké nkume ma e wepụ Chineke anyị?+
33 Ọ na-eme ka ụkwụ m na-awụ ọsọ ka ụkwụ mgbada.
Ọ na-eme ka m guzoro n’ebe dị ezigbote elu.+
34 Ọ na-akụziri m* otú e si alụ agha.
Aka m na-ekweli ụta ọla kọpa.
35 Ị na-enye m ọta gị nke na-azọpụta m.+
Aka gị siri ike* na-akwado m.
Otú i si dị umeala n’obi na-eme ka m bụrụ nnukwu mmadụ.+
36 Ị na-eme ka ụzọ ụkwụ m na-aga saa mbara.
37 M ga-achụ ndị iro m ọsọ chụkwuru ha.
Agaghị m alaghachi azụ ruo mgbe m kpochapụrụ ha.
38 M ga-egweri ha ka ha ghara inwe ike ibili.+
Ha ga-ada, mụ azọkwasị ha ụkwụ.
39 Ị ga-enye m ike m ga-eji alụ agha.
Ị ga-eme ka ndị iro m daa n’ihu m.+
40 Ị ga-eme ka ndị iro m gbaghachi azụ n’ihi m.
M ga-ebibikwa ndị kpọrọ m asị.+
41 Ha na-ebe ákwá ka e nyere ha aka, ma e nweghị onye na-azọpụta ha.
Ha na-ebesadịrị Jehova ákwá, ma ọ naghị atụpụrụ ha ọnụ.
42 M ga-asụri ha ka ha dị ka uzuzu nke ifufe na-ebu.
M ga-awụpụ ha otú e si awụpụ apịtị n’okporo ámá.
43 Ị ga-anapụta m n’aka ndị na-akatọ m.+
Ị ga-eme m onyeisi mba dị iche iche.+
Ndị m na-amaghị ga-ejere m ozi.+
44 Naanị akụkọ ha nụrụ ga-eme ka ha rubere m isi.
Ndị mba ọzọ ga-abịa, jiri ụjọ na-akpọrọ m isiala.+
Ha ga-amara jijiji si n’ebe ha a rụsiri ike na-apụta.
46 Jehova dị ndụ. Ka e too Oké Nkume m.+
Ka a jaa Chineke m mma, bụ́ onye na-azọpụta m.+
47 Ezi Chineke na-abọrọ m ọbọ.+
Ọ na-eme ka ndị dị iche iche nọrọ n’okpuru m.
48 Ọ na-anapụta m n’aka ndị iro m iwe ji.
Chineke, ị na-ebugo m ebe aka ndị na-achọ imesi m ike na-agaghị eru.+
Ị na-anapụta m n’aka onye chọrọ imerụ m ahụ́.
49 Jehova, ọ bụ ya mere m ga-eji nọrọ ná mba dị iche iche too gị.+
M ga-abụkwa abụ iji too aha gị.+
50 Ị na-eme ihe ndị dị egwu iji zọpụta onye i mere eze.+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
19 Eluigwe na-akọsa ebube Chineke.+
Mbara igwe na-akọsa ọrụ aka ya.+
2 Kwa ụbọchị, okwu ha na-asọpụta ka mmiri,
Kwa abalị, ha na-egosi na ị ma ihe.
3 Ha anaghị ekwu okwu. E nweghị ihe ọ bụla ha na-ekwu.
A naghị anụ olu ha.
Chineke amaarala anyanwụ ụlọikwuu n’eluigwe.
5 O yiri nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ nke si n’ụlọ ya na-apụta.
Ọ na-aṅụrị ọṅụ ka dike nke ji ọṅụ na-agba ọsọ.
E nweghịkwa ebe okpomọkụ ya na-anaghị eru.
7 Iwu Jehova zuru okè.+ Ọ na-eme ka mmadụ nweghachi ume.*+
Ihe Jehova na-echetara ndị ya bụ ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi.+ Ọ na-eme ka onye na-amaghị ihe mara ihe.+
8 Ntụziaka Jehova ziri ezi. Ọ na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ.+
Ihe Jehova nyere n’iwu enweghị ntụpọ. Ọ na-eme ka anya na-enwu gbaa.+
9 Ịtụ egwu Jehova dị mma.+ Ọ na-adịru mgbe ebighị ebi.
Ihe Jehova kpebiri bụ eziokwu. Ha niile ziri ezi.+
10 Ha bara ezigbo uru karịa ọlaedo,
Ha dịkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ,+ mmanụ aṅụ nke si n’ụgbụgbọ ya na-agụpụtasị.
11 E jirila ha dọọ ohu gị aka ná ntị.+
Onye na-edebe ha na-enweta ụgwọ ọrụ buru ibu.+
12 Ònye ga-amatali na ya emejọọla ihe?+
Gbaghara m mmehie niile m na-amaghị na m mere.
13 Ekwela ka ohu gị dị mpako.+
Ekwela ka mpako na-achị m.+
Mgbe ahụ, m ga-abụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta,+
Agaghịkwa m eme mmehie dị oké njọ.
14 Biko, Jehova, Oké Nkume m+ na Onye Mgbapụta m,+
Ka ihe m na-ekwu na ihe m na-atụgharị n’uche bụrụ ihe dị gị mma.+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
20 Ka Jehova za gị n’ụbọchị ị na-ata ahụhụ.
Ka aha Chineke Jekọb chebe gị.+
3 Ka o cheta onyinye niile i nyere ya.
Ka o jiri obiọma nabata àjà i suuru ya ọkụ. (Sila)
5 Anyị ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi na ị na-azọpụta anyị.+
Anyị ga-ebuli ihe àmà anyị elu iji too aha Chineke anyị.+
Ka Jehova mezuo ihe niile ị na-arịọ ya.
6 Ugbu a, amarala m na Jehova na-azọpụta onye o tere mmanụ.+
7 Ụfọdụ na-atụkwasị ụgbọ ịnyịnya obi, ndị ọzọ na-atụkwasị ịnyịnya obi,+
Ma ọ bụ aha Jehova Chineke anyị ka anyị na-akpọ.+
Ọ ga-aza anyị n’ụbọchị anyị kpọrọ ya ka o nyere anyị aka.+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
21 Jehova, eze na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na ị na-egosi na ị dị ike.+
Ọ na-aṅụrị nnukwu ọṅụ maka na ị na-azọpụta ya.+
2 I meerela ya ihe obi ya chọrọ.+
Ị jụghị inye ya ihe ọ* rịọrọ. (Sila)
3 N’ihi na i ji ọtụtụ ihe ọma gọzie ya.
I kpuwere ya okpueze e ji ezigbo ọlaedo* rụọ.+
4 Ọ rịọrọ gị ka i mee ka ọ dị ogologo ndụ, i wee meere ya ihe ọ rịọrọ.+
I mere ka ọ dị ogologo ndụ, ka ọ dịrị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi.
5 Nzọpụta ị na-azọpụta ya na-eme ka ọ dị ebube.+
Ị na-achọ ya mma ma mee ka ọ bụrụ onye a na-akwanyere ùgwù.
6 Ị na-eme ka ọ bụrụ onye a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.+
Ị na-eme ka ọ na-aṅụrị ọṅụ maka na ị nọnyeere ya.+
7 N’ihi na eze tụkwasịrị Jehova obi.+
E nweghị ihe ga-eme ka ọ daa* n’ihi ịhụnanya nke Onye Kacha Elu.+
8 Aka gị ga-akpara ndị iro gị niile.
Aka gị siri ike* ga-ejide ndị kpọrọ gị asị.
9 Mgbe ị ga-elebara ha anya, ị ga-ala ha n’iyi otú nnukwu ọkụ si ala ihe a tụbara na ya n’iyi.
Jehova ga-eji iwe bibie ha,* ọkụ ga-erepịakwa ha.+
Ị ga-ewepụ ha n’ụwa. Ị ga-ala ụmụ ha n’iyi.
11 Ha bu n’obi ime gị ihe ọjọọ.+
Ha echepụtala ihe ha ga-eme gị, ma ọ ga-akụ afọ n’ala.+
13 Jehova, biko, bilie kpaa ike.
Anyị ga-abụku gị abụ otuto maka na ị dị ike.
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Nne Ele Isi Ụtụtụ”* kpọọ ya. Abụ Devid.
22 Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?+
Gịnị mere na ị bịaghị ka ị zọpụta m?
Gịnị mere na ị naghị anụ ákwá arịrị m na-ebe?+
2 Chineke m, m na-akpọ gị n’ehihie, ma ị naghị aza.+
M na-akpọkwa gị n’abalị, anaghị m emechi ọnụ.
Izrel ji abụ otuto gbaa gị gburugburu.
4 Ọ bụ gị ka nna anyị hà tụkwasịrị obi.+
Ha tụkwasịrị gị obi, ị nọkwa na-anapụta ha.+
5 Ọ bụ gị ka ha kpọrọ ka i nyere ha aka, e wee zọpụta ha.
Ha tụkwasịrị gị obi, i mechughịkwa ha ihu.*+
7 Ndị niile na-ahụ m na-eji m eme ihe ọchị.+
Ha na-akwa m emo, na-efufekwa isi, na-asị:+
8 “Ọ tụkwasịrị Jehova obi. Ya napụta ya.
Ya zọpụta ya, ebe ọ bụ na ọ hụrụ ya n’anya nke ukwuu.”+
10 Malite mgbe a mụrụ m, e nyefere m n’aka gị ka i lekọtawa m.
Ị bụ Chineke m malite mgbe m nọ n’afọ nne m.
11 Anọla m n’ebe dị anya n’ihi na nsogbu gbara m gburugburu,+
Enweghịkwa m onye ọzọ ga-enyere m aka.+
12 Ọtụtụ ndị iro gbara m gburugburu.+
Ha dị ka oké ehi siri ike ndị si Beshan.+
14 Ike agwụla m. Adịzi m ka mmiri a kwafuru akwafu.
Ọkpụkpụ m niile ekwokapụla.
Obi m dịzi ka mgbá aṅụ na-agbaze agbaze.*+
Obi na-awụnye m n’afọ.+
15 Ike adịkwaghị m. Adịzi m ka mpekere ite ụrọ kpọrọ nkụ.+
Ire m na-arapara n’ágbụ̀ m.+
Ị na-ewetu m n’ájá ka m nwụọ.+
16 Ndị iro gbara m gburugburu ka nkịta.+
Ha na-agba m gburugburu ka ìgwè ndị na-eme ihe ọjọọ.+
Ha na-ata m arụ n’aka nakwa n’ụkwụ ka ọdụm.+
17 A na-ahụzi ọkpụkpụ m niile anya.*+
Ndị iro m na-ele m anya. Ha kporopụrụ anya na-ele m.
19 Ma Jehova, biko, anọzila m n’ebe dị anya.+
Ọ bụ gị bụ ike m. Bịa ngwa ngwa nyere m aka.+
20 Zọpụta m* ka a ghara iji mma agha gbuo m.
Zọpụta ndụ m* ka nkịta ghara ịdọri m.+
21 Zọpụta m n’ọnụ ọdụm,+ zọpụtakwa m ka atụ́ ghara iji mpi ya sọgbuo m.
Za m ma zọpụta m.
22 M ga-akọsara ụmụnna m aha gị.+
M ga-eto gị n’ime ọgbakọ.+
23 Unu ndị na-atụ egwu Jehova, toonụ ya.
Unu niile bụ́ ụmụ* Jekọb, jaanụ ya mma.+
Tụọnụ egwu ya, unu niile bụ́ ụmụ* Izrel.
24 N’ihi na o legharaghị ahụhụ onye a na-emegbu emegbu na-ata anya.+
O zoroghị ya ihu ya.+
Mgbe o besaara ya ákwá ka o nyere ya aka, ọ nụrụ ya.+
25 M ga-anọ n’ọgbakọ buru ibu too gị.+
M ga-emezu nkwa m n’ihu ndị na-atụ egwu gị.
26 Ndị dị umeala n’obi ga-eri ihe rijuo afọ.+
Ndị na-achọ Jehova ga-eto ya.+
Na-enwenụ obi ụtọ* ruo mgbe ebighị ebi.
27 Ndị niile bi n’ebe niile n’ụwa ga-echeta Jehova ma laghachikwuru ya.
Ezinụlọ niile si ná mba dị iche iche ga-akpọ isiala n’ihu gị.+
28 N’ihi na ọ bụ Jehova bụ Eze.+
Ọ na-achị mba niile.
29 Ndị niile bara ọgaranya* n’ụwa ga-eri ihe ma kpọọ isiala.
Ndị niile na-alaghachi n’ájá ga-egbu ikpere n’ala n’ihu ya.
E nweghị onye n’ime ha ga-echebeli onwe ya.*
A ga-akọrọ ọgbọ na-abịa abịa banyere Jehova.
31 Ha ga-abịa kọọ banyere ezi omume ya.
Ha ga-akọrọ ndị a ka ga-amụ amụ ihe ndị o mere.
Abụ Devid.
23 Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ.+
E nweghị ihe ga-akọ m.+
2 Ọ na-eme ka m makpuru n’ebe ahịhịa ndụ juru.
Ọ na-eduga m n’ebe a na-ezu ike nke dị n’akụkụ mmiri.*+
Ọ na-edu m aga n’ụzọ ziri ezi n’ihi aha ya.+
4 Ọ bụrụgodị na mụ ejee ije na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị,+
Agaghị m atụ egwu na ihe ọ bụla ga-eme m,+
N’ihi na ị nọnyeere m.+
Mkpara gị na mkpanaka gị na-eme ka obi sie m ike.*
5 Ị na-edosara m nri na tebụl n’ihu ndị iro m.+
Iko m juru n’ọnụ.+
6 N’eziokwu, ị ga na-egosi m na ị dị mma nakwa na ị hụrụ m n’anya ná ndụ m niile,+
M ga-ebikwa n’ụlọ Jehova ná ndụ m niile.+
Abụ Devid.
24 Ọ bụ Jehova nwe ụwa na ihe niile dị n’ime ya.+
Ọ bụ ya nwe ala na ndị bi na ya.
3 Ònye nwere ike ịrịgo n’ugwu Jehova?+
Ònyekwa nwere ike iguzo n’ebe nsọ ya?
4 Ọ bụ onye ọ bụla aka ya dị ọcha, onye obi ya dịkwa ọcha,+
Onye na-anaghị eji m* aṅụ iyi ụgha,
Onye na-anaghịkwa aṅụ iyi ka ọ ghọgbuo ndị ọzọ.+
Chineke, onye na-azọpụta ya, ga-ewere ya ka onye ezi omume.*+
6 Ọ bụ ndị a bụ ìgwè* ndị na-achọ ya,
Ndị na-achọ ka gịnwa, bụ́ Chineke Jekọb, meere ha amara. (Sila)
7 Unu ọnụ ụzọ ámá, welienụ isi unu.+
8 Ònye bụ Eze a dị ebube?
9 Unu ọnụ ụzọ ámá, welienụ isi unu.+
Unu ọnụ ụzọ oge ochie, megheenụ
Ka Eze dị ebube wee bata!
10 Ònye ka Eze a dị ebube bụ?
Ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha. Ọ bụ ya bụ Eze ahụ dị ebube.+ (Sila)
Abụ Devid.
א [Alef]
25 Jehova, ọ bụ gị ka m lekwasịrị anya.
ב [Bet]
2 Chineke m, m tụkwasịrị gị obi.+
Ekwela ka ihere mee m.+
Ekwela ka ndị iro m ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.+
ג [Gimel]
3 N’eziokwu, e nweghị onye nwere olileanya n’ebe ị nọ ihere ga-eme.+
Ma ihere ga-eme ndị na-aghọ ndị ọzọ aghụghọ n’enweghị ihe kpatara ya.+
ד [Dalet]
4 Jehova, biko, mee ka m mara ụzọ gị.+
Kụziere m ụzọ gị.+
ה [Hee]
5 Mee ka m na-eje ije n’ezigbo ụzọ gị, kụziekwara m ihe,+
N’ihi na ị bụ Chineke m, onye na-azọpụta m.
ו [Wọọ]
Ọ bụ n’ebe ị nọ ka m nwere olileanya mgbe niile.
ז [Zayin]
ח [Het]
7 Biko, echetala mmehie ndị m mere mgbe m bụ okorobịa, echetakwala nnupụisi m.
ט [Tet]
8 Jehova dị mma, bụrụkwa onye ezi omume.+
Ọ bụ ya mere o ji akụziri ndị mmehie otú ha kwesịrị isi na-ebi ndụ.+
י [Yod]
9 Ọ ga-eduzi ndị dị umeala n’obi ka ha na-eme ihe dị mma,+
Ọ ga-akụzikwara ndị dị umeala n’obi ụzọ ya.+
כ [Kaf]
10 Ihe niile Jehova na-emere ndị na-eso ntụziaka ya+ ma na-eme ihe e kwuru n’ọgbụgba ndụ ha na ya+
Na-egosi na ọ hụrụ ha n’anya* nakwa na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.
ל [Lamed]
מ [Mem]
12 Olee onye na-atụ egwu Jehova?+
Ọ ga-akụziri onye ahụ ihe ka ọ mara ihe o kwesịrị ime.+
נ [Nun]
ס [Samek]
14 Ndị ha na Jehova bụ ezigbo enyi bụ ndị na-atụ egwu ya,+
Ọ na-emekwa ka ha mata gbasara ọgbụgba ndụ ya.+
ע [Ayin]
פ [Pee]
16 Chee ihu n’ebe m nọ ma meere m amara,
N’ihi na anọ m naanị m, e nweghịkwa onye na-enyere m aka.
צ [Sadee]
17 Ihe na-enye m nsogbu n’obi adịla ọtụtụ.+
Napụta m n’ahụhụ m na-ata.
ר [Resh]
19 Legodị otú ndị iro m si dị ọtụtụ
Nakwa otú ha si kpọọ m asị nke ukwuu.
ש [Shin]
Ekwela ka ihere mee m, n’ihi na m gbabala n’ime gị.
ת [Tọọ]
22 Chineke, biko, napụta Izrel n’ahụhụ niile ọ na-ata.
Abụ Devid.
26 Jehova, biko, kpee m ikpe, n’ihi na m na-erubere gị isi.+
Ọ bụ Jehova ka m tụkwasịrị obi. Enweghị m obi abụọ ọ bụla.+
2 Jehova, biko, nyochaa m, nwaleekwa m.
Nụchaa obi m na ihe m na-eche n’ala ala obi m.*+
4 Mụ na ndị aghụghọ anaghị akpa.*+
Mụ na ndị na-ezochi ụdị ndị ha bụ* anaghịkwa anọ.
6 M ga-akwọ aka m iji gosi na aka m dị ọcha.
Jehova, m ga-aga ebe ịchụàjà gị gburugburu,
7 Iji kelee gị n’olu dara ụda+
Ma kọsaa ọrụ niile dị ebube ị na-arụ.
9 Egbukọtala mụ* na ndị mmehie,+
Egbukọtakwala mụ na ndị tigbuo zọgbuo,*
10 Ndị na-eme omume na-eme ihere,
Ndị na-anara aka azụ.*
11 Ma, m ga na-erubere gị isi.
Napụta m ma meere m amara.
12 M guzo n’ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme m.*+
M ga-anọ n’ọgbakọ buru ibu too Jehova.+
Abụ Devid.
27 Jehova bụ ìhè m+ na onye na-azọpụta m.
Ònye ka m ga-atụ egwu?+
Jehova bụ idé ji ndụ m.+
Ònye ka m ga-atụ ụjọ?
2 Mgbe ndị ọjọọ lụsoro m ọgụ ka ha laa m n’iyi,+
Ọ bụ hanwa bụ́ ndị iro m na ndị na-emegide m zọhiere ụkwụ wee daa.
Ọ bụrụgodị na a lụso m agha,
Obi ka ga-esi m ike.
4 Otu ihe ka m rịọrọ Jehova.
Ọ bụ ihe m na-achọ.
Ka m biri n’ụlọ Jehova ná ndụ m niile,+
Ka m wee na-ahụ otú Jehova si dị mma,
Na-enwekwa obi ụtọ ka m na-ele ụlọ nsọ ya anya.+
5 N’ihi na ọ ga-ezo m n’ụlọ ya n’ụbọchị ọdachi ga-abịa.+
Ọ ga-ezo m n’ebe zoro ezo n’ụlọikwuu ya.+
Ọ ga-ekugo m n’elu nnukwu nkume.+
6 Ugbu a, emeriela m ndị iro m niile gbara m gburugburu.
M ga-etikwa mkpu ọṅụ mgbe m na-achụ àjà n’ụlọikwuu ya.
M ga-abụku Jehova abụ otuto.
7 Jehova, biko, nụrụ olu m mgbe m besaara gị ákwá.+
Meere m amara za m.+
8 Obi m echetarala m ihe i nyere n’iwu, sị:
“Chọọnụ m.”*
Jehova, ọ bụ gị ka m ga-achọ.+
Ejila iwe chụpụ ohu gị.
Ọ bụ gị bụ onye na-enyere m aka.+
Ahapụla m, agbakụtakwala m azụ, Chineke m, onye na-azọpụta m.
11 Jehova, biko, kụziere m ụzọ gị.+
Duo m n’ụzọ ziri ezi n’ihi ndị iro m.
12 Enyefela m n’aka ndị iro m,*+
N’ihi na ndị akaebe ụgha abịala ka ha bo m ebubo,+
Ha na-abakwa mba na ha ga-emesi m ike.
14 Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ.+
Nwee obi ike, ka obi siekwa gị ike.+
Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ.
Abụ Devid.
28 Jehova, Oké Nkume m, ọ bụ gị ka m na-akpọ mgbe niile.+
Ajụla ige m ntị.
2 Nụrụ arịrịọ m mgbe m na-ebesara gị ákwá ka i nyere m aka,
Mgbe m gbasara aka m chee ya n’Ebe Kacha Nsọ n’ụlọ nsọ gị.+
3 Akpụrụkọtala mụ na ndị ajọ omume nakwa ndị na-eme ihe ọjọọ,+
Ndị na-agwa mmadụ ibe ha okwu ọma, ma ya abụrụ na ha bu ihe ọjọọ n’obi.+
Kwụọ ha ụgwọ ọrụ ndị ha rụrụ,
Maka ihe dị iche iche ha merela.+
Ọ ga-akwada ha, ọ gaghịkwa ekulite ha.
6 Ka e too Jehova,
N’ihi na ọ nụla arịrịọ m na-arịọ ya ka o nyere m aka.
Ọ bụ ya ka m tụkwasịrị obi.+
O nyerela m aka. Obi na-atọzi m ụtọ.
N’ihi ya, m ga-eji abụ m na-abụ too ya.
8 Jehova bụụrụ ndị ya ike.
Ọ bụ ebe mgbaba. Ọ na-azọpụta onye o tere mmanụ.+
9 Zọpụta ndị gị, gọziekwa ndị i ketara.+
Zụọ ha otú e si azụ atụrụ, kurukwa ha n’aka gị ruo mgbe ebighị ebi.+
Abụ Devid.
2 Toonụ Jehova n’ihi na e kwesịrị ito aha ya.
Yirinụ ọmarịcha uwe dị nsọ kpọọrọ Jehova isiala.*
3 A na-anụ ụda olu Jehova n’elu ígwé ojii.*
Olu Chineke, onye dị ebube, na-ada ka égbè eluigwe.+
Olu Jehova dị ebube.
5 Olu Jehova na-agbaji osisi sida.
N’eziokwu, Jehova na-agbajisị osisi sida ndị dị na Lebanọn.+
7 Olu Jehova na-eme ka àmụ̀mà gbuo.+
8 Olu Jehova na-eme ka ala ịkpa maa jijiji.+
Jehova na-eme ka ala ịkpa Kedesh+ maa jijiji.
Ndị niile nọ n’ụlọ nsọ ya na-asị: “Toonụ Chineke!”
10 Jehova nọ n’ocheeze ya nke dị n’elu ọtụtụ mmiri.*+
Jehova nọ n’ocheeze ya. Ọ bụ Eze ruo mgbe ebighị ebi.+
11 Jehova ga-enye ndị ya ume.+
Jehova ga-agọzi ndị ya, mee ka ha nọrọ n’udo.+
Abụ ọma. Abụ Devid. Abụ e ji nyefee ụlọ ya.*
30 Jehova, m ga-eto gị, n’ihi na ị dọpụtala m.
I kweghị ka ndị iro m ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.+
2 Jehova Chineke m, m besaara gị ákwá ka i nyere m aka, i wee gwọọ m.+
3 Jehova, i sila n’ili* dọpụta m.*+
I dowere m ndụ. I mere ka m ghara imikpu n’olulu.*+
4 Unu ndị na-erubere Jehova isi,+ bụkuonụ ya abụ.
Mmadụ nwere ike ibe ákwá ná mgbede, ma e ruo n’ụtụtụ, ya etie mkpu ọṅụ.+
6 Mgbe obi ruru m ala, m sịrị:
“E nweghị ihe ga-eme ka m daa.”*
7 Jehova, mgbe ị na-emere m amara,* i mere ka m sie ike ka ugwu.+
Ma mgbe i zooro m ihu gị, ụjọ jidere m.+
8 Jehova, ọ bụ gị ka m nọ na-akpọku.+
Ọ bụkwa gị, Jehova, ka m nọ na-arịọ ka i meere m amara.
9 Ọ bụrụ na m nwụọ, olee uru ọ bara? Olee uru ọ ga-aba ma m gbadaa n’olulu?*+
Ájá ọ̀ ga-eto gị?+ Ọ̀ ga-ekwu na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi?+
10 Jehova, biko, gee ntị ma meere m amara.+
Jehova, biko nyere m aka.+
11 I meela ka m kwụsị iru uju gbawazie egwú.
I yipụla m ákwà iru uju m yi ma yiwe m ọṅụ ka uwe,
Jehova Chineke m, m ga-eto gị ruo mgbe ebighị ebi.
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
31 Jehova, agbabala m n’ime gị.+
Biko, ekwela ka ihere mee m.+
Napụta m n’ihi na ị bụ onye ezi omume.+
Bịa ọsọ ọsọ napụta m.+
Bụrụ ugwu m na-agbaba na ya,
Ebe a rụsiri ike m na-agbaba ka a zọpụta m.+
3 N’ihi na ị bụ nkume m dị elu na ebe m a rụsiri ike.+
N’ihi aha gị,+ ị ga na-edu m ma na-ezi m ụzọ m ga-eso.+
5 M na-enyefe mmụọ m n’aka gị.+
Ị napụtala m, Jehova Chineke, onye eziokwu.*+
6 M kpọrọ ndị na-efe arụsị efu na-abaghị uru asị.
Ma, ọ bụ Jehova ka m tụkwasịrị obi.
Ị ma na m na-atagbu onwe m n’ahụhụ.
9 Jehova, biko meere m amara n’ihi na m na-ahụsi anya.
Uju m na-eru emeela ka anya m gharazie ịna-ahụcha ụzọ,+ meekwa ka ike gwụchaa m.+
Ike na-agwụ m n’ihi mmehie ndị m mere.
Ọkpụkpụ m esighịzi ike.+
Ndị mụ na ha dị ná mma na-atụ m ụjọ.
Ha hụ m n’èzí, ha agbawa ọsọ.+
12 Obi* ha apụọla n’ebe m nọ. Ha echefuola m ka à ga-asị na mụ anwụọla.
Adị m ka arịa kụwara akụwa.
13 Anụla m ọtụtụ ihe ọjọọ ndị mmadụ na-ekwu.
Ụjọ zuru m ahụ́.+
14 Ma, Jehova, m tụkwasịrị gị obi.+
Ana m asị: “Ị bụ Chineke m.”+
15 Ndụ m dị gị n’aka.
Napụta m n’aka ndị iro m nakwa n’aka ndị na-akpagbu m.+
Zọpụta m n’ihi ịhụnanya gị.*
17 Jehova, biko, ekwela ka ihere mee m mgbe m na-akpọku gị.+
Ka ihere mee ndị ajọ omume.+
18 Ka ndị na-ekwu okwu ụgha daa ogbi,+
Ya bụ, ndị mpako na ịkpọ asị mere ka ha na-ekwutọ onye ezi omume.
19 Ihe ọma ị na-eme karịrị akarị.+
I doweere ya ndị na-atụ egwu gị,+
Ọ bụkwa n’ihu mmadụ niile ka ị na-emere ya ndị na-agbaba n’ime gị.+
Ị ga-ezo ha n’ụlọ gị
Ka ha ghara ịba n’aka ndị na-ekwu okwu ọjọọ.+
21 Ka e too Jehova,
N’ihi otú na-enweghị atụ o si gosi na ọ hụrụ m n’anya*+ mgbe m nọ n’obodo ndị agha nọchibidoro.+
22 Ma ụjọ tụrụ m, m wee sị:
“A ga-ebibi m ka m ghara ịnọkwa n’ihu gị.”+
Ma ị nụrụ arịrịọ m mgbe m besaara gị ákwá ka i nyere m aka.+
23 Unu ndị jisiri Jehova aka ike, hụnụ ya n’anya.+
Abụ Devid. Maskil.*
32 Onye Chineke gbaghaara ihe ọjọọ o mere, ya bụ, onye e kpuchiri* mmehie ya, na-enwe obi ụtọ.+
3 Mgbe m gbara nkịtị, ike gwụruru m n’ọkpụkpụ maka na m nọ na-asụ ude n’akwụsịghị akwụsị.+
4 N’ihi na ma n’ehihie ma n’abalị, iwe ị na-ewesa m* na-anyịgbu m ka à ga-asị na ọ bụ ibu dị arọ.+
Ume dị m n’ahụ́ gwụrụ ka ebe anwụ mịkọọrọ mmiri n’oge ọkọchị. (Sila)
5 M mechara kwupụtara gị mmehie m.
Ekpuchighị m njehie m.+
M sịrị: “M ga-ekwupụtara Jehova ihe ọjọọ ndị m mere.”+
Ị gbaghaara m mmehie m niile.+ (Sila)
6 Ọ bụ ya mere onye ọ bụla nke jisiri gị aka ike ga-eji rịọ gị arịrịọ n’ekpere+
Mgbe a ka nwere ike ịchọta gị.+
Mgbe ahụ, nsogbu ndị yiri idei mmiri agaghị eru n’ebe ọ nọ.
7 Ị bụụrụ m ebe nzuzo.
Ị ga-echebe m n’oge nsogbu.+
Ị ga-eme ka ndị ga-eti mkpu ọṅụ maka na ị napụtala m gbaa m gburugburu.+ (Sila)
8 “M ga-eme ka ị mara ihe, zikwa gị ụzọ i kwesịrị iso.+
M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adịkwa n’ebe ị nọ.+
9 Unu emela ka ịnyịnya ma ọ bụ jakị na-anaghị aghọta ihe,+
Nke ị ga-ejirịrị eriri ma ọ bụ ụdọ dọrọ
Tupu ya abịa gị nso.”
10 Onye ajọ omume na-atagbu onwe ya n’ahụhụ.
Ma ịhụnanya Jehova na-echebe onye tụkwasịrị ya obi.+
11 Unu ndị ezi omume, ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi Jehova, nweekwanụ obi ụtọ.
Tienụ mkpu ọṅụ, unu niile ndị obi ha dị ọcha.
33 Unu ndị ezi omume, tienụ mkpu ọṅụ n’ihi Jehova.+
Ọ dị mma ka ndị ezi omume na-eto ya.
2 Jirinụ ụbọ akwara na-ekele Jehova.
Jirinụ ụbọ nwere akwara iri bụkuo ya abụ otuto.
Kpọọnụ ụbọ akwara ka ndị bụ́ aka ochie, tiekwanụ mkpu ọṅụ.
5 Ezi omume na ikpe ziri ezi na-amasị ya.+
Ịhụnanya* Jehova juru ebe niile n’ụwa.+
7 Ọ na-eme ka mmiri ndị dị n’oké osimiri kwụrụ otu ebe ka mgbidi.+
Ọ na-eme ka mmiri na-ekwo ekwo kworo gaa n’ebe ha na-asọkọta.
8 Ka ndị niile bi n’ụwa tụọ egwu Jehova.+
Ka ndị niile bi n’ụwa sọpụrụ ya.
9 N’ihi na o kwuru ka ihe dị, ihe adị.+
O nyere iwu ka ihe mee, ihe o nyere n’iwu emee.+
10 Jehova aghasaala atụmatụ* mba dị iche iche.+
Ọ kụghasịala ihe ndị si n’ebe dị iche iche bu n’obi ime.+
11 Ma ihe niile Jehova kpebiri ime* agaghị agbanwe ruo mgbe ebighị ebi.+
Ihe ndị o bu n’obi ime na-adịgide malite n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.
13 Jehova na-esi n’eluigwe eledata anya.
Ọ na-ahụ mmadụ niile.+
14 Ọ na-esi n’ebe o bi
Ele ndị bi n’ụwa anya.
15 Ọ bụ ya na-akpụ obi mmadụ niile.
Ọ na-enyocha ihe niile ha na-eme.+
16 E nweghị eze a ga-azọpụta maka na o nwere ọtụtụ ndị agha.+
Nnukwu ike dike nwere agaghị azọpụta ya.+
17 Ịtụkwasị obi n’ịnyịnya agaghị eme ka a zọpụta mmadụ.*+
Ọ bụghị nnukwu ike ya ga-eme ka mmadụ gbalaga.
18 Anya Jehova dị n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ,+
Bụ́ ndị na-atụ anya ịhụnanya ya,*
19 Ka o wee napụta ha* n’aka ọnwụ
Ma dowe ha ndụ mgbe ụnwụ dara.+
20 Anyị* na-atụ anya ka Jehova nyere anyị aka.
Ọ bụ ọta anyị na onye na-enyere anyị aka.+
Abụ Devid dere gbasara oge o mere ka onye isi na-adịghị mma+ n’ihu Abimelek, ya achụpụ Devid, Devid alawa.
א [Alef]
34 M ga na-eto Jehova mgbe niile.
Agaghị m akwụsị iji ọnụ m na-eto ya.
ב [Bet]
Ndị dị umeala n’obi ga-anụ ya ma ṅụrịa ọṅụ.
ג [Gimel]
Ka anyị niile too aha ya.
ד [Dalet]
4 Ajụrụ m Jehova ase, ya aza m.+
Ọ napụtara m n’ihe niile na-emenye m ụjọ.+
ה [Hee]
5 Ndị nwere olileanya n’ebe ọ nọ na-enwe obi ụtọ.
A gaghị emechu ha ihu.
ז [Zayin]
6 Onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya kpọkuru Jehova, ya anụ ya.
Ọ zọpụtara ya n’ahụhụ niile ọ na-ata.+
ח [Het]
ט [Tet]
8 Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.+
Onye gbabara n’ime ya na-enwe obi ụtọ.
י [Yod]
כ [Kaf]
ל [Lamed]
11 Bịanụ, ụmụ m, geenụ m ntị.
M ga-akụziri unu ihe bụ́ ịtụ egwu Jehova.+
מ [Mem]
נ [Nun]
ס [Samek]
14 Ya hapụ ihe ọjọọ, mewe ezi ihe.+
Ya na-achọ udo ma gbalịa na-eme udo.+
ע [Ayin]
פ [Pee]
צ [Sadee]
17 Ha bere ákwá, Jehova wee nụ ya.+
Ọ napụtara ha n’ahụhụ niile ha na-ata.+
ק [Kof]
18 Jehova nọ ndị obi gbawara nso.+
Ọ na-azọpụta ndị ike ụwa gwụrụ.*+
ר [Resh]
ש [Shin]
20 Ọ na-echebe ọkpụkpụ ya niile.
E nweghị otu n’ime ha a gbajiri agbaji.+
ת [Tọọ]
21 Ọdachi ga-egbu onye ajọ omume.
A ga-ama ndị kpọrọ onye ezi omume asị ikpe.
22 Jehova na-agbapụta ndụ* ndị ohu ya.
E nweghị ndị gbabara n’ime ya a ga-ama ikpe.+
Abụ Devid.
35 Jehova, biko, kpechite ọnụ m n’ikpe mụ na ndị iro m.+
Lụso ndị na-alụso m ọgụ ọgụ.+
3 Bulie ube gị na anyụike e ji alụ agha* lụso ndị na-achụ m ọsọ ọgụ.+
Gwa m,* sị: “Ọ bụ m na-azọpụta gị.”+
4 Ka ihere mee ndị na-achọ igbu m,* ka e mechuokwa ha ihu.+
Ka ndị na-akpa nkata igbu m gbaghachi azụ n’ihere.
5 Ka ha dị ka mkpo ọka* ifufe na-eburu.
Ka mmụọ ozi Jehova chụsasịa ha.+
6 Mgbe mmụọ ozi Jehova na-achụ ha ọsọ,
Ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, na-amịkwa amị.
7 N’ihi na ha ejirila ụgbụ siere m ọnyà n’agbanyeghị na e nweghị ihe m mere ha.
Ha egwuorola m* olulu n’agbanyeghị na e nweghị ihe m mere ha.
8 Ka ọdachi dakwasị ha na mberede.
Ka ụgbụ ha ji sie ọnyà jide ha.
Ka ha daba na ya wee nwụọ.+
9 Ma m* ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi Jehova.
M ga-enwe obi ụtọ maka na ọ na-azọpụta m.
10 M ga-eji obi m niile sị:
“Jehova, ònye dị ka gị?
Ị na-anapụta ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka n’aka ndị ka ha ike,+
Ị na-anapụtakwa ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka na ndị ogbenye n’aka ndị na-anara ha ihe ha.”+
13 Ma mgbe ha na-arịa ọrịa, m yiiri ákwà iru uju.
M buru ọnụ wee taa onwe m ahụhụ.
Mgbe a na-azaghịkwa ekpere m,
14 M nọ na-agagharị na-eru uju ka à ga-asị na ha bụ ndị enyi m ma ọ bụ ụmụnne m.
M nọ na-eru uju ka onye nne ya nwụrụ.
15 Ma mgbe nsogbu bịaara m, ha ṅụrịrị ọṅụ ma gbakọọ.
Ha gbakọrọ zoo ka ha tie m ihe.
Ha dọriri m, ha emechighịkwa ọnụ.
16 Ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke na-akparị m ma na-achị m ọchị.*
Ha na-ata ikikere ezé n’ihi iwe ha na-ewesa m.+
17 Biko, Jehova, olee mgbe ị ga-akwụsị ịna-ele naanị n’anya?+
Napụta m* ka ha ghara igbu m.+
18 Mgbe ahụ, m ga-anọ n’ọgbakọ buru ibu kelee gị.+
M ga-anọ n’etiti ìgwè mmadụ too gị.
19 Ekwela ka ndị bụ́ ndị iro m n’enweghị ihe m mere ha ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.
Ekwela ka ndị kpọrọ m asị n’agbanyeghị na e nweghị ihe m mere ha+ rọọ m anya.+
20 N’ihi na ha anaghị ekwu okwu na-eme ka obi ruo mmadụ ala,
Kama ha na-eji aghụghọ akpara ndị na-achọ udo nkata ọjọọ.+
21 Ha na-emeghe ọnụ ha ka ha bo m ebubo.
Ha na-asị: “Ntọọ! Ntọọ! Anyị ahụla ya.”
22 Jehova, ị hụla ihe merenụ. Agbachizila nkịtị.+
Jehova, biko, anọla m n’ebe dị anya.+
23 Biko, gee ntị, bilie gbachitere m.
Jehova, Chineke m, kpechite ọnụ m.
24 Jehova Chineke m, biko, gosi na ị bụ onye ezi omume+ mgbe ị na-ekpe m ikpe.
Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.
25 Biko, ekwela ka ha gwa onwe ha, sị: “Ntọọ ya! Anyị enwetala ihe anyị chọrọ.”
Ekwela ka ha sị: “Anyị alaala ya n’iyi.”+
26 Ka ihere mee ndị niile na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ọdachi dakwasịrị m,
Ka e mechuokwa ha niile ihu.
Ka e menye ndị na-eche na ha ka m mma ezigbo ihere, ka a kpụọkwa ùgwù ha n’ala.
27 Ma, ka ndị obi dị ụtọ na m na-eme ezi omume tie mkpu ọṅụ.
Ka ha na-ekwu mgbe niile, sị:
“Ka e too Jehova, onye obi na-adị mma na ohu ya nọ n’udo.”+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid ohu Jehova.
36 Ọ bụ ihe ọjọọ na-achị obi onye ajọ omume.
Ọ naghị atụ egwu Chineke.+
3 Ihe ọ na-ekwu n’ọnụ ya na-agbawa obi, na-eduhiekwa mmadụ.
Ọ maghịzi otú e si eme ihe ọma.
4 Ọ na-anọdị n’elu àkwà* ya akpa nkata ọjọọ.
Ọ na-eso ụzọ na-adịghị mma.
Ọ naghị ajụ ihe ọjọọ.
5 Jehova, ịhụnanya gị* na-eru n’eluigwe.+
Ihe ọma ị na-eme na-eru n’ígwé ojii.
6 Ezi omume gị dị ka nnukwu ugwu.*+
Ihe ndị ị na-ekpebi karịrị akarị. Ha dị omimi ka ogbu mmiri.+
Jehova, ị na-echebe* mmadụ na anụmanụ.+
7 Chineke, ịhụnanya gị* enweghị atụ.+
Ọ bụ n’okpuru nku gị ka ndị mmadụ na-agbaba ka e chebe ha.+
8 Ha na-eri ihe ọma* ndị juru n’ụlọ gị, rijuo afọ.+
Ị na-emekwa ka ha rie ihe ọma ndị na-asọ ka mmiri.+
Ọ bụ ìhè gị na-enye anyị ìhè.+
11 Ekwela ka ndị dị mpako zọọ m ụkwụ,
Ekwekwala ka ndị ajọ omume kwapụ m.
12 Lee, ndị na-eme ihe ọjọọ adaala.
A kụtuola ha, ha enweghịkwa ike ibili.+
Abụ Devid.
א [Alef]
ב [Bet]
3 Tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọma.+
Biri n’ụwa,* na-emekwa ihe ga-eme ka a tụkwasị gị obi.+
ג [Gimel]
Tụkwasị ya obi. Ọ ga-enyere gị aka.+
6 Ọ ga-eme ka ezi omume ị na-eme na-enwu ka ìhè ụtụtụ,
Meekwa ka ihe ndị dị mma ị na-eme na-acha ka anwụ etiti ehihie.
ד [Dalet]
Ewerela onye na-akpa nkata ọjọọ iwe
Maka na nkata ọ na-akpa na-agaziri ya.+
ה [Hee]
Ewela iwe wee gaa mee ihe ọjọọ.*
9 N’ihi na a ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ.+
Ma ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enweta ụwa.+
ו [Wọọ]
10 N’oge na-adịghị anya, ndị ajọ omume agaghịzi anọ.+
Ị ga-ele anya n’ebe ha na-anọ,
Ma ha agaghị anọ ya.+
ז [Zayin]
12 Onye ajọ omume na-akpara onye ezi omume nkata ọjọọ.+
Ọ na-ata ikikere ezé maka na ọ na-ewesa onye ezi omume iwe.
ח [Het]
14 Ndị ajọ omume na-amịpụta mma agha ha, na-ekwekwa ụta ha
Ka ha gbatuo ndị a na-emegbu emegbu na ndị ogbenye
Nakwa ka ha gbuo ndị na-eme ihe ziri ezi.*
15 Ma mma agha ha ga-amaba ha n’obi.+
A ga-agbaji ụta ha.
ט [Tet]
י [Yod]
18 Jehova ma nsogbu niile na-abịara ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta,
Ihe ha ga-eketa ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi.+
19 Ihere agaghị eme ha n’oge ọdachi dakwasịrị ha.
Ha ga-enwe ọtụtụ ihe ha ga-eri n’oge ụnwụ.
כ [Kaf]
20 Ma a ga-ebibi ndị ajọ omume.+
Ndị iro Jehova ga-ala n’iyi otú ahịhịa ndị dị n’ebe mara mma anụmanụ na-ata ahịhịa si akpọnwụ.
Ha ga-apụ n’anya ka anwụrụ ọkụ.
ל [Lamed]
21 Onye ajọ omume na-agbaziri ihe, ma ọ naghị akwụghachi.
Ma onye ezi omume na-emesapụ aka,* na-emetekwara ndị mmadụ ebere.*+
מ [Mem]
24 Ọ bụ eziokwu na onye ahụ nwere ike ịda, ma ọ gaghị adaru ala,+
N’ihi na Jehova ji ya aka, na-akwado ya.+
נ [Nun]
25 E nwere mgbe m bụ nwata. Ma ugbu a, abụzi m agadi.
ס [Samek]
ע [Ayin]
Ọ ga na-echebe ha mgbe niile.+
Ma a ga-ebibi ụmụ ndị ajọ omume.+
פ [Pee]
31 Iwu Chineke ya dị n’obi ya.+
Ọ gaghị azọhie ụkwụ.+
צ [Sadee]
32 Onye ajọ omume na-ele onye ezi omume anya,
Na-achọ ka o gbuo ya.
33 Ma Jehova agaghị ahapụ onye ezi omume n’aka ya,+
Ọ gaghịkwa ekwu na ikpe mara onye ezi omume mgbe a na-ekpe ya ikpe.+
ק [Kof]
34 Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, na-esokwa ụzọ ya,
Ọ ga-emekwara gị amara, mee ka i nweta ụwa.
Mgbe a ga-ebibi ndị ajọ omume,+ ị ga-ahụ ya.+
ר [Resh]
35 Ahụla m onye ajọ omume nke obi fere azụ
Ka ihe na-agaziri ya, ya adị ka nnukwu osisi na-ama pokopoko n’ala a kụrụ ya.+
36 Ma, ọ nwụrụ na mberede. Ọ nọghịzi.+
Anọ m na-achọ ya, ma ahụghị m ya.+
ש [Shin]
37 Hụwa onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta ama,
Na-elekwa onye ezi omume anya,+
N’ihi na udo ga-adịrị ya n’ọdịnihu.+
38 Ma a ga-ebibi ndị niile na-emebi iwu.
Ndị ajọ omume enweghị ọdịnihu.+
ת [Tọọ]
39 Ọ bụ Jehova na-azọpụta ndị ezi omume.+
Ọ bụ ebe a rụsiri ike nke ha na-agbaba n’oge ahụhụ.+
40 Jehova ga-enyere ha aka ma napụta ha.+
Ọ ga-anapụta ha n’aka ndị ajọ omume ma zọpụta ha,
Maka na ha gbabara n’ime ya.+
Abụ Devid, nke e ji echeta ihe.
3 Ahụ́ niile na-egbu m mgbu n’ihi iwe gị.
Obi anaghị ezu m ike* n’ihi mmehie m.+
4 N’ihi na mmehie ndị m mere erikpuola isi m.+
Ha dị ka ibu na-anyị arọ. Agaghị m ebuli ha.
5 Ọnyá ndị dị m n’ahụ́ na-esi ísì, na-abasakwa abasa
N’ihi nzuzu m.
6 M na-echegbu onwe m, obi dakwara m mbà.
Iwe juru m obi malite n’ụtụtụ ruo n’abalị.
7 Ime ahụ́ na-ere m ọkụ.
Ahụ́ niile na-egbu m mgbu.+
8 Ahụ́ akụnwụọla m, ike ụwa agwụkwala m.
M na-asụsi ude ike n’ihi otú iwe si ju m obi.
9 Jehova, ị ma ihe niile m chọrọ,
Ị na-anụkwa ọsụ m na-ama.
11 Ndị enyi m na ndị mụ na ha na-akpa na-agbara m ọsọ n’ihi ọrịa m,
Ndị mụ na ha dị n’ezigbo mma anaghịkwa abịa m nso.
12 Ndị na-achọ igbu m* na-esiri m ọnyà.
Ndị na-achọ imerụ m ahụ́ na-akpa otú ha ga-esi laa m n’iyi.+
Ihe ha na-ekwu malite n’ụtụtụ ruo n’abalị bụ aghụghọ ha ga-aghọ.
13 Ma m na-eme ka onye ntị chiri. Anaghị m ege ihe ha na-ekwu.+
M na-eme ka onye ogbi. Anaghị m ekwu ihe ọ bụla.+
14 M dịzi ka onye na-anaghị anụ ihe,
Ka onye na-enweghị ihe ọ ga-ekwu iji zara ọnụ ya.
16 N’ihi na m sịrị: “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m,
Ekwekwala ka ha maliwe elu ma ụkwụ m mịchapụ.”
17 N’ihi na ọ fọrọ obere ka m daruo ala.
Ahụ́ na-egbu m mgbu mgbe niile.+
18 M kwupụtara ihe ọjọọ m mere.+
Mmehie m nọ na-ewute m.+
19 Ma ndị iro m siri ike,* bụrụkwa ndị dike.
Ndị kpọrọ m asị n’enweghị ihe m mere ha dịzi ọtụtụ.
20 Ha ji ihe ọjọọ kwụọ m ụgwọ ihe ọma.
Ha nọ na-enye m nsogbu maka na ha achọghị ka m na-eme ihe dị mma.
21 Jehova, biko, ahapụla m.
Chineke m, biko, anọla m n’ebe dị anya.+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. Nke Jedutọn.*+ Abụ Devid.
M ga-eji ihe kechie ọnụ m+
Mgbe ọ bụla onye ajọ omume nọ n’ebe m nọ.”
2 M gbara nkịtị n’ekwughị okwu.+
Ekwughịdị m ihe dị mma.
Ma, ahụ́ nọ na-egbusi m mgbu ike.
3 Obi nọ na-ere m ọkụ.
Ka m nọ na-atụgharị uche,* ọkụ ahụ ka nọ na-ere.
M kwuziri, sị:
4 “Jehova, biko, nyere m aka ka m mara ihe ga-emecha mee m,
Nakwa mgbe m ga-anọru ndụ,+
Ka m wee mara otú ndụ m dịruru mkpirikpi.
5 N’eziokwu, i meela ka ụbọchị ndụ m dị naanị ole na ole.*+
Oge m dịrịla ndụ enweghị ihe ọ bụ n’anya gị.+
Mmadụ ọ bụla bụ naanị ume e kupụrụ ekupụ, a sịgodị na o chere na e nweghị ihe nwere ike ime ya.+ (Sila)
6 N’eziokwu, mmadụ ọ bụla na-ejegharị ka onyinyo.
Ọ na-arụgbu onwe ya n’ọrụ* na nkịtị.
Ọ na-akpakọ akụ̀ n’amaghị onye ga-eri ya.+
7 Jehova, gịnịzi ka m ga-elewe anya ya?
Ọ bụ naanị gị bụ olileanya m nwere.
8 Napụta m ná mmehie m niile.+
Ekwela ka onye nzuzu jiri m mere ihe ọchị.
9 M gbara nkịtị.
10 Atazila m ahụhụ ị na-ata m.
Ike agwụla m n’ihi ihe ị na-eti m.
11 Ị na-ata mmadụ ahụhụ mmehie o mere iji dọọ ya aka ná ntị.+
Ị na-emebisị ihe ndị bara ezigbo uru o nwere otú egu* si emebisị ihe.
N’eziokwu, mmadụ ọ bụla bụ naanị ume e kupụrụ ekupụ.+ (Sila)
12 Jehova, biko, nụrụ ekpere m.
Ṅaa ntị n’ákwá m na-ebe ka i nyere m aka.+
Elegharala ákwá m na-ebe anya.
N’ihi na abụ m onye mbịarambịa n’ebe ị nọ.+
Abụ m onye njem na-agafe agafe, otú nna nna m hà niile bụ.+
13 Elezila m anya n’iwe, ka obi dịtụ m ụtọ
Tupu mụ anwụọ, nke m agaa.”
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
40 M tụsiri anya ike ka Jehova nyere m aka.
O wee gee m ntị* ma nụ ákwá m na-ebe ka o nyere m aka.+
2 Ọ dọpụtara m n’olulu nke mmiri dị na ya na-ekwo ekwo,
N’apịtị na-amị amị.
O mekwara ka m guzoro ná nnukwu nkume.
O mere ka ụkwụ sie m ike n’ala.
Ọtụtụ ndị ga-ahụ ihe Chineke mere, ya erie ha ọnụ,
Ha atụkwasịzie Jehova obi.
4 Onye tụkwasịrị Jehova obi na-enwe obi ụtọ,
Ya bụ, onye na-anaghị eso ndị isi ike ma ọ bụ ndị ụgha.
5 Jehova bụ́ Chineke m,
Ihe ndị i merela karịrị akarị,
Ya bụ, ọrụ ndị dị ebube ị na-arụ na ihe ndị ị na-echere anyị.+
E nweghị onye a ga-eji tụnyere gị.+
Ọ bụrụ na mụ asị ka m gbalịa kwuwe banyere ha,
Ha dị nnọọ ọtụtụ nke na enweghị m ike ikwucha ha.+
I kwughị ka a chụọrọ gị àjà a na-esu ọkụ na àjà mmehie.+
7 M wee sị: “Lee, abịala m.
E dere banyere m n’akwụkwọ mpịakọta.+
9 M na-anọ n’ọgbakọ buru ibu ezisa ozi ọma banyere ezi omume gị.+
Jehova, ị ma nke ọma
Na anaghị m emechi ọnụ m.+
10 Anaghị m ezochi ezi omume gị n’ime obi m.
M na-akọsa na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi nakwa na ị na-azọpụta ndị gị.
Anaghị m ezo ịhụnanya gị* na eziokwu gị ezo n’ọgbakọ buru ibu.”+
11 Jehova, ahapụla imere m ebere.
Biko, na-echebe m mgbe niile n’ihi ịhụnanya gị* nakwa n’ihi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
12 Ọdachi ndị na-abịara m karịrị akarị nke na enweghị m ike ịgụta ha ọnụ.+
Mmehie m dị nnọọ ọtụtụ nke na anaghị m ahụ ụzọ.+
Ha dị ọtụtụ karịa ntutu isi m,
Obi adaakwala m mbà.
Jehova, biko, bịa ngwa ngwa nyere m aka.+
Ka ndị obi na-atọ ụtọ na ọdachi dakwasịrị m
Gbaghachi azụ n’ihere.
15 Ka ihere megbuo
Ndị na-asị m: “Ntọọ! Ntọọ!”
Ka ndị obi na-atọ ụtọ na ị na-azọpụta ndị gị na-ekwu mgbe niile, sị:
“Ka e too Jehova.”+
17 Ma, m bụ ogbenye, e nweghịkwa onye na-enyere m aka.
Ka Jehova gee m ntị.
Ọ bụ gị na-enyere m aka, ọ bụkwa gị na-anapụta m.+
Chineke m, biko, egbula oge.+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
41 Onye na-emetere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere na-enwe obi ụtọ.+
Jehova ga-anapụta ya n’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ya.
2 Jehova ga-echebe ya ma dowe ya ndụ.
A ga-akpọ ya onye obi ụtọ n’ụwa.+
Ị gaghị ahapụ ya ka ndị iro ya mee ya ihe ha bu n’obi.+
3 Jehova ga-enyere ya aka mgbe o dina n’àkwà* ya na-arịa ọrịa.+
Ị ga-elekọta ya* n’oge ọ na-arịa ọrịa.
4 N’ihi na m kwuru, sị: “Jehova, biko, meere m amara.+
Gwọọ m,*+ n’ihi na emehiela m gị.”+
5 Ma ndị iro m na-ekwu ihe ọjọọ banyere m, sị:
“Olee mgbe ọ ga-anwụ, ka e wee chefuo aha ya?”
6 Ọ bụrụ na otu onye n’ime ha abịa ịhụ m, ọ* na-aghara m ụgha.
Ọ na-achọta ihe ọjọọ ọ ga-ekwu.
Ya pụzie, ya akọsawa ya.
7 Ndị niile kpọrọ m asị na-agbanyere ibe ha izu.
Ha na-akpa nkata ihe ọjọọ ha ga-eme m. Ha na-asị:
8 “Ihe ọjọọ abịarala ya.
Ugbu a o dinazi edina, ọ gaghị ebili ọzọ.”+
10 Ma, Jehova, biko, meere m amara ma kulite m,
Ka m wee kwụọ ha ụgwọ ihe ha mere.
11 Mgbe m ga-amara na ihe m na-eme dị gị mma
Bụ mgbe onye iro m na-enweghịzi ike ịṅụrị ọṅụ na ya emeriela m.+
12 Ma ị na-akwado m maka na m kwụsiri ike n’ebe ị nọ.+
Ị ga-eme ka m nọrọ n’ihu gị ruo mgbe ebighị ebi.+
Amen na Amen.
AKWỤKWỌ NKE ABỤỌ
(Abụ Ọma 42-72)
Maka onye na-eduzi abụ. Maskil* nke ụmụ Kora.+
2 Agụụ ife Chineke, bụ́ Chineke dị ndụ, na-agụsi m* ike otú mmiri si agụsi mmadụ ike.+
Olee mgbe m ga-abịa n’ihu Chineke?+
3 Anaghị m eri nri, naanị ákwá ka m na-ebe ehihie na abalị.
Malite n’ụtụtụ ruo n’abalị, ndị mmadụ na-akparị m, na-asị: “Olee ebe Chineke gị nọ?”+
4 M cheta ihe ndị a, ọ na-eme ka m gwa gị ihe niile dị m n’obi,
N’ihi na e nwere mgbe m na-eso ìgwè mmadụ aga.
M na-akwụ ha n’ihu, anyị ejiri nwayọọ nwayọọ na-aga n’ụlọ Chineke.
Anyị na-eti mkpu ọṅụ ka anyị na-aga, na-abụkwa abụ ekele
Ka ìgwè mmadụ ndị na-eme ememme.+
Gịnị mere na obi anaghị ezu m ike?
Ọ bụ ya mere m ji nọrọ+
N’ala Osimiri Jọdan nakwa n’elu elu ugwu Hemọn
Nakwa n’Ugwu Miza* na-echeta gị.
7 Oké osimiri na-akpọ oké osimiri òkù
Mgbe mmiri gị nke na-asọda asọda na-eme mkpọtụ.
Nsogbu ezuola m ahụ́ ka onye oké ebili mmiri gị niile rikpuru.+
8 N’ehihie, Jehova ga-egosi na ọ hụrụ m n’anya.
N’abalị, m ga-abụ abụ too ya, wee gwa Chineke nyere m ndụ okwu n’ekpere.+
9 M ga-ajụ Chineke, bụ́ nkume m dị elu, sị:
“Gịnị mere i ji chefuo m?+
Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị na-eru uju n’ihi otú ndị iro m si na-emegbu m?”+
10 Ndị iro m bu iwe na ọnụma n’obi na-akparị m.*
Ha na-akparị m mgbe niile, na-asị: “Olee ebe Chineke gị nọ?”+
Gịnị mere na obi anaghị ezu m ike?
43 Chineke, biko, kpee m ikpe.+
Kpechite ọnụ m n’ikpe+ mụ na mba na-anaghị erubere gị isi nwere.
Napụta m n’aka onye aghụghọ nke na-eme ajọ omume.
2 N’ihi na ị bụ Chineke m, bụrụkwa ebe m a rụsiri ike.+
Gịnị mere i ji jụ m?
Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị na-eru uju n’ihi otú ndị iro m si na-emegbu m?”+
Ka ha na-edu m.+
Ka ha duga m n’ugwu nsọ gị nakwa n’ụlọikwuu gị dị ebube.+
4 Mgbe ahụ, m ga-abịa n’ebe ịchụàjà Chineke,+
Bịakwute Chineke, onye na-eme ka m na-enwe nnukwu aṅụrị.
Chineke, bụ́ Chineke m, m ga-eji ụbọ akwara too gị.+
Gịnị mere na obi anaghị ezu m ike?
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ụmụ Kora.+ Maskil.*
44 Chineke, anyị ejirila ntị anyị nụ,
Nna nna anyị hà akọọrọla anyị+
Ihe ndị i mere n’oge ha,
N’oge dị anya gara aga.
I meriri mba dị iche iche, chụpụkwa ha.+
Nye iwu ka Jekọb merie.
5 Anyị ga-achụghachi ndị iro anyị n’ihi ike ị na-enye anyị.+
Anyị ga-eji aha gị merie ndị na-alụso anyị ọgụ.+
8 Anyị ga-eto Chineke mgbe niile,
Anyị ga-ajakwa aha gị mma ruo mgbe ebighị ebi. (Sila)
9 Ma ugbu a, ị jụla anyị ma mee ka ihere mee anyị,
Ị naghịkwa anọnyere ndị agha anyị ma ha gaa agha.
10 Ị na-eme ka anyị na-agbaghachi azụ ma anyị hụ ndị iro anyị.+
Ndị kpọrọ anyị asị na-anara anyị ihe ọ bụla ha chọrọ.
11 Ị na-enyefe anyị n’aka ha ka ha dọrie anyị otú e si adọri atụrụ.
Ị chụsaala anyị ná mba dị iche iche.+
12 Ị na-ere ndị gị ezigbo ọnụ ala.+
E nweghị uru ị na-erite n’ego ole ị na-ere ha.
13 I meela ka ndị agbata obi anyị na-akparị anyị,
Meekwa ka ndị niile gbara anyị gburugburu na-akwa anyị emo ma na-achị anyị ọchị.
14 I meela ka mba dị iche iche jiri anyị na-eme ihe ọchị,*+
Meekwa ka ndị dị iche iche na-efufe isi ma ha hụ anyị.
15 Ihere na-eme m mgbe niile.
Ihere onwe m emegbuola m,
16 N’ihi otú ha si na-akparị anyị ma na-akatọ anyị,
N’ihi onye iro anyị nke na-emegwara anyị ihe anyị mere.
18 Obi anyị apụbeghị n’ebe ị nọ.
Anyị ahapụghị ụzọ gị gawa ebe ọzọ.
19 Ma ị sụọla anyị akwụ n’ebe nkịta ọhịa na-ebi.
I jirila oké ọchịchịrị kpuchie anyị.
20 Ọ bụrụ na anyị echefuola aha Chineke anyị
Ma ọ bụ gbasaa aka anyị kpeere chi ọzọ,
21 Chineke ọ́ gaghị achọpụta?
Ọ ma ihe niile dị mmadụ n’obi.+
22 Ọ bụ n’ihi gị ka e ji na-egbu anyị mgbe niile.
E werela anyị ka atụrụ a ga-egbu egbu.+
23 Jehova, gịnị mere o ji dị ka ị̀ na-ehi ụra? Biko, bilie nyere anyị aka.+
Teta. Ajụla anyị ruo mgbe ebighị ebi.+
24 Gịnị mere na i nyereghị anyị aka?*
Gịnị mere i ji chefuo ahụhụ anyị na-ata na mmegbu a na-emegbu anyị?
25 A kwatuola anyị n’ala.
Anyị madoro afọ n’ala.+
Napụta anyị n’ihi ịhụnanya gị.*+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Okooko Lili” kpọọ ya. Abụ ụmụ Kora.+ Maskil.* Abụ ịhụnanya.
45 Ozi ọma emeela ka obi dị m ụtọ.
Ana m asị: “M na-abụ abụ gbasara eze.”+
Ka ọnụ* m dịrị ka mkpịsị odeakwụkwọ.*+
2 Ọ bụ gị kacha ụmụ nwoke niile maa mma.
Okwu dị mma na-esi n’ọnụ gị apụta.+
Ọ bụ ya mere Chineke ji gọzie gị ruo mgbe ebighị ebi.+
3 Gị dike,+ kee mma agha gị n’úkwù.+
Yiri ebube gị na ịma mma gị ka uwe.+
4 Gosi otú i si dị ebube, gaakwa meriwe.+
Gbaa ịnyịnya n’ihi eziokwu na ịdị umeala n’obi na ezi omume,+
Ị ga-ejikwa ike gị mee* ihe ndị dị egwu.
5 Akụ́ gị dị nkọ. Ọ na-eme ka ndị dị iche iche na-ada n’ihu gị.+
Ọ na-agbapu obi ndị iro eze.+
6 Ọ bụ Chineke nyere gị ikike ịchị* ruo mgbe niile ebighị ebi.+
Mkpanaka alaeze gị bụ mkpanaka ezi omume.*+
7 Ị hụrụ ezi omume n’anya,+ ị kpọkwara ajọ omume asị.+
Ọ bụ ya mere Chineke, bụ́ Chineke gị, ji tee gị mmanụ+ ma mee ka ị na-aṅụrị ọṅụ+ karịa ndị ibe gị.
8 E ji mea na alo na kashịa mee ka uwe gị niile na-esi ísì ọma.
Ụda ụbọ akwara a na-akpọ ná nnukwu obí eze e ji ọdụ́ chọọ mma na-eme ka ị ṅụrịa ọṅụ.
9 Ndị ada eze so n’ụmụ agbọghọ ndị ị kwanyeere ùgwù.
Nwunye eze akwụrụla n’aka nri gị, e jikwa ọlaedo kacha mma* chọọ ya mma.+
10 Ada, biko, gee ntị, tọọkwa ntị n’ala nụrụ.
Chefuo ndị gị na ụlọ nna gị.
Ndị kacha baa ọgaranya ga-achọ ka gị na ha dị ná mma.*
13 Ada eze bụ sọ mma n’obí eze.*
E ji ọlaedo chọọ uwe ya mma.
14 Ọ ga-eyi uwe a kpara nke ọma mgbe a ga-akpọrọ ya bịakwute eze.
A na-akpọbatara gị ụmụ agbọghọ ndị na-eso ya, bụ́ ndị na-amaghị nwoke.
15 A ga-eji obi ụtọ na ọṅụ kpọbata ha.
Ha ga-abata n’obí eze.
16 Ụmụ gị ndị nwoke ga-anọchi nna nna gị hà.
Ị ga-eme ha ndị isi n’ụwa niile.+
17 M ga-eme ka a mara aha gị n’ọgbọ niile na-abịa abịa.+
Ọ bụ ya mere ndị dị iche iche ga-eji na-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. Abụ ụmụ Kora.+ A ga-eji ụda Alamọt* kpọọ ya.
46 Chineke bụ ebe mgbaba anyị na ike anyị.+
Ọ dị njikere inyere anyị aka n’oge nsogbu.+
2 Ọ bụ ya mere na anyị agaghị atụ egwu, ọ bụrụgodị na ụwa agbanwee,
Ọ bụrụgodị na ugwu dị iche iche amaa jijiji daba n’ala oké osimiri,+
3 Ọ bụrụgodị na mmiri ya na-eme mkpọtụ, na-agbọkwa ụfụfụ,+
Ọ bụrụgodị na ugwu dị iche iche amaa jijiji maka na oké osimiri na-enugharị enugharị. (Sila)
4 E nwere osimiri nke iyi ndị si na ya asọpụta na-eme ka ndị bi n’obodo Chineke ṅụrịa ọṅụ.+
Ha na-eme ka ebe nsọ, ya bụ, nnukwu ụlọikwuu nke Onye Kacha Elu, ṅụrịa ọṅụ.
5 Chineke nọ n’obodo ahụ.+ A gaghị akwatuli ya.
Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ.+
6 Mba dị iche iche nọ na-agba ghara ghara. E meriri alaeze dị iche iche.
Ọ bara mba, ụwa wee maa jijiji.+
7 Jehova nke ụsụụ ndị agha nọnyeere anyị.+
Chineke Jekọb bụ ebe anyị na-agbaba, aka aghara ịkpa anyị. (Sila)
8 Bịanụ, hụ ọrụ dị iche iche Jehova na-arụ,
Otú o si mee ihe dị iche iche dị ịtụnanya n’ụwa.
9 Ọ na-eme ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa.+
Ọ na-agbaji ụta, na-agbajisịkwa ube.
Ọ na-agba ụgbọ e ji alụ agha* ọkụ.
10 “Chịlierenụ m aka elu. Maranụ na m bụ Chineke.
A ga-eto m ná mba niile.+
A ga-eto m n’ụwa.”+
11 Jehova nke ụsụụ ndị agha nọnyeere anyị.+
Chineke Jekọb bụ ebe anyị na-agbaba, aka aghara ịkpa anyị.+ (Sila)
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ụmụ Kora.+
47 Unu ndị niile, kụọnụ aka.
Toonụ Chineke, tiekwanụ mkpu ọṅụ.
2 N’ihi na Jehova, Onye Kacha Elu, dị egwu.+
Ọ bụ nnukwu Eze nke na-achị ụwa niile.+
3 Ọ na-eme ka ndị dị iche iche nọrọ n’okpuru anyị.
Ọ na-eme ka anyị merie mba dị iche iche.+
4 Ọ bụ ya na-ahọtara anyị ebe anyị ga-eketa,+
Bụ́ ebe Jekọb, onye ọ hụrụ n’anya, ji anya isi.+ (Sila)
5 Chineke agbagorola mgbe ndị mmadụ na-eti mkpu ọṅụ.
Jehova agbagorola mgbe a na-afụ opi.*
6 Bụkuonụ Chineke abụ otuto. Bụọnụ abụ otuto.
Bụkuonụ Eze anyị abụ otuto. Bụọnụ abụ otuto.
7 N’ihi na Chineke bụ Eze na-achị ụwa niile.+
Bụkuonụ ya abụ otuto. Gosinụ na unu ma ihe.
8 Chineke aghọọla Eze na-achị mba niile.+
Chineke nọ n’ocheeze ya dị nsọ.
9 Ndị isi nke ndị dị iche iche
Na ndị nke Chineke Ebreham ezukọtala.
N’ihi na ọ bụ Chineke nwe ndị na-achị achị n’ụwa.*
Ọ nọ n’ebe dị ezigbo elu.+
Abụ ọma. Abụ ụmụ Kora.+
48 Jehova bụ onye ukwu, onye ọ bụla kwesịkwara ịna-eto ya
N’obodo Chineke anyị, n’ugwu nsọ ya.
2 Ugwu Zayọn nke dị n’ime ime ebe ugwu,
Bụ́ obodo Eze Ukwu,+
Mara mma n’ebe dị ezigbo elu ọ dị, bụrụkwa obodo na-eme ka ụwa niile ṅụrịa ọṅụ.+
3 N’ụlọ elu ndị a rụsiri ike dị na ya,
Chineke emeela ka a mara na ya bụ ebe mmadụ na-agbaba, aka aghara ịkpa ya.+
4 Lee, ndị eze ezukọtala.
Ha niile enurula bịa.
5 Mgbe ha hụrụ ya, o juru ha anya.
Egwu tụrụ ha, ha wee gbalaga n’ihi ụjọ.
6 Ụjọ jidere ha n’ebe ahụ.
Ha hụsiri anya ka nwaanyị na-amụ nwa.
7 I ji ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ mee ka ụgbọ mmiri Tashish kpuo.
8 Anyị nọ n’obodo Jehova nke ụsụụ ndị agha, n’obodo Chineke anyị,
Hụ ihe ndị anyị nụrụ n’akụkọ.
Chineke ga-echebe obodo a ruo mgbe ebighị ebi.+ (Sila)
Ị na-eji ike* gị eme ihe ziri ezi.+
12 Gaanụ Zayọn gburugburu. Gazuonụ ya okirikiri.
Gụọnụ ụlọ elu ndị dị na ya ọnụ.+
13 Chebaranụ mgbidi ya ndị siri ike echiche.+
Leruonụ ụlọ elu ndị dị na ya a rụsiri ike anya,
Ka unu wee kọọrọ ya ọgbọ ndị na-abịa abịa.
14 N’ihi na Chineke a bụ Chineke anyị+ ruo mgbe niile ebighị ebi.
Ọ ga-edu anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.*+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ụmụ Kora.+
49 Unu ndị niile, nụrụnụ ihe a.
4 M ga-aṅa ntị ka m nụrụ ilu.
M ga-akọwa ilu m mgbe m na-akpọ ụbọ akwara.
5 Gịnị mere m ga-eji tụọ egwu n’oge nsogbu,+
Mgbe ndị chọrọ ịgba m mgba okpuru ji ihe ọjọọ ha na-eme gbaa m gburugburu?
6 Ndị tụkwasịrị obi n’ihe ha nwere,+
Ndị jikwa nnukwu akụnụba ha nwere anya isi,+
7 E nweghị onye ọ bụla n’ime ha nwere ike ịgbapụta nwanne ya
Ma ọ bụ nye Chineke ihe a ga-eji gbapụta ya.+
9 Ha enweghị ike ịgbapụta nwanne ha ka o wee dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma ghara ịbanye n’olulu.*+
10 Onye ọ bụla na-ahụ na ndị ma ihe na-anwụdị anwụ.
11 Ihe ha chọrọ bụ ka ụlọ ha dịruo mgbe ebighị ebi,
Ka ụlọikwuu ha dịrị n’ọgbọ niile.
Ha agụọla ala ha aha ha.
12 Ma n’agbanyeghị na a na-akwanyere mmadụ ùgwù, ọ gaghị adịrị ndụ gawa.+
Ọ kaghị anụmanụ na-anwụ anwụ mma.+
14 Ha dị ka atụrụ a ga-egbu egbu. Ha ga-aga n’ili.*
Ọnwụ ga-edu ha otú onye na-azụ atụrụ si edu atụrụ ya.
Ndị ezi omume ga-achị ha+ n’ụtụtụ.
Ha agaghịzi anọ.+
Ha ga-ebizi n’ili*+ kama ibi n’obí eze.+
15 Ma Chineke ga-anapụta m* n’ili.*+
Ọ ga-adọpụta m. (Sila)
16 Egwu atụla gị maka na mmadụ bara ọgaranya,
Maka na ọ na-akpatakwu akụ̀ n’ụlọ ya.
17 N’ihi na e nweghị otu mkpụrụ ihe ọ ga-ewere ma ọ nwụọ.+
Akụnụba ya agaghị eso ya banye n’ili.+
18 Ọ na-aja onwe ya* ike n’oge ọ nọ ndụ.+
(Ndị mmadụ na-eto mmadụ mgbe ihe na-agaziri ya.)+
19 Ma n’ikpeazụ, ọ na-anwụ otú nna nna ya hà nwụrụ.
Ha agaghịzi ahụ ìhè ọzọ.
20 Onye ọ bụla na-aghọtaghị ihe a, n’agbanyeghị na a na-akwanyere ya ùgwù,+
Akaghị anụmanụ na-anwụ anwụ mma.
Abụ Esaf.+
50 Chi kacha chi niile, bụ́ Jehova,+ ekwuola okwu.
Ọ na-enye iwu ka ndị niile bi n’ụwa gbakọta
Malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda anyanwụ.
2 Chineke si na Zayọn, bụ́ ebe mma ruru gwụ,+ na-enwu ka ìhè.
3 Chineke anyị ga-abịa. Ọ gaghịzi agbachi nkịtị.+
4 Ọ na-enye iwu ka ndị niile bi n’eluigwe na ndị niile bi n’ụwa gbakọta,+
Ka o wee kpee ndị ya ikpe.+ Ọ na-asị:
7 “Ndị m, geenụ ntị. M ga-ekwu okwu.
Izrel, m ga-agba akaebe na i mere ihe na-adịghị mma.+
Abụ m Chineke, bụ́ Chineke gị.+
8 Ọ bụghị àjà ndị ị na-achụ mere m ji abara gị mba,
Ọ bụghịkwa n’ihi àjà ị na-esucha ọkụ, bụ́ ndị ị na-edowe n’ihu m mgbe niile.+
11 M ma nnụnụ niile bi n’ugwu.+
Ọ bụ m nwe imirikitiimi anụmanụ bi n’ọhịa.
M ga-anapụta gị, ị ga-etokwa m.”+
16 Ma Chineke ga-agwa onye ajọ omume, sị:
19 Ị na-eji ọnụ gị akọsa ihe ọjọọ.
Ire gị bụ aghụghọ aghụghọ.+
20 Ị na-anọdụ ala na-ekwu okwu ọjọọ banyere nwanne gị.+
Ị na-akọsa ihe ọjọọ nwanne afọ gị mere.*
21 Mgbe i mere ihe ndị a, m gbachiri nkịtị.
I wee chee na m ga-adị ka gị.
Ma m ga-adọ gị aka ná ntị ugbu a.
M ga-ekwu ihe na-adịghị mma i mere.+
22 Biko, unu ndị na-echefu Chineke, chebaranụ ihe a echiche,+
Ka m wee ghara ịdọri unu n’enweghị onye ga-anapụta unu.
23 Ọ bụ onye na-ekele m na-eto m. Ekele ya bụ àjà ọ na-achụrụ m.+
Mụnwa bụ́ Chineke ga-azọpụtakwa
Onye na-eso ụzọ dị mma.”+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid bụrụ mgbe Netan onye amụma gwachara ya okwu maka iko ya na Bat-shiba kwara.+
51 Chineke, biko, meere m amara n’ihi ịhụnanya gị.*+
Hichapụ mmehie m n’ihi na ebere gị dị ukwuu.+
M meela ihe dị njọ n’anya gị.+
N’ihi ya, ị bụ onye ezi omume ma i kwuo okwu,
A gaghịkwa ata gị ụta mgbe ị na-ekpe ikpe.+
5 Lee, m bu mmehie pụta ụwa.
Abụ m onye mmehie malite mgbe nne m dị ime m.+
6 Ihe na-amasị gị bụ obi mmadụ ịdị ọcha.+
Kụziere m ihe, ka ihe m na-eche n’ime ime obi m gosi na m ma ihe.
7 Jiri ùkwù ahịhịa hisop sachapụ mmehie m ka m dị ọcha.+
Sachaa m, ka m dị ọcha karịa snoo.+
11 Achụpụla m n’ihu gị.
Anapụkwala m mmụọ nsọ gị.
12 Mee ka obi dịghachi m ụtọ otú ọ dị m mgbe ị zọpụtara m.+
Mee ka irubere gị isi na-agụ m agụụ.
16 N’ihi na ọ bụghị àjà ka ị chọrọ. Ọ bụrụ ya ka ị chọrọ, m gaara achụrụ gị ya.+
Ọ bụghị àjà a na-esucha ọkụ na-amasị gị.+
17 Àjà Chineke na-anabata bụ ihe mmadụ mere iwute ya n’obi.
Chineke, ị gaghị eleghara onye obi gbawara anya nakwa onye ihe o mere na-ewute.+
18 Meere Zayọn ihe ọma.
Rụghachi mgbidi Jeruselem.
19 Mgbe ahụ, àjà ndị ezi omume na-achụ ga-amasị gị,
Ma àjà dị iche iche a na-esu ọkụ ma àjà ndị a na-esucha ọkụ.
A ga-ejizi ọtụtụ oké ehi chụọ àjà n’ebe ịchụàjà gị.+
Maka onye na-eduzi abụ. Maskil.* Abụ Devid bụrụ mgbe Doeg onye Ịdọm bịara kọọrọ Sọl na Devid bịara n’ụlọ Ahimelek.+
52 Gị dike, gịnị mere i ji jiri ihe ọjọọ ndị ị na-eme na-etu ọnụ?+
Ịhụnanya Chineke na-adịru mgbe niile.+
3 Ihe ọjọọ na-amasị gị karịa ihe ọma.
Ịgha ụgha na-amasị gị karịa ikwu eziokwu. (Sila)
4 Gị onye ire ya bụ aghụghọ aghụghọ,
Ihe na-amasị gị bụ okwu ọ bụla na-agbawa ndị mmadụ obi.
5 Ọ bụ ya mere Chineke ga-eji dọturuo gị ala.+
Ọ ga-adọrọ gị ma dọpụta gị n’ụlọikwuu gị.+
Ọ ga-ekpochapụ gị n’ụwa.*+ (Sila)
6 Ndị ezi omume ga-ahụ ya, ya erie ha ọnụ,+
Ha ga-achịkwa ya ọchị, sị,+
7 “Lee nwoke na-ejighị Chineke mere ebe mgbaba ya,+
Kama ọ tụkwasịrị obi ná nnukwu akụnụba ya+
Nakwa na nkata ọjọọ ọ na-akpa.”*
8 Ma, m ga-ama pokopoko n’ụlọ Chineke otú osisi oliv si ama pokopoko.
Obi siri m ike na Chineke ga-ahụ m n’anya*+ ruo mgbe niile ebighị ebi.
9 M ga-eto gị ruo mgbe ebighị ebi maka na i meela ihe.+
M ga-anọ n’ihu ndị na-erubere gị isi
Gosi na m tụkwasịrị obi n’aha gị+ maka na ọ dị mma.
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda Mehalat* kpọọ ya. Maskil.* Abụ Devid.
53 Ndị nzuzu* na-asị n’obi ha:
“Jehova adịghị.”+
Ihe ọjọọ ha na-eme rụrụ arụ, na-asọkwa oyi.
E nweghị onye na-eme ihe dị mma.+
2 Ma Chineke si n’eluigwe na-ele ndị mmadụ anya+
Ka ọ hụ ma è nwere onye na-aghọta ihe, ma è nwere onye na-achọ Jehova.+
3 Ha niile akwụsịla ime ihe dị mma.
Ha niile rụrụ arụ.
E nweghị onye na-eme ihe dị mma,
E nweghịdị otu onye.+
4 Ọ̀ bụ na e nweghị onye na-aghọta ihe n’ime ndị na-eme ihe ọjọọ?
Ha na-eri ndị m ka à ga-asị na ha na-eri nri.*
Ha anaghị efe Jehova.+
5 Ma oké ụjọ ga-ejide ha,
Ụdị ụjọ na-atụtụbeghị ha,*
N’ihi na Chineke ga-atụsasị ọkpụkpụ ndị na-alụso gị ọgụ.
Ị ga-emenye ha ihere, n’ihi na Jehova ajụla ha.
6 Ọ dị m ka ya bụrụ na a ga-esi na Zayọn zọpụta ndị Izrel.+
Ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka ndị Izrel nweekwa obi ụtọ
Mgbe Jehova ga-akpọlata ndị ya a dọọrọ n’agha.
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya. Maskil.* Abụ Devid bụrụ mgbe ndị Zif bịara gwa Sọl, sị: “Devid zoro n’obodo anyị.”+
2 Chineke, biko, nụrụ ekpere m.+
Gee ntị n’ihe m na-ekwu.
E nweghị ihe ha ji Chineke kpọrọ.*+ (Sila)
4 Ma Chineke bụ onye na-enyere m aka.+
Jehova nọnyeere ndị na-akwado m.*
5 Ọ ga-eji ihe ọjọọ ndị iro m na-eme kwụọ ha ụgwọ.+
Chineke m, bibie ha n’ihi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
6 M ga-eji obi m niile chụọrọ gị àjà.+
Jehova, m ga-eto aha gị n’ihi na ọ dị mma.+
7 N’ihi na ị na-anapụta m ná nsogbu niile.+
M ga na-ele ndị iro m anya na-achị ha ọchị mgbe a na-emeri ha.+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya. Maskil.* Abụ Devid.
55 Chineke, biko, ṅaa ntị n’ekpere m.+
Elegharala arịrịọ m na-arịọ ka i meere m ebere anya.*+
Ihe m na-eche na-eme ka obi ghara izu m ike.+
Isi na-agba m ghara ghara
3 N’ihi ihe onye iro m na-ekwu
Nakwa n’ihi nsogbu onye ajọ omume na-enye m.
N’ihi na ha na-ekonye m nsogbu n’isi,
Ha bukwaara m iwe n’obi.+
5 Ezigbo egwu ejidela m,
M na-amakwa jijiji.
6 M nọ na-asị: “A sị nnọọ na m nwere nku ka nduru,
M gaara efepụ gaa biri n’ebe obi ga-eru m ala.
7 M gaara efega n’ebe dị anya.+
M gaara aga biri n’ala ịkpa.+ (Sila)
8 M gaara agbaba n’ebe m ga-anọ
Zere nsogbu ndị yiri oké ifufe nke na-efesi ike.”
9 Jehova, biko, megharịa ha anya, kụghasịakwa atụmatụ ha,*+
N’ihi na ahụla m na ihe juru n’obodo a bụ tigbuo zọgbuo na esemokwu.
10 Ha na-aga elu mgbidi obodo a gburugburu n’ehihie nakwa n’abalị.
Ihe ọjọọ na nsogbu juru n’obodo a.+
11 Ihe ọjọọ na-eme n’ebe niile n’obodo a.
E nweghị mgbe a na-anaghị emegbu ndị mmadụ ma na-aghọ ha aghụghọ n’ámá ya.+
12 Ọ bụghị onye iro na-akparị m.+
A sị na ọ bụ ya, m gaara edi ya.
Ọ bụghị onye iro na-emegide m.
A sị na ọ bụ ya, m gaara ezo ka ọ ghara ịhụ m.
14 Mụ na gị bụbu ezigbo enyi.
Anyị na ìgwè mmadụ na-esobu abanye n’ụlọ Chineke.
Ka ha banye n’ili* ná ndụ.
N’ihi na ihe ọjọọ juru n’ebe ha bi, jukwa ha n’obi.
18 Ọ ga-anapụta m,* meekwa ka ndị na-emegide m kwụsị ịlụso m ọgụ,
N’ihi na ọtụtụ ìgwè mmadụ na-alụso m ọgụ.+
Ndị na-anaghị atụ egwu Chineke+
Agaghị ekwe agbanwe.
20 Ọ* lụsola ndị ya na ha dị ná mma ọgụ.+
Okwu ya dị nro karịa mmanụ,
Ma ha yiri mma agha a mịpụtara amịpụta.+
22 Bunye Jehova ibu na-anyịgbu gị.+
Ọ ga-enyere gị aka.+
E nweghị mgbe ọ ga-ahapụ onye ezi omume ka ọ daa.*+
23 Ma Chineke, ị ga-eme ka ndị ahụ ikpe ọbara mara na ndị na-aghọ aghụghọ banye n’ili.+
Ha agaghị anọru ọkara ndụ ha.+
Ma m ga-atụkwasị gị obi.
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Nduru Na-anaghị Ekwu Okwu nke Nọ n’Ebe Dị Anya” kpọọ ya. Abụ Devid. Miktam.* Mgbe ndị Filistia jidere ya n’obodo Gat.+
56 Chineke, biko, meere m amara n’ihi na mmadụ efu na-emegide m.
Ha na-alụso m ọgụ ma na-emegbu m kwa ụbọchị.
2 Ndị iro m na-emegide m ụbọchị niile.
Ọtụtụ ndị na-alụso m ọgụ maka na ha dị mpako.
3 Ụjọ tụwa m,+ m na-atụkwasị gị obi.+
4 Ọ bụ Chineke, onye m na-eto n’ihi ihe o kwuru, ka m tụkwasịrị obi.
M tụkwasịrị Chineke obi; egwu anaghị atụ m.
Gịnị ka mmadụ nkịtị* ga-eme m?+
5 Kwa ụbọchị, ha na-emebiri m ihe.
Naanị ihe ha na-eche n’echiche bụ ime m ihe ọjọọ.+
6 Ha na-aga zoo ka ha kpara m aka.
7 Jụ ha n’ihi ihe ọjọọ ha na-eme.
Chineke, jiri iwe kwatuo mba dị iche iche.+
8 Ị ma otú m si na-awagharị ebe niile.+
Biko, gbanye anya mmiri m n’ime karama akpụkpọ gị.+
Ọ̀ bụ na i deghị ha n’akwụkwọ gị?+
9 Ndị iro m ga-agbaghachi azụ n’ụbọchị m ga-akpọ gị ka i nyere m aka.+
Obi siri m ike na Chineke nọnyeere m.+
10 Ọ bụ Chineke, onye m na-eto n’ihi ihe o kwuru, ka m tụkwasịrị obi.
Ọ bụ Jehova, onye m na-eto n’ihi ihe o kwuru, ka m tụkwasịrị obi.
11 M tụkwasịrị Chineke obi; egwu anaghị atụ m.+
Gịnị ka mmadụ nkịtị ga-eme m?+
12 Chineke, m ga-emezurịrị nkwa m kwere gị.+
M ga-ekele gị.+
13 N’ihi na ị napụtara m* n’aka ọnwụ,+
I kweghịkwa ka m kpọbie ụkwụ,+
Ka m wee dịrị ndụ na-ejegharị n’ihu Chineke.+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Alala M n’Iyi” kpọọ ya. Abụ Devid. Miktam.* Ọ bụrụ abụ a mgbe ọ gbagara n’ọgba n’ihi Sọl.+
57 Chineke, meere m amara. Biko, meere m amara,
N’ihi na m gbabala* n’ime gị,+
M ga-ezokwa n’okpuru nku gị ruo mgbe nsogbu gafere.+
2 Ana m akpọku Chineke Onye Kacha Elu,
Ezi Chineke, onye na-eme ka nsogbu m kwụsị.
3 Ọ ga-esi n’eluigwe nyere m aka ma zọpụta m.+
Ọ ga-emegharị onye na-alụso m ọgụ anya. (Sila)
Chineke ga-esi otú ahụ nyere m aka n’ihi na ọ hụrụ m n’anya nakwa n’ihi na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
4 Ndị yiri ọdụm gbara m* gburugburu.+
Ọ bụ n’etiti ndị chọrọ ịdọri m ka m na-edina,
Ndị ezé ha dị ka ube na akụ́,
Ndị ire ha dịkwa ka mma agha dị nkọ.+
5 Chineke, ka a jaa gị mma n’eluigwe.
Ka e too gị n’ụwa niile.+
6 Ha ejirila ụgbụ siere ụkwụ m ọnyà.+
Ha egwuola olulu n’ebe m si aga,
Ma ọ bụ ha dabara n’ime ya.+ (Sila)
Obi siri m ike.
M ga-akpọrọ gị egwú, bụọkwara gị abụ otuto.
Ụbọ akwara, teta. Tetakwa, gị une.
M ga-ebili n’isi ụtụtụ.+
9 Jehova, m ga-anọ n’ihu ndị obodo dị iche iche too gị.+
M ga-abụku gị abụ otuto ná mba dị iche iche.+
10 N’ihi na ịhụnanya gị* dị ukwuu nke na ọ na-eru n’eluigwe,+
Ị bụkwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe niile.*
11 Chineke, ka a jaa gị mma n’eluigwe.
Ka e too gị n’ụwa niile.+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Alala M n’Iyi” kpọọ ya. Abụ Devid. Miktam.*
58 Unu ndị mmadụ, ùnu ga-ekwuli banyere ezi omume mgbe unu gbachiri nkịtị?+
Ùnu ga-ekpeli ikpe ziri ezi?+
2 Kama ime otú ahụ, unu na-echepụta ihe ọjọọ n’obi unu,+
Jirikwa aka unu na-eme ihe na-adịghị mma n’ala unu.+
3 Ndị ajọ omume na-amalite mgbe a mụrụ ha* mewe ihe ọjọọ.*
Ha na-enupụ isi. Ha bụ ndị ụgha malite mgbe a mụrụ ha.
Ha na-akpọchi ntị ka agwọ ubí nke mechiri ntị ya.
5 Ọ gaghị ege ndị chọrọ ịrata ya ntị
N’agbanyeghị otú ọgwụ ha si akpa ike.
6 Chineke, biko, kụpụsịa ha ezé n’ọnụ.
Jehova, biko, kụwaa ndị a yiri ọdụm agba.
7 Ka ha pụọ n’anya ka mmiri na-asọpụ asọpụ.
Ka Chineke kwee ụta ya ma jiri akụ́ ya gbatuo ha.
8 Ka ha dị ka eju nke na-achọ ịnwụ anwụ.*
Ka ha dị ka nwa nwụrụ n’ime afọ nke na-ahụghị ìhè anyanwụ.
9 Tupu ite unu sikwasịrị n’ọkụ unu ji osisi ogwu kwanye anụrụ ọkụ,
Chineke ga-ebufu ma osisi ogwu ndị nke na-akpọbeghị nkụ ma ndị nke na-enwu ọkụ, otú oké ifufe si ebufu ihe.+
10 Onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ maka na ọ hụla ọbọ Chineke bọrọ.+
Ọ ga-azọnye ụkwụ n’ọbara ndị ajọ omume.+
11 Ndị mmadụ ga-asịzi: “N’eziokwu, onye ezi omume ga-enweta ụgwọ ọrụ.+
N’eziokwu, e nwere Chineke bụ́ onye na-ekpe ụwa ikpe.”+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Alala M n’Iyi” kpọọ ya. Abụ Devid. Miktam.* Ọ bụrụ abụ a mgbe Sọl dunyere ndị mmadụ ka ha gaa na-eche ụlọ Devid* nche, ka ha gbuo ya.+
59 Chineke m, biko, napụta m n’aka ndị iro m.+
Chebe m ka ndị na-abịa ịlụso m ọgụ ghara inweta m.+
2 Napụta m n’aka ndị na-eme ihe ọjọọ,
Zọpụtakwa m n’aka ndị tigbuo zọgbuo.
Jehova, ndị dị ike na-alụso m ọgụ,
Ma ọ bụghị maka na m nupụrụ isi ma ọ bụ maka na m mehiere.+
4 N’agbanyeghị na e nweghị ihe ọjọọ m mere, ha na-eji ọsọ aga ejikere ịlụso m ọgụ.
Biko, za òkù m na-akpọ gị ma hụrụ ihe ha na-eme.
5 N’ihi na ọ bụ gị, Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ Chineke Izrel.+
Bilie lebara mba niile anya.
Emerela ndị ọjọọ ọ bụla na-agba mmadụ mgba okpuru ebere.+ (Sila)
6 Ha na-abịaghachi ná mgbede ọ bụla.+
Ha na-agbọ ụja ka nkịta,+ zorokwa ezoro na-agagharị n’obodo.+
7 Okwu ọjọọ na-adapụsị ha n’ọnụ.
8 Ma Jehova, ị ga-achị ha ọchị.+
Ị ga-akwa mba niile emo.+
10 Chineke, onye hụrụ m n’anya, ga-agbatara m ọsọ enyemaka.+
Chineke ga-eme ka m na-ele ndị iro m anya na-achị ha ọchị mgbe a na-emeri ha.+
11 Egbula ha ozugbo, ka ndị m ghara ichefu.
Jiri ike gị mee ka ha kpagharịwa.
Jehova, ọta anyị, biko, mee ka ha daa.+
12 Ka mpako ha tinye ha ná nsogbu+
N’ihi ihe ọjọọ si ha n’ọnụ apụta, bụ́ okwu niile ha na-ekwu
Nakwa n’ihi ọnụ ha na-abụ ndị mmadụ na aghụghọ ha na-aghọ.
Laa ha n’iyi, ka ha gharazie ịnọ.
Mee ka ha mara na ọ bụ Chineke na-achị Jekọb, na-achịkwa ebe niile n’ụwa.+ (Sila)
14 Ka ha bịaghachi ná mgbede.
Ka ha gbọwa ụja ka nkịta ma zoro ezoro na-agagharị n’obodo.+
15 Ka ha gagharịwa na-achọ ihe ha ga-eri.+
Ekwela ka afọ ju ha ma ọ bụ ka ha hụ ebe ha ga-ehi ụra.
16 Ma m ga-abụ abụ gbasara otú i si dị ike.+
N’ụtụtụ, m ga-eji obi ụtọ kọọ gbasara ịhụnanya gị.
17 Chineke m, ị bụ ike m. M ga-abụku gị abụ otuto,+
N’ihi na ị bụ ebe m na-agbaba, aka aghara ịkpa m, Chineke onye hụrụ m n’anya.+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Okooko Lili E Ji Echeta Ihe” kpọọ ya. Miktam.* Abụ Devid. A ga-eji ya na-akụzi ihe. Ọ bụrụ abụ a mgbe ya na ndị Eram-nehareyim na ndị Eram-Zoba lụrụ ọgụ, Joab wee laghachi gbuo ndị Ịdọm dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000) na Ndagwurugwu Nnu.+
60 Chineke, ị jụrụ anyị. Ị chụsasịrị anyị.+
I wesara anyị iwe. Ma ugbu a, nabataghachi anyị.
2 I mere ka ala maa jijiji. I mere ka ọ gbawaa.
Mechie oghere ya niile, n’ihi na ọ na-adakpu n’ime.
3 I mere ka ndị gị taa ahụhụ.
I mere ka anyị ṅụọ mmanya nke mere ka anyị na-adagharị.+
6 Chineke, Onye dị nsọ, ekwuola,* sị:
“M ga-aṅụrị ọṅụ. M ga-ewere Shikem nye ndị m chọrọ ka ọ bụrụ ihe ha ketara.+
M ga-atụkwa Ndagwurugwu Sọkọt atụ̀ nye ndị m chọrọ.+
7 Ọ bụ m nwe Gilied, ọ bụkwa m nwe Manase.+
Ifrem bụ okpu m na-ekpu n’isi.
Juda bụ mkpara na-egosi ikike m nwere.+
8 Moab bụ efere m ji asa ihe.+
M ga-atụba akpụkpọ ụkwụ m n’Ịdọm.+
M ga-eti mkpu ọṅụ maka na m ga-emeri Filistia.”+
9 Ònye ga-eduru m gaa n’obodo a nọchibidoro anọchibido?*
Ònye ga-edu m ruo Ịdọm?+
10 Chineke, ọ́ bụghị gị, onye jụrụ anyị,
Chineke anyị, onye na-anaghịzi anọnyere ndị agha anyị ma ha gaa agha?+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya. Abụ Devid.
61 Chineke, biko, nụrụ ákwá m na-ebe ka i nyere m aka.
Gee ntị n’ekpere m.+
Duru m gaa n’elu nkume dị elu karịa m.+
3 N’ihi na ị bụụrụ m ebe mgbaba,
Bụrụkwa ụlọ elu siri ike nke na-echebe m ka onye iro ghara ịkpara m aka.+
4 M ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị ruo mgbe ebighị ebi.+
M ga-agbaba n’okpuru nku gị.+ (Sila)
5 Chineke, ị nụla nkwa m kwere.
I kenyela m ihe ị na-ekenye ndị na-atụ egwu aha gị.+
7 Ọ ga-anọ n’ocheeze* n’ihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi.+
Chebe ya n’ihi ịhụnanya gị* nakwa n’ihi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. Nke Jedutọn.* Abụ Devid.
62 N’eziokwu, m* nwere ndidi, na-echere Chineke.
Ọ bụ ya na-azọpụta m.+
2 N’eziokwu, ọ bụ ya bụ oké nkume m na onye na-azọpụta m, ebe m na-agbaba, aka aghara ịkpa m.+
E nweghị ihe ga-eme ka m daa.*+
3 Olee mgbe unu ga-akwụsị iti mmadụ ihe ka unu tigbuo ya?+
E kwesịrị ize unu niile eze maka na unu dị ka mgbidi e ji nkume rụọ nke chọrọ ịda ada.
4 N’ihi na ha na-agba izu ka ha si ná nnukwu ọkwá mmadụ nọ kwatuo ya.
Ịgha ụgha na-atọ ha ụtọ.
Ha na-eji ọnụ ha agọzi mmadụ, ma na-abụ ya ọnụ n’obi ha.+ (Sila)
6 N’eziokwu, ọ bụ ya bụ oké nkume m na onye na-azọpụta m, ebe m na-agbaba, aka aghara ịkpa m.
E nweghị ihe ga-eme ka m daa.*+
7 Ọ bụ Chineke na-azọpụta m, na-emekwa ka a na-akwanyere m ùgwù.
Chineke bụ oké nkume m siri ike na ebe mgbaba m.+
8 Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile.
Gwanụ ya ihe niile dị unu n’obi.+
Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba.+ (Sila)
9 Ụmụ mmadụ bụ naanị ume e kupụrụ ekupụ.
E nweghị ihe ụmụ mmadụ bụ.+
A tụọ ha n’ihe e ji atụ̀ ihe, ha aharughị ka ume e kupụrụ ekupụ.+
10 Unu echela na irigbu mmadụ ga-eme ka ihe gaziere unu
Ma ọ bụ na izu ohi ga-eme ka ihe dịrị unu ná mma.
Ọ bụrụ na unu akpatakwuo akụ̀, unu atụkwasịla ya obi.+
11 Anụla m ka Chineke kwuru ugboro abụọ, sị:
Ọ bụ Chineke nwe ike.+
Abụ Devid bụrụ mgbe ọ nọ n’ala ịkpa Juda.+
63 Chineke, ị bụ Chineke m. M na-achọsi gị ike.+
Ike agwụla m ebe m na-atụ anya gị
N’ala kpọrọ ezigbo nkụ nke mmiri na-adịghị.+
2 N’ihi ya, ahụla m gị n’ebe nsọ gị.
Ahụla m ike gị na ebube gị.+
4 N’ihi ya, m ga-eto gị ná ndụ m niile.
M ga-agbasa aka m kpọkuo aha gị.
5 M ga-eji ọnụ m bụkuo gị abụ otuto, jirikwa ọṅụ too gị,
6 M na-echeta gị n’elu àkwà* m.
Ọ bụ ihe banyere gị ka m na-atụgharị n’uche n’oge nche abalị.+
Aka nri gị jidesiri m ike.+
10 A ga-eji mma agha bibie ha.
Ha ga-aghọrọ nkịta ọhịa nri.
11 Ma, eze ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe Chineke meere ya.
Onye ọ bụla nke na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-enwe obi ụtọ,*
N’ihi na a ga-emechi ọnụ ndị na-ekwu okwu ụgha.
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
64 Chineke, biko, nụrụ olu m mgbe m na-arịọ gị arịrịọ.+
Chebe ndụ m ka m ghara ịtụ onye iro ụjọ.
2 Mee ka nkata ndị ọjọọ na-akpa na nzuzo ghara ikpudo m+
Nakwa ka ìgwè ndị ajọ omume ghara ịkpara m aka.
3 Ha na-amụ ire ha ka ọ dị nkọ ka mma agha.
Ha na-adị njikere ikwu okwu ọjọọ ka à ga-asị na ha chọrọ ịgbapụ akụ́,
4 Ka ha nọrọ n’ebe ha zoro gbaa ya onye aka ya dị ọcha.
Ha na-agba ya onye ahụ na mberede n’atụghị egwu.
5 Ha anaghị akwụsị iche echiche ọjọọ.*
Ha na-akpa otú ha ga-esi sie ọnyà.
Ha na-asị: “Ònyekwanụ ga-ahụ ọnyà ndị ahụ?”+
6 Ha na-echepụta ụzọ ọhụrụ ndị ha ga-esi na-eme ihe ọjọọ.
Ha na-eji aghụghọ agba izu wee chepụta ihe ọjọọ ha ga-eme.+
Mmadụ enweghị ike ịghọta ihe onye nke ọ bụla na-eche n’obi ya.
7 Ma Chineke ga-agba ha akụ́.+
Akụ́ ga-emerụ ha ahụ́ na mberede.
8 Ire ha ga-akpatara ha ọdachi.+
Ndị niile na-ele ha anya ga-efufe isi.
9 Egwu ga-ejidezi mmadụ niile.
Ha ga-akọsa ihe Chineke mere,
Ha ga-aghọtakwa ọrụ dị iche iche ọ na-arụ.+
10 Onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi Jehova, ọ ga-agbabakwa n’ime ya.+
Ndị niile obi ha dị ọcha ga-enwe obi ụtọ.*
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ọma Devid. Abụ.
65 Chineke, ọ bụ gị ka a ga-eto na Zayọn.+
Anyị ga-emezu nkwa anyị kwere gị.+
2 Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka ụdị mmadụ* niile ga-abịakwute.+
Ma ị na-agbaghara m* ihe ọjọọ ndị m na-eme.+
Ọ bụ gị ka ndị bi n’ebe niile ụwa sọtụrụ,
Nakwa ndị bi n’ebe dị anya n’ofe oké osimiri, tụkwasịrị obi.+
6 I* ji ike gị mee ka ugwu kwụrụsie ike.
7 Ị* na-eme ka oké osimiri ndị na-enugharị enugharị dajụọ,+
Na-emekwa ka mkpọtụ ebili mmiri na ụzụ mba dị iche iche na-eme dajụọ.+
8 Ndị bi n’ebe ndị dị anya ga-atụ egwu n’ihi ihe ndị dị ịtụnanya ị na-eme.+
Ị ga-eme ka ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ na ndị bi n’ebe ọdịda anyanwụ tie mkpu ọṅụ.
Mmiri juru n’iyi Chineke kere.
I mere ka ụwa na-emepụtara ndị mmadụ nri,+
N’ihi na ọ bụ otú a ka ị kwadebere ụwa ka ọ na-eme.
10 Ị na-eme ka mmiri dee ebe ndị a kọrọ akọ na ya, kposaakwa ájá ndị a kọrọ akọ.
Ị na-eme ka mmiri ozuzo dee ya. Ị na-agọzi ya ka ihe a kụrụ na ya na-epu.+
11 I meela ka ihe ndị a kụrụ n’afọ mee nke ọma.
Ihe ọma juru n’ụzọ i si agafe.+
Ha na-eti mkpu ọṅụ. N’eziokwu, ha na-abụ abụ.+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ọma. Abụ.
66 Unu niile ndị bi n’ụwa, tienụ mkpu ọṅụ, tookwanụ Chineke.+
2 Bụọnụ abụ iji too aha ya dị ebube.
Toonụ ya, jaakwanụ ya mma.+
3 Sịnụ Chineke: “Ọrụ gị niile na-eme nnọọ ka a na-atụ egwu gị!+
Ndị iro gị ga-ama jijiji n’ihu gị+
Maka na ike gị dị ukwuu.
4 Ndị niile bi n’ụwa ga-akpọrọ gị isiala.+
Ha ga-abụku gị abụ otuto.
Ha ga-abụ abụ iji too aha gị.”+ (Sila)
5 Bịanụ hụ ọrụ dị iche iche Chineke na-arụ.
Ihe ọ na-emere ndị mmadụ dị ịtụnanya.+
6 O mere ka oké osimiri bụrụ ala nkịtị.+
Ha ji ụkwụ gafee osimiri.+
Anyị ṅụrịrị ọṅụ n’ebe ahụ n’ihi ihe o meere anyị.+
7 O ji ike ya na-achị ruo mgbe ebighị ebi.+
Anya ya na-ahụ mba niile.+
Ndị isi ike ekwesịghị ibuli onwe ha elu.+ (Sila)
Ọ naghị ekwe ka anyị zọhie ụkwụ.*+
10 N’ihi na i nyochaala anyị, Chineke.+
Ị nụchaala anyị otú e si anụcha ọlaọcha.
11 I meela ka ụgbụ e ji siere anyị ọnyà jide anyị.
I boro anyị ibu na-anyịgbu anyị.
12 I kwere ka mmadụ efu zọpịa anyị.*
Anyị tara nnukwu ahụhụ ka à ga-asị na anyị si n’etiti ọkụ nakwa n’etiti mmiri gafere.
I wee kpọbata anyị n’ebe obi ga-eru anyị ala.
13 M ga-eji àjà a na-esucha ọkụ bata n’ụlọ gị.+
15 M ga-eji anụ ndị gbara agba chụọrọ gị àjà a na-esu ọkụ,
M ga-eji ebule chụọrọ gị àjà.
M ga-achụ oké ehi na mkpi n’àjà. (Sila)
17 M ji ọnụ m kpọkuo ya,
M jikwa ire m too ya.
Ọ ṅara ntị n’ekpere m.+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya. Abụ ọma. Abụ.
67 Chineke, ị ga-emere anyị amara ma gọzie anyị.
Ị ga-enwe mmasị n’ebe anyị nọ,*+ (Sila)
2 Ka ụwa niile wee mara ihe ndị ị na-eme,+
Mba niile amarakwa otú i si azọpụta ndị gị.+
3 Chineke, ka ndị mmadụ too gị.
Ka mmadụ niile too gị.
Ị ga na-edu mba dị iche iche dị n’ụwa. (Sila)
5 Chineke, ka ndị mmadụ too gị.
Ka mmadụ niile too gị.
6 Ala ga-emepụta nri nke ọma.+
Chineke, bụ́ Chineke anyị, ga-agọzi anyị.+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid. Abụ ọma.
2 Chụsaa ha otú ifufe si efesasị anwụrụ ọkụ.
3 Ma, ka ndị ezi omume ṅụrịa ọṅụ.+
Ka ha ṅụrịa ezigbo ọṅụ n’ihu Chineke.
Ka aṅụrị na obi ụtọ ju ha obi.
4 Bụkuonụ Chineke abụ. Bụọnụ abụ iji too aha ya.+
Bụkuonụ Onye na-agafe n’ọzara* abụ.
Aha ya bụ Jaa.*+ Ṅụrịanụ ọṅụ n’ihu ya.
5 Chineke nọ n’ebe dị nsọ o bi.+
Ọ bụ nna ụmụ na-enweghị nna, bụrụkwa onye na-echebe* ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ.+
6 Chineke na-enye ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka ụlọ ha ga-ebi.+
Ọ na-akpọpụta ndị mkpọrọ ma mee ka ha baa ọgaranya.+
Ma ndị isi ike* ga-ebi n’ala kpọrọ nkụ.+
Chineke mere ka mmiri si n’eluigwe zoo.
Chineke, bụ́ Chineke Izrel, mere ka Saịnaị nke a maa jijiji.+
9 Chineke, i mere ka mmiri zosie ike.
I mere ka ndị gị* ike gwụchara nweghachi ume.
Chineke, i gbooro ndị ogbenye mkpa ha n’ihi na ị dị mma.
11 Ọ bụ Jehova na-enye iwu.
Ụmụ nwaanyị ndị na-ezisa ozi ọma dị ọtụtụ.+
12 Ndị eze na ndị agha ha na-agbalaga.+ Ha na-agbalaga.
Nwaanyị nọ n’ụlọ na-eso eketa ihe a kwatara n’agha.+
13 N’agbanyeghị na unu* dina n’ebe unu kwanyere ọkụ n’akụkụ ụlọikwuu unu,
Unu ga-enweta nduru nku ya bụ ọlaọcha,
15 Ugwu Beshan+ bụ ugwu Chineke.*
Ugwu Beshan nwere ọtụtụ ebe dị elu na ya.
16 Gị ugwu nwere ọtụtụ ebe dị elu na ya, gịnị mere i ji ele
N’eziokwu, Jehova ga-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi.+
17 Ụgbọ ịnyịnya agha Chineke dị iri puku kwuru iri puku, puku kwuru puku.+
Jehova esila na Saịnaị bata n’ebe dị nsọ.+
18 Jaa bụ́ Chineke, ị rịgooro n’elu.+
Ị kpọọrọ ndị a dọọrọ n’agha.
Ị kpọọrọ ụmụ nwoke ka ha bụrụ onyinye.+
N’eziokwu, ị kpọọrọ ndị isi ike+ ka ha na ha biri.
19 Ka e too Jehova, onye na-eburu anyị ibu anyị kwa ụbọchị,+
Ezi Chineke, onye na-azọpụta anyị. (Sila)
20 Ezi Chineke bụụrụ anyị Chineke na-azọpụta anyị.+
Ọkaakaa Onyenwe anyị bụ́ Jehova na-anapụta anyị n’aka ọnwụ.+
21 N’eziokwu, Chineke ga-akụri isi ndị iro ya,
Ya bụ, isi onye ọ bụla na-ekweghị ahapụ ihe ọjọọ ọ na-eme.+
22 Jehova ekwuola, sị: “M ga-esi na Beshan kpọghachi ha.+
M ga-esi n’ala ala oké osimiri kpọghachi ha,
23 Ka i wee zọọ ọbara ndị iro gị ụkwụ,+
Ka nkịta gị rachaakwa ọbara ndị iro gị.”
24 Chineke, ha na-ahụ ka ndị gị kwụ n’ahịrị na-aga.
Chineke m, bụ́ Eze m, ha na-ahụ ka ndị gị kwụ n’ahịrị na-abanye n’ebe dị nsọ.+
25 Ndị na-abụ abụ na-aga n’ihu, ndị na-akpọ ụbọ akwara esoro ha n’azụ.+
Ụmụ agbọghọ ndị na-akụ obere ịgbà nọ n’agbata ha.+
26 Unu ndị Onyenwe Izrel nyere ndụ,+ toonụ Chineke.
Nọrọnụ n’ọgbakọ buru ibu too Jehova.
27 Benjamin,+ bụ́ ọdụdụ nwa, na-emeri ha.
Ndị isi Juda na ìgwè mmadụ ndị na-eti mkpu ha na ha so na-emerikwa,
Nakwa ndị isi Zebulọn na ndị isi Naftalaị.
28 Chineke gị ekwuola na ị ga-adị ike.
Chineke, biko, gosi ike gị, gị onye gbachiteere anyị.+
30 Baara anụ ọhịa ndị nọ n’ebe ahịhịa amị dị mba,
Bụ́ ìgwè oké ehi+ na ụmụ ha
Ruo mgbe ndị mmadụ ga na-akpọ isiala ma na-eweta ọlaọcha.*
Ma, ọ na-achụsasị ndị ịlụ agha na-atọ ụtọ.
31 A ga-esi n’Ijipt bute arịa ndị e ji ọla nchara rụọ.*+
Kush ga-eme ngwa ngwa nye Chineke onyinye.
32 Unu alaeze ndị dị n’ụwa, bụkuonụ Chineke abụ,+
Bụkuonụ Jehova abụ otuto, (Sila)
33 Bụkuonụ Onye na-agbafe n’eluigwe niile nke dịwara kemgbe oge ochie abụ.+
Lee, olu ya nke dị ebube na-adasi ụda ike.
34 Kwuonụ na Chineke nwere ike dị ukwuu.+
Ọ bụ ya na-achị Izrel,
A na-ahụkwa ike ya na mbara igwe.*
35 A na-atụ egwu Chineke, na-akwanyekwara ya ùgwù n’ebe nsọ ya* dị ebube.+
Ọ bụ Chineke Izrel,
Onye na-enye ndị ya ike na ume.+
Toonụ Chineke.
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Okooko Lili” kpọọ ya. Abụ Devid.
69 Chineke, biko zọpụta m, n’ihi na mmiri na-achọ iri m.*+
2 Emikpuola m n’ime apịtị miri emi, nke ala ya na-esighị ike.+
Adakpuola m na mmiri miri emi.
Iyi na-asọsi ike eburula m.+
3 Etigidela m mkpu, ike agwụ m.+
Olu agụọla m.
Anya m anaghịzi ahụcha ụzọ ebe m nọ na-echere Chineke m.+
Ndị chọrọ igbu m,
Ya bụ, ndị iro m, bụ́ ndị aghụghọ,* adịla ọtụtụ.
Ha manyere m ka m nye ha ihe m na-ezughị ezu.
5 Chineke, ị ma nzuzu m zuzuru,
Ị makwa ihe ndị m mere ikpe ji ma m.
6 Ọkaakaa Onyenwe anyị, Jehova nke ụsụụ ndị agha,
Biko, ekwela ka ihere mee ndị nwere olileanya n’ebe ị nọ n’ihi m.
Biko, Chineke Izrel,
Ekwela ka e menye ndị na-achọ gị ihere n’ihi m.
Ihere ejula m ihu.+
9 Ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ n’obi.+
Ọ bụ m ka ndị na-akparị gị kparịrị.+
12 Ndị nọ n’ọnụ ụzọ ámá na-ekwu gbasara m,
Ndị aṅụrụma jikwa m agụ egwú.
Chineke, biko, n’ihi ịhụnanya gị* dị ukwuu,
Za ekpere m ma gosi na ị bụ onye nzọpụta a tụkwasịrị obi.+
14 Dọpụta m n’apịtị.
Ekwela ka m mikpuo.
Napụta m n’aka ndị kpọrọ m asị,
Dọpụtakwa m na mmiri miri emi.+
16 Jehova, biko, za m, n’ihi na ịhụnanya gị* dị mma.+
Za m ngwa ngwa n’ihi na m na-ata ahụhụ.+
18 Bịa m nso napụta m.
Napụta m n’aka ndị iro m.
19 Ị ma mkparị a na-akparị m na otú e si na-emenye m ihere nakwa otú e si jiri m na-eme ihe ọchị.+
Ị na-ahụ ndị iro m niile.
20 Obi agbawaala m n’ihi mkparị a na-akparị m, ọnyá ya enweghịkwa ngwọta.
M nọ na-atụ anya ka e metere m ebere, ma e nweghị onye meteere m ebere.+
M nọkwa na-atụ anya ndị ga-akasi m obi, ma e nweghị onye m hụrụ.+
23 Ka anya ha gbaa ọchịchịrị ka ha gharazie ịhụ ụzọ,
Meekwa ka úkwù na-ama ha jijiji mgbe niile.
25 Ka ebe ha mara ụlọikwuu* tọgbọrọ chakoo.
Ka a ghara inwe onye bi n’ụlọikwuu ha.+
26 N’ihi na ha na-achụ onye i tiri ihe ọsọ,
Ha na-akọsakwa ahụhụ ndị ị merụrụ ahụ́ na-ata.
27 Mee ka ha taa ahụhụ ihe ọjọọ ha mere taruo ya n’isi,
Ka ị gharakwa ile ha anya ka ndị ezi omume.
28 Ka e hichapụ aha ha n’akwụkwọ nke ndụ,*+
Ka a gharakwa ide aha ha n’ebe e dere aha ndị ezi omume.+
29 Ma m na-ata ahụhụ, ahụ́ niile na-egbukwa m mgbu.+
Chineke, biko, jiri ike i ji azọpụta ndị gị chebe m.
30 M ga-abụ abụ too aha Chineke.
M ga-aja ya mma, keleekwa ya.
32 Ndị dị umeala n’obi ga-ahụ ike Chineke wee ṅụrịa ọṅụ.
Unu ndị na-achọ Chineke, ka obi sie unu ike.
Ka oké osimiri na ihe niile na-agagharị n’ime ya too ya.
Ha ga-ebikwa n’ebe ahụ, ya* abụrụ nke ha.
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid, nke e ji echeta ihe.
70 Chineke, biko, zọpụta m.
Jehova, biko, bịa ngwa ngwa nyere m aka.+
Ka ndị obi na-atọ ụtọ na ọdachi dakwasịrị m
Gbaghachi azụ n’ihere.
3 Ka a chụghachi ndị na-asị m: “Ntọọ! Ntọọ!” azụ,
Ka ihere meekwa ha.
Ka ndị obi na-atọ ụtọ na ị na-azọpụta ndị gị na-ekwu mgbe niile, sị:
“Ka e too Chineke!”
5 Ma, m bụ ogbenye, e nweghịkwa onye na-enyere m aka.+
Chineke, biko, mee ngwa ngwa nyere m aka.+
Ọ bụ gị na-enyere m aka, ọ bụkwa gị na-anapụta m.+
Jehova, biko, egbula oge.+
71 Jehova, agbabala m n’ime gị.
Biko, ekwela ka ihere mee m.+
2 Zọpụta m ma napụta m n’ihi na ị bụ onye ezi omume.
3 Ghọọrọ m ebe a rụsiri ike n’oké nkume,
Bụ́ ebe m ga na-agbaba mgbe niile.
Biko, nye iwu ka a zọpụta m,
N’ihi na ị bụ nkume m dị elu na ebe m a rụsiri ike.+
5 N’ihi na m nwere olileanya n’ebe ị nọ, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova.
M tụkwasịrị gị obi* kemgbe m bụ nwata.+
6 Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi kemgbe a mụrụ m.
Ọ bụ gị si n’afọ nne m kupụta m.+
M ga na-eto gị mgbe niile.
7 Ọ na-eju ọtụtụ ndị anya ma ha hụ ihe ọma meere m.
Ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike.
8 M ji ọnụ m eto gị mgbe niile.+
Kwa ụbọchị, m na-akọ otú i si dị ebube.
Ahapụla m mgbe ike na-adịghịzi m.+
10 Ndị iro m na-ekwu okwu ọjọọ banyere m,
Ndị chọrọ igbu m* na-agbara m izu ọjọọ,+
11 Sị: “Chineke ahapụla ya.
Chụwa ya jide ya, n’ihi na e nweghị onye ga-azọpụta ya.”+
12 Chineke, biko, anọzila m n’ebe dị anya.
Chineke m, biko, bịa ọsọ ọsọ nyere m aka.+
Ka e menye ndị na-achọ ka ọdachi dakwasị m ihere,
Ka e mechuokwa ha ihu.+
14 Ma m ga na-echere gị.
M ga-etokwu gị.
15 M ga-eji ọnụ m kọsaa ezi omume ị na-eme.+
Kwa ụbọchị, m ga-akọsa otú i si azọpụta ndị gị,
N’agbanyeghị na otú i si azọpụta ha karịrị akarị nke na anaghị m aghọtacha ha.*+
16 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova,
M ga-abịa kọọ gbasara ihe ndị dị ukwuu ị na-eme.
M ga-ekwu banyere naanị ezi omume ị na-eme.
17 Chineke, ị na-akụziri m ihe kemgbe m bụ nwata.+
Ruo ugbu a, m ka na-akọ banyere ọrụ ndị dị ebube ị na-arụ.+
18 Chineke, biko, m megodị agadi gbaa isi awọ́, ahapụla m.+
Biko, ka m kọọrọ ọgbọ na-abịa abịa banyere ike* gị,
Kọọkwara ndị niile a ka ga-amụ banyere ihe ndị dị ukwuu ị na-eme.+
19 Chineke, ezi omume ị na-eme karịrị nnọọ akarị.+
I meela ọtụtụ ihe dị egwu.
Chineke, ònye dị ka gị?+
Si n’ala ala mmiri gụpụta m.+
21 Mee ka a na-akwanyekwuru m ùgwù.
Chebe m ma kasie m obi.
M ga-eji une bụkuo gị abụ otuto,
Gị Onye Nsọ Izrel.
24 Kwa ụbọchị, m ga na-akọ banyere ezi omume ndị ị na-eme,+
N’ihi na ihere ga-eme ndị chọrọ ka m laa n’iyi, a ga-emechukwa ha ihu.+
Gbasara Solomọn.
2 Ka o kpee ikpe ziri ezi mgbe ọ na-ekpechite ọnụ ndị gị,
Ka o kpeekwa ikpe ziri ezi mgbe ọ na-ekpechite ọnụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha.+
3 Ka ugwu ukwu mee ka udo dịrị ndị mmadụ,
Ka ugwu nta meekwa ka ha na-eme ezi omume.
4 Ka o kpechite ọnụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha* n’ime ndị gị.
Ka ọ zọpụta ụmụ ndị ogbenye,
Ka o bibiekwa onye na-erigbu ndị ọzọ.+
5 Ha ga na-atụ egwu gị ogologo oge niile anyanwụ dị
Nakwa ogologo oge niile ọnwa dị,
Si n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+
7 N’oge ọchịchị ya, ihe ga na-agaziri onye ezi omume,+
Udo ga-adịkwa ebe niile+ ruo mgbe ọnwa na-agaghịzi adị.
8 Ọ ga-enwe ndị ọ na-achị* malite n’oké osimiri ruo n’oké osimiri,
Malitekwa n’Osimiri Yufretis ruo n’ebe niile ụwa sọtụrụ.+
10 Ndị eze Tashish na ndị eze agwaetiti dị iche iche ga-atụrụ ya ụtụ.+
Ndị eze Shiba na ndị eze Siba ga-eweta onyinye.+
11 Ndị eze niile ga-akpọrọ ya isiala,
Mba niile ga-ejekwara ya ozi.
12 N’ihi na ọ ga-anapụta ogbenye nke na-ebe ákwá ka e nyere ya aka,
Napụtakwa onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka.
13 Ọ ga-emere ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere,
Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye.
14 Ọ ga-anapụta ha* n’aka ndị na-emegbu ha nakwa n’aka ndị na-emesi ha ike,
Ọ ga-ejikwa ndụ* ha kpọrọ ihe.
15 Ka ọ dịrị ndụ, ka e nyekwa ya ọlaedo Shiba.+
Ka a na-ekpere ya ekpere mgbe niile,
Ka a na-agọzikwa ya mgbe niile.
Ọ ga-eju eju n’elu ugwu dị iche iche.
Mkpụrụ a kụrụ n’ubi ya ga na-eme nke ọma ka osisi ndị dị na Lebanọn,+
Ndị nọ n’obodo ya dị iche iche ga na-amakwa pokopoko ka ihe a kụrụ n’ala.+
17 Ka aha ya dịruo mgbe ebighị ebi.+
Ka aha ya na-ede ude ogologo oge niile anyanwụ dị.
Ka e si n’aka ya gọzie ndị mmadụ.+
Ka mba niile kpọọ ya onye obi ụtọ.
Amen na Amen.
20 Ekpere Devid nwa Jesi gwụrụ n’ebe a.+
AKWỤKWỌ NKE ATỌ
(Abụ Ọma 73-89)
Abụ Esaf.+
73 N’eziokwu, Chineke na-emere Izrel ihe ọma. Ọ na-emere ya ndị obi ha dị ọcha.+
2 Ma, ọ fọrọ obere ka m kpafuo.
Ọ fọrọ obere ka ụkwụ m mịchapụ.+
3 N’ihi na m malitere imere ndị ajọ omume, bụ́ ndị onwe ha na-ebu isi,* anyaụfụ
Mgbe m hụrụ na ihe na-agaziri ha.+
4 N’ihi na ahụ́ na-adị ha mma.*
Ha anaghị ahụsi anya mgbe ha na-anwụ.+
6 N’ihi ya, mpako bụ ihe olu ha.+
Ha yi tigbuo zọgbuo ka uwe.
7 Akụ̀* ha na-eme ka anya ha zaa.
Ihe na-agaziri ha karịa otú ha chere n’obi ha.
8 Ha na-achị ndị ọzọ ọchị, na-ekwukwa ihe ọjọọ.+
Ha na-etu ọnụ na ha ga-emesi ndị ọzọ ike.+
9 Ha na-ekwu okwu ka à ga-asị na isi ha na-eru n’eluigwe.
Ha na-ejegharị n’ụwa, na-ekwu ihe ọ bụla masịrị ha.
11 Ha na-asị: “Olee otú Chineke ga-esi mara?+
Onye Kacha Elu ọ̀ ma ihe na-eme?”
12 Ọ bụ ndị a bụ ndị na-eme ihe ọjọọ. Ha anaghị enwe nsogbu ọ bụla.+
Ha na-eme ka akụ̀ ha na-adịkwu ọtụtụ.+
13 N’eziokwu, mbọ m gbara mee ka obi m dị ọcha bụ n’efu.
Ọ bụkwa n’efu ka m kwọrọ aka m iji gosi na aka m dị ọcha.+
14 A na-enye m nsogbu ụbọchị niile.+
A na-ata m ahụhụ kwa ụtụtụ.+
15 Ma, a sị na m kwuru ihe ndị a,
Ọ pụtara na mụ aghọgbuola ndị gị.
16 Mgbe m gbara mbọ ka m ghọta ya,
Ọ nọ na-enye m nsogbu n’obi
17 Ruo mgbe m batara n’ebe nsọ dị ebube nke Chineke,
M wee ghọta ihe ga-eme ha n’ọdịnihu.
18 N’eziokwu, ọ bụ n’ala na-amị amị ka i dowere ha.+
Ị na-eme ka ha daa laa n’iyi.+
Ha na-ala n’iyi n’egbughị oge.
20 Jehova, ị ga-echefu ha mgbe i biliri,
Otú mmadụ si echefu nrọ mgbe o tetara n’ụra.
M yiri anụ ọhịa na-amaghị ihe n’anya gị.
23 Ma ugbu a, mụ na gị na-anọ mgbe niile.
I jidela m aka n’aka nri m.+
25 Ènwere m onye ọzọ n’eluigwe?
Ebe ọ bụ na m nwere gị, e nweghị ihe ọzọ m chọrọ n’ụwa.+
26 Ike nwere ike ịgwụ m, obi nwekwara ike ịda m mbà,
Ma, Chineke bụ oké nkume m nke na-eme ka obi sie m ike, bụrụkwa òkè m ruo mgbe ebighị ebi.+
27 N’eziokwu, a ga-ala ndị na-agbara gị ọsọ n’iyi.
Ị ga-ebibi onye ọ bụla kpara àgwà ka akwụna wee hapụ gị.+
28 Ma, ịbịa Chineke nso dị m mma.+
Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ka m ji mere ebe mgbaba m,
Ka m wee kọsaa ọrụ ya niile.+
74 Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi?+
Gịnị mere i ji na-ewesa ìgwè atụrụ gị ị na-enye nri iwe dị ọkụ?+
Cheta Ugwu Zayọn bụ́ ebe i bi.+
3 Gawa n’ebe ndị e bibiri kpamkpam.+
Onye iro ebibiela ihe niile dị n’ebe nsọ.+
4 Ndị iro gị na-eti mkpu ọṅụ n’ebe a na-anọ efe gị.*+
Ha egwunyela ọkọlọtọ ha n’ebe ahụ iji gosi na ha emeriela.
5 Ha dị ka ụmụ nwoke ndị ji anyụike na-egbutusị osisi ndị dị n’oké ọhịa.
6 Ha ji anyụike na ígwè na-egbujisị ihe niile a tụrụ atụ́ dị na ya.+
Ha merụrụ ụlọikwuu a kpọkwasịrị aha gị ma kwatuo ya n’ala.
8 Ha na ụmụ ha ekwuola n’obi ha, sị:
“A ga-agba ebe niile a na-anọ efe Chineke n’ala a ọkụ.”
9 E nweghịzi ihe àmà anyị na-ahụ.
E nweghịzi onye amụma nọnụ,
E nweghịkwa onye ọ bụla n’ime anyị ma mgbe ihe a ga-emeru.
10 Chineke, biko, olee mgbe onye iro ga-akwụsị ịkparị gị?+
Onye iro ọ̀ ga na-ekwutọ aha gị ruo mgbe ebighị ebi?+
11 Gịnị mere i ji sere aka gị, ya bụ, aka nri gị?+
Wepụta aka gị* bibie ha.
13 Ị na-eji ike gị enugharị oké osimiri.+
Ị kụpịasịrị isi nnukwu anụ mmiri dị iche iche n’ime mmiri.
14 I gwepịara isi nnukwu anụ mmiri.*
I weere ya nye ndị mmadụ, bụ́ ndị bi n’ọzara, ka ha rie.
I mere ka osimiri ndị na-asọ asọ kemgbe takọọ.+
16 Ọ bụ gị nwe ehihie na abalị.
Ọ bụ gị kere ìhè na anyanwụ.+
17 Ọ bụ gị kpaara ụwa ókè ya niile.+
Ọ bụ gị mere ka e nwee ọkọchị na udu mmiri.+
19 Enyefela nduru gị n’aka anụ ọhịa.
Echefula ndị gị na-ata ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi.
20 Cheta ndụ anyị na gị gbara,
N’ihi na ndị tigbuo zọgbuo na-ezo n’ebe ọ bụla gbara ọchịchịrị n’ụwa chebiri ndị mmadụ.
21 Ka a ghara imenye onye a na-emegbu emegbu ihere.+
Ka ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya too aha gị.+
22 Chineke, biko, bilie kpechite ọnụ gị.
Cheta otú onye nzuzu si na-akparị gị mgbe niile.+
23 Echefula ihe ndị iro gị na-ekwu.
Mkpọtụ ndị na-enupụrụ gị isi na-eme na-ala elu mgbe niile.
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Alala M n’Iyi” kpọọ ya. Abụ Esaf.+
75 Anyị na-ekele gị, Chineke. Anyị na-ekele gị.
2 Ị sịrị: “M kpebie oge m ga-ekpe ikpe,
M na-ekpe ikpe ziri ezi.
3 Mgbe ụwa na ndị niile bi n’ime ya mara jijiji,*
Ọ bụ m mere ka ogidi ya dị iche iche kwụsie ike.” (Sila)
4 M gwara ndị na-etu ọnụ, sị: “Unu etula ọnụ,”
Gwakwa ndị ajọ omume, sị: “Unu etola onwe unu na unu dị ike.*
6 N’ihi na ọ bụghị n’ebe ọwụwa anyanwụ ma ọ bụ n’ebe ọdịda anyanwụ ma ọ bụkwanụ n’ebe ndịda
Ka onye na-eme ka mmadụ bụrụ onye ukwu si abịa.
7 N’ihi na ọ bụ Chineke bụ Onyeikpe.+
Ọ na-eweda otu onye ala, bulie onye ọzọ elu.+
8 N’ihi na e nwere iko Jehova bu n’aka.+
Mmanya nke dị n’ime ya na-agbọ ụfụfụ, a gwakwara ya nke ọma.
Ọ ga-awụpụrịrị ya.
Ndị ajọ omume niile nọ n’ụwa ga-aṅụkwa ya, ṅụchaa ya.”+
9 Ma m ga-akọsa ya ruo mgbe ebighị ebi.
M ga-abụku Chineke Jekọb abụ otuto.
10 N’ihi na ọ na-asị: “M ga-anapụ ndị ajọ omume ike.”*
Ma, m ga-eme ka onye ezi omume nwekwuo ike.*
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya. Abụ Esaf.+ Abụ ọma.
Aha ya na-ede ude n’Izrel.+
Ị dị ebube karịa ugwu dị iche iche anụ ọhịa juru.
5 A nakọrọla ndị dike ihe ha nwere.+
Ụra eburula ha.
E nweghị onye ike dị ná ndị agha niile.+
7 Ọ bụ naanị gị bụ onye a na-atụ egwu.+
Ònye ga-eguzoli ma i wee oké iwe?+
8 I si n’eluigwe kwuo ihe i kpebiri.+
Ndị bi n’ụwa tụrụ egwu wee nọrọ jụụ+
9 Mgbe Chineke biliri ka o mee ihe o kpebiri,
Iji zọpụta ndị niile dị umeala n’obi n’ụwa.+ (Sila)
10 N’ihi na iwe mmadụ ga-eme ka e too gị.+
Ị ga-eme ka ihe ikpeazụ ndị iro gị ga-eji iwe mee mee ka e too gị.
11 Kwenụ Jehova bụ́ Chineke unu nkwa ma mezuo ya.+
Ka ndị niile gbara ya gburugburu tụọ egwu ya ma weta onyinye ha.+
12 Ọ ga-emenye ndị isi dị mpako ihere.
Ọ na-eme ka egwu tụwa ndị eze ụwa.
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. Nke Jedutọn.* Abụ Esaf.+
77 M ga-ebesara Chineke ákwá.
Ọ bụ Chineke ka m ga-ebesara ákwá, ọ ga-anụkwa olu m.+
2 M chọrọ Jehova n’oge m nọ ná nsogbu.+
N’abalị, m gbasara aka m na-ekpe ekpere. Ike agwụghị m.
Ma a kasighị m obi.
3 M na-asụ ude ma m cheta Chineke.+
Obi anaghị ezu m ike, ike na-agwụkwa m.*+ (Sila)
4 Ị na-ejide mbubere anya m ka ọ ghara imechi.
Ahụ́ anaghị eru m ala, anaghịkwa m ekwuli okwu.
6 N’abalị, m na-echeta abụ m.+
M na-atụgharị uche.+
M na-agbalịsi ike ka m ghọta ihe ndị a.
7 Jehova ọ̀ ga-ajụ anyị ruo mgbe ebighị ebi?+
Ọ̀ bụ na e nweghịzi mgbe ọ ga-emere anyị amara?+
8 Ọ̀ bụ na ọ gaghịzi ahụ anyị n’anya ruo mgbe ebighị ebi?
Ọ̀ bụ na ọ gaghịzi emezuru ọgbọ niile nkwa o kwere?
10 M̀ kwesịrị ịnọ na-asị: “Ọ bụ ihe a na-ewute m:+
Onye Kacha Elu agbanweela otú o si emeso anyị”?
11 M ga-echeta ọrụ niile Jaa na-arụ.
M ga-echeta ihe ndị dị ịtụnanya i mere n’oge dị anya gara aga.
13 Chineke, otú i si eme ihe gosiri na ị dị nsọ.
Chineke, olee chi dị ukwuu ka gị?+
14 Ọ bụ gị bụ ezi Chineke, onye na-eme ihe ndị dị ịtụnanya.+
I meela ka ndị dị iche iche mata na ị dị ike.+
Mmiri miri emi malitekwara ime mkpọtụ.
17 Mmiri si n’ígwé ojii zosie ike.
Égbè eluigwe gbara n’ígwé ojii,
Àmụ̀mà gị nọkwa na-egbu aghara aghara ka ebe a na-agbapụsị akụ́.+
18 Ụda égbè eluigwe gị+ dị ka mkpọtụ ụkwụ ụgbọ ịnyịnya na-eme.
Àmụ̀mà gburu, ìhè enwuo n’ụwa.*+
Ụwa mere mkpọtụ, maakwa jijiji.+
19 Ị na-esi n’oké osimiri agafe.+
Ị na-esi n’etiti ọtụtụ mmiri agafe.
Ma a naghị ahụ nzọụkwụ gị.
Geenụ ntị n’ihe m na-ekwu.
2 M ga-emeghe ọnụ m tụọ ilu.
M ga-atụ ilu ndị a na-atụ n’oge dị anya gara aga.+
Anyị ga-akọrọ ọgbọ na-abịa abịa+
Ihe ọma ndị Jehova mere nakwa otú o si gosi na ọ dị ike,+
Ya bụ, ihe ndị dị ebube o mere.+
O nyere nna nna anyị hà iwu
Ka ha mee ka ụmụ ha mara ihe ndị a,+
6 Ka ọgbọ na-abịa abịa,
Ya bụ, ụmụ a ka ga-amụ amụ, mara ihe ndị a.+
Hanwa ga-akọkwara ụmụ nke ha ihe ndị a.+
7 Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi.
8 Ọ ga-eme ka ha ghara ịdị ka ndị nna nna ha,
Bụ́ ọgbọ isi ike, nke nupụrụ isi,+
Ọgbọ nke obi ha na-adịghị n’otu ebe,*+
Nke na-atụkwasịghịkwa Chineke obi.
9 E nyere ụmụ Ifrem ụta,
Ma ha gbara ọsọ n’ụbọchị ha gara agha.
15 O mere ka oké nkume ndị dị n’ala ịkpa gbawaa.
O mere ka ha ṅụjuo mmiri afọ ka à ga-asị na ọ̀ bụ mmiri si n’oké osimiri.+
N’agbanyeghị ya, ha jụrụ, sị: “Ò nwere ike inye anyị nri,
Ka ò nwere ike inye ndị ya anụ ha ga-ata?”+
21 Mgbe Jehova nụrụ ihe ha kwuru, o were nnukwu iwe.+
Ha atụkwasịghị ya obi na ọ ga-azọpụtali ha.
23 O wee nye ígwé ojii nke dị n’elu iwu,
O meghekwara ọnụ ụzọ eluigwe.
24 Ọ nọ na-eme ka mana na-ezoro ha ka mmiri ka ha rie.
O nyere ha nri si n’eluigwe.+
25 Ndị mmadụ riri nri ndị dike.*+
O nyere ha nri ga-ezuru ha.+
26 O mere ka ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ fewe n’eluigwe,
Jirikwa ike ya mee ka ifufe si n’ebe ndịda fewe.+
27 O mere ka anụ ju ebe niile ka ájá.
Nnụnụ juru ebe niile ka ájá dị n’akụkụ oké osimiri.
29 Ha riri ihe rifee afọ ha.
O nyere ha ihe gụrụ ha.+
30 Ma, tupu ha erie ya otú o si na-agụ ha,
Mgbe ha ka kpụ nri ha n’ọnụ,
O gburu ụmụ nwoke ha ndị kacha ike.+
O gburu ụmụ okorobịa Izrel.
32 N’agbanyeghị ihe a, ha mekwuru mmehie.+
Ha enweghị okwukwe n’agbanyeghị na ha hụrụ ọrụ ndị dị ebube ọ rụrụ.+
33 O wee mee ka ha kwụsị ịdị ndụ n’otu ntabi anya ka ebe e kupụrụ ume,+
Meekwa ka nsogbu bịara ha na mberede, ha anwụọ.
34 Ma mgbe ọ bụla o gburu ụfọdụ n’ime ha, ha na-achọ ya.+
Ha na-alaghachi chọọ Chineke.
36 Ma ha gbalịrị ka ha jiri okwu ọnụ ha ghọgbuo ya,
Ha ghakwaara ya ụgha.
Ha ejighịkwa ọgbụgba ndụ ha na ya kpọrọ ihe.+
Ọ na-agbaghara ha* mmehie ha ma ghara ibibi ha.+
Ọ na-eme ka iwe ya dajụọ ugboro ugboro+
Kama iwesa ha iwe otú ọ dị ya n’obi.
Ha echetaghị ụbọchị ọ napụtara ha n’aka onye iro,+
43 Otú o si mee ihe àmà dị iche iche n’Ijipt,+
Rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche n’ógbè Zoan,
44 Nakwa otú o si mee ka mmiri Naịl ghọọ ọbara,+
Nke mere na ndị mmadụ enweghị ike ịṅụ mmiri ya.
46 O mere ka igurube ndị na-erichapụ ihe rie ihe ha kụrụ n’ubi,
Meekwa ka igurube ndị na-abịa n’ìgwè richapụ ihe ha tara ahụhụ rụpụta.+
48 O mere ka akụ́ mmiri ígwé dagbuo anụ ndị na-eburu ha ibu,+
Meekwa ka àmụ̀mà see wee* gbuo anụ ụlọ ha.
49 O wesara ha iwe dị ọkụ,
O were nnukwu iwe, taakwa ha ahụhụ.
Ìgwè ndị mmụọ ozi kpataara ha ọdachi.
50 O mere ka iwe ya zuo ha ahụ́.
Ọ napụtaghị ha* n’aka ọnwụ.
O mekwara ka ọrịa na-efe efe gbuo ha.
51 N’ikpeazụ, o gburu ndị niile e bu ụzọ mụọ n’Ijipt,+
Bụ́ ndị e bu ụzọ mụọ n’ụlọikwuu ndị dị na Ham.
Oké osimiri kpuchiri ndị iro ha.+
55 Ọ chụpụụrụ ha mba dị iche iche.+
O ji eriri e ji atụ̀ ihe tụọ ala, kenyezie ha ya.+
O mere ka ebo dị iche iche e nwere n’Izrel biri n’ụlọ nke ha.+
56 Ma ha nọ na-ama Chineke Onye Kacha Elu aka,* na-enupụkwara ya isi.+
Ha egeghị ntị ná ntụziaka ndị o nyere ha.*+
57 Ha gbakụtakwara ya azụ ma na-aghọ aghụghọ ka ndị nna nna ha.+
Ha dị ka ụta a na-ekwesighị ike, nke a na-atụkwasịghị obi.+
58 Ha nọ na-efe arụsị ha n’ebe ndị dị elu wee na-akpasu ya iwe,+
Ha jikwa arụsị ha a pịrị apị na-akpasu ya iwe.+
59 Chineke hụrụ ihe ha nọ na-eme, ya ewee oké iwe.+
O wee jụ Izrel kpamkpam.
61 O kwere ka ndị iro ya buru igbe ọgbụgba ndụ ya.
O kwere ka ha buru ihe nọchiri anya ike ya na ebube ya.+
63 Ọkụ regburu ụmụ okorobịa ya.
A gụrụghị ụmụ agbọghọ ya na-amaghị nwoke egwú agbamakwụkwọ.*
66 O wee chụghachi ndị iro ya azụ.+
O mere ka ihere na-eme ha mgbe niile.
67 Ọ jụrụ ụlọikwuu Josef.
Ọ họrọghị ebo Ifrem.
69 Ọ rụrụ ebe nsọ ya ka ọ na-adị mgbe niile ka eluigwe,+
Meekwa ka ọ dị ka ụwa nke o kere ka ọ dịruo mgbe ebighị ebi.+
Abụ Esaf.+
79 Chineke, ndị mba ọzọ abatala n’ala gị.+
Ha emerụọla ụlọ nsọ gị.+
Ha emeela ka Jeruselem bụrụzie obodo e bibiri ebibi.+
2 Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye ụmụ nnụnụ ka ha rie,
Werekwa anụ ahụ́ ndị na-erubere gị isi nye anụ ọhịa.+
4 Ndị agbata obi anyị jizi anyị eme ihe ọchị.+
Ndị gbara anyị gburugburu na-akparị anyị ma na-akwa anyị emo.
5 Jehova, olee mgbe ị ga-akwụsị oké iwe ị na-ewe? Ị̀ ga na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi?+
Olee mgbe iwe gị nke na-ere ka ọkụ ga-akwụsị?+
8 Atala anyị ahụhụ maka ihe ọjọọ nna nna anyị hà mere.+
Meere anyị ebere ọsọ ọsọ,+
N’ihi na e mechuola anyị ezigbo ihu.
Napụta anyị ma gbaghara anyị* mmehie anyị n’ihi aha gị.+
10 Gịnị mere mba dị iche iche ga-eji sị: “Olee ebe Chineke ha nọ?”+
Ka anyị hụ mgbe a ga-eme ka mba niile mara
Na ị bọọla ọbọ maka ọbara ndị ohu gị e gburu egbu.*+
11 Biko, nụrụ ude onye mkpọrọ na-asụ.+
Jiri nnukwu ike* gị napụta* ndị a mara ikpe ọnwụ.+
12 Jehova, biko, kwụọ ndị agbata obi anyị ụgwọ okpukpu asaa+
Maka mkparị ha kparịrị gị.+
13 Mgbe ahụ, anyị bụ́ ndị gị, ndị bụ́kwa ìgwè atụrụ ị na-enye nri,+
Ga na-ekele gị ruo mgbe ebighị ebi.
Anyị ga-etokwa gị si n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Okooko Lili” kpọọ ya. Abụ e ji echeta ihe. Abụ Esaf.+
Bịa zọpụta anyị.+
3 Chineke, biko, nabataghachi anyị.+
Meere anyị amara* ka e wee zọpụta anyị.+
4 Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, olee mgbe ị ga-akwụsị ileghara ekpere ndị gị anya n’ihi nnukwu iwe ị na-ewesa ha?+
5 Ị na-eme ka anya mmiri bụrụ nri ha,
Ị na-emekwa ka ha na-aṅụ anya mmiri gafee ókè.
6 I kwere ka ndị agbata obi anyị na-agba mbọ ka ha merie anyị.
Ndị iro anyị na-akwa anyị emo otú o si masị ha.+
7 Chineke nke ụsụụ ndị agha, biko, nabataghachi anyị.
Meere anyị amara* ka e wee zọpụta anyị.+
8 I mere ka osisi vaịn+ si n’Ijipt pụta.
Ị chụpụrụ mba dị iche iche wee kụọ ya.+
10 Ndò ya kpuchiri ugwu dị iche iche,
Alaka ya kpuchikwara osisi sida dị iche iche Chineke kụrụ.
12 Gịnị mere i ji kwatusịa mgbidi e ji nkume rụọ, bụ́ ndị gbara osisi vaịn ahụ gburugburu,+
Nke meziri ndị niile na-agafe agafe ji na-aghọrọ mkpụrụ ya?+
14 Chineke nke ụsụụ ndị agha, biko, lọghachi.
Si n’eluigwe ledata anya hụrụ.
Biko, lebara nwa gị nwoke anya, bụ́ onye* i mere ka ọ dịịrị gị ike.+
16 A na-egbutu ya, gbaa ya ọkụ.+
Mba ị na-aba na-eme ka a na-ala ha n’iyi.
18 Anyị agaghịzi ahapụ gị.
Dowe anyị ndụ, ka anyị wee na-akpọ aha gị.
19 Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, biko, nabataghachi anyị.
Meere anyị amara* ka e wee zọpụta anyị.+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ; nke ụda Gitit.* Abụ Esaf.+
81 Tienụ mkpu ọṅụ n’ihu Chineke, bụ́ ike anyị.+
Tienụ mkpu ọṅụ, tookwanụ Chineke Jekọb.
2 Malitenụ ịbụ abụ, werekwanụ obere ịgbà
Na ụbọ akwara nakwa une e ji akpọ egwú dị ụtọ.
M nụrụ olu* m na-amataghị, nke sịrị:
6 “M bupụrụ ibu o bu n’ubu ya.+
M buuru nkata o bu n’aka.*
7 Ị kpọkuru m n’oge ị na-ata ahụhụ, m wee napụta gị.+
M si n’ígwé ojii, nke égbè eluigwe si agba,* za gị.+
M nwalere gị na mmiri Meriba.*+ (Sila)
8 Ndị m, Izrel, nụrụnụ. M ga-ekwu ihe unu mere.
A sị nnọọ na unu ga-ege m ntị.+
Mepeenụ ọnụ unu nke ọma ka m tinyejuo ya nri.+
11 Ma ndị m egeghị m ntị.
Izrel ekweghị erubere m isi.+
12 M wee hapụ ha ka ha mewe ihe obi ha kpọrọ nkụ chọrọ.
Ha mere ihe ha chere dị mma.+
13 A sị nnọọ na ndị m ga-ege m ntị,+
A sị nnọọ na Izrel ga-erubere m isi,+
14 M ga-emeri ndị iro ha n’egbughị oge.
M ga-alụso ndị iro ha ọgụ.+
15 Ndị kpọrọ Jehova asị ga-ama jijiji n’ihu ya,
A ga-ebibikwa ha ruo mgbe ebighị ebi.
16 Ma ọ ga na-enye gị* ọka wit kacha mma,+
Ọ ga na-enyekwa gị mmanụ aṅụ si n’oké nkume ruo mgbe afọ juru gị.”+
Abụ Esaf.+
82 Chineke eguzorola n’etiti ndị bụ́ chi.+
Ọ na-ekpe ikpe n’etiti chi dị iche iche,* na-asị:+
3 Kpechitenụ ọnụ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na nwa na-enweghị nna.+
Kpeenụ ogbenye na onye na-enweghị onye na-enyere ya aka ikpe ziri ezi.+
4 Napụtanụ ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya.
Zọpụtanụ ha n’aka ndị ajọ omume.”
5 Ha* amaghị ihe, ha anaghịkwa aghọta ihe.+
Ha na-ejegharị n’ọchịchịrị.
A naghị ekpe ikpe ziri ezi n’ụwa, e nweghịkwa ihe e ji iwu kpọrọ.*+
Unu niile bụ ụmụ Onye Kacha Elu.
7 Ma unu ga-anwụ otú ndị ọzọ si anwụ.+
Unu ga-adakwa otú ndị ọzọ bụ́ ndị isi si ada.’”+
Abụ Esaf.+ Abụ ọma.
83 Chineke, biko, agbala nkịtị.+
Chineke, biko, anọla jụụ,* anọkwala na-ele n’anya n’anya.
2 Lee, ndị iro gị na-eme mkpọtụ.+
Ndị kpọrọ gị asị na-ama gị aka.*
3 Ha ji aghụghọ na-agbara ndị gị izu.
Ha na-akpara ndị ị hụrụ n’anya* nkata ọjọọ.
4 Ha na-asị: “Bịanụ ka anyị kpochapụ ha ka ha ghara ịbụkwa mba,+
Ka a gharazie icheta aha Izrel ọzọ.”
5 Ha na-eji otu obi agba izu ihe ha ga-eme.
Ha na-akwado ụmụ Lọt.+ (Sila)
Ha ghọrọ nri ala.
11 Mee ndị a ma ama n’obodo ha ihe i mere Oreb na Zieb,+
Meekwa ndị isi* ha ihe i mere Ziba na Zalmọna,+
12 N’ihi na ha sịrị: “Ka anyị weghara ala ebe Chineke bi.”
13 Chineke m, biko, mee ka ha dị ka ahịhịa ogwu ifufe na-ebugharị,+
Ka ha dị ka ahịhịa ọka ifufe na-ebugharị.
14 Otú ahụ ọkụ si agba oké ọhịa,
Ire ọkụ ana-erekwa ugwu,+
15 Si otú ahụ jiri oké ifufe gị chụọ ha ọsọ,+
Jirikwa oké ifufe gị yie ha egwu.+
16 Jehova, biko, mee ka ihere ju ha ihu,
Ka ha wee chọọ aha gị.
17 Biko, ka e menye ha ihere, ka ụjọ na-atụkwa ha ruo mgbe ebighị ebi.
Ka e mechuo ha ihu ma laa ha n’iyi.
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ; nke ụda Gitit.* Abụ ụmụ Kora.+ Abụ ọma.
Ọ gụkatala m ike agwụ m.
Eji m obi m niile na ike m niile na-eti mkpu ọṅụ n’ihu Chineke dị ndụ.
3 Jehova nke ụsụụ ndị agha,
Eze m na Chineke m,
Nnụnụ na-ahụdị ebe ha ga-ebi n’akụkụ nnukwu ebe ịchụàjà gị.
Elekentịọba kpakwara akwụ́ ya n’ebe ahụ,
Bụ́ ebe ọ na-elekọta ụmụ ya.
4 Ndị bi n’ụlọ gị na-enwe obi ụtọ.+
Ha ga na-eto gị.+ (Sila)
Mmiri ozuzo mbụ na-agọzikwa ala ahụ.*
7 Ha ga na-aga ebe ha na-aga, ma ike agaghị agwụ ha.+
Onye ọ bụla n’ime ha na-abịa n’ihu Chineke n’ime Zayọn.
8 Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, biko, nụrụ ekpere m.
Chineke Jekọb, biko, ṅaa m ntị. (Sila)
10 N’ihi na ịnọ otu ụbọchị n’ogige ụlọ gị dị mma karịa ịnọ otu puku ụbọchị n’ebe ọ bụla ọzọ.+
Ọ kaara m mma iguzo ọtọ na-eje ozi* n’ọnụ ụzọ ụlọ Chineke m
Kama ibi n’ụlọikwuu ndị ajọ omume.
11 N’ihi na Jehova Chineke bụ anyanwụ anyị+ na ọta anyị.+
Ọ na-emere ndị mmadụ amara, na-emekwa ka a na-akwanyere ha ùgwù.
Jehova agaghị ajụ inye
Ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta ihe ọ bụla dị mma.+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ụmụ Kora.+
85 Jehova, i meerela ala gị amara.+
Ị kpọghachitere ụmụ Jekọb a dọọrọ n’agha.+
2 Ị gbagharala ndị gị ihe ọjọọ ha mere.
Ị gbaghaara ha* mmehie ha niile.+ (Sila)
3 Ị kwụsịrị iwesa ha oké iwe.
I mere ka iwe gị dị ọkụ dajụọ.+
5 Ị̀ ga na-ewesa anyị oké iwe ruo mgbe ebighị ebi?+
Ị̀ ga na-ewesa anyị iwe si n’ọgbọ ruo n’ọgbọ?
8 M ga-ege ntị n’ihe ezi Chineke bụ́ Jehova na-ekwu,
N’ihi na ọ ga-agwa ndị ya, bụ́ ndị jisiri ya aka ike, na udo ga-adịrị ha,+
Ma ka ha ghara ịtụkwasị onwe ha obi ọzọ.+
10 Ịhụnanya* na eziokwu ga-ezute.
Ezi omume na udo ga-esusu ọnụ.+
11 Eziokwu ga-adị ebe niile ka à ga-asị na o si n’ala na-epupụta.
Ezi omume Chineke ga-enwu ka ìhè nke na-esi n’eluigwe enwu.*+
Ekpere Devid.
2 Chebe ndụ* m, n’ihi na m na-erubere gị isi.+
Zọpụta ohu gị, onye tụkwasịrị gị obi,
N’ihi na ị bụ Chineke m.+
5 N’ihi na gịnwa bụ́ Jehova dị mma,+ dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.+
Ịhụnanya ị na-egosi ndị niile na-akpọku gị dị ukwuu.+
6 Jehova, biko, gee ntị n’ekpere m.
Ṅaakwa ntị n’arịrịọ m na-arịọ ka i nyere m aka.+
8 Jehova, e nweghị chi dị ka gị n’ime chi niile.+
E nweghị onye rụtụrụla ọrụ ndị ị rụrụ.+
10 N’ihi na ị bụ onye ukwu, ị na-emekwa ihe ndị dị ebube.+
Ọ bụ naanị gị bụ Chineke.+
11 Jehova, biko, kụziere m ụzọ gị.+
M ga-eje ije n’ezigbo ụzọ gị.+
Mee ka m jiri obi m niile* na-atụ egwu aha gị.+
12 Jehova Chineke m, m ji obi m niile na-eto gị,+
M ga-etokwa aha gị ruo mgbe ebighị ebi,
13 N’ihi na ịhụnanya i nwere n’ebe m nọ dị ukwuu,
14 Chineke, ndị dị mpako na-alụso m ọgụ.+
15 Ma Jehova, ị bụ Chineke nwere ọmịiko* ma na-eme ebere.
Ị naghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ịhụnanya gị dị ukwuu, ị bụkwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.*+
16 Chee ihu n’ebe m nọ ma meere m amara.+
Nye ohu gị ike gị,+
Zọpụtakwa nwa ohu gị nwaanyị.
17 Mee ka ndị kpọrọ m asị hụ ihe ọma ndị ị na-emere m,
Ka ihere wee mee ha.
N’ihi na Jehova, ọ bụ gị na-enyere m aka, na-akasikwa m obi.
Abụ ụmụ Kora.+ Abụ ọma.
87 Chineke tọrọ ntọala obodo ya n’ugwu dị nsọ.+
3 Gị obodo ezi Chineke,+ a na-ekwu ọtụtụ ihe dị ịtụnanya banyere gị. (Sila)
4 M ga-agụnye ndị bi na Rehab+ nakwa na Babịlọn ná ndị ma m.
A ga-ekwu gbasara ndị Filistia, ndị Taya ma ọ bụ ndị Kush,
Sị: “A mụrụ onye a n’ebe ahụ.”
5 A ga-ekwukwa banyere Zayọn, sị:
“A mụrụ onye nke ọ bụla n’ime ha na ya.”
Onye Kacha Elu ga-emekwa ka Zayọn kwụsie ike.
6 Mgbe Jehova ga na-edeba aha ndị dị iche iche n’akwụkwọ, ọ ga-ekwu, sị:
“A mụrụ onye a n’ebe ahụ.” (Sila)
7 Ndị na-agụ egwú+ nakwa ndị na-agba egwú a na-agba gburugburu gburugburu+ ga-asị:
“Ihe ọma niile na-abịara anyị si n’aka gị.”+
Abụ ụmụ Kora.+ Abụ ọma. Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda Mehalat* kpọọ ya. A ga na-ekwe ya ekwe ma a bụwa ya. Maskil* nke Himan+ onye Zira.
N’abalị, m na-ebere ákwá bịa n’ihu gị.+
2 Ka ekpere m na-ekpe ruo gị ntị.+
Gee ntị* n’ákwá m na-ebe ka i nyere m aka.+
4 A gụnyela m ná ndị na-agbada n’olulu.*+
Adịzi m ka onye na-enweghị onye na-enyere ya aka,*+
5 Nke tọgbọ n’ebe ndị nwụrụ anwụ tọgbọ
Otú ndị e gburu egbu si atọgbọrọ n’ili,
Bụ́ ndị ị na-anaghịzi echeta,
Ndị ị na-anaghịzi elekọta.
7 Oké iwe ị na-ewesa m dị m ka ì bunyere m ibu na-anyịgbu m.+
Ihe ndị ị na-eme m dị m ka à ga-asị na nnukwu ebili mmiri na-erikpu m. (Sila)
8 Ị chụpụla ndị mụ na ha dị ná mma, ha anọrọzie m n’ebe dị anya.+
I meela ka ha kpọọ m asị.
Ọnyà amala m, enweghịkwa m ike ịgbapụ.
9 Ahụhụ m na-ata emeela ka anya m gharazie ịna-ahụcha ụzọ.+
Jehova, m na-akpọku gị malite n’ụtụtụ ruo n’abalị.+
M gbasara aka m na-arịọ gị arịrịọ.
10 Ọ̀ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị ga-arụrụ ọrụ ebube?
Ndị nwụrụ anwụ hà ga-ebili too gị?+ (Sila)
11 Ọ̀ bụ n’ili ka a ga-akọsa ịhụnanya gị?
Ọ̀ bụ n’ebe ndị mmadụ na-anọ erekasị* ka a ga-akọsa na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi?
12 Ọ̀ bụ n’ọchịchịrị ka a ga-amata ihe ndị dị ebube ị na-eme,
Ka ọ̀ bụ n’ala ndị e chefuru echefu ka a ga-amata ezi omume ị na-eme?+
13 Ma, Jehova, m ka na-ebesara gị ákwá ka i nyere m aka.+
Kwa ụtụtụ, m na-ekpe ekpere, rịọ gị arịrịọ.+
14 Jehova, gịnị mere i ji jụ m?*+
Gịnị mere na ị naghị enyere m aka?*+
Ahụ́ afọghịzi m maka na ị hapụrụ m ka m na-atagbu onwe m n’ahụhụ.
16 Iwe dị ọkụ ị na-ewesa m ezuola m ahụ́.+
Oké ụjọ ị na-emenye m na-ala m n’iyi.
17 Ọ na-agba m gburugburu ka mmiri malite n’ụtụtụ ruo n’abalị.
Ọ na-esi n’akụkụ niile agba m gburugburu.*
18 Ị chụpụla ndị enyi m na ndị mụ na ha dị ná mma, ha anọrọzie m n’ebe dị anya.+
Ọ bụzi mụ na ọchịchịrị na-anọ.
89 M ga-abụ abụ banyere otú Jehova si egosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi.
M ga-eji ọnụ m kọsaara ọgbọ niile na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.
2 N’ihi na m sịrị: “Ịhụnanya gị* ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.+
I meekwala ka o doo anya n’eluigwe na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.”
3 Ị sịrị: “Mụ na onye m họọrọ agbaala ndụ.+
M ṅụọrọla ohu m Devid iyi,+ sị:
4 ‘M ga-eme ka nwa* gị+ nọruo mgbe ebighị ebi,
M ga-emekwa ka ocheeze gị dịrị n’ọgbọ niile.’”+ (Sila)
5 Jehova, eluigwe na-eto gị maka ọrụ ndị dị ịtụnanya ị na-arụ.
N’eziokwu, ha na-eto gị n’ọgbakọ ndị nsọ maka na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.
6 N’ihi na ònye ka a ga-eji tụnyere Jehova n’eluigwe?+
N’ime ụmụ Chineke,+ è nwere onye dị ka Jehova?
7 Ìgwè* ndị nsọ na-atụ egwu Chineke.+
Ọ dị ukwuu, ndị niile gbara ya gburugburu na-atụkwa egwu ya.+
Ị na-egosi n’ihe niile na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
9 Ị na-achị oké osimiri nke na-enugharị n’ike n’ike.+
Mgbe ebili mmiri ya na-amali elu, ị na-eme ka ọ dajụọ.+
10 I meriela Rehab+ ma gbuo ya.+
I jirila nnukwu ike* gị chụsasịa ndị iro gị.+
11 Ọ bụ gị nwe eluigwe, ụwa bụkwa nke gị.+
Ọ bụ gị kere ala na ihe niile juru na ya.+
12 Ọ bụ gị kere ebe ugwu na ebe ndịda.
Ugwu Tebọ+ na Ugwu Hemọn+ ji ọṅụ na-eto aha gị.
Aka gị siri ike.+
Aka nri gị dị elu.+
14 I ji ezi omume na ikpe ziri ezi tọọ ntọala ocheeze gị.+
Ịhụnanya* na eziokwu dị n’ihu gị.+
15 Ndị na-eji ọṅụ eto gị na-enwe obi ụtọ.+
Jehova, ị na-emere ha amara.*
16 Ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihi aha gị malite n’ụtụtụ ruo n’abalị,
Ezi omume gị na-emekwa ka e bulie ha elu.
18 N’ihi na ọ bụ Jehova nwe ọta anyị.
Ọ bụ Onye Nsọ Izrel nwe eze anyị.+
19 N’oge ahụ, ị gwara ndị jisiri gị aka ike okwu n’ọhụụ, sị:
“Emeela m ka dike sie ike.+
Emeela m ka onye m si n’etiti ndị mmadụ họrọ dị elu.+
Ejirila m mmanụ m dị nsọ tee ya mmanụ.+
24 M ga-egosi ya na m bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi, gosikwa ya na m hụrụ ya n’anya,+
A ga-emekwa ka o nwekwuo ike* n’ihi aha m.
28 Agaghị m akwụsị ịhụ ya n’anya ruo mgbe ebighị ebi,+
E nweghịkwa ihe ga-emebi ọgbụgba ndụ mụ na ya.+
29 M ga-eme ka nwa* ya nọruo mgbe ebighị ebi,
Meekwa ka ocheeze ya dịruo mgbe ebighị ebi ka eluigwe.+
30 Ọ bụrụ na ụmụ ya ahapụ iwu m,
Ọ bụrụkwa na ha esoghị ndụmọdụ m,*
31 Ọ bụrụ na ha eleghara ntụziaka m anya,
Gharakwa idebe iwu m,
32 M ga-apịa ha ụtarị iji taa ha ahụhụ maka na ha nupụrụ isi,+
M ga-apịakwa ha ihe maka mmehie ha.
35 Ebe ọ bụ na m dị nsọ, e nwere otu ihe m ṅụrụ n’iyi.
Agaghị m aghara Devid ụgha.+
36 Nwa* ya ga-anọru mgbe ebighị ebi.+
Ocheeze ya ga-adị n’ihu m ruo mgbe ebighị ebi ka anyanwụ.+
37 A ga-eme ka ocheeze ya dịruo mgbe ebighị ebi
Otú ọnwa si apụta mgbe niile na mbara igwe ka onye akaebe a tụkwasịrị obi.” (Sila)
38 Ma, ị chụpụla onye i tere mmanụ, jụkwa ya.+
I wesala ya oké iwe.
39 E nweghịzi ihe i ji ndụ gị na ohu gị gbara kpọrọ.
I merụọla okpueze ya maka na ị tụrụ ya n’ala.
40 Ị kwatuola mgbidi ya niile e ji nkume rụọ.*
I bibisịala ebe niile ọ rụsiri ike.
41 Ndị niile na-agafe agafe akwakọrọla ihe ya.
Ndị agbata obi ya na-akparị ya.+
42 I meela ka ndị kpọrọ ya asị merie ya.*+
I meela ka ndị iro ya niile ṅụrịa ọṅụ.
43 I meela ka mma agha ya ghara ịba uru ọ bụla,
I meekwala ka ọ ghara imeri n’agha.
44 I meela ka a gharazie ịna-akwanyere ya ùgwù.
Ị kwatuola ocheeze ya.
45 I meela ka ọ kaa nká ngwa ngwa.
I meela ka ihere ju ya ihu. (Sila)
46 Jehova, olee mgbe ị ga-akwụsị izoro anyị onwe gị? Ị̀ ga na-ezo onwe gị ruo mgbe ebighị ebi?+
Ị̀ ka ga na-ewesa anyị iwe gị nke na-ere ka ọkụ?
47 Cheta na mmadụ anaghị adịte ndụ aka.+
Ọ̀ bụ n’efu ka i kere mmadụ niile?
48 È nwere mmadụ dị ndụ nke na-agaghị anwụ anwụ?+
Ọ̀ ga-azọpụtali onwe ya* ka ọ ghara ịbanye n’ili?* (Sila)
49 Jehova, olee ebe ọrụ ịhụnanya gị ndị ị rụrụ n’oge gara aga dị,
Nke ị ṅụụrụ Devid n’iyi maka na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi?+
50 Jehova, biko, cheta mkparị a na-akparị ndị ohu gị.
Cheta otú m si na-edi mkparị mmadụ niile na-akparị m.
51 Jehova, biko, cheta otú ndị iro gị si na-ekwutọ onye i tere mmanụ,
Otú ha si na-akatọ ihe ọ bụla o mere.
52 Ka e too Jehova ruo mgbe ebighị ebi. Amen na Amen.+
AKWỤKWỌ NKE ANỌ
(Abụ Ọma 90-106)
Ekpere Mosis, onye nke ezi Chineke, kpere.+
90 Jehova, ị bụ ebe mgbaba anyị*+ si n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.
3 Ị na-eme ka mmadụ efu laghachi n’ájá.
Ị na-asị: “Ụmụ mmadụ, laghachinụ n’ájá.”+
4 N’ihi na n’anya gị, otu puku afọ gara aga dị ka ụnyaahụ.+
Ọ dị ka awa ole na ole n’abalị.*
5 Ị na-ekpochapụ ha,+ e chefuo ha ka nrọ a rọrọ n’abalị.
N’ụtụtụ, ha na-adị ka ahịhịa ndụ pupụtara epupụta.+
6 Ha na-awa okooko n’ụtụtụ, maakwa pokopoko.
Ma ná mgbede, ha na-achanwụ, kpọnwụọkwa.+
8 Ị na-edowe mmehie anyị n’ihu gị.*+
Ị na-ahụ ihe niile anyị na-eme na nzuzo.+
9 Ndụ* anyị na-agwụ n’ike n’ike n’ihi iwe ị na-ewesa anyị.
Afọ ndụ anyị na-agwụ ọsọ ọsọ ka ebe mmadụ zere ume.*
Ma ihe juru n’afọ ndị a bụ nsogbu na ahụhụ.
Ha na-agwụ ngwa ngwa, nke anyị agaa.+
11 Ònye ga-aghọtali otú iwe gị nwere ike ịdịru ọkụ?
Ọ bụ otú egwu e kwesịrị ịna-atụ gị si dị ukwuu ka iwe gị sikwa dị ukwuu.+
13 Jehova, biko, lọghachi.+ Olee mgbe ihe a ga-ebi?+
Meere ndị ohu gị ebere.+
14 Mee ka ịhụnanya gị*+ zuo anyị ahụ́ n’ụtụtụ,
Ka anyị wee na-eti mkpu ọṅụ ma na-enwe obi ụtọ+ n’oge niile anyị dị ndụ.
15 Mee ka ụbọchị ole anyị ga-aṅụrị ọṅụ hara ka ụbọchị ole i mesiri anyị ike,+
Ka ọ dịkwa ọtụtụ ka afọ ole ọdachi dakwasịrị anyị.+
17 Ka Jehova bụ́ Chineke anyị meere anyị amara.
Mee ka ihe ndị anyị na-eme gaziere anyị.
Biko, mee ka ihe ndị anyị na-eme gaziere anyị.+
2 M ga-asị Jehova: “Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m a rụsiri ike.+
Ị bụ Chineke m, onye m tụkwasịrị obi.”+
3 N’ihi na Chineke ga-anapụta gị n’ọnyà nke onye na-achụ nta nnụnụ siri,
Napụtakwa gị n’ajọ ọrịa na-efe efe.
Eziokwu ya+ ga na-echebe gị otú nnukwu ọta+ na mgbidi siri ike si echebe mmadụ.
5 Ị gaghị atụ ihe ọ bụla egwu n’abalị,+
Ị gaghịkwa atụ akụ́ a gbapụrụ n’ehihie egwu,+
6 Ị gaghịkwa atụ egwu ọrịa nke na-efe ndị mmadụ n’abalị
Ma ọ bụ ihe na-egbu ndị mmadụ n’etiti ehihie.
7 Otu puku mmadụ ga-ada n’akụkụ gị,
Puku mmadụ iri ga-adakwa n’aka nri gị,
Ma ihe ọjọọ ndị a agaghị eme gị.+
9 Ebe ọ bụ na ị sịrị: “Jehova bụ ebe mgbaba m.”
I jirila Onye Kacha Elu mere ebe gị a rụsiri ike;*+
10 E nweghị ọdachi ga-adakwasị gị,+
E nweghịkwa ihe ọjọọ ga-abịa nso n’ụlọikwuu gị.
13 Ị ga-azọ ọdụm na agwọ ubí ụkwụ.
Ị ga-azọpịa nnukwu ọdụm na nnukwu agwọ.+
14 Chineke sịrị: “Ebe ọ bụ na ọ hụrụ m n’anya, m ga-anapụta ya.+
M ga-echebe ya maka na ọ ma aha m.+
15 Ọ ga-akpọ m, m ga-azakwa ya.+
M ga-anọnyere ya n’oge ọ na-ata ahụhụ.+
M ga-anapụta ya ma mee ka ọ dị ebube.
Abụ a na-abụ n’Ụbọchị Izu Ike. Abụ ọma.
2 Ọ dị mma ka a kọsaa ịhụnanya gị*+ n’ụtụtụ
Nakwa ka a kọsaa n’abalị na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.
4 N’ihi na, Jehova, i meela ka m ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe ndị ị na-eme.
M na-eti mkpu ọṅụ n’ihi ihe ndị ị na-arụ.
5 Jehova, ọrụ gị dị nnọọ ebube.+
Ị ma ihe nke ukwuu.+
6 Mmadụ ọ bụla nke na-anaghị eche echiche enweghị ike ịmata ha.
E nweghịkwa onye nzuzu nwere ike ịghọta ihe a:+
7 Mgbe ndị ajọ omume na-eju ebe niile otú ahịhịa si epu ebe niile,
Ihe ana-agazikwara ndị niile na-eme ihe ọjọọ,
Ọ bụ ka e wee laa ha n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.+
8 Ma ọ bụ gị, Jehova, kacha elu ruo mgbe ebighị ebi.
9 Jehova, lee ndị iro gị anya chịa ha ọchị mgbe a na-emeri ha.
Legodị otú a ga-esi laa ndị iro gị n’iyi.
A ga-achụsasị ndị niile na-eme ihe ọjọọ.+
10 Ma ị ga-eme ka m sie ike* ka atụ́.
M ga-ete mmanụ ọhụrụ n’ahụ́.+
11 M ga na-ele ndị iro m anya na-achị ha ọchị mgbe a na-emeri ha.+
M ga-eji ntị m nụ na e meriela ndị ọjọọ na-alụso m ọgụ.
12 Ma onye ezi omume ga na-ama pokopoko ka nkwụ.
Ọ ga na-agba agba ka osisi sida dị na Lebanọn.+
13 Ha dị ka osisi a kụrụ n’ụlọ Jehova.
Ha ga na-eme nke ọma n’ogige ụlọ Chineke anyị.+
14 Ha megodị agadi,* ha ka ga na-eme nke ọma.+
Ahụ́ ka ga-esi ha ike, ha ga na-amakwa pokopoko.+
15 Ha ga na-akọsa na Jehova bụ onye ezi omume.
Ọ bụ ya bụ Oké Nkume m,+ ọ naghịkwa eme ihe ọjọọ.
O yi ebube ka uwe.
Jehova yi ike ka uwe.
Ọ na-eke ya otú e si eke ájị̀.
E kesiri ụwa* ike.
A gaghị ebupụli ya ebupụ.*
2 Ọ bụ gị na-achị* kemgbe oge dị anya gara aga.+
Ị dị adị kemgbe ebighị ebi.+
3 Jehova, osimiri enugharịala,
Osimiri enugharịala ma mee mkpọtụ.
Osimiri na-enugharị, na-adakwa oké ụda.
4 Ma Jehova dị ebube n’eluigwe
Karịa mkpọtụ ọtụtụ mmiri na-eme,+
Karịakwa nnukwu ebili mmiri niile nke oké osimiri.+
5 E kwesịrị nnọọ ịtụkwasị ihe ị na-echetara ndị gị obi.+
Jehova, ụlọ gị mara mma, ọ na-adịkwa nsọ*+ mgbe niile.
Kwụọ ndị mpako ụgwọ ihe ha mere.+
3 Jehova, olee mgbe ndị ajọ omume ga-akwụsị ịṅụrị ọṅụ?
Olee mgbe ha ga-akwụsị ịṅụrị ọṅụ?+
4 Ha na-ekwu ekwurekwu, na-etukwa ọnụ.
Ndị niile na-eme ihe ọjọọ na-eto onwe ha.
6 Ha na-egbu nwaanyị di ya nwụrụ na onye mbịarambịa,
Ha na-egbukwa ụmụ na-enweghị nna.
7 Ha na-asị: “Jaa anaghị ahụ ihe na-eme.+
Chineke Jekọb amaghị ihe na-eme.”+
8 Unu ndị na-anaghị eche echiche, ghọtanụ ihe a.
Unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-ama ihe?+
9 Ọ̀ bụ na Onye kere ntị enweghị ike ịnụ ihe?
Ọ̀ bụ na Onye kere anya enweghị ike ịhụ ụzọ?+
10 Ọ̀ bụ na Onye na-adọ mba dị iche iche aka ná ntị enweghị ike ịbara unu mba?+
Ọ bụ ya na-akụziri ndị mmadụ ihe ka ha mara ihe.+
11 Jehova ma ihe ndị mmadụ na-eche.
Ọ ma na ihe ha na-eche bụ naanị ume e kupụrụ ekupụ.+
12 Jaa, onye ị na-adọ aka ná ntị na-enwe obi ụtọ,+
Ya bụ, onye i ji iwu gị akụziri ihe,+
13 Ka i wee mee ka obi ruo ya ala n’oge ọdachi dakwasịrị ya,
Ruo mgbe a ga-egwuru onye ajọ omume olulu.+
15 N’ihi na a ga-amalitekwa ikpe ikpe ziri ezi,
Ndị niile obi ha dị ọcha ga na-emekwa ihe e kpebiri.
16 Ònye ga-anapụta m n’aka ndị ajọ omume?
Ònye ga-enyere m aka ka m merie ndị na-eme ihe ọjọọ?
20 Gị na ndị ọchịchị,* bụ́ ndị na-arụrụ aka, ùnu ga na-emekọ ihe
Mgbe ha na-akpa nkata ka ha jiri iwu kpata nsogbu?+
22 Ma Jehova ga-abụrụ m ebe m ga-agbaba, aka aghara ịkpa m.
Chineke m bụ oké nkume m na-agbaba.+
23 Ọ ga-eme ka ha jiri isi ha buru ihe ọjọọ ha metara.+
Ọ ga-eme ka ihe ọjọọ ha na-eme bibie ha.
Jehova bụ́ Chineke anyị ga-ebibi ha.+
95 Bịanụ ka anyị tie mkpu ọṅụ n’ihu Jehova.
Ka anyị tie mkpu ọṅụ ma too Oké Nkume na-azọpụta anyị.+
2 Ka anyị bịa n’ihu ya kelee ya.+
Ka anyị tie mkpu ọṅụ ma bụkuo ya abụ otuto.
3 N’ihi na Jehova bụ Chineke ukwu.
Ọ bụ Eze kacha chi ọzọ niile.+
4 Ebe ndị kacha mie emie n’ụwa dị ya n’aka.
Ọ bụkwa ya nwe elu elu ugwu niile.+
5 Ọ bụ ya kere oké osimiri, ọ bụkwa ya nwe ya.+
O ji aka ya kee ala nkịtị.+
6 Bịanụ ka anyị fee ya ma kpọọrọ ya isiala.
Ka anyị gbuo ikpere n’ala n’ihu Jehova bụ́ Onye kere anyị.+
Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya,+
8 Unu akpọchila obi unu otú nna nna unu hà mere na Meriba,*+
Ha mara m aka n’agbanyeghị na ha hụrụ ihe ndị m mere.+
10 M kpọrọ ọgbọ ahụ asị ruo afọ iri anọ, m sịkwara:
“Ha bụ ndị isi ike, ndị na-eme naanị ihe dị ha n’obi.
Ha amatabeghị m.”
11 M wee jiri iwe ṅụọ iyi, sị:
“Ha agaghị eso m zuo ike.”+
Ndị niile bi n’ụwa, bụkuonụ Jehova abụ.+
2 Bụkuonụ Jehova abụ. Toonụ aha ya.
Kwa ụbọchị, na-ekwusanụ ozi ọma banyere otú o si azọpụta ndị mmadụ.+
4 Jehova bụ onye ukwu, onye ọ bụla kwesịkwara ịna-eto ya.
E kwesịrị ịna-atụ egwu ya karịa chi ọ bụla ọzọ.
5 Chi ọzọ niile ndị mmadụ na-efe abaghị uru.+
Ma, ọ bụ Jehova kere eluigwe.+
6 Ebube na ịma mma gbara ya gburugburu.+
Ike na ịma mma dị n’ebe nsọ ya.+
7 Ezinụlọ dị iche iche, toonụ Jehova.
Toonụ Jehova n’ihi na ọ dị ebube, dịkwa ike.+
Jirinụ onyinye bata n’ogige ụlọ ya.
9 Yirinụ ọmarịcha uwe dị nsọ kpọọrọ Jehova isiala.*
Ndị niile bi n’ụwa, maanụ jijiji n’ihu ya.
10 Kọsaanụ ná mba dị iche iche, sị: “Jehova abụrụla Eze.+
E kesiri ụwa* ike. A gaghị ebupụli ya ebupụ.*
Ọ ga-ekpe mba dị iche iche ikpe ziri ezi.”*+
11 Ka eluigwe ṅụrịa ọṅụ, ka ụwa nweekwa aṅụrị.
Ka oké osimiri na ihe niile dị n’ime ya mee mkpọtụ.+
12 Ka ọhịa na ihe niile dị n’ime ya ṅụrịa ọṅụ.+
Ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe.
Ọ ga-ekpe ụwa* ikpe ziri ezi,+
Ọ ga-ekpekwa mba dị iche iche ikpe otú gosiri na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
Ka ụwa ṅụrịa ọṅụ.+
Ka agwaetiti niile ṅụrịa ọṅụ.+
2 Ígwé ojii na oké ọchịchịrị gbara ya gburugburu.+
O ji ezi omume na ikpe ziri ezi tọọ ntọala ocheeze ya.+
4 Àmụ̀mà ya na-eme ka ìhè nwuo n’ụwa.
Ụwa na-ahụ ya wee maa jijiji.+
Chi niile, kpọọrọnụ Chineke isiala.*+
8 Jehova, Zayọn na-anụ ihe i kpebiri wee ṅụrịa ọṅụ.+
Obodo ndị dị na Juda na-enwe obi ụtọ
N’ihi ihe i kpebiri.+
9 N’ihi na Jehova, ọ bụ gị bụ Onye Kacha Elu n’ụwa niile.
Ị dị ezigbo elu karịa chi niile ọzọ.+
10 Unu ndị hụrụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.+
Ọ na-eche ndị* na-erubere ya isi nche.+
Ọ na-anapụta ha n’aka ndị ajọ omume.+
Abụ.
O jirila aka ya siri ike,* ya bụ, ogwe aka ya dị nsọ, zọpụta ndị ya.*+
2 Jehova emeela ka a mara na ọ bụ onye nzọpụta.+
O meela ka mba dị iche iche mara na ọ bụ onye ezi omume.+
3 O chetala nkwa o kwere na ọ ga-egosi na ọ hụrụ ụlọ Izrel n’anya, gosikwa ha na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
Ndị niile bi n’ụwa ahụla otú Chineke anyị si zọpụta ndị ya.*+
4 Ndị niile bi n’ụwa, tienụ mkpu ọṅụ, tookwanụ Jehova.
Nweenụ obi ụtọ, tienụ mkpu ọṅụ, bụọkwanụ abụ otuto.+
5 Jirinụ ụbọ akwara bụkuo Jehova abụ otuto.
Kpọọrọnụ ya ụbọ akwara, bụọkwaranụ ya abụ na-atọ ụtọ.
8 Ka osimiri kụọ aka.
99 Jehova abụrụla Eze.+ Ka ndị dị iche iche maa jijiji.
Ọ nọ n’ocheeze dị n’elu* ndị cherob.+ Ka ụwa maa jijiji.
4 Chineke bụ nnukwu eze nke ikpe ziri ezi na-amasị.+
I meela ka a mata ihe bụ́ ihe ziri ezi.
I meela ka a na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume+ na Jekọb.
5 Toonụ Jehova Chineke+ anyị, kpọọkwanụ isiala n’ihu ya.*+
Ọ dị nsọ.+
Ha kpọkuru Jehova,
Ọ zakwara ha.+
7 O si n’ogidi ígwé ojii gwa ha okwu.+
Ha echefughị ihe ndị o chetaara ha, ha debekwara iwu ndị o nyere ha.+
8 Jehova Chineke anyị, ị zara ha.+
Abụ ekele.
100 Unu niile ndị bi n’ụwa, toonụ Jehova, tiekwanụ mkpu ọṅụ.+
Tirinụ mkpu ọṅụ bịa n’ihu ya.
3 Maranụ* na Jehova bụ Chineke.+
Ọ bụ ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị.*+
Anyị bụ ndị ya, bụrụkwa ìgwè atụrụ ọ na-enye nri.+
4 Batanụ n’ọnụ ụzọ ámá ụlọ ya kelee ya.+
Batanụ n’ogige ụlọ ya too ya.+
Keleenụ ya. Toonụ aha ya.+
Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi,
Ọ bụkwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi n’ọgbọ niile.+
Abụ Devid.
101 M ga-abụ abụ banyere ịhụnanya Chineke nakwa otú o si ekpe ikpe ziri ezi.
Jehova, m ga-abụku gị abụ otuto.
2 M ga-akpa àgwà otú gosiri na m ma ihe nakwa na m bụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.
Olee mgbe ị ga-enyere m aka?
M ga-eji obi m niile na-erubere gị isi+ n’ime ụlọ m.
3 Agaghị m edowe ihe ọ bụla na-abaghị uru n’ihu m.
M kpọrọ omume ndị na-akwụsị ime ihe dị mma asị.+
E nweghị ihe jikọrọ mụ na ha.
4 Anaghị m aga onye aghụghọ* nso.
Agaghị m anabata* ihe ọjọọ.
Agaghị m agbachi
Onye ọ bụla dị mpako na onye na-ebuli onwe ya elu nkịtị.
6 M ga-emere ndị na-erube isi n’ụwa amara,
Ka ha wee binyere m.
Onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta* ga-ejere m ozi.
7 E nweghị onye aghụghọ ga-ebi n’ụlọ m,
E nweghịkwa onye na-agha ụgha ga-eguzo n’ihu m.
8 Kwa ụtụtụ, m ga na-emechi ọnụ* ndị ajọ omume niile nọ n’ụwa,
Ka m wee si n’obodo Jehova kpochapụ ndị niile na-eme ihe ọjọọ.+
Ekpere onye a na-emegbu emegbu kpere mgbe ọ na-ata ahụhụ.* N’ekpere a, ọ kọọrọ Jehova ihe niile na-echegbu ya.+
102 Jehova, biko, nụrụ ekpere m.+
Nụrụ ákwá m na-ebe ka i nyere m aka.+
2 Ezorola m ihu gị n’oge m nọ ná nsogbu.+
Gee m ntị.*
Biko, za m ozugbo m kpọrọ gị.+
3 N’ihi na ndụ m na-agwụ n’ike n’ike ka ebe anwụrụ ọkụ na-ekusasị.
Ọkpụkpụ m na-ere m ọkụ ka à ga-asị na a kwanyere ya ọkụ.+
6 M yiri okwolo nke nọ n’ala ịkpa.
Adị m ka obere ikwiikwii nke nọ n’ebe dakpọsịrị adakpọsị.
7 Edina m ala, ma ụra ekweghị atụ m.*
Adị m ka nnụnụ nke nọ naanị ya n’elu ụlọ.+
8 Ndị iro m na-akparị m mgbe niile.+
Ndị na-akwa m emo na-eji aha m abụ ndị mmadụ ọnụ.
9 M na-aracha ntụ ka à ga-asị na ọ bụ nri.+
Anya mmiri m na-ataba n’ihe m na-aṅụ,+
10 N’ihi iwe gị na ọnụma gị,
N’ihi na i buliri m elu ka ị tụfuo m.
Oge a kara aka eruola.+
15 Mba dị iche iche ga-atụ egwu aha Jehova,
Ndị niile bụ́ eze n’ụwa ga-atụkwa egwu gị maka na ị dị ebube.+
16 N’ihi na Jehova ga-arụghachi Zayọn.+
Ọ ga-egosi na ya dị ebube.+
17 Ọ ga-ege ntị n’ekpere ndị ogbenye.+
Ọ gaghị eleghara ekpere ha anya.+
19 N’ihi na ọ na-esi n’ebe dị elu ọ nọ, bụ́ ebe dị nsọ, eledata anya.+
Jehova na-esi n’eluigwe ele anya n’ụwa,
20 Ka o wee nụrụ ude ndị a tụrụ mkpọrọ na-asụ,+
Ka ọ napụta ndị a mara ikpe ọnwụ,+
21 Ka e wee kọsaa aha Jehova n’ime Zayọn,+
Ka e tookwa ya na Jeruselem
22 Mgbe ndị dị iche iche na alaeze dị iche iche
23 O mere ka ike gwụ m mgbe m na-akabeghị nká.
O mere ka ndụ m na-agbada n’ike n’ike.
26 Ha ga-ala n’iyi, ma ị ga na-adị ndụ.
Ha niile ga-aka nká ka uwe.
Ị ga-agbanwe ha otú e si agbanwe ákwà, nke ha agaa.
27 Ma ị ka bụ onye ị bụ, e nweghịkwa mgbe ị ga-akwụsị ịdị ndụ.+
Abụ Devid.
Ka ihe niile dị n’ime m too aha nsọ ya.
Ka a ghara inwe mgbe m ga-echefu ihe niile o mere.+
4 Ọ na-azọ gị ndụ ka ị ghara ịbanye n’olulu.*+
O kpuwere gị ịhụnanya ya na ebere ya+ ka okpueze.
5 Ọ na-emere gị ọtụtụ ihe ọma+ n’oge niile ị dị ndụ,
Ka i wee bụrụ okorobịa ahụ́ na-adịghachi ọhụrụ ka ahụ́ ugo.+
8 Jehova nwere ọmịiko* ma na-eme ebere.+
Ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ịhụnanya ya dịkwa ukwuu.+
10 Ọ naghị emeso anyị ihe otú anyị si emehie,+
Ọ naghịkwa akwụ anyị ụgwọ otú ihe ọjọọ anyị na-eme hà.+
11 N’ihi na otú a na-enweghị ike ịtụ ihe eluigwe ji dị elu karịa ụwa atụ̀
Ka a na-enweghị ike ịtụ ịhụnanya* ọ na-egosi ndị na-atụ egwu ya.+
12 Otú ọwụwa anyanwụ si dị ezigbo anya n’ọdịda anyanwụ
Bụkwa otú o wepụrụ mmehie anyị ka ọ dị ezigbo anya n’ebe anyị nọ.+
14 N’ihi na ọ ma nnọọ otú e si kee anyị.+
Ọ na-echeta na anyị bụ ájá.+
15 Ndụ mmadụ efu dị ka nke ahịhịa ndụ.+
Mmadụ na-ama mma otú okooko osisi dị n’ọhịa si ama mma.+
16 Ma mgbe ifufe fere, a naghịzi ahụ ya,
Ya adịzie ka à ga-asị na e nwetụbeghị mgbe ọ dị.
Ọ na-emere ụmụ ụmụ ha ihe ọma,+
18 Na-emere ndị na-anaghị emebi ọgbụgba ndụ ha na ya+
Nakwa ndị na-elezi anya na-edebe iwu ya ihe ọma.
19 Jehova emeela ka ọchịchị* ya kwụsie ike n’eluigwe.+
Ọ na-achị ihe niile.+
20 Unu niile bụ́ ndị mmụọ ozi+ Jehova, ndị siri ezigbo ike,
Ndị na-erubere ya isi+ ma na-eme ihe o kwuru, toonụ ya.
22 Ka ihe niile Jehova kere too ya
N’ebe niile ọ na-achị.
Ka m jiri obi m niile too Jehova.
Jehova Chineke m, ị bụ nnọọ onye ukwu.+
I yi ebube na ùgwù ka uwe.+
2 I ji ìhè kpuchie onwe gị+ ka ákwà.
Ị na-agbasa eluigwe ka ákwà ụlọikwuu.+
3 Ọ bụ na mmiri dị n’elu* ka ọ rụkwasịrị ụlọ ya ndị dị n’elu.+
Ọ na-eji ígwé ojii emere ụgbọ ịnyịnya.+
Ọ na-agagharị n’elu ifufe.+
A gaghị ebupụli ya ebupụ* ruo mgbe niile ebighị ebi.+
6 I ji oké osimiri kpuchie ya ka ákwà.+
Mmiri tochiri ugwu dị iche iche.
7 Ị bara mba, ha asọghachi azụ.+
Mgbe ha nụrụ ụda égbè eluigwe gị, ha tụrụ ụjọ sọghachi azụ
8 N’ebe ị tọrọ ntọala ka ha dịrị.
Ugwu wee dịrị,+ ndagwurugwu adịrịkwa.
10 Ọ na-eme ka iyi dịrị na ndagwurugwu.
Ha na-asọ n’agbata ugwu dị iche iche.
11 Ọ bụ mmiri si na ha ka anụ ọhịa na-aṅụ.
Jakị ọhịa na-aṅụ ya ma mmiri gụwa ha.
12 Nnụnụ na-akpa akwụ́ n’elu osisi ndị dị n’akụkụ mmiri ndị ahụ.
Ha na-anọ n’alaka ha akwụkwọ juru na-ebe ubé.
13 Ọ na-esi n’ụlọ ya ndị dị n’elu agba ugwu dị iche iche mmiri.+
Ihe ndị ị na-emepụta na-ezuru ụwa.+
14 Ọ na-eme ka ahịhịa na-epuru anụmanụ,
Na-enyekwa ndị mmadụ ihe ha ga-akụ,+
Ka ha wee si n’ala na-enweta ihe oriri
15 Na mmanya nke na-eme ka obi tọọ mmadụ ụtọ,+
Mmanụ nke na-eme ka ihu mmadụ na-egbuke egbuke,
Nakwa nri nke na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ.+
16 Osisi Jehova kụrụ na-enweta mmiri na-ezuru ya,
Ya bụ, osisi sida ndị dị na Lebanọn,
17 Bụ́ ebe nnụnụ na-akpa akwụ́ ha.
Ụgbala ọcha*+ na-ebi n’osisi junipa.
18 Ewu ọhịa na-anọ n’ugwu ndị dị elu.+
Ewi nkume na-ezo ná nnukwu nkume.+
19 O kere ọnwa ka e jiri ya na-amata oge dị iche iche.
Anyanwụ ma oge o kwesịrị ịda.+
20 Ị na-eme ka ọchịchịrị gbaa, chi ejie.+
Ọ bụ mgbe ahụ ka anụ ọhịa niile na-akpagharị.
21 Ọdụm na-agbọ ụja mgbe ha na-achọ anụ ha ga-eri.+
Ha na-achọ nri Chineke ga-enye ha.+
22 Mgbe anyanwụ pụtara,
Ha na-alaghachi gaa makpuru n’ebe ha na-ebi.
23 Mmadụ na-apụ gawa ọrụ ya,
Ọ na-arụgidekwa ọrụ ruo mgbede.
24 Jehova, ọrụ ị rụrụ dị nnọọ ọtụtụ.+
I ji amamihe rụọ ha niile.+
Ihe ndị i kere eke juru n’ụwa.
25 Oké osimiri buru ezigbo ibu ma saa mbara.
Imirikitiimi ihe ndị dị ndụ, ma ndị ukwu ma ndị nta, juru n’ime ha.+
26 Ụgbọ mmiri na-aga na ha.
Nnukwu anụ mmiri,*+ nke i kere ka ọ na-egwuri egwu n’ime ha, na-agakwa na ha.
28 Ihe ị na-enye ha ka ha na-eri.+
Ọ bụrụ na ị saghee aka gị, ha na-enweta ihe ọma na-ezuru ha.+
29 Ọ bụrụ na i wepụ ihu gị, obi anaghị ezu ha ike.
Ọ bụrụ na i mee ka ha kwụsị iku ume,* ha na-anwụ laghachi n’ájá.+
30 Ọ bụrụ na i zipụ mmụọ nsọ gị, a na-eke ha.+
Ị na-emekwa ka ala dị ọhụrụ.
31 Jehova ga na-adị ebube ruo mgbe ebighị ebi.
Jehova ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ọrụ ya.+
32 O lee ụwa anya, ụwa amaa jijiji.
O metụ ugwu dị iche iche aka, ha akwụọ anwụrụ ọkụ.+
33 M ga-abụku Jehova abụ+ n’oge niile m dị ndụ.
M ga-abụku Chineke m abụ otuto n’oge niile m dị ndụ.+
34 Ka ihe m na-eche n’echiche dị ya mma.*
M ga na-aṅụrị ọṅụ n’ihi Jehova.
35 A ga-ekpochapụ ndị mmehie n’ụwa.
Ndị ajọ omume agaghịzi anọ.+
105 Keleenụ Jehova,+ kpọkuonụ aha ya.
Kọọrọnụ mba dị iche iche ihe ndị ọ na-eme.+
2 Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto.
Chebaranụ ọrụ niile dị ebube ọ na-arụ echiche.*+
3 Jirinụ aha nsọ ya na-eme ọnụ.+
Ka obi ndị na-achọ Jehova ṅụrịa ọṅụ.+
4 Chọọnụ Jehova,+ rịọkwanụ ya ka o nye unu ike.
Na-arịọnụ ya mgbe niile ka o meere unu amara.
5 Chetanụ ihe ndị dị ebube o mere,
Ọrụ ebube ndị ọ rụrụ nakwa ikpe ndị o kpere,+
6 Unu ụmụ* Ebreham bụ́ ohu ya,+
Unu ụmụ Jekọb, bụ́ ndị ọ họọrọ.+
7 Ọ bụ ya bụ Jehova Chineke anyị.+
Ọ na-ekpe ụwa niile ikpe.+
8 Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.+
Ọ na-echeta nkwa o kwere* ruo otu puku ọgbọ.+
10 Ọ ṅụrụ iyi ahụ iji mee ka obi sie Jekọb ike
Nakwa ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ ga-adịte aka ya na Izrel gbara.
12 Ha dị ole na ole mgbe ahụ.+
N’eziokwu, ha ehighị nne, ha bụkwa ndị mbịarambịa.+
16 O kwuru ka ụnwụ daa n’ala ahụ.+
O mebiri ebe ha na-edosa achịcha.*
E kere ya agbụ ígwè n’olu.
20 Eze ziri ozi ka a tọhapụ ya.+
Onye na-achị ndị dị iche iche tọhapụrụ ya.
21 O mere ya onyeisi n’ezinụlọ ya,
Onye na-elekọta ihe niile o nwere,+
22 Ka o wee chịwa ndị eze mere ndị isi otú masịrị ya
Nakwa ka ọ kụziere ndị okenye ya ihe.+
Jekọb wee bụrụ onye mbịarambịa n’ala Ham.
24 Chineke mere ka ndị ya mụọ ọtụtụ ụmụ.+
O mere ka ha dị ike karịa ndị iro ha.+
28 Chineke mere ka ala ha gbaa ọchịchịrị.+
Ha* enupụrụghị ya isi.
33 O bibiri osisi vaịn ha na osisi fig ha,
Kụjisiekwa osisi ndị dị n’ala ha.
35 Ha richapụrụ ahịhịa ndụ niile dị n’ala ahụ,
Ha richapụkwara ihe niile ala ha mepụtara.
37 O mere ka ndị ya jiri ọlaọcha na ọlaedo pụta.+
E nweghịkwa onye ọ bụla n’ebo ya ike gwụrụ.*
40 Ha rịọrọ ya anụ, ya ezitere ha nnụnụ kwel.+
O nyere ha achịcha si n’eluigwe, ha erie rijuo afọ.+
41 O meghere nnukwu nkume, mmiri agbapụtawa.+
Mmiri a nọ na-asọ n’ọzara ka à ga-asị na ọ bụ osimiri.+
42 N’ihi na o chetara nkwa dị nsọ o kwere Ebreham ohu ya.+
44 O nyere ha ala ndị mba ọzọ.+
Toonụ Jaa!*
Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma.+
Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+
4 Jehova, biko, cheta m mgbe ị na-emere ndị gị amara.+
Lekọta m ma zọpụta m,
5 Ka ihe ọma ị na-emere ndị ị họọrọ wee baara m uru,+
Ka m wee soro mba gị ṅụrịa ọṅụ,
Ka m wee jiri obi ụtọ soro ndị i ketara too gị.
6 Anyị emehiela otú nna nna anyị hà mehiere.+
Anyị emeela ihe ọjọọ. Anyị akpaala àgwà ọjọọ.+
7 Nna nna anyị hà ejighị ọrụ ndị dị ebube ị rụrụ n’Ijipt kpọrọ ihe.*
Ha echetaghị ịhụnanya gị nke dị ukwuu,
Kama ha nupụrụ isi n’oké osimiri, n’Oké Osimiri Uhie.+
9 Ọ baara Oké Osimiri Uhie mba, ya ataa.
O duuru ha si n’ala ala osimiri ahụ gafere ka à ga-asị na ọ bụ ala ịkpa.*+
11 Mmiri kpuchiri ndị iro ha.
E nweghị otu onye n’ime ha fọrọ.+
12 Ha nweziri okwukwe ná nkwa o kwere.+
Ha malitere ịbụ abụ, na-eto ya.+
13 Ma ha chefuru ihe ndị o mere ngwa ngwa.+
Ha echereghị ka o nye ha ntụziaka.
14 Kama ha nwewere akpịrị ogologo n’ala ịkpa.+
Ha nwara Chineke n’ọzara.+
15 O nyere ha ihe ha rịọrọ,
Ma o mere ka ha malite ịrịa ọrịa ọjọọ nke mere ka ike na-agwụ ha* ma mechaa gbuo ha.+
16 Ha nweere Mosis anyaụfụ n’ebe ha mara ụlọikwuu.
Ha nwekwaara Erọn,+ bụ́ onye nsọ Jehova,+ anyaụfụ.
18 Ọkụ rere ìgwè mmadụ ahụ.
Ọkụ regburu ndị ọjọọ ahụ.+
21 Ha chefuru Chineke,+ Onye Nzọpụta ha,
Onye mere ihe ndị dị ịtụnanya n’Ijipt,+
22 Onye rụrụ ọrụ ndị dị ebube n’ala Ham,+
Meekwa ihe ndị dị egwu n’Oké Osimiri Uhie.+
23 Ọ fọrọ obere ka o nye iwu ka e kpochapụ ha.
Ma Mosis, onye ọ họọrọ, rịọrọ ya arịrịọ
Ka ọnụma ya dajụọ.+
24 Ha wee gosi na e nweghị ihe ha ji ọmarịcha ala ahụ kpọrọ.+
Ha enweghị okwukwe ná nkwa ya.+
25 Ha nọ na-atamu ntamu n’ụlọikwuu ha.+
Ha egeghị ntị n’olu Jehova.+
29 Àgwà ha kpasuru Chineke iwe.+
Ọrịa ọjọọ wee malite ịrịa ha.+
32 Ha kpasuru Chineke iwe na mmiri Meriba.*
Mosis wee banye ná nsogbu n’ihi ha.+
35 Kama ha na ndị mba ọzọ nọ na-emekọ ihe.+
38 Ha nọ na-egbu* ndị aka ha dị ọcha,+
Ya bụ, ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị,
Ndị ha ji chụọrọ arụsị dị iche iche ndị Kenan na-efe àjà.+
Ọbara ndị ha gburu wee merụọ ala ahụ.
39 Ihe ndị ha na-eme mere ka ha gharazie ịdị ọcha.
Ha kpara àgwà ka ndị akwụna, hapụ Chineke fewe chi ọzọ.+
40 Jehova wee wesa ndị ya iwe dị ọkụ,
Ọ kpọkwara ndị o ketara asị.
42 Ndị iro ha megburu ha,
Chịakwa ha.
43 Ọ napụtara ha ọtụtụ ugboro.+
45 O ji maka ha na-echeta ndụ ya na ha gbara,
Ọ na-emetekwara ha ebere n’ihi ịhụnanya ya nke dị ukwuu.+
47 Jehova Chineke anyị, biko, zọpụta anyị.+
Ka mmadụ niile sịkwa, “Amen!”*
Toonụ Jaa!*
AKWỤKWỌ NKE ISE
(Abụ Ọma 107-150)
107 Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma.+
Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+
O si ma n’ebe ọwụwa anyanwụ ma n’ebe ọdịda anyanwụ,
Ma n’ebe ugwu ma n’ebe ndịda kpọkọta ha.+
4 Ha wagharịrị n’ala ịkpa, n’ọzara.
Ha ahụghị ụzọ ha ga-esi gaa n’obodo ha ga-ebi.
5 Agụụ gụrụ ha, mmiri gụkwara ha.
Ezigbo ike gwụrụ ha.*
6 Ha nọ na-ebesara Jehova ákwá mgbe ha na-ata ahụhụ.+
Ọ napụtara ha ná nsogbu ha nọ na ya.+
9 N’ihi na o nyela ndị mmiri na-agụ mmiri.
O jirikwala ihe ọma dị iche iche nyejuo ndị* agụụ na-agụ afọ.+
10 Ụfọdụ bibu n’oké ọchịchịrị,
Bụ́ ndị mkpọrọ a na-emekpa ahụ́, ndị a tụkwara ịga.
11 N’ihi na ha nupụrụ isi n’ihe Chineke kwuru.
Ha ledara ndụmọdụ Onye Kacha Elu anya.+
12 N’ihi ya, o mere ka ihe siere ha ike ka ha wee dị umeala n’obi.+
Ha dara, e nweghịkwa onye nyeere ha aka.
13 Ha kpọkuru Jehova ka o nyere ha aka mgbe ha na-ata ahụhụ.
Ọ napụtara ha ná nsogbu ha nọ na ya.
18 E nweghịzi nri ọ bụla na-agụ ha agụụ.
Ọ fọrọ obere ka ha nwụọ.
19 Ha na-akpọku Jehova ka o nyere ha aka mgbe ha na-ata ahụhụ.
Ọ na-anapụtakwa ha ná nsogbu ha nọ na ya.
20 Ọ na-enye iwu, e wee gwọọ ha.+
Ọ na-anapụtakwa ha n’olulu ebe e ji ha.
23 Ndị ji ụgbọ mmiri aga n’oké osimiri,
Ndị na-azụ ahịa n’elu nnukwu mmiri,+
24 Ha ahụla ọrụ Jehova
Nakwa ihe ndị dị ebube o kere n’oké osimiri,+
25 Otú okwu o kwuru si eme ka oké ifufe malite ife,+
Meekwa ka e nwee ebili mmiri n’oké osimiri.
26 Ebili mmiri na-ebugoru ha na mbara igwe.
Ọ na-atụbakwa ha n’ala ala osimiri.
Obi na-alọ ha mmiri n’ihi ọdachi chọrọ ịdakwasị ha.
27 Ha na-aṅagharị, na-adagharịkwa ka ndị mmanya na-egbu,
E nweghịzi uru ihe niile ha ma gbasara ịkwọ ụgbọ bara.+
29 Ọ na-eme ka oké ifufe kwụsị ife.
Ebili mmiri na-adajụ.+
30 Ha na-aṅụrị ọṅụ mgbe ihe niile a dara jụụ,
Ọ na-edurukwa ha gaa n’ebe ha bu n’obi ịkwụsị ụgbọ ha.
33 Ọ na-eme ka osimiri ghọọ ọzara,
Ọ na-eme ka isi mmiri ghọọ ala kpọrọ nkụ,+
34 Ọ na-emekwa ka ala nke na-eme nri ghọọ ala nnu nke na-abaghịzi uru,+
N’ihi ihe ọjọọ nke ndị bi na ya na-eme.
38 Ọ na-agọzi ha, ha adịzie nnọọ ọtụtụ.
Ọ naghị ekwe ka anụ ụlọ ha dị ole na ole.+
39 Ma n’ihi mmegbu a na-emegbu ha na ọdachi na-adakwasị ha na uju ha na-eru,
Ha na-adị ole na ole ọzọ, a na-emechukwa ha ihu.
42 Ndị ezi omume na-ahụ ihe ndị a ṅụrịa ọṅụ.+
Ma a ga-emechi ọnụ ndị ajọ omume niile.+
Abụ Devid. Abụ ọma.
108 Chineke, obi siri m ike.
M ga-eji obi m niile kpọọrọ gị egwú, bụọkwara gị abụ otuto.+
2 Ụbọ akwara, teta. Tetakwa, gị une.+
M ga-ebili n’isi ụtụtụ.
3 Jehova, m ga-anọ n’ihu ndị obodo dị iche iche too gị.
M ga-abụku gị abụ otuto ná mba dị iche iche.
4 N’ihi na ịhụnanya gị* dị ukwuu nke na ọ na-eru n’eluigwe,+
Ị bụkwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe niile.*
5 Chineke, ka a jaa gị mma n’eluigwe.
Ka e too gị n’ụwa niile.+
7 Chineke, Onye dị nsọ, ekwuola,* sị:
“M ga-aṅụrị ọṅụ. M ga-ewere Shikem+ nye ndị m chọrọ ka ọ bụrụ ihe ha ketara.
M ga-atụkwa Ndagwurugwu Sọkọt+ atụ̀ nye ndị m chọrọ.
8 Ọ bụ m nwe Gilied,+ ọ bụkwa m nwe Manase.
Ifrem bụ okpu m na-ekpu n’isi.+
Juda bụ mkpara na-egosi ikike m nwere.+
9 Moab bụ efere m ji asa ihe.+
M ga-atụba akpụkpọ ụkwụ m n’Ịdọm.+
M ga-eti mkpu ọṅụ maka na m ga-emeri Filistia.”+
10 Ònye ga-eduru m gaa n’obodo a rụsiri ike?
Ònye ga-edu m ruo n’Ịdọm?+
11 Chineke, ọ́ bụghị gị, onye jụrụ anyị,
Chineke anyị, onye na-anaghịzi anọnyere ndị agha anyị ma ha gaa agha?+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
109 Chineke, onye m na-eto,+ biko, agbachizila nkịtị.
2 N’ihi na onye ajọ omume na onye aghụghọ na-akatọ m.
Ha na-ekwu okwu ụgha banyere m.+
3 Ha na-agba m gburugburu, na-agwa m okwu ọjọọ.
Ha na-alụsokwa m ọgụ n’enweghị ihe m mere ha.+
4 Ha na-emegide m n’agbanyeghị na m hụrụ ha n’anya.+
Ma, m ka na-ekpe ekpere.
6 Mee ka onye ajọ omume chịwa onye iro m.*
Ka onye ga-emegide ya* guzoro n’aka nri ya.
7 Ka ikpe ma ya mgbe a na-ekpe ya ikpe.
Ka e were ekpere ọ na-ekpe ka ihe ọjọọ.+
Ka onye ọzọ rụwa ọrụ* ọ na-arụbu.+
9 Ka ụmụ ya bụrụ ụmụ na-enweghị nna,
Ka nwunye ya bụrụkwa nwaanyị di ya nwụrụ.
10 Ka ụmụ ya na-akpagharị na-arịọ arịrịọ,
Ka ha si n’ụlọ ha dakpọsịrị adakpọsị gaa na-achọgharị ihe ha ga-eri.
11 Ka onye o ji ụgwọ bukọrọ ihe niile o nwere,
Ka ndị ala ọzọ kwakọrọ ngwongwo ya.
12 Ka a ghara inwe onye ga-emere ya ihe ọma,
Ka a gharakwa inwe onye ga-emere ụmụ ya, bụ́ ụmụ na-enweghị nna, amara.
Ka a ghara icheta aha ha n’ọgbọ na-abịa abịa.
15 Ka Jehova na-echeta ihe ha mere mgbe niile.
Ka e chefuokwa aha ha n’ụwa.+
16 N’ihi na o chetaghị imere ndị ọzọ ihe ọma,+
Kama ọ nọ na-achụ ogbenye a na-emegbu emegbu,+ nke obi gbawara,
Ka o gbuo ya.+
17 A bụrụ ya ọnụ maka na ọ na-atọ ya ụtọ ịbụ ndị ọzọ ọnụ.
A gọzighị ya maka na ọ naghị achọ ịgọzi ndị ọzọ.
18 Ọnụ a bụrụ ya zuru ya ahụ́ otú uwe si ekpuchi mmadụ ahụ́.
Ọ banyere ya n’ahụ́ otú mmiri si abanye mmadụ n’ahụ́,
Banyekwa ya n’ọkpụkpụ ka mmanụ.
19 Ka ọnụ a bụrụ ya zuo ya ahụ́ otú uwe ya si ekpuchi ya ahụ́,+
Ka ọ dịkwa ka ájị̀ ọ na-eke mgbe niile.
Napụta m n’ihi na ịhụnanya gị* dị mma.+
23 Ndụ m na-agbada n’ike n’ike ka onyinyo ji nwayọọ nwayọọ apụ mgbe anwụ na-ada.
E fechapụla m otú e si efechapụ igurube.
24 Ikpere na-amazi m jijiji n’ihi ọnụ m na-ebu.
Ataala m ahụ́, ike na-agwụkwa m.
Ha hụ m, ha ana-efufe isi.+
26 Jehova Chineke m, biko, nyere m aka.
Zọpụta m n’ihi ịhụnanya gị.*
27 Ka ha mara na ihe a si n’aka gị,
Na ọ bụ gịnwa, bụ́ Jehova, mere ya.
28 Ha ga-abụ m ọnụ, ma ị ga-agọzi m.
Ka e menye ha ihere mgbe ha ga-ebili ka ha mesie m ike,
Ma ka ohu gị ṅụrịa ọṅụ.
29 Ka e mechuo ndị na-emegide m ihu.
Ka ihere jukwa ha ihu ka à ga-asị na e ji uwe kpuchie ha.+
30 M ga-eji ọnụ m too Jehova nke ukwuu.
M ga-anọ n’ihu ọtụtụ ndị too ya.+
Abụ Devid.
110 Jehova gwara Onyenwe m, sị:
2 Jehova ga-eme ka ọchịchị gị* si na Zayọn ruo n’ebe ndị ọzọ. Ọ sịrị:
“Gaa meriwe n’etiti ndị iro gị.”+
3 Ndị gị ga-eji obi ha wepụta onwe ha n’ụbọchị i du ndị agha gị na-eje agha.
Ìgwè ndị na-eto eto* na-akwado gị. Ha dị ka igirigi nke na-ada n’isi ụtụtụ.
Ha dị nsọ, maakwa mma n’anya.
4 Jehova aṅụọla iyi, ọ gaghịkwa agbanwe obi ya.* Ọ sịrị:
5 Jehova ga-anọ n’aka nri gị.+
Ọ ga-ebibi ndị eze n’ụbọchị iwe ya.+
6 Ọ ga-ekpe mba dị iche iche ikpe ma taa ha ahụhụ.+
Ọ ga-eme ka ozu ju n’ala ahụ niile.+
Ọ ga-ebibi onye na-achị* ala buru nnukwu ibu.*
7 Ọ* ga-aṅụ mmiri n’iyi dị n’ụzọ.
N’ihi ya, ọ ga-eweli isi ya elu.
א [Alef]
ג [Gimel]
2 Ọrụ niile Jehova na-arụ dị ukwuu.+
ד [Dalet]
Ndị niile ọrụ ya na-amasị na-amụ banyere ha.+
ה [Hee]
3 Ihe ndị ọ na-eme dị ebube, maakwa mma.
ו [Wọọ]
Ọ bụ onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.+
ז [Zayin]
4 Ọ na-eme ka a na-echeta ọrụ ndị dị ebube ọ na-arụ.+
ח [Het]
Jehova nwere ọmịiko* ma na-eme ebere.+
ט [Tet]
5 Ọ na-enye ndị na-atụ egwu ya nri.+
י [Yod]
Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.+
כ [Kaf]
6 O gosila ndị ya nnukwu ọrụ ndị ọ rụrụ.
מ [Mem]
7 Ọrụ aka ya na-egosi na ọ na-ekwu eziokwu, na-ekpekwa ikpe ziri ezi.+
נ [Nun]
A ga-atụkwasịli iwu ya niile obi.+
ס [Samek]
8 A ga-atụkwasịli ha obi mgbe niile, ma ugbu a ma ruo mgbe ebighị ebi.
ע [Ayin]
Onye nyere iwu ndị ahụ bụ onye ezi omume na onye eziokwu.+
פ [Pee]
צ [Sadee]
O nyere iwu ka ọgbụgba ndụ ya dịruo mgbe ebighị ebi.
ק [Kof]
Aha ya dị nsọ, bụrụkwa ihe e kwesịrị ịna-atụ egwu.+
ר [Resh]
10 Ihe na-egosi na mmadụ amatawala ihe bụ onye ahụ ịtụ egwu Jehova.+
ש [Sin]
Ndị niile na-edebe iwu ya* na-egosi na ha na-aghọta ihe nke ọma.+
ת [Tọọ]
A na-eto ya ruo mgbe ebighị ebi.
א [Alef]
ג [Gimel]
ה [Hee]
3 Akụnụba juru n’ụlọ ya.
ו [Wọọ]
Ọ ga na-eme ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.
ז [Zayin]
4 Ọ na-enwuru ndị obi ha dị ọcha ka ìhè nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị.+
ח [Het]
O nwere ọmịiko,* na-eme ebere,+ bụrụkwa onye ezi omume.
ט [Tet]
5 Ihe na-agaziri onye na-eji obi ya niile agbazinye ndị mmadụ ihe.+
י [Yod]
Ọ na-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile ọ na-eme.
כ [Kaf]
6 A gaghị eme ka ọ laa n’iyi.*+
ל [Lamed]
A ga na-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.+
מ [Mem]
7 Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ.+
נ [Nun]
Obi siri ya ike. Ọ tụkwasịrị Jehova obi.+
ס [Samek]
8 Obi anaghị amapụ ya. Ụjọ anaghị atụ ya.+
ע [Ayin]
N’ikpeazụ, ọ ga na-ele ndị iro ya anya na-achị ha ọchị mgbe a na-emeri ha.+
פ [Pee]
9 O kesaarala mmadụ niile ihe. O nyela ndị ogbenye ihe.+
צ [Sadee]
Ọ ga na-eme ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.+
ק [Kof]
A ga-eme ka o sikwuo ike, meekwa ka ọ dị ebube.
ר [Resh]
10 Onye ajọ omume ga-ahụ ya wee iwe.
ש [Shin]
Ọ ga-ata ikikere ezé wee laa n’iyi.
ת [Tọọ]
Ndị ajọ omume agaghị enweta ihe na-agụ ha.+
Unu ndị ohu Jehova, toonụ ya.
Toonụ aha Jehova.
2 Ka e too aha Jehova
Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.+
4 Jehova dị elu karịa mba niile.+
Ọ dị ebube karịa
eluigwe.+
6 Ọ na-ehulata ka o lee eluigwe na ụwa anya.+
7 Ọ na-esi n’ájá ekulite onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya.
Ọ na-esi n’ebe a na-ekpofu ntụ* ekulite ogbenye,+
8 Ka o wee mee ka o soro ndị a ma ama nọrọ,
Bụ́ ndị a ma ama ná ndị Chineke.
Toonụ Jaa!*
114 Mgbe Izrel si n’Ijipt pụta,+
Mgbe ezinụlọ Jekọb si n’obodo ndị na-asụ asụsụ ọzọ pụta,
2 Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke.
Izrel ghọrọ ala ọ na-achị.+
3 Oké osimiri hụrụ ya gbaa ọsọ.+
Osimiri Jọdan laghachiri azụ.+
4 Ugwu ukwu niile wụliri elu ka ebule.+
Ugwu nta niile wụliri elu ka ụmụ atụrụ.
5 Oké osimiri, gịnị mere i ji gbaa ọsọ?+
Osimiri Jọdan, gịnị mere i ji laghachi azụ?+
6 Ugwu ukwu, gịnị mere unu ji wụlie elu ka ebule?
Ugwu nta, gịnị mere unu ji wụlie elu ka ụmụ atụrụ?
7 Ụwa, maa jijiji n’ihi Onyenwe anyị,
N’ihi Chineke Jekọb,+
8 Onye na-eme ka oké nkume bụrụ ọdọ mmiri nke ahịhịa amị juru,
Onye na-eme ka oké nkume siri ike bụrụ isi mmiri.+
115 Jehova, ọ bụghị anyị ka e kwesịrị ito, ọ bụghị anyị,*
Kama ọ bụ aha gị ka e kwesịrị ịna-eto+
N’ihi ịhụnanya gị* nakwa n’ihi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
2 Gịnị mere ị ga-eji kwe ka mba dị iche iche sị:
“Olee ebe Chineke ha nọ?”+
3 Chineke anyị nọ n’eluigwe.
Ọ na-eme ihe ọ bụla dị ya mma.
4 E ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ arụsị ha na-efe.
Ọ bụ mmadụ kpụrụ ha.+
5 Ha nwere ọnụ, ma ha anaghị ekwu okwu.+
Ha nwere anya, ma ha anaghị ahụ ụzọ.
6 Ha nwere ntị, ma ha anaghị anụ ihe.
Ha nwere imi, ma ha anaghị anụ ísì.
7 Ha nwere aka, ma ha anaghị emetụ ihe aka.
Ha nwere ụkwụ, ma ha anaghị aga ije.+
Ha anaghị eji akpịrị ha eme mkpọtụ ọ bụla.+
9 Unu ndị Izrel, tụkwasịnụ Jehova obi.+
Ọ bụ ya na-enyere unu aka, bụrụkwa ọta unu.+
10 Ezinụlọ Erọn,+ tụkwasịnụ Jehova obi.
Ọ bụ ya na-enyere unu aka, bụrụkwa ọta unu.
11 Unu ndị na-atụ egwu Jehova, tụkwasịnụ Jehova obi.+
Ọ bụ ya na-enyere unu aka, bụrụkwa ọta unu.+
12 Jehova na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị.
Ọ ga-agọzi ezinụlọ Izrel.+
Ọ ga-agọzi ezinụlọ Erọn.
13 Ọ ga-agọzi ndị na-atụ egwu Jehova,
Ma ndị ukwu ma ndị nta.
17 Ndị nwụrụ anwụ anaghị eto Jaa.+
Onye ọ bụla nke na-agbada n’ili* anaghịkwa eto ya.+
18 Ma anyị ga na-eto Jaa
Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.
Toonụ Jaa!*
116 M hụrụ Jehova n’anya
Maka na ọ na-anụ olu m. Ọ na-anụ arịrịọ m na-arịọ ka o nyere m aka.+
3 Ọnwụ kere m ụdọ gburugburu.
Ọ dị m ka à ga-asị na ili* jichiri m.+
Nsogbu zuru m ahụ́, m nọkwa na-eru naanị uju.+
4 Ma m kpọkuru Jehova, kpọọ aha ya, sị:+
Chineke anyị na-eme ebere.+
6 Jehova na-echebe ndị na-amaghị ihe.+
E mere ka ike gwụ m, ma ọ zọpụtara m.
I mere ka m kwụsị ibe ákwá, meekwa ka m ghara ịkpọbi ụkwụ.+
9 M ga-adị ndụ na-efe Jehova.*
10 Ekwuru m okwu maka na m nwere okwukwe.+
E mekpara m ahụ́ nke ukwuu.
11 Ma ụjọ tụrụ m, mụ asị:
“Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”+
12 Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ
Maka ihe ọma niile o meere m?
14 M ga-emezu nkwa m kwere Jehova.
M ga-anọ n’ihu ndị ya niile mezuo ya.+
16 Jehova, m na-arịọ gị arịrịọ
N’ihi na abụ m ohu gị.
Abụ m ohu gị, nwa ohu gị nwaanyị.
Ị tọpụla m agbụ e kere m.+
M ga-akpọku aha Jehova.
18 M ga-emezu nkwa m kwere Jehova.+
2 N’ihi na ịhụnanya* ọ na-egosi anyị dị ukwuu.+
Jehova bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi+ ruo mgbe ebighị ebi.+
118 Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma.+
Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.
2 Ka ndị Izrel kwuo, sị:
“Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”
3 Ka ndị ezinụlọ Erọn kwuo, sị:
“Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”
4 Ka ndị na-atụ egwu Jehova kwuo, sị:
“Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”
5 M kpọkuru Jaa* n’oge m na-ata ahụhụ.
Jaa zara m wee kpọba m ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme m.*+
6 Jehova nọnyeere m. Agaghị m atụ egwu.+
Gịnị ka mmadụ ga-emeli m?+
7 Jehova nọnyeere m. Ọ bụ ya na-enyere m aka.*+
M ga na-ele ndị kpọrọ m asị anya na-achị ha ọchị mgbe a na-emeri ha.+
11 Ha gbara m gburugburu. N’eziokwu, ha gbara m nnọọ gburugburu.
Ma ọ bụ aha Jehova
Ka m ji chụọ ha ọsọ.
12 Ha gbara m gburugburu ka aṅụ,
Ma a lara ha n’iyi ngwa ngwa otú ọkụ si erechapụ osisi ogwu ngwa ngwa.
Ọ bụ aha Jehova
Ka m ji chụọ ha ọsọ.+
Aka nri Jehova na-akpa ike.+
16 Jehova weliri aka nri ya maka na o meriela.
Aka nri Jehova na-akpa ike.+
19 Megheerenụ m ọnụ ụzọ ámá ezi omume.+
M ga-esi na ya banye too Jaa.
20 Ọ bụ ọnụ ụzọ ámá Jehova.
Ndị ezi omume ga-esi na ya gafere.+
Ọ dị ebube n’anya anyị.+
24 Taa bụ ụbọchị Jehova wepụtara.
Anyị ga-aṅụrị ọṅụ, nweekwa obi ụtọ na ya.
25 Jehova, biko, anyị na-arịọ gị, zọpụta anyị.
Jehova, biko, mee ka anyị merie.
26 Onye na-abịa n’aha Jehova bụ onye a gọziri agọzi.+
Anyị si n’ụlọ Jehova na-agọzi unu.
27 Jehova bụ Chineke.
Ọ na-enye anyị ìhè.+
Jirinụ alaka osisi soro ndị na-eme ememme kwụrụ n’ahịrị.+
28 Ị bụ Chineke m. M ga-eto gị.
Chineke m, m ga-aja gị mma.+
29 Keleenụ Jehova+ n’ihi na ọ dị mma.
Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+
א [Alef]
3 Ha anaghị eme ajọ omume.
Ha na-eme ihe ọ chọrọ.+
7 M ga-eji obi dị ọcha na-eto gị
Mgbe m na-amụta ihe ndị dị mma i kpebiri.
8 M ga na-eso ntụziaka gị.
Biko, ahapụla m kpamkpam.
ב [Bet]
9 Olee otú nwa okorobịa ga-esi na-ebi ndụ dị mma?
Ọ bụ ịkpachara anya na-eme ihe i kwuru.+
10 Eji m obi m niile na-achọ gị.
Ekwela ka m hapụ iwu gị kpafuo.+
12 Jehova, ka e too gị.
Biko, kụziere m ihe i nyere n’iwu.*
13 Eji m ọnụ m na-akọsa
Ihe niile i kpebiri bụ́ ndị i kwupụtara.
14 Ana m aṅụrị ọṅụ maka ihe ndị ị na-echetara m+
Karịa ka m na-aṅụrị ọṅụ maka ihe ọ bụla ọzọ bara ezigbo uru.+
16 Iwu gị na-eme m obi ụtọ.
Agaghị m echefu okwu gị.+
ג [Gimel]
18 Meghee anya m, ka m na-ahụ
Ihe ndị dị ịtụnanya dị n’iwu gị nke ọma.
19 Adị m ka onye mbịarambịa n’ala a.+
Ezorola m iwu gị.
20 Ọ na-agụsi m agụụ ike mgbe niile
Ka m mara ihe ndị i kpebiri.
22 Mee ka a kwụsị ịkọcha m na ịkparị m,
N’ihi na m na-eme ihe ndị ị na-echetara m.
24 Ihe ndị ị na-echetara m na-eme m obi ụtọ.+
M weere ha ka ndị na-adụ m ọdụ.+
ד [Dalet]
Dowe m ndụ otú i kwuru.+
26 M gwara gị ihe ndị m chọrọ ime, i wee za m.
Kụziere m ihe i nyere n’iwu.*+
28 Uju m na-eru emeela ka m gharazie ịna-ehi ụra.
Mee ka m dị ike otú i kwere m ná nkwa.*
29 Ekwela ka m bụrụ onye aghụghọ.+
Meere m amara ma kụziere m iwu gị.
30 M kpebiela na m ga-abụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
M ghọtara na ihe ndị i kpebiri ziri ezi.
31 M ji ihe ndị ị na-echetara m kpọrọ ihe.+
Jehova, biko, ekwela ka ihere mee m.+
ה [Hee]
37 Nyere m aka ka m ghara ịna-ele ihe na-abaghị uru.+
Mee ka m na-eje ije n’ụzọ gị ka i wee dowe m ndụ.
39 Ụjọ na-atụ m na a ga-emechu m ihu, ma ekwela ka e mechuo m ihu
N’ihi na ihe ndị i kpebiri dị mma.+
40 Idebe iwu gị na-agụsi m agụụ ike.
Dowe m ndụ n’ihi na ị bụ onye ezi omume.
ו [Wọọ]
42 Mgbe ahụ, m ga-aza onye na-akparị m okwu,
N’ihi na m tụkwasịrị okwu gị obi.
47 Iwu gị na-eme m obi ụtọ.
N’eziokwu, m ji ha kpọrọ ihe.+
ז [Zayin]
51 Ndị mpako na-akparị m.
Ma anaghị m ahapụ iwu gị.+
56 M na-eme ihe a mgbe niile
Maka na m chọrọ ịna-erubere iwu gị isi.
ח [Het]
M kwela nkwa na m ga na-eme ihe i kwuru.+
58 Eji m obi m niile na-arịọ gị.+
Meere m amara+ otú i kwere m ná nkwa.*
60 M na-edebe iwu gị ngwa ngwa.+
Anaghị m egbu oge idebe ya.
64 Jehova, a na-ahụ ịhụnanya gị* n’ụwa niile.+
Kụziere m ihe i nyere n’iwu.*
ט [Tet]
67 Mgbe a na-atabeghị m ahụhụ, m nọ na-eme mmehie.*
Ma ugbu a, m na-eme ihe i kwuru.+
68 Ị dị mma,+ ihe ndị ị na-eme dịkwa mma.
Kụziere m ihe i nyere n’iwu.*+
69 Ndị mpako na-ekwu ihe na-abụghị eziokwu gbasara m,
Ma m ji obi m niile na-edebe iwu gị.
70 Ihe anaghị emetụ ha n’obi.+
Ma iwu gị na-eme m obi ụtọ.+
י [Yod]
73 Ọ bụ gị kere m ma kpụọ m.
Mee ka m na-aghọta ihe,
Ka m wee mụta iwu gị.+
75 Jehova, ama m na ihe ndị i kpebiri dị mma+
Nakwa na ị tara m ahụhụ maka na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
78 Ka e menye ndị dị mpako ihere,
N’ihi na ha na-eme m ihe ọjọọ n’enweghị ihe m mere ha.
Ma m ga-echebara iwu gị echiche.*+
79 Ka ndị na-atụ egwu gị lọghachikwute m,
Ya bụ, ndị ma iwu gị.
כ [Kaf]
84 Afọ ole ka ohu gị ga-echeru?
Olee mgbe ị ga-eme ndị na-akpagbu m ihe i kpebiri?+
85 Ndị mpako, bụ́ ndị na-anaghị edebe iwu gị,
Na-egwuru m olulu.
86 E kwesịrị ịtụkwasị iwu gị niile obi.
Ndị mmadụ na-akpagbu m n’enweghị ihe m mere ha. Nyere m aka.+
87 Ọ fọrọ obere ka ha laa m n’iyi,
Ma ahapụghị m iwu gị.
ל [Lamed]
90 Ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi n’ọgbọ niile.+
Ị tọsiri ntọala ụwa ike, ka o wee dịgide.+
95 Ndị ajọ omume na-eche m ka ha gbuo m,
Ma, m na-echebara ihe ndị ị na-echetara m echiche.
96 Ahụla m ọtụtụ ihe zuru okè,
Ma iwu gị kacha ha niile mma.
מ [Mem]
97 M ji iwu gị kpọrọ ihe nke ukwuu.+
M na-echebara ya echiche* kwa ụbọchị.+
100 Otú m si eme ihe na-egosi na m na-aghọta ihe karịa ndị okenye,
N’ihi na m na-edebe iwu gị.
102 Anaghị m ahapụ ime ihe i kpebiri,
N’ihi na ị kụzierela m ihe.
103 Okwu gị na-atọ m ụtọ n’ọnụ.
Ọ na-atọ m ụtọ karịa mmanụ aṅụ.+
104 Iwu gị na-eme ka m na-akpa àgwà otú gosiri na m na-aghọta ihe.+
Ọ bụ ya mere m ji kpọọ ụzọ ọjọọ ọ bụla asị.+
נ [Nun]
106 M ṅụọla iyi na m ga-eme ihe ndị dị mma i kpebiri,
M ga-emezukwa ya.
107 M tagbuola onwe m n’ahụhụ.+
Jehova, biko, dowe m ndụ otú i kwere m ná nkwa.*+
108 Jehova, biko, ka àjà otuto m ji obi m na-achụrụ gị mee gị obi ụtọ.+
Kụziekwara m ihe ndị i kpebiri.+
112 Ekpebiela m na m ga na-eso ntụziaka gị
Mgbe niile, sogide ya ruo n’isi.
ס [Samek]
Ekwela ka ihe m na-atụ anya ya ghara imezu.*+
117 Nyere m aka ka e wee zọpụta m.+
Mgbe ahụ, m ga na-echebara ntụziaka gị echiche mgbe niile.+
119 Ị na-awụfu ndị ajọ omume niile nọ n’ụwa otú e si awụfu irighiri ihe na-abaghị uru.*+
Ọ bụ ya mere m ji jiri ihe ndị ị na-echetara m kpọrọ ihe.
120 Ahụ́ na-ama m jijiji n’ihi ụjọ m na-atụ gị.
M na-atụ ihe ndị i kpebiri egwu.
ע [Ayin]
121 M kpeela ikpe ziri ezi, meekwa ezi omume.
Biko, ahapụla m ka ndị na-emegbu m nweta m.
122 Kwe ohu gị nkwa na ị ga-enyere ya aka.
Ekwela ka ndị mpako megbuo m.
128 N’ihi ya, m weere ntụziaka* ọ bụla ị na-enye m ka ihe dị mma.+
M kpọrọ ụzọ ọjọọ ọ bụla asị.+
פ [Pee]
129 Ihe ndị ị na-echetara m dị ezigbo mma.
Ọ bụ ya mere m ji na-eme ha.
130 Anya na-emepe mmadụ ma a kọwaa okwu gị.+
Ọ na-eme ka ndị na-amaghị ihe mara ihe.+
131 Ịnụ iwu gị na-agụ m agụụ.
Ọ na-agụsi m agụụ ike.+
133 Jiri okwu gị duzie m ka m ghara ịzọhie ụkwụ.*
Ekwela ka ihe ọjọọ ọ bụla na-achị m.+
134 Napụta m n’aka ndị na-emegbu mmadụ,
M ga-edebekwa iwu gị.
צ [Sadee]
138 Ihe ndị ị na-echetara m dị mma,
E kwesịkwara ịtụkwasị ha nnọọ obi.
141 E nweghị ihe m bụ, a na-eledakwa m anya.+
Ma echefubeghị m iwu gị.
143 Ọ bụ eziokwu na m na-ata ahụhụ, ihe ana-esikwara m ike,
Ma iwu gị ka na-eme m obi ụtọ.
144 Ihe ndị ị na-echetara m ziri ezi ruo mgbe ebighị ebi.
Mee m ka m na-aghọta ihe,+ ka m wee dịrị ndụ.
ק [Kof]
145 M ji obi m niile na-akpọ gị. Jehova, biko, za m.
M ga-eso ntụziaka gị.
146 M na-akpọ gị. Zọpụta m.
M ga-eme ihe ndị ị na-echetara m.
149 Gee m ntị n’ihi ịhụnanya gị.*+
Jehova, biko, dowe m ndụ maka na ị na-ekpe ikpe ziri ezi.
150 Ndị na-eme omume na-eme ihere na-abịa m nso.
Ha ajụla iwu gị.
ר [Resh]
154 Kpechite ọnụ m ma napụta m.+
Dowe m ndụ otú i kwere m ná nkwa.*
156 Jehova, ị na-eme ebere nke ukwuu.+
Dowe m ndụ maka na ị na-ekpe ikpe ziri ezi.
157 Ndị na-akpagbu m na ndị iro m dị ọtụtụ.+
Ma ahapụbeghị m ihe ndị ị na-echetara m.
159 Eji m iwu gị kpọrọ ihe.
Jehova, biko, dowe m ndụ n’ihi ịhụnanya gị.*+
160 Okwu gị niile bụ eziokwu.+
Ihe ndị dị mma i kpebiri na-adịru mgbe ebighị ebi.
ש [Sin] ma ọ bụ [Shin]
163 M kpọrọ okwu ụgha asị, m na-asọ ya oyi.+
Ma m ji iwu gị kpọrọ ihe.+
164 M na-eto gị ugboro asaa n’ụbọchị
N’ihi ihe ndị dị mma i kpebiri.
165 Udo na-adịrị ndị ji iwu gị kpọrọ ihe.*+
E nweghị ihe ga-eme ka ha daa.
166 Jehova, m na-atụ anya ka ị zọpụta m,
M na-edebekwa iwu gị.
ת [Tọọ]
169 Jehova, biko, nụrụ ákwá m na-ebe ka i nyere m aka.+
Jiri okwu gị mee ka m na-aghọta ihe.+
170 Nụrụ arịrịọ m na-arịọ ka i meere m amara.
Napụta m otú i kwere m ná nkwa.*
174 Jehova, m na-atụsi anya ike ka ị zọpụta m.
Iwu gị na-emekwa m obi ụtọ.+
175 Ka m dịrị ndụ ka m wee na-eto gị.+
Ka ihe ndị i kpebiri na-enyere m aka.
Abụ Mgbago.*
5 Efuola m n’ihi na m biela na Mishek ka onye mbịarambịa!+
M bi n’ụlọikwuu ndị Kida kemgbe.+
7 Achọrọ m udo, ma mgbe ọ bụla m kwuru okwu,
Ha na-ejikere ịlụso m agha.
Abụ Mgbago.
121 M lere anya n’ugwu dị iche iche,+ sị:
Olee onye ga-enyere m aka?
3 E nweghị mgbe ọ ga-ekwe ka ụkwụ gị mịchapụ.*+
E nweghị mgbe ụra ga-atụ Onye na-eche gị nche.
5 Jehova na-eche gị nche.
Jehova bụ ndò gị,+ ọ nọkwa n’aka nri gị.+
7 Jehova ga-eche gị nche ka ihe ọ bụla ghara ime gị.+
Abụ Mgbago. Abụ Devid.
122 Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sịrị m:
“Ka anyị gaa n’ụlọ Jehova.”+
6 Rịọnụ arịrịọ ka udo dị na Jeruselem.+
Obi ga-eru ndị ji gị* kpọrọ ihe ala.
7 Ka udo dị n’ime mgbidi gị niile siri ike.
Ka obi ruo ndị bi n’ụlọ elu gị ndị a rụsiri ike ala.
8 N’ihi ụmụnne m na ndị enyi m, m ga-asị:
“Ka udo dị n’ime gị.”
Abụ Mgbago.
2 Otú ahụ ndị na-eje ozi si ele nna ha ukwu anya n’aka,
Nwaanyị na-eje ozi ana-elekwa nne ya ukwu anya n’aka,
Otú ahụ ka anya anyị dị n’ebe Jehova Chineke anyị nọ+
Ruo mgbe ọ ga-emere anyị amara.+
4 Ndị onwe ha juru afọ na-akwa anyị emo mgbe niile,
Ndị mpako na-akparịkwa anyị.
Abụ Mgbago. Abụ Devid.
124 “A sị na ọ bụghị na Jehova nọnyeere anyị,”+
Ka ndị Izrel kwuo, sị,
2 “A sị na ọ bụghị na Jehova nọnyeere anyị+
Mgbe ndị mmadụ lụsoro anyị ọgụ,+
Mgbe ha na-ewesa anyị iwe dị ọkụ.+
4 Mmiri gaara eburu anyị.
5 Mmiri na-enugharị n’ike n’ike gaara erikpu anyị.*
6 Ka e too Jehova
N’ihi na o nyefeghị anyị n’aka ha ka ha jiri ezé tagbuo anyị ka anụ oriri.
E mebiri ọnyà ahụ,
Anyị wee gbapụ.+
Abụ Mgbago.
Dị ka Ugwu Zayọn, bụ́ ugwu a na-enweghị ike ime ka ọ maa jijiji,
Kama ọ ga-adịru mgbe ebighị ebi.+
2 Otú ahụ ugwu dị iche iche si gbaa Jeruselem gburugburu+
Ka Jehova si gbaa ndị ya gburugburu,+
Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.
3 Onye ajọ omume* agaghị anọ na-achị ndị ezi omume,+
Ka ndị ezi omume wee ghara ịgbanwe mewe ihe ọjọọ.+
5 Ma Jehova ga-ebibi ndị hapụrụ ụzọ dị mma soro ụzọ gbagọrọ agbagọ.
Ọ ga-ebibi ha na ndị na-eme ihe ọjọọ.+
Ka udo dịrị Izrel.
Abụ Mgbago.
N’oge ahụ, mba dị iche iche nọ na-asị:
“Jehova emeerela ha nnukwu ihe.”+
4 Jehova, biko, kpọlata ndị obodo anyị a dọọrọ n’agha
Otú mmiri ozuzo si asọba n’iyi ndị dị na Negeb.*
5 Ndị ji anya mmiri na-agha mkpụrụ
Ga-eji mkpu ọṅụ ghọrọ ihe mkpụrụ ha mepụtara.
Abụ Mgbago. Abụ Solomọn.
Ọ bụrụ na Jehova echeghị obodo,+
Ọ bụ n’efu ka onye nche na-amụ anya.
2 Ọ bụ n’efu ka unu na-ebili n’isi ụtụtụ.
Ọ bụ n’efu ka unu na-amụ anya abalị.
Ọ bụkwa n’efu ka unu na-arụgbu onwe unu n’ọrụ ka unu nweta ihe unu ga-eri,
Ebe ọ bụ na ọ na-egboro ndị ọ hụrụ n’anya mkpa ha, na-emekwa ka ha hie ụra nke ọma.+
3 Lee, ụmụ* bụ onyinye si n’aka Jehova.+
Mkpụrụ nke afọ bụ ụgwọ ọrụ Chineke na-akwụ.+
5 Onye ji ha kpojuo akpa akụ́ ya na-enwe obi ụtọ.+
Abụ Mgbago.
2 Ị ga-eri ihe i ji aka gị rụpụta.
Obi ga-adị gị ụtọ, ihe ga-agakwara gị nke ọma.+
3 Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịn nke na-amị mkpụrụ n’ụlọ gị.+
Ụmụ gị ga-adị ka ome osisi oliv gburugburu tebụl gị.
5 Jehova ga-esi na Zayọn gọzie gị.
Ka udo dịrị Izrel.
Abụ Mgbago.
Ma ha emeribeghị m.+
3 Ndị na-akọ ihe akọọla m ihe n’azụ.+
Ebe ndị ha kọrichara n’azụ m dị ogologo.”
4 Ma Jehova bụ onye ezi omume.+
Ọ dọbisiela ụdọ ndị ajọ omume kere m.+
6 Ha ga-adị ka ahịhịa puru n’elu ụlọ,
Nke na-akpọnwụ tupu e fopụ ya,
7 Nke na-enweghịdị ike iju ọbụ aka onye na-ewe ihe ubi,
Nke na-enweghịkwa ike iju aka onye na-achịkọta ọka n’ùkwù n’ùkwù.
8 Ndị na-agafe agafe agaghị ekwu, sị:
“Ka Jehova gọzie unu.
Anyị na-agọzi unu n’aha Jehova.”
Abụ Mgbago.
130 Jehova, m nọ ná nnukwu nsogbu* na-akpọ gị.+
2 Jehova, biko, nụrụ olu m.
Nụrụ arịrịọ m na-arịọ gị ka i nyere m aka.
5 M nwere olileanya n’ebe Jehova nọ. M* nwere olileanya n’ebe ọ nọ.
M tụkwasịrị okwu ya obi.
Karịa otú ndị nche si eche ka chi bọọ,+
Karịa otú ndị nche si atụsi anya ike ka chi bọọ.
7 Ka ndị Izrel na-echere Jehova
N’ihi na Jehova anaghị ahapụ ndị ọ hụrụ n’anya,+
O nwekwara nnukwu ike ọ ga-eji gbapụta ha.
8 Ọ ga-agbaghara ndị Izrel mmehie ha niile.
Abụ Mgbago. Abụ Devid.
131 Jehova, adịghị m mpako.
Anaghị m ebuli onwe m elu.+
Anaghịkwa m achọ oké ihe+
Ma ọ bụ ihe ndị karịrị m.
Afọ juru m ka nwatakịrị a kwụsịrị ara.
Abụ Mgbago.
3 “Agaghị m abanye n’ụlọikwuu m, n’ụlọ m.+
Agaghị m edina n’ihe ndina m, n’àkwà m.
6 Anyị nụrụ banyere ya n’Efrata.+
Anyị chọtara ya n’oké ọhịa.+
Ka anyị kpọọ isiala n’ihu ya.*+
8 Jehova, biko, bilie ka gị na igbe ọgbụgba ndụ nke na-egosi na ị dị ike+
Bata n’ebe ị na-anọ ezu ike.+
9 Ka ndị nchụàjà gị yiri ezi omume ka uwe.
Ka ndị jisiri gị aka ike tiekwa mkpu ọṅụ.
11 Jehova aṅụọrọla Devid iyi.
Ọ ga-emezurịrị ihe o kwuru, sị:
12 Ọ bụrụ na ụmụ gị emebighị ọgbụgba ndụ m,
Ọ bụrụkwa na ha na-eme ihe m na-echetara ha, bụ́ ihe ndị m na-akụziri ha,+
Ụmụ ha ga-anọrọkwa
N’ocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.”+
13 N’ihi na Jehova ahọrọla Zayọn.+
Ọ bụ ebe ọ chọrọ ibi. Ọ sịrị:+
14 “Ebe a bụ ebe m ga-anọ na-ezu ike ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ bụ ebe a ka m ga-ebi+ n’ihi na ọ bụ ihe m chọrọ.
15 M ga-eji ihe oriri gọzie obodo a.
M ga-eji achịcha nyejuo ndị ogbenye bi na ya afọ.+
16 M ga-azọpụta ndị nchụàjà bi na ya.*+
Ndị jisiri Chineke aka ike ga-eti mkpu ọṅụ.+
17 M ga-eme ka Devid sikwuo ike.*
M meela ka e nwee onye si n’ezinụlọ onye m tere mmanụ ga na-achị.*+
18 M ga-eme ka ihere ju ndị iro ya ihu,
Ma okpueze onye m tere mmanụ kpu n’isi ga na-egbuke egbuke.”+
Abụ Mgbago. Abụ Devid.
Ọ bụ n’ebe ahụ ka Jehova kwere nkwa na ya ga-agọzi ndị ya,
Nye ha ndụ ebighị ebi.
Abụ Mgbago.
3 Ka Jehova, Onye kere eluigwe na ụwa,
Si na Zayọn gọzie gị.
Toonụ aha Jehova.
3 Toonụ Jaa, n’ihi na Jehova dị mma.+
Bụọnụ abụ iji too aha ya, n’ihi na aha ya dị mma.
4 N’ihi na Jaa ahọrọla Jekọb ka ọ bụrụ nke ya.
Ọ họrọla ndị Izrel ka ha bụrụ ndị ya pụrụ iche.+
5 N’ihi na o doro m anya na Jehova bụ onye ukwu.
Onyenwe anyị ka chi ọzọ niile.+
6 Jehova na-eme ihe ọ bụla dị ya mma,+
Ma n’eluigwe ma n’ụwa, ma n’oké osimiri ma na mmiri niile miri emi.
7 Ọ na-eme ka alụlụụ* si n’ebe niile ụwa sọtụrụ na-akwụgo elu.
Ọ na-eme ka àmụ̀mà na-egbu mgbe mmiri na-ezo.
Ọ na-eme ka ifufe si n’ebe ọ na-adị pụta.+
O bibiri alaeze niile dị na Kenan.
13 Jehova, aha gị na-adịru mgbe ebighị ebi.
Jehova, ị na-ede ude* n’ọgbọ niile.+
15 E ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ arụsị mba dị iche iche na-efe.
Ọ bụ mmadụ kpụrụ ha.+
16 Ha nwere ọnụ, ma ha anaghị ekwu okwu.+
Ha nwere anya, ma ha anaghị ahụ ụzọ.
17 Ha nwere ntị, ma ha anaghị anụ ihe.
Ha anaghị eku ume.+
19 Ezinụlọ Izrel, toonụ Jehova.
Ezinụlọ Erọn, toonụ Jehova.
20 Ezinụlọ Livaị, toonụ Jehova.+
Unu ndị na-atụ egwu Jehova, toonụ Jehova.
Toonụ Jaa!+
136 Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma.+
Ịhụnanya ya* na-adịru mgbe ebighị ebi.+
3 Keleenụ Onyenwenụ kacha ndị nwenụ niile,
N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.
9 O kere ọnwa na kpakpando ka ha na-enye ìhè n’abalị,+
N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.
15 Ọ tụbara Fero na ndị agha ya n’ime Oké Osimiri Uhie,+
N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.
18 O gburu ndị eze dị ike,
N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi,
19 Ya bụ, Saịhọn+ eze ndị Amọraịt,
N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi,
N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.
21 O nyere ndị ya ala ha ka ọ bụrụ ihe ha ketara,+
N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi,
22 Ka ọ bụrụ ihe Izrel ohu ya ketara,
N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.
26 Keleenụ Chineke nke eluigwe,
N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.
137 Anyị nọdụrụ ala n’akụkụ osimiri ndị dị na Babịlọn.+
Anyị bere ákwá mgbe anyị chetara Zayọn.+
3 Ndị dọọrọ anyị n’agha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ n’ebe ahụ.+
Ndị na-akwa anyị emo chọrọ ka anyị meere ha ihe ọchị. Ha sịrị:
“Bụọrọnụ anyị otu n’ime abụ ndị a na-abụ na Zayọn.”
4 Olee otú anyị ga-esi bụọ abụ Jehova
N’ala ọzọ?
6 Ọ bụrụ na mụ echetaghị gị,
Ọ bụrụ na emeghị m ka Jeruselem
Bụrụ ihe kacha enye m ọṅụ,+
Ka ire m tapara n’okpo ọnụ m.
7 Jehova, biko, cheta
Ihe ndị Ịdọm kwuru n’ụbọchị e meriri Jeruselem. Ha sịrị:
“Kwatuo ya! Kwaturuo ya ala!”+
8 Babịlọn,* obodo a ga-ebibi n’oge na-adịghị anya,+
Onye ga-emegwara gị ihe i mere anyị+
Ga-enwe obi ụtọ.
9 Onye ga-ejide ụmụ gị
Kụrie ha na nkume+ ga-enwe obi ụtọ.
Abụ Devid.
138 M ga-eji obi m niile too gị.+
M ga-anọ n’ihu chi ọzọ dị iche iche
Bụkuo gị abụ otuto.
2 M ga-eche ihu n’ụlọ nsọ gị kpọọ isiala,+
M ga-etokwa aha gị+
N’ihi ịhụnanya gị* nakwa n’ihi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.
I meela ka okwu gị na aha gị dị ebube karịa ihe ọ bụla ọzọ.*
3 Ị zara m n’ụbọchị m kpọrọ gị.+
I mere ka obi sie m* ike, meekwa ka m dị ike.+
6 Ọ bụ eziokwu na Jehova bi n’ebe dị elu, ọ na-ahụ onye dị umeala n’obi.+
Ma ọ naghị abịa ndị dị mpako nso.+
7 Ọ bụrụgodị na m nọ ná nsogbu, ị na-echebe m ndụ.+
Ị na-amatị aka gị mesie ndị iro m iwe ji ike.
Aka gị siri ike* ga-azọpụta m.
8 Jehova ga-emezu ihe niile o bu n’obi imere m.
Jehova, ịhụnanya gị na-adịru mgbe ebighị ebi.+
Ahapụla ọrụ aka gị.+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
139 Jehova, i nyochaala m, ị makwa m.+
2 Ị ma mgbe m nọ ọdụ na mgbe m biliri ọtọ.+
Ị na-anọ n’ebe dị anya mara ihe m na-eche.+
3 Ị na-eleru m anya mgbe m na-aga njem na mgbe m dina ala.
Ị makwa ihe niile m na-eme.+
5 Ị nọ m n’ihu nakwa n’azụ na-echebe m.
I jidekwara m aka.
6 Enweghị m ike ịghọta ihe niile ị ma gbasara m.
Ha karịrị m.+
8 Ọ bụrụ na mụ agbagoo n’eluigwe, ị ga-anọ n’ebe ahụ,
Ọ bụrụkwa na mụ eburu àkwà* m banye n’ili,* ị ga-anọ n’ebe ahụ.+
9 A sị na m ga-epu nku ma fefee na mbara igwe ngwa ngwa otú ìhè si apụta ma chi bọwa,
Ka m gaa biri n’akụkụ oké osimiri nke kacha dị anya,
10 Ị ka ga-eji aka gị na-edu m n’ebe ahụ,
Ị ga-ejikwa aka nri gị jide m aka.+
11 Ọ bụrụ na mụ asị: “N’eziokwu, ọchịchịrị ga-ekpuchi m ka a ghara ịhụ m.”
Ìhè ga-agbazi m gburugburu n’abalị.
Ọchịchịrị na ìhè bụụrụ gị otu ihe.+
13 Ọ bụ gị kere akụrụ m.
I ji ihe kpuchie m n’afọ nne m.+
14 M na-eto gị n’ihi na otú i si kee m dị ebube,+ ọ na-emekwa ka m na-atụ egwu gị.
Ọrụ gị niile dị ịtụnanya.+
O doro m nnọọ anya.
16 Ị hụdịrị m mgbe m na-akabeghị aka n’afọ nne m.
E dere ihe niile dị m n’ahụ́ n’akwụkwọ gị.
E dedịrị mgbe e kere ha
Tupu nke ọ bụla n’ime ha adịrị.
17 Ihe ndị ị na-eche n’echiche pụrụ nnọọ iche n’anya m.+
Chineke, ha dị nnọọ ọtụtụ.+
18 M gbalịa ka m gụọ ha ọnụ, m na-ahụ na ha dị ọtụtụ karịa ájá.+
M teta, m ka ga na-agụ ha ọnụ.*+
19 Chineke, a sị nnọọ na ị ga-egbu ndị ajọ omume,+
Ndị na-egbu mmadụ* ga-esi n’ebe m nọ pụọ,
20 Ya bụ, ndị ji obi ọjọọ na-ekwutọ gị.
Ha bụ ndị iro gị, ndị ji aha gị eme ihe efu.+
Ha bụzi ezigbo ndị iro m.
23 Chineke, biko, nyochaa m, ka ị mara ihe dị m n’obi.+
Nyochaa m, ka ị mara ihe na-echegbu m.+
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
140 Jehova, biko, napụta m n’aka ndị ọjọọ.
Chebe m ka m ghara ịba n’aka ndị tigbuo zọgbuo,+
2 Ndị na-akpa nkata ihe ọjọọ n’obi ha+
Ma na-akpata nsogbu kwa ụbọchị.
3 Ha na-amụ ire ha ka ọ dị nkọ ka ire agwọ.+
Okwu ọjọọ ndị na-esi ha n’ọnụ apụta dị ka elò ajụala.+ (Sila)
4 Jehova, biko, chebe m ka m ghara ịba n’aka ndị ajọ omume.+
Chebe m ka m ghara ịba n’aka ndị tigbuo zọgbuo,
Ndị na-akpa nkata ka ha kwatuo m.
5 Ndị mpako siiri m ọnyà.
Ha tụsasịrị ụdọ n’akụkụ ụzọ ka ha jide m.+
Ha na-esiri m ọnyà dị iche iche.+ (Sila)
6 M sịrị Jehova: “Ị bụ Chineke m.
Jehova, biko, ṅaa ntị n’arịrịọ m na-arịọ ka i nyere m aka.”+
8 Jehova, biko, emerela ndị ajọ omume ihe ha chọrọ.
Ekwela ka nkata ha na-akpa nwee isi, ka isi ghara ibuwe ha.+ (Sila)
10 Ka a wụkwasị ha icheku ọkụ.+
11 Ka onye na-ekwutọ mmadụ ghara ịhụ ebe ọ ga-ebi n’ụwa.*+
Ka ihe ọjọọ chụwa ndị tigbuo zọgbuo ọsọ ma laa ha n’iyi.
13 N’eziokwu, ndị ezi omume ga-eto aha gị.
Ndị na-eme ihe dị mma ga-ebi n’ihu gị.+
Abụ Devid.
Biko, bịa ngwa ngwa nyere m aka.+
Gee ntị mgbe m na-akpọ gị.+
2 Ka ekpere m masị gị ka insens*+ a kwadebere nke ọma,+
Ka aka m gbasara na-ekpe ekpere dịrị ka àjà ọka a na-achụ ná mgbede.+
3 Jehova, biko, nyere m aka ka m chee ọnụ m nche.
Nyere m aka ka m chee egbugbere ọnụ m nche.+
E nweghị ihe ga-eme ka m soro ha rie nri ha a kwọrọ aka sie.
5 Ọ bụrụ na onye ezi omume etie m ihe, ọ pụtara na ọ hụrụ m n’anya.*+
Ọ bụrụ na ọ baara m mba, ọ ga-adị ka ebe a wụsara m mmanụ n’isi.+
A gaghị m ajụ ya.+
M ka ga na-ekpere ya ekpere mgbe ọdachi dakwasịrị ya.
6 Ọ bụrụgodị na e si n’elu ugwu na-atụda ndị ikpe,
Ndị mmadụ ga-ege ntị n’ihe m na-ekwu n’ihi na ihe m na-ekwu dị mma.
7 A tụsasịala ọkpụkpụ anyị n’ọnụ ili*
Otú onye na-egwu ala si atụsasị ihe ndị ọ na-egwupụta n’ala aghara aghara.
8 Ma Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, anya m dị n’ebe ị nọ.+
Agbabala m n’ime gị.
Ekwela ka m nwụọ.*
9 Chebe m ka m ghara ịdaba n’ọnyà ndị ajọ omume siiri m,
Ka m ghara ịdaba n’ọnyà ha.
Maskil.* Ekpere Devid kpere mgbe ọ nọ n’ọgba.+
142 M kpọkuru Jehova ka o nyere m aka.+
M rịọrọ Jehova ka o meere m amara.
2 M gwara ya ihe niile na-echegbu m.
N’oge ahụ, ị na-eleru ụzọ m si aga anya.+
Ha siiri m ọnyà
N’ụzọ m si agafe.
E nweghị ebe m ga-agbaga.+
E nweghị onye chọrọ ịma banyere m.
5 Jehova, m na-akpọku gị ka i nyere m aka.
M sịrị: “Ị bụ ebe mgbaba m.+
Naanị gị ka m nwere.”*
6 Ṅaa ntị n’ákwá m na-ebe ka i nyere m aka,
N’ihi na m nọ ná nnukwu nsogbu.
Napụta m n’aka ndị na-akpagbu m,+
N’ihi na ha ka m ike.
Ka ndị ezi omume zukọta gbaa m gburugburu
N’ihi na ị na-emeso m ihe otú dị mma.
Abụ Devid.
143 Jehova, biko, nụrụ ekpere m.+
Ṅaa ntị n’arịrịọ m na-arịọ ka i nyere m aka.
Za m n’ihi na ị bụ onye ezi omume na onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.
3 N’ihi na onye iro na-achụ m ọsọ.
Ọ zọpịala m, zọba m n’ime ala.
O meela ka m biri n’ebe gbara ọchịchịrị ka ndị nwụrụ anwụ kemgbe.
Obi adaala m mbà.+
5 Echetala m oge dị anya gara aga.
M na-atụgharị uche n’ọrụ gị niile.+
M ji obi m niile na-echebara ọrụ aka gị echiche.*
6 M gbasapụụrụ gị aka m na-ekpe ekpere.
M na-echere gị otú ala kpọrọ nkụ si eche ka mmiri zoo.+ (Sila)
7 Jehova, biko, za m ngwa ngwa.+
Ike agwụchaala m.+
8 Mee ka m nụ banyere ịhụnanya gị n’ụtụtụ,
N’ihi na m tụkwasịrị gị obi.
Mee ka m mara ụzọ m kwesịrị ịna-eso,+
N’ihi na ọ bụ gị ka m lekwasịrị anya.
9 Jehova, biko, napụta m n’aka ndị iro m.
M gbakwutere gị ka i chebe m.+
Mmụọ nsọ gị dị mma.
Ka ọ na-edu m n’ebe a na-enweghị ihe ọjọọ ga-eme m.*
11 Jehova, biko, dowe m ndụ n’ihi aha gị.
Napụta m* n’ahụhụ m na-ata n’ihi na ị bụ onye ezi omume.+
12 Bibie ndị iro m n’ihi ịhụnanya gị.*+
Abụ Devid.
144 Ka e too Jehova bụ́ Oké Nkume m,+
Onye na-akụziri m otú e si alụ ọgụ,
Na-akwadebekwa m maka ịlụ agha.+
2 Ọ hụrụ m n’anya, ọ bụkwa ebe m a rụsiri ike.
Ọ bụ ebe m na-agbaba aka aghara ịkpa m nakwa onye na-anapụta m.
3 Jehova, gịnị ka mmadụ bụ nke mere i ji na-eche banyere ya?
Gịnịkwa ka nwa nke mmadụ efu bụ nke mere i ji na-elebara ya anya?+
4 Mmadụ yiri ume e kupụrụ ekupụ.+
Ndụ ya dị ka onyinyo na-apụ apụ.+
5 Jehova, biko, bịada eluigwe gị ka ị gbadata.+
Metụ ugwu aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.+
6 Mee ka àmụ̀mà gbuo ka ndị iro gbasasịa.+
Gbapụ akụ́ gị ka i tinye ha n’ọgba aghara.+
7 Si n’eluigwe matịa aka gị.
Zọpụta m ma dọpụta m na mmiri na-ekwo ekwo,
Napụtakwa m n’aka ndị mba ọzọ,+
8 Bụ́ ndị ụgha juru ọnụ,
Ndị na-eweli aka nri ha ṅụọ iyi ụgha.
9 Chineke, m ga-abụku gị abụ ọhụrụ.+
M ga-eji ụbọ nwere akwara iri bụkuo gị abụ otuto,
10 Gị Onye na-eme ka ndị eze merie,*+
Onye na-anapụta Devid ohu ya ka ndị mmadụ ghara iji mma agha gbuo ya.+
11 Zọpụta m ma napụta m n’aka ndị mba ọzọ,
Bụ́ ndị ụgha juru ọnụ,
Ndị na-eweli aka nri ha ṅụọ iyi ụgha.
12 Mgbe ahụ, ụmụ anyị ndị nwoke ga-adị ka obere osisi ndị na-eto ngwa ngwa,
Ụmụ anyị ndị nwaanyị adịkwa ka ogidi ndị e ji chọọ obí eze mma.
13 Ihe dị iche iche ala anyị na-emepụta ga-eju n’ebe anyị na-akwasa ihe.
Ìgwè ewu na atụrụ anyị ga na-amụba okpukpu puku kwuru puku nakwa iri puku kwuru iri puku.
14 Ehi anyị ndị dị ime agaghị enwe nsogbu ọ bụla, ime agaghịkwa apụ ha.
E nweghị onye ga na-ebe ákwá n’ámá anyị n’ihi ahụhụ.
15 Ndị ihe dịịrị otú a na-enwe obi ụtọ.
Ndị Jehova bụ Chi ha na-enwe obi ụtọ.+
Abụ otuto Devid bụrụ.
א [Alef]
145 Chineke m bụ́ Eze, m ga-eto gị.+
M ga-eto aha gị ruo mgbe niile ebighị ebi.+
ב [Bet]
2 M ga-eto gị malite n’ụtụtụ ruo n’abalị.+
M ga-eto aha gị ruo mgbe niile ebighị ebi.+
ג [Gimel]
3 Jehova bụ onye ukwu, onye ọ bụla kwesịkwara ịna-eto ya.+
E nweghị ike ịghọta* otú ọ dịruru ukwuu.+
ד [Dalet]
4 Ọgbọ niile ga-aja ọrụ gị niile mma.
Ha ga-akọ banyere nnukwu ọrụ ndị ị na-arụ.+
ה [Hee]
5 Ha ga-ekwu banyere otú i si dị ukwuu ma dị ebube,+
M ga-echebakwara ọrụ ndị dị ebube ị na-arụ echiche.
ו [Wọọ]
ז [Zayin]
7 Ha ga-eto gị mgbe ha na-echeta ọtụtụ ihe ọma ndị ị na-eme,+
Ha ga-etikwa mkpu ọṅụ maka na ị bụ onye ezi omume.+
ח [Het]
8 Jehova nwere ọmịiko* ma na-eme ebere.+
Ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ịhụnanya ya dịkwa ukwuu.+
ט [Tet]
י [Yod]
כ [Kaf]
12 Ka ha wee mee ka ndị mmadụ mara nnukwu ọrụ ndị ị na-arụ+
Nakwa otú ọchịchị gị si dị ukwuu ma dị ebube.+
מ [Mem]
ס [Samek]
ע [Ayin]
15 Ihe niile i kere eke na-ele gị anya ka i nyere ha aka,
Ị na-enyekwa ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị.+
פ [Pee]
צ [Sadee]
17 Ihe niile Jehova na-eme na-egosi na ọ bụ onye ezi omume,+
Ihe niile ọ na-eme na-egosikwa na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
ק [Kof]
ר [Resh]
19 Ọ na-emere ndị na-atụ egwu ya ihe na-agụ ha.+
Ọ na-anụ ákwá ha na-ebe ka o nyere ha aka, ọ na-anapụtakwa ha.+
ש [Shin]
ת [Tọọ]
21 M ga-eji ọnụ m na-eto Jehova.+
Ka ihe niile dị ndụ* too aha nsọ ya ruo mgbe niile ebighị ebi.+
Ka m jiri obi m niile too Jehova.+
2 M ga-eto Jehova ná ndụ m niile.
M ga-abụku Chineke m abụ otuto n’oge niile m dị ndụ.
3 Unu atụkwasịla ndị isi* obi,
Unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye na-enweghị ike ịzọpụta mmadụ.+
4 Ọ kwụsị iku ume, ọ na-alaghachi n’ájá.+
N’ụbọchị ahụ, ọ na-akwụsị iche echiche.+
5 Onye Chineke Jekọb na-enyere aka na-enwe obi ụtọ,+
Bụ́ onye nwere olileanya n’ebe Chineke ya bụ́ Jehova nọ,+
6 Onye kere eluigwe na ụwa,
Oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha,+
Onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe niile,+
7 Onye na-ekpechitere ndị a na-erigbu erigbu ọnụ ha,
Onye na-enye ndị agụụ na-agụ ihe oriri.+
Jehova na-atọhapụ ndị mkpọrọ.*+
8 Jehova na-emeghe anya ndị ìsì.+
Jehova na-ekulite ndị ike gwụrụ.+
Jehova hụrụ ndị ezi omume n’anya.
9 Jehova na-echebe ndị mbịarambịa.
Toonụ Jaa!*
Ọ dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto.
Ọ dị nnọọ mma ito ya, ọ bụkwa ihe kwesịrị ekwesị.+
Ọ na-akpọlata ndị Izrel a dọọrọ n’agha.+
3 Ọ na-akasi ndị obi gbawara obi.
Ọ na-ekechi ọnyá ha.
4 Ọ na-agụ kpakpando ọnụ.
Ọ na-akpọ ha niile aha.+
5 Onyenwe anyị bụ onye ukwu, ike ya dịkwa ukwuu.+
E nweghị ike ịtụ otú ọ na-aghọtaru ihe atụ̀.+
7 Bụkuonụ Jehova abụ iji kelee ya.
Jirinụ ụbọ akwara bụkuo Chineke anyị abụ otuto,
8 Onye ji ígwé ojii kpuchie eluigwe,
Onye na-eme ka mmiri zooro ụwa,+
Onye na-eme ka ahịhịa ndụ puo+ n’ugwu dị iche iche.
12 Jeruselem, jaa Jehova mma.
Zayọn, too Chineke gị.
13 Ọ na-eme ka ihe e ji atụchi ọnụ ụzọ ámá obodo gị sie ike.
Ọ na-agọzi ụmụ gị.
14 Ọ na-eme ka udo dị n’ala gị.+
Ọ na-eji ọka wit kacha mma enyeju gị afọ.+
15 Ọ na-enye ụwa iwu.
Okwu ya na-eru ebe o dunyere ya ngwa ngwa.
16 Ọ na-eme ka snoo kpuchie ụwa ka à ga-asị na ọ bụ ákwà e ji ajị anụ kpaa.+
Ọ na-aghasasị mkpụrụ mmiri ka à ga-asị na ọ bụ ntụ.+
17 Ọ na-atụdasị akụ́ mmiri ígwé ka à ga-asị na ọ bụ iberibe achịcha.+
Ònye ga-edili oyi ya?+
18 Ọ na-enye iwu, ha agbazee.
Ọ na-eme ka ifufe fee,+ mmiri asọwa.
20 E nweghị mba ọ bụla ọzọ o meere otú a.+
E nweghị ihe ha ma gbasara ihe ndị o kpebiri.
Ndị nọ n’eluigwe, toonụ Jehova.+
Ndị nọ n’ebe ndị kacha elu, toonụ ya.
2 Ndị mmụọ ozi ya niile, toonụ ya.+
Ụsụụ ndị agha ya niile, toonụ ya.+
3 Anyanwụ na ọnwa, toonụ ya.
Kpakpando niile na-enye ìhè, toonụ ya.+
6 Ọ na-eme ka ha na-adị ruo mgbe niile ebighị ebi.+
O nyela iwu ga na-achị ha mgbe niile.+
7 Toonụ Jehova n’ụwa,
Unu nnukwu anụ mmiri na mmiri niile miri emi,
8 Unu àmụ̀mà na akụ́ mmiri ígwé, snoo na urukpuru,
Unu oké ifufe ndị na-eme ihe o kwuru,+
9 Unu ugwu ukwu na unu ugwu nta niile,+
Unu osisi na-amị mkpụrụ na unu osisi sida niile,+
10 Unu anụ ọhịa+ na unu anụ ụlọ niile,
Unu anụ ndị na-arị arị na nnụnụ,
11 Unu ndị eze ụwa na unu mba niile,
Unu ndị isi na unu ndị ikpe niile e nwere n’ụwa,+
12 Unu ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa,*
Ndị agadi nakwa ụmụaka.
Ọ dị ebube karịa eluigwe na ụwa.+
14 Ọ ga-eme ka ndị ya sikwuo ike,*
Ka e wee na-aja ndị niile na-erubere ya isi mma,
Ya bụ, ndị Izrel, bụ́ ndị na-abịa ya nso.
Toonụ Jaa!*
Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ.+
Toonụ ya n’ọgbakọ ndị na-erubere ya isi.+
2 Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ n’ihi Onye Ukwu kere ya.+
Ka ụmụ Zayọn ṅụrịa ọṅụ n’ihi Eze ha.
4 N’ihi na Jehova hụrụ ndị ya n’anya.+
Ọ na-azọpụta ndị dị umeala n’obi.+
5 Ka ndị na-erubere Chineke isi ṅụrịa ọṅụ n’ihi na ọ na-akwanyere ha ùgwù.
Ka ha nọrọ n’àkwà* ha tie mkpu ọṅụ.+
6 Ka ha jiri ọnụ ha na-abụku Chineke abụ otuto,
Ka ha jidekwa mma agha nwere ihu abụọ n’aka,
7 Ka ha wee bọọ ọbọ n’isi mba dị iche iche
Ma taa mba dị iche iche ahụhụ,
8 Ka ha kee ndị eze ha agbụ ígwè
Ma tụọ ndị a ma ama n’obodo ha ịga n’ụkwụ,
9 Ka ha wee mee ha ihe e dere ede nke e kpebiri na a ga-eme ha.+
Ọ bụ ndị niile na-erubere ya isi ka a ga-akwanyere ụdị ùgwù a.
Toonụ Jaa!*
Nọrọnụ n’ụlọ nsọ Chineke too ya.+
Nọrọnụ n’okpuru mbara igwe nke na-egosi na ọ dị ike too ya.+
2 Toonụ ya n’ihi nnukwu ọrụ ndị ọ na-arụ.+
Toonụ ya maka na ọ bụ nnọọ onye ukwu.+
Jirinụ ụbọ akwara na une too ya.+
4 Jirinụ obere ịgbà+ too ya, gbaakwanụ egwú a na-agba gburugburu gburugburu.
5 Jirinụ ájà ndị na-ada ụda too ya.
Jirinụ ájà ndị na-adasi ụda ike too ya.+
6 Ka ihe niile na-eku ume too Jaa.
Na Hibru, “Ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “ana-atụgharịkwa uche n’ihe.”
Ma ọ bụ “kpacharanụ anya.”
Na Hibru, “Susuonụ ọkpara ya ọnụ.”
Na Hibru, “ọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “Onye na-ebuli isi m elu.”
Na Hibru, “Meere m ohere sara mbara.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Na Hibru, “mee ka ìhè si n’ihu gị nwuoro anyị.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “onye na-awụfu ọbara ma na-aghọ aghụghọ.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “Akpịrị.”
Ma ọ bụ “ihu ọma.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ebere.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “anaghị echeta.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “Abụ ákwá.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
O nwere ike ịbụ, “Mgbe m hapụrụ onye na-emegide m n’agbanyeghị na e nweghị ihe m mere ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “ndụ m.”
Ma ọ bụ “onye na-anwale obi na akụrụ.”
Na Hibru, “onye dị ime ihe ọjọọ.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “Gị onye a na-akọ akụkọ ebube ya n’eluigwe.”
Na Hibru, “mkpịsị aka.”
Na Hibru, “ndị dị ka chi.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ala.”
Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
O nwere ike ịbụ, “Onye anyaukwu na-agọzi onwe ya.”
Ma ọ bụ “ka m zọhie ụkwụ.”
Ma ọ bụ “n’ọhịa.”
Na Hibru, “welie aka gị.”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Na Hibru, “Gbajie aka onye ajo omume.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “Mgbe a kwaturu ntọala.”
Ma ọ bụ “nke na-enwu gbaa.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ya.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ ga-awụ ndị ajọ omume icheku ọkụ.”
Ma ọ bụ “Ọ ga-emere ndị ezi omume amara.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “egbugbere ọnụ.”
Na Hibru, “egbugbere ọnụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “ihi ụra ọnwụ.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Ndị na-enweghị uche.”
Na Hibru, “achịcha.”
Na Hibru, “ọgbọ.”
Ma ọ bụ “na-akwụwa aka ọtọ.”
Na Hibru, “eji ire ya ekwutọ.”
Ma ọ bụ “emenye ndị enyi ya ihere.”
Na Hibru, “ihe ọ ṅụrụ n’iyi.”
Ma ọ bụ “eri ngarị.”
Ma ọ bụ “zọhie ụkwụ.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Àgwà ọma m.”
Ma ọ bụ “egbugbere ọnụ.”
Na Hibru, “N’abalị, akụrụ m na-agbazi m.”
Ma ọ bụ “ka m maa jijiji.”
Na Hibru, “Ebube m na-enwe.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “hụ olulu.” O nwere ike ịbụ, “ree ure.”
Na Hibru, “ụkwụ m.”
Ma ọ bụ “Hulata gee ntị.”
Na Hibru, “n’aka nri gị.”
Ma ọ bụ “Abụba ha ekpuchiela ha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ndị oge a.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “onye nzọpụta m nke dị ike.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ọwa mmiri.”
Ma ọ bụ “ebe sara mbara.”
Ma ọ bụ “ndị na-ata ahụhụ.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “bụ okwu e ji ọkụ nụchaa.”
Na Hibru, “aka m.”
Na Hibru, “Aka nri gị.”
Ma ọ bụ “nkwonkwo ụkwụ m.”
Ma ọ bụ “Ike ga-agwụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”
O nwere ike ịbụ, “eriri ha ji atụ̀ ihe.”
Ma ọ bụ “n’ala.”
Ma ọ bụ “na-eweghachi mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “ọlaedo a nụchara anụcha.”
Na Hibru, “aka nri ya.”
Na Hibru, “egbugbere ọnụ ya.”
Ma ọ bụ “ọlaedo a nụchara anụcha.”
Ma ọ bụ “ka ọ zọhie ụkwụ.”
Na Hibru, “Aka nri gị.”
Na Hibru, “loo ha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ.”
Na Hibru, “n’ihu ha.”
Ihe a nwere ike ịbụ aha ụda egwú ma ọ bụ aha otú e si akpọ egwú.
Ma ọ bụ “i menyeghịkwa ha ihere.”
Mgbá aṅụ bụ ihe aṅụ na-anyụpụta nke na-adị n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ. Ihe a na-agbaze ngwa ngwa.
Na Hibru, “M ga-agụli ọkpụkpụ m niile ọnụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “Ka obi unu dị ndụ.”
Na Hibru, “buru ibu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “Mkpụrụ.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ na-eduga m na mmiri dị jụụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “na-akasi m obi.”
Ma ọ bụ “Ị na-ete m mmanụ n’isi, ahụ́ eruo m ala.”
Ma ọ bụ “ndụ m,” ya bụ, ndụ Jehova.
Ma ọ bụ “ga-ekpe ya ikpe ziri ezi.”
Ma ọ bụ “ọgbọ.”
Ma ọ bụ “bilienụ.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Na-egosi ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “Mkpụrụ.”
Na Hibru, “n’ụgbụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “akụrụ m.”
Na Hibru, “anọ.”
Ma ọ bụ “ndị ihu abụọ.”
Na Hibru, “na-anọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ndị na-awụfu ọbara.”
Ma ọ bụ “Ndị na-enye ndị ọzọ aka azụ.”
Na Hibru, “Ụkwụ m guzo n’ala dị larịị.”
Na Hibru, “Chọọnụ ihu m.”
Na Hibru, “ihu.”
Ma ọ bụ “n’aka mkpụrụ obi ndị iro m.”
O nwere ike ịbụ, “N’eziokwu, m nwere okwukwe na m ga-anọ ndụ hụ otú Jehova si dị mma.”
Ma ọ bụ “n’ili.”
O nwere ike ịbụ, “Feenụ Jehova n’ihi na ọ dị ebube, dịkwa nsọ.”
Na Hibru, “mmiri dị iche iche.”
Na Hibru, “mmiri dị iche iche.”
O nwere ike ịbụ ugwu ndị dị na Lebanọn ka a na-ekwu.
Ma ọ bụ “oké osimiri dị n’eluigwe.”
O nwere ike ịbụ, “ụlọ nsọ.” Na Hibru, “ụlọ ahụ.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “n’ili.”
Na Hibru, “ihe dị nsọ e ji echeta ya.”
Ma ọ bụ “ihe ọma.”
Ma ọ bụ “ka m zọhie ụkwụ.”
Ma ọ bụ “ihe ọma.”
Ma ọ bụ “n’ili.”
Ma ọ bụ “Ka ebube m.”
Ma ọ bụ “Hulata gee ntị.”
Ma ọ bụ “onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “n’ebe sara mbara.”
Ma ọ bụ “Uche.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “gosi m ịhụnanya pụrụ iche.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “a gbaghaara.”
Ma ọ bụ “aka gị.”
Ma ọ bụ “Ịhụnanya pụrụ iche nke.”
Ma ọ bụ “mmụọ.”
Ma ọ bụ “kee ìgwè ya niile.” O nwere ike ịbụ anyanwụ, ọnwa, na kpakpando ka a na-ekwu.
Ma ọ bụ “ndụmọdụ.”
Ma ọ bụ “ndụmọdụ Jehova.”
Ma ọ bụ “eme ka mmadụ merie.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi anyị.”
Ma ọ bụ “gosi anyị ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “ire.”
Na Hibru, “egbugbere ọnụ ya.”
Ma ọ bụ “ndị obi dara mbà.”
Ma ọ bụ “ọdachi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “anyụike nwere ihu abụọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
O nwere ike ịbụ, “Ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke na-akparị m ka e wee nye ha achịcha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “na-echebara ezi omume gị echiche.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “ugwu Chineke.”
Ma ọ bụ “na-azọpụta.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “abụba.”
Ma ọ bụ “n’ala.”
Ma ọ bụ “Na-enwe ọṅụ kachanụ.”
Na Hibru, “Nyefee Jehova ụzọ gị.”
Ma ọ bụ “Jiri ndidi na-eche ya.”
O nwere ike ịbụ, “Ewela iwe, n’ihi na naanị ihe o nwere ike ịkpata bụ nsogbu.”
Ma ọ bụ “ndị ụzọ ha kwụ ọtọ.”
Na Hibru, “ga-agbaji aka ndị ajọ omume.”
Ma ọ bụ “na-eme amara.”
Ma ọ bụ “na-enwekwa ọmịiko.”
Na Hibru, “achịcha.”
Na Hibru, “Ire ya.”
Na Hibru, “Aka gị na-abịada m.”
Na Hibru, “Udo adịrịghị ọkpụkpụ m.”
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “dị ndụ.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “na-asụ ude.”
Na Hibru, “hara ka uhiè ọbụ aka.”
Na Hibru, “Ọ na-eme mkpọtụ.”
N’Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.
Ma ọ bụ “hulata gee ntị.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Na Hibru, “ga-agbanwe ihe ndina ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “obi ya.”
Na Hibru, “eweliela ikiri ụkwụ ya ka o megide m.”
Ma ọ bụ “Malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “agụụ gị na-agụsi mkpụrụ obi m ike.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m adaala mbà.”
Ma ọ bụ “n’ugwu nta.”
O nwere ike ịbụ, “Mkparị ndị iro m na-akparị m dị ka à ga-asị na ha na-egweri ọkpụkpụ m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “aka.”
Na Hibru, “aka nri gị na ogwe aka.”
Na Hibru, “ìhè si n’ihu.”
Na Hibru, “jiri anyị na-atụ ilu.”
Na Hibru, “i ji zooro anyị ihu gị?”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “ire.”
Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Na Hibru, “Aka nri gị ga-akụzikwara gị.”
Na Hibru, “Chineke bụ ocheeze gị.”
Ma ọ bụ “ikpe ziri ezi.”
Ma ọ bụ “ọlaedo Ofa.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Taya.”
Ma ọ bụ “ga-eme ka obi gị jụrụ.”
Na Hibru, “n’ime.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “ọta.”
Ma ọ bụ “mpi ebule.”
Na Hibru, “ọta niile nke ụwa.”
Na Hibru, “aka nri.”
O nwere ike ịbụ, “ruo mgbe anyị nwụrụ.”
Ma ọ bụ “n’oge a.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Ma ọ bụ “n’ili.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “mkpi.”
Na Hibru, “n’otu puku ugwu.”
Ma ọ bụ “ndụmọdụ.”
O nwere ike ịbụ, “ị na-esonyere ya.”
Ma ọ bụ “na-akatọ nwanne gị.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “Sachapụ m mmehie m nke ọma.”
Na Hibru, “ire m.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “n’ala ndị dị ndụ.”
Ma ọ bụ “O jikwa nkata ọjọọ ọ na-akpa mere ebe mgbaba.”
Ma ọ bụ “ga-egosi m ịhụnanya pụrụ iche.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Ndị na-enweghị uche.”
Na Hibru, “achịcha.”
O nwere ike ịbụ, “Ha ga-atụ ụjọ n’ebe ha na-ekwesịghị ịtụ ụjọ.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “Ha anaghị eme ka Chineke nọrọ n’ihu ha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Ezorola m onwe gị mgbe m na-arịọ gị ka i nyere m aka.”
Na Hibru, “kewaa ire ha.”
Ma ọ bụ “nwoke mụ na ya hà.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ya bụ, enyi ahụ e kwuru okwu ya n’amaokwu 13 na 14.
Na Hibru, “ọgbụgba ndụ ya.”
Ma ọ bụ “maa jijiji.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “anụ ahụ́.”
Na Hibru, “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m agbabala.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “Ebube.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “ruo na mbara igwe.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “n’akpa nwa.”
Ma ọ bụ “mebie.”
Na Hibru, “nke na-agbaze agbaze mgbe ọ na-arị.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “ụlọ ahụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “I gosila.”
Na Hibru, “aka nri.”
O nwere ike ịbụ, “Chineke ekwuola n’ebe nsọ ya.”
O nwere ike ịbụ, “n’obodo a rụsiri ike.”
Ma ọ bụ “Ọ ga-ebi.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “zọhie ụkwụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m, nwee ndidi, chere Chineke.”
Ma ọ bụ “ka m zọhie ụkwụ.”
Ma ọ bụ “na-egosi ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “Agụụ gị na-agụsi mkpụrụ obi m ike.”
Na Hibru, “Egbugbere ọnụ m ga-aja.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ibibi mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ga-anya isi.”
Ma ọ bụ “Ha na-agba ibe ha ume ka ha mee ihe ọjọọ.”
Ma ọ bụ “ga-anya isi.”
Na Hibru, “anụ ahụ́.”
Na Hibru, “na-ekpuchi.”
Na Hibru, “O.”
Na Hibru, “ya.”
Na Hibru, “Ọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
Ma ọ bụ “ka ụkwụ anyị maa jijiji.”
Na Hibru, “jiri ịnyịnya wụfee anyị n’isi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “igosi m ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “Ọ ga-eme ka ihu ya nwuoro anyị ìhè.”
Ma ọ bụ “ga-asọpụrụ.”
Mgbá aṅụ bụ ihe aṅụ na-anyụpụta nke na-adị n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ. Ihe a na-agbaze ngwa ngwa.
O nwere ike ịbụ, “n’elu ígwé ojii.”
“Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Na Hibru, “onyeikpe.”
Ma ọ bụ “ndị na-enupụ isi.”
Na Hibru, “ndị i ketara.”
Ma ọ bụ “unu ụmụ nwoke.”
Ma ọ bụ “ugbene.”
Ma ọ bụ “ọlaedo a nụchara anụcha.”
Ma ọ bụ “Ọ dị ka à ga-asị na snoo dara na Zalmọn.”
Ma ọ bụ “ọmarịcha ugwu.”
Ma ọ bụ “nwere mmasị na ya.”
O nwere ike ịbụ, “ma na-azọ ọlaọcha ụkwụ.”
O nwere ike ịbụ, “Ndị nnọchiteanya ga-esi n’Ijipt pụta.”
Na Hibru, “n’ígwé ojii.”
Na Hibru, “gị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ndị bụ́ ndị iro m n’enweghị ihe m mere ha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
O nwere ike ịbụ, “Mgbe m bere ákwá ma buo ọnụ.”
Na Hibru, “ihe e ji atụ ilu.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “n’olulu.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ahịhịa na-egbu mmadụ.”
Ma ọ bụ “ụlọikwuu ha mgbidi gbara gburugburu.”
Ma ọ bụ “n’akwụkwọ nke ndị dị ndụ.”
Ya bụ, ala ahụ.
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “Hulata gee ntị.”
Ma ọ bụ “Ị bụ obi ike m.”
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “agụtali ha ọnụ.”
Na Hibru, “ogwe aka.”
Ma ọ bụ “zọpụtara mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “Ka o kpee ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ikpe.”
Ma ọ bụ “Ọ ga-achị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “ọbara.”
Ma ọ bụ “ndị na-etu ọnụ.”
Ma ọ bụ “ha na-enwe afọ ukwu.”
Na Hibru, “Abụba.”
Na Hibru, “ndị ya.”
Na Hibru, “Akụrụ m.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “nzukọ gị.”
Ma ọ bụ “n’ụlọ nzukọ gị.”
Ma ọ bụ “Wepụta aka gị n’ime uwe gị.”
Na Hibru, “Levayatan.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “Aha gị dị anyị nso.”
Na Hibru, “gbazere.”
Na Hibru, “Unu ebulila mpi unu elu.”
Na Hibru, “Unu ebulila mpi unu elu.”
Na Hibru, “M ga-agbaji mpi ndị ajọ omume.”
Na Hibru, “ga-ebuli mpi onye ezi omume elu.”
Ma ọ bụ “ìhè kpuchiri gị.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “mmụọ m.”
Na Hibru, “ogwe aka.”
Ma ọ bụ “n’ala.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ná ntụziaka.”
Ma ọ bụ “ihe ncheta.”
Na Hibru, “nke na-akwadebeghị obi ha.”
Ma ọ bụ “nwaa Chineke ọnwụnwa.”
Ma ọ bụ “ka e nye mkpụrụ obi ha nri.”
Ma ọ bụ “nri ndị mmụọ ozi.”
Na Hibru, “ọ.” O nwere ike ịbụ ụlọikwuu Chineke ma ọ bụkwanụ nke ndị Izrel.
Ma ọ bụ “Onye na-abọrọ ha ọbọ.”
Ma ọ bụ “na-ekpuchi.”
O nwere ike ịbụ, “Ume ndụ ha na-apụ ma ghara ịlọghachi.”
Na Hibru, “aka ya.”
O nwere ike ịbụ, “ka oké ahụ́ ọkụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “aka nri.”
Na Hibru, “na-anwa Chineke Onye Kacha Elu.”
Ma ọ bụ “n’ihe o chetaara ha.”
Na Hibru, “A jaghị ụmụ agbọghọ ya na-amaghị nwoke mma.”
Na Hibru, “kpuchie.”
Na Hibru, “ọbara ndị ohu gị a wụfuru.”
Na Hibru, “ogwe aka.”
O nwere ike ịbụ, “tọhapụ.”
O nwere ike ịbụ, “n’etiti.”
Na Hibru, “Mee ka ihu gị nwuoro anyị ìhè.”
Na Hibru, “Mee ka ihu gị nwuoro anyị ìhè.”
Ma ọ bụ “alaka.”
Na Hibru, “Mee ka ihu gị nwuoro anyị ìhè.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, Chineke.
Ma ọ bụ “asụsụ.”
O nwere ike ịbụ na ihe a na-ekwu ebe a bụ nkata ndị ohu ji ebu ihe e ji arụ ụlọ.
Na Hibru, “n’ebe zoro ezo égbè eluigwe si agba.”
Meriba pụtara “Esemokwu.”
Na Hibru, “ya,” ya bụ, ndị Chineke.
Ma ọ bụ “ndị yiri chi.” Ọ ga-abụ ndị ikpe Izrel ka a na-ekwu maka ha.
Ya bụ, chi ndị ahụ e kwuru okwu ha n’amaokwu 1.
Na Hibru, “Ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji.”
Ma ọ bụ “Unu dị ka chi.” Ọ ga-abụ ndị ikpe Izrel ka a na-ekwu maka ha.
Ma ọ bụ “emechila ọnụ.”
Na Hibru, “na-eweli isi ha elu.”
Na Hibru, “ndị i zoro ezo.”
Ma ọ bụ “Ha agbaala ndụ.”
Ma ọ bụ “na ndagwurugwu.”
Ma ọ bụ “ndị na-edu.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ndagwurugwu osisi beka juru na ya.”
O nwere ike ịbụ, “Onye na-ezi ha ihe ji ngọzi ekpuchi onwe ya ka ákwà.”
O nwere ike ịbụ, “Chineke, biko, lee ọta anyị.”
Na Hibru, “iguzo.”
Ma ọ bụ “I kpuchiri.”
Ma ọ bụ “kpọghachite.”
Ma ọ bụ “gosi anyị ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “Ezi omume ga-esi n’eluigwe ledata anya.”
Ma ọ bụ “ga-eme ka ihe gaziere anyị.”
Ma ọ bụ “hulata gee ntị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ohu.”
Ma ọ bụ “obi a na-ekewaghị ekewa.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m; ndụ m.”
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ị na-emekwa amara.”
Ma ọ bụ “ị na-ekwukwa eziokwu.”
Na Hibru, “n’ọnụ ụzọ ámá Zayọn.”
Na Hibru, “n’ụlọikwuu niile nke Jekọb.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Hulata gee ntị.”
Na Hibru, “mkpụrụ obi m.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “n’ili.”
Ma ọ bụ “onye ike na-adịghịzi.”
Ma ọ bụ “olulu na-enweghị nsọtụ.”
Ma ọ bụ “n’Abadọn.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “i ji ezoro m ihu gị.”
O nwere ike ịbụ, “abịa otu mgbe.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “Ọgbakọ.”
Na Hibru, “ogwe aka.”
Ma ọ bụ “Ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “ha na-eje ije n’ìhè si n’ihu gị.”
Na Hibru, “na-eme ka mpi anyị dị elu.”
Na Hibru, “ogwe aka.”
Na Hibru, “ga-ebuli mpi ya elu.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “ihe m kpebiri.”
Na Hibru, “Mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “ụlọ ya ndị e ji nkume rụọ.”
Na Hibru, “weliela aka nri ndị iro ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “n’aka Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ebe anyị bi.”
Ma ọ bụ “Malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
Ma ọ bụ “otu oge nche.”
Ma ọ bụ “Ị ma ihe ọjọọ anyị na-eme.”
Na Hibru, “Ụbọchị.”
Na Hibru, “ka okwu a takwụnyeere mmadụ.”
Ma ọ bụ “obi anyị.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “chebe.”
Na Hibru, “ụgwọ a na-akwụ ndị ajọ omume.”
Ma ọ bụ “ebe mgbaba.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “Ị ga-ebuli mpi m elu.”
Ma ọ bụ “Ha gbagodị isi awọ́.”
Ma ọ bụ “ala.”
Ma ọ bụ “eme ka ọ maa jijiji.”
Na Hibru, “Ocheeze gị kwụsiri ike.”
Ma ọ bụ “ụlọ gị kwesịrị ịdị nsọ.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ndị ikpe.” Na Hibru, “ocheeze.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Meriba pụtara “Esemokwu.”
Masa pụtara “Ọnwụnwa.”
O nwere ike ịbụ, “Feenụ Jehova n’ihi na ọ dị ebube, dịkwa nsọ.”
Ma ọ bụ “ala.”
Ma ọ bụ “eme ka ọ maa jijiji.”
Ma ọ bụ “Ọ ga-ekpechite ọnụ mba dị iche iche.”
Ma ọ bụ “ọ bịala.”
Ma ọ bụ “ala.”
Mgbá aṅụ bụ ihe aṅụ na-anyụpụta nke na-adị n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ. Ihe a na-agbaze ngwa ngwa.
Ma ọ bụ “feenụ ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ndị.”
Na Hibru, “ihe dị nsọ e ji echeta ya.”
Na Hibru, “aka nri ya.”
Ma ọ bụ “merie.”
Ma ọ bụ “otú Chineke anyị si merie.”
Ma ọ bụ “ala.”
Ma ọ bụ “ọ bịala.”
Ma ọ bụ “ala.”
O nwere ike ịbụ, “n’etiti.”
Ma ọ bụ “n’ebe ọ gbakwasịrị ụkwụ.”
Na Hibru, “ị bọrọ ọbọ.”
Ma ọ bụ “Feekwanụ ya.”
Ma ọ bụ “na-ejere ya ozi.”
Ma ọ bụ “Kwetanụ.”
O nwere ike ịbụ, “ọ bụghị anyị kere onwe anyị.”
Ma ọ bụ “onye obi ya gbagọrọ agbagọ.”
Na Hibru, “ama.”
Ma ọ bụ “ga-ebibi.”
Ma ọ bụ “Onye na-akwụwa aka ọtọ.”
Ma ọ bụ “ga na-ebibi.”
Ma ọ bụ “mgbe ike gwụrụ ya.”
Ma ọ bụ “Hulata gee ntị.”
O nwere ike ịbụ, “M tara ahụ́.”
Ma ọ bụ “Aha gị ga-adịkwa.” Na Hibru, “A ga na-echeta gị.”
Na Hibru, “ka ga-eke eke.”
Ma ọ bụ “jeere Jehova ozi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “n’ili.”
Ma ọ bụ “na-eme amara.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
Ma ọ bụ “ocheeze.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “n’ime mmiri.”
Ma ọ bụ “A gaghị eme ka ọ maa jijiji.”
Ma ọ bụ “Shekeleke.”
Na Hibru, “Levayatan.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “i wepụ mmụọ ha.”
O nwere ike ịbụ, “Ka ihe m na-atụgharị n’uche banyere ya dị ya ụtọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
O nwere ike ịbụ, “Kwuonụ gbasara ọrụ niile dị ebube ọ na-arụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “iwu o nyere.”
Na Hibru, “Ọ gbajiri osisi achịcha niile.” O nwere ike ịbụ osisi e ji ekonye achịcha.
O nwere ike ịbụ Mosis na Erọn.
Ma ọ bụ “Zitekwa ire ọkụ.”
Ma ọ bụ “daranụ.”
Na Hibru, “ha.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “aghọtaghị ọrụ ndị dị ebube ị rụrụ n’Ijipt.”
Ma ọ bụ “ọzara.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Ya bụ, àjà ndị a chụụrụ ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ chi na-adịghị ndụ.
Meriba pụtara “Esemokwu.”
Ma ọ bụ “mụta ihe ha na-eme.”
Na Hibru, “na-awụfu ọbara.”
Ma ọ bụ “Malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ!”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “ruo na mbara igwe.”
Na Hibru, “aka nri.”
Na Hibru, “za m.”
O nwere ike ịbụ, “Chineke ekwuola n’ebe nsọ ya.”
Na Hibru, “chịwa ya.”
Ma ọ bụ “onye ga-ebo ya ebubo.”
Ya bụ, ọrụ ilekọta ọgbakọ.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “ga-esetị mkpanaka nke ike gị.”
Ma ọ bụ “Ìgwè ụmụ okorobịa.”
Ma ọ bụ “ọ gaghịkwa akwa ụta.”
Na Hibru, “onyeisi.”
Ma ọ bụ “ụwa niile.”
Ya bụ “Onyenwe m” e kwuru okwu ya n’amaokwu 1.
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “na-eme amara.”
Ya bụ, ala.
Na Hibru, “na-edebe ha.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “ọgbọ.”
Ma ọ bụ “na-eme amara.”
Ma ọ bụ “A gaghị eme ka ọ maa jijiji.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “nọ n’ocheeze.”
O nwere ike ịbụ, “ahịhịa.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “E nweghị ihe ruuru anyị, Jehova, e nweghị ihe ruuru anyị.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “n’ebe a na-anọ duu.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “ọ na-ehulata gee ntị.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “na-eme amara.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “M ga-eje ije n’ihu Jehova n’ala ndị dị ndụ.”
Ma ọ bụ “M ga-ebuli iko nke nnukwu nzọpụta elu.”
Na Hibru, “Dị oké ọnụ n’anya.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “Ọnụmara.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
“Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “ebe sara mbara.”
O nwere ike ịbụ, “ya na ndị na-enyere m aka.”
O nwere ike ịbụ, “Ị kwasiri.”
Ma ọ bụ “mkpu nzọpụta.”
Na Hibru, “na mpi ebe ịchụàjà.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ndị na-akwụwa aka ọtọ.”
Na Hibru, “M na-edebe okwu gị n’obi m.”
Ma ọ bụ “ntụziaka gị.”
Ma ọ bụ “na-amụ iwu gị.”
Ma ọ bụ “na-amụ ntụziaka gị.”
Ma ọ bụ “ntụziaka gị.”
Ma ọ bụ “na-amụ banyere ọrụ gị ndị dị ebube.”
Ma ọ bụ “i kwuru.”
Na Hibru, “ga-eji ọsọ.”
O nwere ike ịbụ, “ị na-eme ka obi sie m ike.”
Ma ọ bụ “Mee ka m na-eje ije n’ụzọ iwu gị.”
Ma ọ bụ “Ọ bụghị n’uru.”
Ma ọ bụ “ihe i kwuru.”
O nwere ike ịbụ, “Nke e kwere ndị na-atụ egwu gị.”
Ma ọ bụ “gosi m ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “i kwuru.”
Ma ọ bụ “na-echere.”
Na Hibru, “na-achọ.”
Ma ọ bụ “ga-amụ banyere ntụziaka ị na-enye.”
Ma ọ bụ “nkwa i kwere.”
Ma ọ bụ “Nke i mere ka m chere.”
Ma ọ bụ “N’ụlọ ebe m bi ka onye mbịarambịa.”
Ma ọ bụ “i kwuru.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ntụziaka gị.”
Ma ọ bụ “i kwuru.”
Ma ọ bụ “m nọ na-emehie n’amaghị ụma.”
Ma ọ bụ “ntụziaka gị.”
Ma ọ bụ “na-echere.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ị gwara ohu gị.”
Ma ọ bụ “ga-amụ iwu gị.”
Ma ọ bụ “ka m na-echere.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ya bụ, ihe niile o kere.
Na Hibru, “na-achọ.”
Ma ọ bụ “na-amụ banyere ya.”
Ma ọ bụ “na-amụ ihe ndị ị na-echetara m.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “i kwuru.”
Ma ọ bụ “M chị obi m n’aka.”
Ma ọ bụ “Ihe ndị ị na-echetara m bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi.”
Ma ọ bụ “ndị obi ha kewara ekewa.”
Ma ọ bụ “na-echere.”
Ma ọ bụ “otú i kwuru.”
Ma ọ bụ “ka ihere mee m.”
Okwu Hibru a sụgharịrị ebe a pụtara ihe na-abaghị uru na-esi n’ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo apụta mgbe a na-agbaze ya.
Ma ọ bụ “i kwuru.”
Ma ọ bụ “ntụziaka gị.”
Ma ọ bụ “ọlaedo a nụchara anụcha.”
Ma ọ bụ “iwu.”
Ma ọ bụ “ka ụkwụ sie m ike.”
Na Hibru, “Mee ka ihu gị nwuoro ohu gị ìhè.”
Ma ọ bụ “ntụziaka gị.”
Ma ọ bụ “na-echere.”
Na Hibru, “tupu oge nche abalị.”
Ma ọ bụ “mụọ okwu gị.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “otú i kwuru.”
Na Hibru, “achọ.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Obi na-eru ndị ji iwu gị kpọrọ ihe ala.”
Ma ọ bụ “otú i kwuru.”
Ma ọ bụ “ntụziaka gị.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “maa jijiji.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “mgbe ị na-apụ apụ na mgbe ị na-abata abata.”
“Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ya bụ, Jeruselem.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi anyị.”
Na Hibru, “Mkpanaka ajọ omume.”
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “ụmụ nwoke.”
Ọ ga-abụ nna ha ka a na-ekwu.
Ọ ga-abụ ụmụ ha ka a na-ekwu.
Na Hibru, “n’ala ala mmiri.”
“Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “na-agụkọ.”
Na Hibru, “na-atụ egwu gị.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “nnukwu ụlọikwuu.”
Ma ọ bụ “ná nnukwu ụlọikwuu ya.”
Ma ọ bụ “n’ebe ọ gbakwasịrị ụkwụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ nke afọ gị.”
Ma ọ bụ “M ga-eyiwe ndị nchụàjà ya nzọpụta dị ka uwe.”
Na Hibru, “mpi Devid puo.”
Na Hibru, “Akwadebela m ọkụ maka onye m tere mmanụ.”
O nwere ike ịbụ, “Chịlienụ aka unu n’ebe nsọ.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “ígwé ojii.”
Ma ọ bụ “aha gị ga-adị.” Na Hibru, “a ga na-echeta gị.”
Ma ọ bụ “Ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “nghọta.”
Na Hibru, “anụ ahụ́ niile.”
Ebe a na-ekwu bụ Babịlọn.
O nwere ike ịbụ, “kpọnwụọ.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Babịlọn.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
O nwere ike ịbụ, “I meela ka okwu gị dị ebube karịa aha gị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “Aka nri gị.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “Mgbe ị kpara m n’ala ala ụwa.”
Na Hibru, “mụ na gị ka nọkwa.”
Ma ọ bụ “Ndị ikpe ọbara mara.”
Na Hibru, “isi m.”
Ma ọ bụ “N’olulu mmiri.”
Ma ọ bụ “n’ala.”
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ma ọ bụ “na o gosiri m ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Anapụla m ndụ m.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “Naanị gị bụ òkè m n’ala ndị dị ndụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “na-amụ banyere ọrụ aka gị.”
Ma ọ bụ “n’ili.”
Ma ọ bụ “na-edu m n’ala ezi omume.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Onye na-azọpụta ndị eze.”
Ma ọ bụ “ịchọpụta.”
Ma ọ bụ “ike gị dị egwu.”
Ma ọ bụ “na-eme amara.”
Ma ọ bụ “na-akpọku ya n’eziokwu.”
Na Hibru, “anụ ahụ́ niile.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “ndị a ma ama.”
Na Hibru, “ndị e kere agbụ.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Na Hibru, “Eluigwe nke eluigwe.”
Na Hibru, “ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke.”
Na Hibru, “Ọ ga-ebuli mpi ndị ya elu.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.